Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Imeri Adịghị Ike Mmadụ

Imeri Adịghị Ike Mmadụ

 Imeri Adịghị Ike Mmadụ

“Ịtụkwasị uche n’anụ ahụ bụ ọnwụ.”—NDỊ ROM 8:6.

1. Olee otú ụfọdụ si ele ahụ mmadụ anya, oleekwa ajụjụ ndị kwesịrị ntụle?

“M GA-EKELE Gị; n’ihi na e jiwo ihe dị iche iche dị egwu mee ka m bụrụ oké ọrụ.” (Abụ Ọma 139:14) Otú ahụ ka ọbụ abụ ahụ bụ́ Devid bụrụ n’abụ mgbe ọ na-atụle otu n’ime ihe ndị Jehova kere—ahụ mmadụ. Kama inye otuto kwesịrị ekwesị dị otú ahụ, ụfọdụ ndị nkụzi okpukpe na-ewere ahụ dị ka ebe mmehie na-ezobe onwe ya nakwa ngwá ọrụ ya. A kpọwo ya “ihe mkpuchi nke amaghị ihe, ntọala nke omume ọjọọ, agbụ nke nrụrụ aka, ogige nke ihe ọjọọ, ọnwụ dị ndụ, ozu dị ndụ, ili na-aga ije.” Ọ bụ eziokwu na Pọl onyeozi kwuru, sị: “Ezi ihe adịghị ebi . . . n’anụ ahụ m.” (Ndị Rom 7:18) Ma nke a ọ̀ pụtara na anyị tọrọ atọ n’ụzọ olileanya na-adịghị na ya n’ime ahụ na-emehie emehie?

2. (a) Gịnị ka “ịtụkwasị uche n’anụ ahụ” pụtara? (b) Ọgụ dị aṅaa ka “anụ ahụ” na “Mmụọ Nsọ” na-alụ n’ime mmadụ ndị na-achọ ime ihe na-atọ Chineke ụtọ?

2 Mgbe ụfọdụ Akwụkwọ Nsọ na-ezo aka n’ahụ mmadụ dị ka “anụ ahụ.” (1 Ndị Eze 21:27) Ọ na-ejikwa “anụ ahụ” eme ihe iji kọwaa mmadụ n’ọnọdụ ezughị okè ya dị ka nwa na-emehie emehie nke Adam na-enupụ isi. (Ndị Efesọs 2:3; Abụ Ọma 51:5; Ndị Rom 5:12) Ihe anyị ketara n’aka ya arụpụtawo “adịghị ike nke anụ ahụ.” (Ndị Rom 6:19) Pọl dọkwara aka ná ntị, sị: “Ịtụkwasị uche n’anụ ahụ bụ ọnwụ.” (Ndị Rom 8:6) Ụdị “ịtụkwasị uche n’anụ ahụ” ahụ pụtara ịbụ onye ọchịchọ nke anụ ahụ na-emehie emehie na-achịkwa ma na-akwali. (1 Jọn 2:16) Ya mere, ọ bụrụ na anyị na-agbalị ime ihe na-atọ Chineke ụtọ, e nwere ọgụ na-aga n’ihu n’ihu n’etiti ọnọdụ ime mmụọ anyị na ọdịdị mmehie anyị bụ́ nke na-arụgide anyị n’esepụghị aka ịrụ “ọrụ nile nke anụ ahụ.” (Ndị Galetia 5:17-23; 1 Pita 2:11) Mgbe Pọl kọwasịrị ọgụ a na-egbu mgbu a na-alụ n’ime ya, o kwupụtara, sị: “Mmadụ nke hụjuru anya ka mụ onwe m bụ! ònye ga-adọpụta m n’ahụ nke ọnwụ a?” (Ndị Rom 7:24) Pọl ọ̀ bụ onye chere ọnwụnwa ihu n’enweghị enyemaka? Bible na-aza ee e n’ụzọ dara ụda!

 Ịdị Adị nke Ọnwụnwa na Mmehie

3. Olee otú ọtụtụ ndị si ele mmehie na ọnwụnwa anya, ma olee otú Bible si adọ aka ná ntị megide omume dị otú ahụ?

3 Nye ọtụtụ ndị taa, mmehie bụ echiche a na-adịghị anabata. Ụfọdụ ndị na-eji “mmehie” eme ihe n’ụzọ na-atọ ọchị dị ka okwu mgbe ochie e ji akọwa obere mmejọ mmadụ mere. Ha adịghị aghọta na “a ghaghị ime ka anyị nile pụta ìhè n’ihu oche ikpe Kraịst; ka anyị nile n’otu n’otu wee naghachi ihe e sitere n’ahụ mee, dị ka ihe onye ọ bụla mere si dị, ma ọ bụ ezi ihe ma ọ bụ ihe na-adịghị mma.” (2 Ndị Kọrint 5:10) Ndị ọzọ pụrụ ikwu okwu n’echeghị echiche, sị: “Apụrụ m iguzogide ihe ọ bụla ma e wezụga ọnwụnwa!” Ụfọdụ ndị bi n’ebe e nwere ọdịbendị ndị dabeere n’inwe ihe ụtọ ozugbo, ma ọ̀ gụnyere nri, mmekọahụ, mkpori ndụ, ma ọ bụ ịrụzu ihe. Ọ bụghị nanị na ha chọrọ ihe nile kama ha chọrọ ya ozugbo! (Luk 15:12) Ha adịghị ele anya gabiga ihe ụtọ dị ugbu a ruo n’ọṅụ dị n’ihu nke “ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie.” (1 Timoti 6:19) Otú ọ dị, Bible na-akụziri anyị iche echiche nke ọma na ilepụ anya n’ihu, na-ezere ihe ọ bụla ga-emerụ anyị ahụ n’ụzọ ime mmụọ ma ọ bụ n’ụzọ ndị ọzọ. Otu ilu sitere n’ike mmụọ nsọ na-ekwu, sị: “Onye nwere ezi uche ahụwo ihe ọjọọ, wee zobe onwe ya: ma ndị na-enweghị uche agabigawo, e wee rie ha nha.”—Ilu 27:12.

4. Ndụmọdụ dị aṅaa e dekọrọ ná 1 Ndị Kọrint 10:12, 13 ka Pọl nyere?

4 Mgbe Pọl degaara ndị Kraịst bi na Kọrint—obodo e ji omume rụrụ arụ mara—akwụkwọ, o nyere ịdọ aka ná ntị dị irè megide ọnwụnwa na ikike nke mmehie. O kwuru, sị: “Onye na-eche na ọ na-eguzo, ya lezie anya ka ọ ghara ịda. Ọ dịghị ọnwụnwa ọ bụla nwaworo unu ma ọ bụghị nke mmadụ na-anagide: ma Chineke kwesịrị ntụkwasị obi, Onye na-agaghị ekwe ka a nwaa unu karịa nke unu pụrụ ịnagide; kama n’oge ọnwụnwa ahụ Ọ ga-emekwa ụzọ mgbapụ, ka unu wee nwee ike ịnagide ya.” (1 Ndị Kọrint 10:12, 13) Anyị nile—ma ndị na-eto eto ma ndị agadi, ma ndị ikom ma ndị inyom—na-ezute ọtụtụ ọnwụnwa n’ụlọ akwụkwọ, n’ebe ọrụ, ma ọ bụ n’ebe ndị ọzọ. Ya mere, ka anyị tụlee okwu Pọl ma hụ ihe ha pụtara nye anyị.

Enwebigala Obi Ike Ókè

5. N’ihi gịnị ka inwebiga obi ike ókè ji dị ize ndụ?

5 Pọl na-ekwu, sị: “Onye na-eche na ọ na-eguzo, ya lezie anya ka ọ ghara ịda.” Inwebiga obi ike ókè banyere ikike nke omume anyị dị ize ndụ. Ọ na-egosipụta enweghị nghọta banyere ọdịdị na ike nke mmehie. Ebe ọ bụ na mmadụ ndị dị ka Mosis, Devid, Solomọn, na Pita onyeozi dabara ná mmehie, ànyị kwesịrị iche na anyị enweghị ike ịdaba na ya? (Ọnụ Ọgụgụ 20:2-13; 2 Samuel 11:1-27; 1 Ndị Eze 11:1-6; Matiu 26:69-75) “Onye maara ihe na-atụ egwu, wee si n’ihe ọjọọ wezụga onwe ya: ma onye nzuzu na-ewebiga iwe ókè, wee na-atụkwasị obi,” ka Ilu 14:16 na-ekwu. Ọzọkwa, Jisọs kwuru, sị: ‘Mmụọ dị ọkụ n’ezie, ma anụ ahụ adịghị ike.’ (Matiu 26:41) Ebe ọ bụ na ọ dịghị mmadụ ọ bụla na-ezughị okè nke agụụ ihe rụrụ arụ na-apụghị ịgụ, ọ dị anyị mkpa iji ndụmọdụ Pọl kpọrọ ihe nke ukwuu ma guzogide ọnwụnwa, ma ọ́ bụghị ya, anyị ga-anọ n’ihe ize ndụ nke ịda.—Jeremaịa 17:9.

6. Olee mgbe anyị ga-ejikere maka ọnwụnwa, n’ụzọ dịkwa aṅaa?

6 Ọ bụ ihe amamihe dị na ya ijikere maka nsogbu nke pụrụ ịdapụta na mberede. Eze Esa ghọtara na ọ bụ oge e nwere udo bụ oge dị mma iwu ihe nchebe ya. (2 Ihe E Mere 14:2, 6, 7) Ọ maara na oge ga-agawo maka ime nkwadebe n’oge a ga-awakpo ya. N’otu aka ahụ, ọ kasị mma ime mkpebi banyere ihe a ga-eme mgbe ọnwụnwa bịara n’oge isi ka dị mmadụ jụụ, n’oge a na-enwebeghị nsogbu. (Abụ Ọma 63:6) Daniel na ndị enyi ya na-atụ egwu Chineke mere mkpebi ikwesị ntụkwasị obi n’iwu Jehova tupu a na-arụgide ha iri ihe oriri ọma nke eze. N’ihi ya, ha alaghị azụ n’ịrapagide n’ihe ha kweere nakwa ịghara iri nri rụrụ arụ. (Daniel 1:8) Tupu ọnọdụ ndị na-eweta ule ebilite, ka anyị mee ka mkpebi anyị ịnọgide na-adị ọcha n’omume sikwuo ike. Mgbe ahụ anyị ga-enwe ike iguzogide mmehie.

7. N’ihi gịnị ka o ji bụrụ ihe na-akasi obi ịmara na ndị ọzọ eguzogidewo ọnwụnwa n’ụzọ gara nke ọma?

 7 Lee nkasi obi anyị na-enweta site n’okwu Pọl bụ́: “Ọ dịghị ọnwụnwa ọ bụla nwaworo unu ma ọ bụghị nke mmadụ na-anagide”! (1 Ndị Kọrint 10:13) Pita onyeozi dere, sị: “Na-eguzogidenụ [Ekwensu], n’ihi na unu dị ike n’okwukwe unu, ebe unu matara na a na-emezu otu ahụhụ ahụ n’ahụ ndị bụ́ òtù ụmụnna unu ndị nọ n’ụwa.” (1 Pita 5:9) Ee, ndị ọzọ echewo ọnwụnwa ndị dị otú ahụ ihu ma guzogide ha n’ụzọ gara nke ọma site n’enyemaka Chineke, anyị onwe anyị pụkwara ime otú ahụ. Otú ọ dị, dị ka ezi ndị Kraịst na-ebi n’ụwa rụrụ arụ, anyị nile pụrụ ịtụ anya inweta ọnwụnwa n’oge ọ bụla. Mgbe ahụ, olee otú anyị pụrụ isi nwee obi ike na anyị ga-emeri adịghị ike mmadụ na ọnwụnwa ime mmehie?

Anyị Pụrụ Iguzogide Ọnwụnwa!

8. Olee ụzọ bụ́ isi isi zere ọnwụnwa?

8 Ụzọ bụ́ isi isi kwụsị “ịdị na-abụ ohu nke mmehie” bụ izere ọnwụnwa mgbe o kwere mee. (Ndị Rom 6:6) Ilu 4:14, 15 na-agba anyị ume, sị: “Abala n’okporo ụzọ ndị na-emebi iwu, agakwala n’ihu n’ụzọ ndị ọjọọ. Zere ya, agabigala n’ime ya; wezụgara ya onwe gị, gabiga.” Anyị na-adịkarị mbụ amara ma ọnọdụ ụfọdụ hà yiri ndị ga-eduga ná mmehie. Ya mere, o doro anya na ihe anyị ga-eme dị ka ndị Kraịst bụ ‘ịgabiga,’ iwezụga onwe anyị n’ebe onye ọ bụla nke pụrụ ịkpalite ọchịchọ na-ezighị ezi ma mee ka anyị nwewa mmetụta ndị rụrụ arụ nọ, na n’ihe ọ bụla nakwa n’ebe ọ bụla nke pụrụ ime otu ihe ahụ.

9. Olee otú e si mesie ike isi n’ọnọdụ ndị na-akpata ọnwụnwa gbapụ n’Akwụkwọ Nsọ?

9 Ịgbanahụ ọnọdụ na-eduga n’ọnwụnwa bụ nzọụkwụ ọzọ bụ́ isi na-eduga n’imeri ọnwụnwa. Pọl dụrụ ọdụ, sị: “Gbanahụnụ ịkwa iko.” (1 Ndị Kọrint 6:18) O dekwara, sị: “Gbanahụnụ ikpere arụsị.” (1 Ndị Kọrint 10:14) Onyeozi ahụ dọkwara Timoti aka ná ntị ịgbanahụ ọchịchọ gabigara ókè maka ụba ihe onwunwe, nakwa “agụụ ihe ọjọọ na-agụ nwa okorobịa.”—2 Timoti 2:22; 1 Timoti 6:9-11.

10. Ihe atụ abụọ dị aṅaa dịgasị iche na-egosi abamuru dị n’ịgbanahụ ọnwụnwa?

10 Tụlee ihe banyere Eze Devid nke Israel. Ka ọ nọ na-elepụ anya site n’elu ụlọ obí ya, ọ hụrụ otu nwanyị mara mma ka ọ na-asa ahụ, ọchịchọ na-ezighị ezi wee jupụta ya n’obi. O kwesịrị isiwo n’elu ụlọ ahụ pụọ ma gbanahụ ọnwụnwa ahụ. Kama nke ahụ, ọ jụrụ ajụjụ banyere nwanyị a—Bat-sheba—ihe sikwa na ya pụta bibiri ihe. (2 Samuel 11:1–12:23) N’aka nke ọzọ, olee otú Josef si mee omume mgbe nwunye nna ya ukwu bụ́ onye na-eme omume rụrụ arụ rịọrọ ya iso ya dinaa? Ihe ndekọ ahụ na-agwa anyị, sị: “Mgbe ọ na-agwa Josef okwu kwa ụbọchị, [o] geghị ya ntị, idina nso ya, ma ọ bụ ịnọnyere ya.” Ọbụna n’agbanyeghị na e nwebeghị Iwu Mosis, bụ́ nke a na-enyebeghị ka ọ dị mgbe ahụ, Josef zara ya site n’ikwu, sị: “M̀ ga-esikwa aṅaa mee oké ihe ọjọọ nke a, mehie megide Chineke?” Otu ụbọchị, o jidere ya, na-asị: “Ka mụ na gị dinaa.”  Josef ọ̀ nọdụrụ n’ebe ahụ ma nwaa iso ya tụgharịa uche? Ee e. Ọ ‘gbalagara, pụọ n’èzí.’ Josef enyeghị ọnwụnwa nke inwe mmekọahụ ohere ịnwata ya. Ọ gbalagara!—Jenesis 39:7-16.

11. Gịnị pụrụ ikwe omume ma ọ bụrụ na anyị na-enweta ọnwụnwa ugboro ugboro?

11 Mgbe ụfọdụ a na-ele ịgbapụ anya dị ka ụjọ, ma isi n’otu ọnọdụ pụọ na-abụkarị ihe amamihe dị na ya ime. Ikekwe anyị na-enweta ọnwụnwa ugboro ugboro n’ebe ọrụ. Ọ bụ ezie na anyị enweghị ike ịgbanwe ọrụ, a pụrụ inwe ụzọ ndị ọzọ anyị pụrụ isi wepụ onwe anyị n’ọnọdụ ndị na-akpata ọnwụnwa. Ọ dị anyị mkpa isi n’ihe ọ bụla anyị maara na o zighị ezi gbapụ, anyị kwesịkwara ikpebisi ike ime nanị ihe ziri ezi. (Emọs 5:15) N’ebe ndị ọzọ, ịgbanahụ ọnwụnwa ga-achọ izere ógbè Internet ndị nwere ihe na-akpali agụụ mmekọahụ na ebe ntụrụndụ ndị a na-enyo enyo. Ọ pụkwara ịpụta ịtụfu magazin ma ọ bụ ịchọta ndị enyi ọhụrụ—ndị hụrụ Chineke n’anya bụ́kwa ndị nwere ike inyere anyị aka. (Ilu 13:20) Ihe ọ sọrọ ya bụrụ ya na-anwa anyị ime mmehie, anyị ga-abụ ndị amamihe ma ọ bụrụ na anyị ejiri mkpebi siri ike gbakụta ya azụ.—Ndị Rom 12:9.

Otú Ekpere Pụrụ Isi Nye Aka

12. Gịnị ka anyị na-arịọ n’aka Chineke mgbe anyị na-ekpe ekpere, sị: “Ewebala anyị n’ime ọnwụnwa”?

12 Pọl na-enye ihe mmesi obi ike a na-agba ume, sị: “Chineke kwesịrị ntụkwasị obi, Onye na-agaghị ekwe ka a nwaa unu karịa nke unu pụrụ ịnagide; kama n’oge ọnwụnwa ahụ Ọ ga-emekwa ụzọ mgbapụ, ka unu wee nwee ike ịnagide ya.” (1 Ndị Kọrint 10:13) Otu ụzọ Jehova si enyere anyị aka bụ site n’ịza ekpere anyị maka enyemaka ya n’ịnagide ọnwụnwa. Jisọs Kraịst kụziiri anyị ikpe ekpere, sị: “Ewebala anyị n’ime ọnwụnwa, kama dọpụta anyị n’aka ajọ onye ahụ.” (Matiu 6:13) Ná nzaghachi nye ekpere dị otú ahụ si n’obi, Jehova agaghị agbahapụ anyị n’ọnwụnwa; ọ ga-anapụta anyị n’aka Setan na omume aghụghọ ya. (Ndị Efesọs 6:11, ihe odide ala ala peeji nke NW) Anyị kwesịrị ịrịọ Chineke ka o nyere anyị aka ịmata ọnwụnwa ma nwee ikike iguzogide ha. Ọ bụrụ na anyị arịọ ya ka ọ ghara ikwe ka anyị daa mgbe a nwara anyị, ọ ga-enyere anyị aka ka Setan, bụ́ “ajọ onye ahụ,” ghara imeri anyị.

13. Gịnị ka anyị kwesịrị ime mgbe ọnwụnwa na-adịgide adịgide chere anyị ihu?

13 Anyị kwesịrị ikpesi ekpere ike karịsịa mgbe ọnwụnwa na-adịgide adịgide chere anyị ihu. Ọnwụnwa ụfọdụ pụrụ ime ka anyị na-agba mgba siri ike n’ime onwe anyị, mgba siri ike megide echiche na omume ndị na-echetara anyị n’ụzọ pụtara ìhè otú adịghị ike anyị haruru. (Abụ Ọma 51:5) Dị ka ihe atụ, gịnị ka anyị pụrụ ime ma ọ bụrụ na anyị na-enwe mmekpa ahụ ma anyị cheta omume ụfọdụ rụrụ arụ anyị na-emebu? Gịnị ma ọ bụrụ na a na-anwa anyị imeghachi ya? Kama nanị ịnwa ịbịada mmetụta ndị dị otú ahụ, wegara ya Jehova n’ekpere—ugboro ugboro ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa. (Abụ Ọma 55:22) Site n’ike nke Okwu ya na mmụọ nsọ ya, ọ pụrụ inyere anyị aka iwepụsị ọchịchọ ndị na-adịghị ọcha n’uche anyị.—Abụ Ọma 19:8, 9.

14. N’ihi gịnị ka ekpere ji dị oké mkpa iji nagide ọnwụnwa?

14 N’ịhụ iro ụra nke ndị ozi ya n’ogige Getsemane, Jisọs gbara ha ume, sị: “Na-echenụ nche, na-ekpekwanụ ekpere, ka unu wee ghara ịba n’ọnwụnwa: mmụọ nke mmadụ dị ọkụ n’ezie, ma anụ ahụ adịghị ike.” (Matiu 26:41) Otu ụzọ isi merie ọnwụnwa bụ ịmara ụzọ dị iche iche ọnwụnwa pụrụ isi bịa ma kpachara anya maka ụzọ aghụghọ ya nile. Ọ dịkwa oké mkpa ka anyị kpee ekpere banyere ọnwụnwa ahụ n’egbughị oge ka anyị wee dị njikere n’ụzọ ime mmụọ ịlụso ya ọgụ. Ebe ọ bụ na ọnwụnwa na-esi n’ebe ndị anyị na-adịghị ike abịa, anyị apụghị iguzogide ya nanị anyị. Ekpere dị oké mkpa n’ihi na ikike Chineke na-enye pụrụ ịkwado ihe nchebe anyị megide Setan. (Ndị Filipaị 4:6, 7) Enyemaka ime mmụọ na ekpere nke “ndị okenye nke nzukọ Kraịst” pụkwara ịdị anyị mkpa.—Jemes 5:13-18.

Na-eguzogidesi Ọnwụnwa Ike

15. Gịnị ka iguzogide ọnwụnwa gụnyere?

15 E wezụga izere ọnwụnwa mgbe o kwere  omume, anyị aghaghị iguzogidesi ya ike ruo mgbe ọ gabigara ma ọ bụ mgbe ọnọdụ ahụ gbanwere. Mgbe Setan nwara Jisọs, o guzogidere ya ruo mgbe Ekwensu pụrụ. (Matiu 4:1-11) Jemes onye na-eso ụzọ dere, sị: “Guzogidenụ ekwensu, ọ ga-agbapụkwa n’ebe unu nọ.” (Jemes 4:7) Nguzogide na-amalite site n’iji Okwu Chineke mee ka uche anyị sikwuo ike nakwa ikpebisi ike na anyị ga-arapagide n’ụkpụrụ ya. Anyị ga-eme nke ọma iburu akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị bụ́ isi bụ́ ndị kwuru okwu banyere adịghị ike anyị kpọmkwem n’isi ma na-atụgharị uche na ha. Ọ ga-abụ ihe amamihe dị na ya ịchọta onye Kraịst tozuru okè—ikekwe onye okenye—bụ́ onye anyị pụrụ ịdị na-akọrọ nchegbu anyị bụ́kwa onye anyị pụrụ ịkpọ maka enyemaka mgbe ọnwụnwa bịara.—Ilu 22:17.

16. Olee otú anyị pụrụ isi nọgide na-eme omume ziri ezi?

16 Akwụkwọ Nsọ na-agba anyị ume iyikwasị mmadụ ọhụrụ ahụ. (Ndị Efesọs 4:24) Nke a pụtara ikwe ka Jehova na-akpụzi ma na-agbanwe anyị. Mgbe Pọl na-edegara onye ya na ya na-arụkọ ọrụ bụ́ Timoti akwụkwọ, o kwuru, sị: “Na-agbaso ezi omume, nsọpụrụ Chineke, okwukwe, ịhụnanya, ntachi obi, ịdị nwayọọ. Na-agbasi mgba ọma nke okwukwe ike, jide ndụ ebighị ebi aka, nke a kpọrọ gị ka ị nata ya.” (1 Timoti 6:11, 12) Anyị pụrụ ‘ịgbaso ezi omume’ site n’iji ịdị uchu na-amụ Okwu Chineke iji nweta ihe ọmụma miri emi banyere àgwà ya ma na-emezi omume n’ụzọ kwekọrọ n’ihe ndị ọ chọrọ. Usoro ihe omume juru eju nke ndị Kraịst, dị ka ikwusa ozi ọma na ịga nzukọ, dịkwa oké mkpa. Ịbịaru Chineke nso na irite uru site ná ndokwa ime mmụọ ndị o mere, ga-enyere anyị aka ito eto n’ụzọ ime mmụọ ma nọgide na-eme omume ziri ezi.—Jemes 4:8.

17. Olee otú anyị si mara na Chineke agaghị ahapụ anyị n’oge ọnwụnwa?

17 Pọl na-emesi anyị obi ike na ọnwụnwa ọ bụla anyị chere ihu agaghị akarị ikike Chineke nyere anyị ime ihe banyere ya. Jehova ‘ga-eme ụzọ mgbapụ, ka anyị wee nwee ike ịnagide ya.’ (1 Ndị Kọrint 10:13) N’ezie, Chineke adịghị ekwe ka ọnwụnwa ghọọ nke na-erikpu nnọọ erikpu nke na anyị agaghịzi enwe ike ime mmụọ zuru ezu ịnọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe ma ọ bụrụ na anyị anọgide na-adabere n’ebe ọ nọ. Ọ chọrọ ka anyị na-enwe ihe ịga nke ọma n’iguzogidesi ọnwụnwa nke ime ihe na-ezighị ezi n’anya ya ike. Ọzọkwa, anyị pụrụ inwe okwukwe ná nkwa ya bụ́: “M gaghị aha gị aka ma ọlị, M gaghị ahapụkwa gị ma ọlị.”—Ndị Hibru 13:5.

18. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji jide n’aka na anyị ga-emeri adịghị ike mmadụ?

18 Pọl enweghị obi abụọ banyere ihe ga-esi ná ndọlị ya megide adịghị ike mmadụ pụta. O leghị onwe ya anya dị ka onye kwesịrị imere ebere na onye na-apụghị ime ihe n’ebe ọchịchọ anụ ahụ ya dị. N’ụzọ dị iche, o kwuru, sị: “Mụ onwe m na-agba ọsọ otú a, dị ka onye na-adịghị agba n’eleghị anya ihe; otú a ka m na-esu ọkpọ, dị ka onye na-adịghị apịa ifufe: ma ana m etipụta ahụ m ọnyá, meekwa ya ka ọ bụrụ ohu m: ka mụ onwe m ghara ịghọ onye a jụrụ ajụ n’ụzọ ọ bụla, mgbe m kwusasịrị okwu Chineke nye ndị ọzọ.” (1 Ndị Kọrint 9:26, 27) Anyị onwe anyị kwa pụrụ ịlụ ọgụ na-aga nke ọma megide anụ ahụ anyị na-ezughị okè. Site n’Akwụkwọ Nsọ, mbipụta ndị dabeere na Bible, nzukọ ndị Kraịst, na ndị Kraịst ibe anyị tozuru okè, Nna anyị nke eluigwe na-ahụ n’anya na-enye anyị ihe ncheta mgbe nile bụ́ ndị na-enyere anyị aka ịgbaso ụzọ ziri ezi. Site n’enyemaka ya, anyị pụrụ imeri adịghị ike mmadụ!

Ị̀ Na-echeta?

• Gịnị ka “ịtụkwasị uche n’anụ ahụ” pụtara?

• Olee otú anyị pụrụ isi jikere maka ọnwụnwa?

• Gịnị ka anyị pụrụ ime iji nagide ọnwụnwa?

• Òkè dị aṅaa ka ekpere na-ekere n’ime ihe maka ọnwụnwa?

• Olee otú anyị si mara na ọ bụ ihe kwere omume imeri adịghị ike mmadụ?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto ndị dị na peeji nke 10]

Bible adịghị akụzi na anyị bụ ndị na-enweghị ihe ha pụrụ ime n’ebe ọchịchọ anụ ahụ ha dị

[Foto dị na peeji nke 12]

Ịgbanahụ ọnwụnwa bụ otu ụzọ bụ́ isi isi zere mmehie