Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Otú Anyị Pụrụ Isi Zụlite Omume Ọma

Otú Anyị Pụrụ Isi Zụlite Omume Ọma

 Otú Anyị Pụrụ Isi Zụlite Omume Ọma

AKWỤKWỌ ọkọwa okwu ndị nke oge a na-akọwa “omume ọma” dị ka “omume magburu onwe ya; ịdị mma.” Ọ bụ “omume na echiche ziri ezi; ịdị mma nke omume.” Onye na-ede akwụkwọ ọkọwa okwu bụ́ Marvin R. Vincent na-ekwu na ihe mbụ okwu Grik ahụ a sụgharịrị ịbụ “omume ọma” pụtara n’oge ochie na-egosipụta “ụdị ọ bụla nke ihe ịmagbu onwe ya.” Mgbe ahụ, ọ bụghị ihe ijuanya na e towo àgwà ndị dị ka ịdị akọ, obi ike, ọzụzụ onwe onye, ikpe ziri ezi, ọmịiko, nnọgidesi ike, ịkwụwa aka ọtọ, ịdị umeala n’obi, na iguzosi ike n’ihe dị ka omume ọma site n’oge ruo n’oge. A kọwawokwa omume ọma dị ka “ikwekọ n’ụkpụrụ nke ezi ihe.”

Ònye ka anyị kwesịrị ikwekọ n’ụkpụrụ ya nke ihe ịmagbu onwe ya, ịdị mma, na ezi ihe? “Dị ka ndị bụ́ ọkachamara na nkà ihe ọmụma nke omume ọma si kwuo,” ka magazin bụ́ Newsweek kwuru, “ịrụ eziokwu ụka nke Oge Nghọta kpalitere emewo ka echiche nile nke ezi ihe na ihe ọjọọ bụrụzie nke dabeere ná nhọrọ onwe onye, nhọrọ dabeere ná mmetụta uche ma ọ bụ n’ọdịbendị.” Ma, ihe masịrị mmadụ ma ọ bụ ihe mmadụ họọrọ ọ̀ bụ ụzọ kwesịrị ekwesị isi na-ekpebi ihe bụ́ ezi ihe na ihe ọjọọ? Ee e. Ka anyị wee zụlite omume ọma, ọ dị anyị mkpa inwe ụkpụrụ a pụrụ ịdabere na ya nke ezi ihe na ihe ọjọọ—ụkpụrụ nke a pụrụ ịgbakwasị ụkwụ na ya kpebie na omume ma ọ bụ àgwà ụfọdụ ziri ezi ma ọ bụ dị njọ.

Nanị Ezigbo Isi Iyi nke Ụkpụrụ Omume Ọma

E nwere nanị otu Isi Iyi maka ụkpụrụ omume ọma—Onye Okike nke ihe a kpọrọ mmadụ, bụ́ Jehova Chineke. N’oge na-adịghị anya mgbe Jehova Chineke kesịrị mmadụ mbụ, bụ́ Adam, o nyere nwoke ahụ iwu a, sị: “Mkpụrụ nke sitere n’osisi nile ọ bụla nke ubi a a gbara ogige ka ị ga  na-eri eri: ma mkpụrụ nke sitere n’osisi ịma ezi ihe na ihe ọjọọ, gị erila mkpụrụ sitere na ya: n’ihi na n’ụbọchị ị ga-eri mkpụrụ sitere na ya ị ghaghị ịnwụ anwụ.” (Jenesis 2:16, 17) Jehova Chineke nyere osisi ahụ aha ahụ pụrụ iche iji gosi oruru o ruuru nanị ya ikpebiri ihe ndị o kere eke ihe bụ́ ezi ihe na ihe ọjọọ. N’ụzọ dị otú a, ụkpụrụ Chineke maka ihe ndị bụ́ ezi ihe na ihe ọjọọ ghọrọ ihe ndabere maka inyocha ma ọ bụ ikpe omume, echiche, na àgwà mmadụ ikpe. E wezụga ụkpụrụ ndị dị otú ahụ, anyị apụghị ịmata n’ụzọ ziri ezi ọdịiche dị n’etiti ezi ihe na ihe ọjọọ.

Iwu ahụ e nyere banyere osisi ịma ezi ihe na ihe ọjọọ nyere Adam na Iv ohere ime nhọrọ—irube isi ma ọ bụ ịghara irube isi. Nye ha, omume ọma pụtara irube isi n’iwu ahụ. Ka oge na-aga, Jehova kpughekwuru ihe na-atọ ya ụtọ na ihe na-adịghị atọ ya ụtọ, o mekwara ka e dekọọrọ anyị nke a n’ime Bible. N’ihi ya, ịzụlite omume ọma na-agụnye anyị ikwekọ n’ụkpụrụ ezi omume nke Jehova e dekọrọ n’Akwụkwọ Nsọ.

Mara Ụkpụrụ Chineke nke Ọma

Ebe ọ bụ na Jehova Chineke esetịpụwo ụkpụrụ nke ezi ihe na ihe ọjọọ ma kpughee ha n’ime Bible, ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ịmara ha nke ọma? Pọl onyeozi dere, sị: “Ihe ọ bụla e deworo n’akwụkwọ nsọ bụ ihe si n’obi Chineke pụta, ọ bakwara uru iji zie ihe, na iji tụọ mmadụ mmehie ha n’anya, na iji mee ka uche mmadụ guzozie, na iji zụpụta nzụpụta nke dị n’ezi omume: ka onye nke Chineke wee zuo okè, onye e meworo ka o zuo okè ịrụ ezi ọrụ nile ọ bụla.”—2 Timoti 3:16, 17.

Dị ka ihe atụ, tụlee ka e si ghọtahie Kunihito, bụ́ onye a kpọtụrụ aha n’isiokwu bu ụzọ, mgbe ọ na-egosipụta obi umeala dị ka ọdịbendị ya si lee ya anya. Ilebatụkwu anya n’ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ mesịrị nyere ya aka inwe echiche ziri ezi karị. N’ezie, Bible na-agba ume ka a zụlite obi umeala, ọ na-adụkwa ọdụ megide inwebiga obi ike ókè na nganga. (Ilu 11:2; Maịka 6:8) Ma, mgbe Pọl onyeozi na-edepụta iru eru maka “ọnọdụ onye na-elekọta nzukọ Kraịst anya,” o kwuru banyere ‘ịgbaso’ ihe ùgwù ahụ. (1 Timoti 3:1) ‘Mgbaso’ a bụ nke a ga-eme ọ bụghị nanị n’etughị ọnụ ma ọ bụ n’adịghị nganga kamakwa n’ewedaghị onwe onye ala n’ụzọ na-enweghị isi.

Gịnị ka Bible na-ekwu banyere omume magburu onwe ya n’ógbè achụmnta ego? Iji ụzọ a na-enyo enyo ma ọ bụ wuruwuru eme ihe n’ihe banyere iwu nchịkwa gọọmenti na iwu ụtụ isi bụ ihe a na-emekarị taa n’ógbè achụmnta ego. Otú ọ dị, ihe ọ sọrọ ndị ọzọ ha mewe, ụkpụrụ Bible bụ ka anyị ‘na-ebi obi nke ọma n’ihe nile.’ (Ndị Hibru 13:18) N’ihi ya, anyị na-azụlite omume ọma site n’ịkwụwa aka ọtọ na ime ihe n’ụzọ ziri ezi mgbe anyị na-emeso ndị were anyị n’ọrụ, ndị anyị were n’ọrụ, ndị ahịa anyị, na gọọmenti ihe. (Deuterọnọmi 25:13-16; Ndị Rom 13:1; Taịtọs 2:9, 10) N’ezie, ịkwụwa aka ọtọ na-akwalite ntụkwasị obi na mmekọrịta dị mma. Ide nkwekọrịta ede na-egbochikarịkwa nghọtahie na mgbagwoju anya ndị a pụrụ inwe n’ihi “ihe ndapụta.”—Eklisiastis 9:11; Jemes 4:13, 14.

Okwu metụtara uwe na ejiji bụ ebe ọzọ ọ dị anyị mkpa ịzụlite omume ọma. Nhọrọ ndị e nwere maka uwe dịgasị iche na-adabere n’ọdịbendị, a pụkwara inwe nrụgide siri ike ịnọgide na-eyi ụdị uwe ọgbara ọhụrụ na ndị na-ewu ewu. Ma, olee ihe mere anyị ga-eji na-agbaso ụdị ejiji nile na-ewu ewu pụtaranụ? Bible na-adụ anyị ọdụ ‘ịghara ikwe ka e mee ka anyị yie ajọ oge a.’ (Ndị Rom 12:2) Kama inye iwu, Pọl onyeozi ji ike mmụọ nsọ dee, sị: “Ezubere m ka ndị inyom were ihe ịchọ mma kwesịrị ekwesị chọọ onwe ha mma, ya na nsọpụrụ na uche zuru okè; ọ bụghị isi a kpara akpa, na ọlaedo ma ọ bụ pearl ma ọ bụ uwe dị oké ọnụ ahịa; kama (nke kwesịrị ndị inyom na-ekwupụta egwu Chineke).” (1 Timoti 2:9, 10) Ụkpụrụ a bụ́ isi metụtara ma ndị ikom ma ndị inyom. N’ezie, e nwere ohere maka ụdị dịgasị iche mara mma nke ejiji n’ihi nhọrọ dabeere n’ọdịnala ma ọ bụ nhọrọ onwe onye.

Bible na-egosipụtakwa omume rụrụ arụ ndị Chineke katọrọ n’ụzọ doro anya. Ná 1 Ndị Kọrint 6:9, 10, anyị na-agụ ịdọ aka ná ntị bụ́: “Ma ọ bụ ùnu amataghị na ndị ajọ omume agaghị eketa alaeze Chineke? Unu ekwela ka e duhie unu: ndị na-akwa iko, ma ọ bụ ndị na-ekpere arụsị, ma ọ bụ ndị ikom na-akwa iko, bụ́ ndị  nwere nwunye, ma ọ bụ ndị ikom na-eme dị ka ndị inyom, ma ọ bụ ndị ikom na-emerụ onwe ha n’ahụ ndị ikom, ma ọ bụ ndị ohi, ma ọ bụ ndị anyaukwu, ma ọ bụ ndị na-aṅụbiga mmanya ókè, ma ọ bụ ndị nkwutọ, ma ọ bụ ndị na-apụnara mmadụ ihe, ha agaghị eketa alaeze Chineke.” Akụkụ Akwụkwọ Nsọ a nyeere Maria, bụ́ onye a kpọtụrụ aha na mbụ, aka, ịhụ na dị ka ụkpụrụ omume magburu onwe ya nke Onye Okike setịpụrụ si dị, ihe ya na Juan mere dị njọ nakwa na ọ ghaghị ịkwụsị ya ma ọ bụrụ na ọ ga-enweta nnwapụta Chineke. N’ụzọ doro anya, iji zụlite omume ọma, ọ dị anyị mkpa ịmara ụkpụrụ Jehova nke ọma.

Jiri Obi Mụta Ya

Omume ọma abụghị nanị izere ihe ọjọọ. Ọ na-akwali mmadụ ime ezi ihe. Onye na-eme omume ọma nwere àgwà ịdị mma. “Ọ dị mkpa,” ka otu prọfesọ na-ekwu, “iji obi na ọgụgụ isi mụta omume ọma.” Ya mere, ịzụlite omume ọma na-agụnye ihe karịrị ịmara Okwu Chineke nke ọma. Ọ na-achọ ịtụgharị uche n’ihe e dere na ya ka obi anyị wee jupụta n’ekele maka Jehova, a kwaliekwa anyị itinye ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ n’ọrụ ná ndụ anyị.

“Lee ka m si hụ iwu Gị n’anya!” ka ọbụ abụ ahụ kwupụtara. “Ogologo ụbọchị nile ka nke ahụ bụ ihe m na-atụgharị n’uche.” (Abụ Ọma 119:97) Eze Devid dekwara, sị: “Echetawo m ụbọchị nile nke mgbe ochie; atụgharịwo m uche n’omume Gị [Chineke] nile: n’ọrụ aka Gị abụọ ka m tụgharịworo obi.” (Abụ Ọma 143:5) Anyị onwe anyị kwa kwesịrị ime ka iji ekpere na-atụgharị uche bụrụ akụkụ dị oké mkpa nke ọmụmụ anyị na-amụ Bible na akwụkwọ ndị dabeere na Bible.

N’eziokwu, iwepụta oge maka iji ịdị uchu na-amụ ihe, tinyere ntụgharị uche pụrụ ịbụ ihe ịma aka. Ma ịgbaso omume ọma na-achọ ka anyị si n’ihe omume ndị ọzọ na-azụchapụtara ya oge. (Ndị Efesọs 5:15, 16) Aaron, bụ́ onye dị afọ 24, na-azụchapụta oge dị otú ahụ kwa ụbọchị site n’ibili n’ụra minit 30 tupu oge o jibu ebili. Ọ na-akọ, sị: “Na mbụ, ana m eji ọkara awa ahụ dum gụọ Bible. Ọ bụ nanị na nso nso a ka m bịara ghọta mkpa ntụgharị uche dị. Ya mere, ugbu a ana m eji ihe dị ka ọkara oge ahụ atụgharị uche n’ihe m ka gụpụrụ. Nke a abụrụwo ihe na-akwụghachi ụgwọ n’ezie.” A pụrụ ịtụgharị uche n’oge ndị ọzọ. N’abụ ọ bụkuru Jehova, Devid bụrụ, sị: “N’ime nche abalị nile ka m na-atụgharị uche m na Gị.” (Abụ Ọma 63:6) Bible na-akọkwa, sị: “Aịsak wee pụọ ịtụgharị uche ya n’ọhịa na mgbe anyasị.”—Jenesis 24:63.

Ntụgharị uche bara oké uru n’ịzụlite omume ọma, n’ihi na ọ na-enyere anyị aka inwe mmetụta otú Jehova si enwe nakwa ime ka echiche anyị na ya kwekọọ. Dị ka ihe atụ, Maria maara na Chineke machibidoro ịkwa iko iwu. Ma iji ‘kpọọ ajọ ihe asị ma rapara ezi ihe n’ahụ,’ ọ dị ya mkpa ịtụgharị uche n’akụkụ ihe odide Bible ndị bụ́ isi. (Ndị Rom 12:9) E nyeere ya aka ịhụ mkpa ọ dị ime mgbanwe mgbe ọ gụsịrị Ndị Kọlọsi 3:5, bụ́ nke na-agba anyị ume ‘ime ka ihe nile dị anyị n’ahụ nke dị n’elu ụwa nwụọ; ịkwa iko, adịghị ọcha, ọchịchọ ọjọọ, agụụ ihe ọjọọ, na anyaukwu.’ Maria jụrụ onwe ya, sị: ‘Olee ụdị ọchịchọ ọjọọ m na-aghaghị ime ka ọ nwụọ? Gịnị ka m kwesịrị izere bụ́ nke pụrụ ịkpali ọchịchọ ndị na-adịghị  ọcha? Ọ̀ dị mgbanwe ndị ọ dị m mkpa ime n’ụzọ m si emeso ndị na-abụghị ụmụ nwanyị ibe m ihe?’

Ntụgharị uche na-agụnye ịtụle ihe ga-esi n’omume pụta. Pọl na-agba ndị Kraịst ume ịhapụ ịkwa iko na inwe njide onwe onye ka “onye ọ bụla ghara ịghọgbu na irigbu nwanna ya.” (1 Ndị Tesalọnaịka 4:3-7) Ezigbo ajụjụ ndị e kwesịrị ịtụle bụ: ‘Ọdachi dị aṅaa ka m ga-akpatara onwe m, ezinụlọ m, ma ọ bụ ndị ọzọ site n’ime ihe a? Ọ̀ ga-esi aṅaa emetụta m n’ụzọ ime mmụọ, n’ụzọ mmetụta uche, nakwa n’ụzọ anụ ahụ? Olee otú ihe siworo gaara ndị ọzọ bụ́ ndị mebiri iwu Chineke n’oge ndị gara aga?’ Ntụgharị uche dị otú ahụ mere ka obi sikwuo Maria ike, ọ pụkwara ime otú ahụ n’ebe anyị nọ.

Mụta Ihe Site n’Aka Ndị Nlereanya

À pụrụ ịkụzi omume ọma n’ọnụ ụlọ klas? Nke a bụ ajụjụ gbagwojuworo ndị na-eche echiche anya ruo ọtụtụ narị afọ iri. A kpaliri onye ọkà ihe ọmụma Gris bụ́ Plato iche na a pụrụ. N’aka nke ọzọ, Aristotle chere na a na-azụlite omume ọma site n’ime ya eme. Otu onye odeakụkọ chịkọtara arụmarụ ahụ a rụrụ n’okwu a n’ụzọ dị otú a: “Ná nkenke, a pụghị ịmụta nanị ụkpụrụ nke omume ọma. A pụghịkwa isi n’akwụkwọ ọgụgụ kụzie ya. A na-amalite ịkpa ezi àgwà site n’ibi n’ógbè . . . ebe a na-agba ume ime omume ọma ma na-enye ụgwọ ọrụ maka ya.” Ma, ebee ka anyị ga-achọta ndị na-eme omume ọma n’ezie? Ọ bụ ezie na ọtụtụ ọdịbendị na-enye ihe atụ ụfọdụ nke omume ọma, ma ọ́ dịghị ihe ọzọ ná ndị dike ha na-akọ n’akụkọ ọdịbendị nakwa n’akụkọ ifo ha, Bible nwere ọtụtụ ihe atụ, ndị bụ́kwa eziokwu.

Onye kasị pụta ìhè n’ime omume ọma bụ Jehova. Ọ na-eme ihe mgbe nile n’ụzọ dị mma ma na-eme ezi omume na ihe ziri ezi. Anyị pụrụ ịzụlite omume ọma site n’ịghọ “ndị na-eṅomi Chineke.” (Ndị Efesọs 5:1) Ọkpara Chineke, bụ́ Jisọs Kraịst, ‘hapụkwaara anyị ihe ilereanya, ka anyị wee soo ijeụkwụ Ya nile.’ (1 Pita 2:21) Ọzọkwa, Bible nwere ihe ndekọ banyere ọtụtụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi, dị ka Abraham, Sera, Josef, Rut, Job, nakwa Daniel na ndị enyi ya atọ bụ́ ndị Hibru. E kwesịghị ileghara ndị nlereanya nke omume ọma n’etiti ndị ohu Jehova nke oge a anya.

Anyị Pụrụ Inwe Ihe Ịga nke Ọma

Ànyị pụrụ inwe ihe ịga nke ọma n’ezie n’ime ihe dị mma n’anya Chineke? N’ịbụ ndị ketaworo ezughị okè, mgbe ụfọdụ agha kpụ ọkụ n’ọnụ pụrụ ịdị n’etiti uche na anụ ahụ anyị—n’etiti ịchọ ime ihe dị mma na ịgbaso ọchịchọ ime mmehie anyị. (Ndị Rom 5:12; 7:13-23) Ma anyị pụrụ imeri n’agha ahụ site n’enyemaka Chineke. (Ndị Rom 7:24, 25) Jehova ewepụtawo Okwu ya na mbipụta ndị dabeere na Bible. Site n’iji ịdị uchu na-amụ Akwụkwọ Nsọ na iji ekpere na-atụgharị uche na ya, anyị pụrụ ịghọ ndị dị ọcha n’obi. Echiche, okwu, na omume ndị dị mma pụrụ isi n’obi ọcha dị otú ahụ pụta. (Luk 6:45) N’ịdabere n’ihe nlereanya nke Jehova Chineke na Jisọs Kraịst, anyị pụrụ ịzụlite àgwà nsọpụrụ Chineke. Anyị pụkwara n’ezie ịmụta ihe dị ukwuu site n’aka ndị ji ikwesị ntụkwasị obi na-ejere Chineke ozi taa.

Pọl onyeozi gbara ndị na-agụ akwụkwọ ya ume ka ha ‘na-agụkọ’ omume ọma na ihe ndị ọzọ kwesịrị otuto. Ime nke a bụ ihe e ji n’aka na ọ ga-eweta ngọzi Chineke. (Ndị Filipaị 4:8, 9) Site n’enyemaka Jehova, anyị pụrụ inwe ihe ịga nke ọma n’ịzụlite omume ọma.

[Foto dị na peeji nke 6]

Mee ka ntụgharị uche bụrụ akụkụ nke ọmụmụ Bible gị

[Foto dị na peeji nke 7]

Zụlite àgwà nsọpụrụ Chineke site n’ịṅomi Kraịst Jisọs