Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Were Ọchịchọ Obi Na-ejere Chineke Ozi

Were Ọchịchọ Obi Na-ejere Chineke Ozi

 Were Ọchịchọ Obi Na-ejere Chineke Ozi

“M GA-EWERE obi ụtọ nile mefuo ihe m nwere kwekwa ka e mefusịa mụ onwe m n’ihi mkpụrụ obi unu,” ka Pọl onyeozi dere. (2 Ndị Kọrint 12:15) Gịnị ka e ji okwu ndị a na-agwa gị banyere echiche na àgwà nke ndị ohu Jehova kwesịrị itinye mgbalị ịzụlite? Dị ka otu ọkà mmụta Bible kwuru, mgbe Pọl degaara ndị Kraịst nọ na Kọrint okwu ndị ahụ, ọ na-ekwu, sị: “Adị m njikere itinye ume m, oge m, na ndụ m, na ihe nile m nwere maka ọdịmma unu, dị ka nna na-eji obi ụtọ emere ụmụ ya.” Pọl dị njikere ‘ka e mefusịa ya,’ ma ọ bụ “ịbụ onye ike gwụkasịrị ahụ,” ma ọ bụrụ na nke ahụ bụ ihe ọ ga-ewe iji jezuo ozi ya dị ka onye Kraịst.

Ọzọkwa, Pọl ji “obi ụtọ nile” mee ihe a dum. Ọ dị “njikere n’ụzọ zuru ezu” ime otú ahụ, ka The Jerusalem Bible na-ekwu. Gịnị banyere gị? Ị̀ dị njikere iji oge gị, ume gị, ikike gị, na ihe onwunwe gị mee ihe n’ijere Jehova Chineke ozi nakwa maka ọdịmma nke ndị ọzọ, ọ bụrụgodị na ime otú ahụ pụtara “ịbụ onye ike gwụkasịrị ahụ” mgbe ụfọdụ? Ị̀ ga-ejikwa “obi ụtọ nile” mee nke a?

Ha Na-ajụ Ije Ozi Ma Ọlị

Ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ abụghị nanị na ha na-ala azụ ijere Chineke ozi kama ha na-ajụwapụ isi ime otú ahụ. Mmụọ ha nwere bụ nke enweghị ekele, nnwere onwe maka ọdịmma onwe onye nanị, ọbụna nke nnupụisi. Setan rabanyere Adam na Iv n’iche ụdị echiche ahụ. O kwuru n’ụzọ na-ezighị ezi na ha ‘ga-adị ka Chineke, na-ama ezi ihe na ihe ọjọọ’—nwee ike ikpebiri onwe ha ihe bụ ezi ihe na ihe ọjọọ. (Jenesis 3:1-5) Ndị nwere ụdị mmụọ ahụ taa na-eche na ha kwesịrị inwe nnwere onwe zuru ezu ime kpọmkwem ihe gụrụ ha agụụ n’enweghị ibu ọrụ ọ bụla n’ebe Chineke nọ ma ọ bụ ihe mgbochi si n’aka ya. (Abụ Ọma 81:11, 12) Ha na-achọ iji ihe nile ha nwere eme ihe ná nchụso nke ọdịmma onwe ha.—Ilu 18:1.

Ikekwe, i nweghị ụdị echiche a gabigara ókè. Ma eleghị anya i nwere ezi ekele maka onyinye nke ndụ ị dị ugbu a na maka ọbụna atụmanya dị ebube karị nke ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa paradaịs. (Abụ Ọma 37:10, 11; Mkpughe 21:1-4) Ọ pụrụ ịbụ na i nwere ekele miri emi nye Jehova maka ịdị mma ya n’ebe ị nọ. Ma ọ dị anyị nile mkpa ịmụrụ anya maka ihe ize ndụ bụ́ na Setan pụrụ ịgbagọ echiche anyị nke na ozi anyị pụrụ ịghọ n’ezie ihe Chineke na-adịghị anabata. (2 Ndị Kọrint 11:3) Olee otú nke a pụrụ isi mee?

A Chọrọ Ozi E ji Ọchịchọ Obi Na-eje

Jehova chọrọ ozi sitere n’ọchịchọ obi, nke e ji obi dum na-eje. Ọ dịghị mgbe ọ bụla ọ na-amanye anyị ime ihe ọ na-achọ. Ọ bụ Setan bụ onye ga-eme ihe ọ bụla iji rụgide ma ọ bụ rabanye ndị mmadụ n’ime ihe ọ na-achọ. N’ihe gbasara ijere Chineke ozi, Bible kwuru okwu banyere ibu ọrụ, ihe e nyere n’iwu, ihe ndị a chọrọ, na ihe ndị ọzọ. (Eklisiastis 12:13; Luk 1:6) Ma, ebumnobi bụ́ isi anyị ji na-ejere Chineke ozi bụ na anyị hụrụ ya n’anya.—Ọpụpụ 35:21; Deuterọnọmi 11:1.

N’agbanyeghị otú Pọl tinyeruru onwe ya n’ozi  Chineke, ọ maara na nke a agaghị aba uru ọ bụla ‘ma ọ bụrụ na o nweghị ịhụnanya.’ (1 Ndị Kọrint 13:1-3) Mgbe ndị dere Bible zoro aka n’ebe ndị Kraịst nọ dị ka ndị ohu Chineke, ha adịghị ezo aka n’ajọ ịgba ohu dabeere ná mmanye. (Ndị Rom 12:11; Ndị Kọlọsi 3:24) Ihe e bu n’uche bụ ido onwe onye n’okpuru nke sitere n’ọchịchọ obi, na-adabere n’ịhụnanya miri emi, nke si n’obi, maka Chineke na Ọkpara ya, bụ́ Jisọs Kraịst.—Matiu 22:37; 2 Ndị Kọrint 5:14; 1 Jọn 4:10, 11.

Ozi anyị na-ejere Chineke aghaghịkwa igosipụta ịhụnanya miri emi maka ndị mmadụ. “Anyị ghọrọ ndị dị nwayọọ n’etiti unu, dị ka mgbe nwanyị nke na-azụ nwa na-elezi ụmụ nke aka ya anya nke ọma,” ka Pọl degaara ọgbakọ dị na Tesalọnaịka. (1 Ndị Tesalọnaịka 2:7) N’ọtụtụ ala taa, ndị nne nwere ibu ọrụ iwu kwuru nke ilekọta ụmụ ha. Ma n’ezie, ihe ka ọtụtụ ná ndị nne adịghị eme nke a nanị iji rubere iwu isi, ka hà na-eme? Ee e. Ha na-eme ya n’ihi na ha ji ụmụ ha kpọrọ ihe. Leenụ, nne nke na-azụ nwa na-eji obi ụtọ achụ àjà dị ukwuu n’ihi ụmụ ya! N’ihi na Pọl nwere “mmetụta ịhụnanya” dị otú ahụ maka ndị o jeere ozi, ‘ọ dị ya ezi mma’ (“dị njikere,” King James Version; “nwere obi ụtọ,” New International Version) iji ndụ ya kpọmkwem nyere ha aka. (1 Ndị Tesalọnaịka 2:8, NW) Ịhụnanya na-akwali anyị iṅomi ihe nlereanya Pọl.—Matiu 22:39.

Gịnị Banyere Ozi nke Na-esighị n’Obi?

N’ezie, anyị agaghị ekwe ka ịhụnanya anyị nwere maka onwe anyị karịa ịhụnanya anyị nwere maka Chineke na ndị mmadụ. Ma ọ bụghị ya, e nwere ihe ize ndụ n’ezie na anyị pụrụ nanị ịdị na-eje ozi na-esighị anyị n’obi, n’ejighị obi anyị dum. Anyị pụrụ ọbụna ịmalite na-enwetụ obi ilu, na-ewe iwe na anyị enweghị ike ibi ndụ anyị kpọmkwem dị ka anyị si chọọ. Nke a mere ụfọdụ ndị Israel, bụ́ ndị na-enweghịzi ịhụnanya maka Chineke ma ka na-ejere ya ozi ụfọdụ n’ihi na ọ bụ ọrụ dịịrị ha. Gịnị si n’ime ya pụta? Ijere Chineke ozi ghọọrọ ha “oké ike ọgwụgwụ.”—Malakaị 1:13.

Onyinye ọ bụla e nyere Chineke kwesịrị mgbe nile ịbụ nke “zuru okè,” nke na-enweghị ntụpọ, nke “kasị mma” e nwere. (Levitikọs 22:17-20; Ọpụpụ 23:19, NW) Otú ọ dị, kama inye Jehova nke kasị mma n’ime anụmanụ ha, ndị nọ n’oge Malakaị malitere iweta ndị na-adịghị ha onwe ha mma n’ezie. Olee otú Jehova si meghachi omume? Ọ gwara ndị nchụàjà, sị: “Mgbe unu na-eweta anụ kpuru ìsì nso [unu na-asị], ihe ọjọọ adịghị ya! Mgbe unu na-eweta nso nke gwọrọ ngwụrọ na nke na-arịa ọrịa, ihe ọjọọ adịghị ya! Biko, weta ya nso onye na-achị ala gị; ihe gị [ọ̀] ga-atọ ya ụtọ? Ma ọ bụ ọ̀ ga-ahụ gị ihu ọma? . . . Unu ewebatawokwa ihe a napụrụ n’ike, na ihe gwọrọ ngwụrọ, na ihe na-arịa ọrịa; otú a ka unu webataworo onyinye ịnata ihu ọma: M̀ ga-anara nke a nke ọma n’aka unu?”—Malakaị 1:8, 13.

Olee otú nke a pụrụ isi mee onye ọ bụla n’ime anyị? Àjà ndị anyị na-achụ pụrụ ịghọrọ anyị “oké ike ọgwụgwụ” ma ọ bụrụ na anyị enweghị ọchịchọ obi na mkpali n’ezie. (Ọpụpụ 35:5, 21, 22; Levitikọs 1:3; Abụ Ọma 54:6; Ndị Hibru 13:15, 16) Dị ka ihe atụ, ọ̀ bụ ihe fọdụrụ n’oge anyị ka anyị na-enye Jehova?

Ọ̀ dị onye ọ bụla pụrụ iche nnọọ na ọ gaara abụ ihe Chineke na-anabata ma ọ bụrụ na onye òtù ezinụlọ nke nwere ezi ebumnobi ma ọ bụ onye Livaị na-anụ ọkụ n’obi, n’ụzọ ụfọdụ, amanye onye Israel nke na-enweghị ọchịchọ obi ka ọ họpụta anụmanụ ya nke kasị mma iji chụọ àjà mgbe ọ na-achọghị iwepụta ya n’ezie? (Aịsaịa 29:13; Matiu 15:7, 8) Jehova jụrụ àjà ndị dị otú ahụ, mesịakwa jụ ndị ahụ chụrụ ha.—Hosea 4:6; Matiu 21:43.

Ka Ime Ihe Chineke Na-achọ Na-atọ Gị Ụtọ

Iji jeere Chineke ozi ọ ga-anabata, anyị aghaghị ịgbaso ihe nlereanya Jisọs Kraịst. O kwuru, sị: “Etughị m ihe Mụ onwe m na-achọ, kama ihe Onye zitere m na-achọ.” (Jọn 5:30) Jisọs nwetara obi ụtọ dị ukwuu site n’iji ọchịchọ obi na-ejere Chineke ozi. Jisọs mezuru okwu amụma Devid, bụ́: “Ime ihe dị Gị ụtọ atọwo m ụtọ, Chineke.”—Abụ Ọma 40:8.

N’agbanyeghị na ime ihe Jehova na-achọ tọrọ Jisọs ụtọ, nke a adịghịrị ya mfe mgbe nile. Tụlee ihe mere ntakịrị oge tupu e jide ya, kpee ya ikpe, ma gbuo ya. Mgbe ọ nọ n’ogige Getsemane, Jisọs nwere ‘mwute dị ukwuu,’ o ‘gbukwara ya mgbu n’obi hie nne.’ Nrụgide mmetụta uche ahụ siri ike nke ukwuu nke na  mgbe ọ na-ekpe ekpere, “ọsụsọ Ya wee ghọọ ihe dị ka oké ọkpụrụkpụ ọbara na-ada n’ala.”—Matiu 26:38; Luk 22:44.

N’ihi gịnị ka Jisọs ji nwee oké ihe mgbu dị otú ahụ? N’ezie ọ bụghị n’ihi ọdịmma onwe onye ma ọ bụ enweghị ọchịchọ obi ọ bụla ime ihe Chineke na-achọ. Ọ dị njikere ịnwụ, ọbụna na-emeghachi omume n’ụzọ siri ike n’ihe ahụ Pita kwuru, bụ́: “Meere [onwe] Gị ebere, Onyenwe anyị: ihe a agaghị adịrị Gị ma ọlị.” (Matiu 16:21-23) Ihe na-echegbu Jisọs bụ otú ọnwụ ya dị ka omempụ a na-asọ oyi ga-esi emetụta Jehova na aha nsọ Ya. Jisọs matara na ọ ga-ewute Nna ya nke ukwuu ịhụ ka a na-emeso Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya ihe n’ụzọ obi ịta mmiri dị otú ahụ.

Jisọs ghọtakwara na ya na-abịaru nso n’oge dị oké mkpa ná mmezu nke nzube Jehova. Iji ikwesị ntụkwasị obi rapagidesie ike n’iwu nile nke Chineke ga-egosipụta n’ụzọ na-enweghị mgbagha na Adam pụrụ imewo otu nhọrọ ahụ. Ikwesị ntụkwasị obi nke Jisọs ga-ekpughe na nzọrọ ahụ Setan mere nke bụ́ na ụmụ mmadụ agaghị eji ọchịchọ obi na ikwesị ntụkwasị obi jeere Chineke ozi ma ha nọrọ n’ule bụ ụgha n’ụzọ nile. Site n’aka Jisọs, Jehova ga-emesịa gwepịa Setan ma wepụ mmetụta nile nke nnupụisi ya.—Jenesis 3:15.

Lee nnukwute ibu ọrụ dịkwasịrị n’ubu Jisọs! Aha Nna ya, udo nke eluigwe na ụwa, na nzọpụta nke ezinụlọ ụmụ mmadụ ha nile dabeere n’ikwesị ntụkwasị obi Jisọs. N’ịghọta nke a, o kpere ekpere, sị: “Nna m, ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee, ka iko a gabiga m: ma ọ bụghị dị ka Mụ onwe m na-achọ, kama dị ka Gị onwe gị na-achọ.” (Matiu 26:39) Ọbụna mgbe ọ nọ ná nrụgide kasị taa akpụ, Jisọs adaghị mbà ná njikere ọ dị ido onwe ya n’okpuru uche Nna ya.

‘Mmụọ nke Mmadụ Dị Ọkụ, Ma Anụ Ahụ Adịghị Ike’

Ebe Jisọs nwere oké nrụgide mmetụta uche mgbe ọ na-ejere Jehova ozi, anyị pụrụ ịtụ anya na Setan ga-arụgide anyị dị ka ndị ohu Chineke. (Jọn 15:20; 1 Pita 5:8) Ọzọkwa, anyị ezughị ókè. Ya mere, ọ bụrụgodị na anyị weere ọchịchọ obi na-ejere Chineke ozi, ọ gaghị adịrị anyị mfe ime otú ahụ. Jisọs hụrụ otú ndị na-eso ụzọ ya si na-adọlị iji mee ihe nile ọ gwara ha mee. Ọ bụ ya mere o ji kwuo, sị: “Mmụọ nke mmadụ dị ọkụ n’ezie, ma anụ ahụ adịghị ike.” (Matiu 26:41) E nweghị adịghị ike ọ bụla e ketara eketa di n’anụ ahụ mmadụ ya zuru okè. Otú ọ dị, o bu n’uche adịghị ike anụ ahụ nke ndị na-eso ụzọ ya, ezughị okè ha ketaworo site n’aka Adam na-ezughị okè. Jisọs maara na n’ihi ezughị okè e ketara eketa na adịghị ike nke mmadụ si na ya pụta, ha ga na-agba mgba siri ike iji mee ihe nile ha chọrọ ime n’ozi Jehova.

Ya mere, anyị pụziri inwe mmetụta dị ka Pọl onyeozi, bụ́ onye nwere oké obi erughị ala mgbe ezughị okè gbochiri ikike ya n’ijere Chineke ozi n’ụzọ zuru ezu. Pọl dere, sị: “Ịchọ ihe ọma dị nso n’ebe aka m ga-eru, ma ịrụta ihe ọma adịghị nso n’ebe aka m ga-eru.” (Ndị Rom 7:18) Anyị onwe anyị na-achọpụtakwa na anyị apụghị imezu ihe ọma nile anyị na-achọ ime. (Ndị Rom 7:19) Nke a abụghị n’ihi enweghị ọchịchọ ọ bụla n’akụkụ nke anyị. Ọ bụ nanị n’ihi na adịghị ike anụ ahụ na-egbochi ọbụna mgbalị anyị ndị kasị mma.

Ka obi ghara ikoropụ anyị. Ọ bụrụ na anyị dị njikere site n’obi anyị ime ihe nile anyị pụrụ ime, n’ezie, Chineke ga-anabata ozi anyị. (2 Ndị Kọrint 8:12) Ka anyị “na-anụ ọkụ n’obi” iṅomi mmụọ Kraịst nke ido onwe ya n’okpuru uche Chineke n’ụzọ zuru ezu. (2 Timoti 2:15; Ndị Filipaị 2:5-7; 1 Pita 4:1, 2) Jehova ga-akwụghachi ọchịchọ obi dị otú ahụ ụgwọ ma kwado ya. Ọ ga-enye anyị “ọkịka nke ike” iji nye aka maka adịghị ike anyị nile. (2 Ndị Kọrint 4:7-10) Dị ka Pọl, site n’enyemaka Jehova, anyị ‘ga-ewere obi ụtọ nile mefuo ihe anyị nwere, kwekwa ka e mefusịa anyị ‘ n’ozi Ya dị oké ọnụ ahịa.

[Foto dị na peeji nke 21]

Pọl ji ọchịchọ obi jeere Chineke ozi dị ka ike ya si dị

[Foto dị na peeji nke 23]

Ọbụna mgbe ọ nọ ná nrụgide kasị taa akpụ, Jisọs mere ihe Nna ya na-achọ