Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

N’ihi Gịnị Ka I Kwesịrị Iji Na-ekpe Ekpere?

N’ihi Gịnị Ka I Kwesịrị Iji Na-ekpe Ekpere?

 N’ihi Gịnị Ka I Kwesịrị Iji Na-ekpe Ekpere?

“UNU na-arịọ arịrịọ, ma unu adịghị anata ihe, n’ihi na unu na-arịọ n’obi ọjọọ . . . Bịaruonụ Chineke nso, Ọ ga-abịarukwa unu nso.” (Jemes 4:3, 8) Okwu ndị ahụ onye na-eso ụzọ Jisọs bụ́ Jemes kwuru pụrụ ịkpali anyị nnọọ ịtụle ihe ndị mere anyị ji ekpe ekpere.

Ekpere abụghị nanị ụzọ isi gwa Chineke ihe ndị dị anyị mkpa. Jisọs kwuru n’Ozizi Elu Ugwu ya a ma ama, sị: “Nna unu matara ihe nile dị unu mkpa, mgbe unu aka-arịọghị Ya.” Ma, Jisọs kwukwara, sị: “Rịọnụ, a ga-enyekwa unu.” (Matiu 6:8; 7:7) Ya mere, Jehova na-achọ ka anyị na-agwa ya ihe anyị chere na ọ dị anyị mkpa. Ma ekpere gụnyere ihe karịrị nke ahụ.

Ezi ndị enyi adịghị ekwurịta okwu nanị mgbe ihe dị ha mkpa. Ha na-enwe mmasị n’ebe ibe ha nọ, ọbụbụenyi ha na-etokwa mgbe ha na-ekwupụta mmetụta ha. N’otu aka ahụ, ekpere nwere nzube karịrị nanị ịrịọ maka ihe ndị na-akpa anyị. Ọ na-enye anyị ohere ime ka mmekọrịta anyị na Jehova sikwuo ike site n’ikwupụta nrara anyị ji obi anyị dum rara onwe anyị nye ya.

Ee, Chineke enyewo anyị ihe ùgwù nke ikpe ekpere ka anyị wee nwee ike ịbịaru ya nso. Nke a pụrụ ime nanị ma ọ bụrụ na anyị ana-agwa Chineke mmetụta anyị kama ịdị na-ekpe ekpere anyị bu n’isi. Lee ihe dị ụtọ ọ bụ ịgwa  Jehova okwu n’ekpere! Ọzọkwa, otu Ilu Bible na-ekwu, sị: “Ekpere ndị ziri ezi bụ ihe na-atọ Ya ụtọ.”—Ilu 15:8.

“Mụ onwe m, ịbịaru Chineke nso dị m mma,” ka ọbụ abụ bụ́ Esaf bụrụ. (Abụ Ọma 73:28) Ma, iji bịaruo Chineke nso, anyị aghaghị ime ihe ndị ọzọ na-abụghị nanị ikpe ekpere. Rịba ama otú ihe ndekọ na-esonụ si egosi nke a:

“Otu n’ime ndị na-eso ụzọ [Jisọs] sị Ya, Onyenwe anyị, zi anyị ikpe ekpere.” Ná nzaghachi, Jisọs kwuru, sị: “Mgbe ọ bụla unu na-ekpe ekpere, sịnụ, Nna, Ka e doo aha Gị nsọ. Ka alaeze Gị bịa.” (Luk 11:1, 2) Ànyị pụrụ ikpe ekpere n’ụzọ nwere nzube otú a n’ebughị ụzọ mara ihe bụ́ aha Chineke na otú a ga-esi edo ya nsọ? Ànyị pụkwara ikpe ekpere n’ụzọ kwekọrọ n’okwu Jisọs ndị a ma ọ bụrụ na anyị aghọtaghị ihe Alaeze Chineke bụ? Anyị pụrụ ịghọta ihe ndị a ma ọ bụrụ na anyị ejiri nlezianya nyochaa Bible. Ihe ọmụma anyị nwetara n’ụzọ dị otú a ga-enyere anyị aka ịmara Chineke na ịghọta ụzọ ya. Ọzọkwa, ịmara Jehova Chineke ga-eme ka anyị bịarukwuo ya nso ma rarakwuo onwe anyị nye ya. N’aka nke ya, nke a ga-enyere anyị aka ịgwa ya okwu n’ekpere n’enweghị ihe mgbochi.

Ekpere Pụrụ Idozi Nsogbu

Iwulite mmekọrịta chiri anya n’ebe Jehova nọ ga-enyere anyị aka idozi nsogbu dị iche iche. Rịba ama otú nke a si bụrụ eziokwu na nke ọ bụla n’ime ọnọdụ ndị na-esonụ. Ha na-egosi na ndị ahụ kpere ekpere wusikwuru mmekọrịta ha na Jehova ike.

Na Brazil, otu nwanyị aha ya bụ Maria kpekuru Chineke ekpere maka enyemaka. Ọ chọwo inupụ isi megide ụkpụrụ omume ndị a nakweere n’obodo ya, otu ihe kpatara ya bụ n’ihi ihu abụọ ọ hụrụ n’etiti ọha mmadụ. Maria ahapụlarị di ya, ụmụ ya, na ebe obibi ya. Ọ malitekwara iji ọgwụ ọjọọ eme ihe. Ma mgbe ọ na-achọtalighị obi ụtọ, ọ gwara Chineke ihe nile dị ya n’obi ma kpekuo ya ekpere maka enyemaka.

N’oge na-adịghị anya, mmadụ abụọ n’ime Ndịàmà Jehova kpọtụụrụ Maria ma hapụrụ ya otu mbipụta Ụlọ Nche nke bu isiokwu na-ekwu banyere abamuru nke ịnakwere nduzi Chineke. O metụrụ ya n’obi, ọ malitekwara iso Ndịàmà amụ Bible n’ụbọchị ahụ kpọmkwem. Nke a mesịrị mee ka ya na ezinụlọ ya birighachi. Ka ọ na-amụta banyere Jehova, ọ chọrọ igosipuṭa ịhụnanya o nwere n’ebe ọ nọ. “Emere m mgbanwe ndị meziwanyere ndụ m,” ka Maria kwuru. “Na mbụ, di m na ezinụlọ m megidere ọmụmụ m na-amụ Bible. Ma ka ha hụrụ mgbanwe ndị m nọ na-eme, ha malitere ịgba m ume.” Mgbe e mesịrị, Maria raara ndụ ya nye Onye Na-anụ ekpere iji jeere ya ozi.

N’agbanyeghị na José nwere nwunye mara mma na achụmnta ego na-aga nke ọma na Bolivia, o nweghị obi ụtọ. Mmekọahụ o so nwanyị ọzọ nwee mere ka nwunye ya hapụ ya. Ọ na-aṅụbiga mmanya ókè ma na-enwe mmetụta nke ịbụ onye na-abaghị n’ihe. José na-ekwu, sị: “Amalitere m iji obi m nile ekpe ekpere, na-ajụ ihe m kwesịrị ime iji mee ka obi dị Chineke ụtọ. N’oge na-adịghị anya, Ndịàmà Jehova letara ụlọ ọrụ m na-ekwu ka ha duziere m ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu, ma agwara m ha ka ha laa. Nke a mere ugboro atọ. Mgbe ọ bụla m kpere ekpere maka enyemaka, ha abịa. N’ikpeazụ, ekpebiri m na m ga-ege ha ntị mgbe ọ bụla ha bịara ọzọ. Agụchapụla m Bible ma nwee ọtụtụ ajụjụ, ma ha na-enyekarị m azịza ndị na-eju m afọ. Ịmụta banyere Jehova mere ka m nwee nzube ọhụrụ ná ndụ, ndị enyi m nwetara n’etiti Ndịàmà bụkwa nnọọ ndị nlereanya na-enye agbamume! Ahapụrụ m enyi m nwanyị na ndị mụ na ha na-aṅụkọ mmanya. N’oge na-adịghị anya, alaghachikwuuru m nwunye m na ụmụ m. E mere m baptism ná mmalite 1999.”

N’Itali, alụmdi na nwunye Tamara nwere nsogbu, ya mere, o kpere ekpere maka amamihe. Ọ zụlitewo àgwà ịchọ okwu, n’ihi ịbụ onye a kụrụ ihe ma chụpụ n’ụlọ mgbe ọ dị afọ 14. Tamara na-ekwu, sị: “Achọtara m Bible ma malite ịgụ ya. Otu abalị, agụtara m na ‘ịchọta amamihe dị ka ịchọta akụ̀ zoro ezo.’ Ekpere m ekpere maka amamihe ahụ. (Ilu 2:1-6) N’ụtụtụ echi ya, Ndịàmà Jehova bịara. Amalitere m iso ha amụ Bible, ma o wetụrụ m oge iji tinye ihe  ndị m na-amụta n’ọrụ. N’ikpeazụ, ekpebiri m ịgbaso ụzọ ndụ ndị Kraịst, e mekwara m baptism. Ugbu a, eso m di m na-enyere ndị ọzọ aka irite uru n’amamihe Chineke.”

Beatriz bụ otu n’ime ndị a ma ama n’obodo Caracas, Venezuela. Ma, di ya gbara ya alụkwaghịm, ya enweekwa obi erughị ala. N’ịbụ onye nwere obi nkoropụ, o ji ọtụtụ awa kpee ekpere n’otu oge. N’ụtụtụ echi ya, mgbịrịgba ọnụ ụzọ ya kụrụ. N’ịbụ onye iwe were, o si n’oghere nnyofe anya dị n’ibo nyofee anya ma hụ mmadụ abụọ bu akpa. O mere ka a ga-asị na ọ nọghị n’ụlọ, ma tupu mmadụ abụọ ahụ apụọ, ha si n’okpuru ọnụ ụzọ tụbata otu mpempe akwụkwọ. “Mara Bible Gị,” ka e dere na ya. Ọ̀ pụrụ ịbụ na o nwere ihe jikọrọ nleta ha na ekpere o kpere n’abalị bu ụzọ? Ọ kpọrọ ha ka ha lọghachi. N’oge na-adịghị anya, ọ nọ na-amụ Bible, e mekwara ya baptism mgbe e mesịrị. N’ịbụ onye nwere obi ụtọ n’ikpeazụ, Beatriz na-akụziri ndị ọzọ ugbu a banyere ụzọ e si achọta obi ụtọ.

Carmen kpere ekpere banyere ọgụ ọ na-alụso ịda ogbenye. O nwere ụmụ iri na di bụ́ onye aṅụrụma, bụ́ Rafael. “Agbalịrị m ịkpata ego site n’ịsa ákwà,” ka Carmen kwuru. Ma àgwà aṅụrụma Rafael kara njọ. “Ọ bụ mgbe anyị malitere iso Ndịàmà Jehova na-amụ Bible ka di m malitere ịgbanwe. Anyị mụtara banyere nkwa Alaeze ahụ—na Jehova ga-ewepụ ịda ogbenye na mmegbu n’ụwa n’oge na-adịghị anya. N’ikpeazụ, a zara ekpere m kpekuru Chineke!” Ịmụta banyere ụzọ nke Jehova nyeere Rafael aka ịkwụsị aṅụrụma, o yikwasịkwara “mmadụ ọhụrụ” ahụ. (Ndị Efesọs 4:24) Ya na ezinụlọ ya mere ka ọnọdụ ibi ndụ ha ka mma. Rafael na-ekwu, sị: “Ọ bụ ezie na anyị abaghị ọgaranya, anyị enweghịkwa ụlọ nke aka anyị, ma anyị na-enweta ihe ndị dị anyị mkpa ná ndụ, anyị na-enwekwa obi ụtọ.”

Mgbe A Ga-aza Ekpere Nile

Ikpe ekpere ọ̀ rụpụtaara ndị a ezi ihe ọ bụla? Eenụ! Ị̀ rịbakwara ama na n’ọnọdụ ka ọtụtụ, a zara ekpere ha mgbe otu onye si n’ọgbakọ ndị Kraịst nyeere ha aka ịbịaru Jehova Chineke nso site n’ịmụ Bible?—Ọrụ 9:11.

Ya mere, anyị nweziri ezi ihe mere anyị ga-eji na-ekpe ekpere. N’oge na-adịghị anya ugbu a, a ga-aza ekpere a na-ekpe ka Alaeze Chineke bịa nakwa ka e mee ihe Ọ na-achọ n’ụwa. (Matiu 6:10) Mgbe Chineke mesịrị ka ụwa anyị dị ọcha pụọ ná ndị na-emegide Ya, “ihe ọmụma Jehova ga-ejupụta ụwa, dị ka mmiri si ekpuchi oké osimiri.” (Aịsaịa 11:9) Mgbe ahụ, ndị nile hụrụ Jehova n’anya ga-anụ ụtọ “inwe onwe . . . nke ebube nke ụmụ Chineke”—a ga-azakwa ekpere ha n’ezie.—Ndị Rom 8:18-21.

[Foto dị na peeji nke 7]

Ị̀ maara ihe mere anyị kwesịrị iji na-ekpe ekpere?