Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị Pụrụ Ịnọgide Na-adị Ọcha n’Omume

Ị Pụrụ Ịnọgide Na-adị Ọcha n’Omume

 Ị Pụrụ Ịnọgide Na-adị Ọcha n’Omume

“Nke a bụ ịhụnanya Chineke, ka anyị debe ihe nile O nyere n’iwu.”—1 JỌN 5:3.

1. Ọdịiche dị aṅaa ka a na-ahụ n’omume ndị mmadụ taa?

OGOLOGO oge gara aga, e nyere Malakaị onye amụma ike mmụọ nsọ ibu amụma banyere oge omume nke ndị Chineke ga-agbapụ nnọọ iche na nke ndị na-adịghị ejere Chineke ozi. Onye amụma ahụ dere, sị: “Unu ga-alaghachikwa hụ ihe dị iche n’etiti onye ezi omume na onye na-emebi iwu, n’etiti onye na-efe Chineke na onye na-adịghị efe Ya.” (Malakaị 3:18) A na-emezu amụma ahụ taa. Idebe iwu Chineke, gụnyere ndị nke chọrọ ka a na-adị ọcha n’omume, bụ ụzọ amamihe dị na ya na nke kwesịrị ekwesị ná ndụ. Ma, ọ naghị abụ ụzọ dị mfe mgbe nile. E nwere ezi ihe mere Jisọs ji kwuo na ndị Kraịst aghaghị ịdọgbu onwe ha n’ọrụ iji nweta nzọpụta.—Luk 13:23, 24.

2. Nrụgide ndị dị aṅaa gbara mmadụ gburugburu na-eme ka o siere ụfọdụ ndị ike ịnọgide na-adị ọcha n’omume?

2 Gịnị mere ịnọgide na-adị ọcha n’omume ji esi ike? Otu ihe kpatara ya bụ na e nwere nrụgide ndị gbara mmadụ gburugburu. Ụlọ ọrụ na-emepụta ihe ntụrụndụ na-egosipụta mmekọahụ rụrụ arụ dị ka ihe na-adọrọ adọrọ, ihe dị ụtọ, na ihe e ji ama ndị tozuru okè, ebe ọ na-afọ nke nta ka ha leghara ihe ọjọọ ndị na-esi na ya apụta anya. (Ndị Efesọs 4:17-19) Ihe ka ọtụtụ ná mmekọrịta chiri anya ha na-egosi na-abụ n’etiti ndị na-abụghị di na nwunye. Mgbe mgbe, ihe nkiri sịnịma na televishọn na-egosi ndị na-eme enyi nkịtị ka ha na-enwe mmekọahụ. Dị ka ọ na-adịkarị, ịhụnanya na nkwanyerịta ùgwù anaghị adị na ya. E kpughepụwo ọtụtụ ndị nye echiche  ndị dị otú ahụ site n’oge ha bụ ụmụaka. Ọzọkwa, e nwere nrụgide ndị ọgbọ nke ikwekọ n’omume mmadụ imere otú masịrị ya nke oge a, a na-emekwa ndị jụrụ ịgbaso omume a akaje ma ọ bụ ọbụna kwutọọ ha.—1 Pita 4:4.

3. Olee ihe ụfọdụ mere ọtụtụ ndị n’ụwa ji etinye aka n’omume rụrụ arụ?

3 Nrụgide na-esite n’ahụ anyị na-emekwa ka ịnọgide na-adị ọcha n’omume bụrụ ihe siri ike. Jehova kenyere ọchịchọ inwe mmekọahụ n’ime ụmụ mmadụ, ọchịchọ ndị ahụ pụkwara isi ike. Ọchịchọ na ihe anyị na-eche nwere nnọọ njikọ, e jikọkwara omume rụrụ arụ na echiche ndị na-ekwekọghị n’echiche Jehova. (Jemes 1:14, 15) Iji maa atụ, dị ka nnyocha e mere n’oge na-adịbeghị anya nke pụtara n’akwụkwọ bụ́ British Medical Journal si gosi, mmekọahụ mbụ nke ọtụtụ ndị nwere bụ n’ihi ọkụ ọ dị ha n’obi ịchọpụta ihe mmekọahụ dị ka ya. Ndị ọzọ kweere na ihe ka ọtụtụ ná ndị ọgbọ ha na-enwe mmekọahụ, ya mere ha onwe ha kwa achọghịzi ịbụ ndị na-amaghị nwoke ma ọ bụ nwanyị. Ma, ndị ọzọ kwuru na ha achịkwaghị mmetụta ha ma ọ bụ na ‘mmanya na-egbutụ ha n’oge ahụ.’ Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịdị na-eme ihe na-atọ Chineke ụtọ, anyị aghaghị iche echiche n’ụzọ dị iche. Ụdị echiche dị aṅaa ga-enyere anyị aka ịnọgide na-adị ọcha n’omume?

Zụlite Nkwenkwe Ndị Siri Ike

4. Iji nọgide na-adị ọcha n’omume, gịnị ka anyị na-aghaghị ime?

4 Iji nọgide na-adị ọcha n’omume, anyị aghaghị ịghọta na ịgbaso ụzọ ndụ dị otú ahụ bụ ihe kwesịrị ekwesị. Nke a kwekọrọ n’ihe Pọl onyeozi degaara ndị Kraịst nọ na Rom: “Nwapụta ihe bụ ihe Chineke na-achọ, bụ́ ezi ihe nke dịkwa Ya ezi ụtọ nke zukwara okè.” (Ndị Rom 12:2) Ịghọta na ịdị ọcha n’omume bụ ihe kwesịrị ekwesị na-agụnye ihe karịrị nanị ịmara na a katọrọ omume rụrụ arụ n’Okwu Chineke. Ọ na-agụnye ịghọta ihe ndị mere e ji katọọ omume rụrụ arụ na otú anyị pụrụ isi rite uru site n’ịjụ ime ya. A tụlere ụfọdụ n’ime ihe ndị a n’isiokwu bu ụzọ.

5. N’ụzọ bụ́ isi, n’ihi gịnị ka ndị Kraịst kwesịrị iji chọọ ịnọgide na-adị ọcha n’omume?

5 Otú ọ dị, n’ezie, nye ndị Kraịst, ihe ndị kasị ike mere a ga-eji ezere mmekọahụ rụrụ arụ si ná mmekọrịta anyị na Chineke. Anyị amụtawo na ọ maara ihe ga-akasị abara anyị uru. Ịhụnanya anyị nwere n’ebe ọ nọ ga-enyere anyị aka ịkpọ ihe ọjọọ asị. (Abụ Ọma 97:10) Chineke bụ Onye Na-enye “ezi onyinye ọ bụla na ihe ọ bụla zuru okè nke e nyere enye.” (Jemes 1:17) Ọ hụrụ anyị n’anya. Site ná nrubeisi anyị nye ya, anyị na-egosi na anyị hụrụ ya n’anya ma nwee ekele maka ihe nile o mewooro anyị. (1 Jọn 5:3) Ọ dịghị mgbe anyị ga-achọ imechu Jehova ihu na ịkpasu ya iwe site n’imebi iwu ezi omume ya. (Abụ Ọma 78:41) Anyị adịghị achọ ime omume n’ụzọ ga-eme ka ụzọ e si efe ya ofufe bụ́ nke dị nsọ ma zie ezie bụrụ ihe a na-ekwulu. (Taịtọs 2:5; 2 Pita 2:2) Site n’ịnọgide na-adị ọcha n’omume, anyị na-eme ka Onye Kasị Elu ṅụrịa.—Ilu 27:11.

6. Olee otú ime ka ndị ọzọ mara ụkpụrụ omume anyị si enye aka?

 6 Ozugbo anyị kpebiworo ịnọgide na-adị ọcha n’omume, ihe nchebe ọzọ bụ ime ka ndị ọzọ mara ihe ahụ anyị kweere. Mee ka ndị mmadụ mara na ị bụ ohu Jehova Chineke nakwa na i kpebisiri ike ịnọgide na-edebe ụkpụrụ ya ndị dị elu. Ọ bụ ndụ gị, ahụ gị, nhọrọ gị. Gịnị nọ n’ihe ize ndụ? Ọ bụ mmekọrịta dị oké ọnụ ahịa nke gị na Nna gị nke eluigwe. Ya mere, mee ka o doo anya na ọ dịghị ihe pụrụ ime ka ị gbanwee omume gị nke iguzosi ike n’ezi ihe. Nwee obi ụtọ ịnọchite anya Chineke site n’ịgbaso ụkpụrụ ya. (Abụ Ọma 64:10) Ihere emela gị ma ọlị iso ndị ọzọ kwurịta ihe ndị i kweere banyere omume ọma. Ikwupụta ya pụrụ iwusi gị ike, chebe gị, ma gbaa ndị ọzọ ume ịgbaso ihe nlereanya gị.—1 Timoti 4:12.

7. Olee otú anyị pụrụ isi jigide mkpebi anyị ịnọgide na-adị ọcha n’omume?

7 Ọzọ, n’ịbụ ndị kpebisiworo ike ịnọgide na-agbaso ụkpụrụ omume dị elu, n’ịbụkwa ndị meworo ka a mara ebe anyị kwụ, anyị aghaghị ime ihe iji nọgidesie ike ná mkpebi anyị. Otu ụzọ anyị ga-esi eme nke a bụ site n’ilezi anya mgbe anyị na-ahọrọ ndị enyi. “Na-ejeso ndị maara ihe, ị ga-amakwa ihe,” ka Bible na-ekwu. Soro ndị gị na ha nwere otu echiche banyere ụkpụrụ omume ọma na-akpakọrịta; ha ga-ewusi gị ike. Akụkụ Akwụkwọ Nsọ a kwukwara, sị: “Ma enyi ndị nzuzu ka a ga-emejọ.” (Ilu 13:20) Ruo ókè o kwere mee, zere ndị pụrụ imebi mkpebi gị.—1 Ndị Kọrint 15:33.

8. (a) Gịnị mere anyị ji kwesị itinye uche anyị n’ihe ndị kwesịrị ekwesị? (b) Gịnị ka anyị kwesịrị izere?

8 Ọzọkwa, ọ dị anyị mkpa itinye uche anyị n’ihe ndị bụ́ eziokwu, kwesịrị nsọpụrụ, ziri ezi, dị ọcha, kwesịrị ịhụnanya, e kwuru nke ọma; dị mma, ma kwesị otuto nile. (Ndị Filipaị 4:8) Anyị na-eme nke a site n’ime nhọrọ n’ihe anyị na-ekiri ma na-agụ nakwa n’egwú anyị na-ege. Ikwu na akwụkwọ na-akọ banyere omume rụrụ arụ adịghị enwe mmetụta na-emerụ emerụ yiri ikwu na akwụkwọ na-akọ banyere omume ọma adịghị enwe mmetụta dị mma. Cheta, ụmụ mmadụ na-ezughị okè pụrụ ịdaba n’omume rụrụ arụ n’ụzọ dị mfe. Ya mere, akwụkwọ, magazin, sịnịma, na egwú ndị na-akpali mmetụta nke mmekọahụ ga-eduga n’ọchịchọ ndị na-ezighị ezi, ihe ndị a pụkwara iduga ná mmehie n’ikpeazụ. Iji nọgide na-adị ọcha n’omume, anyị aghaghị iji amamihe Chineke na-emeju uche anyị.—Jemes 3:17.

Nzọụkwụ Ndị Na-eduga n’Omume Rụrụ Arụ

9-11. Dị ka Solomọn si kọọ, nzọụkwụ ndị dị aṅaa ji nke nta nke nta duga otu nwa okorobịa n’omume rụrụ arụ?

9 Mgbe mgbe, a na-enwe nzọụkwụ ndị pụtara ìhè na-eduga n’omume rụrụ arụ. Nzọụkwụ nke ọ bụla e weere na-eme ka o siwanye ike ịlaghachi azụ. Rịba ama otú e si kọwaa nke a n’Ilu 7:6-23. Solomọn hụrụ “nwa okorobịa nke obi amamihe kọrọ,” ma ọ bụ nke na-enweghị ezi ebumnobi. Nwa okorobịa ahụ “na-agabiga n’ámá nke nso nkuku nwanyị [akwụna] ahụ, ọ bụkwa n’ụzọ ụlọ ya ka ọ na-azọ ije; na chi ojiji, n’anyasị nke ụbọchị.” Ebe ahụ ka ọ nọ hie ụzọ nke mbụ ya. Na chi ojiji, “obi” ya eduruwo ya gaa, ọ bụghị nnọọ n’ámá ọ bụla, kama na nke ọ maara na a pụrụ ịhụ nwanyị akwụna.

10 Anyị na-agụkwa, sị: “Lee, otu nwanyị zutere ya yiri uwe nke nwanyị na-akwa iko, ọ bụkwa onye e cheworo obi ya.” Nwa okorobịa ahụ ahụla ya ugbu a! Ọ pụrụ ichigharị laa n’ụlọ ya, ma nke a siri ike karịa otú o siburu, karịsịa ebe ọ bụ na o nwere adịghị ike nke omume. Nwanyị ahụ ejide ya aka sutụkwa ya ọnụ. Ebe ọ bụ na o kwewo ka e sutụ ya ọnụ, ya egewezie ntị n’okwu ụrà ya: “Ihe àjà nile nke àjà udo dị n’aka m,” ka ọ na-ekwu. “Taa ka m kwụghachiworo ihe nile m kwere ná nkwa.” Ihe àjà nile nke àjà udo na-agụnye anụ, ụtụ ọka, mmanụ, na mmanya. (Levitikọs 19:5, 6; 22:21; Ọnụ Ọgụgụ 15:8-10) Site n’ịkpọtụ ha aha, ọ pụrụ ịbụ na ọ na-enye echiche na ya ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe, n’otu mgbe ahụ kwa, ọ pụkwara ịbụ na ọ na-eme ka ọ mara na ezi ihe oriri na ihe ọṅụṅụ bara ụba n’ụlọ ya. “Bịa,” ka ọ na-arịọ ya, “ka afọ jubiga anyị ókè n’ịkwa iko ruo ụtụtụ; ka anyị mee ka obi tọọ anyị ụtọ n’ịhụnanya nile.”

11 O sighị ike ikwu ihe ga-esi na ya pụta. “O weere okwu ire ụtọ nke egbugbere ọnụ ya nufuo ya.” Nwa okorobịa ahụ esoro ya laa n’ebe obibi ya “dị ka ehi si abịa n’ogbugbu ya” nakwa “dị ka nnụnụ si eme ngwa ịba n’igbudu.” Solomọn ji okwu ndị a na-akpali iche echiche mechie: “Ọ maghị na imegide ndụ ya ka ọ bụ.” O metụtara ndụ ya n’ihi na “Chineke ga-ekpe ndị na-akwa  iko ikpe, ha na ndị na-akwa iko, bụ́ ndị ikom nwere nwunye na ndị inyom nwere di.” (Ndị Hibru 13:4) Lee ihe mmụta dị ike ọ bụụrụ ma ndị ikom ma ndị inyom! Anyị kwesịrị izere iwere ọbụna nzọụkwụ ndị mbụ n’ụzọ nke ga-eduga n’enweghị ihu ọma Chineke.

12. (a) Gịnị ka okwu ahụ bụ́ “obi amamihe kọrọ” pụtara? (b) Olee otú anyị pụrụ isi zụlite ikike ime omume ọma?

12 Rịba ama na “obi amamihe kọrọ” nwa okorobịa ahụ a kọrọ banyere ya n’ihe ndekọ ahụ. Okwu a na-egosi anyị na echiche, ọchịchọ, mmetụta ịhụnanya, mmetụta uche, na ihe mgbaru ọsọ ya ná ndụ ekwekọghị n’ihe Chineke na-anakwere. Adịghị ike ya n’ime omume ọma rụpụtara ihe ndị dị ize ndụ. Na “mgbe ikpeazụ” ndị a dị oké egwu, ọ na-achọ mgbalị iji zụlite ikike nke omume. (2 Timoti 3:1) Chineke na-eme ndokwa dị iche iche iji nyere anyị aka. Ọ na-edokwa nzukọ dị iche iche nke ọgbakọ ndị Kraịst iji na-agba anyị ume n’ụzọ ziri ezi na iji mee ka anyị soro ndị nwere otu ihe mgbaru ọsọ ahụ anyị nwere na-akpakọrịta. (Ndị Hibru 10:24, 25) E nwere ndị okenye ọgbakọ bụ́ ndị na-azụ anyị dị ka atụrụ ma na-akụziri anyị ụzọ ezi omume. (Ndị Efesọs 4:11, 12) Anyị nwere Okwu Chineke, bụ́ Bible, inye anyị ntụziaka na nduzi. (2 Timoti 3:16) N’oge nile kwa, anyị nwere ohere ikpe ekpere maka mmụọ Chineke inyere anyị aka.—Matiu 26:41.

Ịmụta Ihe Site ná Mmehie Devid

13, 14. Olee otú Eze Devid si tinye aka ná mmehie jọgburu onwe ya?

13 Otú ọ dị, ọ dị mwute ikwu na ọbụna ndị ohu Chineke a ma ama etinyewo aka ná mmekọahụ rụrụ arụ. Otu n’ime ndị dị otú ahụ bụ Eze Devid, bụ́ onye jewooro Jehova ozi n’ikwesị ntụkwasị obi ruo ọtụtụ iri afọ. Obi abụọ adịghị ya na ọ hụrụ Chineke n’anya nke ukwuu. Ma, ọ dabara n’omume mmehie. Dị ka nwa okorobịa ahụ Solomọn kọwara, e nwere nzọụkwụ ndị dugara ná mmehie Devid ma mezie ka o hie nne.

14 Devid akatatụla ahụ n’oge ahụ, ikekwe ọ nọ n’afọ ndị 50 ya. Ọ nọ n’elu ụlọ ya hụ Bat-sheba mara mma ka ọ na-asa ahụ. Ọ jụrụ ajụjụ banyere ya ma mata onye ọ bụ. Ọ chọpụtara na di ya, bụ́ Uraịa, so ná ndị gara ịnọchibido Raba, bụ́ obodo Amọn. Devid mere ka a kpọbata ya n’obí ya, o sorokwa ya nwee mmekọahụ. Mgbe nke ahụ gasịrị, ihe bịara sie ike—nwanyị ahụ chọpụtara na Devid atụwala ya ime. N’inwe olileanya na Uraịa na nwunye ya ga-edina n’abalị ahụ, Devid kpọrọ ya ka o si n’agha lọghachi. N’ụzọ dị otú ahụ, ọ gaara eyi ka ọ bụ Uraịa bụ nna nwa Bat-sheba. Ma Uraịa agaghị n’ụlọ ya. N’ịbụ onye chọsiri ike ikpuchi mmehie ya, Devid zigaghachiziri Uraịa na Raba ma nye ya akwụkwọ ozi ọ ga-enye onyeisi usuu ndị agha ahụ bụ́ nke na-ekwu ka e debe Uraịa n’ebe a ga-egbu ya. Uraịa si otú ahụ tụfuo ndụ ya, Devid lụkwara nwanyị ahụ di ya nwụrụ tupu ọha na eze amara na ọ dị ime.—2 Samuel 11:1-27.

15. (a) Olee otú e si kpughee mmehie Devid? (b) Olee otú Devid si meghachi omume n’ịdọ aka ná ntị Netan ji nkà nye ya?

15 O yiri nnọọ ka nkata Devid kpara iji kpuchie mmehie ya ọ̀ gazielara ya. Ọtụtụ ọnwa gafere. A mụrụ nwa ahụ—nwa nwoke. Ọ bụrụ na Devid bu ihe a merenụ n’uche mgbe o dere Abụ Ọma nke 32, mgbe ahụ, o doro anya na akọ na uche ya nyere ya nsogbu. (Abụ Ọma 32:3-5) Otú ọ dị, e zonahụghị Chineke mmehie ahụ. Bible na-ekwu, sị: “Ihe Devid mere jọrọ njọ n’anya Jehova.” (2 Samuel 11:27) Jehova zigara Netan onye amụma, bụ́ onye ji nkà gosi Devid ihe o meworo. Devid kwupụtara mmehie ya ozugbo ma rịọ Jehova mgbaghara. Ezi nchegharị ya mere ka ya na Chineke dịghachi ná mma. (2 Samuel 12:1-13) Devid ajụghị ịdọ aka ná ntị ahụ. Kama nke ahụ, o gosipụtara àgwà ahụ a kọwara n’Abụ Ọma 141:5: “Ka onye ezi omume tigbuo m, ọ ga-abụ ebere; ya baakwara m mba, ọ ga-abụ mmanụ isi; ekwela ka isi m sị, Ee e.”

16. Ịdọ aka ná ntị na ndụmọdụ dị aṅaa ka Solomọn na-enye banyere njehie?

16 Solomọn, bụ́ nwa nwoke nke abụọ nke Devid na Bat-sheba, pụrụ ịtụgharịwo uche n’ihe omume ọjọọ a mere ná ndụ nna ya. O mesịrị dee, sị: “Onye na-ekpuchi njehie ya nile, ọ gaghị agara ya: ma onye na-ekwupụta ha, nke na-ahapụkwa ha, a ga-enwe obi ebere n’ahụ ya.” (Ilu 28:13) Ọ bụrụ na anyị emee mmehie dị oké njọ, anyị kwesịrị ịṅa ntị na ndụmọdụ a sitere n’ike mmụọ nsọ, nke bụ́ ma ịdọ aka ná ntị ma okwu ndụmọdụ. Anyị kwesịrị ikwupụtara Jehova  mmehie anyị ma gakwuru ndị okenye ọgbakọ maka enyemaka. Otu ọrụ dị mkpa ndị okenye na-arụ bụ inye aka mee ka ndị dabaworo n’omume ọjọọ guzozie.—Jemes 5:14, 15.

Idi Ihe Mmehie Na-akpata

17. Ọ bụ ezie na Jehova na-agbaghara mmehie, gịnị ka ọ na-adịghị echebe anyị pụọ na ya?

17 Jehova gbaghaara Devid. N’ihi gịnị? N’ihi na Devid bụ nwoke na-eguzosi ike n’ezi ihe, n’ihi na ọ na-emere ndị ọzọ ebere, nakwa n’ihi na o nwere ezigbo nchegharị. Otú o sina dị, e chebeghị Devid pụọ n’ọdachi ndị si na ya pụta. (2 Samuel 12:9-14) Otú ahụ ka ọ dị taa. Ọ bụ ezie na Jehova adịghị eweta ihe ọjọọ n’isi ndị chegharịrịnụ, ọ dịghị echebe ha pụọ ná nsogbu anụ ahụ ndị omume ọjọọ ha na-akpata. (Ndị Galetia 6:7) Ịgba alụkwaghịm, ịtụrụ ime ọkwà, ọrịa ndị a na-ebute site ná mmekọahụ, na ire ùgwù na ntụkwasị obi pụrụ iso n’ihe ndị ga-esi ná mmekọahụ rụrụ arụ pụta.

18. (a) Olee otú Pọl gwara ọgbakọ Kọrint ka ha si dozie otu okwu metụtara ajọ mmekọahụ rụrụ arụ? (b) Olee otú Jehova si egosipụta ịhụnanya na ebere n’ebe ndị mmehie nọ?

18 Ọ bụrụ na anyị ejehiewo n’ụzọ dị njọ, ọ dị mfe inwe nkụda mmụọ ka anyị na-ata ahụhụ ihe si n’ụzọ anyị hiere pụta. Otú o sina dị, anyị ekwesịghị ikwe ka ihe ọ bụla dọghachi anyị azụ n’ichegharị na iso Chineke dịghachi ná mma. Na narị afọ mbụ, Pọl degaara ndị Kọrint akwụkwọ ka ha chụpụ otu nwoke nke na-edina onye ikwu ya n’ọgbakọ. (1 Ndị Kọrint 5:1, 13) Mgbe nwoke ahụ nwesịrị ezi nchegharị, Pọl nyere ọgbakọ ahụ ntụziaka, sị: “Unu were amara gbaghara ya kasiekwa ya obi, [unu meekwa] ka ịhụnanya unu hụrụ ya bụrụ ihe dị ịtụkwasị obi.” (2 Ndị Kọrint 2:5-8) Na ndụmọdụ a sitere n’ike mmụọ nsọ, anyị na-ahụ ịhụnanya na ebere Jehova n’ebe ndị mmehie chegharịrị echegharị nọ. Ndị mmụọ ozi nọ n’eluigwe na-aṅụrị ọṅụ mgbe otu onye mmehie chegharịrị.—Luk 15:10.

19. Ịbụ onye omume ọjọọ wutere n’ụzọ kwesịrị ekwesị pụrụ iweta abamuru ndị dị aṅaa?

19 Ọ bụ ezie na ụzọ ọjọọ na-ewute anyị, ụta anyị na-akwa pụrụ inyere anyị aka ‘ilezi anya ka anyị ghara iche ajọ ihe ihu ọzọ.’ (Job 36:21) N’ezie, ihe ndị dị mwute na-esi ná mmehie apụta kwesịrị igbochi anyị ime mmehie ọzọ. Ọzọkwa, Devid ji ahụmahụ dị mwute o nwetara site n’omume ọjọọ ya mee ihe iji nye ndị ọzọ ndụmọdụ. O kwuru, sị: “M ga-ezi ndị njehie ụzọ Gị nile; ndị mmehie ga-alaghachikwutekwa Gị.”—Abụ Ọma 51:13.

Obi Ụtọ Na-abịa Site n’Ijere Jehova Ozi

20. Uru ndị dị aṅaa na-esi n’irube isi n’ụkpụrụ ezi omume Chineke apụta?

20 [Obi ụtọ, NW] na-adịrị ndị nụrụ okwu Chineke, debekwa ya,” ka Jisọs kwuru. (Luk 11:28) Irube isi n’ụkpụrụ ezi omume Chineke na-eweta obi ụtọ ugbu a nakwa n’ọdịnihu ebighị ebi. Ọ bụrụ na anyị anọgidewo na-adị ọcha n’omume, ka anyị nọgide n’omume ahụ site n’iji ndokwa nile Jehova meworo iji nyere anyị aka na-eme ihe n’ụzọ bara uru. Ọ bụrụ na anyị adabawo n’omume rụrụ arụ, ka anyị nweta nkasi obi n’ịmara na Jehova dị njikere ịgbaghara ndị chegharịrị n’ezie,  ka anyị kpebisiekwa ike ịghara imehie ọzọ ma ọlị.—Aịsaịa 55:7.

21. Itinye ndụmọdụ dị aṅaa nke Pita onyeozi nyere n’ọrụ pụrụ inyere anyị aka ịnọgide na-adị ọcha n’omume?

21 N’isi nso, ụwa ajọ omume a ga-agabiga, tinyere àgwà na omume ya nile rụrụ arụ. Site n’ịnọgide na-adị ọcha n’omume, anyị ga-erite uru ugbu a nakwa ruo mgbe ebighị ebi. Pita onyeozi dere, sị: “Ndị m hụrụ n’anya, ebe unu na-ele anya ihe ndị a, na-anụnụ ọkụ n’obi ka e wee hụ unu n’udo, ndị na-enweghị ntụpọ, ndị a na-apụghịkwa ịta ụta n’ihu Ya. . . . Ebe unu buru ụzọ mara ihe ndị a, na-echenụ onwe unu nche, ka a ghara iwere njehie nke ndị na-emebi iwu bupụ unu, unu wee si ná nguzosi ike nke aka unu dapụ.”—2 Pita 3:14, 17.

Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?

• Gịnị mere ọ pụrụ iji sie ike ịnọgide na-adị ọcha n’omume?

• Olee ụzọ ụfọdụ anyị ga-esi akwado mkpebi siri ike anyị na-eme ịgbaso ụkpụrụ omume ndị dị elu?

• Olee ihe ndị anyị pụrụ ịmụta site ná mmehie nke nwa okorobịa ahụ Solomọn kpọtụrụ aha?

• Gịnị ka ihe nlereanya Devid na-akụziri anyị banyere nchegharị?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 13]

Ọ bụ ihe nchebe ime ka ndị ọzọ mara ebe ị kwụ n’okwu ndị metụtara omume

[Foto ndị dị na peeji nke 16, 17]

N’ihi na Devid ji ezi obi chegharịa, Jehova gbaghaara ya