Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọgụgụ Bible—Ihe Bara Uru Ma Na-atọ Ụtọ

Ọgụgụ Bible—Ihe Bara Uru Ma Na-atọ Ụtọ

 Ọgụgụ Bible—Ihe Bara Uru Ma Na-atọ Ụtọ

“Ị [ghaghị ịgụ, NW] ya ehihie na abalị.”—JOSHUA 1:8.

1. Olee abamuru ụfọdụ dị n’ịgụ ihe n’ozuzu ya, nakwa n’ọgụgụ Bible kpọmkwem?

ỊGỤ akwụkwọ kwesịrị ekwesị bụ ihe omume bara uru. Onye France bụ́ ọkà ihe ọmụma nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị bụ́ Montesquieu (Charles-Louis de Secondat) dere, sị: “Nye m, ịmụ ihe abụrụwo mgbe nile ihe ngwọta kasịnụ maka ike ọgwụgwụ nke ndụ. Ọ dịghị obi erughị ala m nwere nke ịgụ ihe ruo otu awa na-ewepụbeghị.” Ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ kasị ukwuu, otú a ka ọgụgụ Bible dị. Ọbụ abụ ahụ e nyere ike mmụọ nsọ kwuru, sị: “Iwu Jehova zuru okè, na-eweghachi mkpụrụ obi; ihe àmà Jehova kwesịrị ntụkwasị obi, na-eme ka onye na-enweghị uche mara ihe. Ụkpụrụ nile Jehova tọrọ ziri ezi, na-eme ka obi ṅụrịa ọṅụ.”—Abụ Ọma 19:7, 8.

2. N’ihi gịnị ka Jehova jiworo chekwaa Bible eri oge, gịnịkwa ka ọ na-atụ anya ka ndị ya jiri ya na-eme?

2 Ebe Jehova Chineke bụ Onye Chepụtara Bible, o chekwawo ya gafee ọtụtụ afọ nke mmegide kpụ ọkụ n’ọnụ sitere n’aka ndị iro ya, ma ndị nke okpukpe ma ndị nke ụwa. Ebe ọ bụ nzube ya ka “a zọpụta mmadụ nile, ka ha bịaruokwa mmazu nke eziokwu,” ọ hụwo na e mere ka Okwu ya ruo ihe nile a kpọrọ mmadụ aka. (1 Timoti 2:4) A na-eme atụmatụ na a pụrụ iji 100 asụsụ rute ihe dị ka pasent 80 nke ndị bi n’ụwa. Ihe odide nile nke Bible dị n’asụsụ 370, a pụkwara ịgụ akụkụ ụfọdụ nke Akwụkwọ Nsọ n’asụsụ na n’olumba 1,860. Jehova chọrọ ka ndị ya na-agụ Okwu ya. Ọ na-agọzi ndị ohu ya bụ́ ndị na-etinye uche n’Okwu ya, ee, ndị na-agụ ya kwa ụbọchị.—Abụ Ọma 1:1, 2.

Ọgụgụ Bible Bụ Ihe A Chọrọ n’Aka Ndị Nlekọta

3, 4. Gịnị ka Jehova chọrọ n’aka ndị eze Israel, ihe ndị dị aṅaa bụ́ ndị mere o ji chọọ ihe a n’aka ha metụtakwara ndị Kraịst bụ́ ndị okenye taa?

3 Mgbe Jehova na-ekwu banyere oge mba Israel ga-enwe eze bụ́ mmadụ, o kwuru, sị: “Ọ ga-erukwa, mgbe ọ na-anọkwasị n’ocheeze nke alaeze ya, na ọ ga-edepụtara onwe ya iwu a n’akwụkwọ, site n’akwụkwọ ahụ nke dị n’ihu ndị nchụàjà, bụ́ ndị Livaị: ọ ga-adịkwa n’aka ya, ọ ga-agụkwa ihe dị n’ime ya ụbọchị nile nke ndụ ya: ka o wee mụta ịtụ egwu Jehova, bụ́ Chineke ya, idebe okwu nile nke iwu a na ụkpụrụ ndị a, ime ha: ka obi ya wee ghara ịdị elu karịa ụmụnne ya, ka ọ gharakwa isi n’ihe e nyere n’iwu wezụga onwe ya, n’aka nri, ma ọ bụ n’aka ekpe.”—Deuterọnọmi 17:18-20.

4 Rịba ama ihe ndị mere Jehova ji chọọ ka ndị nile ga-abụ eze Israel n’ọdịnihu na-agụ akwụkwọ nke iwu Chineke kwa ụbọchị: (1) “ka o wee mụta ịtụ egwu Jehova, bụ́ Chineke ya, idebe okwu nile nke iwu a na ụkpụrụ ndị a, ime ha”; (2) “ka obi ya wee ghara ịdị elu karịa ụmụnne ya”; (3) “ka ọ gharakwa isi n’ihe e nyere n’iwu wezụga onwe ya, n’aka nri, ma ọ bụ n’aka ekpe.” Ọ́ dịghị ndị Kraịst bụ́ ndị nlekọta taa mkpa ịtụ egwu Jehova, irube isi n’iwu ya, izere ibuli onwe ha elu karịa ụmụnna ha, na izere isi n’iwu Jehova wezụga onwe ha? N’ezie, ọgụgụ Bible kwa ụbọchị dị ha mkpa dị ka ọ dị ndị eze Israel.

5. Gịnị ka Òtù Na-achị Isi degaara ndị so na Kọmitii Alaka n’oge na-adịbeghị anya banyere ọgụgụ Bible, n’ihi gịnịkwa ka ndị Kraịst nile bụ́ ndị okenye ga-eji eme nke ọma ịgbaso ndụmọdụ dị otú ahụ?

 5 Ndị Kraịst bụ́ ndị okenye taa na-eji nnọọ ọrụ n’aka, bụ́ ihe na-eme ka ọgụgụ Bible kwa ụbọchị bụrụ ihe ịma aka. Dị ka ihe atụ, ndị so n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova na ndị so na Kọmitii Alaka dị iche iche gburugburu ụwa bụcha ndị ikom ji nnọọ ọrụ n’aka. Ma, akwụkwọ ozi Òtù Na-achị Isi degaara Kọmitii Alaka nile n’oge na-adịbeghị anya mesiri ike mkpa ọgụgụ Bible kwa ụbọchị na àgwà ọmụmụ ihe dị mma, dị. Akwụkwọ ozi ahụ mere ka ọ pụta ìhè na nke a ga-amụba ịhụnanya anyị nwere n’ebe Jehova nọ na n’ebe eziokwu ahụ dị, ọ ‘ga-enyekwara anyị aka ịnọgide na-enwe okwukwe, ọṅụ, na ịnọgidesi ike ruo n’ọgwụgwụ dị ebube.’ Ndị okenye nile nọ n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova nwere otu mkpa ahụ. Ịgụ Akwụkwọ Nsọ kwa ụbọchị ga-enyere ha aka ‘inwe uche.’ (Joshua 1:7, 8) Nye ha kpọmkwem, ọgụgụ Bible “bara uru maka izi ihe, maka ịdọ aka ná ntị, maka mgbazi, nakwa maka inye ọzụzụ n’ezi omume.”—2 Timoti 3:16, Revised Standard Version.

Ihe Ndị Na-eto Eto na Ndị Agadi Na-aghaghị Ime

6. N’ihi gịnị ka Joshua ji gụpụta okwu nile nke iwu Jehova n’ihu mkpọkọta nke ebo Israel na ndị ọbịa?

6 N’oge ochie, ndị mmadụ enweghị Akwụkwọ Nsọ nke aka ha, ya mere a na-agụ Bible n’ihu mkpọkọta ahụ. Mgbe Jehova mesịrị ka Joshua merie obodo Ai, ọ kpọkọtara ebo nile nke Israel n’ihu Ugwu Ibal na Ugwu Geraịzim. Mgbe ahụ, ihe ndekọ ahụ na-agwa anyị, sị: “O wee gụọ okwu nile nke iwu ahụ, ma ngọzi ma nkọcha, dị ka ihe nile si dị nke e deworo n’akwụkwọ iwu ahụ. Ọ dịghị okwu ọ bụla n’ihe nile nke Mosis nyere n’iwu nke Joshua na-agụghị n’ihu mkpọkọta nile nke Israel, na ndị inyom, na ụmụntakịrị, na ndị ọbịa ndị na-eje ije n’etiti ha.” (Joshua 8:34, 35) Ọ dị ndị na-eto eto na ndị agadi, ụmụ afọ na ndị ọbịa, mkpa ịkụnye n’obi na n’uche ha, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, omume nke ga-eweta ngọzi Jehova na nke ga-eweta amamikpe ya. N’ezie, ọgụgụ Bible nke a na-agụchi anya ga-enyere anyị aka n’akụkụ a.

7, 8. (a) Ole ndị taa dị ka “ndị ọbịa” ahụ, n’ihi gịnịkwa ka o ji dị ha mkpa ịgụ Bible kwa ụbọchị? (b) N’ụzọ ndị dị aṅaa ka “ụmụntakịrị” nọ n’etiti ndị Jehova pụrụ isi na-agbaso ihe nlereanya Jisọs?

7 Taa, ọtụtụ nde ndị ohu Jehova dị ka “ndị ọbịa” ahụ n’ụzọ ime mmụọ. Na mbụ, ha nọ na-ebi ndụ dị ka ụkpụrụ nke ụwa si dị, ma ha agbanwewo ndụ ha. (Ndị Efesọs 4:22-24; Ndị Kọlọsi 3:7, 8) Ọ dị ha mkpa ichetara onwe ha mgbe nile ụkpụrụ Jehova banyere ezi ihe na ihe ọjọọ. (Emọs 5:14, 15) Ịgụ Okwu Chineke kwa ụbọchị na-enyere ha aka ime nke a.—Ndị Hibru 4:12; Jemes 1:25.

8 E nwekwara ọtụtụ “ụmụntakịrị” nọ n’etiti ndị Jehova bụ́ ndị ndị mụrụ ha kụziwooro ụkpụrụ Jehova, ndị ọ dịkwa mkpa iji aka ha kwenye na uche ya ziri ezi. (Ndị Rom 12:1, 2) Olee otú ha pụrụ isi mee nke ahụ? N’Israel, e nyere ndị nchụàjà na ndị okenye ntụziaka, sị: “[Unu] ga-agụ iwu a n’ihu Israel nile ná ntị ha. Kpọkọta ndị Israel, bụ́ ndị ikom, na ndị inyom, na ụmụntakịrị, na ọbịa gị nke nọ n’ime ọnụ ụzọ ámá gị nile, ka ha wee nụ, ka ha we mụtakwa, wee tụọ egwu Jehova, bụ́ Chineke unu, leziekwa anya ime okwu nile nke iwu a; ụmụ ha, ndị na-amaghị, ga-anụkwa, wee mụta ịtụ egwu Jehova, bụ́ Chineke unu.” (Deuterọnọmi 31:11-13) N’ịbụ onye biri ndụ n’okpuru Iwu ahụ,  Jisọs gosipụtara oké mmasị n’ịghọta iwu Nna ya mgbe ọ dị afọ 12. (Luk 2:41-49) Mgbe e mesịrị, e ji ige ntị na ikere òkè n’ọgụgụ Akwụkwọ Nsọ n’ụlọ nzukọ mara ya. (Luk 4:16; Ọrụ 15:21) Ndị na-eto eto taa ga-eme nke ọma ịgbaso ihe nlereanya Jisọs site n’ịgụ Okwu Chineke kwa ụbọchị nakwa site n’ịgachi nzukọ bụ́ ebe a na-agụ ma na-amụ Bible, anya.

Ọgụgụ Bible —Ihe A Ga-ebute Ụzọ

9. (a) N’ihi gịnị ka o ji dị anyị mkpa ime nhọrọ banyere ihe anyị na-agụ? (b) Gịnị ka onye editọ mbụ nke magazin a kwuru banyere ihe ndị na-enye aka n’ịmụ Bible?

9 Eze Solomọn maara ihe dere, sị: “Nara ndụmọdụ: ime ọtụtụ akwụkwọ enweghị ọgwụgwụ; ọtụtụ mmụta bụkwa ike ọgwụgwụ nke anụ ahụ.” (Eklisiastis 12:12) Mmadụ pụrụ ịgbakwụnye na ịgụ ọtụtụ akwụkwọ a na-ebipụta taa abụghị nanị na ha bụ ike ọgwụgwụ nke anụ ahụ kama, n’ikwu eziokwu, ha dị ize ndụ nye uche. Ya mere, ọ dị mkpa ime nhọrọ. Tụkwasị n’ịgụ akwụkwọ anyị ndị e ji amụ Bible, ọ dị anyị mkpa ịgụ Bible n’onwe ya. Onye editọ mbụ nke magazin a deere ndị na-agụ ya akwụkwọ, sị: “Unu echefula ma ọlị na Bible bụ Ụkpụrụ anyị nakwa n’agbanyeghị otú enyemaka anyị na-enye pụrụ isi bụrụ nke si n’aka Chineke, ha bụ ‘enyemaka,’ ha abụghị ihe e ji edochi anya Bible.” * N’ihi ya, ọ bụ ezie na anyị agaghị eleghara akwụkwọ ndị dabeere na Bible anya, ọ dị anyị mkpa ịgụ Bible n’onwe ya.

10. Olee otú “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” siworo mesie ịdị mkpa nke ọgụgụ Bible ike?

10 N’ịmara banyere mkpa a, ruo ọtụtụ afọ ugbu a, “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” edokwawo ọgụgụ Bible dị ka akụkụ nke usoro ihe omume Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’ọgbakọ ọ bụla.  (Matiu 24:45) Usoro ọgụgụ Bible e ji eme ihe ugbu a ga-ewe ihe dị ka afọ asaa iji gụchaa Bible. Usoro ọgụgụ Bible a bara uru nye mmadụ nile ma karịsịa nye ndị ọhụrụ bụ́ ndị na-agụchabeghị Bible n’ozuzu ya. A na-achọ ka ndị na-aga Watchtower Bible School of Gilead maka ndị ozi ala ọzọ na Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi nakwa ndị ọhụrụ so n’ezinụlọ Betel gụchaa Bible n’ozuzu ya n’ime otu afọ. Usoro ọ sọrọ gị gbasoo, dị ka otu onye ma ọ bụ dị ka ezinụlọ, isochi ya anya na-achọ ibute ọgụgụ Bible ụzọ.

Gịnị Ka Àgwà Ịgụ Ihe Gị Na-ekpughe?

11. N’ụzọ dị aṅaa ka anyị kwesịrị isi na-eri okwu Jehova kwa ụbọchị, n’ihi gịnịkwa?

11 Ọ bụrụ na ọ na-esiri gị ike ịgbasochi usoro ọgụgụ Bible gị anya, ọ pụrụ ikwesị ekwesị ka ị jụọ onwe gị, sị: ‘Mmetụta dị aṅaa ka àgwà ịgụ ihe m ma ọ bụ nke ikiri TV m pụrụ inwe n’ikike m nwere ịgụ Okwu Jehova?’ Cheta ihe Mosis dere—nke Jisọs kwughachikwara—na “ọ bụghị nanị achịcha ka mmadụ ga-eji dị ndụ, kama ọ bụ okwu nile ọ bụla nke na-esi n’ọnụ Chineke pụta.” (Matiu 4:4: Deuterọnọmi 8:3) Dị nnọọ ka o si dị anyị mkpa ịta achịcha ma ọ bụ ihe yiri ya ụbọchị nile nke ndụ anyị iji kwagide anụ ahụ anyị, ọ dị anyị mkpa n’otu aka ahụ inweta echiche Jehova kwa ụbọchị iji nọgide na-eji ihe ime mmụọ akpọrọ ihe. Anyị pụrụ inweta echiche Chineke kwa ụbọchị site n’ịgụ Akwụkwọ Nsọ.

12, 13. (a) Olee otú Pita onyeozi si mee ihe atụ nke agụụ anyị kwesịrị inwe maka Okwu Chineke? (b) Olee otú Pọl si jiri mmiri ara mee ihe n’ụzọ dị iche na nke Pita?

12 Ọ bụrụ na anyị aghọta Bible, ‘ọ bụghị dị ka okwu mmadụ, kama, otú ọ dị n’eziokwu, dị ka okwu Chineke,’ a ga-adọta anyị n’ebe ọ dị, dị nnọọ ka nwa ọhụrụ si achọsi ara nne ya ike. (1 Ndị Tesalọnaịka 2:13) Pita onyeozi mere ntụnyere dị otú ahụ, na-ede, sị: “Dị ka ụmụ a mụrụ ọhụrụ, ka agụụ mmiri ara nke okwu Chineke, nke aghụghọ na-adịghị ya, na-agụsi unu ike, ka unu wee were ya na-eto eto ruo nzọpụta; ọ bụrụ na unu detụrụ n’ire na Onyenwe anyị bụ onye nwere obiọma.” (1 Pita 2:2, 3) Ọ bụrụ na anyị edetuwo ire n’ezie, site n’ahụmahụ onwe onye, na “Onwenwe anyị bụ onye nwere obiọma,” anyị ga-azụlite ọchịchọ siri ike maka ọgụgụ Bible.

13 E kwesịrị ịrịba ama na n’akụkụ ihe odide a, Pita ji mmiri ara mee ihe n’ụzọ dị iche n’otú Pọl onyeozi si jiri ya mee ihe. Nye nwa a mụrụ ọhụrụ, mmiri ara na-enye ya ihe nile ahụ ya chọrọ. Ihe atụ Pita na-egosi na Okwu Chineke nwere ihe nile dị anyị mkpa iji “na-eto eto ruo nzọpụta.” N’aka nke ọzọ, Pọl ji mkpa mmiri ara dị mee ihe iji gosipụta àgwà iri ihe na-adịghị mma nke ụfọdụ ndị bụ́ ndị na-azọrọ na ha bụ ndị tozuru okè n’ụzọ ime mmụọ. N’akwụkwọ ozi Pọl degaara ndị Hibru bụ́ ndị Kraịst, o dere, sị: “Mgbe unu kwesịrị ịbụ ndị ozizi n’ihi oge, ọ dị unu mkpa ọzọ ka mmadụ zie unu ihe bụ́ ihe ozizi mbụ nke mmalite okwu si n’ọnụ Chineke pụta; unu aghọwokwa ndị mmiri ara dị mkpa, ọ bụghị nri siri ike. N’ihi na onye ọ bụla nke na-eketa mmiri ara bụ onye a ka-anwaghị ya n’okwu ezi omume; n’ihi na ọ bụ nwa ọhụrụ. Ma nri siri ike bụ nke ndị tozuru okè, ndị a nwaworo nghọta ha n’ihi omume ha na-eme mgbe dum ịtụle ihe ọma na ihe ọjọọ.” (Ndị Hibru 5:12-14) Ọgụgụ Bible e tinyere uche na ya pụrụ ime ihe dị ukwuu n’iwulite nghọta anyị na ịkpalị ọchịchọ anyị maka ihe ime mmụọ.

Ụzọ Isi Na-agụ Bible

14, 15. (a) Ihe ùgwù dị aṅaa ka Onye Chepụtara Bible na-enye anyị? (b) Ànyị pụrụ isi aṅaa rite uru n’amamihe Chineke? (Nye ihe atụ.)

14 A na-amalite ọgụgụ Bible n’ụzọ kasị baa uru, ọ bụghị site n’ịgụ ihe, kama site n’ikpe ekpere. Ekpere bụ ihe ùgwù dị ịrịba ama. Ọ dị ka a ga-asị na ị malitere ịmụ otu akwụkwọ dabeere n’isiokwu ndị miri emi site n’ịrịọ onye dere ya ka o nyere gị aka ịghọta ihe ị na-aga ịgụ. Lee uru dị ukwuu nke ahụ pụrụ ịba! Onye Chepụtara Bible, bụ́ Jehova, na-enye gị ihe ùgwù ahụ. Otu onye so n’òtù na-achị isi nke narị afọ mbụ degaara ụmụnna ya akwụkwọ, sị: “Ọ bụrụ na amamihe fọdụụrụ onye ọ bụla n’ime unu inwe, ya rịọ n’aka Chineke, Onye na-enye mmadụ nile n’afọ ofufo, n’ataghịkwa ụta; a  ga-ewerekwa ya nye ya. Ma ya rịọ n’okwukwe, ghara inwe obi abụọ.” (Jemes 1:5, 6) Òtù Na-achị Isi nke oge a na-agba anyị ume mgbe nile iji ekpere na-agụ Bible.

15 Amamihe bụ itinye ihe ọmụma n’ọrụ n’ụzọ dị irè. Ya mere, tupu ị saghee Bible gị, rịọ Jehova ka o nyere gị aka ịghọta isi ihe ndị ị ga-agụta bụ́ ndị ọ ga-adị mkpa ka i tinye n’ọrụ ná ndụ gị. Jikọta ihe ọhụrụ ndị ị na-amụta na ihe ị mabu. Mee ka ha kwekọọ ‘n’ihe ilereanya nke okwu na-enye ezi ndụ’ bụ́ nke ị ghọtaworo. (2 Timoti 1:13) Tụgharịa uche n’ihe ndị mere ná ndụ nke ndị ohu Jehova n’oge gara aga, ma jụọ onwe gị otú ị gaara esiwo eme omume n’ọnọdụ ndị yiri nke ahụ.—Jenesis 39:7-9; Daniel 3:3-6, 16-18; Ọrụ 4:18-20.

16. Aro ndị dị aṅaa dị irè ka a tụrụ iji mee ka anyị nwee ike ime ka ọgụgụ Bible anyị bakwuo uru?

16 Agụla nanị ka i wee gụchapụ ọtụtụ peeji. Jiri nwayọọ. Tụgharịa uche n’ihe ị na-agụ. Mgbe isi ihe ụfọdụ kpaliri mmasị gị, lee ntụaka dị n’etiti na n’ala ala peeji ma ọ bụrụ na Bible gị nwere ya. Ọ bụrụ na isi ihe ahụ edobeghị gị anya, detuo ya edetuo iji mekwuo nnyocha banyere ya. Ka ị na-agụ, na-aka akara n’akụkụ ihe odide ndị ị chọrọ icheta karịsịa ma ọ bụ depụta ha edepụta. Ị pụkwara ịgbakwụnye ihe odide nke aka gị na ntụaka n’akụkụ Bible gị. Maka akụkụ ihe odide ndị i chere na ha pụrụ ịdị gị mkpa otu ụbọchị n’ọrụ nkwusa na izi ihe gị, rịba okwu bụ́ isi ama ma lee ndepụta ntụaka nke okwu Bible bụ́ nke dị n’azụ Bible gị. *

Mee Ka Ọgụgụ Bible Bụrụ Ihe Na-atọ Ụtọ

17. N’ihi gịnị ka ịgụ Bible ji kwesị ịdị na-atọ anyị ụtọ?

17 Ọbụ abụ ahụ kwuru banyere nwoke obi ụtọ bụ́ onye ọ bụ “n’iwu Jehova ka ihe ụtọ ya dị; ọ bụkwa n’iwu Ya ka ọ na-atụgharị uche ehihie na abalị.” (Abụ Ọma 1:2) Ọgụgụ Bible anyị na-agụ kwa ụbọchị ekwesịghị ịbụ ihe a na-eme iji mezuo iwu kama, ihe na-atọ ụtọ n’ezie. Otu ụzọ isi mee ka ọ bụrụ ihe na-atọ ụtọ bụ ịmara mgbe nile uru ihe ndị a na-amụta bara. Eze Solomọn maara ihe dere, sị: “Onye ihe na-agara nke ọma ka mmadụ nke chọtaworo amamihe bụ . . . Ụzọ ya nile bụ ụzọ nke ịdị ụtọ, okporo ụzọ ya nile bụkwa udo. Osisi na-enye ndụ ka ọ bụụrụ ndị na-ejide ya aka: ee, onye ọ bụla nke na-ejisi ya aka ike bụ onye ihe na-agara nke ọma.” (Ilu 3:13, 17, 18) Mgbalị a chọrọ iji nweta amamihe kwesịịrị ya n’ezie, n’ihi na ụzọ ya nile bụ ụzọ nke ịdị ụtọ, udo, obi ụtọ, nakwa n’ikpeazụ, ndụ.

18. Tụkwasị n’ọgụgụ Bible, gịnị ọzọ dị mkpa, gịnịkwa ka anyị ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

18 Ee, ọgụgụ Bible bụ ma ihe bara uru ma ihe na-atọ ụtọ. Ma, ọ̀ bụ ebe ahụ ka ọ gwụrụ? Ndị na-aga chọọchị Krisendọm anọwo na-agụ Bible ruo ọtụtụ narị afọ, “na-amụ ihe mgbe nile, ma ha apụghị ịbịaru ịmazu eziokwu mgbe ọ bụla.” (2 Timoti 3:7) Ka ọgụgụ Bible wee bụrụ ihe na-amị mkpụrụ, anyị aghaghị ịgụ ya na-eburu n’uche itinye ihe ọmụma ndị anyị na-enweta n’ọrụ ná ndụ anyị na iji ya na-eme ihe n’ọrụ nkwusa na izi ihe anyị. (Matiu 24:14; 28:19, 20) Nke a na-achọ mgbalị na usoro dị mma nke ịmụ ihe, bụ́ nke pụkwara ịdị ụtọ ma na-akwụghachị ụgwọ, dị ka anyị ga-ahụ n’isiokwu na-esonụ.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 9 Lee akwụkwọ bụ́ Jehovah’s Witnesses—Proclaimers of God’s Kingdom, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara, peeji nke 241.

^ par. 16 Lee Ụlọ Nche nke May 1, 1995, peeji nke 16-17, “Aro Ndị Ga-eme Ka Ọgụgụ Bible Gị Ka Mma.

Ajụjụ Ntụleghachi

• Ndụmọdụ dị aṅaa e nyere ndị eze Israel metụtara ndị nlekọta taa, n’ihi gịnịkwa?

• Ole ndị taa dị ka “ndị ọbịa” na “ụmụntakịrị,” n’ihi gịnịkwa ka o ji dị ha mkpa ịgụ Bible kwa ụbọchị?

• N’ụzọ ndị dị aṅaa dị irè ka “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” siworo nyere anyị aka ịgụchi Bible anya?

• Olee otú anyị pụrụ isi na-erite ezigbo uru ma na-enweta obi ụtọ site n’ọgụgụ Bible anyị?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 9]

Ọ dị ndị okenye mkpa karịsịa ịgụ Bible kwa ụbọchị

[Foto dị na peeji nke 10]

E ji ikere òkè n’ọgụgụ Akwụkwọ Nsọ n’ụlọ nzukọ mara Jisọs