Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịgba Mkpụrụ nke Eziokwu Mmiri na Chile

Ịgba Mkpụrụ nke Eziokwu Mmiri na Chile

Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ

Ịgba Mkpụrụ nke Eziokwu Mmiri na Chile

Ọ PỤRỤ iwe ọtụtụ afọ tupu mmiri ezoo n’ọzara nke ebe ugwu Chile. Ma mgbe o zoro, ala kpọrọ nkụ nke nkume jupụtara na-agbanwe ghọọ ala nke okooko osisi ndị nwere ọtụtụ àgwà jupụtara na ya. Ihe a na-adọrọ adọrọ na-adọta ọtụtụ ndị njem nleta si n’akụkụ nile nke mba ahụ.

Otú ọ dị, ọ dị ihe ka adọrọ mmasị nke na-eme n’etiti ndị Chile. Mmiri nke eziokwu Bible na-asọga n’akụkụ nile nke ala ahụ, ọtụtụ ndị nwere ezi obi ‘na-agbawa okooko’ ghọọ ndị na-eso ụzọ Jisọs Kraịst. Otu ụzọ e si agbasa mmiri nke eziokwu a bụ site na telifon. Ahụmahụ ndị na-esonụ na-egosipụta ihe ọma ndị a na-arụpụta site n’ụzọ ịgba àmà a.

• A gwara otu onye na-ekwusa ozi ọma oge nile nke aha ya bụ Karina ka o mee ihe ngosi ná mgbakọ sekit banyere otú e si eji telifon agba àmà. Otú ọ dị, Karina ekeretụbeghị òkè n’ụdị ọrụ ịgba àmà ahụ. Iji gbaa ya ume ikere òkè n’ihe omume mgbakọ ahụ, otu okenye na nwunye ya sooro Karina tụleghachi isi ihe ụfọdụ banyere otú e si eji telifon agba àmà. Ha gbakwara ya ume ịrịọ maka nduzi Jehova n’okwu ahụ. O mere otú ahụ, e mesịa o kpebiri ịnwa ịkpọ mmadụ na fon.

Karina họọrọ otu nọmba telifon nke dị n’obodo nta dị ha nso. Otu onye ọrụ telifon zara, Karina kọwakwara nzube o ji maka ya na-akpọ. Onye ọrụ telifon ahụ zaghachiri n’ụzọ dị mma, ha mekwara ndokwa ikwurịta okwu ọzọ n’ụbọchị atọ n’ihu. Nletaghachi ahụ o ji telifon mee mere ka ha malite ọmụmụ Bible, na-eji broshuọ bụ́ Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị? Kemgbe ahụ, ha enwewo ọmụmụ ihe ndị na-adọrọ mmasị na ndị dị ụtọ, Karina ezigawokwara nwanyị ahụ akwụkwọ iji zaa ya ajụjụ ndị o nwere.

• Bernarda butere ụzọ n’ịgbara otu nwoke kpọrọ nọmba telifon ya n’amaghị ama, àmà. Kama igosipụta iwe, Bernarda kọwara onwe ya dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova ma kwuo ka ya nyere ya aka. Ha malitere nkwurịta okwu, nwoke ahụ gekwara ntị ka ọ na-akọwa otú Alaeze Chineke ga-esi wepụ ikpe na-ezighị ezi n’isi nso. Nwoke ahụ nyere Bernarda nọmba fon ya, Bernarda jikwa telifon mee nletaghachi. N’otu n’ime nkwurịta okwu ha, ọ gụụrụ nwoke ahụ otu akụkụ nke akwụkwọ bụ́ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi. Nwoke ahụ jụrụ ya otú ọ ga-esi nweta otu, Bernarda zigakwaara ya otu, ya na Bible. E mere ndokwa ka otu nwanna nwoke bi n’ógbè ahụ leta ya, bụ́ onye nọgideziri ‘na-agba ihe ọkụkụ a na-eto nke ọma mmiri.’

Ee, n’ala ime mmụọ kpọrọ oké nkụ nke ụwa a, mkpụrụ ndị zoro ezo na-echere iji puo ome mgbe mmiri na-enye ndụ ga-eru ha. Ọtụtụ puku ndị akpịrị na-akpọ nkụ na-anọgide ‘na-epu’ ma ‘na-agbawa okooko’ ghọọ ndị ohu Jehova Chineke na-ekwesị ntụkwasị obi.—Aịsaịa 44:3, 4.