Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịkwanyere Ịbụisi Ùgwù—N’ihi Gịnị Ka O Ji Dị Oké Mkpa?

Ịkwanyere Ịbụisi Ùgwù—N’ihi Gịnị Ka O Ji Dị Oké Mkpa?

 Ịkwanyere Ịbụisi Ùgwù—N’ihi Gịnị Ka O Ji Dị Oké Mkpa?

OLEE onye na-adịghị enwe ekele na ndị uwe ojii nwere ikike ijide ndị omekome bụ́ ndị na-ezu ihe onwunwe anyị ma ọ bụ na-eyi ezinụlọ anyị egwu? Ọ̀ bụ na anyị adịghịkwa enwe ekele na ụlọikpe nwere ikike ịta ndị omekome ahụhụ iji chebe ndị obodo?

Ozi ndị ọzọ na-enye aka a na-ejere ọha na eze, dị ka ịrụzi ụzọ, nzacha na mkpocha, na agụmakwụkwọ—ndị a na-akwụ ụgwọ ha site n’ụtụ isi ndị gọọmenti na-anakọta—pụkwara ịgbata n’uche. Ezi ndị Kraịst na-ebute ụzọ n’ikweta na ọ dị oké mkpa ịkwanyere ịbụisi a họpụtara ahọpụta ùgwù. Ma olee ókè nkwanye ùgwù dị otú ahụ na-eru? N’akụkụ ndị dịkwa aṅaa nke ndụ ka a chọrọ ka a na-akwanyere ịbụisi ùgwù?

Ịbụisi n’Obodo

Bible na-agwa mmadụ nile, ma hà bụ ndị kwere ekwe ma hà bụ ndị na-ekweghị ekwe, ka ha na-akwanyere ịbụisi obodo ùgwù, bụ́ ndị na-arụ ọrụ maka ọdịmma ndị obodo. Onye Kraịst bụ́ Pọl onyeozi degaara ndị kwere ekwe ibe ya nọ na Rom akwụkwọ banyere nke a, ọ bakwara uru ịtụle ihe ọ na-ekwu, dị ka e dekọrọ ya ná Ndị Rom 13:1-7.

Ṗọl bụ nwa amaala Rom, Rom bụkwa ike ọchịchị ụwa n’oge ahụ. Akwụkwọ ozi Pọl, bụ́ nke o dere n’ihe dị ka afọ 56 O.A., dụrụ ndị Kraịst ọdụ ịbụ ụmụ amaala na-esetịpụ ezi ihe nlereanya. O dere, sị: “Ka mkpụrụ obi ọ bụla doo onwe ya n’okpuru ndị na-achị isi n’elu ya: n’ihi na ọ dịghị onye ọ bụla na-achị isi ma ọ bụrụ na Chineke edoghị ya; ndị na-achị isi bụkwa ndị Chineke doworo.”

N’ebe a, Pọl na-akọwa na a garaghị enwe ịbụisi mmadụ ọ bụla ma ọ bụrụ na Chineke ekweghị ka ọ dịrị. N’echiche ahụ, ndị na-achị isi nwetụrụ ọnọdụ ná nzube Chineke. Ya mere, ọ pụtara na “onye na-edo onwe ya megide onye ahụ na-achị isi, ọ na-eguzogide iwu Chineke nyere.”

Ọ bụ ezie na ndị na-achị isi pụrụ ịja ụmụ amaala mere ezi ihe mma, e nyekwara ndị a na-achị isi ikike inye ndị mere ihe ọjọọ ntaramahụhụ. E nwere ọtụtụ ihe mere ndị na-eme ihe ọjọọ ga-eji na-atụ ikike ndị na-achị isi nwere ịrụ ọrụ dị ka “onye ọ́bọ̀” egwu, ebe ọ bụ na  gọọmenti na-eme otú ahụ dị ka “onye na-ejere Chineke ozi.”

Pọl mechiri okwu ya site n’ikwu, sị: “N’ihi ya ọ dị mkpa ido onwe unu n’okpuru ya, ọ bụghị nanị n’ihi iwe ahụ, kama ọ bụkwa n’ihi akọ na uche. N’ihi na ọ bụ n’ihi nke a ka unu na-atụkwa ụtụ; n’ihi na ha bụ ndị na-efe Chineke ofufe, na-anọgidesi ike n’ọrụ ha ime otu ihe a.”

Ibu ọrụ nke ikpebi ihe a ga-eji ụtụ isi rụọ dị n’ubu ndị na-achị isi, ọ bụghị n’ubu onye na-atụ ya. Dị ka nwa amaala na-akwụwa aka ọtọ, onye Kraịst na-anọgide na-enwe ezi akọ na uche. Ọ maara na site n’ido onwe ya n’okpuru ndị na-achị isi na ịtụ ụtụ isi ruuru ya, ọ bụghị nanị na ọ na-eme ka ọnọdụ obodo o bi na ya ka mma kama ọ na-ebikwa ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ihe Chineke chọrọ.

Ezinụlọ na Ịbụisi

Gịnị banyere ịbụisi n’ezinụlọ? N’ụbọchị ndị mbụ nke ndụ ya, nwa ọhụrụ ga-achọkarị ka e lebara ya anya site n’ịkwa ákwá ma ọ bụ ọbụna site n’iti mkpu. Ma, nne ma ọ bụ nna maara ihe ga-aghọta ihe ndị na-akpa nwa ọhụrụ ahụ n’ezie, n’ekweghị ka ọ bụrụ oké iwe ga-ekpebi ihe ọ ga-eme. Ka ụmụaka ụfọdụ na-etolite, a na-ahapụ ha imere otú masịrị ha, na-ahapụkwa ha isetịpụ ụkpụrụ nke aka ha. N’ịbụ ndị na-enweghị ahụmahụ, ha pụrụ itinye aka na mpụ ma ọ bụ n’omume ọjọọ ndị ọzọ, na-akpaghasị ma ezinụlọ ma obodo n’ozuzu ya, dị ka ọtụtụ ndị ọchịchị obodo maara nke ọma.

“Ndị nne na nna na-adọ ụmụ ha aka ná ntị mgbe oge gaferela nnọọ,” ka Rosalind Miles, bụ́ onye dere akwụkwọ bụ́ Children We Deserve, na-ekwu. “Oge a ga-amalite bụ ozugbo a mụrụ nwata ahụ.” Ọ bụrụ na site ná mmalite, ndị nne na nna ejiri olu ọma na ịhụnanya na-achịkwa ụmụ ha, na-emekwa ihe kwekọrọ n’ihe ha na-ekwu, n’oge na-adịghị anya, ụmụ ha ga-amụta ịnakwere ịbụisi ahụ na ịdọ aka ná ntị ịhụnanya na-esite na ya.

Bible bu ihe ọmụma buru ibu banyere ịbụisi n’ezinụlọ. N’akwụkwọ Ilu, nwoke ahụ maara ihe bụ́ Solomọn na-adọrọ uche gaa n’ịdị n’otu nke ndị nne na nna na-atụ egwu Chineke nwere n’ihu ụmụ ha, na-ekwu, sị: “Nwa m, nụrụ ịdọ aka ná ntị nke nna gị, ahapụkwala iwu nne gị.” (Ilu 1:8) Mgbe ndị nne na nna nọgidere na-enwe ụdị ịdị n’otu ahụ ezi uche dị na ya n’ihu ụmụ ha, ụmụ ha na-ama ebe ha kwụ. Ha pụrụ ịnwa ime ka otu n’ime ndị mụrụ ha megide onye nke ọzọ ná mgbalị iji nweta ihe ndị ha chọrọ, ma ịbụisi nke ndị nne na nna ji otu olu na-eme ihe bụụrụ ndị na-eto eto ihe nchebe.

Bible na-akọwa na di nwere ibu ọrụ bụ́ isi maka ọdịmma ime mmụọ nke ọ bụghị nanị ụmụ ya kamakwa nwunye ya. A kọwara nke a dị ka ịbụisi. Olee otú e kwesịrị isi jiri ịbụisi a mee ihe? Pọl na-ekwu na dị ka Kraịst bụ Isi nke ọgbakọ, otú ahụ ka nwoke bụ isi nke nwunye ya. Pọl gbakwụnyeziri, sị: “Ndị bụ́ di, hụnụ nwunye unu n’anya, dị ka Kraịst anyị hụkwara nzukọ Ya n’anya [nwunye ime mmụọ ya], rarakwa Onwe ya nye n’ihi ya.” (Ndị Efesọs 5:25) Mgbe nwoke gbasoro ihe nlereanya Jisọs wee na-egosipụta ịbụisi ya n’ụzọ ịhụnanya, nwunye ya ga “na-atụ egwu” ya. (Ndị Efesọs 5:33) Ụmụ ndị nọ n’ezinụlọ dị otú ahụ ga-ahụkwa uru ikike ịchịisi Chineke nyere bara, ọ ga-agbakwa ha ume ịnakwere ya.—Ndị Efesọs 6:1-3.

Olee otú ndị nne ma ọ bụ nna nanị ha na-azụ ụmụ, gụnyere ndị di ma ọ bụ nwunye ha nwụnahụworo, pụrụ isi melie nke a? Ma hà bụ nna ma hà bụ nne, ha pụrụ ịrịọ kpọmkwem ka Jehova Chineke na Jisọs Kraịst nye ha ikike. Jisọs ji ikike kwuo okwu mgbe nile —nke Nna ya na nke Akwụkwọ Nsọ e dere n’ike mmụọ nsọ.—Matiu 4:1-10; 7:29; Jọn 5:19, 30; 8:28.

Bible na-enye ụkpụrụ ndị bara uru n’ụba bụ́ ndị metụtara nsogbu ndị ụmụaka na-eche ihu. Site n’ịchọpụta ụkpụrụ ndị a na ịgbaso ha, ndị nne ma ọ bụ nna ga-enwe ike inye ụmụ ha ndụmọdụ ịhụnanya na ndị na-enye aka. (Jenesis 6:22; Ilu 13:20; Matiu 6:33; 1 Ndị Kọrint 15:33; Ndị Filipaị 4:8, 9) Ndị nne na nna pụkwara izo aka n’akwụkwọ ndị dabeere na Bible bụ́ ndị e dere kpọmkwem iji nyere ha aka ịzụ ụmụ ha ịghọta abamuru nke ịkwanyere ikike nke Akwụkwọ Nsọ ùgwù. *

Ọgbakọ Ndị Kraịst na Ịbụisi

“Onye a bụ Ọkpara m M hụrụ n’anya, Onye ihe Ya dị m ezi mma; nụrụnụ okwu Ya.” (Matiu 17:5) Okwu ndị a, bụ́ ndị Jehova Chineke kwuru n’onwe ya, na-akwado na Jisọs bụ onye na-eji ikike Chineke ekwu okwu. E dekọrọ ihe ndị o kwuru n’ihe ndekọ Oziọma anọ ahụ bụ́ ndị anyị pụrụ ịtụle n’ụzọ dị mfe.

Obere oge tupu Jisọs arịgoro eluigwe, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “E werewo ike nile dị n’eluigwe na n’elu ụwa nye m.” (Matiu 28:18) Dị ka Isi nke ọgbakọ ya, ọ bụghị nanị na Jisọs na-elebara ụmụazụ ya e tere mmanụ nọ n’ụwa anya kama, kemgbe a wụpụrụ mmụọ nsọ ahụ na Pentikọst 33 O.A., o jiriwokwa ha mee ihe dị ka usoro e si enweta eziokwu, dị ka “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche.” (Matiu 24:45-47; Ọrụ 2:1-36) Gịnị ka o meworo iji mezuo ihe nile a iji wusie ọgbakọ ndị Kraịst ike? “Mgbe ọ rịgoro n’elu . . . , o nyere onyinye n’ụdị mmadụ.” (Ndị Efesọs 4:8, NW) “Onyinye n’ụdị mmadụ” ndị a bụ ndị Kraịst bụ́ ndị okenye, bụ́ ndị e ji mmụọ nsọ họpụta ma nye ha ikike ilekọta ọdịmma ime mmụọ nke ndị kwere ekwe ibe ha.—Ọrụ 20:28.

N’ihi nke a, Pọl na-adụ ọdụ, sị: “Na-echetanụ ndị isi unu, bụ́ mmadụ ndị gwara unu okwu Chineke; na-ekirikwanụ ọpụpụ nke ibi obi ha, na-eṅomikwanụ okwukwe ha.” Ebe ọ bụ na ndị ikom a na-ekwesị ntụkwasị obi na-agbasochi nzọụkwụ Jisọs anya, n’ezie, ọ bụ ihe amamihe iṅomi okwukwe ha. Pọl gbakwụnyeziri, sị: “Na-ekwenyenụ ndị isi unu, na-edokwanụ onwe unu n’okpuru ha: [“nọgidenụ na-anabata ikike ha nwere n’ebe unu nọ,” The Amplified Bible] n’ihi na ndị ahụ na-amụ anya n’ihi mkpụrụ obi unu, dị ka ndị ga-aza ajụjụ banyere unu; ka ha wee were ọṅụ mee nke a, ghara ịsụ ude: n’ihi na nke a ga-abụ ihe na-abaghị[rị] unu uru.”—Ndị Hibru 13:7, 17.

Gịnị na-eme mgbe e leghaara ntụziaka dị otú ahụ anya? Ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ ndị Kraịst oge mbụ mere nnọọ otú ahụ ma si n’ezi ofufe dapụ. A kpọtụrụ Haịmeniọs na Filitọs aha dị ka ndị ikom mebiri okwukwe nke ụfọdụ ndị na ndị okwu efu ha ‘na-emerụ emerụ.’ Otu n’ime ihe ndị ha na-azọrọ bụ na mbilite n’ọnwụ ewereworị ọnọdụ, ihe àmà na-egosi na ma ọ́ bụghị nke ime mmụọ ọ bụrụ nke ihe atụ, n’ihi ya kwa na, a gaghị enwe mbilite n’ọnwụ ọzọ n’ọdịnihu n’okpuru Alaeze Chineke.—2 Timoti 2:16-18.

Ndị a họpụtara ịchịisi gbatara ọsọ enyemaka. Ndị Kraịst bụ́ ndị okenye gbaghara okwu dị otú ahụ n’ihi na dị ka ndị nnọchiteanya  nke Jisọs Kraịst, ha ji ikike nke Akwụkwọ Nsọ mee ihe. (2 Timoti 3:16, 17) Otú ahụ ka ọ dị taa n’ọgbakọ ndị Kraịst, bụ́ nke a kọwara dị ka “idé na ntọala nke eziokwu.” (1 Timoti 3:15) A gaghị ekwe ka ozizi ụgha mebie “ihe ilereanya nke okwu na-enye ezi ndụ” ma ọlị, bụ́ nke e chekwaara anyị n’ime Bible dị ka ihe ọma e nyere anyị n’aka idebe.—2 Timoti 1:13, 14.

Ọ bụ ezie na ùgwù a na-akwanyere ịbụisi na-emi ala n’ike n’ike n’ụwa, dị ka ndị Kraịst, anyị na-aghọta na e guzobere ịbụisi kwesịrị ekwesị n’obodo, n’ezinụlọ, nakwa n’ọgbakọ ndị Kraịst maka abamuru anyị. Ịkwanyere ịbụisi ùgwù dị oké mkpa maka ahụ ike anyị n’ụzọ anụ ahụ, n’ụzọ mmetụta uche, nakwa n’ụzọ ime mmụọ. Site n’ịnakwere na ịkwanyere ikike ịchịisi dị otú ahụ nke Chineke nyere ùgwù, ndị na-achị isi kasịnụ—Jehova Chineke na Jisọs Kraịst—ga-echebe anyị maka ọdịmma ebighị ebi anyị.—Abụ Ọma 119:165; Ndị Hibru 12:9.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 17 Lee akwụkwọ ndị bụ́ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè na Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ, ndị Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 5]

Bible bu ihe ọmụma buru ibu banyere ịbụisi n’ezinụlọ

[Foto dị na peeji nke 6]

Ndị nne ma ọ bụ nna nanị ha na-azụ ụmụ pụrụ ịrịọ kpọmkwem ka Jehova Chineke na Jisọs Kraịst nye ha ikike

[Foto ndị dị na peeji nke 7]

Ndị Kraịst na-aghọta na e guzobere ịbụisi kwesịrị ekwesị n’ezinụlọ, n’ọgbakọ ndị Kraịst, nakwa n’obodo maka abamuru ha

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 4]

Foto nke Josh Mathes sere, Nchịkọta nke Ụlọikpe Kasị Elu nke United States