Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Nlereanya Ọma Ị̀ Na-erite Uru n’Aka Ha?

Ndị Nlereanya Ọma Ị̀ Na-erite Uru n’Aka Ha?

 Ndị Nlereanya Ọma Ị̀ Na-erite Uru n’Aka Ha?

“U NU ghọrọ ihe atụ n’ebe ha nile nọ, bụ́ ndị kwere ekwe n’ime Masedonia na n’ime Akaịa.” Pọl onyeozi degaara ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi bi na Tesalọnaịka okwu ndị a. Ihe nlereanya ha setịpụụrụ ndị kwere ekwe ibe ha kwesịrị ịja mma n’ezie. Ma, ndị Tesalọnaịka n’onwe ha nọ na-agbaso ihe nlereanya Pọl na ndị ibe ya setịpụworo. Pọl kwuru, sị: “Ọ bụghị nanị n’okwu ọnụ ka ozi ọma anyị bịaruru unu, kama ọ bịakwara n’ike, na n’ime Mmụọ Nsọ na ọtụtụ nkwezu; dị ka unu matara aha mmadụ a hụrụ na anyị bụ n’ebe unu nọ n’ihi unu. Unu onwe unu ghọkwara ndị na-eṅomi anyị.”—1 Ndị Tesalọnaịka 1:5–7.

Ee, ọ bụghị nanị izi ihe ka Pọl ziri. Ndụ ya kpọmkwem bụ ihe na-akpali akpali—ihe nlereanya nke okwukwe, ntachi obi, na ịchụ onwe onye n’àjà. N’ihi nke a, Pọl na ndị ibe ya bịara nwee mmetụta dị ike ná ndụ ndị Tesalọnaịka, na-akpali ha ịnabata eziokwu ahụ “n’ime ọtụtụ mkpagbu.” Otú ọ dị, ọ bụtụghị nanị Pọl na ndị ha na ya na-arụkọ ọrụ nwere mmetụta dị mma n’ebe ndị ahụ kwere ekwe nọ. Ihe nlereanya nke ndị ọzọ bụ́ ndị tachiri obi ná mkpagbu bụkwa ihe agbamume. Pọl degaara ndị Tesalọnaịka akwụkwọ, sị: “Unu onwe unu, ụmụnna anyị, ghọrọ ndị na-eṅomi nzukọ nile nke Chineke nke dị na Judia n’ime Kraịst Jisọs: n’ihi na unu onwe unu hụkwara otu ahụhụ ahụ n’aka ndị unu na ha bụ otu ala, ọbụna dị ka ndị ahụ hụrụ ahụhụ n’aka ndị Juu.”—1 Ndị Tesalọnaịka 2:14.

Kraịst Jisọs—Onye Nlereanya Kasịnụ

Ọ bụ ezie na Pọl n’onwe ya setịpụrụ ihe nlereanya kwesịrị nṅomi, ọ laghị azụ n’ikwu na Jisọs bụ onye nlereanya bụ́ isi ndị Kraịst kwesịrị ịgbaso. (1 Ndị Tesalọnaịka 1:6) Kraịst bụ Onye Nlereanya anyị kasịnụ. Pita onyeozi dere, sị: “N’ihi na a kpọrọ unu ime nke a: n’ihi na Kraịst hụkwara ahụhụ n’ihi unu, na-ahapụrụ unu ihe ilereanya, ka unu wee soo ijeụkwụ Ya nile.”—1 Pita 2:21.

Otú ọ dị, Jisọs dịsịrị ndụ ya dị ka mmadụ n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 2,000 gara aga. Ugbu a ọ “na-ebi n’ime ìhè nke a na-apụghị ịbịaru nso” dị ka onye bụ́ mmụọ e kere eke nke na-adịghị anwụ anwụ. N’ihi ya, “ọ dịghị mmadụ ọ bụla hụworo Ya anya, ma ọ bụ pụ ịhụ Ya anya.” (1 Timoti 6:16) Oleezi otú anyị pụrụ isi ṅomie ya? Otu ụzọ bụ site n’ịmụ ihe ndekọ anọ nke Bible banyere ndụ Jisọs. Oziọma ndị ahụ na-eme ka a ghọta àgwà ya, ụzọ ndụ ya, na “uche” ya. (Ndị Filipaị 2:5-8) A pụrụ inwetakwu nghọta site n’iji nlezianya mụọ akwụkwọ bụ́ Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ, bụ́ nke na-akọ banyere ihe ndị mere ná ndụ Jisọs n’ụzọ zuru nnọọ ezu nakwa n’usoro ha si mee. *

Ihe nlereanya Jisọs nke ịchụ onwe onye n’àjà nwere mmetụta dị ike n’ebe Pọl onyeozi nọ. Ọ gwara ndị Kọrint bụ́ ndị Kraịst, sị: “Ma mụ onwe m ga-ewere obi ụtọ nile mefuo ihe m nwere kwekwa ka e mefusịa mụ onwe m n’ihi mkpụrụ obi unu.” (2 Ndị Kọrint 12:15) Lee àgwà yiri nke Kraịst nke ahụ bụ! Ka anyị na-atụgharị uche n’ihe nlereanya zuru okè nke Kraịst, e kwesịkwara ịkwali anyị onwe anyị iṅomi ya n’ụzọ ndụ anyị.

Dị ka ihe atụ, Jisọs kụziiri anyị na anyị kwesịrị ịdabere ná nkwa Chineke kwere igboro anyị mkpa ihe onwunwe. Ma o mere ihe karịrị nke ahụ. O gosipụtara okwukwe na obi ike dị otú ahụ n’ebe Jehova nọ kwa ụbọchị. O kwuru, sị: “Nkịta  ọhịa nwere ọnụ ha na-edina, anụ ufe nke eluigwe nwekwara ebe ha na-arahụ ụra; ma Nwa nke mmadụ enweghị ebe ịtọgbọ isi Ya.” (Matiu 6:25; 8:20) Nchegbu banyere ihe onwunwe ọ̀ na-emejupụta ihe ka ukwuu n’echiche na omume gị? Ka ndụ gị ọ̀ na-enye ihe àmà na ị na-ebu ụzọ achọ Alaeze ahụ? Gịnịkwanụ banyere omume gị n’ebe ozi Jehova dị? Ọ̀ dị ka nke Onye Nlereanya anyị, bụ́ Jisọs? Bible na-egosi na ọ bụghị nanị na Jisọs kwuru ka a na-anụ ọkụ n’obi kama o gosipụtara oké ịnụ ọkụ n’obi n’ọtụtụ oge. (Jọn 2:14-17) Ọzọkwa, lee ezi ihe nlereanya Jisọs setịpụrụ ma a bịa n’ihe banyere ịhụnanya! Leenụ, ọ chụrụ ndụ ya n’àjà maka ndị na-eso ụzọ ya! (Jọn 15:13) Ị̀ na-eṅomi Jisọs site n’igosipụta ịhụnanya n’ebe ụmụnna gị bụ́ ndị Kraịst nọ? Ka ị̀ na-ekwe ka ezughị okè nke ụfọdụ ndị gbochie gị ịhụ ha n’anya?

Ná mgbalị anyị na-eme ịgbaso ihe nlereanya Kraịst, mgbe mgbe anyị agaghị emeru otú o kwesịrị. Ma n’ezie Jehova na-enwe obi ụtọ maka mgbalị anyị na-eme iji “[yikwasị] Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.”—Ndị Rom 13:14.

‘Ihe Atụ Ìgwè Atụrụ ahụ Ga-eṅomi’

È nwere ndị nọ n’ọgbakọ taa bụ́ ndị pụrụ ịbụrụ anyị ndị nlereanya? Eenụ, e nwere! Karịsịa ụmụnna ndị nwoke a họpụtara n’ọnọdụ ibu ọrụ aghaghị isetịpụ ihe nlereanya. Pọl gwara Taịtọs, bụ́ onye jere ozi n’ọgbakọ ndị dị na Krit ma họpụta ndị nlekọta na onye okenye ọ bụla a họpụtara ahọpụta aghaghị ịbụ “onye a na-apụghị ibo ebubo.” (Taịtọs 1:5, 6) N’otu aka ahụ, Pita onyeozi dụkwara “ndị okenye” ọdụ ime onwe ha ‘ihe atụ ìgwè atụrụ ahụ ga-eṅomi.’ (1 Pita 5:1-3) Gịnịkwanụ banyere ndị na-eje ozi dị ka ndị ohu na-eje ozi? Ha aghaghịkwa ịbụ “ndị jeworo ozi nke ọma.”—1 Timoti 3:13.

N’ezie, ọ bụghị ihe ezi uche dị na ya ịtụ anya na onye okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi ọ bụla ga-enwe nkà n’ụzọ pụtara ìhè n’akụkụ nile nke ozi ndị Kraịst. Pọl gwara ndị Kraịst nọ na Rom, sị: “Anyị nwere onyinye amara dị iche iche dị ka amara nke e nyere anyị si dị.” (Ndị Rom 12:6) Ụmụnna dị iche iche nwere ebe dị iche iche ha na-eme nke ọma karị. Ọ bụghị ihe ezi uche dị na ya ịtụ anya na ndị okenye ga-eme ihe ma ọ bụ kwuo okwu nile n’ụzọ zuru okè. “Anyị nile na-asụ ngọngọ n’ọtụtụ ihe,” ka Bible na-ekwu na Jemes 3:2. “Ọ bụrụ na onye ọ bụla asụghị ngọngọ n’okwu, onye ahụ bụ nwoke tozuru okè, bụrụkwa onye pụrụ ịkwa ahụ ya dum nga.” Otú ọ dị, n’agbanyeghị ezughị okè ha, ndị okenye ka pụrụ, dị ka Timoti, ‘ime onwe ha ka ha bụrụ ihe atụ nye ndị kwere ekwe n’okwu, n’ibi obi, n’ịhụnanya, n’okwukwe, n’ịdị ọcha.’ (1 Timoti 4:12) Mgbe ndị okenye na-eme otú ahụ, ndị nọ n’ìgwè atụrụ ahụ ga-eji ọchịchọ obi tinye ndụmọdụ nke Ndị Hibru 13:7 n’ọrụ, bụ́: “Na-echetanụ ndị isi unu, . . . na-ekirikwanụ ọpụpụ nke ibi obi ha, na-eṅomikwanụ okwukwe ha.”

Ndị Nlereanya Ọzọ nke Oge A

N’ime iri afọ ole na ole gafeworonụ, imerime ndị ọzọ egosipụtawo onwe ha ịbụ ndị nlereanya ọma. Gịnị banyere ọtụtụ puku ndị ozi ala ọzọ na-achụ onwe ha n’àjà bụ́ ndị “hapụrụ ụlọ, ma ọ bụ ụmụnne ndị ikom, ma ọ bụ ụmụnne ndị inyom, ma ọ bụ nna, ma ọ bụ nne, ma ọ bụ ụmụ, ma ọ bụ ubi” iji rụzuo ọrụ ndị Kraịst n’ubi ala ọzọ? (Matiu 19:29) Cheekwa banyere ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na nwunye ha, ndị ikom na ndị inyom bụ́ ndị na-eje ozi dị ka ndị ozi afọ ofufo n’alaka ụlọ ọrụ dị iche iche nke Watch Tower Society, na ndị ọsụ ụzọ bụ́ ndị na-ejere ọgbakọ dị iche iche ozi. Ndị nlereanya dị otú ahụ hà pụrụ ịkwali ndị ọzọ? Otu onye Kraịst na-ezisa ozi ọma n’Esia na-echeta otu onye ozi ala ọzọ sitere na klas nke asatọ nke Watchtower Bible School of Gilead. Ọ sịrị na nwanna nwoke a na-ekwesị ntụkwasị obi dị “njikere ịnagide imerime anwụnta na udè na emekpa ahụ. . . . Nke kasị akpali akpali bụ ikike o nwere iji ma asụsụ Chinese ma asụsụ Malay na-ekwusa ozi ọma n’agbanyeghị na o si England.” Mmetụta dị aṅaa ka ezi ihe nlereanya a nwere?  Nwanna nwoke ahụ kwuru, sị: “Ịdị nwayọọ na obi ike ya kpaliri m ịchọ ịghọ onye ozi ala ọzọ mgbe m toro.” Ọ bụghị ihe ijuanya na nwanna nwoke a mesịrị ghọọ onye ozi ala ọzọ.

Akwụkwọ bụ́ Watch Tower Publications Index nwere ọtụtụ ihe ndekọ nke akụkọ ndụ ndị pụtaworo na magazin Ụlọ Nche na Teta! Akụkọ ndị a na-akọ banyere mmadụ ndị hapụworo ọrụ na ihe mgbaru ọsọ nke ụwa, merie adịghị ike dị iche iche, mee mgbanwe ndị dị egwu n’àgwà ha, nọgide na-enwe àgwà ziri ezi n’oge ahụhụ, gosipụtakwa ịdị uchu, ntachi obi, iguzosi ike n’ihe, ịdị umeala n’obi, na mmụọ nke ịchụ onwe onye n’àjà. Otu onye na-agụ ha dere banyere akụkọ ndị a, sị: “Ha na-eme ka m bụrụ onye Kraịst dịkwu umeala n’obi ma nwekwuo ekele ka m na-agụ ihe ndị ọzọ gabigaworo, ha enyewokwara m aka ịghara iche banyere onwe m gabiga ókè ma ọ bụ ịbụ onye na-achọ ọdịmma onwe ya nanị.”

Tụkwasị na nke a, echefula ndị nlereanya ọma nọ n’ọgbakọ gị: ndị isi ezinụlọ bụ́ ndị na-adịghị ahapụ ilekọta ma mkpa anụ ahụ ma mkpa ime mmụọ nke ezinụlọ ha; ụmụnna nwanyị—gụnyere ndị nne nanị ha na-azụ ụmụ—ndị na-achịkwa nrụgide nke ịzụ ụmụ ma na-ekerechikwarị òkè anya n’ozi; ndị kataworo ahụ na ndị ahụ na-adịkwaghị ike bụ́ ndị na-anọgide na-ekwesị ntụkwasị obi n’agbanyeghị adịghị ike na ahụ esighị ike ha bụ́ nke na-akawanye njọ. Ọ̀ bụ na ndị nlereanya dị otú ahụ adịghị akwali gị?

N’eziokwu, ndị nlereanya ọjọọ jupụtara n’ụwa. (2 Timoti 3:13) Ka o sina dị, chee banyere agbamume Pọl nyere ndị Kraịst bi na Judia. Mgbe ọ kpọtụsịrị àgwà kwesịrị nṅomi nke ọtụtụ ndị ikom na ndị inyom nke okwukwe n’oge ochie, aha, Pọl onyeozi gbara ha ume, sị: “Ya mere ka anyị onwe anyị, ebe anyị nwere oké ìgwè ndị àmà dị otú a ndị gbara anyị gburugburu dị ka igwe ojii, ka anyị . . . werekwa ntachi obi gbaa ọsọ ahụ e debere anyị n’ihu, na-elegide Jisọs anya, bụ́ onye ndú na onye mmezu nke okwukwe anyị.” (Ndị Hibru 12:1, 2) Taa, ‘ókè ìgwè’ ndị nlereanya ọma gbakwara ndị Kraịst gburugburu—ma ndị oge ochie ma ndị nke oge a. Ị̀ na-erite uru n’ezie n’aka ha? Ị pụrụ irite uru ma ọ bụrụ na i kpebisie ike ịbụ ‘onye na-adịghị eṅomi ihe ọjọọ, kama onye na-eṅomi ezi ihe.’—3 Jọn 11.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 6 Nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 20]

Ọ bụghị ihe ezi uche dị na ya ịtụ anya na onye okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi ọ bụla ga-enwe nkà n’ụzọ pụtara ìhè n’akụkụ nile nke ozi ndị Kraịst

[Foto ndị dị na peeji nke 21]

Ndị okenye ga-abụ “ihe atụ ìgwè atụrụ ahụ ga-eṅomi”