Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịgha Mkpụrụ Nke Eziokwu Alaeze

Ịgha Mkpụrụ Nke Eziokwu Alaeze

 Ịgha Mkpụrụ Nke Eziokwu Alaeze

“Ghaa mkpụrụ gị n’ụtụtụ, ewepụkwala aka gị n’anyasị.”—EKLISIASTIS 11:6.

1. N’echiche dị aṅaa ka ndị Kraịst na-agha mkpụrụ taa?

ỌRỤ ubi keere òkè dị mkpa n’etiti ndị Hibru oge ochie. Ọ bụ ya mere Jisọs, bụ́ onye biri ndụ ya nile dị ka mmadụ n’Ala Nkwa ahụ, ji jiri isiokwu ndị metụtara ọrụ ubi mee ihe n’ihe atụ ndị o nyere. Dị ka ihe atụ, o ji ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke tụnyere ịgha mkpụrụ. (Matiu 13:1–9, 18–23; Luk 8:5–15) Ruo taa, ma ànyị bi n’etiti ndị ji ọrụ ubi kpọrọ ihe ma ọ bụ na anyị ebighị, isi otú a agha mkpụrụ ime mmụọ bụ ọrụ kasị mkpa ndị Kraịst na-arụ.

2. Olee ókè ọrụ nkwusa anyị dịruru ná mkpa, oleekwa ụfọdụ n’ime ihe ndị a na-eme taa iji na-arụ ya?

2 Ikere òkè n’ịgha mkpụrụ nke eziokwu Bible na mgbe ọgwụgwụ a bụ ihe ùgwù dị ukwuu. Ndị Rom 10:14, 15 na-ekwupụta nke ọma mkpa ọrụ a dị: “Hà ga-esi aṅaa nụ ma onye na-ekwusa anọghị? ma hà ga-esi aṅaa kwusaa, ma ọ bụrụ na e zigaghị ha? dị ka e deworo ya n’akwụkwọ nsọ, sị, Lee, ka ha si  maa mma nke ukwuu, bụ́ ụkwụ ndị na-ezisa ozi ọma nke ezi ihe!” Ọ dịtụbeghị mgbe ọ dị mkpa iji àgwà ziri ezi na-aga n’ihu n’ịrụzu ọrụ a Chineke nyere karịa ka ọ dị ugbu a. N’ihi nke ahụ, Ndịàmà Jehova mikpuru onwe ha n’ụzọ zuru ezu n’imepụta nakwa n’ikesa Bible na ihe ndị na-enye aka ịmụ Bible, n’asụsụ 340. A chọrọ ihe karịrị ndị ọrụ afọ ofufo 18,000 n’isi ụlọ ọrụ nakwa n’alaka ụlọ ọrụ ha ndị dị n’ala dị iche iche iji kwadebe ihe ndị a. Ihe fọkwara nke nta ka ọ bụrụ nde Ndịàmà isii na-ekere òkè n’ikesa akwụkwọ ndị a e ji amụ Bible gburugburu ụwa.

3. Gịnị ka a na-arụzu site n’ịgha mkpụrụ Alaeze?

3 Mkpụrụ dị aṅaa ka nrụsi ọrụ ike a na-amịpụta? Dị ka ọ dị n’oge Iso Ụzọ Kraịst malitere ọhụrụ, ọtụtụ ndị taa na-anabata eziokwu ahụ. (Ọrụ 2:41, 46, 47) Otú ọ dị, ihe dị mkpa karịa ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke ndị nkwusa Alaeze e mere baptism ọhụrụ bụ eziokwu ahụ bụ́ na àmà a dị ukwuu na-atụnye ụtụ n’ido aha Jehova nsọ nakwa n’iwepụ Ya n’ụta dị ka onye nanị ya bụ ezi Chineke. (Matiu 6:9) Ọzọkwa, ihe ọmụma nke Okwu Chineke na-emeziwanye ndụ nke ọtụtụ ndị, ọ pụkwara iduga ná nzọpụta ha.—Ọrụ 13:47.

4. Ruo ókè ha aṅaa ka ndị ozi nwere nchegbu banyere ndị ha meere nkwusa?

4 Ndị ozi ahụ maara nke ọma banyere mkpa ozi ọma ahụ dị n’inye ndụ, ha nwekwara mmetụta miri emi n’ebe ndị ha meere nkwusa nọ. Nke a pụtara ìhè site n’okwu Pọl onyeozi, mgbe o dere, sị: “Ebe unu dị anyị n’obi nke ukwuu, ọ dịịrị anyị ezi mma ime ka unu keta, ọ bụghị nanị ozi ọma nke Chineke, kama ọ bụkwa mkpụrụ obi nke aka anyị, n’ihi na e mere ka unu bụrụ ndị anyị hụrụ n’anya.” (1 Ndị Tesalọnaịka 2:8) N’igosipụta ezigbo nchegbu dị otú ahụ n’ebe ndị mmadụ nọ, Pọl na ndị ozi ndị ọzọ nọ na-eṅomi Jisọs na ndị mmụọ ozi nke eluigwe, bụ́ ndị na-ekere nnọọ òkè n’ọrụ a na-azọpụta ndụ. Ka anyị tụlee òkè ndị ohu Chineke a nọ n’eluigwe na-ekere n’ịgha mkpụrụ nke eziokwu Alaeze, ka anyị hụkwa otú ihe nlereanya ha si agba anyị ume imezu òkè anyị.

JisọsỌgha Mkpụrụ nke Eziokwu Alaeze

5. N’ọrụ dị aṅaa ka Jisọs tinyere onwe ya n’ụzọ bụ́ isi mgbe ọ nọ n’ụwa?

5 Jisọs, bụ́ nwoke zuru okè, nwere ikike nke inye ndị nke oge ya ọtụtụ ezi ihe onwunwe. Dị ka ihe atụ, ọ pụrụ idoziwo ọtụtụ n’ime echiche ndị na-ezighị ezi e nwere n’oge ya banyere ịgwọ ọrịa, ma ọ bụ ọ pụrụ ịmụbawo nghọta ụmụ mmadụ nwere na nkà mmụta ndị ọzọ. Ma, o mere ka o doo anya ná mmalite nke ozi ya na ọrụ ya bụ ikwusa ozi ọma. (Luk 4:17–21) Ka ozi ya na-erukwa ná njedebe, ọ kọwara, sị: “A mụwo Mụ onwe m ime ihe a, abịawokwa m n’ime ụwa ime ihe a, ka M wee gbaara eziokwu àmà.” (Jọn 18:37) Ya mere o tinyere onwe ya n’ịgha mkpụrụ nke eziokwu Alaeze. Ịkụziri ndị ya na ha dịkọrọ ndụ banyere Chineke na nzube Ya dị mkpa karịa ihe ọ bụla ọzọ Jisọs pụrụ ịkụziworo ha.—Ndị Rom 11:33–36.

6, 7. (a) Olee nkwa dị ịrịba ama Jisọs kwere tupu ọ rịgoro eluigwe, ò sikwa aṅaa emezu ya? (b) Olee otú àgwà Jisọs nwere n’ebe ọrụ nkwusa ahụ dị si emetụta gị onwe gị?

6 Jisọs zoro aka n’ebe ya onwe ya nọ dị ka Ọgha Mkpụrụ nke eziokwu Alaeze. (Jọn 4:35–38) O ji ohere ọ bụla ghaa mkpụrụ nke ozi ọma. Ọbụna ka ọ na-anwụ n’elu osisi, o ziri ozi ọma banyere paradaịs elu ala nke a ga-enwe n’ọdịnihu. (Luk 23:43) Ọzọkwa, nchegbu miri emi o nwere ka e kwusaa ozi ọma ahụ akwụsịghị mgbe ọ nwụrụ n’elu osisi ịta ahụhụ. Tupu ọ rịgoro eluigwe, o nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu ịnọgide na-agha mkpụrụ nke eziokwu Alaeze na ime ndị na-eso ụzọ. Mgbe ahụ, Jisọs kwere nkwa dị ịrịba ama. O kwuru, sị: “Lee, Mụ onwe m nọnyeere unu ụbọchị nile, ruo ọgwụgwụ oge a.”—Matiu 28:19, 20.

7 Site n’okwu ndị a, Jisọs kwere nkwa ịkwado, iduzi, na ichebe ọrụ nke ikwusa ozi ọma ahụ “ụbọchị nile, ruo ọgwụgwụ oge a.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Ruo kpọmkwem n’oge anyị, Jisọs nọgidere na-enwe mmasị onwe onye n’ọrụ izisa  ozi ọma. Ọ bụ Onye Ndú anyị, onye na-ahụ maka ịgha mkpụrụ nke eziokwu Alaeze. (Matiu 23:10) Dị ka Isi nke ọgbakọ ndị Kraịst, ọ ga-aza ajụjụ n’ihu Jehova maka ọrụ a zuru ụwa ọnụ.—Ndị Efesọs 1:22, 23; Ndị Kọlọsi 1:18.

Ndị Mmụọ Ozi Ezisaa Ozi Ọma

8, 9. (a) Olee otú ndị mmụọ ozi siworo gosipụta ezigbo mmasị n’ihe omume ụmụ mmadụ? (b) N’echiche dị aṅaa ka a pụrụ ikwu na anyị bụ ndị ndị mmụọ ozi na-ekiri?

8 Mgbe Jehova kere ụwa, ndị mmụọ ozi “[tikọrọ] mkpu ọṅụ, . . . wee tisie mkpu ọṅụ ike.” (Job 38:4–7) Kemgbe ahụ, ndị a e kere eke nọ n’eluigwe egosipụtawo ezi mmasị n’ihe omume ụmụ mmadụ. Jehova ejiriwo ha mee ihe n’izi ụmụ mmadụ ozi Ya. (Abụ Ọma 103:20) Ọ dị otú a karịsịa n’ihe banyere ịgbasa ozi ọma ahụ n’oge anyị. Ná mkpughe e nyere ya, Jọn onyeozi hụrụ otu “mmụọ ozi . . . ka ọ na-efe n’etiti eluigwe” bụ́ onye nwere “ozi ọma ebighị ebi izisara ndị na-anọdụ n’elu ụwa, bụ́ mba nile ọ bụla na ebo nile ọ bụla na asụsụ nile  ọ bụla na ndị nile ọ bụla; ọ na-ewerekwa oké olu sị, Tụọnụ egwu Chineke, nyekwa Ya otuto; n’ihi na oge awa nke ikpe Ya abịawo.”—Mkpughe 14:6, 7.

9 Bible na-ezo aka n’ebe ndị mmụọ ozi nọ dị ka “ndị mmụọ na-efe ofufe, ndị e zipụtara ije ozi n’ihi ndị gaje iketa nzọpụta.” (Ndị Hibru 1:14) Ka ndị mmụọ ozi ji ịnụ ọkụ n’obi arụ ọrụ e nyere ha, ha nwere ohere ikiri anyị na ọrụ anyị. Dị ka a ga-asị na ọ bụ n’ebe a na-eme ihe nkiri nke a na-ahụ nke ọma, anyị na-arụ ọrụ anyị n’ihu ndị nọ n’eluigwe na-ekiri anyị. (1 Ndị Kọrint 4:9) Lee ka o si bụrụ ihe na-akpali iche echiche na mmasị ịmara na anyị adịghị arụ ọrụ ịgha mkpụrụ nke eziokwu Alaeze ahụ nanị anyị!

Anyị Na-eji Ịnụ Ọkụ n’Obi Arụzu Ọrụ Anyị

10. Olee otú a pụrụ isi jiri ndụmọdụ dị irè nke dị n’Eklisiastis 11:6 mee ihe n’ebe ọrụ izisa ozi ọma anyị dị?

10 N’ihi gịnị ka Jisọs na ndị mmụọ ozi ji enwe nnọọ mmasị n’ọrụ anyị? Jisọs kwuru otu ihe kpatara ya mgbe ọ sịrị: “Asị m unu, na otú a ọṅụ dị n’ihu ndị mmụọ ozi Chineke n’isi otu onye mmehie nke na-echegharị.” (Luk 15:10) Anyị onwe anyị kwa na-enwe ezigbo mmasị dị otú ahụ n’ebe ndị mmadụ nọ. N’ihi ya, anyị na-eme ihe kasị mma anyị pụrụ ime iji na-agha mkpụrụ nke eziokwu Alaeze ahụ n’ebe nile. A pụrụ iji okwu ndị dị n’Eklisiastis 11:6 mee ihe n’ọrụ anyị. N’ebe ahụ, Bible na-adụ anyị ọdụ, sị: “Ghaa mkpụrụ gị n’ụtụtụ, ewepụkwala aka gị n’anyasị: n’ihi na ị dịghị ama nke ga-agazi agazi, ma ọ̀ bụ nke a ma ọ bụ nke ọzọ, ma ọ bụ na ha abụọ ga-adị mma otu aka ahụ.” N’ezie, maka otu onye ọ bụla na-anakwere ozi anyị, a pụrụ inwe ọtụtụ narị ma ọ bụ ọbụna ọtụtụ puku mmadụ bụ́ ndị na-ajụ ya. Ma dị ka ndị mmụọ ozi, anyị na-aṅụrị ọṅụ mgbe ọbụna“otu onye mmehie” nakweere ozi nke nzọpụta.

11. Ókè hà aṅaa ka iji mbipụta ndị dabeere na Bible eme ihe pụrụ ịdịru irè?

11 A chọrọ ihe dị ukwuu iji kwusaa ozi ọma ahụ. Otu ihe enyemaka dị mkpa n’ọrụ a bụ akwụkwọ ndị e biri ebi dabeere na Bible bụ́ ndị Ndịàmà Jehova na-eji eme ihe. N’ọnọdụ ụfọdụ, mbipụta ndị a na-adịkwa ka mkpụrụ ndị a ghara ebe nile. Anyị amaghị ebe ha ga-anọ enwe ihe ịga nke ọma. Mgbe ụfọdụ akwụkwọ pụrụ isi n’aka otu onye gafee n’aka onye ọzọ tupu mmadụ agụọ ya. Jisọs na ndị mmụọ ozi pụrụ ọbụna iduzi ihe omume n’ọnọdụ ụfọdụ iji mee ka nke a mee maka abamuru nke ndị obi ha ziri ezi. Tụlee ahụmahụ ụfọdụ na-egosi otú Jehova pụrụ isi jiri akwụkwọ ndị e nyefeworo ndị mmadụ rụpụta ihe ndị dị egwu a na-atụghị anya ha.

Ọrụ Ezi Chineke Ahụ

12. Olee otú otu magazin ochie si bụrụ ngwá ọrụ n’inyere otu ezinụlọ aka ịbịa mara Jehova?

12 Na 1953, Robert, Lila, na ụmụ ha si  n’otu obodo ukwu kwaga n’otu ụlọ ochie na-adịchaghị mma nke dị n’ugbo dị n’ime obodo Pennsylvania, U.S.A. N’oge na-adịghị anya mgbe ha kwabasịrị, Robert kpebiri ịrụnye ụlọ ịsa ahụ n’okpuru stepụ ndị dị n’ime ụlọ ahụ. Mgbe o wepụsịrị bọọdụ ole na ole, ọ chọpụtara na òké akwakọbawo iberibe akwụkwọ, mkpokoro ụkpa, na ụmụ ịrịghiri ihe ndị ọzọ, n’ahụ ájá. N’ebe ahụ, n’etiti ihe ahụ nile, ka otu magazin bụ́ The Golden Age tọgbọ. Robert nwere mmasị karịsịa n’otu isiokwu na-ekwu banyere ịzụ ụmụ. Ntụziaka doro anya dabeere na Bible e nyere na magazin ahụ masịrị ya nke ukwuu nke na ọ gwara Lila na ha gaje isonyere “okpukpe nke The Golden Age.” N’ime izu ole na ole nanị, Ndịàmà Jehova bịara n’ụlọ ha, ma Robert gwara ha na ezinụlọ ya nwere mmasị nanị ‘n’okpukpe nke The Golden Age.’ Ndịàmà ahụ kọwara na The Golden Age nweziri aha ọhụrụ, bụ́ Teta! Robert na Lila malitere iso Ndịàmà ahụ na-amụchi Bible anya, n’ikpeazụ kwa, e mere ha baptism. Ha onwe ha kwa ghara mkpụrụ nke eziokwu ahụ n’ime ụmụ ha ma wee ihe ubi n’ụba. Taa, ihe karịrị mmadụ 20 so n’ezinụlọ a, gụnyere ụmụ asaa nile Robert na Lila mụtara, bụ ndị ohu Jehova Chineke e mere baptism.

13. Gịnị kpaliri otu di na nwunye nọ na Puerto Rico iwulite mmasị na Bible?

13 Ihe dị ka afọ 40 gara aga, William na Ada, bụ́ di na nwunye si Puerto Rico, enweghị mmasị n’ịmụ Bible. Mgbe ọ bụla Ndịàmà Jehova kụrụ aka n’ọnụ ụzọ ha, di na nwunye ahụ na-eme ka a ga-asị na ha anọghị n’ụlọ. Otu ụbọchị, William jere ebe a na-ere ihe ịzụrụ otu ihe dị ya mkpa iji rụzie ihe n’ebe obibi ha. Ka ọ na-apụ, ọ hụrụ otu akwụkwọ na-acha akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ n’ime otu nnukwu ihe e ji ekpofu ahịhịa. Ọ bụ Religion, bụ́ akwụkwọ Ndịàmà Jehova bipụtara laa azụ na 1940. William weere akwụkwọ ahụ laa n’ebe obibi ya, o nwekwara mkpali n’ịgụ banyere ọdịiche dị n’etiti okpukpe ụgha na ezi okpukpe. Oge ọzọ Ndịàmà Jehova kpọtụụrụ ha, William na Ada ji obi ụtọ gee ntị n’ozi ha ma malite iso ha na-amụ Bible. Ọnwa ụfọdụ mgbe e mesịrị, e mere ha baptism ná Mgbakọ Mba Nile nke Uche Chineke na 1958. Kemgbe ahụ, ha enyeworo ihe karịrị mmadụ 50 aka ịghọ akụkụ nke òtù ụmụnna ndị Kraịst anyị.

14. Dị ka otu ahụmahụ gosiri, gịnị ka akwụkwọ anyị ndị dabeere na Bible pụrụ ịrụpụta?

14 Karl dị nanị afọ 11 ma na-enyetụ nsogbu. O yiri ya ka ọ na-abanyekarị ná nsogbu. Nna ya, bụ́ onye ụkọchukwu Metọdist nke Germany, kụziiri ya na a na-akpọ ndị ajọ omume ọkụ na hel mgbe ha nwụsịrị. Ya mere Karl na-atụ nnọọ hel ụjọ. Otu ụbọchị na 1917, Karl hụrụ otu mpempe akwụkwọ e biri ihe na ya n’okporo ámá ma tụtụrụ ya. Ka ọ na-agụ ya, o lekwasịrị anya ozugbo n’ajụjụ bụ́: “Gịnị bụ hel?” Mpempe akwụkwọ ahụ bụ akwụkwọ  ịkpọ òkù maka okwu ihu ọha nke isiokwu ya dabeere na hel, bụ́ nke Ndị Mmụta Bible, bụ́ ndị a maara taa dị ka Ndịàmà Jehova, haziri. Ihe dị ka otu afọ mgbe nke ahụ gasịrị, bụ́ mgbe e duzisịịrị Karl ọmụmụ Bible ọtụtụ ugboro, e mere ya baptism, o wee si otú a ghọọ otu n’ime Ndị Mmụta Bible. Na 1925 a kpọrọ ya ịrụ ọrụ n’isi ụlọ ọrụ ụwa nile nke Ndịàmà Jehova—ebe ọ ka nọ na-eje ozi. Ịgbaso ụzọ ndụ ndị Kraịst nke weworo ihe karịrị afọ iri asatọ, ji mpempe akwụkwọ a tụtụtara n’okporo ámá malite.

15. Gịnị ka Jehova pụrụ ime, dị ka o si kwesị ekwesị n’anya ya?

15 N’eziokwu, ọ bụ ihe karịrị ike mmadụ ịmara ma ndị mmụọ ozi hà keere òkè kpọmkwem n’ahụmahụ ndị a nakwa otú ha keruuru òkè na ha. Ma, anyị ekwesịghị ma ọlị inwe obi abụọ ma Jisọs na ndị mmụọ ozi hà na-ekere òkè dị ukwuu n’ọrụ nkwusa ahụ nakwa ma Jehova ọ̀ pụrụ ime ka ihe gaa dị ka o si kwesị ekwesị n’anya ya. Ahụmahụ ndị a na ọtụtụ ndị yiri ha na-egosi ihe ndị dị mma akwụkwọ anyị pụrụ ịrụpụta mgbe ọ pụsịrị anyị n’aka.

E Nyefewo Anyị Akụ̀ n’Aka

16. Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’okwu ndị dị ná 2 Ndị Kọrint 4:7?

16 Pọl onyeozi kwuru banyere ‘akụ̀ dị n’ite ájá.’ Akụ̀ ahụ bụ ọrụ ime nkwusa nke Chineke nyere, ite ájá ahụ bụkwa ụmụ mmadụ bụ́ ndị Jehova nyefeworo akụ̀ a n’aka. Ebe ọ bụ na ụmụ mmadụ ahụ ezughị okè ma bụrụ ndị na-erughị eru, Pọl gara n’ihu ikwu na ihe ga-esi na ha ịbụ ndị e nyere ọrụ dị otú ahụ apụta bụ “ka ọkịka nke ike ahụ wee bụrụ nke Chineke, gharakwa isite n’anyị onwe anyị.” (2 Ndị Kọrint 4:7) Ee, anyị pụrụ ịdabere n’ebe Jehova nọ inye anyị ike dị mkpa iji mee ka anyị nwee ike ịrụzu ọrụ anyị ji n’aka.

17. Gịnị ka anyị ga-ezute ka anyị na-agha mkpụrụ nke eziokwu Alaeze, otú o sina dị, n’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji nọgide na-enwe àgwà ziri ezi?

17 Anyị aghaghị ịchụ ihe ụfọdụ n’àjà mgbe mgbe. Ịrụ ọrụ n’ókèala ụfọdụ pụrụ ịbụ ihe siri ike na ihe na-eweta ahụ erughị ala. E nwere ógbè ebe ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ na-eyi ndị na-enwetụghị mmasị na ọbụna ndị na-enweghị omume enyi. A pụrụ itinye mgbalị dị ukwuu n’ógbè ndị dị otú ahụ n’enweghị ihe ịga nke ọma doro anya. Ma ọ dịghị mgbalị a ga-asị na ọ gabigara ókè mgbe ihe dị ukwuu nọ n’ihe ize ndụ. Cheta, mkpụrụ ị na-agha pụrụ inye ndị mmadụ obi ụtọ ugbu a nakwa ndụ ebighị ebi n’ọdịnihu. Okwu ndị dị n’Abụ Ọma 126:6 emewo ọtụtụ mgbe: “Onye na-ebu njụaka mkpụrụ ọghịgha, ọ bụ ezie na ọ na-eje ije na-akwa ákwá; ma ọ ghaghị iwere iti mkpu ọṅụ bịaghachi, na-ebu ùkwù ọka ya nile.”

18. Ànyị pụrụ isi aṅaa rịba ozi anyị ama, n’ihi gịnịkwa ka anyị kwesịrị iji mee otú ahụ?

18 Ka anyị jiri ohere ọ bụla kwesịrị ekwesị na-agha mkpụrụ nke eziokwu Alaeze n’ụba. Ka anyị ghara ichefu mgbe ọ bụla na, n’agbanyeghị na ọ bụ anyị na-akụ ma na-akwọsa mkpụrụ ndị ahụ mmiri, ọ bụ Jehova na-eme ka ha too. (1 Ndị Kọrint 3:6, 7) Ma, dị nnọọ ka Jisọs na ndị mmụọ ozi na-arụzu akụkụ nke ha n’ọrụ ahụ, Jehova na-atụ anyị anya n’aka ijezu ozi anyị. (2 Timoti 4:5) Ka anyị rịba ozizi anyị, àgwà anyị, na ịnụ ọkụ n’obi anyị n’ozi ahụ ama. N’ihi gịnị? Pọl na-aza, sị: “N’ime nke a ị ga-azọpụta onwe gị zọpụtakwa ndị na-anụ olu gị.”—1 Timoti 4:16.

Gịnị Ka Anyị Mụtara?

• N’ụzọ ndị dị aṅaa ka ọrụ ịgha mkpụrụ anyị si arụpụta ezi ihe?

• Olee otú Jisọs Kraịst na ndị mmụọ ozi si ekere òkè n’ọrụ izisa ozi ọma ahụ taa?

• N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji na-emesapụ aka dị ka ndị na-agha mkpụrụ nke eziokwu Alaeze?

• Mgbe anyị zutere enweghị mmasị na enweghị omume enyi n’ozi anyị, gịnị kwesịrị ịkwali anyị ịnọgidesi ike?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 15]

Dị ka ndị ọrụ ubi n’Israel oge ochie, ndị Kraịst taa na-agha mkpụrụ nke eziokwu Alaeze n’ụba

[Foto ndị dị na peeji nke 16, 17]

Ndịàmà Jehova na-emepụta ma na-ekesa ụdị dị iche iche nke mbipụta ndị dabeere na Bible n’asụsụ 340