Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nnapụta n’Àgwàetiti Robinson Crusoe

Nnapụta n’Àgwàetiti Robinson Crusoe

 Nnapụta n’Àgwàetiti Robinson Crusoe

ROBINSON CRUSOE bụ otu n’ime àgwàetiti atọ dị n’Oké Osimiri Pacific bụ́ ndị mejupụtara ìgwè àgwàetiti a na-akpọ Juan Fernández, nke dị ihe dị ka kilomita 640 site n’ụsọ oké osimiri Chile. * Àgwàetiti ahụ nke dị square kilomita 93, nwetara aha ya site n’otu akwụkwọ ọgụgụ a ma ama na narị afọ nke 18 bụ́ Robinson Crusoe, bụ́ nke onye England na-ede akwụkwọ bụ́ Daniel Defoe, dere. Ihe àmà na-egosi na akwụkwọ ọgụgụ ahụ dabeere n’ụzọ bụ́ isi n’ahụmahụ dị ize ndụ nke otu nwoke Scotland, bụ́ Alexander Selkirk, bụ́ onye biri nanị ya n’àgwàetiti ahụ ruo ihe dị ka afọ anọ.

Akụkụ ụfọdụ nke ihe e dere n’elu otu ihe ịrịba ama e ji osisi mee nke dị n’àgwàetiti ahụ, na-ekwu, sị: “N’ebe a, kwa ụbọchị ruo ihe karịrị afọ anọ, onye Scotland na-akwọ ụgbọ mmiri bụ́ Alexander Selkirk ji oké nchegbu chọọ ụgbọ mmiri ga-anapụta ya pụọ n’ịnọ nanị ya.” N’ikpeazụ, a napụtara Selkirk ma kpọghachi ya ná mba ya, n’ógbè na-enyeghịzi ya afọ ojuju ka o bisịrị n’obere paradaịs nke ya. A kọrọ na o mesịrị kwuo, sị: “Oo, àgwàetiti masịrị m! Ọ dị m ka ya bụrụ na m ahapụbeghị gị!”

Ka oge na-aga, a bịara jiri àgwàetiti ahụ mere ógbè ntaramahụhụ, bụ́ ebe ụfọdụ ndị mere “mpụ metụtara okpukpe” megide Chọọchị Katọlik bi. Lee ka o si dị iche n’àgwàetiti paradaịs nke Selkirk mabu! Otú ọ dị, ndị bi n’àgwàetiti ahụ n’oge a nwere ịdị juu nke a na-enweghị n’ọtụtụ akụkụ nke ụwa. Ụzọ ndụ ntụsara ahụ a na-ahụkarị n’ọtụtụ àgwàetiti na-eme ka ọ dị mfe isoro nnọọ onye ọ bụla malite mkparịta ụka.

Dị ka ihe ndekọ e nwere si dị, ihe dị ka mmadụ 500 bi na Robinson Crusoe, ma n’oge ka ukwuu n’afọ, ọ bụ nanị ihe dị ka mmadụ  400 na-ebi n’àgwàetiti ahụ. N’otu akụkụ, ihe na-akpata ya bụ na ụfọdụ ndị nne na ụmụ ha na-ebi na Chile n’oge agụmakwụkwọ, na-alọghachi n’àgwàetiti ahụ nanị n’ọnwa ndị ha nọ ezumike iji soro ndị fọdụrụnụ n’ezinụlọ ha nọkọọ.

N’agbanyeghị gburugburu ebe obibi ndị mara mma e nwere na Robinson Crusoe, ọ na-adị ụfọdụ ndị bi n’ebe ahụ ka hà tọgbọ chakoo n’ụzọ ime mmụọ, ha na-achọkwa azịza. Ọ dị ndị ọzọ ka a ga-asị na ọ dị ha mkpa ịbụ ndị a napụtara n’ụzọ ime mmụọ.

Nnapụta Ime Mmụọ

Ọrụ nnapụta ime mmụọ dị otú ahụ malitere n’ihe dị ka 1979. Otu nwanyị so Ndịàmà Jehova na-amụ Bible na Santiago, Chile, kwagara n’àgwàetiti ahụ ma malite ịkụziri ndị ọzọ ihe ọ mụtaworo. Oge ụfọdụ mgbe e mesịrị, otu onye okenye ọgbakọ bụ́ onye bịara n’àgwàetiti ahụ n’ihi ihe ndị metụtara ọrụ ya nwere ihe ijuanya ịhụ obere ìgwè ndị a na-amụrụ Bible ka ha na-enwe ọganihu n’ụzọ ime mmụọ site n’enyemaka nwanyị ahụ. Ka ọ na-erule oge onye okenye ahụ gara àgwàetiti ahụ ọzọ ọnwa atọ mgbe e mesịrị, onye nkụzi Bible a nọ n’ebe dịpụrụ adịpụ na mmadụ  abụọ n’ime ndị ọ na-amụrụ ihe dị njikere ịbụ ndị e mere baptism, ya mere onye okenye ahụ hụrụ maka baptism ha. Mgbe e mesịrị, otu n’ime ndị Kraịst a e mere baptism ọhụrụ lụrụ di, ya na di ya nọgidekwara na-achọ ndị ọzọ nnapụta ime mmụọ dị mkpa. Di ya butere ụzọ n’iwu otu obere Ụlọ Nzukọ Alaeze, bụ́ nke obere ìgwè ahụ nọ n’àgwàetiti ahụ ka na-eji eme ihe. Ka oge na-aga, n’ihi ihe ndị metụtara akụ̀ na ụba, ha si Robinson Crusoe kwaga n’otu ọgbakọ dị n’etiti Chile, bụ́ ebe ha nọgidere na-arụsi ọrụ ike n’ijere Jehova ozi.

Nke nta nke nta, ìgwè nta ahụ nọ n’àgwàetiti ahụ nọgidere na-amụba ka a na-anapụta ndị ọzọ pụọ n’okpukpe ụgha. Otú ọ dị, ebe ọ bụ na ụmụ akwụkwọ aghaghị ịga Chile maka agụmakwụkwọ kọleji, ìgwè ahụ belatara ruo ụmụnna nwanyị abụọ e mere baptism na otu nwatakịrị nwanyị. Ìgwè ahụ na-amụba n’oge ezumike bụ́ mgbe ụfọdụ ndị nne na-alọghachi n’àgwàetiti ahụ. Nke a na-eme ka ndị Kraịst atọ ahụ nọ n’ebe dịpụrụ adịpụ bụ́ ndị na-anọ ebe ahụ mgbe nile n’afọ, nwee ume ọhụrụ. N’ihi nrụsi ọrụ ike nke ụmụnna nwanyị a, a maara Ndịàmà Jehova nke ọma na Robinson Crusoe. N’eziokwu, ụfọdụ ndị bi n’àgwàetiti ahụ emegidewo ọrụ ha ma gbalịa ịrụgide ndị ọzọ ịjụ ozi Alaeze ahụ. Otú o sina dị, mkpụrụ eziokwu Bible bụ́ ndị a kụrụ n’obi ndị ziri ezi na-anọgide na-epu ome.

Iwusi Ndị A Napụtaworo Ike

Otu ugbo n’afọ, otu onye nlekọta na-ejegharị ejegharị na-eleta àgwàetiti ahụ. Gịnị ka ileta ọnụ ọgụgụ dị nta nke Ndịàmà nọ n’àgwàetiti dịpụrụ adịpụ dị ka ya? Otu onye nlekọta sekit na-akọwa nleta mbụ o mere na Robinson Crusoe, sị:

“Njem a dị ịtụnanya. Anyị malitere ya n’elekere 7:00 nke ụtụtụ bụ́ mgbe anyị ji ụgbọala si Valparaiso gaa n’Ọdụ Ụgbọelu Cerrillos dị na Santiago. Anyị banyere otu obere ụgbọelu na-ebu mmadụ asaa. Mgbe anyị fere ruo awa 2 na minit 45, anyị nọ n’ebe dị anya hụ elu otu ugwu dị elu karịa igwe ojii. Ka anyị bịarukwuru nso, anyị hụrụ àgwàetiti ahụ—oké nkume nke dị n’etiti oké osimiri. O yiri ka ọ na-ese n’elu mmiri sara mbara dị ka ụgbọ mmiri furu n’oké osimiri.

“Mgbe ụgbọelu ahụ fedara n’ala, otu ụgbọ mmiri buuru anyị banye  n’ime obodo. N’ebe nile, nkume ndị buru ibu bụ́ ndị si n’oké osimiri kpọlipụta ghọrọ obere àgwàetiti ndị anụ fur seal ndị dị na Juan Fernández ji mere ebe izu ike. Anụ fur seal bụ ụdị anụ seal a na-echebe ka a ghara igbukpọ ya n’ihi na ọnụ ọgụgụ ya ebelatawo n’ụzọ dị ukwuu. Na mberede, otu ihe feliri elu n’akụkụ ụgbọ mmiri anyị ma mikpuo ọzọ n’ime oké osimiri ahụ. Ọ bụ azụ̀ na-efe efe bụ́ nke ntù ya ndị fụchiri afụchi yiri nku. O yiri ka ọ na-atọ ya ụtọ isi n’ime mmiri ahụ malie elu iji jide ụmụ ahụhụ. N’ezie, mgbe ụfọdụ, a na-ejidekwa onye na-ejide ihe; mmali ya pụrụ ịdọta uche anụ ndị ọzọ na-eri ibe ha bụ́ ndị dị njikere ilo ya ka ọ na-adaba na mmiri.

“N’ikpeazụ, anyị rutere n’obodo nta bụ́ San Juan Bautista (St. Jọn Baptist). Ọtụtụ ndị bi n’àgwàetiti ahụ guzo n’ọdụ ụgbọ mmiri ahụ, ma ọ́ bụghị na ha na-eche ndị ọbịa ha ọ bụrụ nnọọ na ọ na-enu ha enu ịmara ndị ọ pụrụ ịbụ ha na-alọta na nke ugbu a. Gburugburu ebe mara mma dọọrọ mmasị anyị—nnukwu ugwu nke nkume jupụtara nke a na-akpọ El Yunque (The Anvil), bụ́ nke ahịhịa ndị yiri kapet e ji aji na-achatụ akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ mee, jupụtara n’ala ya, n’azụ ya kwa, e nwere ihu igwe na-acha anụnụ anụnụ nke gbachapụrụ agbachapụ bụ́ nke igwe ojii na-acha ọcha dị ná nsọtụ ya.

“N’oge na-adịghị anya, anyị hụrụ ìgwè ụmụnna anyị nwanyị ndị Kraịst na ụmụ ha ka ha na-eche anyị n’ọdụ ụgbọ mmiri ahụ. Ọ bụ oge ezumike, ya mere ìgwè ahụ buru ibu karịa otú ha na-ahabu. Mgbe anyị kelerịtasịrị onwe anyị n’ụzọ kporo ọkụ, a kpọọrọ anyị gaa n’otu ọnụ ụlọ ụgbọ mmiri mara mma bụ́ nke anyị ga-akpọ ebe obibi anyị ruo otu izu.

“Ọ bụ izu pụrụ nnọọ iche, anyị matakwara na ọ ga-agabiga ngwa ngwa. Ọ dị anyị mkpa iji oge anyị mee ihe nke ọma. N’ụbọchị ahụ kpọmkwem, mgbe anyị risịrị nri ehihie, anyị letara otu onye a na-amụrụ Bible bụ́ onye gaje ịghọ nwanna nwanyị ime mmụọ anyị na onye so na paradaịs ime mmụọ Chineke, n’oge na-adịghị anya. Ihu ya nọ na-egbukepụ n’ọṅụ ma ahụ eruchaghịkwa ya ala. Ihe mgbaru ọsọ ọ nọworo na-eche iru eri oge, bụ́ baptism, nọ na-eru nso. Anyị so ya tụlee ụfọdụ ihe ọmụma ndị dị mkpa ka o wee nwee ike iru eru dị ka onye nkwusa nke ozi ọma. N’echi ya, o keere òkè n’ọrụ nkwusa na nke mbụ ya. N’ụbọchị nke atọ, anyị malitere iso ya tụlee ihe ndị a chọrọ maka baptism. Tupu izu ahụ agwụ, e mere ya baptism.

“E nyere nzukọ ndị anyị nwere n’izu ahụ ezi nkwado, ọnụ ọgụgụ kasị elu nke ndị bịaranụ bụ mmadụ 14. Kwa ụbọchị, e mere ndokwa maka ozi ubi, nletaghachi, ọmụmụ Bible, na nleta ọzụzụ atụrụ. Lee agbamume nke a bụụrụ ụmụnna nwanyị ahụ bụ́ ndị na-arụ ọrụ nanị ha n’oge nile n’afọ!”

Ọ nọwo na-esiri ndị ikom nọ n’àgwàetiti ahụ ike karị ịnakwere eziokwu ahụ, ikekwe n’ihi oké ihe nke ọrụ ego ha na-achọ n’aka ha. Ọrụ bụ́ isi ha na-arụ bụ́ igbu oporo, bụ́ nke na-achọ ka e tinye oge dị ukwuu na ya. Ajọ mbunobi sokwa eme ka ọtụtụ mmadụ na-emeghachi omume n’ụzọ na-adịghị mma. Otú o sina dị, a na-enwe olileanya na ọtụtụ ndị bi n’àgwàetiti ahụ, ma ndị nwoke ma ndị nwanyị, ga-emeghachi omume n’ụzọ dị mma n’ọdịnihu.

Ruo ugbu a, a napụtawo mmadụ iri nọ n’àgwàetiti ahụ site n’ime ka ha mara eziokwu ahụ na nzube Jehova Chineke. Ọ dịla anya ọtụtụ n’ime ha si n’àgwàetiti ahụ pụọ n’ihi ihe ndị dịgasị iche. Ma hà nọgidere ebe ahụ ma ọ bụ na ha anọgideghị, nnapụta a napụtara ha n’ụzọ ime mmụọ abụrụwo nke dị nnọọ ịrịba ama karịa nnapụta a napụtara Alexander Selkirk. Ha nọzi na paradaịs ime mmụọ n’ebe ọ bụla ha pụrụ ibi. Ụmụnna nwanyị ahụ bụ́ ndị ka bi n’àgwàetiti ahụ na ụmụ ha bi na gburugburu ebe obibi mara mma, ma ọbụna n’ụzọ karịrị nke ahụ, ha nwere atụmanya nke ịdị ndụ mgbe ụwa nile ga-aghọ paradaịs bụ́ ezie n’ụzọ nile.

Ọrụ Nnapụta ahụ Ka Na-aga n’Ihu

A bịa n’ihe banyere ebe ha bi, ìgwè nta a nke Ndịàmà Jehova nọ na Robinson Crusoe bi n’ebe dị nnọọ anya site n’ebe ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị ime mmụọ ha ndị ọzọ bi. Ma, ọ naghị adị ha ka a gbahapụrụ ha agbahapụ, dị ka ọ dị nwoke Scotland ahụ bụ́ Selkirk. Site n’akwụkwọ ọchịchị Chineke ndị a na-ezitere ha n’esepụghị aka, vidio mgbakọ dị iche iche ndị alaka Watch Tower Society dị na Chile na-ezitere ha ugboro atọ n’afọ, na nleta onye nlekọta sekit na-eleta ha kwa afọ, ha anọgidewo na-eso nzukọ Jehova enwe mmekọrịta chiri anya. Ya mere, ha anọgidewo na-abụ akụkụ na-arụsi ọrụ ike nke ‘òtù ụmụnna ndị nọ n’ụwa.’—1 Pita 5:9.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 2 Aha gọọmenti nyere àgwàetiti ahụ bụ Más a Tierra.

[Map/Foto dị na peeji nke 9]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

CHILE

Santiago

ÀGWÀETITI ROBINSON CRUSOE

San Juan Bautista

El Yunque

OSIMIRI PACIFIC

ÀGWÀETITI SANTA CLARA

[Foto]

Ka mmadụ malitere ịhụ àgwàetiti ahụ anya, ọ na-ahụ nnukwu nkume nke dị n’etiti oké osimiri

[Ebe E Si Nweta Foto]

Map Chile: Mountain High Maps® Copyright © 1997 Digital Wisdom, Inc.

[Foto dị na peeji nke 8, 9]

Nnukwu ugwu ahụ nke nkume jupụtara a na-akpọ El Yunque (The Anvil)

[Foto dị na peeji nke 9]

Obodo nta bụ́ San Juan Bautista (St. Jọn Baptist)

[Foto dị na peeji nke 9]

Anụ “fur seal” na “sea lion” na-eji ụmụ obere àgwàetiti mere ebe izu ike

[Foto dị na peeji nke 10]

Anyị ji otu obere ụgbọelu si Santiago, Chile, gaa

[Foto dị na peeji nke 10]

Ụsọ oké osimiri Robinson Crusoe nke jupụtara na nkume

[Foto dị na peeji nke 10]

Obere Ụlọ Nzukọ Alaeze nke dị n’àgwàetiti ahụ