Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Na-asọpụrụnụ Ndị E Nyere Ike Ịchịisi n’Ebe Unu Nọ

Na-asọpụrụnụ Ndị E Nyere Ike Ịchịisi n’Ebe Unu Nọ

 Na-asọpụrụnụ Ndị E Nyere Ike Ịchịisi n’Ebe Unu Nọ

“Sọpụrụnụ mmadụ nile. Hụnụ òtù ndị bụ́ ụmụnna n’anya. Na-atụnụ egwu Chineke. Na-asọpụrụnụ eze unu.”—1 PITA 2:17.

1, 2. Olee otú ndị mmadụ si ele ịchịisi anya taa? N’ihi gịnị?

“ỤMỤAKA nweere onwe ha ime ihe nile. Ha adịghị asọpụrụ ndị nne na nna ha,” ka otu onye bụ́ nne kwara n’arịrị. “Maa Ịchịisi Aka” ka otu mpempe akwụkwọ a mapawara na bọmpa ụgbọala na-ekwu. Ndị ahụ bụ nanị ngosipụta abụọ nke ọnọdụ ndị ị na-aghaghị ịmara na o jupụtara ebe nile taa. Gburugburu ụwa, a na-ahụkarị enweghị nkwanye ùgwù n’ebe ndị nne na nna, ndị nkụzi, ndị were mmadụ n’ọrụ, na ndị ọrụ gọọmenti, nọ.

2 Ụfọdụ pụrụ nanị ịkpọ n’ubu ma sị, ‘Ndị na-achị isi erughị eru inweta nsọpụrụ m.’ Mgbe ụfọdụ, ọ pụrụ isi ike ịgọnahụ nke ahụ. Anyị na-enweta ọtụtụ akụkọ banyere ndị ọrụ gọọmenti rụrụ arụ, ndị were mmadụ n’ọrụ bụ́ ndị dị anyaukwu, ndị nkụzi na-amaghị ọrụ, na ndị nne na nna nwere ọnụ ọjọọ. N’ụzọ na-enye obi ụtọ, ọ bụ ndị Kraịst ole na ole na-ele ndị na-achị isi n’ọgbakọ anya n’ụzọ dị otú ahụ.—Matiu 24:45-47.

3, 4. N’ihi gịnị ka o ji kwesị ekwesị ka ndị Kraịst na-akwanyere ndị na-achị isi ùgwù?

3 Dị ka ndị Kraịst, “ọ dị mkpa” ka anyị kwanyere ndị ọchịchị ùgwù. Pọl onyeozi dụrụ ndị Kraịst ọdụ ‘ido onwe ha n’okpuru ndị na-achị isi n’elu ha: n’ihi na ọ dịghị onye ọ bụla na-achị isi ma ọ bụrụ na Chineke edoghị ya; ndị na-achị isi bụkwa ndị Chineke doworo.’ (Ndị Rom 13:1, 2, 5; 1 Pita 2:13-15) Pọl gosikwara ezi ihe mere a ga-eji na-asọpụrụ ịchịisi n’ezinụlọ: “Ndị bụ́ nwunye, na-edonụ onwe unu n’okpuru di unu, dị ka ọ na-ekwesị unu n’ime Onyenwe anyị. Ụmụ, na-aṅanụ ntị okwu ndị mụrụ unu n’ihe nile, n’ihi na nke a bụ ihe na-atọ ezi ụtọ n’ime Onyenwe anyị.” (Ndị Kọlọsi 3:18, 20) O kwesịrị ka anyị kwanyere ndị okenye ọgbakọ ùgwù n’ihi na ‘Mmụọ Nsọ mere ha ndị na-elekọta ya anya n’etiti ya, ka ha na-azụ nzukọ Chineke dị ka atụrụ.’ (Ọrụ 20:28) Ọ bụ n’ihi nkwanye ùgwù anyị nwere n’ebe Jehova nọ mere anyị ji asọpụrụ ịchịisi nke mmadụ. Dị ka o kwesịrị ịdị, ịsọpụrụ ịchịisi Jehova na-ebute ụzọ ná ndụ anyị.—Ọrụ 5:29.

4 N’iburu ikike kasị elu nke Jehova n’uche, ka anyị tụlee ihe atụ ụfọdụ banyere ndị na-akwanyeghịrị ndị na-achị isi ùgwù nakwa banyere ụfọdụ ndị kwanyeere ha ùgwù.

Enweghị Nkwanye Ùgwù Na-eduga n’Enweghị Ihu Ọma

5. Omume dị aṅaa nke enweghị nkwanye ùgwù ka Maịkal gosipụtara n’ebe Devid nọ, gịnịkwa ka nke ahụ dugara na ya?

5 Site n’akụkọ banyere Eze Devid, anyị pụrụ ịhụ otú Jehova si ele ndị na-eleda ndị Chineke nyere ike ịchịisi anya. Mgbe Devid mere ka e bubata igbe ọgbụgba ndụ ahụ na Jerusalem, nwunye ya bụ́ Maịkal “[hụrụ] eze, bụ́ Devid, ka ọ na-awụli, na-etekwa egwú, n’ihu Jehova; o wee ledaa ya anya n’obi ya.” Maịkal kwesịrị ịghọta na Devid abụghị nanị onyeisi ezinụlọ kamakwa ọ bụ eze nke ala ahụ. Otú ọ dị, o ji okwu mkparị  kwupụta ihe dị ya n’obi, sị: “Lee, otú eze Israel dị nsọpụrụ nke ukwuu taa, onye kpupụrụ uwe n’ahụ ya taa n’anya ndị ohu nwanyị nke ndị ohu ya, dị ka otu n’ime ndị ikom efu na-ekpupụ uwe n’ahụ ya ekpupụ!” Ihe si na nke a pụta bụ na Maịkal amụtaghị nwa ọ bụla.—2 Samuel 6:14-23.

6. Olee otú Jehova si lee enweghị nkwanye ùgwù Kora n’ebe ndị O tere mmanụ nọ anya?

6 Ihe atụ pụtara ìhè nke enweghị nsọpụrụ n’ebe ndị Chineke họpụtara idu ndú n’ọchịchị ya nọ bụ́ nke Kora. Dị ka onye Kohat, lee ihe ùgwù o nwere ijere Jehova ozi n’ụlọikwuu! Ma, ọ hụtara ebe Mosis na Erọn, bụ́ ndị Chineke tere mmanụ idu ụmụ Israel, na-emezighị emezi. Kora na ndị isi ndị ọzọ nke Israel jikọrọ aka ma jiri nlelị gwa Mosis na Erọn, sị: “O zuworo unu, n’ihi na nzukọ Israel nile, ha nile n’otu n’otu, dị nsọ, ọ bụkwa n’etiti ha ka Jehova nọ: ọ̀ bụkwa gịnị mere unu na-ebuli onwe unu karịa mkpọkọta nke Jehova?” Olee otú Jehova si lee àgwà Kora na ndị na-akwado ya anya? Chineke lere omume ha anya dị ka enweghị nsọpụrụ n’ebe Jehova n’onwe ya nọ. Mgbe ha hụsịrị ka ala lodara ndị nile na-akwado ha, ọkụ sitere n’aka Jehova repịara Kora na ndị isi 250 ahụ.—Ọnụ Ọgụgụ 16:1-3, 28-35.

7. È nwere ihe mere “ndị ozi ọkasị mma” ahụ ga-eji katọọ ikike Pọl?

7 N’ọgbakọ ndị Kraịst nke narị afọ mbụ, e nwere ndị lelịrị ndị na-achị isi n’ọchịchị Chineke anya. “Ndị ozi ọkasị mma” (NW) nọ n’ọgbakọ Kọrint nwere omume nke enweghị nkwanye ùgwù n’ebe Pọl nọ. Ha katọrọ ikike ikwu okwu ya, na-asị: “Ọnụnọ nke ahụ ya n’etiti anyị adịghị ike, okwu ya bụkwa ihe a kpọrọ ihe efu.” (2 Ndị Kọrint 10:10; 11:5) Ma Pọl ọ̀ bụ ọkà okwu pụtara ìhè ma ọ bụ na ọ bụghị, o kwesịrị ka a kwanyere ya ùgwù dị ka onyeozi. Ma okwu Pọl ọ̀ bụ ihe a kpọrọ ihe efu n’ezie? Okwu ihu ọha ya ndị e dekọrọ na Bible na-enye ihe àmà banyere otú o si bụrụ onye ọkà okwu na-eme ka mmadụ kwenye. Leenụ, n’ihi nkwurịta okwu dị mkpirikpi ya na Herọd Agrịpa nke Abụọ, bụ́ onye “mazuru . . . ajụjụ nile dị n’etiti ndị Juu” nwere, Pọl gwara eze ahụ okwu ruo mgbe o kwuru, sị: “Ị na-eji okwu nta eme ka m kwenye ịbụ [onye Kraịst]”! (Ọrụ 13:15-43; 17:22-34; 26:1-28) Ma, ndị ozi ọkasị mma ahụ nọ na Kọrint boro ya ebubo ikwu okwu a kpọrọ ihe efu! Olee otú Jehova si lee omume ha anya? N’ozi Jisọs Kraịst zigaara ọgbakọ Efesọs, o kwuru ihe dị mma banyere ndị ahụ na-ekweghị ka ‘ndị kpọrọ onwe ha ndị ozi, ma ha abụghị’ rafuo ha.—Mkpughe 2:2.

Nkwanye Ùgwù n’Agbanyeghị Ezughị Okè

8. Olee otú Devid si gosi na o nwere nsọpụrụ maka ikike Jehova nyeworo Sọl?

8 E nwere ọtụtụ ihe atụ ndị dị n’ime Bible banyere ndị sọpụụrụ ndị na-achị isi, ọbụna mgbe ndị a ji ikike ha mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. Devid bụ otu n’ime ihe atụ mara mma ndị dị otú ahụ. Eze Sọl, bụ́ onye Devid na-ejere ozi, malitere ikwoso ya ekworo n’ihi ihe ndị ọ rụzuru ma chọọ igbu ya. (1 Samuel 18:8-12; 19:9-11; 23:26) Ma, n’agbanyeghị na o nwetara ohere igbu Sọl, Devid kwuru, sị: “Ya bụrụ m ihe arụ site na Jehova, bụ́ isetị aka m megide onye Jehova e tere mmanụ.” (1 Samuel 24:3-6; 26:7-13) Devid maara na ọ bụ Sọl mejọrọ, ma ọ hapụrụ ya n’aka Jehova ikpe ya ikpe. (1 Samuel 24:12, 15; 26:22-24) O kwutọghị Sọl.

9. (a) Olee mmetụta Devid nwere mgbe Sọl na-emejọ ya? (b) Olee otú anyị pụrụ isi gosi na ùgwù Devid kwanyeere Sọl bụ nke ezigbo ya?

9 Devid ò nwere obi erughị ala mgbe a na-emejọ ya? “Ndị na-eme ka mmadụ maa jijiji achọwokwa mkpụrụ obi m,” ka Devid tikuru Jehova. (Abụ Ọma 54:3) Ọ gwara Jehova ihe dị ya n’obi, sị: “Napụta m n’aka ndị iro m, Chineke m . . . Ndị dị ike na-ezukọ imegide m: ọ bụghị n’ihi njehie m, ọ bụghịkwa n’ihi mmehie m, Jehova. Mgbe ọ na-adịghị ajọ omume m mere ha na-agba ọsọ, dozie onwe ha: kpọtee Onwe gị izute m, hụkwa.” (Abụ Ọma 59:1-4) Ì nwetụwo ụdị  mmetụta ahụ—na ọ dịghị ihe ọjọọ ọ bụla i mere onye na-achị isi, ma ya anọgide na-eme ka ihe na-esiri gị ike? Devid akwụsịghị ịkwanyere Sọl ùgwù. Mgbe Sọl nwụrụ, kama ịwụli elu n’ọṅụ, Devid dere otu abụ ákwá: “Sọl na Jonatan bụ ndị na-ahụrịta onwe ha n’anya, bụrụkwa ndị dị ụtọ ná ndụ ha . . . ; ha dị garagara karịa ugo, ha dị ike karịa ọdụm. Ụmụ ndị inyom Israel, kwaaranụ Sọl ákwá.” (2 Samuel 1:23, 24) Lee ezi ihe nlereanya nke ịkwanyere onye Jehova tere mmanụ ùgwù nke a bụ, n’agbanyeghị na Sọl mejọrọ Devid!

10. Ezi ihe nlereanya dị aṅaa ka Pọl setịpụrụ n’ịsọpụrụ ikike Chineke nyere òtù na-achị isi, nke ahụ dugakwara na gịnị?

10 N’oge ndị Kraịst kwa, anyị na-ahụ ihe atụ ndị pụtara ìhè nke ndị na-asọpụrụ ndị Chineke nyere ikike ịchịisi. Were Pọl dị ka ihe atụ. O gosipụtara nkwanye ùgwù n’ebe mkpebi nke òtù na-achị isi nke narị afọ mbụ nke ọgbakọ ndị Kraịst, dị. N’oge Pọl mere nleta ikpeazụ ya na Jerusalem, òtù na-achị isi dụrụ ya ọdụ ka ọ sachaa onwe ya dị ka omenala si dị iji gosi ndị ọzọ na ya ebughị ihe ọjọọ n’obi n’ebe Iwu Mosis dị. Pọl pụrụ icheworị, sị: ‘Ụmụnna ahụ bu ụzọ gwa m ka m si na Jerusalem pụọ n’oge e yiri ndụ m egwu. Ugbu a ha chọrọ ka m gosi n’ihu ọha na m na-akwanyere Iwu Mosis ùgwù. Edegaworo m rịị ndị Galetia akwụkwọ ozi na-enye ha ndụmọdụ ka ha ghara idebe Iwu ahụ. Ọ bụrụ na mụ agaa n’ụlọ nsọ, ndị ọzọ pụrụ ịghọtahie ihe m mere, na-eche na m na-eso ndị a na-ebighị úgwù emekọrịta ihe.’ Otú ọ dị, ihe àmà na-egosi na Pọl echeghị otú ahụ. Ebe ọ bụ na ọ dịg̣hị ụkpụrụ ndị Kraịst ọ ga-emebi, ọ kwanyeere ndụmọdụ nke òtù na-achị isi nke narị afọ mbụ ùgwù ma mee dị ka ndụmọdụ ha si dị. Ihe si na ya pụta ozugbo bụ na a napụtara Pọl n’aka ìgwè ndị Juu na-eme ihe ike, e mesịakwa ọ nọrọ afọ abụọ n’ụlọ mkpọrọ. N’ikpeazụ, e mere uche Chineke. Pọl gbaara ndị isi ọchịchị àmà na Sizarịa, e mesịakwa ndị ọchịchị gbaara ya ụgbọ gaa Rom iji gbaa àmà n’ihu Siza n’onwe ya.—Ọrụ 9:26-30; 21:20-26; 23:11; 24:27; Ndị Galetia 2:12; 4:9, 10.

Ị̀ Na-egosi Nkwanye Ùgwù?

11. Olee otú anyị pụrụ isi gosi nkwanye ùgwù n’ebe ndị ọchịchị nọ?

11 Ị̀ na-egosi nkwanye ùgwù kwesịrị ekwesị n’ebe ndị na-achị isi nọ? E nyere ndị Kraịst iwu ‘ịkwụghachi mmadụ nile ihe nile ha ji ha n’ụgwọ: ịsọpụrụ onye ha ji ụgwọ nsọpụrụ.’ N’ezie, anyị ido onwe anyị n’okpuru “ndị na-achị isi” gụnyere ọ bụghị nanị ịtụ ụtụ isi kamakwa ịkwanyere ndị na-achị isi ùgwù site n’omume na n’okwu anyị. (Ndị Rom 13:1–7) Ọ bụrụ na anyị echee ndị isi ọchịchị bụ́ ndị pụrụ ịdị obi ọjọọ ihu, olee otú anyị na-esi emeghachi omume? Na Chiapas State, Mexico, ndị ọchịchị nke otu ógbè weghaara ala ubi nke ezinụlọ 57 bụ́ Ndịàmà Jehova n’ihi na ndị Kraịst a ekereghị òkè n’ememe okpukpe ụfọdụ. Ná nzukọ ndị e nwere iji dozie okwu ahụ, Ndịàmà ahụ, bụ́ ndị jiri ejiji ndị dị ọcha ma dị mma n’anya, kwuru okwu mgbe nile n’ụzọ nkwanye ùgwù na nsọpụrụ. Ihe karịrị otu afọ mgbe e mesịrị, e kpelaara ha okwu ahụ. Àgwà ha mere ka ụfọdụ ndị kiriri ihe merenụ na-akwanyeziri ha ùgwù ruo n’ókè nke na ha onwe ha chọkwara ịghọ Ndịàmà Jehova!

12. N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa inwe “nkwanye ùgwù miri emi” n’ebe di mmadụ bụ́ onye na-ekweghị ekwe nọ?

12 Olee otú ị pụrụ isi gosi nkwanye ùgwù n’ebe ịchịisi Chineke guzobere n’ezinụlọ dị? Mgbe ọ tụlesịrị ihe nlereanya Jisọs n’ịnagide ihe ọjọọ e mesoro ya, Pita onyeozi kwuru, sị: “Otú ahụ, ndị bụ́ nwunye, na-edonụ onwe unu n’okpuru di nke aka unu; ka, ọbụna a sị na ụfọdụ ekwenyeghị okwu Chineke, ka e wee site n’ibi obi nwunye ha rite ha n’uru n’ebe a na-ekwughị okwu; mgbe ha na-ele ibi obi unu dị ọcha, ya na [nkwanye ùgwù miri emi, NW].” (1 Pita 3:1, 2; Ndị Efesọs 5:22-24) N’ebe a, Pita mesiri ike mkpa ọ dị ka nwunye jiri “nkwanye ùgwù miri emi” na-edo onwe ya n’okpuru di nke aka ya, n’agbanyeghị na ụfọdụ ndị bụ́ di pụrụ ịbụ ndị na-adịchaghị eme omume kwesịrị ka a kwanyere ha ùgwù. Omume nkwanye ùgwù nke onye bụ́ nwunye pụrụ ime ka di ya na-ekweghị ekwe kwenyere ya.

13. Olee otú ndị bụ́ nwunye pụrụ isi na-asọpụrụ di ha?

13 N’ikwekọ n’ihe a na-ekwu banyere ya n’akụkụ akwụkwọ nsọ ndị a, Pita na-adọrọ uche anyị gaa n’ihe nlereanya Sera, bụ́ onye di ya, bụ́ Abraham, bụ ihe nlereanya pụtara ìhè nke  okwukwe. (Ndị Rom 4:16, 17; Ndị Galetia 3:6-9; 1 Pita 3:6) Ndị nwunye bụ́ ndị nwere di kwere ekwe hà kwesịrị inye di ha nsọpụrụ dị nta karịa ka ndị nwunye nwere di na-ekweghị ekwe na-enye di ha? Gịnị ma ọ bụrụ na gị na di gị ekwekọrịtaghị n’ihe ụfọdụ? Jisọs nyere ndụmọdụ ụfọdụ bụ́ ndị a pụrụ iji mee ihe n’ebe a n’ụzọ ọ bụla: “Onye ọ bụla nke ga-ejide gị ije otu mile, so ya jee mile abụọ.” (Matiu 5:41) Ị̀ na-asọpụrụ di gị site n’ịkwado ọchịchọ ya? Ọ bụrụ na nke a yiri ihe siri nnọọ ike, soro ya kwurịta echiche gị banyere okwu ahụ. Echela na ọ maara mmetụta gị. Ma mgbe ị na-eme ka ọ mara ọchịchọ gị, mee otú ahụ n’ụzọ nkwanye ùgwù. Bible na-adụ anyị ọdụ, sị: “Ka okwu unu dị n’amara mgbe nile, ihe e ji nnu mee ka ọ dị ụtọ, ka unu wee mata otú unu na-aghaghị ịza mmadụ nile ọ bụla.”—Ndị Kọlọsi 4:6.

14. Gịnị ka ịsọpụrụ nne na nna gụnyere?

14 Olee banyere unu ndị bụ́ ụmụ? Okwu Chineke na-enye iwu, sị: “Ụmụ, na-aṅanụ ntị okwu ndị mụrụ unu n’ime Onyenwe anyị: n’ihi na nke a bụ ihe ziri ezi. Sọpụrụ nna gị na nne gị (nke bụ ihe mbụ e nyere n’iwu nke nkwa dịịrị ya).” (Ndị Efesọs 6:1–3) Rịba ama na e lere ịṅa nne na nna unu ntị anya dị ka ihe ya na ‘ịsọpụrụ nna unu na nne unu’ pụtara otu ihe. Okwu Grik a sụgharịrị ịbụ “sọpụrụ” pụtara “iji ihe kpọrọ ihe” ma ọ bụ “iwere ihe dị ka ihe dị oké ọnụ ahịa.” N’ihi ya, irube isi chọrọ ihe karịrị iji enweghị mmasị na-agbaso ụkpụrụ nduzi nke nne na nna unu bụ́ ndị pụrụ iyi unu ihe ezi uche na adịghị na ha. Chineke na-agwa unu ka unu jiri nne na nna unu na nduzi ha kpọrọ ihe nke ukwuu.—Ilu 15:5.

15. Olee otú ụmụ pụrụ isi nọgide na-akwanyere nne na nna ha ùgwù ọbụna ma a sị na nne na nna ha hiere ụzọ?

15 Ọ bụrụ na nne na nna unu emee ihe na-achọ ime ka nkwanye ùgwù unu nwere n’ebe ha nọ belata, gịnị ga-emezi? Gbalịanụ ịhụ ihe otú ha si ahụ ya. Ọ̀ bụ na ọ bụghị ha ‘mụrụ unu’ ma lekọta unu? (Ilu 23:22) Ọ̀ bụ na ọ bụghị ịhụnanya ha nwere n’ebe unu nọ na-akwali ha? (Ndị Hibru12:7-11) Gwanụ nne na nna unu okwu n’ụzọ dị ùgwù, na-eji àgwà nke  ịdị nwayọọ akọwara ha echiche unu. Ọ bụrụgodị na ha emeghachi omume n’ụzọ na-adịghị unu mma, zerenụ ịgwa ha okwu n’ụzọ enweghị nkwanye ùgwù. (Ilu 24:29) Chetanụ otú Devid si nọgide na-akwanyere Sọl ùgwù ọbụna mgbe eze ahụ na-agbasoghịzi ndụmọdụ Chineke. Rịọnụ Jehova ka o nyere unu aka ịchịkwa mmetụta ndị unu na-enwe. “Wụsịnụ obi unu n’ihu Ya dị ka mmiri,” ka Devid sịrị. “Chineke bụụrụ anyị ebe mgbaba.”—Abụ Ọma 62:8; Abụ Ákwá 3:25-27.

Na-asọpụrụ Ndị Na-edu Ndú

16. Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’ihe atụ nke ndị ozizi ụgha na ndị mmụọ ozi?

16 E ji mmụọ nsọ họpụta ndị okenye ọgbakọ, ma ha ka bụ ndị na-ezughị okè, na-ehiekwa ụzọ. (Abụ Ọma 130:3; Eklisiastis 7:20; Ọrụ 20:28; Jemes 3:2) N’ihi ya, ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ pụrụ ịbụ ndị na-enweghị afọ ojuju n’ebe ndị okenye nọ. Olee otú anyị kwesịrị isi meghachi omume mgbe anyị chere na ọ dị ihe a na-emezighị nnọọ emezi n’ime ọgbakọ, ma ọ bụ ma ọ dịghị ihe ọzọ mgbe o yiri ka ọ dị otú ahụ? Rịba ama ọdịiche dị n’etiti ndị ozizi ụgha nke narị afọ mbụ na ndị mmụọ ozi: “Ndị nwere anyaike, ndị nwere isi ike, ha [ndị ozizi ụgha] amaghị ahụ jijiji ikwulu ndị nọ n’ebube: ebe ndị mmụọ ozi, ọ bụ ezie na ha ka ha n’ume na ike, ma ha ekpegideghị ha ikpe nkwulu [n’ihi ùgwù ha na-akwanyere Jehova, NW].” (2 Pita 2:10-13) Ka ndị ozizi ụgha ahụ na-ekwulu “ndị nọ n’ebube”—ndị okenye bụ́ ndị e nyere ikike ịchịisi n’ọgbakọ ndị Kraịst narị afọ mbụ—ndị mmụọ ozi ahụ ekwulughị ndị ozizi ụgha ahụ bụ́ ndị nọ na-akpata nkewa n’etiti ụmụnna. Ndị mmụọ ozi ahụ, n’ịbụ ndị nọ n’ọnọdụ ka elu ma nwee echiche ka nkọ nke ikpe ziri ezi karịa ndị mmadụ, maara ihe na-aga n’ọgbakọ ahụ. Ma, “n’ihi ùgwù ha na-akwanyere Jehova,” ha hapụụrụ Chineke ikpe.—Ndị Hibru 2:6, 7; Jud 9.

17. Olee otú okwukwe gị si abata na ya mgbe ị na-eme ihe banyere nsogbu bụ́ mgbe i chere na ndị okenye mejọrọ ihe?

17 Ọ bụrụgodị na e meghị ihe otú e kwesịrị nnọọ isi mee ya, ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị inwe okwukwe n’ebe Jisọs Kraịst nọ dị ka Onyeisi dị ndụ nke ọgbakọ ndị Kraịst? Ọ̀ bụ na ọ maghị ihe na-eme n’ọgbakọ ya zuru ụwa ọnụ? Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ịkwanyere ụzọ o si ahụ banyere ọnọdụ ahụ ùgwù ma mata ikike o nwere ịchịkwa ihe? N’ezie, ‘anyị onwe anyị bụ ole ndị, ikpe onye agbata obi anyị ikpe?’ (Jemes 4:12; 1 Ndị Kọrint 11:3; Ndị Kọlọsi 1:18) Gịnị ma i wegara Jehova nchegbu gị n’ekpere gị?

18, 19. Gịnị ka ị pụrụ ime ma ọ bụrụ na i chee na onye okenye emehiewo ihe?

18 N’ihi ezughị okè mmadụ, ihe isi ike ma ọ bụ nsogbu pụrụ ibilite. A pụrụ inwe ọbụna mgbe onye okenye pụrụ imehie ihe, na-akpatara ụfọdụ ndị mgbakasị ahụ. Anyị ime ihe ọsọ ọsọ n’ọnọdụ dị otú ahụ agaghị agbanwe  ọnọdụ ahụ. Nanị ihe ọ pụrụ ime bụ ime ka nsogbu ahụ ka njọ. Ndị nwere nghọta ime mmụọ ga-echere ka Jehova dozie ihe ma nye ịdọ aka ná ntị ọ bụla pụrụ ịdị mkpa n’oge nke ya na n’ụzọ nke ya.—2 Timoti 3:16; Ndị Hibru 12:7-11.

19 Gịnị ma ọ bụrụ na i nwee nkụda mmụọ n’ihi ihe ụfọdụ? Kama ịgwawa ya ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ, gịnị ma i jiri nkwanye ùgwù jekwuru ndị okenye maka enyemaka? N’akọchaghị mmadụ, kọwaa otú o si metụta gị. Na-enwe “mmetụta maka [ha]” (NW) mgbe nile, nọgidekwa na-akwanyere ha ùgwù ka ị na-akọrọ ha ihe nzuzo. (1 Pita 3:8) Ahọrọla iji okwu mkparị eme ihe, kama nwee ntụkwasị obi ná ntozu okè ha dị ka ndị Kraịst. Nwee ekele maka agbamume ọ bụla dabeere n’Akwụkwọ Nsọ bụ́ nke ha pụrụ iji obi ọma nye gị. Ọ bụrụkwa na o yie ka ọ̀ dị mkpa ime mgbazi ndị ọzọ, nwee obi ike na Jehova ga-eduzi ndị okenye ime ihe dị mma ma zie ezi kpọmkwem.—Ndị Galetia 6:10; 2 Ndị Tesalọnaịka 3:13.

20. Gịnị ka anyị gaje ịtụle n’isiokwu na-esonụ?

20 Otú ọ dị, a ka nwere akụkụ ọzọ a ga-atụle n’ihe banyere ịsọpụrụ na ịkwanyere ndị na-achị isi ùgwù. Ọ̀ bụ na ndị e nyere ike ịchịisi ekwesịghị ịkwanyere ndị e nyere ha ilekọta ùgwù? Ka anyị tụlee nke ahụ n’isiokwu na-esonụ.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

• Olee ezi ihe mere anyị ga-eji na-asọpụrụ ndị na-achị isi?

• Olee otú Jehova na Jisọs si ele ndị na-adịghị akwanyere ndị Chineke nyere ikike ịchịisi ùgwù?

• Ezi ihe nlereanya ndị dị aṅaa ka ndị ahụ sọpụụrụ ndị e nyere ikike ịchịisi setịpụwooro anyị?

• Gịnị ka anyị pụrụ ime ma ọ bụrụ na onye na-achị isi n’ebe anyị nọ eyie ka o mehiewo ihe?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 12]

Sera kwanyeere ịbụisi Abraham ùgwù n’ụzọ miri emi, o nwekwara obi ụtọ

[Foto dị na peeji nke 13]

Maịkal akwanyeghịrị ọnọdụ ịchịisi Devid dị ka onyeisi ezinụlọ na eze, ùgwù

[Foto dị na peeji nke 15]

“Ya bụrụ m ihe arụ . . . isetị aka m megide onye Jehova e tere mmanụ”

[Foto dị na peeji nke 16]

Gịnị ma i wegara Jehova nchegbu gị n’ekpere gị?