Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Kwadosie Izi Ihe Chineke Ike

Kwadosie Izi Ihe Chineke Ike

 Kwadosie Izi Ihe Chineke Ike

“Tụkwasị Jehova obi gị nile, adaberekwala nghọta gị: n’ụzọ gị nile mara Ya, Ya onwe ya ga-emekwa ka okporo ụzọ gị nile zie ezie.”—ILU 3:5, 6.

1. Olee otú e si ekpughepụ anyị nye ihe ọmụma mmadụ dị ka ọ na-adịtụbeghị mbụ?

KA Ọ dị ugbu a, e nwere ihe dị ka akwụkwọ akụkọ 9,000 a na-ebipụta kwa ụbọchị bụ́ ndị a na-ekesa gburugburu ụwa. Kwa afọ, a na-ebipụta akwụkwọ ọhụrụ dị ihe dị ka 200,000 na United States nanị. Dị ka otu atụmatụ e mere si dị, ka ọ na-erule March 1998, e nwere ihe dị ka nde peji 275 n’Ebe A Na-enweta Ihe Ọmụma n’Internet. A na-ekwu na ọnụ ọgụgụ a na-arị elu n’ọ̀tụ̀tụ̀ nke nde peji 20 kwa ọnwa. Dị ka ọ na-adịtụbeghị mbụ, ndị mmadụ na-enweta nnọọ ihe ọmụma banyere ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ isiokwu ọ bụla. Ọ bụ ezie na ọnọdụ ahụ nwere akụkụ ndị dị mma, oké nkwakọba ihe ọmụma dị otú ahụ ewetawo nsogbu dị iche iche.

2. Olee nsogbu ndị pụrụ ibilite site n’inwe oké nkwakọba ihe ọmụma?

2 Mmadụ ụfọdụ aghọwo ndị ihe ọmụma riri ahụ, na-emejukarị ọchịchọ na-adịghị agwụ agwụ nke ịchọ ịmata ihe na-aganụ, ma na-eleghara ihe ndị ka mkpa anya. Ndị ọzọ na-enweta ihe ọmụma na-ezughị ezu banyere ihe ndị dị mgbagwoju anya ma na-elezi onwe ha anya dị ka ndị ọkachamara. N’ịdabere nanị ná nghọta a kpaara ókè, ha pụrụ ime mkpebi ndị dị oké mkpa bụ́ ndị pụrụ imerụ ha ma ọ bụ ndị ọzọ ahụ. E nwekwara mgbe nile ihe ize ndụ nke inweta ihe ọmụma na-abụghị eziokwu ma ọ bụ nke na-ezighị ezi. A dịghị enwekarị ụzọ ọ bụla a pụrụ ịdabere na ya isi mata ma imirikitimi ihe ọmụma ndị ahụ hà ziri ezi ma guzozie eguzozie.

3. Olee ịdọ aka ná ntị ndị a na-achọta na Bible banyere ịchụso amamihe ụmụ mmadụ?

3 Ọ dịla anya ọchịchọ ịmata ihe bụwara àgwà mmadụ. Laa azụ n’oge Eze Solomọn, a matara ihe ize ndụ nke ịla oge dị ukwuu n’iyi n’ịchụso ihe ọmụma na-abaghị uru ma ọ bụ ọbụna nke na-emerụ ahụ. O kwuru, sị: “Nara ndụmọdụ: ime ọtụtụ akwụkwọ enweghị ọgwụgwụ; ọtụtụ mmụta bụkwa ike ọgwụgwụ nke anụ ahụ.” (Eklisiastis 12:12) Ọtụtụ narị afọ mgbe nke a gasịrị, Pọl onyeozi degaara Timoti akwụkwọ, sị: “Na-eche ihe ahụ e nyere gị n’aka idebe, na-eze okwu efu nile nke e merụrụ emerụ nke ihe ahụ a na-akpọ ihe ọmụma n’ụzọ ụgha, ha na nguzogide ya nile; bụ́ ihe ọmụma nke ụfọdụ kwupụtara wee hie n’ihe banyere okwukwe anyị.” (1 Timoti 6:20, 21) Ee, ọ dị ndị Kraịst taa mkpa izere ịbụ ndị na-ekpughepụ onwe ha n’ụzọ na-enweghị isi nye echiche ndị na-emerụ ahụ.

4. Olee otu ụzọ anyị pụrụ isi gosipụta ntụkwasị obi anyị nwere n’ebe Jehova nọ nakwa n’ebe ozizi ya dị?

4 Ndị Jehova na-emekwa nke ọma ịṅa ntị n’okwu ndị dị n’Ilu 3:5, 6: “Tụkwasị Jehova obi gị nile, adaberekwala nghọta gị: n’ụzọ gị nile mara Ya, Ya onwe ya ga-emekwa ka okporo ụzọ gị nile zie ezie.” Ịtụkwasị Jehova obi na-agụnye ịjụ echiche ọ bụla nke na-emegide Okwu Chineke, ma ọ̀ bụ anyị onwe anyị chepụtara ya ma ọ bụ mmadụ ibe anyị chepụtara ya. Iji chebe ọnọdụ ime mmụọ anyị, ọ dị anyị mkpa ịzụ ike nghọta anyị ka anyị wee nwee ike ịmata ihe ọmụma ndị na-emerụ ahụ ma zere ha. (Ndị Hibru 5:14) Ka anyị tụlee ebe ụfọdụ ihe ọmụma dị otú ahụ si apụta.

Ụwa nke Setan Karịrị Ike

5. Olee otu ebe echiche ndị na-emerụ ahụ si apụta, oleekwa ndị na-akwalite ya?

5 Ụwa nke na-adịghị efe Chineke bụ otu ebe echiche ndị na-emerụ ahụ si apụta n’ụba.  (1 Ndị Kọrint 3:19) Jisọs Kraịst kpekuru Chineke ekpere banyere ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ekpeghị m ekpere ka I wepụ ha n’ụwa, kama ka I debe ha ka ha pụọ n’aka ajọ onye ahụ.” (Jọn 17:15) Jisọs, site n’ịrịọ ka e chebe ndị na-eso ụzọ ya pụọ n’aka “ajọ onye ahụ,” kwetara na Setan nwere mmetụta n’ụwa. Ịbụ ndị Kraịst anyị n’onwe ya adịghị echebe anyị pụọ ná mmetụta ọjọọ dị iche iche nke ụwa a. Jọn dere, sị: “Anyị matara na anyị bụ ndị si na Chineke pụta, ụwa dum na-atọgbọkwa n’aka ajọ onye ahụ.” (1 Jọn 5:19) Karịsịa n’ọgwụgwụ nke mgbe ikpeazụ a, e kwesịrị ịtụ anya na Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya ga-eji ihe ọmụma na-emerụ ahụ mejupụta ụwa.

6. Olee otú ihe omume dị iche iche nke ntụrụndụ pụrụ isi mee ka ihe ghara ịdị na-emetụtazi mmadụ?

6 E kwesịkwara ịtụ anya na ụfọdụ n’ime ihe ọmụma ndị a na-emerụ ahụ pụrụ iyi ihe na-adịghị emerụ ahụ. (2 Ndị Kọrint 11:14) Dị ka ihe atụ, tụlee ihe omume ntụrụndụ, tinyere ihe ngosi TV ya, ihe nkiri sịnịma ya, egwú ya, na akwụkwọ ya dị iche iche. Ọtụtụ ndị kweere na ụdị ụfọdụ nke ntụrụndụ na-akwalitewanye omume ndị dị njọ, dị ka omume rụrụ arụ, ime ihe ike, na ịṅụ ọgwụ ọjọọ. Mgbe mbụ e kpughepụrụ ndị mmadụ nye otu ụdị ntụrụndụ rụrụ arụ nke ukwuu, akpata oyi pụrụ ịwụ ha n’ahụ. Ma mmadụ ịbụ onye e kpughepụrụ nye ntụrụndụ dị otú ahụ ugboro ugboro pụrụ ime ka ọ gharazie imetụ ya n’ahụ. Anyị ekwesịghị ma ọlị ile ntụrụndụ na-akwalite echiche ndị na-emerụ ahụ anya dị ka ihe dị mma ma ọ bụ ihe na-adịghị emerụ ahụ.—Abụ Ọma 119:37.

7. Ụdị amamihe mmadụ dị aṅaa pụrụ imebi obi ike anyị nwere n’ebe Bible dị?

7 Tụlee ebe ọzọ ihe ọmụma ndị pụrụ imebi ihe si apụta—imirikitimi echiche nke ụfọdụ ndị ọkà mmụta sayensị na ndị ọkà mmụta bụ́ ndị na-ama izi ezi Bible aka, na-ebipụta. (Tụlee Jemes 3:15.) Ihe odide dị otú ahụ na-apụta ugboro ugboro na magazin ndị bụ́ isi nakwa n’akwụkwọ ndị na-ewu ewu, ọ pụkwara imebi obi ike mmadụ nwere n’ebe Bible dị. Mmadụ ụfọdụ na-anya isi n’iji ịkọ nkọ na-adịghị agwụ agwụ eme ka Okwu Chineke ghara inwe ikike. Ihe ize ndụ yiri nke ahụ dịrị n’oge ndị ozi, dị ka ọ pụtara ìhè site n’okwu Pọl onyeozi, bụ́: “Lezienụ anya ka onye ọ bụla ghara iwere ịhụ amamihe n’anya na aghụghọ efu nke ya bụrụ onye na-ezu unu n’ohi, ịhụ amamihe n’anya nke dị ka ihe ozizi mmadụ nyere idebe, dị ka ozizi mbụ nke ụwa, ma ọ dịghị ka Kraịst si dị.”—Ndị Kọlọsi 2:8.

Ndị Iro nke Eziokwu Ahụ

8, 9. Olee otú ndapụ n’ezi ofufe si apụta ìhè taa?

8 Ndị si n’ezi ofufe dapụ pụrụ iyikwu ọnọdụ ime mmụọ anyị egwu. Pọl onyeozi buru n’amụma na a ga-enwe ndapụ n’ezi ofufe n’etiti ndị sị na ha bụ ndị Kraịst. (Ọrụ 20:29, 30; 2 Ndị Tesalọnaịka 2:3) Ná mmezu nke okwu ya, mgbe ndị ozi nwụsịrị, oké ndapụ n’ezi ofufe dugara n’iwulite Krisendọm. Taa, oké ndapụ n’ezi ofufe adịghị ewere ọnọdụ n’etiti ndị Chineke. Ma, mmadụ ole na ole esiwo ná njikọ anyị pụọ, ụfọdụ n’ime ha kpebisikwara ike imebi aha Ndịàmà Jehova site n’ịgbasa ụgha na ihe ọmụma na-ezighị ezi. Mmadụ ole na ole n’ime ha so ìgwè ndị ọzọ na-arụ ọrụ ịgbakọta aka megide ofufe dị ọcha. N’ime otú ahụ, ha na-adụnyere onye mbụ si n’ezi ofufe dapụ, bụ́ Setan, úkwù.

9 Ụfọdụ ndị si n’ezi ofufe dapụ na-ejiwanye ụdị dị iche iche nke usoro mgbasa ozi, tinyere  Internet, eme ihe iji na-agbasa ihe ọmụma ndị na-abụghị eziokwu banyere Ndịàmà Jehova. N’ihi ya, mgbe ndị nwere ezi obi mere nnyocha banyere ihe ndị anyị kweere, ha pụrụ ịhụ mkpọsa nke ndị si n’ezi ofufe dapụ mere. Ọbụna ụfọdụ Ndịàmà ekpughepụwo onwe ha n’amaghị ama nye ihe ndị a na-emerụ ahụ. Tụkwasị na nke ahụ, ndị si n’ezi ofufe dapụ na-ekere òkè mgbe ụfọdụ n’ihe omume telivishọn ma ọ bụ redio. N’ihi nke a, olee ụzọ amamihe dị na ya ịgbaso?

10. Olee ụzọ amamihe dị na ya isi meghachi omume nye mkpọsa nke ndị si n’ezi ofufe dapụ?

10 Jọn onyeozi tụziiri ndị Kraịst ka ha ghara ịnabata ndị si n’ezi ofufe dapụ n’ụlọ ha. O dere, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla abịakwute unu, ma o wetaghị ozizi a, unu akpọbatala ya n’ụlọ, unu asịkwala ya biri nke ọma: n’ihi na onye na-asị ya biri nke ọma na-eso ya n’inwekọ ọrụ ya nile, nke bụ́ ajọ ọrụ.” (2 Jọn 10, 11) Izere iso ndị mmegide a na-enwe mmekọrịta ọ bụla ga-echebe anyị pụọ n’echiche ha rụrụ arụ. Ịṅa ntị n’ozizi nke onye si n’ezi ofufe dapụ site n’ụzọ dị iche iche nke usoro mgbasa ozi nke oge a bụ nnọọ ihe na-emerụ ahụ dị ka ịnabata onye ahụ si n’ezi ofufe dapụ n’onwe ya n’ụlọ anyị. Anyị ekwesịghị mgbe ọ bụla ikwe ka ọchịchọ ịmata ihe duba anyị n’ụzọ dị otú ahụ na-eweta ọdachi!—Ilu 22:3.

N’ime Ọgbakọ

11, 12. (a) Gịnị bụ otu ebe echiche na-emerụ ahụ si pụta n’ọgbakọ nke narị afọ mbụ? (b) Olee otú ụfọdụ ndị Kraịst na-esighị guzosie ike n’ịkwado izi ihe Chineke?

11 Tụleekwa ebe ọzọ echiche ndị na-emerụ ahụ pụrụ isi pụta. Ọ bụ ezie na onye Kraịst raara onwe ya nye ebughị n’uche ịkụzi ihe na-abụghị eziokwu, ọ pụrụ ịzụlite àgwà nke ikwu okwu n’echeghị eche. (Ilu 12:18) N’ihi ọdịdị anyị na-ezughị okè, anyị nile ga-eji ire anyị mehie mgbe ụfọdụ. (Ilu 10:19; Jemes 3:8) Ihe àmà na-egosi na n’oge Pọl onyeozi, e nwere ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ bụ́ ndị na-achịkwaghị ire ha ma tinye onwe ha ná nrụrịta ụka na-akpata esemokwu banyere okwu efu. (1 Timoti 2:8) E nwere ndị ọzọ bụ́ ndị ji echiche nke onwe ha kpọrọbiga ihe ókè, ọbụnakwa ruo nnọọ n’ókè nke ịma ikike Pọl aka. (2 Ndị Kọrint 10:10–12) Mmụọ dị otú ahụ dụgara n’esemokwu ndị na-enweghị isi.

12 Mgbe ụfọdụ, nghọtahie ndị a mụbara ghọọ “ịrụ ụka,” na-etisasị udo nke ọgbakọ. (1 Timoti 6:5; Ndị Galetia 5:15) Pọl dere banyere ndị kpalitere arụmụka ndị a, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla na-ezi ihe dị iche, n’ekwenyeghịkwa n’okwu na-enye ezi ndụ, bụ́ okwu nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, na ozizi ahụ nke dị ka nsọpụrụ Chineke si dị; a fụliwo ya elu, ọ dịghị ihe ọ maara, kama ọrịa banyere ajụjụ na esemokwu n’ihi okwu efu na-arịa ya, nke ekworo, esemokwu, nkwulu, ajọ echiche, na-esi n’ime ha na-apụta.”—1 Timoti 6:3, 4.

13. Gịnị bụ àgwà nke ihe ka ọtụtụ ná ndị Kraịst na narị afọ mbụ?

13 N’ụzọ na-enye obi ụtọ, n’oge ndị ozi, ihe  ka ọtụtụ ná ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi ma nọgide na-elekwasị anya n’ọrụ nke ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke. Ha rụsiri ọrụ ike n’ilekọta “ụmụ mgbei na ndị inyom di ha nwụrụ n’ime mkpagbu ha” ma debe onwe ha “n’enweghị ntụpọ site n’ụwa,” n’alaghị oge ha n’iyi n’arụmụka ndị na-enweghị isi banyere okwu efu. (Jemes 1:27) Ha zeere “mkparịta nile ọjọọ” ọbụna n’ime ọgbakọ ndị Kraịst iji chebe ọnọdụ ime mmụọ ha.—1 Ndị Kọrint 15:33; 2 Timoti 2:20, 21.

14. Ọ bụrụ na anyị akpachapụghị anya, olee otú nkwurịta echiche ndị dị otú ha kwesịrị pụrụ isi ghọọ arụmụka ndị na-emerụ ahụ?

14 N’otu aka ahụ, e jighị ọnọdụ ndị ahụ a kọwara na paragraf nke 11 mara ọgbakọ Ndịàmà Jehova taa. Ma, anyị ga-eme nke ọma ikweta na arụmụka ndị na-enweghị isi dị otú ahụ pụrụ ibilite. N’ezie, ọ bụ ihe dị otú o kwesịrị bụ́ ikwurịta banyere ihe ndekọ Bible ma ọ bụ inwe ihe ijuanya banyere akụkụ ụfọdụ nke ụwa ọhụrụ ahụ e kwere ná nkwa bụ́ ndị a na-ekpughebeghị. Ọ dịghịkwa ihe dị njọ n’ikwurịta echiche anyị n’ihe ndị metụtara onwe onye, dị ka uwe na ejiji ma ọ bụ ntụrụndụ anyị na-ahọrọ. Otú ọ dị, ọ bụrụ na anyị aghọọ ndị na-ekwesi olu ike banyere echiche anyị ma na-ewe iwe mgbe ndị ọzọ na-ekwenyeghịrị anyị, ọgbakọ pụrụ ịghọ nke e kewara ekewa n’ihi okwu ndị na-enweghị ihe ha pụtara. Ihe malitere dị ka obere okwu na-adịghị emerụ ahụ pụrụ ịghọ ihe na-emerụ ahụ n’ezie.

Ichebe Ihe E Nyere Anyị Idebe

15. Ruo ókè ha aṅaa ka “ozizi nke ndị mmụọ ọjọọ” pụrụ imerụ anyị ahụ n’ụzọ ime mmụọ, oleekwa ndụmọdụ a na-enye n’Akwụkwọ Nsọ?

15 Pọl onyeozi na-adọ aka ná ntị, sị: “Mmụọ Nsọ na-ekwuwa okwu, sị, na n’oge ikpeazụ ụfọdụ ga-ewezụga onwe ha n’ebe okwukwe anyị dị, na-aṅa ntị ndị mmụọ na-eduhie eduhie na ozizi nke ndị mmụọ ọjọọ.” (1 Timoti 4:1) Ee, echiche ndị na-emerụ ahụ bụ ihe iyi egwu n’ezie. N’ụzọ kwere nghọta, Pọl rịọrọ enyi ọ hụrụ n’anya bụ́ Timoti, sị: “Biko Timoti, na-eche ihe ahụ e nyere gị n’aka idebe, na-eze okwu efu nile nke e merụrụ emerụ nke ihe ahụ a na-akpọ ihe ọmụma n’ụzọ ụgha, ha na nguzogide ya nile; bụ́ ihe ọmụma nke ụfọdụ kwupụtara wee hie n’ihe banyere okwukwe anyị.”—1 Timoti 6:20, 21.

16, 17. Gịnị ka Chineke nyeworo anyị idebe, oleekwa otú anyị kwesịrị isi chebe ya?

16 Olee otú anyị onwe anyị taa pụrụ isi rite uru site n’ịdọ aka ná ntị ịhụnanya a? E nyere Timoti ihe idebe—ihe dị oké ọnụ ahịa ilekọta na ichebe. Olee ihe ọ bụ? Pọl na-akọwa, sị: “Jide ihe ilereanya nke okwu na-enye ezi ndụ nke ị nụrụ n’ọnụ m, n’ime okwukwe na ịhụnanya nke dị n’ime Kraịst Jisọs. Ihe ọma ahụ nke e nyere n’aka gị idebe, were Mmụọ Nsọ Nke bi n’ime anyị na-eche ya.” (2 Timoti 1:13, 14) Ee, ihe e nyere Timoti idebe gụnyere ‘okwu na-enye ezi ndụ,’ “ozizi ahụ nke dị ka nsọpụrụ Chineke si dị.” (1 Timoti 6:3) N’ikwekọ n’okwu ndị a, ndị Kraịst taa kpebisiri ike ichebe okwukwe ha na eziokwu ahụ e nyeworo ha idebe.

17 Ichebe ihe ahụ e nyere anyị idebe na-agụnye ịzụlite ihe ndị dị ka àgwà dị mma nke ịmụ Bible na ịnọgidesi ike n’ekpere, ma na-arụ “ezi ihe n’ebe mmadụ nile nọ, ma . . . karịsịa n’ebe ndị ezinụlọ nke okwukwe anyị nọ.” (Ndị Galetia 6:10; Ndị Rom 12:11–17) Pọl gara n’ihu ịdụ ọdụ, sị: “Na-agbaso ezi omume, nsọpụrụ Chineke, okwukwe, ịhụnanya, ntachi obi, ịdị nwayọọ. Na-agbasi mgba ọma nke okwukwe ike, jide ndụ ebighị ebi aka, nke a kpọrọ gị ka ị nata ya, i kwupụtakwara nkwupụta ọma ahụ n’ihu ọtụtụ ndị àmà.” (1 Timoti 6:11, 12) Ojiji Pọl ji nkebi ahịrịokwu ndị dị ka “na-agbasi mgba ọma nke okwukwe ike” na ‘jide aka’ mee ihe na-eme ka o doo anya na anyị aghaghị iji nrụsi ọrụ ike na mkpebi siri ike guzogide mmetụta ndị na-emerụ ahụ n’ụzọ ime mmụọ.

Mkpa Nghọta Dị

18. Olee otú anyị pụrụ isi gosipụta echiche ziri ezi nke ndị Kraịst n’otú anyị si ele ihe ọmụma ụwa anya?

18 N’ezie, nghọta dị mkpa n’ịgbasi mgba ọma nke okwukwe ike. (Ilu 2:11; Ndị Filipaị 1:9) Dị ka ihe atụ, ọ ga-abụ ihe ezi uche na-adịghị na ya ịjụ ịtụkwasị ihe ọmụma nile nke ụwa obi. (Ndị Filipaị 4:5; Jemes 3:17) Ọ bụghị echiche  nile nke ụmụ mmadụ na-emegide Okwu Chineke. Jisọs kwuru banyere mkpa ọ dị ndị ọrịa ịgakwuru dibịa ruru eru—ọrụ na-abụghị nke okpukpe. (Luk 5:31) N’agbanyeghị usoro ịgwọ ọrịa nke ndị na-emepechaghị anya e ji mee ihe n’oge Jisọs, o kwetara na e nwere abamuru ụfọdụ a ga-enweta site n’enyemaka onye dibịa. Ndị Kraịst taa na-egosipụta echiche ziri ezi n’ihe metụtara ihe ọmụma ụwa, ma ha na-ajụ ịbụ ndị e kpughepụrụ nye nke ọ bụla pụrụ imerụ ha ahụ n’ụzọ ime mmụọ.

19, 20. (a) Olee otú ndị okenye si eji nghọta eme ihe mgbe ha na-enyere ndị na-ekwu okwu n’ụzọ amamihe na-adịghị na ya aka? (b) Olee otú ọgbakọ si emeso ndị na-esi ọnwụ n’ịkwalite ozizi ụgha?

19 Nghọta dịkwa ndị okenye mkpa mgbe a kpọrọ ha inyere ndị na-ekwu okwu n’ụzọ amamihe na-adịghị na ya aka. (2 Timoti 2:7) Mgbe ụfọdụ, ndị òtù ọgbakọ pụrụ ịdaba n’esemokwu banyere ihe ndị na-enweghị ihe ha pụtara nakwa n’arụmụka banyere ihe ndị na-edochaghị ha anya. Iji chebe ịdị n’otu nke ọgbakọ, ndị okenye kwesịrị ime ngwa idozi nsogbu ndị dị otú ahụ. N’otu mgbe ahụ, ha ga-ezere ikwu na ụmụnna ha nwere ajọ ebumnobi, ha agaghịkwa adị oké ngwa ile ha anya dị ka ndị si n’ezi ofufe dapụ.

20 Pọl kọwara mmụọ a ga-eji na-enye aka. O kwuru, sị: “Ụmụnna m, a sị na ọ bụ ezie na a nwụde mmadụ mgbe ọ nọ ná ndahie ọ bụla, unu onwe unu, bụ́ ndị Mmụọ Nsọ na-achị, meenụ ka mmadụ dị otú a guzozie n’ime mmụọ nke ịdị nwayọọ; na-elezi onwe gị anya, ka a ghara ịnwakwa gị onwe gị.” (Ndị Galetia 6:1) N’ikwu kpọmkwem banyere ndị Kraịst na-enwe obi abụọ, Jud dere, sị: “Na-emekwaranụ ụfọdụ ebere, bụ́ ndị nwere obi abụọ; na-azọpụtakwanụ ụfọdụ, na-agụpụta ha n’ọkụ.” (Jud 22, 23) N’ezie, ọ bụrụ na e nye mmadụ ndụmọdụ ugboro ugboro ma ya esie ọnwụ n’ịkwalite ozizi ụgha, ọ dị ndị okenye mkpa ime ihe ozugbo iji chebe ọgbakọ.—1 Timoti 1:20; Taịtọs 3:10, 11.

Iji Ihe Ndị Kwesịrị Ịja Mma Na-emeju Uche Anyị

21, 22. Ọ̀ bụ banyere gịnị ka anyị kwesịrị ịdị na-eme nhọrọ, gịnịkwa ka anyị kwesịrị iji na-emeju uche anyị?

21 Ọgbakọ ndị Kraịst na-ezere okwu ndị na-emerụ ahụ bụ́ ndị “na-aba aba dị ka gangrene.” (2 Timoti 2:16, 17; Taịtọs 3:9) Nke a bụ eziokwu ma okwu dị otú ahụ hà na-apụta ìhè ‘n’amamihe’ na-eduhie eduhie nke ụwa, mkpọsa nke ndị si n’ezi ofufe dapụ, ma ọ bụ n’okwu e kwuru n’echeghị echiche n’ime ọgbakọ. Ọ bụ ezie na ọchịchọ dị mma ịmụta ihe ọhụrụ pụrụ ịba uru, ịchọ ịmata ihe n’ụzọ a na-akparaghị ókè pụrụ ikpughe anyị nye echiche ndị na-emerụ ahụ. Anyị abụghị ndị na-amaghị atụmatụ dị iche iche nke Setan. (2 Ndị Kọrint 2:11) Anyị maara na ọ na-eme mgbalị dị ukwuu ịdọpụ uche anyị iji mee ka anyị selata aka n’ozi anyị na-ejere Chineke.

22 Dị ka ezi ndị ozi, ka anyị kwadosie izi ihe Chineke ike. (1 Timoti 4:6) Ka anyị jiri oge anyị na-eme ihe n’ụzọ amamihe site n’ime nhọrọ banyere ihe ọmụma ndị anyị na-anakwere. Mgbe ahụ, anyị agaghị abụ ndị mkpọsa Setan kpalitere na-emetụta n’ụzọ dị mfe. Ee, ka anyị nọgide na-agụkọ ‘ihe bụ́ eziokwu, ihe kwesịrị nsọpụrụ, ihe ziri ezi, ihe dị ọcha, ihe kwesịrị ịhụnanya, ihe e kwuru nke ọma; ịdị mma ọ bụla, na otuto ọ bụla.’ Ọ bụrụ na anyị ejiri ihe ndị dị otú ahụ na-emeju uche na obi anyị, Chineke nke udo ga-anọnyere anyị.—Ndị Filipaị 4:8, 9.

Gịnị Ka Anyị Mụtara?

• Olee otú amamihe ụwa pụrụ isi yie ọnọdụ ime mmụọ anyị egwu?

• Gịnị ka anyị pụrụ ime iji chebe onwe anyị pụọ n’ihe ọmụma ndị na-emerụ ahụ nke ndị si n’ezi ofufe dapụ?

• Olee ụdị okwu e kwesịrị izere n’ime ọgbakọ ndị Kraịst?

• Olee otú e si egosipụta ezi nguzo nke ndị Kraịst n’ihe banyere oké nkwakọba ihe ọmụma ndị e nwere taa?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 9]

Ọtụtụ magazin na akwụkwọ na-ewu ewu na-emegide ụkpụrụ omume anyị dị ka ndị Kraịst

[Foto dị na peeji nke 10]

Ndị Kraịst pụrụ ikwurịta echiche ha n’ekwesighị olu ike