Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Otú Jehova Si Edu Anyị

Otú Jehova Si Edu Anyị

 Otú Jehova Si Edu Anyị

“Durukwa m n’okporo ụzọ dị larịị.”—ABỤ ỌMA 27:11.

1, 2. (a) Olee otú Jehova si edu ndị ya taa? (b) Gịnị ka irite uru zuru ezu ná nzukọ gụnyere?

JEHOVA bụ Isi Iyi nke ìhè na eziokwu, dị ka anyị mụtara n’isiokwu bu ụzọ. Okwu ya na-enye ụzọ anyị ìhè ka anyị na-eme njem n’okporo ụzọ dị larịị. Jehova na-edu anyị site n’inye anyị ntụziaka n’ụzọ ya nile. (Abụ Ọma 119:105) Dị ka ọbụ abụ oge ochie ahụ, anyị na-eji ekele anabata nduzi Chineke ma na-ekpe ekpere, sị: “Jehova, zi m ụzọ Gị; durukwa m n’okporo ụzọ dị larịị, n’ihi ndị na-eche m anwụ.”—Abụ Ọma 27:11.

2 Otu ụzọ Jehova si enye ntụziaka taa bụ site ná nzukọ ndị Kraịst. Ànyị na-erite uru zuru ezu ná ndokwa ịhụnanya a site (1) n’ịgachi ya anya, (2) n’ige ntị nke ọma n’ihe omume, nakwa (3) n’iji ọchịchọ obi na-ekere òkè n’akụkụ ndị chọrọ ka ndị na-ege ntị tinye ọnụ? Ọzọkwa, mgbe a tụụrụ anyị aro ndị ga-enyere anyị aka ịnọgide “n’okporo ụzọ dị larịị,” ànyị na-eji ekele anakwere ha?

Olee Otú I Si Eje Nzukọ?

3. Olee otú otu onye ozi oge nile si zụlite àgwà ọma nke ịgachi nzukọ anya?

3 Ụfọdụ ndị nkwusa Alaeze anọwo na-ejechi nzukọ anya kemgbe ha bụ nwata. “Mgbe mụ na ụmụnne m ndị inyom nọ na-etolite n’afọ ndị 1930,” ka otu onye ozi oge nile nke Ndịàmà Jehova na-echeta, “anyị adịghị ajụ nne na nna anyị ma ànyị ga-aga nzukọ. Anyị maara na anyị ga-aga ọ gwụla ma ànyị na-arịa ọrịa. Ezinụlọ anyị adịghị nnọọ ahapụ ije nzukọ.” Dị ka onye amụma nwanyị ahụ bụ́ Ana, nwanna nwanyị a ‘apụghị’ n’ebe ofufe Jehova.—Luk 2:36, 37.

4-6. (a) N’ihi gịnị ka ụfọdụ ndị nkwusa Alaeze ji ahapụ ịga nzukọ? (b) N’ihi gịnị ka ịga nzukọ ji dị oké mkpa?

 4 Ì so n’ime ndị na-agachi nzukọ ndị Kraịst anya, ka ị̀ na-agazi mgbe ụfọdụ? Ndị Kraịst ụfọdụ bụ́ ndị chere na ha na-eme nnọọ nke ọma kpebiri ile ma ọ̀ dịkwa otú ha chere. Ruo izu ole na ole, ha deturu nzukọ ọ bụla ha gara. Mgbe ha tụleghachiri ihe ndekọ ahụ ná ngwụsị nke oge ha yiri, ọnụ ọgụgụ nzukọ ndị ha na-agaghị juru ha anya.

5 ‘Ọ bụghị ihe ijuanya,’ ka mmadụ pụrụ ikwu. ‘Ndị mmadụ nwere nrụgide dị ukwuu taa nke na ọ dịghị adịrị ha mfe ịgachi nzukọ anya.’ Ọ bụ nnọọ eziokwu na anyị bi n’oge jupụtara ná nrụgide. Ọzọkwa, obi abụọ adịghị ya na nrụgide ahụ ga-arị elu. (2 Timoti 3:13) Ma nke ahụ ọ́ dịghị eme ka ọ dịkwuo mkpa ịgachi nzukọ anya? Ọ bụrụ na anyị anọgideghị na-eri nri ime mmụọ na-edozi ahụ iji kwagide anyị, anyị apụghị inwe olileanya iguzogide nrụgide nke usoro ihe a na-eweta. Leenụ, ọ bụrụ na anyị adịghị enwe mkpakọrịta chiri anya, a pụrụ ịnwa anyị ịgbahapụ “okporo ụzọ ndị ezi omume” kpam kpam! (Ilu 4:18) N’eziokwu, mgbe anyị lọrutere ụlọ ná ngwụsị nke ụbọchị siiri anyị ike, anyị nwere ike ghara inwecha ọchịchọ ịga nzukọ. Otú ọ dị, mgbe anyị mechara gaa n’agbanyeghị ike ọgwụgwụ anyị, anyị na-erite uru, anyị na-agbakwa ndị Kraịst ibe anyị ume n’Ụlọ Nzukọ Alaeze.

6 Ndị Hibru 10:25 na-atụ aro ihe ọzọ dị mkpa mere anyị kwesịrị iji na-agachi nzukọ anya. N’ebe ahụ, Pọl onyeozi na-agba ndị Kraịst ibe ya ume ịgbakọta ọnụ, ‘na-eme karịakwa otú a, n’ụzọ ha otú ha na-ele ụbọchị ahụ anya ka ọ na-abịaru nso.’ Ee, anyị agaghị echefu eziokwu ahụ bụ́ na “ụbọchị ahụ nke Chineke” na-eru  nso. (2 Pita 3:12) Ọ bụrụ na anyị ekwubie na ọgwụgwụ nke usoro ihe a ka dị nnọọ anya, anyị pụrụ ịmalite ikwe ka nchụso onwe onye weghara ọnọdụ nke ihe omume ime mmụọ ndị dị mkpa, dị ka ịga nzukọ. Mgbe ahụ, dị ka Jisọs dọrọ aka ná ntị, ‘ụbọchị ahụ pụrụ ịbịakwasị anyị na mberede.’—Luk 21:34.

Bụrụ Onye Na-ege Ntị nke Ọma

7. N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ka ụmụaka na-ege ntị ná nzukọ?

7 O zughị ezu nanị ịga nzukọ. Anyị aghaghị ige ntị nke ọma, na-etinye uche n’ihe a na-ekwu n’ebe ahụ. (Ilu 7:24) Nke a na-agụnye ụmụ anyị. Mgbe nwata gara ụlọ akwụkwọ, a na-atụ anya ka o gee onye nkụzi ya ntị, ọbụna mgbe otu ihe ọmụmụ na-amasịghị ya ma ọ bụ yie ihe ọ na-apụghị ịghọta. Onye nkụzi ahụ maara na ọ bụrụ na nwata ahụ agbalịa ige ntị, ma ọ dịghị ihe ọzọ, ọ ga-erite uru ụfọdụ site n’ihe ọmụmụ ahụ. Mgbe ahụ, ọ́ bụghị ihe ezi uche dị na ya bụ́ ụmụaka ndị toruworo ịga ụlọ akwụkwọ ige ntị ná ntụziaka a na-enye ná nzukọ ọgbakọ kama ịbụ ndị a na-ekwe ka ha hiwe ụra ozugbo nzukọ malitere? N’eziokwu, “ihe ụfọdụ nke dị ike ịghọta” so n’ime eziokwu ndị dị oké ọnụ ahịa a na-achọta n’Akwụkwọ Nsọ. (2 Pita 3:16) Ma anyị ekwesịghị ileda ikike nwata nwere ịmụta ihe anya. Chineke adịghị eme otú ahụ. N’oge Bible, o nyere ndị ohu ya bụ́ ụmụntakịrị iwu ‘ịnụ na ịmụta na ịtụ egwu Jehova, na ilezi anya ime okwu nile nke iwu a,’ bụ́ nke obi abụọ na-adịghị ya na ụfọdụ n’ime ha siiri ụmụaka ahụ ike ịghọta. (Deuterọnọmi 31:12; tụlee Levitikọs 18:1-30.) Jehova ọ̀ na-atụ anya ihe dị ala karịa nke ahụ n’aka ụmụaka taa?

8. Olee nzọụkwụ ndị nne na nna ụfọdụ na-ewere iji nyere ụmụ ha aka ige ntị ná nzukọ?

8 Ndị Kraịst bụ́ nne na nna na-aghọta na ihe ụmụ ha na-amụta ná nzukọ na-egbo mkpa ime mmụọ nke ụmụ ha n’akụkụ ụfọdụ. N’ihi ya, ụfọdụ ndị nne na nna na-eme ndokwa ka ụmụ ha hie obere ụra tupu nzukọ ka ha wee jiri ahụ doro edo bịaruo n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ma dị njikere ịmụta ihe. Ndị nne na nna ụfọdụ pụrụ iji nkwụsi ike kpaara ikiri telivishọn ókè ma ọ bụ ọbụna jiri amamihe machibido ya iwu ná mgbede nzukọ. (Ndị Efesọs 5:15, 16) Ndị nne na nna dị otú ahụ na-ebelatakwa nnọọ ihe ndọpụ uche, na-agba ụmụ ha ume ige ntị ma mụta ihe, dabere n’afọ ndụ na ikike ha.—Ilu 8:32.

9. Gịnị pụrụ inyere anyị aka ịzụlite ikike anyị ige ntị?

9 Jisọs nọ na-agwa ndị toworo eto okwu mgbe ọ sịrị: “Lezienụ anya otú unu si anụ.” (Luk 8:18) N’ụbọchị ndị a, nke ahụ na-adịkarị mfe ikwu ya ekwu karịa ime ya eme. N’eziokwu, ige ntị nke ọma bụ ọrụ siri ike, ma a pụrụ ịzụlite ikike nke ige ntị. Ka ị na-ege ntị n’okwu dabeere na Bible ma ọ bụ n’akụkụ ihe omume nke nzukọ, gbalịa ịrịba ihe ndị bụ́ isi a na-ekwu ama. Tụọ anya ihe ọzọ ọkà okwu ahụ gaje ikwu. Chọpụta isi ihe ndị ị pụrụ iji mee ihe n’ozi gị ma ọ bụ itinye n’ọrụ ná  ndụ gị. Ka a na-atụle isi ihe ndị ahụ, jiri uche gị na-atụleghachi ha. Mee ndekọ ndị dị mkpirikpi.

10, 11. Olee otú ndị nne na nna ụfọdụ siworo nyere ụmụ ha aka ịghọ ndị na-ege ntị n’ụzọ ka mma, oleekwa usoro ị hụworo dị ka nke na-enye aka?

10 A na-akasị amụta àgwà ige ntị nke ọma na nwata. Ọbụna tupu ha amụta ịgụ na ide ihe, ndị nne na nna na-agba ụmụ ha ụfọdụ na-etorubeghị ịga ụlọ akwụkwọ ume ‘idetu ihe’ n’oge nzukọ. Ha na-akanye ihe ná mpempe akwụkwọ mgbe e ji okwu ndị ha maara nke ọma dị ka “Jehova,” “Jisọs,” ma ọ bụ “Alaeze” mee ihe. N’ụzọ dị otú a, ụmụaka pụrụ ịmụta ige ntị n’ihe a na-ekwu n’ikpo okwu.

11 Ọ dị ọbụna ụmụaka totụworo eto mkpa ịbụ ndị a gbara ume ige ntị. Mgbe otu onyeisi ezinụlọ chọpụtara na nwa ya nwoke dị afọ 11 mụ anya na-arọ nrọ n’oge otu mgbakọ ndị Kraịst, o nyere nwata nwoke ahụ Bible ma gwa ya ka ọ na-asapeta akụkụ akwụkwọ nsọ ka ndị ọkà okwu na-ehota ha. Nna ahụ, bụ́ onye na-edetu ihe, na-ele nwa ya anya ka o ji Bible ahụ. Mgbe nke ahụ gasịrị, nwata nwoke ahụ ji ịnụ ọkụ n’obi ka ukwuu gee ntị n’usoro ihe omume mgbakọ ahụ.

Mee Ka A Nụ Olu Gị

12, 13. N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ikere òkè n’ịbụ abụ n’ọgbakọ?

12 Eze Devid bụrụ n’abụ, sị: “Aga m [agba] ebe ịchụàjà Gị gburugburu otú a, Jehova: ime ka e gee ntị olu ekele.” (Abụ Ọma 26:6, 7) Nzukọ nke Ndịàmà Jehova na-enye anyị ohere ndị magburu onwe ha ikwupụta okwukwe anyị n’olu dara ụda. Otu ụzọ anyị pụrụ isi mee nke a bụ site n’ikere òkè n’ịbụ abụ n’ọgbakọ. Nke a bụ akụkụ dị mkpa nke ofufe anyị, ma ọ pụrụ ịdị mfe ileghara ya anya.

13 Ụmụaka ụfọdụ na-apụghị ịgụ ihe ka ọ dịgodị na-eburu okwu nke abụ Alaeze a ga-abụ ná nzukọ kwa izu, n’isi. Ha na-enwe mkpali ịbụ ndị nwere ike isoro ndị toro eto na-abụ abụ. Otú ọ dị, ka ụmụaka na-etolitetụkwu, e nwere ike ha agaghị enwecha ọchịchọ isonye n’ịbụ  abụ Alaeze. Ụfọdụ ndị toworo eto na-alakwa azụ n’ihe banyere ịbụ abụ ná nzukọ. Ma, ịbụ abụ bụ akụkụ nke ofufe anyị, dị nnọọ ka ozi ubi bụ akụkụ nke ofufe anyị. (Ndị Efesọs 5:19) Anyị na-anwa ike anyị nile ito Jehova n’ozi ubi. Ọ̀ bụ na anyị apụghịkwa ito ya site n’iweli olu anyị—ma ọ̀ dị ụtọ ma ọ bụ na ọ dịghị—n’abụ otuto ndị si n’obi?—Ndị Hibru 13:15.

14. N’ihi gịnị ka o ji kwesị ka anyị na-akwadebe ihe ndị anyị na-amụ ná nzukọ ọgbakọ nke ọma tupu oge eruo?

14 Anyị na-ewetakwara Chineke otuto mgbe anyị na-aza ajụjụ ndị na-ewuli elu n’oge a na-eme ihe omume ndị chọrọ ka ndị na-ege ntị tinye ọnụ, ná nzukọ anyị. Nke a chọrọ ime nkwadebe. Ọ na-ewe oge iji tụgharịa uche n’ihe ndị ka mie emi nke Okwu Chineke. Pọl onyeozi, bụ́ onye na-amụchi Akwụkwọ Nsọ anya, ghọtara nke a. O dere, sị: “Aa! omimi nke akụ̀ nke amamihe na nke ihe ọmụma kwa nke Chineke!” (Ndị Rom 11:33) Ndị isi ezinụlọ, ọ dị mkpa ka unu nyere onye ọ bụla so n’ezinụlọ unu aka inyocha amamihe Chineke, dị ka e kpughere ya n’Akwụkwọ Nsọ. Wepụtanụ oge ụfọdụ n’oge ọmụmụ Bible ezinụlọ unu iji kọwaa isi ihe ndị tara akpụ na iji nyere ezinụlọ unu aka ịkwadebe maka nzukọ.

15. Aro ndị dị aṅaa pụrụ inyere mmadụ aka ịza ajụjụ ná nzukọ?

15 Ọ bụrụ na ị ga-achọ ịdị na-aza ajụjụ ugboro ugboro ná nzukọ, gịnị ma i buru ụzọ kwadebe ihe ndị ị chọrọ ikwu? Ọ dịghị mkpa ka ha too ogologo. A ga-enwe ekele maka akụkụ Bible kwesịrị ekwesị e ji nkwenye siri ike gụọ ma ọ bụ okwu ole na ole a họọrọ nke ọma bụ́ ndị si n’obi. Ndị nkwusa ụfọdụ na-agwa onye na-eduzi ọmụmụ ihe ka ọ hapụrụ ha azịza mbụ nke otu paragraf, ka ohere nke ikwupụta okwukwe ha ghara ifunahụ ha.

Onye Na-enweghị Uche Amara Ihe

16, 17. Olee ndụmọdụ nke otu okenye nyere otu ohu na-eje ozi, n’ihi gịnịkwa ka o ji dị irè?

16 Ná nzukọ nke Ndịàmà Jehova, a na-echetakarịrị anyị ịgụ Okwu Chineke kwa ụbọchị. Ime otú ahụ na-enye ume ọhụrụ. Ọ na-enyekwara anyị aka ime mkpebi ndị amamihe dị na ha, idozi ntụpọ ndị e nwere n’àgwà, iguzogide ọnwụnwa, na iguzozighachi n’ụzọ ime mmụọ ma ọ bụrụ na anyị azọnyewo ụkwụ n’ụzọ na-ezighị ezi.—Abụ Ọma 19:7.

17 Ndị okenye ọgbakọ nwere ahụmahụ na-adị njikere inye ndụmọdụ dabeere n’Akwụkwọ Nsọ bụ́ nke e mere ka o kwekọọ ná mkpa anyị. Nanị ihe anyị nwere ime bụ ‘ịdọpụta ya’ site n’ịchọ ndụmọdụ ha ndị dabeere na Bible. (Ilu 20:5) Otu ụbọchị, otu ohu na-eje ozi nke na-eto eto bụ́ onye na-anụ ọkụ n’obi rịọrọ otu okenye ka ọ tụọrọ ya aro n’otú ọ ga-esi baara ọgbakọ uru karị. Okenye ahụ, bụ́ onye maara nwa okoro ahụ nke ọma, meghere Bible ya gaa na 1 Timoti 3:3, bụ́ ebe na-ekwu na ndị ikom a họpụtara ahọpụta aghaghị ‘inwe obiọma.’ O ji obiọma kwupụta ụzọ ndị nwa okoro ahụ pụrụ isi gosipụta obiọma ná mmekọrịta ya na ndị ọzọ. Iwe ò were nwanna nwoke ahụ na-eto eto n’ihi ndụmọdụ ahụ e nyere ya n’ezoghị ọnụ? Ọ dịghị ma ọlị! “Okenye ahụ ji Bible mee ihe,” ka ọ kọwara, “ya mere aghọtara m na ndụmọdụ ahụ sitere n’aka Jehova.” Ohu na-eje ozi ahụ ji ekele tinye ndụmọdụ ahụ n’ọrụ, ọ na-enwekwa ọganihu dị mma.

18. (a) Gịnị nyeere otu onye Kraịst na-eto eto aka iguzogide ọnwụnwa n’ụlọ akwụkwọ? (b) Akụkụ Bible ndị dị aṅaa ka ị na-echeta mgbe ọnwụnwa chere gị ihu?

18 Okwu Chineke pụkwara inyere ndị na-eto eto aka “ịgbanahụ agụụ ihe ọjọọ na-agụ nwa okorobịa.” (2 Timoti 2:22) Otu Onyeàmà Jehova na-eto eto bụ́ onye gụsịrị akwụkwọ na kọleji na nso nso a guzogidere ọnwụnwa n’oge nile ọ na-aga akwụkwọ site n’ịtụgharị uche n’akụkụ Bible ụfọdụ na itinye ha n’ọrụ. Ọ na-echekarị banyere ndụmọdụ ahụ e dekọrọ n’Ilu 13:20: “Na-ejeso ndị maara ihe, ị ga-amakwa ihe.” N’ihi ya, ọ kpachapụrụ anya isoro nanị ndị na-akwanyere ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ ùgwù n’ụzọ miri emi, na-eme enyi. Ọ tụgharịrị uche, sị: “Ọ dịghị onye m ka mma. Ọ bụrụ na mụ esoro ìgwè na-ezighị ezi na-akpakọ, aga m achọ ime ihe ga-atọ ndị enyi m ụtọ, nke ahụ pụkwara iduga ná nsogbu.” Ndụmọdụ Pọl nke e dekọrọ na 2 Timoti 1:8 nyekwaara ya aka. O dere, sị: “Ka ihere àmà nke Onyenwe anyị, . . . ghara  ime gị: kama [soro] ozi ọma Ya hụjukọọ anya.” N’ikwekọ na ndụmọdụ ahụ, o ji obi ike soro ụmụ klas ya na-ekerịta nkwenkwe ya ndị dabeere na Bible n’oge ọ bụla kwesịrị ekwesị. Mgbe ọ bụla e kenyere ya ikwu okwu n’ihu klas ya, ọ na-ahọrọ isiokwu na-enye ya ohere iji akọ gbaa àmà banyere Alaeze Chineke.

19. Gịnị mere ka o siere otu nwa okorobịa ike iguzogide nrụgide nke ụwa a, ma gịnị nyere ya ume ime mmụọ?

19 Ọ bụrụ na anyị esitụdị ‘n’okporo ụzọ ndị ezi omume’ kpafuo, Okwu Chineke pụrụ inyere anyị aka ịzọzi ụkwụ anyị. (Ilu 4:18) Otu nwa okorobịa bi n’Africa mụtara nke a site n’ahụmahụ onwe onye. Mgbe otu n’ime Ndịàmà Jehova letara ya, ọ nabatara ọmụmụ Bible. Ihe ọ na-amụta masịrị ya ma n’oge na-adịghị anya ọ malitere inwe mkpakọrịta ọjọọ n’ụlọ akwụkwọ. Ka oge na-aga, o biwere ndụ rụrụ arụ. “Akọ na uche m nọgidere na-emekpa m ahụ, aghaghịkwa m ịkwụsị ịga nzukọ,” ka ọ na-ekweta. Mgbe e mesịrị, ọ maliteghachiri ịga nzukọ. Nwa okorobịa ahụ kwuru okwu a na-ekpughe ihe: “Achọpụtara m na isi ihe kpatara ihe nile a bụ na anọrọ m agụụ n’ụzọ ime mmụọ. Enweghị m ọmụmụ ihe onwe onye. Ọ bụ ya mere na enweghị m ike iguzogide ọnwụnwa. E mesịa, amalitere m ịgụ Ụlọ Nche na Teta! Nke nta nke nta, enwetaghachiri m ume ime mmụọ m, meekwa ka ndụ m dị ọcha. Nke a gbaara ndị hụrụ mgbanwe ndị m mere ezi àmà. E mere m baptism, enwekwara m obi ụtọ ugbu a.” Gịnị nyere nwa okorobịa a ume imeri adịghị ike anụ ahụ ya? O nwetaghachiri ume ime mmụọ ya site n’ọmụmụ Bible onwe onye chiri anya.

20. Olee otú onye na-eto eto pụrụ isi guzogide mwakpo Setan?

20 Ndị ntorobịa bụ́ ndị Kraịst, a na-awakpo unu taa! Ọ bụrụ na unu ga-eguzogide mwakpo Setan, unu aghaghị irichi nri ime mmụọ anya. Ọbụ abụ ahụ, bụ́ onye ihe àmà na-egosi na ọ bụ nwa okorobịa n’onwe ya, ghọtara nke a. O kelere Jehova maka iwepụta Okwu ya, ka ‘okorobịa wee mee ka ụzọ ya dị ọcha.’—Abụ Ọma 119:9.

Ebe Ọ Bụla Chineke Du Anyị Na-aga, Anyị Ga-eso Ya

21, 22. N’ihi gịnị ka anyị na-agaghị eji kwubie na ụzọ nke eziokwu ahụ tara akpụ nke ukwuu?

21 Jehova duuru mba Israel pụọ n’Ijipt baa n’Ala Nkwa ahụ. Ụzọ ọ họọrọ pụrụ iyiwo nke na-agwụ ike n’ụzọ na-adịghị mkpa site n’ụzọ mmadụ si ele ihe anya. Kama isite n’ụzọ Osimiri Mediterranean nke gara nnọọ kpọmkwem n’ebe ha na-aga bụ́ nke o doro anya na ọ ka mfe, Jehova duuru ndị ya gaa n’ụzọ ọzara nke tara akpụ n’ọgịga. Otú ọ dị, nke a bụ n’ezie obiọma n’ebe Chineke nọ. Ọ bụ ezie na ọ ka nso, ụzọ ahụ nke gafere oké osimiri gaara eduru ụmụ Israel gafee n’ala ndị Filistia na-enweghị omume enyi. Site n’ịhọrọ ụzọ ọzọ, Jehova mere ka ndị ya na ndị Filistia ghara iburịta agha n’isi mbụ a.

22 N’ụzọ yiri nke ahụ, okporo ụzọ nke Jehova na-edu anyị na ya taa pụrụ iyi nke tara akpụ mgbe ụfọdụ. Kwa izu, anyị nwere usoro ihe omume juru eju nke ndị Kraịst, gụnyere nzukọ ọgbakọ, ọmụmụ ihe onwe onye, na ozi ubi. Okporo ụzọ ndị ọzọ pụrụ iyi ndị dị mfe karị. Ma, ọ bụ nanị ma anyị gbasoo nduzi Chineke ka anyị ga-eru n’ebe ahụ anyị na-arụsi ọrụ ike iru. Ya mere, ka anyị nọgide na-anara ntụziaka dị mkpa bụ́ nke sitere n’aka Jehova ma nọgide “n’okporo ụzọ dị larịị” ruo mgbe ebighị ebi!—Abụ Ọma 27:11.

Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?

N’ihi gịnị ka ịgachi nzukọ ndị Kraịst anya ji dị anyị mkpa karịsịa?

Gịnị ka ndị nne na nna pụrụ ime iji nyere ụmụ ha aka ige ntị ná nzukọ?

Gịnị ka ịbụ ezi onye na-ege ntị gụnyere?

Gịnị pụrụ inyere anyị aka ịza ajụjụ ná nzukọ?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 16, 17]

Ịga nzukọ ndị Kraịst na-enyere anyị aka iburu ụbọchị Jehova n’uche

[Foto ndị dị na peeji nke 18]

E nwere ụzọ dịgasị iche isi na-eto Jehova ná nzukọ ndị Kraịst