Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịmara “Uche nke Kraịst”

Ịmara “Uche nke Kraịst”

 Ịmara “Uche nke Kraịst”

“Ònye maara uche Onyenwe anyị, ka o zie Ya ihe? Ma anyị onwe anyị nwere uche nke Kraịst.”—1 NDỊ KỌRINT 2:16.

1, 2. N’Okwu ya, gịnị ka Jehova hụrụ dị ka ihe kwesịrị ekwesị ikpughe banyere Jisọs?

GỊNỊ ka Jisọs dị ka ya? Gịnị bụ ụcha agịrị isi ya? akpụkpọ ahụ ya? anya ya? Olee otú o toruru n’ogologo? Olee otú ọ dịruru n’arọ? N’afọ ndị gafeworonụ, e nwewo ihe osise dịgasị iche banyere Jisọs, site ná ndị bụtụ eziokwu ruo ná ndị na-abụtụghị eziokwu banyere ya. Ụfọdụ esewo ya dị ka onye siri ike ma dị gara gara, ebe ndị ọzọ sere ya dị ka onye na-esighị ike nke na-adịghị gara gara.

2 Otú ọ dị, Bible elekwasịghị anya n’ọdịdị Jisọs. Kama nke ahụ, Jehova hụrụ ya dị ka ihe kwesịrị ekwesị ikpughe ihe dị nnọọ ịrịba ama karị: ụdị onye Jisọs bụ. Ihe ndekọ nke Oziọma ndị ahụ akọghị nanị ihe Jisọs kwuru ma mee kamakwa ha na-ekpughe otú mmetụta na ụzọ iche echiche ndị mere o ji kwuo ihe ndị o kwuru ma mee ihe ndị o mere, haruru. Ihe ndekọ anọ ndị a e dere n’ike mmụọ nsọ na-eme ka anyị nwee ike inyoba anya n’ihe Pọl onyeozi zoro aka na ya dị ka “uche nke Kraịst.” (1 Ndị Kọrint 2:16) Ọ dị mkpa ka anyị mara echiche, mmetụta, na àgwà Jisọs. N’ihi gịnị? N’ihi ihe abụọ ma ọ dịkarịa ala.

3. Nghọta dị aṅaa ka anyị pụrụ inweta site n’ịmara uche nke Kraịst?

3 Nke mbụ, uche nke Kraịst na-eme ka anyị hụperetụ  uche nke Jehova Chineke. Jisọs maara nnọọ Nna ya nke ọma nke na ọ pụrụ ikwu, sị: “Ọ dịghịkwa onye ọ bụla maara Onye Ọkpara ahụ bụ, ma ọ bụghị Nna Ya; na Onye Nna ahụ bụ, ma ọ bụghị Ọkpara Ya, na onye ọ bụla Ọkpara na-ezube ikpughe Ya nye ya.” (Luk 10:22) Ọ dị ka a ga-asị na Jisọs na-ekwu, sị, ‘Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmata ihe Jehova dị ka ya, bịakwute m.’ (Jọn 14:9) N’ihi ya, mgbe anyị na-amụ ihe Oziọma ndị ahụ na-ekpughe banyere ụzọ Jisọs si chee echiche ma nwee mmetụta, anyị na-amụ otú Jehova si eche echiche ma na-enwe mmetụta, dị ka a pụrụ isi kwuo ya. Ihe ọmụma dị otú ahụ na-eme ka anyị nwee ike ịbịarukwu Chineke anyị nso.—Jemes 4:8.

4. Ọ bụrụ na anyị ga-eme n’ezie dị ka Kraịst, gịnị ka anyị na-aghaghị ibu ụzọ mụta, n’ihi gịnịkwa?

4 Nke abụọ, anyị ịmara uche nke Kraịst ga-enyere anyị aka “[iso] ijeụkwụ Ya nile.” (1 Pita 2:21) Iso Jisọs abụghị nanị ihe banyere ikwughachi ihe ndị o kwuru na iṅomi ihe ndị o mere. Ebe ọ bụ na echiche na mmetụta na-akpali okwu ọnụ na ime ihe, iso Kraịst chọrọ ka anyị zụlite otu “uche” ahụ o nwere. (Ndị Filipaị 2:5) N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ọ bụrụ na anyị ga-eme dị ka Kraịst n’ezie, anyị aghaghị ibu ụzọ mụta iche echiche na inwe mmetụta dị ka ya, ya bụ, ruo n’ókè anyị nwere ike dị ka ụmụ mmadụ na-ezughị okè. Site n’enyemaka ndị dere Oziọma ndị ahụ, ka anyị nyobazie anya n’uche nke Kraịst. Nke mbụ, anyị ga-atụle isi ihe ndị kpaliri Jisọs iche echiche na inwe mmetụta dị ka o si mee.

Ịdị Adị Ya Tupu Ọ Ghọọ Mmadụ

5, 6. (a) Mmetụta dị aṅaa ka ndị anyị na ha na-akpakọrịta pụrụ inwe n’ebe anyị nọ? (b) Olee onye ya na Ọkpara Chineke bu ụzọ mụọ kpakọrịtara n’eluigwe tupu ya abịa n’ụwa, mmetụta dịkwa aṅaa ka nke a nwere n’ebe ọ nọ?

5 Ndị anyị na ha na-akpachi anya pụrụ inwe mmetụta n’ebe anyị nọ, na-emetụta echiche, mmetụta, na omume anyị n’ụzọ dị mma ma ọ bụ n’ụzọ dị njọ. * (Ilu 13:20) Tụlee onye ya na Jisọs kpakọrịtara n’eluigwe tupu ya abịa n’ụwa. Oziọma Jọn na-adọrọ uche gaa n’ịdị adị Jisọs dị ka “Okwu ahụ,” ma ọ bụ Ọnụ Na-ekwuru Chineke, tupu ọ ghọọ mmadụ. Jọn na-ekwu, sị: “Na mbụ ka Okwu ahụ dịrị, Okwu ahụ na Chineke dịkwara, Okwu ahụ bụrụkwa [chi, NW]. Onye ahụ na Chineke dịrị na mbụ.” (Jọn 1:1, 2) Ebe ọ bụ na Jehova enweghị mmalite, Okwu ahụ na Chineke ịnọ site “na mbụ” aghaghị ịdị na-ezo aka ná mmalite nke ọrụ okike Chineke. (Abụ Ọma 90:2) Jisọs bụ “onye e buru ụzọ mụọ n’ihe nile e kere eke.” N’ihi ya, ọ dị adị tupu e kee ihe ndị ọzọ bụ́ mmụọ nakwa eluigwe na ala nkịtị.—Ndị Kọlọsi 1:15; Mkpughe 3:14.

6 Dị ka ụfọdụ atụmatụ ndị sayensị mere si dị, eluigwe na ala nkịtị adịruwo ma ọ dịkarịa ala ijeri afọ 12. Ọ bụrụ na atụmatụ ndị ahụ nwere otú ha si zitụ ezi, Ọkpara Chineke bu ụzọ mụọ so Nna ya nwee mkpakọrịta chiri anya ruo afọ a na-apụghị ịgụta ọnụ tupu e kee Adam. (Tụlee Maịka 5:2.) Ha abụọ si otú a nwee njikọ ịhụnanya na nke miri emi. Dị ka amamihe a kọwara ka ọ bụ mmadụ, a kọwara Ọkpara a e bu ụzọ mụọ n’ịdị adị ya tupu ọ ghọọ mmadụ dị ka onye kwuru, sị: “Anọkwa m n’akụkụ Ya, dị ka onye ọkà: M wee bụrụ ihe na-atọ [Jehovah] ụtọ kwa ụbọchị, na-egwuri egwú n’ihu Ya mgbe nile.” (Ilu 8:30) N’ezie, isoro Isi Iyi nke ịhụnanya na-akpachi anya ruo afọ a na-apụghị ịgụta ọnụ nwere mmetụta dị ukwuu n’ebe Ọkpara Chineke nọ! (1 Jọn 4:8) Ọkpara a bịara mara ma na-egosipụta echiche, mmetụta, na ụzọ nke Nna ya ruo n’ókè nke ọ na-adịghị onye ọ bụla ọzọ pụrụ ime ya.—Matiu 11:27.

Ndụ na Mmetụta Elu Ala

7. Olee otu n’ime ihe ndị mere o ji dị mkpa ka Ọkpara Chineke bu ụzọ mụọ bịa n’ụwa?

7 Ọkpara Chineke nwekwuru ihe ndị ọ ga-amụta, n’ihi na nzube Jehova bụ ịkwadebe Ọkpara ya ịbụ Onyeisi Nchụàjà nwere ọmịiko, na-enwe ike “iji obi soo anyị hụkọọ ahụhụ n’adịghị ike anyị.” (Ndị Hibru 4:15) Otu n’ime ihe ndị mere Ọkpara ahụ ji bịa n’ụwa dị ka mmadụ bụ iji ruo ihe a chọrọ maka ọrụ a. N’ebe a, dị ka mmadụ nwere anụ ahụ na ọbara, e kpughepụrụ Jisọs nye ọnọdụ na mmetụta ndị ọ nọbu n’eluigwe  na-ekiri nanị nkiri. Ugbu a ya onwe ya nwere mmetụta na mmetụta uche nke ndị mmadụ na-enwe. Mgbe ụfọdụ ike gwụrụ ya, akpịrị kpọrọ ya nkụ, agụụ gụkwara ya. (Matiu 4:2; Jọn 4:6, 7) Ọbụna karị, o diri ụdị ihe isi ike na ahụhụ nile. O si otú a ‘mụta ịṅa ntị’ ma ruchaa nnọọ eru maka ọrụ ya dị ka Onyeisi Nchụàjà.—Ndị Hibru 5:8-10.

8. Gịnị ka anyị maara banyere oge Jisọs bụ nwata n’ụwa?

8 Gịnị banyere ahụmahụ ndị Jisọs nwere n’oge ndụ ya n’ụwa? Akụkọ banyere oge ọ bụ nwata dị nnọọ mkpirikpi. N’ezie, nanị Matiu na Luk kọrọ ihe ndị mere n’oge ọmụmụ ya. Ndị dere Oziọma ndị ahụ maara na Jisọs ebiwo ndụ n’eluigwe tupu ọ bịa n’ụwa. Ịdị adị ya tupu ọ ghọọ mmadụ gosipụtara, karịa ihe ọ bụla ọzọ, ụdị mmadụ ọ ghọrọ. Otú o sina dị, Jisọs bụ mmadụ n’ozuzu ya. Ọ bụ ezie na o zuru okè, ọ ghaghị ito site n’oge ịbụ nwa ọhụrụ ruo na nwata nakwa site n’oge uto ruo ná ntozu okè, na-amụta ihe n’oge ahụ nile. (Luk 2:51, 52) Bible na-ekpughe ihe ụfodụ banyere oge Jisọs bụ nwata bụ́ ndị obi abụọ na-adịghị ya na ha metụtara ya.

9. (a) Gịnị na-egosi na a mụrụ Jisọs n’ezinụlọ dara ogbenye? (b) N’ọnọdụ dị aṅaa ka o yiri ka Jisọs ò tolitere na ya?

9 Ihe àmà na-egosi na a mụrụ Jisọs n’ezinụlọ dara ogbenye. Ihe ịchụ àjà nke Josef na Meri wetara n’ụlọ nsọ ihe dị ka ụbọchị 40 a mụsịrị ya, gosipụtara nke a. Kama iweta otu nwa ebule dị ka àjà nsure ọkụ na otu nduru ma ọ bụ otu kpalakwukwu dị ka àjà mmehie, ha wetara “nduru abụọ, ma ọ bụ ụmụ kpalakwukwu abụọ.” (Luk 2:24) Dị ka Iwu Mosis si dị, ọ bụ ndị dara ogbenye ka e meere ndokwa iji ihe dị otú a chụọ àjà. (Levitikọs 12:6-8) Ka oge na-aga, ezinụlọ a dara ogbenye mụbara. Josef na Meri mụrụ ma ọ dịkarịa ala ụmụ isii ndị ọzọ site n’ụzọ nkịtị mgbe a mụsịrị Jisọs n’ụzọ ọrụ ebube. (Matiu 13:55, 56) Ya mere Jisọs tolitere n’ezinụlọ buru ibu, ma eleghị anya nọrọ n’ọnọdụ dị ala.

10. Gịnị na-egosi na Meri na Josef bụ ndị na-atụ egwu Chineke?

10 Ọ bụ nne na nna na-atụ egwu Chineke zụlitere Jisọs, ha lekọtakwara ya. Nne ya, bụ́ Meri, bụ nwanyị pụrụ iche. Cheta na mgbe ọ na-ekele ya, mmụọ ozi Gebriel kwuru, sị: “Ekele, gị onye Chineke meworo ka ị nara amara, Onyenwe anyị nọnyeere gị.” (Luk 1:28) Josef bụkwa nwoke ji okpukpe kpọrọ ihe. Kwa afọ, ọ na-eji ikwesị ntụkwasị obi eme njem ahụ dị kilomita 150 gaa Jerusalem maka Ememe Ngabiga. Meri jekwara, n’agbanyeghị na ọ bụ nanị ndị ikom ka a chọrọ ka ha mee otú ahụ. (Ọpụpụ 23:17; Luk 2:41) N’otu oge dị otú ahụ, mgbe Josef na Meri jisịrị ịdị uchu chọgharịa ya, ha hụrụ Jisọs ahụ dị afọ 12 n’ụlọ nsọ n’etiti ndị ozizi. Jisọs gwara nne na nna ya, bụ́ ndị na-echegbu onwe ha, sị: “Ùnu amataghị na aghaghị m ịdị n’ihe nke Nna m?” (Luk 2:49) “Nna”—okwu ahụ aghaghị inyewo Jisọs ahụ na-eto eto echiche nke ịhụnanya na izi ezi. Otu ihe bụ na, ihe àmà na-egosi na a gwawo ya na Jehova bụ Nna ya nke ezigbo ya. Tụkwasị na nke a, Josef aghaghị ịbụwo ezi nna nkuchi nye Jisọs. N’ezie Jehova agaghị ahọrọwo nwoke dị aka ike ma ọ bụ nwee obi ọjọọ ịzụlite Ọkpara Ọ hụrụ n’anya!

11. Ọrụ aka dị aṅaa ka Jisọs mụrụ, n’oge Bible kwa, gịnị ka ịrụ ọrụ aka a gụnyere?

11 N’afọ ndị ọ nọrọ na Nazaret, Jisọs mụtara ọrụ aka bụ́ ịkwa nkà, ma eleghị anya site n’aka  nna nkuchi ya, bụ́ Josef. Jisọs mụtara nnọọ ọrụ aka ahụ nke ọma nke na a kpọrọ ya onwe ya “onye ọkà.” (Mak 6:3) N’oge Bible, e were ndị ọkwa nkà n’ọrụ iwu ụlọ, ịrụ arịa (na-agụnye tebụl, oche, na oche ogologo), na ịrụ ngwá ọrụ ndị e ji arụ ọrụ ugbo. N’akwụkwọ ya bụ́ Dialogue With Trypho, Justin Martyr, nke narị afọ nke abụọ O.A., dere banyere Jisọs, sị: “Ọ rụrụ ọrụ karịsịa dị ka ọkwa nkà mgbe ọ nọ n’etiti ụmụ mmadụ, na-arụpụta ọgụ na yoke.” Ọrụ dị otú ahụ adịghị mfe, n’ihi na ma eleghị anya ọkwa nkà oge gboo apụghị ịzụ osisi ya azụ. O yikarịrị ka ọ na-apụ ma họpụta otu osisi, gbutuo ya, ma bulaa osisi ahụ n’ụlọ. Ya mere, Jisọs pụrụ ịmawo ihe ịma aka ndị dị n’inweta ihe ndị e ji ebi ndụ na n’imeso ndị ahịa ihe.

12. Gịnị na-egosi na ma eleghị anya Josef bu Jisọs ụzọ nwụọ, gịnịkwa ka nke a pụrụ ịpụtaworo Jisọs?

12 Dị ka diọkpara, ma eleghị anya Jisọs nyere aka n’ilekọta ezinụlọ ha, karịsịa ebe ọ bụ na o yiri ka Josef ò bu Jisọs ụzọ nwụọ. * Zion’s Watch Tower nke January 1, 1900, kwuru, sị: “Echiche nke oge ahụ na-ekwu na Josef nwụrụ mgbe Jisọs ka dị obere, nakwa na Jisọs weghaara ọrụ ịkwa nkà ahụ ma ghọọ onye na-akwado ezinụlọ ahụ. Akaebe Akwụkwọ Nsọ ahụ e nwere bụ́ ebe a kpọrọ Jisọs n’onwe ya onye nkà, ebe a kpọtụkwara nne ya na ụmụnne ya aha, ma a kpọtụghị Josef, na-akwadotụ nke a. (Mak 6:3) . . . Mgbe ahụ, o yikarịrị ka e tinyere ogologo oge nke afọ iri na asatọ nke ndụ Onyenwe anyị, site n’oge ihe ahụ [e dekọrọ na Luk 2:41-49] mere ruo n’oge baptism ya, n’ịrụ ọrụ nkịtị ndị a na-arụ ná ndụ.” O yiri ka Meri na ụmụ ya, gụnyere Jisọs, hà maara ihe mgbu a na-enweta mgbe di na nna a hụrụ n’anya nwụrụ.

13. Mgbe Jisọs malitere ozi ya, n’ihi gịnị ka o ji jiri ihe ọmụma, nghọta, na mmetụta miri emi nke nwoke ọzọ na-apụghị inwewo malite?

13 O doro anya na a mụghị Jisọs ná ndụ nke ntụsara ahụ. Kama nke ahụ, o nwetara n’onwe ya ahụmahụ nke ndụ ndị mmadụ nkịtị. Mgbe ahụ, na 29 O.A., oge Jisọs ga-arụ ọrụ ahụ Chineke nyere ya bụ́ nke na-eche ya, ruru. N’oge mgbụsị akwụkwọ nke afọ ahụ, e mere ya baptism n’ime mmiri, a mụọkwa ya dị ka Nwa ime mmụọ nke Chineke. ‘E megheere ya eluigwe,’ ma eleghị anya na-egosi na ọ pụziri icheta ndụ ọ dị n’eluigwe tupu ọ ghọọ mmadụ, gụnyere echiche na mmetụta ndị ya na ya na-agakọ. (Luk 3:21, 22) Ya mere mgbe Jisọs malitere ozi ya, o ji ihe ọmụma, nghọta, na mmetụta miri emi nke ọ na-adịghị nwoke ọzọ pụrụ inwewo ya, malite. E nwere ezi ihe mere ndị dere Oziọma ndị ahụ ji dee banyere ihe ndị mere n’oge ozi Jisọs n’ihe ka ọtụtụ n’ihe odide ha. N’agbanyeghị nke ahụ, ha apụghị idetucha ihe nile o kwuru ma mee. (Jọn 21:25) Ma ihe e nyere ha ike mmụọ nsọ idekọ na-eme ka anyị nwee ike inyoba anya n’uche nke nwoke kasị ukwuu nke dịworo ndụ.

Ihe Jisọs Dị Ka Ya Mgbe Ọ Bụ Mmadụ

14. Olee otú Oziọma ndị ahụ si egosi Jisọs dị ka nwoke nwere ọmịiko na mmetụta mmiri emi?

14 Àgwà Jisọs bụ́ nke a na-ahụ site n’Oziọma ndị ahụ bụ nke nwoke na-ahụ n’anya, nke nwekwara mmetụta miri emi. O gosipụtara mmetụta uche n’ụzọ sara mbara: ọmịiko n’ebe onye ekpenta nọ (Mak 1:40, 41); iruru ndị na-adịghị ege ntị újú (Luk 19:41, 42); iwe ziri ezi n’ebe ndị anyaukwu na-agbanwe ego nọ (Jọn 2:13-17). N’ịbụ nwoke nwere mmetụta ọmịiko, a pụrụ imepụ Jisọs anya mmiri, o zochighịkwa  mmetụta ya. Mgbe ezi enyi ya bụ́ Lazarọs nwụrụ, ọhụhụ ọ hụrụ Meri, bụ́ nwanne Lazarọs nke nwanyị, ka ọ na-ebe ákwá, metụrụ Jisọs n’ahụ nke ukwuu nke na anya mmiri pụrụ ya onwe ya n’anya, ya bewe ákwá n’ihu ndị mmadụ.—Jọn 11:32-36.

15. Olee otú obi ọmịiko Jisọs si pụta ìhè n’ụzọ o si lee ndị ọzọ anya ma mesoo ha ihe?

15 Obi ọmịiko Jisọs pụtara ìhè karịsịa n’ụzọ o si lee ndị ọzọ anya ma mesoo ha ihe. Ọ gakwuuru ndị ogbenye na ndị a na-emegbu emegbu, na-enyere ha aka ‘ịhụ izu ike nye mkpụrụ obi ha.’ (Matiu 11:4, 5, 28-30) O jighị ọrụ n’aka ruo n’ókè nke na o meghị ihe banyere mkpa nke ndị na-ahụju anya, ma ọ̀ bụ nwanyị oruru ọbara nke ji nwayọọ metụ uwe ya aka ma ọ bụ onye arịrịọ kpuru ìsì nke a na-agaghị akwụsịli ikwu okwu. (Matiu 9:20-22; Mak 10:46-52) Jisọs lere anya maka ebe ndị ọzọ na-eme nke ọma, jaakwa ha mma; ma, ọ dịkwa njikere inye ịdọ aka ná ntị mgbe ọ dị mkpa. (Matiu 16:23; Jọn 1:47; 8:44) N’oge e nwere ihe ole na ole ruuru ndị inyom, Jisọs ji ọ̀tụ̀tụ̀ kwesịrị ekwesị nke nkwanye ùgwù mesoo ha ihe. (Jọn 4:9, 27) N’ụzọ kwere nghọta, otu ìgwè ndị inyom ji ọchịchọ obi jeere ya ozi site n’ihe onwunwe ha.—Luk 8:3.

16. Gịnị na-egosi na Jisọs nwere echiche ziri ezi banyere ndụ na ihe onwunwe?

16 Jisọs nwere echiche ziri ezi banyere ndụ. Ihe onwunwe abụghị ihe kasị mkpa nye ya. N’ụzọ ihe onwunwe, o yiri ka o nwere ntakịrị ihe. O kwuru na ya “enweghị ebe ịtọgbọ isi Ya.” (Matiu 8:20) N’otu oge ahụ, Jisọs mere ka ndị ọzọ nwekwuo ọṅụ. Mgbe ọ gara oriri agbamakwụkwọ—ihe omume a na-ahụkarị egwú, ịgụ egwú, na ịṅụrị ọṅụ na ya—o doro anya na ọ gaghị ebe ahụ iji mee ka ememe ahụ ghara ikpo ọkụ. N’ezie, Jisọs rụrụ ọrụ ebube mbụ ya n’ebe ahụ. Mgbe mmanya ha gwụrụ, o mere ka mmiri ghọọ ọmarịcha mmanya, bụ́ ihe ọṅụṅụ “na-eme ka obi mmadụ ṅụrịa.” (Abụ Ọma 104:15; Jọn 2:1-11) N’ihi ya, ememe ahụ gara n’ihu, obi abụọ adịghịkwa ya na e mere ka nwoke na nwanyị ahụ na-alụ ọhụrụ ghara inwe mmechuihu. E gosipụtakwuru echiche ziri ezi o nwere n’oge ka ukwuu ndị a kpọtụrụ aha bụ́ ndị Jisọs ji rụsie ọrụ ike ruo ogologo oge n’ozi ya.—Jọn 4:34.

17. N’ihi gịnị ka ọ na-ejighị bụrụ ihe ijuanya na Jisọs bụ Onye Ọkà Ozizi, gịnịkwa ka ozizi ya na-egosipụta?

17 Jisọs bụ Onye Ọkà Ozizi. Ọtụtụ n’ime ihe ndị ọ kụziri gosipụtara ihe ndị na-eme eme ná ndụ a na-adị kwa ụbọchị, bụ́ ndị ọ maara nke ọma. (Matiu 13:33; Luk 15:8) Ụzọ izi ihe ya enweghị atụ—ọ na-edo anya, na-adị mfe, ma na-adị irè mgbe nile. Ihe ndị ọ kụziri dị ịrịba ama ọbụna karị. Ozizi ya gosipụtara ọchịchọ nke sitere n’ala ala obi ya ime ka ndị na-ege ya ntị mata echiche, mmetụta, na ụzọ nke Jehova.—Jọn 17:6-8.

18, 19. (a) Olee okwu ihe atụ doro anya ndị Jisọs ji kọwaa Nna ya? (b) Gịnị ka a ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

18 N’iji ihe atụ akụzi ihe mgbe mgbe, Jisọs ji okwu ihe atụ ndị doro anya a na-apụghị ichefu ngwa ngwa kpughee Nna ya. Ọ bụ otu ihe ịdị na-ekwu okwu banyere ebere Chineke. Ọ bụkwa ihe ọzọ iji Jehova tụnyere Nna nke na-ahụ n’anya bụ́ onye nwere ọmịiko n’ụzọ dị ukwuu mgbe ọ hụrụ nwa ya nwoke na-alọtanụ nke na ọ ‘gbara ọsọ, wee makụọ ya n’olu, sutukwa ya ọnụ nke ukwuu.’ (Luk 15:11-24) N’ịjụ ọdịbendị aka ike nke ndị ndú okpukpe ji na-eleda ndị nkịtị anya, Jisọs kọwara na Nna ya bụ Chineke nke a pụrụ ijekwuru ejekwuru, nke nabatara arịrịọ onye ọna ụtụ dị obi umeala karịa ekpere ngosi onwe nke onye Farisii na-etu  ọnụ. (Luk 18:9-14) Jisọs gosipụtara Jehova dị ka Chineke nke na-ahụ n’anya bụ́ onye na-ama mgbe egwele dị nnọọ nta dara n’ala. “Unu atụla egwu,” ka Jisọs mesiri ndị na-eso ụzọ ya obi ike, “ọnụ ahịa unu onwe unu karịrị nke ọtụtụ egwele.” (Matiu 10:29, 31) N’ụzọ kwere nghọta, ibobo nwụrụ ndị mmadụ n’ahụ n’ihi ‘ụzọ Jisọs si ezi ihe,’ a dọtakwara ha n’ebe ọ nọ. (Matiu 7:28, 29, NW) Leenụ, n’otu oge, ya na “oké ìgwè mmadụ” nọgidere ruo ụbọchị atọ, ọbụna n’erighị nri!—Mak 8:1, 2.

19 Anyị pụrụ inwe ekele na n’Okwu ya, Jehova ekpughewo uche nke Kraịst! Otú ọ dị, olee otú anyị pụrụ isi zụlite ma gosipụta uche nke Kraịst ná mmekọrịta anyị na ndị ọzọ? A ga-atụle nke a n’isiokwu na-esonụ.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 E gosiri na ndị ha na ihe ndị e kere eke bụ́ mmụọ na-akpakọrịta pụrụ inwe mmetụta n’ebe ha nọ ná Mkpughe 12:3, 4. E gosipụtara Setan n’ebe ahụ dị ka “dragọn” bụ́ onye ji ikike ya mee ihe iji nweta “kpakpando,” ma ọ bụ ụmụ Chineke ndị ọzọ bụ́ mmụọ, isonyere ya n’ụzọ nke nnupụisi.—Tụlee Job 38:7.

^ par. 12 Ebe ikpeazụ a kpọtụrụ Josef aha kpọmkwem bụ mgbe a hụrụ Jisọs ahụ dị afọ 12 n’ụlọ nsọ. E nweghị ebe e zoro aka na Josef nọ n’ememe agbamakwụkwọ ahụ e mere na Kena ná mmalite nke ozi Jisọs. (Jọn 2:1-3) Na 33 O.A., Jisọs ahụ a kpọgidere n’elu osisi nyefere Meri n’aka onyeozi ọ hụrụ n’anya bụ́ Jọn ilekọta ya anya. Nke ahụ bụ ihe ọ na-eyighị ka Jisọs ọ̀ ga-eme ma ọ bụrụ na Josef ka nọ ndụ.—Jọn 19:26, 27.

Ị̀ Na-echeta?

• N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ka anyị mara “uche nke Kraịst”?

• Olee onye ya na Jisọs kpakọrịtara n’oge ịdị adị ya tupu ọ ghọọ mmadụ?

• N’oge ndụ elu ala ya, ọnọdụ na mmetụta ndị dị aṅaa ka Jisọs n’onwe ya nwere?

• Gịnị ka Oziọma ndị ahụ na-ekpughe banyere àgwà Jisọs?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 10]

Jisọs tolitere n’ezinụlọ buru ibu, ma eleghị anya nọrọ n’ọnọdụ dị ala

[Foto ndị dị na peeji nke 12]

Nghọta na azịza nke Jisọs ahụ dị afọ 12 juru ndị ozizi ahụ anya