Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Onye Mkpagbu ahụ Ahụ Oké Ìhè

Onye Mkpagbu ahụ Ahụ Oké Ìhè

 Onye Mkpagbu ahụ Ahụ Oké Ìhè

SỌL nọ na-eweso ụmụazụ Jisọs iwe dị ọkụ. Ebe mkpagbu a kpagbuworo ha rịị na Jerusalem, gụnyere ntụgbu e ji nkume tụgbuo Stifen, na-ejughị ya afọ, ọ nwaziri itinye ihe ná mmegide ahụ. “Ebe ọ na-ewere ịba mba na ogbugbu kuo ume megide ndị na-eso ụzọ . . . ruo ugbu a, [Sọl] jekwuuru onyeisi nchụàjà, rịọ akwụkwọ ozi n’aka ya ịgaru Damaskọs inye ndị ụlọ nzukọ, ka ọ ga-abụ, ma a sị na ọ chọtara ndị ọ bụla dị n’Ụzọ a, ma ọ bụ ndị ikom ma ọ bụ ndị inyom, ka o wee dọkpụrụ ha n’agbụ bịa Jerusalem.”—Ọrụ 9:1, 2.

Ka Sọl ji ụkwụ na-eje Damaskọs, ọ ghaghị ịnọwo na-atụle otú ọ ga-esi rụzuo ọrụ e nyere ya ikike ịrụ n’ụzọ kasị dị irè. Obi abụọ adịghị ya na ikike onyeisi nchụàjà nyere ya ga-eme ka o nweta nkwado nke ndị ndú nke nnukwu ógbè ndị Juu dị n’obodo ahụ. Sọl ga-achọ enyemaka ha.

Mkpali Sọl nwere aghaghị ịnọwo na-arị elu ka ọ na-eru nso ebe ọ na-eje. Njem ahụ o mere site na Jerusalem gaa Damaskọs—njem ụkwụ were ụbọchị asaa ma ọ bụ asatọ nke ihe dị ka kilomita 220—abụwo nke na-agwụ ike. Na mberede, n’ihe dị ka n’etiti ehihie, ìhè nke karịrị onwunwu anyanwụ nwuru gburugburu Sọl, o wee daa n’ala. Ọ nụrụ otu olu ka ọ na-asị ya n’asụsụ Hibru: “Sọl, Sọl, gịnị mere ị na-esogbu m? ọ dị ike ka ị gbaa ndụdụ e ji achụ ehi ụkwụ.” “Ị̀ bụ Onye, Onyenwe anyị?,” ka Sọl jụrụ. “Mụ onwe m bụ Jisọs, Onye gị onwe gị na-esogbu,” bụ azịza o nwetara. “Ma bilie, guzokwa n’ụkwụ gị: n’ihi na e mere ka ị hụ m anya ka M wee mee ihe a, ịhọpụta gị ka ị bụrụ onye na-eje ozi na onye àmà nke ihe ị hụrụ m n’ime ha, na nke ihe M ga-eme ka ị hụ m anya n’ime ha; na-ewepụta gị n’aka ndị Juu, na n’aka ndị mba ọzọ, ndị Mụ onwe m na-eziga gị jekwuru ha.” “Gịnị ka m ga-eme, Onyenwe anyị?,” ka Sọl jụrụ. “Bilie, gaa baa na Damaskọs; n’ebe ahụ ka a ga-agwakwa gị okwu banyere ihe nile nke a kawooro gị ka i mee.”—Ọrụ 9:3-6; 22:6-10; 26:13-17.

 Ndị ha na Sọl so na-eme njem nụrụ olu, ma ha ahụghị onye nwe olu ahụ ma ọ bụ ghọta ihe o kwuru. N’ihi oké mgbukepụ nke ìhè ahụ, mgbe Sọl biliri ọ pụghị ịhụ ụzọ, a ghaghịkwa isekpụrụ ya n’aka. “Ọ hụghịkwa ụzọ ụbọchị atọ, ọ dịghịkwa ihe ọ na-eri ma ọ bụ nke ọ na-aṅụ.”—Ọrụ 9:7-9; 22:11.

Ụbọchị Atọ nke Ntụgharị Uche

Judas, bụ́ onye bi n’ámá a na-akpọ Ámá E Guzoziri, lere Sọl ọbịa. * (Ọrụ 9:11) Ámá a—nke a na-akpọ Darb al-Mustaqim n’Arabic—ka bụ okporo ámá bụ́ isi na Damaskọs. Cheedị banyere ihe Sọl tụgharịrị n’uche mgbe ọ nọ n’ụlọ Judas. Ahụmahụ ahụ emewo ka Sọl kpuo ìsì, o nyeghịkwa ya ọnụ okwu. Oge dị ugbu a iji tụgharịa uche n’ihe ndị ọ pụtara.

Ihe onye mkpagbu ahụ chere na ọ bụ ihe ezi uche na-adịghị na ya chere ya ihu. Onyenwe anyị Jisọs Kraịst a kpọgburu—onye ndị ọchịchị kasị elu nke ndị Juu mara ikpe, onye ‘e ledakwara anya, bụrụkwa onye mmadụ hara aka’—dị ndụ. Leenụ, o guzo ọbụna dị ka onye a nakweere n’aka nri Chineke n’ime “ìhè nke a na-apụghị ịbịaru nso”! Jisọs bụ Mesaịa ahụ. Stifen na ndị ọzọ kwuru eziokwu. (Aịsaịa 53:3; Ọrụ 7:56; 1 Timoti 6:16) Sọl mejọrọ nnọọ emejọ, n’ihi na Jisọs kọwara na ya na ndị ahụ Sọl na-akpagbu kwụ! N’ịbụ onye ihe àmà ahụ chere ihu, olee otú Sọl pụrụ isi nọgide ‘na-agba ndụdụ e ji achụ ehi ụkwụ’? Ọbụna a na-eji ndụdụ dụkata ehi isi ike ya agaa ebe onye nwe ya chọrọ. Ya mere, ịjụ ikwenye n’ihe ndị Jisọs na-agba ya ume ime, ga-abụ Sọl imerụ onwe ya ahụ.

Ebe ọ bụ Mesaịa ahụ, Jisọs apụghị ịbụwo onye Chineke mara ikpe. Ma, Jehova ekwewo ka ọ nwụọ ọnwụ ihere kasịnụ, bụrụkwa onye ihe a Iwu ahụ kwuru metụtara: “Ihe nkọcha nke Chineke ka onye a kwụwara akwụwa bụ.” (Deuterọnọmi 21:23) Jisọs nwụrụ ka a kwụwara ya n’elu osisi ịta ahụhụ. A bụrụ ya ọnụ, ọ bụghị n’ihi mmehie nke ya, ebe ọ bụ na o meghị mmehie ọ bụla, kama n’ihi mmehie nke ihe a kpọrọ mmadụ. Sọl mesịrị kọwaa, sị: “Ka ha hà, bụ́ ndị sitere n’ọrụ nke iwu, ha nọ n’okpuru ọbụbụ ọbụ: n’ihi na e dewo ya n’akwụkwọ nsọ, sị, Onye a na-abụ ọnụ ka ọ bụ, bụ́ onye ọ bụla nke na-anọgideghị n’ihe nile e deworo n’akwụkwọ iwu, ime ha. Ma ọ pụtara ìhè na ọ dịghị onye ọ bụla a na-agụ n’onye ezi omume n’iwu n’ihu Chineke . . . Kraịst gbapụtara anyị n’ọbụbụ ọnụ nke iwu ahụ, ebe Ọ ghọrọ ọbụbụ ọnụ n’ọnọdụ anyị: n’ihi na e dewo ya n’akwụkwọ nsọ, sị, Onye a na-abụ ọnụ ka ọ bụ, bụ́ onye ọ bụla nke a na-akwụwa n’elu osisi.”—Ndị Galetia 3:10-13.

Àjà Jisọs bara uru maka mgbapụta. Site n’ịnakwere àjà ahụ, Jehova kpọgidere Iwu ahụ na ọnụ a bụrụ ya n’elu osisi n’ụzọ ihe atụ. Mgbe ọ ghọtara eziokwu ahụ, Sọl pụrụ iwere osisi ịta ahụhụ ahụ nke “bụụrụ ndị Juu ọnyà” dị ka “amamihe nke Chineke.” (1 Ndị Kọrint 1:18-25; Ndị Kọlọsi 2:14) Ya mere, ọ bụrụ na ọ bụghị site n’ọrụ nke iwu ka a ga-esi enweta nzọpụta kama site n’ebere na-erughịrị mmadụ nke Chineke na-emere ndị mmehie dị ka Sọl n’onwe ya, ndị na-anọghị n’okpuru Iwu ahụ nwekwara ike inweta ya. Ọ bụkwa n’ebe ndị Jentaịl nọ ka Jisọs na-eziga Sọl.—Ndị Efesọs 3:3-7.

Anyị apụghị ikwu kpọmkwem ókè Sọl ghọtaruru ihe a n’oge a tọghatara ya. Jisọs ka ga-agwa ya okwu ọzọ, ikekwe ihe karịrị otu ugbo, banyere ọrụ ọ gaje ịrụ ná mba ọzọ. Ọzọkwa, ọtụtụ afọ gafere tupu Sọl edetuo ihe a nile site n’ike mmụọ nsọ Chineke. (Ọrụ 22:17-21; Ndị Galetia 1:15-18; 2:1, 2) Otú ọ dị, nanị ụbọchị ole na ole gafere tupu Sọl anatakwuo ntụziaka site n’aka Onyenwe ọhụrụ ya.

 Nleta Ananaịas Letara Ya

Mgbe o mesịrị ka Sọl hụ ya anya, Jisọs mekwara ka Ananaịas hụ ya anya, na-agwa ya, sị: “Garuo ámá nke a na-akpọ Ámá E Guzoziri, chọọkwa n’ụlọ Judas otu onye aha ya bụ Sọl, onye Tasọs: n’ihi na lee, ọ na-ekpe ekpere; ọ hụkwara otu nwoke, aha ya bụ Ananaịas, ka ọ na-abata, na-ebikwasịkwa ya aka ya abụọ n’isi, ka e wee mee ka ọ hụ ụzọ.”—Ọrụ 9:11, 12.

Ebe ọ bụ na Ananaịas maara banyere Sọl, a pụrụ ịghọta ihe mere okwu Jisọs ji ju ya anya. O kwuru, sị: “Onyenwe anyị, anụrụ m n’ọnụ ọtụtụ mmadụ ihe banyere nwoke a, ka ha hà, bụ́ ajọ ihe o mere ndị nsọ Gị na Jerusalem: n’ebe a ka o nwekwara ike site n’ebe ndị isi nchụàjà nọ ike ndị nile na-akpọku aha Gị agbụ.” Otú ọ dị, Jisọs gwara Ananaịas, sị: “Gaa: n’ihi na onye ahụ bụ ihe ọrụ a họpụtara nye m, ka o buru aha m chee n’ihu mba ọzọ na ndị eze, na ụmụ Israel.”—Ọrụ 9:13-15.

N’ịbụ onye e mesighachiri obi ike, Ananaịas gara ebe Jisọs gwara ya. Mgbe ọ chọtara ma kelee Sọl, Ananaịas bikwasịrị ya aka ya abụọ n’isi. “Ngwa ngwa,” ka ihe ndekọ ahụ na-ekwu, “ihe dị ka akpịrịkpa wee si n’anya [Sọl] dapụ, e mekwara ka ọ hụ ụzọ.” Sọl dịzi njikere ige ntị. Okwu Ananaịas kwadoro ihe Sọl ghọtaworo ma eleghị anya site n’okwu Jisọs: “Chineke nke nna anyị hà họpụtara gị ịmara ihe Ọ na-achọ, na ịhụ Onye Ezi Omume ahụ, na ịnụ olu si n’ọnụ Ya pụta. N’ihi na ị ga-abụrụ Ya onye àmà n’ebe mmadụ nile nọ nke ihe nile ị hụworo nụkwa. Ugbu a kwa gịnị mere ị na-ala azụ? bilie, ka e mee gị baptism, sachapụkwa mmehie gị nile, na-akpọku aha Ya.” Gịnị si na ya pụta? Sọl “wee bilie, e mee ya baptism; o wee nara nri, e wee mee ka o nwee ume.”—Ọrụ 9:17-19; 22:12-16.

Mgbe ọ rụsịrị ọrụ ya, Ananaịas kwesịrị ntụkwasị obi miri ala ngwa ngwa n’ihe ndekọ ahụ dị ka o si bata na ya, a gwaghịkwa anyị ihe ọ bụla ọzọ banyere ya. Ma, ibobo nwụrụ ndị nile nụrụ ihe Sọl kwuru n’ahụ! Onye ahụ bụbu onye mkpagbu, bụ́ onye bịara Damaskọs ijide ndị na-eso ụzọ Jisọs, malitere ime nkwusa n’ụlọ nzukọ dị iche iche na igosipụta na Jisọs bụ Kraịst.—Ọrụ 9:20-22.

“Onyeozi nke Ndị Mba Ọzọ”

Ahụmahụ Sọl nwere n’ụzọ Damaskọs kwụsịrị ya ịga n’ihu dị ka onye mkpagbu. N’ịbụ onye matarala Mesaịa ahụ, Sọl pụrụ iji ọtụtụ echiche na amụma nke Akwụkwọ Nsọ Hibru mee ihe n’ebe Jisọs nọ. Ịmara na Jisọs emewo ka ọ hụ ya anya, ‘jide ya,’ ma nye ya ọrụ dị ka “onyeozi nke ndị mba ọzọ,” gbanwere ndụ Sọl n’ụzọ dị ukwuu. (Ndị Filipaị 3:12; Ndị Rom 11:13) Ugbu a ọ bụ Pọl onyeozi, o nwere ihe ùgwù na ikike nke gaje imetụta ọ bụghị nanị oge ndụ ya fọdụrụnụ n’ụwa kamakwa akụkọ ihe mere eme nile nke ndị Kraịst.

Ọtụtụ afọ mgbe e mesịrị, mgbe a rụrịtara ụka banyere iru eru Pọl dị ka onyeozi, ọ gbachiteere ikike ya site n’izo aka n’ahụmahụ ahụ o nwere n’ụzọ Damaskọs. “Ábụghị m onyeozi? áhụghị m Jisọs Onyenwe anyị?” ka ọ jụrụ. Mgbe o kwusịkwara banyere ọhụhụ Jisọs ahụ e si n’ọnwụ kpọlite mere ka ndị ọzọ hụ ya anya, Sọl (Pọl) kwuru, sị: “N’ikpeazụ ha nile, dị ka nwa a mụkworo amụkwo, O mere ka mụ onwe m hụkwa Ya anya.” (1 Ndị Kọrint 9:1; 15:8) Site n’ọhụhụ Sọl hụrụ ebube eluigwe Jisọs, ọ dị nnọọ ka a ga-asị na e nyela ya ihe ùgwù nke ịbụ onye a mụrụ, ma ọ bụ onye a kpọlitere n’ọnwụ, gaa ná ndụ nke mmụọ tupu oge eruo.

Sọl ghọtara ihe ùgwù o nwere ma dọgbuo onwe ya n’ọrụ ibi ndụ kwekọrọ na ya. “Mụ onwe m dịkarịsịrị nta n’etiti ndị ozi, ebe m na-erughị ka a kpọọ m onyeozi, n’ihi na esogburu m nzukọ Chineke,” ka o dere. “Ma . . . amara [Chineke] nke e nyere m abụghị ihe efu; kama adọgbubigara m onwe m ókè n’ọrụ karịa [ndị ozi ndị ọzọ nile].”—1 Ndị Kọrint 15:9, 10.

Ikekwe dị ka Sọl, ị na-echeta mgbe ị ghọtara na ka i wee nweta ihu ọma Chineke, ọ dị gị mkpa ime mgbanwe n’echiche okpukpe ndị i nweworo eri oge. Obi abụọ adịghị ya na i nwere nnọọ ekele na Jehova nyeere gị aka ịmata eziokwu ahụ. Mgbe Sọl hụrụ ìhè ahụ ma mata ihe a chọrọ n’aka ya, ọ laghị azụ ime ya. Ọ nọgidekwara na-eji ịnụ ọkụ n’obi na mkpebi siri ike na-eme ya ná ndụ ya nile fọdụrụnụ n’ụwa. Lee ihe nlereanya magburu onwe ya nke a bụụrụ ndị nile chọrọ inweta ihu ọma Jehova taa!

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 7 Otu ọkà mmụta na-eche na Judas pụrụ ịbụwo otu n’ime ndị ndú nke ógbè ndị Juu dị n’obodo ahụ ma ọ bụ onye nwe otu ụlọ ndị njem a na-anabata ndị Juu.

[Foto dị na peeji nke 27]

Okporo ámá ahụ a na-akpọ Ámá E Guzoziri nke dị na Damaskọs nke oge a

[Ebe E Si Nweta Foto]

Foto nke ROLOC Color Slides sere