Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Họrọ asụsụ Igbo

Gịnị Mere E Ji Nwee Baịbụl Dị Iche Iche?

Gịnị Mere E Ji Nwee Baịbụl Dị Iche Iche?

Gịnị mere e ji nwee Baịbụl dị iche iche taa? Ì chere na Baịbụl ndị ọhụrụ a na-asụgharị na-enyere ndị mmadụ aka ịghọtakwu Baịbụl ka ọ̀ na-eme ka o siere ha ike? Ọ bụrụ na anyị amata ndị sụgharịrị ha na ihe mere ha ji sụgharịa ha, ọ ga-enyere anyị aka ịmata nke dị mma anyị ga-agụ.

Ma, oleedị onye dere Baịbụl? Oleekwa mgbe e dere ya?

BAỊBỤL MBỤ

Baịbụl nwere agba abụọ. Agba nke mbụ nwere akwụkwọ iri atọ na itoolu. Ihe e dere na ha bụ “okwu dị nsọ nke Chineke.” (Ndị Rom 3:2) Ọ bụ ụmụ nwoke ndị Chineke nyere mmụọ nsọ ya, dere ihe ndị dị na ya. O were ha ogologo oge, ihe dị ka otu puku na otu narị afọ, ya bu, malite n’afọ 1513 Tupu Oge Ndị Kraịst, ruo obere oge mgbe afọ 443 Tupu Oge Ndị Kraịst gachara. Ọ bụ asụsụ Hibru ka ha kacha jiri dee ya. N’ihi ya, anyị na-akpọ agba ahụ Akwụkwọ Nsọ Hibru. Ihe ọzọ e ji mara ya bụ Agba Ochie.

Agba nke abụọ nwere akwụkwọ iri abụọ na asaa. Ihe e dere na ha bụkwa “okwu Chineke.” (1 Ndị Tesalonaịka 2:13) Chineke nyere ndị na-eso ụzọ Jizọs Kraịst mmụọ nsọ ya, ha dee akwụkwọ ndị ahụ. Oge o were ha ebughị ibu ma e jiri ya tụnyere oge e ji dee agba nke mbụ. O were ha ihe dị ka afọ iri isii, malite n’ihe dị ka n’afọ 41 Oge Ndị Kraịst ruo n’afọ 98 Oge Ndị Kraịst. Ọ bụ asụsụ Grik ka ha kacha jiri dee ha. N’ihi ya, anyị na-akpọ agba nke a Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst. Ihe ọzọ e ji mara ya bụ Agba Ọhụrụ.

A chịkọta akwụkwọ niile a dị na Baịbụl, ha dị iri isii na isii. E dere okwu Chineke na-agwa ụmụ mmadụ n’ime ha. Ma, gịnị mere e ji na-enwe Baịbụl dị iche iche taa? Ka anyị lee ihe atọ gbara ọkpụrụkpụ mere ya.

  • Ka ndị mmadụ nwee ike ịgụ Baịbụl n’asụsụ ha.

  • Ka e nwee ike iwepụ ihe ụfọdụ ndị depụtaghachiri Baịbụl dehiere, ka Baịbụl nwee ike ịdịkwa otú ọ dị na mbụ.

  •   Ka ọ dị otú ndị mmadụ si ekwu okwu n’oge a na-asụgharị ya.

Ka anyị lee otú ndị sụgharịrị Baịbụl abụọ so na Baịbụl ndị mbụ a sụgharịrị si mee ihe atọ a.

SEPTUAGINT GRIK

N’ihe dị ka narị afọ atọ tupu Jizọs abịa n’ụwa, ndị ọkà mmụta ndị Juu malitere ịsụgharị Akwụkwọ Nsọ Hibru gaa n’asụsụ Grik. Ọ bụ ya ka e mechara kpọwa Septuagint Grik. Gịnị mere ha ji wepụta Baịbụl a? N’oge ahụ, ọtụtụ ndị Juu anaghịzi asụ Hibru, ha na-asụzi Grik. Ọ bụ ya mere ha ji sụgharịa ya iji nyere ha aka ịna-agụ “ihe odide ndị ahụ dị nsọ.”—2 Timoti 3:15.

Septuagint ahụ nyekwaara ọtụtụ nde ndị na-abụghị ndị Juu na-asụ Grik aka ịghọta Baịbụl. Olee otú o si mee? Otu prọfesọ aha ya bụ W. F. Howard kwuru ihe merenụ. Ọ sịrị: “N’ihe dị ka n’afọ 50 Oge Ndị Kraịst, Septuagint ghọrọ Baịbụl Chọọchị Ndị Kraịst na-agụzi. Ndịozi na-eji ya aga ozi ọma si n’otu ụlọ nzukọ gaa n’ọzọ, ‘na-egosi ndị mmadụ na Jizọs bụ Mesaya ahụ.’” (Ọrụ Ndịozi 17:3, 4; 20:20) Otu ọkà mmụta Baịbụl aha ya bụ F. F. Bruce kwuru na ọ bụ otu n’ime ihe mere ọtụtụ ndị Juu ji mechaa kwụsị “inwe mmasị na Septuagint.”

Ma, ka ndị na-eso ụzọ Jizọs na-enwetakwu Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, ha wekọtara ya na nsụgharị Septuagint nke Akwụkwọ Nsọ Hibru, ya aghọọ Baịbụl zuru ezu e nwere taa.

BAỊBỤL LATIN VULGATE

Mgbe e dechara Baịbụl, ihe dị ka narị afọ atọ agaa, otu onye ọkà mmụta okpukpe aha ya bu Jerom sụgharịrị Baịbụl n’asụsụ Latin. Ọ bụ ya ka e mechara kpọwa Latin Vulgate. Ma tupu mgbe ahụ, e nwere Baịbụl dị iche iche n’asụsụ Latin. Gịnịzi mere e ji sụgharịwa nke ọhụrụ? Otu akwụkwọ aha ya bụ The International Standard Bible Encyclopedia, kwuru na Jerom chọrọ imezi “ihe ụfọdụ a na-asụgharịtaghị na ndehie ihe ụfọdụ, nakwa iwepụ ihe ndị e tinyere na-ekwesịghị ịdị na Baịbụl na iweghachi ndị e wepụrụ kwesịrị ịdị na ya.”

Jerom meziri ọtụtụ n’ime ihe ndị a. Ma mgbe obere oge gara, ndị isi chọọchị kpara otu nnukwu arụ. Ha kwuru na ọ bụ naanị Baịbụl Latin Vulgate ka ndị mmadụ ga na-agụzi. Ha ekweghị ndị mmadụ gụọ Baịbụl ndị ọzọ ruo ọtụtụ narị afọ. Baịbụl Latin Vulgate mere ka ndị nkịtị ghara ịghọta Baịbụl n’ihi na ọtụtụ n’ime ha amaghị asụsụ Latin chaa chaa.

 BAỊBỤL NDỊ ỌHỤRỤ NA-APỤTAKWU

Ka oge na-aga, ndị mmadụ nọ na-ewepụtakwu Baịbụl dị iche iche. Otu n’ime ha bụ Baịbụl a sụgharịrị n’asụsụ Siriak, nke a na-akpọ Peshitta Siriak. E wepụtara ya n’ihe dị ka otu puku afọ na narị afọ isii gara aga. Ma, ọ bụ n’ihe dị ka narị afọ asaa gara aga ka ndị mmadụ gbakwuru mbọ ka a sụgharịa Akwụkwọ Nsọ n’asụsụ dị iche iche ka ọtụtụ ndị nkịtị nwee ike inweta ya n’asụsụ ha.

Ọ bụ n’oge ahụ, n’Ịngland, ka otu nwoke aha ya bụ Jọn Wiklif bidoro ịsụgharị Baịbụl n’asụsụ Bekee, bụ́ asụsụ ndị obodo ya na-aghọta. Mgbe obere oge gara, ígwè e ji ebi akwụkwọ otu nwoke aha ya bụ Johannes Gutenberg mepụtara, mere ka ọ dịkwuoro ndị na-asụgharị Baịbụl mfe ịna-ebipụta ma na-ekesa Baịbụl ndị ọhụrụ n’asụsụ dị iche iche ndị mmadụ na-asụ na Yurop.

Mgbe a bịara nwee Baịbụl dị iche iche n’asụsụ Bekee, ụfọdụ ndị na-agba Baịbụl ụkwụ jụwara ihe mere a ga-eji na-enwe Baịbụl dị iche iche n’otu asụsụ. Otu onye ụkọchukwu Bekee, dịrị ndụ n’ihe karịrị nari afọ abụọ gara aga, aha ya bụ John Lewis, kwuru, sị: “E nwere oge asụsụ na-eru, ya emee ochie, ndị mmadụ agaghịzi na-aghọta ya. Ọ bụ ya mere o ji dị mkpa ka a na-asụgharị Baịbụl dị iche iche ka ọ daba n’otú e si ekwu okwu n’oge a na-asụgharị ya, ka ndị dịrị ndụ n’oge ahụ ghọta ya.”

Taa, ọ bụ ndị ọkà mmụta Baịbụl kacha kwesị ileba anya ná nsụgharị Baịbụl ndị merela ochie iji mara ma è nwere ihe ndị e kwesịrị imezi na ya. Ọ bụ n’ihi na ha ma asụsụ ndị ochie ahụ e ji dee Baịbụl nke ọma, nweekwa akwụkwọ mpịakọta ndị e ji dee Baịbụl n’oge ochie, ndị a chọtarala n’oge anyị. Ihe ndị a na-enyere ha aka ịmata ma ihe dị na Baịbụl ndị a merela ochie ọ̀ bụ ihe ndị dị na Baịbụl mbụ.

Ọ bụ ihe a mere o ji aba uru mmadụ inwe Baịbụl e ji asụsụ ndị mmadụ na-asụ n’oge a sụgharịa. Ma, anyị kwesịkwara ịkpachara anya gbasara Baịbụl ụfọdụ. * Ọ bụrụ na ihe mere ndị meziri ihe na Baịbụl ochie ma bipụta nke ọhụrụ ji mee ya bụ n’ihi na ha hụrụ Chineke n’anya n’eziokwu, ihe ha mere ga-abara anyị uru.

 

^ para. 24 Gụọ isiokwu bụ́ “Olee Otú Ị Ga-esi Mata Baịbụl A Sụgharịrị Nke Ọma?” Ọ gbara n’Ụlọ Nche May 1, 2008.