Mgbe Onye Ezinụlọ Gị Na-arịa Ọrịa Ga-egbu Ya
E NWERE otu nwaanyị aha ya bụ Doreen. Aha di ya bụ Wesley. Wesley dị afọ iri ise na anọ. O juru Doreen anya mgbe ndị dọkịta kwuru na nnukwu akpụ toro di ya n’ụbụrụ. * Ha kwuru na ọ fọrọ ọnwa ole na ole ka ọ nwụọ. Doreen kwuru, sị: “O siiri m ike ikweta ihe a ha kwuru. O nyeghị m ọnụ okwu ruo ọtụtụ izu. Ọ dị m ka ọ̀ bụ onye ọzọ ka ihe a na-eme. Amaghị m na ụdị ihe a ga-eme anyị.”
E nweela ọtụtụ ndị ọ dị otú a ọ dị Doreen mgbe ụdị ihe a mere ha. Mmadụ nwere ike ịmalite ịrịa ọrịa ga-egbu ya mgbe ọ na-atụghị anya ya. Ụdị ihe a mee, ọtụtụ ndị na-ewepụta onwe ha elekọta ndị nke ha a chọpụtara na ha na-arịa ọrịa ga-egbu ha. Ma, ilekọta onye na-arịa ụdị ọrịa a abụghị obere ọrụ. Olee ihe ndị ezinụlọ nke onye na-arịa ụdị ọrịa a nwere ike ime iji kasie ya obi ma lekọta ya nke ọma? Olee ihe onye na-elekọta ya ga-eme ka ihe ndị nwere ike ịna-enye ya nsogbu n’obi n’oge ahụ ọ na-elekọta onye ahụ ghara ịna-akpa ya aka ọjọọ? Ka oge onye ọrịa ahụ ga-anwụ na-eru nso, olee ihe ndị e nwere ike ịtụ anya ga-eme ya? Tupu anyị azaa ajụjụ ndị a, ka anyị bugodị ụzọ leba anya n’ihe mere na ilekọta onye na-arịa ọrịa ga-egbu ya abụghị obere ọrụ taa.
IHE MERE NA Ọ BỤGHỊ OBERE ỌRỤ TAA
Ndị dọkịta emeela ka ndị mmadụ ghara ịna-anwụ ngwa ngwa otú ha sibu anwụ ma ha rịawa ọrịa. Ihe dị ka otu narị afọ gara aga, ndị mmadụ na-anwụchu ọnwụ ma n’obodo ndị mepere emepe ma ndị nke na-emepeghị emepe. Ndị mmadụ na-anwụ ngwa ngwa n’ihi ọrịa na-efe efe ma ọ bụ ihe mberede. N’oge ahụ, e nwechaghị ụlọ ọgwụ, a na-anọ n’ụlọ elekọta ndị ọrịa, ha na-anọkwa n’ụlọ anwụ.
Ọtụtụ ọgwụ ndị e nwere taa na ụzọ dị iche iche e si agwọ ọrịa na-enyere ndị dọkịta aka ime ka ọrịa ụfọdụ ghara igbu mmadụ ngwa ngwa. Ọrịa ndị
nwere ike igbu mmadụ ozugbo n’oge ochie anaghịzi egbu mmadụ otú ahụ taa. Ma, na e mere ka ọrịa ghara igbu mmadụ ngwa ngwa apụtaghị na ọ na-eme ka onye ahụ gbakee. Ọrịa nwere ike ịkpa mmadụ aka ọjọọ nke na ọ gaghị elekọtali onwe ya. Ilekọta ụdị onye a abụghị obere ọrụ.Ma, ọtụtụ ndị na-anọzi n’ụlọ ọgwụ anwụ karịa mgbe mbụ. Ọtụtụ ndị taa amaghị ihe ndị na-eme mmadụ ma ọ chọwa ịnwụ. Ọ bụ mmadụ ole na ole hụtụrụla mmadụ ka ọ na-anwụ. Ịtụ ụjọ ihe ndị nwere ike ime, nwere ike ime ka mmadụ ghara ịmazi ihe ọ ga-eme ka o nyere onye ezinụlọ ya na-arịa ọrịa aka. Olee ihe nwere ike inyere ya aka?
BIDONỤ N’OGE KWURỊTA IHE UNU GA-EME
Ihe ahụ mere Doreen gosiri na obi na-agbawa ọtụtụ ndị ma a gwa ha na onye nke ha na-arịa ọrịa ga-egbu ya. N’agbanyeghị otú ọ bụla obi dị gị, olee ihe ga-enyere gị aka ịma ihe ị ga-eme? Otu nwoke fere Jehova n’oge ochie rịọrọ ya, sị: “Kụziere anyị otú anyị ga-esi na-agụ ụbọchị anyị ka anyị wee nweta obi amamihe.” (Abụ Ọma 90:12) Rịọsie Jehova Chineke arịrịọ ike ka ọ kụziere gị otú ‘ị ga-esi na-agụ ụbọchị gị’ ka gị na onye nke gị ahụ na-arịa ọrịa nwee ike ibi nke ọma tupu ya anwụọ.
Ihe a ga-achọ ka unu hazie ihe nke ọma. Ọ bụrụ na onye nke gị ahụ ka na-ekwu okwu, dịkwa njikere ikwu ihe a ga-eme, ọ ga-adị mma ka unu jụọ ya onye ọ chọrọ ka o kwuchite ọnụ ya mgbe ọ na-agaghị ekwuli okwu. E kwesịrị iso ya kwurịta ma ọ̀ ga-achọ ka ọ nọrọ n’ụlọ ọgwụ ma ọ bụ ka a kwụnye ya ọksijin ma ọ bụkwanụ si n’ụzọ ndị ọzọ mee ka ọ nọtụkwuo ndụ. Ibu ụzọ kwurịta ihe ndị a ga-eme ka unu ghara ise okwu mgbe unu ga-ekpebi otú a ga-esi agwọ ya mgbe ọ na-enweghịzi ike ikwu okwu. Ọ ga-emekwa ka obi ghara ịma unu ikpe ma unu kpebichaa ihe unu ga-eme. Ọ bụrụ na unu ebido n’oge kwurịta ihe unu ga-eme, ọ ga-eme ka unu lekwasị anya n’ilekọta onye ahụ na-arịa ọrịa. Baịbụl kwuru, sị: “Atụmatụ na-aghasasị ma ọ bụrụ na a gbaghị izu.”—Ilu 15:22.
OTÚ E NWERE IKE ISI NYERE ONYE AHỤ AKA
Ọrụ kacha mkpa onye na-elekọta onye ọrịa kwesịrị ịrụ bụ ịkasi ya obi. E kwesịrị ime ka onye nọ n’ọnụ ọnwụ mata na a hụrụ ya n’anya nakwa na a gaghị ahapụ ya. Olee otú e nwere ike isi eme ya? Na-abụrụ ya abụ ma ọ bụkwanụ na-agụrụ ya akwụkwọ ndị ga-atọ ya ụtọ, nakwa ndị ga-eme ka obi sie ya ike. Ahụ́ na-eru onye na-arịa ọrịa ala ma onye ezinụlọ ya jide ya aka ma meda obi na-agwa ya okwu.
Ọ bụrụ na ndị mmadụ abịa ileta ya, e kwesịrị ime ka ọ mata ndị ahụ bịaranụ. Otu akwụkwọ kwuru, sị: “A bịa n’ihe gbasara ịnụ ihe, ibitụ ihe aka, ịnụ ìsì, imetụ ihe aka na ịnụ ụtọ ihe, nke ikpeazụ mmadụ na-akwụsị ime tupu ya anwụọ bụ ịnụ ihe. Onye ahụ nwere ike ịna-anụ ihe n’agbanyeghị na o nwere ike ịdị ka ọ̀ nọ n’ụra. N’ihi ya, anọla ebe ahụ ekwu ihe ọ bụla ị ma na ị gaghị ekwuli mgbe ọ mụ anya.”
O kwe mee, kpeere ya ekpere. Baịbụl kwuru na e nwere mgbe Pọl onyeozi na ndị ya na ya so nọ n’ezigbo nsogbu nke na ha amaghị ma hà ga-adị ndụ. Olee otú ha si chọọ ka ndị ọzọ nyere ha aka? Pọl gwara ụmụnna ya, sị: “Unu pụkwara inye aka site n’ịrịọsi arịrịọ ike n’ihi anyị.” (2 Ndị Kọrịnt 1:8-11) Ekpere anyị ji obi anyị niile kpeere onye nọ ná ezigbo nsogbu ma ọ bụ onye na-arịa ọrịa, na-abara ya ezigbo uru.
NA-ATỤNỤ ANYA IHE NWERE IKE IME
E nweghị onye obi na-adị ụtọ na onye nke ya na-aga ịnwụ. Ihe a gosiri na e keghị anyị ka anyị na-anwụ anwụ. Chineke ekeghị anyị ka anyị lewa ọnwụ anya ka ihe kwesịrị ekwesị. (Ndị Rom 5:12) Ọ bụ ya mere Baịbụl ji kpọọ ọnwụ “onye iro.” (1 Ndị Kọrịnt 15:26) N’ihi ya, ọ bụghị ihe ọjọọ ma ọ bụrụ na ọ na-esiri mmadụ ike ikweta na onye ezinụlọ ya na-arịa ọrịa ga-anwụ.
Ma, ọ bụrụ na ndị ezinụlọ onye ahụ ana-atụ anya ihe nwere ike ime, ọ ga-eme ka obi sie ha ike, meekwa ka ha na-akasi onwe ha obi. E dere ụfọdụ ihe nwere ike ime mmadụ tupu ya anwụọ n’igbe isiokwu ya bụ, “ Ihe Ndị Nwere Ike Ime Onye Ọrịa n’Izu Ole na Ole Tupu Ya Anwụọ.” Ma, ọ bụghị onye ọ bụla ka ihe niile e kwuru ebe ahụ na-eme, ọ bụghịkwa iwu na ha niile ga-eme otú ahụ e si depụta ha. Ma, ụfọdụ n’ime ha na-eme ọtụtụ ndị ọrịa tupu ha anwụọ.
Ọ bụrụ na onye ezinụlọ anyị ahụ anwụọ, anyị nwere ike ịgwa enyi anyị chọrọ inyere anyị aka ka ọ bịa nye aka. E kwesịrị ime ka ndị ezinụlọ onye ahụ nwụrụnụ ma ọ bụ ndị lekọtara ya mata na nsogbu ya ebiela, nakwa na o nweghị ebe ọ nọ na-ata ahụhụ. Onye kere anyị gwara anyị na “ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla ma ọlị.”—Ekliziastis 9:5.
ONYE KACHA ELEKỌTA ANYỊ
Anyị ekwesịghị igbochi onye ọ bụla inyere anyị aka
Anyị kwesịrị ịtụkwasị Chineke obi ma mgbe onye ezinụlọ anyị nọ n’ọrịa ma mgbe anyị na-eru uju ọnwụ ya. Chineke nwere ike ime ka ndị ọzọ nyere anyị aka ma ọ bụ gwa anyị okwu ga-akasi anyị obi. Doreen ahụ e kwuru banyere ya ná mmalite isiokwu a kwuru, sị: “Amụtara m na ekwesịghị m igbochi onye ọ bụla inyere m aka. Otú ọtụtụ ndị si gbatara mụ na di m ọsọ enyemaka juru anyị anya. O doro anyị anya na ọ bụ Jehova mere ka ndị mmadụ bịa nyere anyị aka. Anyị nwere ike ikwu na ọ bụ otú a ka Jehova ji agwa anyị, sị ‘Anọ m ya, inyere unu aka.’ Agaghị m echefu ihe a echefu.”
N’eziokwu, ọ bụ Jehova Chineke kacha elekọta anyị. Ọ bụ ya kere anyị, ọ makwa nsogbu ndị anyị na ha na-alụ na otú ha si ewute anyị. Ọ chọsiri ike inyere anyị aka ka anyị nwee ike idi ha. Ọ ga-emelikwa ya. O kwekwara anyị nkwa na n’oge na-adịghị anya, na ya ga-akpọlite ọtụtụ ijeri ndị nwụrụ anwụ. (Jọn 5:28, 29; Mkpughe 21:3, 4) Mgbe ọ ga-eme ya, anyị niile ga-ekwu ihe a Pọl onyeozi kwuru. Ọ sịrị: “Ọnwụ, olee mmeri gị? Ọnwụ, olee ebe ihe i ji agba mmadụ dị?”—1 Ndị Kọrịnt 15:55.
^ para. 2 Aha a kpọrọ ha n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.