Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mgbe Alaeze Chineke ga-achịwa, ndị mmadụ ‘ga-enwe obi ụtọ dị ukwuu n’ihi udo nke zuru ebe niile.’​—⁠Abụ Ọma 37:11

Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

Baịbụl ò nwere ike inyere gị aka ịghara ịna-echegbukarị onwe gị?

Gịnị ka ị ga-aza?

  • Ee

  • Mba

  • O nwere ike

Ihe Baịbụl kwuru

“Na-atụkwasịnụ [Chineke] nchegbu unu niile, n’ihi na ihe banyere unu na-emetụ ya n’obi.” (1 Pita 5:⁠7) Baịbụl ga-eme ka obi sie gị ike na Chineke ga-emeli ka ị ghara ịna-echegbukarị onwe gị.

Olee ihe ọzọ anyị ga-amụta na Baịbụl?

  • Ekpere ga-enyere gị aka inweta “udo nke Chineke.” Udo nke Chineke a ga-eme ka ị ghara ịna-echegbukarị onwe gị.​—⁠Ndị Filipaị 4:​6, 7.

  • Ihe ọzọ bụ na ịgụ Baịbụl ga-eme ka ị ghara ịna-echegbucha onwe gị.​—⁠Matiu 11:​28-30.

Ò nwere mgbe mmadụ na-agaghịzi na-echegbu onwe ya?

Ụfọdụ ndị na-ekwu . . . na onye ọ bụla dị ndụ ga na-echegbu onwe ya, ebe ndị ọzọ na-ekwu na ọ bụ naanị mgbe mmadụ nwụrụ ka ọ ga-akwụsị ichegbu onwe ya. Gịnị ka i chere?

Ihe Baịbụl kwuru

Chineke ga-ewepụ ihe ọ bụla na-eme ka mmadụ na-echegbu onwe ya. “Ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru uju ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ.”​—⁠Mkpughe 21:⁠4.

Olee ihe ọzọ anyị ga-amụta na Baịbụl?

  • Mgbe Alaeze Chineke ga-achịwa, ndị mmadụ ga-ebi n’udo, obi eruokwa ha ala.​—⁠Aịzaya 32:⁠18.

  • Ndị mmadụ agaghịzi na-echeta ihe ọ bụla na-eme ka ha na-echegbu onwe ha.​—⁠Aịzaya 65:⁠17.