Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Họrọ asụsụ Igbo

E Kere Anyị Ịdị Ndụ Ruo Mgbe Ebighị Ebi

E Kere Anyị Ịdị Ndụ Ruo Mgbe Ebighị Ebi

È NWERE onye n’ime anyị na-agaghị achọ ịdị ogologo ndụ ma na-enwe obi ụtọ? Chegodị otú ọ ga-adị ma a sị na anyị nwere ike ịdị ndụ ebighị ebi, ahụ́ esie anyị ike, anyị ana-enwekwa obi ụtọ. Anyị na ndị enyi na ndị ikwu anyị nwere ike ịna-eji oge buru ibu anọrị, anyị ana-aga ebe dị iche iche n’ụwa, mụta nkà dị iche iche, nwekwuo amamihe, nwee ike ịmụtakwu otú e si eme ọtụtụ ihe na-amasị anyị.

Gịnị mere ndị mmadụ jị achọ ịdị ndụ ebighị ebi? Baịbụl gwara anyị na Chineke tinyere ọchịchọ a n’ime anyị. (Ekliziastis 3:11) Baịbụl kwukwara na “Chineke bụ ịhụnanya.” (1 Jọn 4:8) Chineke hụrụ anyị n’anya, n’ihi ya, ọ gaghị eme ka anyị nwee ọchịchọ ịdị ndụ ebighị ebi ma ọ bụrụ na anyị agaghị adịli ndụ ebighị ebi.

O nweghị onye chọrọ ịnwụ. Baịbụl kwudịrị na ọnwụ bụ “onye iro” anyị. (1 Ndị Kọrịnt 15:26) O nwere ndị ọ na-egbu n’oge, nweekwa ndị ọ na-ahapụ ruo ogologo oge. Ma, e nweghị onye ga-agbata ya n’ọsọ. Ọtụtụ ndị cheta na otu ụbọchị na ha ga-anwụ, obi amapụ ha, ụjọ ejidekwa ha. Ọnwụ ọ̀ ga-emechanụ kwụsị? Ọ̀ ga-ekweli omume?

IHE MERE ANYỊ JI NWEE OLILEANYA NA NDỊ MMADỤ GA-EMECHA DỊRỊ NDỤ EBIGHỊ EBI

Ọ̀ ga-eju gị anya ma ị nụ na Chineke ebughị n’obi ka ndị mmadụ na-anwụ anwụ? Akwụkwọ Jenesis kwuru ihe gosiri na Chineke chọrọ ka ụmụ mmadụ dịrị ndụ ebighị ebi n’ụwa. Mgbe Jehova Chineke kere ụwa, o tinyere ihe niile dị ụmụ mmadụ mkpa na ihe niile ga-eme ka ha na-enwe obi ụtọ na ya. Mgbe o mechara, o kere nwoke mbụ bụ́ Adam ma tinye ya na paradaịs, bụ́ ogige dị n’Iden. Mgbe o kechara ihe ndị a, “Chineke hụrụ ihe niile o mere, ma, lee! ha dị nnọọ mma.”—Jenesis 1:26, 31.

Mgbe Chineke kere Adam, o zuru okè. O kekwara ya n’oyiyi ya. (Diuterọnọmi 32:4) Iv, bụ́ nwunye  Adam, zukwara okè. O nweghị ntụpọ ọ bụla ma n’ahụ́ ma n’uche ya. Jehova gwara ha, sị: “Mụọnụ ọmụmụ, baanụ ụba ma jupụta ụwa, meekwanụ ka ọ dịrị n’okpuru unu, ka azụ̀ ndị dị n’oké osimiri na anụ ufe nke eluigwe na ihe ọ bụla e kere eke dị ndụ nke na-agagharị n’elu ala nọrọkwa n’okpuru unu.”—Jenesis 1:28.

Ọ ga-ewe Adam na Iv oge iji mụọ ụmụ, jupụta ụwa. Iv ga-amụ ụmụ, ụmụ ya amụọkwa ụmụ ruo mgbe ụmụ mmadụ jupụtara ụwa otú ahụ Chineke chọrọ. (Aịzaya 45:18) Ọ̀ bara uru ichewe na Jehova ga-asị Adam na Iv mụọ ụmụ jupụta ụwa ma ọ bụrụ na ihe o bu n’obi bụ na ha ga-adị ndụ hụ naanị ụmụ ha nakwa ma eleghị anya ụmụ ụmụ ha, okwu agwụ?

Cheekwa gbasara ọrụ o nyere ha ime ka ụmụ anụmanụ nọrọ n’okpuru ha. Chineke gwara Adam ka ọ gụọ ụmụ anụmanụ niile aha. Nke ahụ ga-ewekwa oge. (Jenesis 2:19) Ma ime ka ha nọrọ n’okpuru ya pụtara na ọ ga-amụ banyere ha ma mata otú ọ ga-esi elekọta ha. Nke a ga-ewe oge karịa ịgụ ha aha.

N’ihi ya, ọrụ Chineke nyere Adam na Iv ịmụ ụmụ jupụta ụwa nakwa ime ka ụmụ anụmanụ nọrọ n’okpuru ha gosiri na o kere Adam na Iv ịdị ogologo ndụ. Nke bụ́ eziokwu bụ na Adam dịrị nnọọ ogologo ndụ.

CHINEKE CHỌRỌ KA ỤMỤ MMADỤ DỊRỊ NDỤ EBIGHỊ EBI NA PARADAỊS N’ỤWA

HA DỊRỊ NNỌỌ OGOLOGO NDỤ

Adam dịrị ndụ afọ 930

Metusela dịrị 969

Noa dịrị 950

Anyị na-adị afọ 70 ma ọ bụ 80

Baịbụl gosiri na o nwere mgbe ụmụ mmadụ na-adị ogologo ndụ karịa otú anyị na-adị taa. Ọ sịrị: “Ụbọchị niile Adam dịrị ndụ wee bụrụ narị afọ itoolu na iri atọ.” Ọ kpọkwara aha mmadụ isi ndị ọzọ dịrị ndụ karịa narị afọ itoolu. Ha bụ Set, Inọsh, Kinan, Jered, Metusela, na Noa. Ha niile dịrị ndụ tupu Iju Mmiri oge Noa. Noa dị narị afọ isii tupu Iju Mmiri ahụ. (Jenesis 5:5-27; 7:6; 9:29) Olee ihe mere ha ji na-adị ogologo ndụ mgbe ahụ?

A mụrụ ha obere oge Adam na Iv ghọrọ ndị na-ezughị okè. Ọ ga-abụ ya mere ha ji dịrị ogologo ndụ. Ma, olee ihe gbasara izu okè na mmadụ ịdị ogologo ndụ? Oleekwa otú a ga-esi eme ka ọnwụ kwụsị? Iji zaa ajụjụ ndị a, ka anyị buru ụzọ ghọta ihe mere anyị ji aka nká ma na-anwụ anwụ.