Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mgbe Ọ Dị Ka Ị Gaghịzi Edili Nsogbu Gị

Mgbe Ọ Dị Ka Ị Gaghịzi Edili Nsogbu Gị

NDỤ na-atọ ezigbo ụtọ ma ọ bụrụ na ihe niile ana-aga nke ọma. Ma mgbe ụfọdụ, nsogbu nwere ike mee ka ọ dị mmadụ ka ọnwụ bịa gbuo ya.

Dị ka ihe atụ, mgbe otu ajọ ifufe bibiri ihe niile otu nwaanyị aha ya bụ Sally a bi n’Amerịka nwere, o kwuru, sị: “Ihe a mere m karịrị m. Ọtụtụ mgbe, ọ na-adị m ka agaghịzi m edili ya.”

Ọ bụrụkwanụ na mmadụ nwụnahụrụ gị? Otu nwaanyị bi n’Ọstrelia aha ya bụ Janice kwuru, sị: “Mgbe ụmụ m ndị nwoke abụọ nwụrụ, ndụ m ghasasịrị, ike ụwa agwụkwa m. M rịọrọ Chineke, sị: ‘Agaghịzi m edili ihe a. Hapụ m ka m nwụọ. Achọghịzi m ịdị ndụ.’”

Obi gbawara otu nwoke aha ya bụ Daniel mgbe ọ chọpụtara na nwunye ya na-agba n’èzí. O kwuru, sị: “Mgbe nwunye m kwuru na ya gbara n’èzí, ọ dị m ka à mara m mma n’obi. Obi gbawara m. Ihe a nyere m nsogbu ruo ọtụtụ ọnwa.”

N’Ụlọ Nche a, a ga-atụle ihe mere na ike ụwa ekwesịghị ịgwụ gị, ọ bụrụgodị na

Ka anyị bidogodị na nke mbụ. Olee ihe ga-enyere anyị aka ma e nwee ọdachi?

a Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’Ụlọ Nche a abụghị ezigbo aha ha.