Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Họrọ asụsụ Igbo

 ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ 23

‘Nọrọnụ na Nche Ka A Ghara Inwe Onye Ga-eburu Unu Dị Ka Anụ Oriri Ya’

‘Nọrọnụ na Nche Ka A Ghara Inwe Onye Ga-eburu Unu Dị Ka Anụ Oriri Ya’

“Nọrọnụ na nche: ma eleghị anya, a pụrụ inwe onye ga-eburu unu dị ka anụ oriri ya site na nkà ihe ọmụma na aghụghọ efu, dị ka ọdịnala mmadụ si dị.”—KỌL. 2:8.

ABỤ NKE 96 Okwu Chineke Bụ Akụ̀

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Dị ka e kwuru ná Ndị Kọlọsi 2:4, 8, olee otú Setan si agbalị ime ka anyị chewe echiche ka ya?

SETAN chọrọ ka anyị kwụsị ife Jehova. Ka o nwee ike ime ihe a o bu n’obi, ọ na-agbalị ime ka anyị gbanwee otú anyị si eche echiche, si otú ahụ mee ka anyị na-eche echiche ka ya. Ọ na-agbalịkwa iji ihe na-agụ anyị agụụ anwa anyị iji mee ka anyị na-eso ya.—Gụọ Ndị Kọlọsi 2:4, 8.

2-3. (a) Gịnị mere anyị ji kwesị ime ihe e kwuru ná Ndị Kọlọsi 2:8? (b) Olee ihe anyị ga-atụle n’isiokwu a?

2 Setan ò nwere ike iduhie anyị? Ee, o nwere ike. Anyị kwesịrị icheta na ọ bụghị ndị na-anaghị efe Chineke ka Pọl degaara ihe ahụ e kwuru ná Ndị Kọlọsi 2:8. Ọ bụ Ndị Kraịst e ji mmụọ nsọ tee mmanụ ka o degaara ya. (Kọl. 1:2, 5) Ọ bụrụ na Ndị Kraịst oge ahụ akpacharaghị anya, Ekwensu nwere ike iduhie ha. O nwekwara ike iduhie anyị taa karịadị, ma ọ bụrụ na anyị akpacharaghị anya. (1 Kọr. 10:12) N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na a chụdala Ekwensu n’ụwa a, ọ na-agbalịsikwa ike ka o duhie ndị na-efe Chineke. (Mkpu. 12:9, 12, 17) Ihe ọzọ bụ na anyị bi n’oge ndị ajọ mmadụ na ndị nduhie “na-ajọwanye njọ.”—2 Tim. 3:1, 13.

3 N’isiokwu a, anyị ga-atụle otú Setan si eji “aghụghọ efu” agbalị ịnwa anyị ka anyị na-eche echiche ka ya. Anyị ga-achọpụtakwa “atụmatụ aghụghọ” atọ ọ na-eji anwa anyị. (Efe. 6:11) N’isiokwu na-esonụ, anyị ga-atụle  ihe anyị ga-eme ma ọ bụrụ na e nwere otú atụmatụ ya si kpaa otú anyị si eche echiche aka ọjọọ. Ugbu a, ka anyị buru ụzọ tụlee otú Setan si duhie ndị Izrel mgbe ha banyere n’ala nkwa ahụ na ihe anyị nwere ike ịmụta na ya.

O JI IKPERE ARỤSỊ NWAA HA

4-6. Dị ka Diuterọnọmi 11:10-15 kwuru, olee ụzọ ọhụrụ e si akọ ugbo ndị Izrel mụtara mgbe ha banyere n’Ala Nkwa ahụ?

4 Setan ji akọ nwaa ndị Izrel ka ha fee arụsị. Olee otú o si mee ya? Ọ ma na nri dị ha mkpa, n’ihi ya, o ji ya nwaa ha ka ha mee ihe ọ chọrọ. Mgbe ndị Izrel banyere n’Ala Nkwa ahụ, ha gbanwere otú ha si arụ ọrụ ugbo. Mgbe ha nọ n’Ijipt, ha na-aga n’Osimiri Naịl kuru mmiri gbaa ihe ndị ha kụrụ. Ma, e nweghị osimiri buru ibu dị n’Ala Nkwa ahụ. Ọ bụ mmiri zoro ezo na igirigi na-ede ihe ha kụrụ n’ubi. (Gụọ Diuterọnọmi 11:10-15; Aịza. 18:4, 5) N’ihi ya, ndị Izrel mụrụ ụzọ ọhụrụ ha ga-esi na-arụ ọrụ ugbo. Ọ dịrịghị ha mfe n’ihi na ọtụtụ ndị ma otú e si akọ ugbo nwụrụ n’ala ịkpa.

Olee otú Setan si gbanwee otú ndị Izrel na-arụ ọrụ ugbo si eche echiche? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 4 ruo na nke 6) *

5 Jehova gwara ndị ya na ọnọdụ ha agbanweela. Ọ dọziri ha aka ná ntị. Ihe ọ gwara ha yiri ka o nweghị ihe gbasara ya na ọrụ ugbo. Ọ gwara ha, sị: “Lezienụ anya ka a ghara ịrata obi unu, unu ewee gaa fee chi ọzọ ma kpọọrọ ha isiala.” (Diut. 11:16, 17) Gịnị mere Jehova ji dọọ ha aka ná ntị banyere ife chi ọzọ mgbe ọ na-ekwu gbasara ụzọ ọhụrụ ha ga-esi na-akọ ugbo?

6 Jehova ma na ndị Izrel ga-achọ ịmụta ụzọ ụfọdụ ndị na-efe chi ọzọ gbara ha gburugburu si akọ ugbo. Nke bụ́ eziokwu bụ na ndị a niile bụ aka ochie n’ịkọ ugbo karịa ndị Izrel. Ndị Izrel nwekwara  ike ịmụta ihe bara uru n’aka ha, ma e nwere ike iduhie ha. Otú ndị Kenan na-akọ ugbo si efe Bel kpara otú ha si eche echiche aka. Ha kweere na ọ bụ Bel nwe mbara ígwé, nakwa na ọ bụ ya na-eme ka mmiri zoo. Jehova achọghị ka e jiri nkwenkwe ụgha ndị ahụ duhie ndị ya. Ma ọtụtụ ugboro, ndị Izrel họọrọ ife Bel. (Ọnụ Ọgụ. 25:3, 5; Ikpe 2:13; 1 Eze 18:18) Ka anyị tụlee otú Setan si mee ka ha ghọọrọ ya anụ oriri.

ỤZỌ ATỌ SETAN SI MEE KA NDỊ IZREL GHỌỌRỌ YA ANỤ ORIRI

7. Olee otú e si nwalee okwukwe ndị Izrel mgbe ha banyere n’Ala Nkwa ahụ?

7 Ihe mbụ Setan ji nwaa ụmụ Izrel bụ mmiri ha chọsiri ike ka o zoo. Mmiri anaghị ezokarị n’Ala Nkwa ahụ malite ná ngwụcha ọnwa Eprel ruo Septemba. Ọ bụ mmiri na-ezo malite n’Ọktoba na-eme ka ihe ndị Izrel kụrụ mee nke ọma. Setan ghọgburu ndị Izrel ha ekweta na ka ihe ha kụrụ nwee ike ime nke ọma, ha ga na-eme ka mba ndị na-ekpere arụsị gbara ha gburugburu. Mba ndị ahụ kweere na e nwere ụfọdụ ihe ha ga na-emere chi ha ka o nwee ike ime ka mmiri na-ezo. Ndị na-enweghị okwukwe na Jehova kweere na ha ga-eme ka mba ndị ahụ ka ọkọchị ghara ịkọ ruo ogologo oge. N’ihi ya, ha mere ihe ndị mba ahụ na-eme iji fee Bel.

8. Gịnị bụ ihe nke abụọ Setan ji ghọgbuo ndị Izrel? Kọwaa.

8 Ihe nke abụọ Setan ji nwaa ndị Izrel bụ agụụ mmekọahụ rụrụ arụ na-agụ ha. Mba ndị ahụ na-efe chi ụgha na-eme omume rụrụ arụ ndị na-asọ oyi iji fee chi ha. Ihe ụfọdụ ha na-eme n’ofufe a rụrụ arụ bụ inwe ma ụmụ nwaanyị ma ụmụ nwoke na-agba akwụna n’ụlọ arụsị. Ha kwere ka ụmụ nwoke na-edina ụmụ nwoke, ụmụ nwaanyị ana-edinakwa ụmụ nwaanyị, kwerekwa ka a na-eme omume rụrụ arụ ndị ọzọ. Ha wedịịrị ihe ndị ahụ ka ihe dị mma. (Diut. 23:17, 18; 1 Eze 14:24) Ha kweere na ihe ndị ahụ ha na-eme na-eme ka chi ha mee ka ala ha na-eme nri nke ọma. Omume rụrụ arụ ndị na-efe chi ụgha na-eme iji fee chi ha masịrị ọtụtụ ndị Izrel, ya emee ka ha soro ha fewe chi ha. Ma nke bụ́ eziokwu bụ na Setan ghọgburu ha.

9. Dị ka e kwuru na Hosia 2:16, 17, olee otú Setan si mee ka ụmụ Izrel chefuo Jehova?

9 Ihe nke atọ Setan ji nwaa ụmụ Izrel bụ ime ka ha chefuo Jehova. N’oge Jeremaya onye amụma, Jehova kwuru na ndị amụma ụgha mere ka ndị ya chefuo aha ya “n’ihi Bel.” (Jere. 23:27) O yiri ka ndị Izrel hà kwụsịrị ịkpọ aha Jehova ma jiri Bel, nke pụtara “Onye Nwe” na “Nna Ukwu,” gbanwere ya. Nke a mere ka o siere ndị Izrel ike ịma ihe dị iche n’etiti Jehova na Bel, ya emeekwa ka ha gwakọta ofufe Jehova na Bel.—Gụọ Hosia 2:16, 17.

ỤZỌ NDỊ SETAN SI EDUHIE NDỊ MMADỤ TAA

10. Olee ụzọ ndị Setan ji eduhie ndị mmadụ taa?

10 Setan na-ejikwa ụzọ ndị ahụ o si nwaa ụmụ Izrel anwa anyị taa. Ihe ndị ọ na-eji enweta ndị mmadụ bụ ihe ndị na-agụ ha agụụ, ime ka mmekọahụ rụrụ arụ yie ihe na-adịghị njọ, nakwa ime ka ha chefuo Jehova. Ka anyị buru ụzọ tụlee nke ikpeazụ a.

11. Olee otú Setan sirila mee ka ndị mmadụ chefuo Jehova?

11 Setan na-eme ka ndị mmadụ chefuo Jehova. Mgbe ndịozi Jizọs nwụchara,  ụfọdụ ndị sịrị na ha bụ Ndị Kraịst malitere izi ozizi ụgha. (Ọrụ 20:29, 30; 2 Tesa. 2:3) Ndị a si n’ezi ofufe dapụ malitere ime ka ndị mmadụ chefuo onye naanị ya bụ ezi Chineke. Dị ka ihe atụ, ha kwụsịrị ide aha Chineke na Baịbụl ha ma jiri okwu ndị dị ka “Onyenwe anyị” dochie ya. Otú a ha si were “Onyenwe anyị” dochie aha Chineke mere ka o siere onye na-agụ Baịbụl ike ịmata na Jehova dị iche ná ndị ọzọ a kpọrọ “onyenwe anyị” na Baịbụl. (1 Kọr. 8:5) Ha na-akpọ Jehova na Jizọs “Onyenwe anyị,” ya emee ka o sie ike ịmata na Jehova na Ọkpara ya abụghị otu onye. (Jọn 17:3) Ihe a ha mere mere ka ndị mmadụ kụziwe Atọ n’Ime Otu, bụ́kwanụ ihe Baịbụl na-akụzịghị. Ihe a emeela ka ọtụtụ ndị kwere na anyị agaghị amatali onye Chineke bụ. Ihe a bụ ụgha chara acha.—Ọrụ 17:27.

Olee otú Setan si eji okpukpe ụgha eme ka ndị mmadụ na-eme omume rụrụ arụ na-agụ ha agụụ? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 12) *

12. Olee ihe okpukpe ụgha na-akwado, oleekwa ihe ndị ọ kpatarala dị ka e kwuru ná Ndị Rom 1:28-31?

12 Setan na-eji agụụ mmekọahụ rụrụ arụ na-agụ mmadụ anwa ya. N’oge ụmụ Izrel, Setan ji okpukpe ụgha mee ka ndị mmadụ na-eme omume rụrụ arụ. Ọ ka na-emekwa otu ihe ahụ taa. Okpukpe ụgha na-ekwe ka ndị mmadụ na-eme omume rụrụ arụ, ha na-emedị ka ime ya yie ihe na-enweghị ihe o mere. Nke a emeela ka ndị na-ekwu na ha na-efe Chineke kwụsị ime ihe Chineke kwuru ma mewe omume rụrụ arụ. N’akwụkwọ ozi Pọl onyeozi degaara ndị Rom, o kwuru nsogbu ndị a na-enwe n’ihi na okpukpe ụgha na-akwado omume rụrụ arụ. (Gụọ Ndị Rom 1:28-31.) Ụfọdụ n’ime ihe ndị ahụ “na-ekwesịghị ekwesị” bụ ụdị mmekọahụ niile rụrụ arụ na nwoke idina nwoke na nwaanyị idina nwaanyị. (Rom 1:24-27, 32; Mkpu. 2:20) Ọ dị ezigbo mkpa ka anyị na-eme ihe Baịbụl na-akụzi.

13. Olee ihe ọzọ Setan na-eji eduhie ndị mmadụ?

13 Setan na-eji ihe ndi na-agụ anyị agụụ anwa anyị. Anyị na-achọkarị ịmụ aka ọrụ ndị ga-enyere anyị aka ịkpa afọ anyị na ndị ezinụlọ anyị. (1 Tim. 5:8) Anyị nwere ike ịmụta ọrụ ndị ahụ ma anyị gaa akwụkwọ ma gụsie akwụkwọ ike. Ma anyị kwesịrị ịkpachara anya. Ụlọ akwụkwọ ndị e nwere n’ọtụtụ mba na-akụziri ụmụ akwụkwọ ezigbo aka ọrụ, na-akụzikwara ha amamihe ụwa.  Dị ka ihe atụ, a na-akụziri ụmụ akwụkwọ ka ha kweta na Chineke adịghị, nakwa ka ha ghara iji ihe Baịbụl kwuru kpọrọ ihe. A na-akụzikwara ha na ndị niile maara ihe na-ekweta na e nweghị onye kere ihe niile. (Rom 1:21-23) Ụdị ozizi ndị a na-agba ‘amamihe Chineke’ ụkwụ.—1 Kọr. 1:19-21; 3:18-20.

14. Gịnị ka amamihe nke ụwa merela ka ndị mmadụ na-eme?

14 Ihe ụmụ mmadụ na-akụzi na-emegide ihe Jehova kwuru. Ọ naghị eme ka mmadụ na-akpa àgwà ndị so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ, kama, ọ na-eme ka mmadụ na-arụ “ọrụ nke anụ ahụ́.” (Gal. 5:19-23) Ọ na-eme ka ndị mmadụ na-adị mpako nke na-eme ka ha bụrụ “ndị hụrụ naanị onwe ha n’anya.” (2 Tim. 3:2-4) Àgwà a dị iche n’àgwà Chineke chọrọ ka ndị na-efe ya na-akpa. Chineke chọrọ ka ndị na-efe ya dịrị umeala n’obi. (2 Sam. 22:28) Ụfọdụ Ndị Kraịst garala mahadum na-echezi echiche ka ndị ụwa kama ịna-eche echiche ka Chineke. Ka anyị tụlee otú nke a nwere ike isi mee.

Olee otú amamihe ụwa nwere ike isi mebie otú anyị si eche echiche? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 14 ruo na nke 16) *

15-16. Gịnị ka ị mụtara n’ihe mere otu nwanna nwaanyị a kọrọ akụkọ ya?

15 Otu nwanna nwaanyị jerela ozi oge niile ihe karịrị afọ iri na ise kwuru, sị: “Dị ka Onyeàmà Jehova e mere baptizim, agụọla m akwụkwọ anyị ndị kwuru gbasara nsogbu dị n’ịga mahadum, nụkwa ọtụtụ okwu ndị e kwuru banyere ya, ma o nweghị nke bara m ntị. M chere na ihe ahụ a na-ekwu agbasaghị m.” Olee nsogbu ndị ọ kpataara ya? O kwuru, sị: “Akwụkwọ m na-agụ ekweghị m nwee ohere, ya emee ka m ghara inwe oge  ikpe ekpere ruo ogologo oge otú m na-emebu, ka ezigbo ike na-agwụ m mụ na ndị mmadụ ikwurịta okwu na Baịbụl, ya ana-esikwara m ike ịkwadebe maka ọmụmụ ihe. Ma, obi dị m ụtọ na ozugbo m ghọtara na isi m tinyere n’agụmakwụkwọ dị elu na-akpa adịm ná mma mụ na Jehova aka ọjọọ, m ghọtara na m kwesịrị ịkwụsị ya. Ọ bụkwa ihe m mere.”

16 Olee otú ịga mahadum si kpaa otú nwanna nwaanyị a si eche echiche aka ọjọọ? O kwuru, sị: “Ọ na-eme m ihere ikwu na ịga mahadum mere ka m na-enyo ndị ọzọ enyo, karịchaa ụmụnna m. O mekwara ka m na-atụ anya ka ha mee ihe karịrị ihe ha nwere ike ime, meekwa ka m na-akpapụ onwe m iche. O siiri m ezigbo ike ịkwụsị àgwà ndị ahụ. Ihe ahụ mere m mere ka m ghọta na mmadụ ileghara ihe Jehova si ná nzukọ ya na-agwa anyị anya dị ka mmadụ iji ọkụ egwu egwu. Jehova ma m nke ọma karịa ka m ma onwe m. A sị na m maara, m gaara ege ya ntị.”

17. (a) Gịnị ka anyị kwesịrị ikpebisi ike ime? (b) Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

17 Kpebisie ike na ị gaghị ekwe ka e jiri “nkà ihe ọmụma na aghụghọ efu” nke ụwa Setan duhie gị. Ekwekwala ka Setan duhie gị. (1 Kọr. 3:18; 2 Kọr. 2:11) Ekwela ka o mee ka ị chefuo Jehova. Na-eme ihe Chineke kwuru mgbe niile. Ekwekwala ka Setan mee ka ị ghara iji ndụmọdụ Chineke kpọrọ ihe. Ma, gịnịkwanụ ma ọ bụrụ na ị chọpụta na e nweela otú amamihe nke ụwa sirila kpaa gị aka ọjọọ? Isiokwu na-esonu ga-eme ka anyị mata otú Okwu Chineke nwere ike isi nyere anyị aka ịkụghasị echiche na àgwà “ndị gbanyesiri mgbọrọgwụ ike.”—2 Kọr. 10:4, 5.

ABỤ NKE 49 Ka Anyị Na-eme Ka Obi Jehova Ṅụrịa

^ par. 5 Setan bụ aka ochie n’iduhie ndị mmadụ. O meela ka ọtụtụ ndị na-eche na ha nweere onwe ha, ebe ọ bụkwanụ na ha nọ n’okpuru ya. N’isiokwu a, anyị ga-atụle ihe dị iche iche Setan na-eji eduhie ndị mmadụ.

^ par. 48 NKỌWA FOTO: Ebe ndị Kenan na-achọ ime ka ndị Izrel ha na ha na-emekọrịta ihe fewe Bel ma na-eme omume rụrụ arụ.

^ par. 51 NKỌWA FOTO: Ihe otu chọọchị ji egosi na ha na-ekwe ka nwoke na-edina nwoke, nwaanyị ana-edina nwaanyị.

^ par. 53 NKỌWA FOTO: Ebe otu nwanna nwaanyị nọ na mahadum. Ya na ụmụ akwụkwọ ibe ya kwetara n’ihe onye nkụzi ha na-akụziri ha na sayensị na nkà na ụzụ ga-akwụsị nsogbu niile ụmụ mmadụ nwere. Mgbe o mechara gaa ọmụmụ ihe, o nweghịzi mmasị n’ihe a na-amụ, ya ana-enyokwa ụmụnna enyo.