Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Họrọ asụsụ Igbo

Otú Anyị Ga-esi Zere Otu Ọnyà Setan

Otú Anyị Ga-esi Zere Otu Ọnyà Setan

KA NDỊ IZREL na-achọ ịgafe Osimiri Jọdan banye n’ala nkwa ahụ, e nwere ndị bịara leta ha. Ole ndị ha bụ? Ha bụ ụmụ nwaanyị ndị mba ọzọ. Ha kpọkwara ụmụ nwoke ndị Izrel oriri. O yiri ihe ga-amagbu onwe ya. Ụmụ nwoke ndị Izrel nwere ike imeta ndị enyi ọhụrụ, gbaa egwú, riekwa nri na-atọ ezigbo ụtọ. Ọ bụ eziokwu na omenala na àgwà ụmụ nwaanyị ndị ahụ dị iche n’ihe Iwu Chineke kwuru ka ndị Izrel na-eme, ụfọdụ ụmụ nwoke Izrel nwere ike ịna-eche, sị: “O nweghị ihe ga-emenụ. Anyị ga-akpachara anya.”

 Gịnị meziri? Baịbụl kwuru, sị: “Ha na ndị inyom Moab wee malite inwe mmekọahụ rụrụ arụ.” Ụmụ nwaanyị ndị ahụ chọrọ ka ndị Izrel fee chi ha. Ọ bụkwa ihe ụmụ Izrel mere. N’ihi ya, “Jehova wee weso Izrel iwe dị ọkụ.”—Ọnụ Ọgụ. 25:1-3.

Ndị Izrel mebiri Iwu Chineke abụọ. Ha kpọọrọ arụsị isiala, kwaakwa iko. Ọtụtụ puku mmadụ nwụrụ n’ihi isi a ha nupụrụ. (Ọpụ. 20:4, 5, 14; Diut. 13:6-9) Gịnị mere ihe a ha mere ji jọgbuo onwe ya? Ọ bụ oge o mere. A sị na ha emebighị iwu Chineke, obere oge, ọtụtụ puku ndị Izrel ahụ nwụrụnụ gaara agafere Osimiri Jọdan, banye n’Ala Nkwa ahụ.—Ọnụ Ọgụ. 25:5, 9.

Pọl onyeozi kwuru banyere ihe mere n’oge ahụ, sị: “Ihe ndị a nọ na-adakwasị ha dị ka ihe atụ, e dekwara ha ede ka ha bụụrụ anyị ihe ịdọ aka ná ntị, anyị ndị ọgwụgwụ nke usoro ihe ndị a bịakwasịworo.” (1 Kọr. 10:7-11) O doro anya na obi tọgburu Setan atọgbu na ụfọdụ ndị Izrel mere mmehie dị oké njọ, ya emee ka ha ghara ịbanye n’Ala Nkwa ahụ. Anyị kwesịrị ịmụta ihe n’ihe a mere ha, n’ihi na obi ga-atọgbukwa Setan atọgbu ma ọ bụrụ na ọ ga-emeli ka anyị ghara ịbanye n’ụwa ọhụrụ Chineke.

ỌNYÀ ỌJỌỌ

Setan na-achọ otú ọ ga-esi amata Ndị Kraịst n’ọnyà taa. Ọ na-ejikwa ihe ọ ma o jirila mata ọtụtụ ndị n’ọnyà eme ya. Dị ka anyị mụtara n’ihe banyere ndị Izrel, o ji ịkwa iko mata ha n’ọnyà. N’oge anyị a, ọ ka na-eji ịkwa iko enweta ndị mmadụ. Otu ụzọ jọgburu onwe ya o si anwata ndị mmadụ ime ya bụ ile ndị gba ọtọ.

Taa, mmadụ nwere ike ịna-ele ndị gba ọtọ, ndị mmadụ agaghị ama. Ma, ọtụtụ afọ gara aga, onye chọrọ ile ndị gba ọtọ na-aga ebe a na-egosi fim ndị gba ọtọ ma ọ bụ gaa zụrụ akwụkwọ e sere ndị gba ọtọ. O nwere ike ịbụ na ihe mere ọtụtụ ndị anaghị aga ebe ndị ahụ n’oge ahụ bụ n’ihi na ha achọghị ka ndị mmadụ hụ ha ma ọ bụ mata na ha na-ele ya. Ma ugbu a, onye nwere Ịntanet nwere ike ịnọ n’ebe ọrụ ya ma ọ bụ n’ụgbọala na-ele ya. N’ọtụtụ ebe taa, mmadụ nwedịrị ike ịnọ n’ụlọ ya na-ele ndị gba ọtọ.

Ma a ka nwere ihe ọzọ. Ekwentị emeela ugbu a ka ọ dịkwuo mfe ile ndị gba ọtọ. Ndị mmadụ na-aga n’ụzọ ma ọ bụ nọrọ n’ụgbọala ma ọ bụkwanụ n’ụgbọ okporo ígwè, ha nwere ike iji ekwentị ma ọ bụ tablet ha na-ele ndị gba ọtọ.

Ebe ọ bụ na ọ dịkwuola mfe mmadụ ile ndị gba ọtọ, ndị ọzọ aghara ịma, ile ndị gba ọtọ na-akpata nsogbu ugbu a karịa na mbụ. Ọtụtụ ndị na-ele ya na-enwe nsogbu n’alụmdi na nwunye ha, ndị mmadụ na-akwụsị ịkwanyere ha ùgwù, akọnuche ha na-akwụsịkwa ịrụ ọrụ. Nke ka njọ bụ na o nwere ike ime ka ha na Chineke gharazie ịdị ná mma. O doro anya na ile ndị gba ọtọ na-akpatara ndị na-ele ya nsogbu. Ọtụtụ mgbe, ọ na-akpatara ndị na-ele ya obi mgbawa. Ha nwere ike imecha jiri nwayọọ nwayọọ nweta onwe ha, ma mgbe ụfọdụ, ọ na-esi ike ịkwụsịcha nsogbu ndị ọ kpatara.

Anyị kwesịrị ịma na Jehova kwuru na ọ ga-echebe anyị n’ọnyà Setan a. Ọ bụrụ na Jehova ga-echebe anyị, anyị ga-eme ihe ụmụ nwoke ndị Izrel oge ochie na-emeghị. Anyị ‘ga-erubere nnọọ Jehova isi.’ (Ọpụ. 19:5) Anyị kwesịrị ịghọta na Chineke kpọrọ ile ndị gba ọtọ ezigbo asị. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ?

KPỌỌ YA ASỊ OTÚ AHỤ JEHOVA KPỌRỌ YA

Chebara ihe a echiche. Iwu Chineke nyere ndị Izrel dị iche n’iwu na-achị mba ọ bụla ọzọ n’oge ahụ. Iwu o nyere ndị Izrel dị ka mgbidi chebere ha ka ha ghara ịmụta àgwà ọjọọ mba ndị ọzọ na-akpa. (Diut. 4:6-8) Iwu ndị ahụ mere ka otu eziokwu dị mkpa doo anya, ya bụ na Jehova kpọrọ ịkwa iko asị.

 Jehova gwara ndị Izrel ihe ọjọọ mba ndị nọ ha nso na-eme. Ọ gwaziri ha, sị: “Unu emekwala otú ala Kenan, bụ́ ebe m na-akpọbata unu, na-eme; . . . Ala ha bụ ihe na-adịghị ọcha, m ga-enyekwa ya ntaramahụhụ n’ihi njehie ya.” N’anya Chineke, bụ́ Onye Nsọ nke Izrel, àgwà ndị Kenan rere ezigbo ure nke na o lere ala ha anya ka ihe na-adịghị ọcha na ihe e merụrụ emerụ.—Lev. 18:3, 25.

N’agbanyeghị na Jehova tara ndị Kenan ahụhụ maka ihe ha mere, mba ndị ọzọ nọgidekwara na-akwa iko. Mgbe ihe karịrị otu puku afọ na narị afọ ise gachara, Pọl onyeozi kwuru na mmehie mba ndị Ndị Kraịst bi na ha “adịkwaghị ewute ha.” Mba ndị ahụ “mikpuru onwe ha n’omume rụrụ arụ iji anyaukwu na-eme ụdị omume adịghị ọcha niile.” (Efe. 4:17-19) Taakwa, ọtụtụ ndị na-eme omume rụrụ arụ n’emeghị ihere. N’ihi ya, ezi ndị na-efe Chineke kwesịrị izere ile ihe ọ bụla rụrụ arụ ndị nọ n’ụwa na-eme.

Mmadụ ile ndị gba ọtọ bụ ịkparị Chineke. O kere anyị n’oyiyi ya, meekwa ka anyị nwee ike ịmata ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ. Chineke nyere anyị iwu gbasara mmekọahụ n’ihi na ọ ma ihe. Ọ chọrọ ka ọ bụrụ naanị di na nwunye ga na-enwe mmekọahụ. (Jen. 1:26-28; Ilu 5:18, 19) Ma, olee ihe ndị na-emepụta fim na akwụkwọ ndị gba ọtọ ma ọ bụ ndị na-akwado ha na-eme? E nweghị ihe ha ji iwu Chineke kpọrọ. N’eziokwu, ndị na-akwado ile ndị gba ọtọ na-akparị Jehova. Chineke ga-ekpe ndị leghaara iwu ya anya na-emepụta fim na akwụkwọ ndị gba ọtọ ma ọ bụ ndị na-akwado ndị na-eme ya ikpe.— Rom 1:24-27.

Gịnịkwanụ banyere ndị na-akpachara anya na-ele ndị gba ọtọ ma ọ bụ na-agụ akwụkwọ ha? Ụfọdụ n’ime ha na-eche na ọ bụ ihe e ji atụrụ ndụ na-enweghị ihe o mere. Ma nke bụ́ eziokwu bụ na ha na-akwado ndị na-eleghara iwu Jehova anya. O nwere ike ọ bụghị ihe ha bu n’obi mgbe ha malitere ile ya. Ma Baịbụl mere ka o doo anya na ndị na-efe ezi Chineke kwesịrị ịkpọ ile ndị gba ọtọ ezigbo asị. Baịbụl kwuru, sị: “Unu ndị hụrụ Jehova n’anya, kpọọnụ ihe ọjọọ asị.”—Ọma 97:10.

 O nwere ike isiri ndị na-achọghị ile ndị gba ọtọ ike izere ya kpamkpam. Anyị ezughị okè, n’ihi ya, anyị nwere ike ịna-alụso agụụ mmekọahụ rụrụ arụ ọgụ. Ihe ọzọkwa bụ na ebe anyị na-ezughị okè, anyị nwere ike ịna-agwa onwe anyị na ile ndị gba ọtọ adịghị njọ. (Jere. 17:9) Ma, ọtụtụ ndị ghọrọ Ndị Kraịst emeriela n’ọgụ a. Iburu ihe a n’obi ga-eme ka obi sie gị ike na ị ga-akwụsịli ile ndị gba ọtọ ma ọ bụrụ na gị na ya na-alụ. Ka anyị tụlee otú Okwu Chineke ga-esi enyere gị aka izere ọnyà Setan a bụ́ ile ndị gba ọtọ.

ANỌLA NA-ECHE IHE RỤRỤ ARỤ

Dị ka anyị kwuru na mbụ, ọtụtụ ndị Izrel kwere ka agụụ ihe ọjọọ gbaa mgbọrọgwụ n’obi ha, nke mere ka ha mee ihe kpataara ha ezigbo nsogbu. Ụdị ihe ahụ nwekwara ike ime taa. Jems onye nne ji ya na Jizọs kọwara nsogbu agụụ ihe ọjọọ ịgụ mmadụ na-akpata. Ọ sịrị: “A na-anwa onye ọ bụla mgbe ọchịchọ nke aka ya rapụtara ya wee rafuo ya. Mgbe ọchịchọ ahụ tụụrụ ime, ọ na-amụpụta mmehie.” (Jems 1:14, 15) Ọ bụrụ na mmadụ ekwe ka agụụ ihe ọjọọ gbaa mgbọrọgwụ n’obi ya, ka oge na-aga, onye ahụ nwere ike mee mmehie. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịgbalịsi ike kwụsị iche ihe ndị rụrụ arụ.

Ọ bụrụ na ị chọpụta na ị na-echekarị ihe rụrụ arụ n’obi gị, mee ihe ozugbo maka ya. Jizọs kwuru, sị: “Ọ bụrụ na aka gị ma ọ bụ ụkwụ gị na-eme ka ị sụọ ngọngọ, gbupụ ya tụfuo. . . . Ọ bụrụkwa na anya gị na-eme ka ị sụọ ngọngọ, ghụpụ ya ma tụfuo ya.” (Mat. 18:8, 9) Jizọs anaghị ekwu ka anyị merụọ onwe anyị ahụ́. O ji ihe atụ a na-eme ka anyị ghọta na anyị kwesịrị ịchọpụta ihe mere anyị ji na-eche ihe ọjọọ ma mee ihe ozugbo iji kwụsị ya. Olee otú anyị ga-esi eme ihe a Jizọs kwuru ma a bịa n’ihe gbasara ile ndị gba ọtọ?

Ọ bụrụ na foto ndị gba ọtọ apụta na tiivi ma ọ bụ kọmputa gị, asịkwala, ‘O nweghị ihe ọ ga-eme m.’ Wepụ anya gị ozugbo. Gbanyụọ tiivi gị ozugbo. Gbanyụọ kọmputa ma ọ bụ ekwentị ma ọ bụkwanụ tablet gị ozugbo. Gbalịa lewe ihe dị mma. Ime ihe ndị a nwere ike inyere gị aka ichewe ihe dị mma kama ikwe ka echiche gị dịrị n’ihe ọjọọ.

 GỊNỊ KA ANYỊ GA-EME MA Ọ BỤRỤ NA ANYỊ ELEELA NDỊ GBA ỌTỌ MA KA NA-ECHE GBASARA YA?

Ọ bụrụkwanụ na ị kwụsịla ile ndị gba ọtọ, ma mgbe ụfọdụ, gị ana-echeta ihe ndị ahụ? Mmadụ nwere ike ịna-echeta ihe ndị ahụ o lerela ruo ogologo oge. Ha nwere ike ịbata ya n’obi mgbe ọ bụla. Ọ bụrụ na ụdị ihe a emee gị, i nwere ike ịchọ ime ihe na-adịghị mma, dị ka igbo onwe gị agụụ mmekọahụ. N’ihi ya, mara na ihe ndị ahụ nwere ike ịgbata gị n’uche, dịkwa njikere iwepụ ya n’obi gị.

Kpebisie ike na ị ga na-eche echiche otú Chineke chọrọ, na-emekwa ihe otú ọ chọrọ. Na-eme ka Pọl onyeozi, bụ́ onye dị njikere ‘itipụta ahụ́ ya ọnyá, ma na-achị ya dị ka ohu.’ (1 Kọr. 9:27) Gbalịa ka ị ghara ịna-eme ihe ọjọọ na-agụ gị agụụ. ‘Gbanwee site n’ime ka uche gị dị ọhụrụ, ka i wee chọpụta n’onwe gị ihe bụ́ uche Chineke, nke ziri ezi na nke dị ya mma, nke zukwara okè.’ (Rom 12:2) Cheta na iche echiche na ime ihe otú Chineke chọrọ ga-eme ka i nwee obi ụtọ. Ma, ị gaghị enwe obi ụtọ ma i mee omume rụrụ arụ.

Iche echiche otú Chineke si chọọ na ime ihe otú ọ chọrọ ga-eme ka ị na-enwe obi ụtọ. Ma, ị gaghị na-enwe obi ụtọ ma ị na-eme mmehie

Gbalịa ibu amaokwu Baịbụl ụfọdụ n’isi. Ọ bụrụzie na echiche ọjọọ abata gị n’obi, gbaa mbọ chewe ihe e kwuru n’amaokwu Baịbụl ndị ahụ. E nwere amaokwu Baịbụl ndị ga-enyere gị aka ka i mee ka echiche gị na nke Jehova bụrụ otu n’ihe gbasara mmadụ ile ndị gba ọtọ, nakwa ịmata ihe ọ chọrọ ka ị na-eme. Ha bụ Abụ Ọma 119:37; Aịzaya 52:11; Matiu 5:28; Ndị Efesọs 5:3; Ndị Kọlọsi 3:5; na 1 Ndị Tesalonaịka 4:4-8.

Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na ọ na-esiri gị ike ịkwụsị ile ihe rụrụ arụ ma ọ bụ ịche gbasara ya? Gbalịa ka i mee ihe Jizọs, bụ́ Onye Anyị Na-eṅomi, mere. (1 Pita 2:21) Mgbe e mechara ya baptizim, Setan nọgidere na-anwa ya. Olee ihe Jizọs mere? Ọ nọgidere na-eguzogide Setan. Jizọs ji ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ zaghachi Setan n’ọnwụnwa nke ọ bụla ọ nwara ya. Ọ sịrị ya, “Si ebe a pụọ, Setan!” Setan apụọ. Otú ahụ ike agwụghị Jizọs iguzogide Ekwensu, ike ekwesịghịkwa ịgwụ gị. (Mat. 4:1-11) Setan na ụwa ya ga-anọgide na-achọ ime ka ị na-eche ihe ndị rụrụ arụ, ma, ike agwụla gị ịlụso ha ọgụ. Ị ga-emerili n’ọgụ ị na-alụ ịkwụsị ile ndị gba ọtọ. Jehova ga-enyere gị aka imeri ya.

KPEE EKPERE, RUBEKWARA JEHOVA ISI

Nọgide na-arịọ Jehova n’ekpere ka o nyere gị aka. Pọl kwuru, sị: “Mee ka Chineke mara ihe unu na-arịọ; udo nke Chineke nke karịrị echiche niile ga-eche obi unu na ike iche echiche unu nche site n’aka Kraịst Jizọs.” (Fil. 4:6, 7) Udo Chineke ga-enye gị ga-eme ka obi ruo gị ala, nyekwara gị aka ịghara ịna-eme ihe ọjọọ. Ọ bụrụ na ị bịaruo Jehova nso, ‘ọ ga-abịarukwa gị nso.’ (Jems 4:8)

Ihe ga-akacha enyere anyị aka izere ọnyà Setan bụ ime ka anyị na Ọkaakaa eluigwe na ụwa dịrị n’ezigbo mma. Jizọs kwuru, sị: “Onye na-achị ụwa [ya bụ, Setan] na-abịa. O nweghịkwa ike n’ebe m nọ.” (Jọn 14:30) Gịnị mere obi ji sie Jizọs ike otú a? O kwuru, sị: “Onye zitere m nọnyeere m; ọ hapụghị m ka m nọrọ naanị m, n’ihi na m na-eme ihe dị ya mma mgbe niile.” (Jọn 8:29) Ọ bụrụkwa na ị gbalịa na-eme ihe dị Jehova mma n’ihe niile, Jehova emekataghị hapụ gị. Zere ọnyà Setan a bụ́ ile ndị gba ọtọ, Setan agaghịkwa eji ya amata gị.