Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Họrọ asụsụ Igbo

“M Ga-eje Ije n’Eziokwu Gị”

“M Ga-eje Ije n’Eziokwu Gị”

“Jehova, biko, kụziere m ụzọ gị. M ga-eje ije n’eziokwu gị.”—ỌMA 86:11.

ABỤ: 31, 72

1-3. (a) Olee otú obi kwesịrị ịdị anyị banyere eziokwu Baịbụl? Kọwaa. (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.) (b) Olee ajụjụ ndị anyị ga-atụle n’isiokwu a?

TAA, ndị mmadụ na-eweghachikarị ihe ndị ha zụrụ azụ. Nchọpụta ndị e mere gosiri na ná mba ụfọdụ, e kee ihe ndị mmadụ na-azụ ụzọ iri, ndị mmadụ na-eweghachi ihe dị ka otu ụzọ n’ime ihe ndị ha zụrụ n’ahịa. Ha na-akadị eweghachi ihe ndị ha si n’Ịntanet zụọ karịa. Ọ ga-abụ na ihe mere ha ji eweghachi ihe ndị ahụ bụ na otú ha dị abụghị ihe ha tụrụ anya ya, ma ọ bụ na ha mebiri emebi ma ọ bụkwanụ na ọ dịghị ha mma. N’ihi ya, ha na-eweghachi ha ka e nye ha ọzọ ma ọ bụ ka e nyeghachi ha ego.

2 Ọ bụ eziokwu na anyị nwere ike ikwu ka e nyeghachi anyị ego ihe anyị zụrụ, ma anyị enweghị ike ịchọ ka anyị ‘ree’ ma ọ bụ hapụ “ezi ihe ọmụma” nke eziokwu Baịbụl anyị ‘zụtara.’ ma ọ bụ mụtara. (Gụọ Ilu 23:23; 1 Tim. 2:4) N’isiokwu bú nke a ụzọ, anyị tụlere ihe ụfọdụ anyị hapụrụ ka anyị nwee ike ịmụta eziokwu. Anyị hapụrụ oge anyị na-eji eme ihe ndị ọzọ. O nwere ike ịbụ na anyị hapụrụ ọrụ a na-akwụ anyị ezigbo ụgwọ na ya. O nwekwara ike ịbụ na anyị gbanwere otú anyị na ndị ọzọ si emekọrịta ihe, gbanweekwa àgwà anyị na otú anyị si eche echiche, ma ọ bụ kwụsị ime omenala ndị na-adịghị Jehova mma. Ma, anyị kwetasiri ike na uru  ndị anyị ritere n’ihi eziokwu anyị mụtara karịrị ihe ọ bụla anyị hapụrụ.

3 A bịa n’ihe gbasara eziokwu Baịbụl, ọ dị anyị otú ahụ ọ dị otu nwoke Jizọs kwuru banyere ya n’obere ihe atụ o mere. Iji gosi otú eziokwu Alaeze Chineke dịruru ndị chọtara ya ná mkpa, Jizọs kwuru banyere otu onye ahịa gara chọọ pel ọma ma chọta otu. Nke bụ́ eziokwu bụ na pel ahụ dị oké ọnụ ahịa nke na o ‘rere ihe niile o nwere ozugbo’ ka o nwee ike ịzụ ya. (Mat. 13:45, 46) Otú ahụ ka ọ dị eziokwu Alaeze nakwa eziokwu ndị ọzọ anyị mụtara n’Okwu Chineke. Ha dị oké ọnụ ahịa nke na anyị ji obi anyị niile hapụ ọtụtụ ihe ozugbo ka anyị nwee ike ịmụta ha. Ọ bụrụ na anyị ejiri eziokwu na-akpọrọ ihe, anyị emekataghị ‘ree ya.’ Ma, ọ dị mwute na ụfọdụ ndị ohu Chineke echefuola uru eziokwu baara ha ma ree ya. Ka anyị ghara ikwe ka ụdị ihe a mee anyị. Iji gosi na anyị ji eziokwu kpọrọ ezigbo ihe nakwa na anyị enweghị ike ire ya, anyị kwesịrị ime ihe a Baịbụl kwuru, nke sịrị ka anyị “na-eje ije n’eziokwu ahụ.” (Gụọ 3 Jọn 2-4.) Ije ije n’eziokwu pụtara iwere ya ka ihe kacha mkpa ná ndụ nakwa ịkpa àgwà ka ndị na-eje ije n’eziokwu. Ka anyị tụlee ajụjụ ndị a: Olee ihe nwere ike ime ka ụfọdụ ‘ree’ eziokwu, oleekwa otú ha nwere ike isi eme ya? Olee ihe anyị ga-eme ka anyị ghara ime ya? Olee otú anyị nwere ike isi kpebisikwuo ike ‘ije ije n’eziokwu ahụ’?

IHE MERE ỤFỌDỤ JI ‘ERE’ EZIOKWU NA OTÚ HA SI ERE YA

4. N’oge Jizọs na-eje ozi ya n’ụwa, olee ihe mere ụfọdụ ji ‘ree’ eziokwu?

4 N’oge Jizọs na-eje ozi ya n’ụwa, ụfọdụ ndị nabatara ihe ndị ọ kuziiri ha kwụsịrị ịna-eje ije n’eziokwu. Dị ka ihe atụ, mgbe Jizọs rụrụ ọrụ ebube nye ìgwè mmadụ nri, ha sooro ya gawa n’akụkụ nke ọzọ nke Oké Osimiri Galili. Ma Jizọs kwuru ihe juru ha anya. Ọ sịrị: “Ọ bụrụ na unu erighị anụ ahụ́ Nwa nke mmadụ, ṅụọkwa ọbara ya, unu enweghị ndụ n’ime onwe unu.” Kama ịjụ Jizọs ka ọ kọwaara ha ihe ihe o kwuru pụtara, o wutere ha, ha ekwuo, sị: “Okwu a na-awụ akpata oyi; ònye pụrụ ige ntị na ya?” Ihe ahụ Jizọs kwuru mere ka ‘ọtụtụ n’ime ndị na-eso ụzọ ya laghachi n’ihe ha hapụrụ ahapụ, kwụsịkwa iso ya na-ejegharị.’—Jọn 6:53-66.

5, 6. (a) N’oge ndị na-adịbeghị anya, olee ihe mere ụfọdụ ndị ji hapụ eziokwu? (b) Olee otú mmadụ nwere ike isi hapụ eziokwu?

5 Ọ dị mwute na ụfọdụ ndị taa ahapụla eziokwu. Ihe mere ụfọdụ ji mee ya bụ na a gbanwere otú anyị sibu ghọta amaokwu Baịbụl ma ọ bụ n’ihi ihe nwanna a ma ama kwuru ma ọ bụ mere. Ndị ọzọ hapụrụ eziokwu maka na ha were iwe mgbe e ji Baịbụl dọọ ha aka ná ntị ma ọ bụ na ha na nwanna ọzọ nwere ezigbo nghọtahie. E nwekwara ndị nke hapụrụnụ n’ihi na ha kweere ihe ndị si n’ezi ofufe dapụ na ndị ọzọ na-emegide anyị na-akụzi. Ihe a bụ ihe ole na ole n’ime ihe ndị mere ka ụfọdụ hapụ Jehova na ọgbakọ. (Hib. 3:12-14) Ọ gaara akara ha mma ma a sị na ha nọgidere n’eziokwu ma tụkwasị Jizọs obi, otú ahụ Pita onyeozi mere. Mgbe Jizọs jụrụ ndịozi ya ma hà chọkwara ịla, Pita zara ya ozugbo, sị: “Onyenwe anyị, ònye ka anyị ga-alakwuru? I nwere okwu nke ndụ ebighị ebi.”—Jọn 6:67-69.

6 Ndị ọzọ ji nwayọọ nwayọọ hapụ eziokwu, ikekwe, ha amadịghị na ha ahapụwala ya. E nwere ike iji onye ji nwayọọ nwayọọ hapụ eziokwu tụnyere ụgbọ mmiri dị n’akụkụ mmiri nke mmiri ji nwayọọ nwayọọ bupụ. Baịbụl kpọrọ ụdị ihe a mmadụ “ịkpafu.” (Hib. 2:1) Onye ji nwayọọ nwayọọ hapụ eziokwu akpacharaghị anya mee ya. Ma, o kwere ka adịm  ná mma ya na Chineke gharazie isi ike, ka oge na-aga, ya na Chineke akwụsịkwa ịdị ná mma. Olee ihe anyị ga-eme ka ụdị ihe a ghara ime anyị?

OLEE OTÚ MMADỤ GA-ESI GHARA IRE EZIOKWU?

7. Olee ihe mbụ ga-enyere anyị aka ka anyị ghara ire eziokwu?

7 Ka anyị nwee ike ije ije n’eziokwu, anyị ga-anabata ihe niile Jehova kwuru, ma na-eme ha eme. Anyị kwesịrị iji eziokwu kpọrọ ihe ná ndụ anyị, ma na-eme ihe Baịbụl kwuru. Mgbe Eze Devid na-ekpe ekpere, ọ gwara Jehova, sị: “M ga-eje ije n’eziokwu gị.” (Ọma 86:11) Devid kpebisiri ike ime ihe a o kwuru. Anyịnwa kwesịkwara ikpebisi ike ije ije n’eziokwu nke Chineke. Ọ bụrụ na anyị emeghị otú ahụ, anyị nwere ike nwewe obi abụọ gbasara ihe ndị ahụ anyị hapụrụ n’ihi eziokwu, ikekwe, anyị achọwakwa ime ụfọdụ n’ime ha. Kama ime otú ahụ, anyị kwesịrị iji eziokwu kpọrọ ezigbo ihe. Anyị ma na anyị enweghị ike ịhọrọ eziokwu nke anyị ga-anabata na nke anyị na-agaghị anabata. A sị ka e kwuwe, anyị kwesịrị ije ije ‘n’eziokwu niile.’ (Jọn 16:13) N’isiokwu bu nke a ụzọ, anyị tụlere ihe ise anyị nwere ike ịhapụ ka anyị nwee ike ịmụta eziokwu ma na-eme ha eme. Ugbu a, ka anyị leba anya n’otú anyị nwere ike isi hụ na anyị alaghachighị n’ihe ndị ahụ anyị hapụrụ ahapụ.—Mat. 6:19.

8. Ọ bụrụ na Onye Kraịst ejighị oge ya na-eme ihe bara uru, olee otú o nwere ike isi mee ka ọ hapụ eziokwu? Nye ihe atụ.

8 Oge. Anyị kwesịrị iji oge anyị na-eme ihe bara uru ma ọ bụrụ na anyị achọghị ịhapụ eziokwu. Ọ bụrụ na anyị akpacharaghị anya, anyị nwere ike jiri oge buru ibu na-atụrụ ndụ, na-aga n’Ịntanet, ma ọ bụ na-ele tiivi. Ọ bụ eziokwu na ihe ndị a adịghị njọ, ma oge anyị ji na-eme ha nwere ike na-akpa oge anyị na-eji amụ ihe n’onwe anyị na ihe ndị ọzọ anyị na-eme n’ofufe Jehova aka ọjọọ. Ụdị ihe a mere Nwanna Nwaanyị Emma. * Malite n’oge ọ na-eto eto, o nwere mmasị n’ịnyịnya. Mgbe ọ bụla o nwere ohere, ọ na-agba ya. Ka oge na-aga, ahụ́ anaghịzi eru ya ala n’ihi oge niile ahụ ọ na-eji agba ya, ya emechaa mee mgbanwe. Ọ mụtakwara ihe n’akụkọ Nwanna Nwaanyị Cory Wells, bụ́ onye na-agbabu ịnyịnya. * Nwanna Nwaanyị Emma na-ejizi oge buru ibu ugbu a na-eme ihe ndị gbasara ofufe Chineke, ya na ndị ezinụlọ ya na ndị enyi ya na-anọrịkwa. Ya na Jehova adịkwuola ná mma, obi na-atọkwa ya ụtọ na o ji oge ya na-eme ihe ndị bara uru.

9. Olee otú ịchọ ka anyị nweta ihe onwunwe nwere ike isi mee ka ụfọdụ hapụ ihe ndị gbasara ofufe Chineke?

9 Ihe Onwunwe. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịnọgide na-eje ije n’eziokwu, anyị ekwesịghị ikwe ka inweta ihe onwunwe bụrụ ihe kacha anyị mkpa ná ndụ. Mgbe mbụ anyị mụtara eziokwu, anyị ghọtara na ife Jehova ka mkpa karịa inweta ihe onwunwe, obi dịkwa anyị ụtọ na anyị hapụrụ ihe ndị ahụ niile n’ihi eziokwu. Ma ka oge na-aga, anyị nwere ike ịna-ahụ ndị ọzọ ka ha na-azụ ngwá elektrọniks ndị ọgbara ọhụrụ ma ọ bụ na-ekpori ndụ n’ihe ndị ọzọ. Anyị nwere ike na-eche na e nwere ihe na-efunahụ anyị. O nwere ike ime ka ihe ndị anyị nwere ghara ịna-eju anyị afọ. Inweta ihe onwunwe nwekwara ike dị anyị mkpa karịa ofufe Chineke. Ihe a na-echetara anyị gbasara Dimas. Otú o si hụ “usoro ihe dị ugbu a n’anya” mere ka ọ hapụ ozi ya na Pọl onyeozi na-eje. (2 Tim. 4:10) Gịnị mere o ji hapụ Pọl? Ma ọ̀ hụrụ ihe onwunwe n’anya karịa ịna-ejere Jehova  ozi ma ọ̀ bụ na ọ chọghịzi ịhapụ ihe ụfọdụ ka ya na Pọl nwee ike ịna-eje ozi, Baịbụl agwaghị anyị. O doro anya na anyị achọghị ka anyị nwewekwa mmasị n’inweta ihe onwunwe, ma kwere ka ha mee ka anyị gharazie iji eziokwu kpọrọ ihe.

10. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịna-eje ije n’eziokwu, olee ihe anyị na-ekwesịghị ikwe ka o mee?

10 Mmekọrịta anyị na ndị ọzọ. Ka anyị nwee ike ịna-eje ije n’eziokwu, anyị ekwesịghị ikwe ka nsogbu ndị ọzọ na-enye anyị mee ka anyị hapụ ofufe Chineke. Mgbe anyị malitere ife Jehova, anyị gbanwere otú anyị na ndị enyi anyị na ndị ezinụlọ anyị na-abụghị Ndịàmà Jehova si emekọrịta ihe. E nwere ndị nke na-anaghị enye anyị nsogbu, nweekwa ndị na-achọghị iji anya ahụ anyị. (1 Pita 4:4) Ọ bụ eziokwu na anyị na-agbalị ka anyị na ndị ezinụlọ anyị na-emekọrịta ihe ma na-akpaso ha àgwà ọma, anyị ga-akpachara anya ka ha ghara ime ka anyị mebie iwu Chineke n’ihi na anyị chọrọ ime ihe dị ha mma. Anyị ga na-agbalị ka anyị na ha na-emekọrịta ihe. N’ihi ihe 1 Ndị Kọrịnt 15:33 kwuru, naanị ndị anyị na ha ga na-akpachi anya bụ ndị hụrụ Jehova n’anya.

11. Olee otú anyị nwere ike isi gbaara echiche na àgwà ndị na-adịghị mma ọsọ?

11 Echiche na àgwà ndị na-adịghị mma. Ndị niile na-eje ije n’eziokwu ga-adị nsọ. (Aịza. 35:8; gụọ 1 Pita 1:14-16.) Mgbe anyị ka batara n’ọgbakọ, anyị mere mgbanwe ka anyị nwee ike ịna-eme ihe Baịbụl kwuru. Ụfọdụ n’ime anyị mere ezigbo mgbanwe. N’agbanyeghị nke ọ bụla anyị mere, anyị ekwesịghị ikwe ka omume rụrụ arụ juru n’ụwa a mebie àgwà ọma anyị. Gịnị ka anyị ga-eme ka anyị ghara ime omume rụrụ arụ? Chee echiche ihe o furu Jehova iji mee ka anyị dị nsọ. O ji ọbara dị oké ọnụ ahịa nke Ọkpara ya, bụ́ Jizọs Kraịst chụọ àjà maka anyị. (1 Pita 1:18, 19) Ka anyị nwee ike ịna-adị ọcha n’anya Jehova, anyị ga na-echeta uru àjà ahụ Jizọs ji ndụ ya chụọ baara anyị.

12, 13. (a) Gịnị mere anyị ji kwesị ile ememme anya otú Jehova si ele ya anya? (b) Olee ihe ọzọ anyị ga-atụle?

12 Ememme na omenala ndị na-adịghị Chineke mma. Ndị ezinụlọ anyị, ndị ọrụ ibe anyị, nakwa ụmụ akwụkwọ ibe anyị nwere ike ịchọ ka anyị soro ha n’ememme ndị ha na-eme. Olee ihe anyị ga-eme ka anyị ghara iso ha na-eme ememme ndị ahụ na-adịghị Chineke mma? Otú anyị nwere ike isi eme ya bụ iburu n’obi ihe mere Jehova ji kwuo na ememme ndị ahụ adịghị mma. Ime nchọnchọ n’akwụkwọ anyị ndị kwuru otú ememme ndị ahụ si malite ga-enyere anyị aka. Ọ bụrụ na anyị amata ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru mere na anyị ekwesịghị ime ememme ndị ahụ, ọ ga-edo anyị anya na anyị na-eme “ihe dị Onyenwe anyị mma.” (Efe. 5:10) Ịtụkwasị Jehova obi na iji Okwu ya nke eziokwu kpọrọ ihe, ga-echebe anyị ka anyị ghara “ịtụ mmadụ egwu.”—Ilu 29:25.

13 Ije ije n’eziokwu bụ ihe anyị ga na-eme mgbe niile. Anyị nwere olileanya ịna-eme ya ruo mgbe ebighị ebi. Gịnị ga-enyere anyị aka ịnọgide ná mkpebi anyị mere ịna-eje ije n’eziokwu? Ka anyị tụlee ihe atọ ga-enyere anyị aka.

KPEBISIKWUO IKE ỊNA-EJE IJE N’EZIOKWU

14. (a) Olee otú ịnọgide na-amụta eziokwu ga-esi eme ka anyị nọgide ná mkpebi anyị mere na anyị agaghị ahapụ ya? (b) Olee ihe mere amamihe na ịdọ aka ná ntị na nghọta ji dị mkpa?

14 Ihe mbụ ga-enyere anyị aka bụ ịnọgide na-amụ eziokwu nke Okwu Chineke magburu onwe ya ma na-echebara ihe ndị anyị mụtara echiche. Anyị kwesịrị ịzụta eziokwu. Otú anyị ga-esi eme ya bụ ịna-ewepụta oge na-amụ Okwu Chineke mgbe niile. Ime otú a ga-eme ka anyị jiri  eziokwu kpọrọkwuo ihe, meekwa ka anyị nọgide ná mkpebi anyị mere na anyị agaghị ahapụ ya. E wezụga ịzụta eziokwu, Ilu 23:23 kwukwara na anyị kwesịrị ịzụta “amamihe na ịdọ aka ná ntị na nghọta.” Mmadụ ịmụta eziokwu dị na Baịbụl abụghị ebe okwu biri. Anyị ga na-eme eziokwu ndị ahụ anyị mụtara eme. Anyị ghọta eziokwu, anyị etinyekọta ya n’ihe ndị anyị mụtara nakwa n’ihe ndị anyị ma. Amamihe na-eme ka anyị na-eme ihe ndị ahụ anyị ma. Mgbe ụfọdụ, a na-eji eziokwu adọ anyị aka ná ntị, na-eme ka anyị mata ebe anyị kwesịrị ịgbanwe ihe ná ndụ anyị. Anyị kwesịrị ịna-anabata aka ná ntị a na-adọ anyị ma mee ihe ozugbo banyere ya. Uru ọ ga-abara anyị karịrị ọlaọcha.—Ilu 8:10.

15. Olee otú eziokwu si echebe anyị?

15 Ihe nke abụọ ga-enyere anyị aka bụ na anyị ga-ekpebisi ike ịna-eme ihe ndị anyị na-amụta na Baịbụl n’ihe ọ bụla anyị na-eme kwa ụbọchị. Ka anyị jiri eziokwu kee úkwù anyị. (Efe. 6:14) N’oge Baịbụl, ájị̀ onye agha na-eke n’úkwù ya na-enyere ya aka ma na-echebe úkwù ya nakwa akụkụ ahụ́ ya ndị dị n’ime. Ka ájị̀ a nwee ike ichebe ya, ọ ga-ekesi ya ike. Ọ bụrụ na o kesighị ya ike, ọ gaghị echebe ya. Olee otú eziokwu ahụ anyị kere n’úkwù anyị ga-esi chebe anyị? Ọ bụrụ na anyị ekee eziokwu n’úkwù anyị otú ahụ onye agha si eke ájị̀ n’úkwù ya, ọ ga-eme ka anyị ghara ịna-eche echiche na-adịghị mma, nyekwara anyị aka ime ka anyị na-eme mkpebi ndị ziri ezi. Ọnwụnwa bịara anyị, ọ ga-eme ka anyị nọgide ná mkpebi anyị mere ime ihe ziri ezi. Otú ahụ onye agha na-agaghị eche echiche ịga agha n’ekeghị ájị̀ n’úkwù ya, ka anyị ga-agbalị hụ na anyị ahapụghị eziokwu anyị mụtara. Kama, anyị ga-agbalịsi ike ime ya eme ná ndụ anyị. Ihe ọzọ onye agha na-eji ájị̀ o kere n’úkwù ya eme bụ na ọ na-afanye mma agha ya na ya. N’ihi ya, anyị ga-atụle ihe ọzọ ga-enyere anyị aka ịnọgide ná mkpebi anyị mere ịna-eje ije n’eziokwu.

16. Olee otú ịkụziri ndị mmadụ eziokwu ga-esi nyere anyị aka ịnọgide ná mkpebi anyị mere ịna-eje ije n’eziokwu?

16 Ihe nke atọ ga-enyere anyị aka bụ na anyị kwesịrị ịgbalịsi ike na-akụziri ndị mmadụ eziokwu Baịbụl. Ime otú ahụ ga-eme ka anyị jidesie mma agha anyị ike, ya bụ, “okwu Chineke.” (Efe. 6:17) Anyị niile ga-agba mbọ mee ka otú anyị si ezi ihe na-aka mma ma “na-ejizi okwu nke eziokwu ahụ ejizi.” (2 Tim. 2:15) Ka anyị ji Baịbụl na-enyere ndị ọzọ aka ka ha mụta eziokwu ma jụ ozizi ụgha, anyị na-eme ka Okwu Chineke dịgide n’uche nakwa n’obi anyị. Ime otú ahụ ga-eme ka anyị nọgide ná mkpebi anyị mere ịna-eje ije n’eziokwu.

17. Gịnị mere i ji jiri eziokwu kpọrọ ihe?

17 Eziokwu bụ onyinye magburu onwe ya Jehova nyere anyị. Ọ bụ eziokwu a mere ka anyị na Nna anyị nke eluigwe dịrị n’ezigbo mma, bụ́ ihe kacha mkpa anyị nwere. Ihe ndị ọ kụzirila anyị kemgbe bụ obere ihe ma e jiri ha tụnyere ihe ndị ọ ka ga-akụziri anyị. O kwere anyị nkwa na ya ga na-akụziri anyị ihe ruo mgbe ebighị ebi. N’ihi ya, jiri eziokwu kpọrọ ezigbo ihe ka pel ọma. Nọgide ‘na-azụta eziokwu, erekwala ya.’ Ime otú ahụ ga-eme ka i mezuo nkwa a Devid kwere Jehova. Ọ sịrị: “M ga-eje ije n’eziokwu gị.”—Ọma 86:11.

^ para. 8 Aha a kpọrọ ya abụghị ezigbo aha ya.

^ para. 8 Gaa na Tiivi Ndịàmà Jehova, pịa ebe e dere AJỤJỤ ỌNỤ pịzie EZIOKWU NA-AGBANWE NDỤ NDỊ MMADỤ.