Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Họrọ asụsụ Igbo

 ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ 18

Otú Iwu nke Kraịst Si Gosi na Jehova Nwere Ịhụnanya ma Na-ekpe Ikpe Ziri Ezi

Otú Iwu nke Kraịst Si Gosi na Jehova Nwere Ịhụnanya ma Na-ekpe Ikpe Ziri Ezi

“Na-eburịtanụ ibu arọ nke ibe unu, ma si otú a na-emezu iwu nke Kraịst.”—GAL. 6:2.

ABỤ 12 Jehova Chineke Dị Ukwuu

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Gịnị bụ ihe abụọ obi kwesịrị isi anyị ike maka ha?

JEHOVA CHINEKE hụrụ ndị na-efe ya n’anya. Ọ hụrụ ha n’anya kemgbe ụwa, o nweghị mgbe ọ ga-akwụsị ịhụ ha n’anya. Ọ hụkwara ikpe ziri ezi n’anya. (Ọma 33:5) N’ihi ya, obi kwesịrị isi anyị ike na: (1) Ọ na-ewute Jehova ma a na-emegbu ndị ya. (2) Ọ ga-ahụ na a kwụsịrị imegbu ndị ya, nakwa na a ga-ata ndị na-emegbu ha ahụhụ kwesịịrị ha. N’isiokwu nke mbụ n’ime isiokwu anọ anyị na-atụle, * anyị mụtara na Iwu Chineke si n’aka Mozis nye ụmụ Izrel dabeere n’ịhụnaya. O kwukwara ka a ghara imegbu onye ukwu na onye nta, ma ndị na-enweghị ike ichebe onwe ha. (Diut. 10:18) Iwu ahụ mere ka a mata na Jehova hụrụ ndị ya n’anya nke ukwuu.

2. Olee ajụjụ ndị anyị ga-aza?

2 Iwu Mozis kwụsịrị n’afọ 33 mgbe e hiwere ọgbakọ Ndị Kraịst. Ọ̀ pụtara na Ndị Kraịst enweghịzi iwu nke ihe mere e ji nye ya bụ na Jehova hụrụ anyị n’anya ma na-ekpe ikpe ziri ezi? Mbanụ. E nwere iwu ọhụrụ e nyere Ndị Kraịst. N’isiokwu a, anyị ga-ebu ụzọ tụlee ihe iwu ọhụrụ ahụ bụ. Anyị ga-azakwa ajụjụ ndị a: Gịnị mere anyị nwere ike iji kwuo na iwu a dabeere n’ịhụnanya? Gịnị mere anyị nwere ike iji kwuo na ọ na-eme ka a na-ekpe ikpe ziri ezi? N’iwu a e nyere Ndị Kraịst, olee otú ndị isi ezinụlọ na ndị okenye kwesịrị isi na-emeso ndị ọzọ ihe?

 GỊNỊ BỤ “IWU NKE KRAỊST”?

3. Dị ka e kwuru ná Ndị Galeshia 6:2, olee ihe so ‘n’iwu nke Kraịst’?

3 Gụọ Ndị Galeshia 6:2. Ndị Kraịst nọ n’okpuru “iwu nke Kraịst.” Jizọs edeghị iwu ndị na-eso ụzọ ya ga na-edebe, ma o nyere ha ntụziaka, iwu na ụkpụrụ ndị ga na-eduzi ha. Ihe niile Jizọs kụziri so ‘n’iwu nke Kraịst.’ Na paragraf ndị na-esonụ, anyị ga-amụtakwu banyere iwu a.

4-5. Olee ụzọ ndị Jizọs si kụziere ndị mmadụ ihe, oleekwa mgbe ọ kụziri ihe?

4 Olee ụzọ ndị Jizọs si kụziere ndị mmadụ ihe? Nke mbụ, o ji ihe o kwuru kụziere ha ihe. Ihe ndị o kwuru kpara ezigbo ike n’ihi na o mere ka ndị mmadụ mata eziokwu gbasara Chineke, mee ka ha mata ihe mere ha ji dịrị ndụ, meekwa ka ha mata na ọ bụ Alaeze Chineke ga-eme ka ahụhụ niile ndị mmadụ na-ata kwụsị. (Luk 24:19) Jizọs jikwa ihe ndị o mere kụziere ndị mmadụ ihe. O ji ihe ndị o mere kụziere ndị na-eso ụzọ ya otú ha kwesịrị isi ebi ndụ.—Jọn 13:15.

5 Olee mgbe Jizọs kụziri ihe? Ọ bụ mgbe ọ na-eje ozi ya n’ụwa. (Mat. 4:23) Ọ kụzikwaara ndị na-eso ụzọ ya ihe obere oge a kpọlitechara ya n’ọnwụ. Dị ka ihe atụ, ọ pụtara n’ihu ìgwè ndị na-eso ụzọ ya, ndị nwere ike ịkarị narị mmadụ ise, ma nye ha iwu ka ha mee ka ndị mmadụ ‘bụrụ ndị na-eso ụzọ ya.’ (Mat. 28:19, 20; 1 Kọr. 15:6) Ebe Jizọs bụ onyeisi nke ọgbakọ, ọ nọgidekwara na-akụziri ndị na-eso ụzọ ya ihe mgbe ọ laghachiri n’eluigwe. Dị ka ihe atụ, n’ihe dị ka afọ 96, Kraịst gwara Jọn onyeozi ka ọ gbaa Ndị Kraịst e tere mmanụ ume ma nye ha ndụmọdụ.—Kọl. 1:18; Mkpu. 1:1.

6-7. (a) Olee ebe e dere ihe ndị Jizọs kụziri? (b) Olee otú anyị si erube isi n’iwu nke Kraịst?

6 Olee ebe e dere ihe ndị Jizọs kụziri? Akwụkwọ Matiu, Mak, Luk, na Jọn kwuru ọtụtụ ihe ndị Jizọs kwuru na ihe ndị o mere mgbe ọ nọ n’ụwa. Akwụkwọ Nsọ Grik ndị ọzọ mere ka anyị ghọtakwuo otú Jizọs si ele ihe anya n’ihi na ndị dere ha si n’ike mmụọ nsọ dee ha, ha nwekwara “uche nke Kraịst.”—1 Kọr. 2:16.

7 Ihe ndị anyị na-amụta: Ihe ndị Jizọs kụziri gbasara ihe niile anyị na-eme ná ndụ. N’ihi ya, iwu nke Kraịst gbasara ihe ndị anyị na-eme n’ụlọ, n’ebe anyị na-arụ ọrụ, n’ụlọ akwụkwọ, nakwa n’ọgbakọ. Otú anyị  si amụta iwu a bụ ịgụ Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst na ịtụgharị uche na ha. Anyị na-edebe iwu a ma anyị na-erube isi ná ntụziaka, n’iwu, nakwa n’ụkpụrụ ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst. Ọ bụrụ na anyị ana-erube isi n’iwu nke Kraịst, anyị na-erubere Chineke hụrụ anyị n’anya isi, n’ihi na ọ bụ ya ka ihe niile Jizọs kụziri si n’aka.—Jọn 8:28.

IWU AHỤ DABEERE N’ỊHỤNANYA

8. Gịnị ka iwu nke Kraịst dabeere na ya?

8 Ụlọ ntọala ya siri ezigbo ike na-eme ka obi ruo ndị bi na ya ala. Otú ahụkwa ka ezigbo iwu nke nwere ezigbo ihe ọ dabeere na ya na-eme ka obi ruo ndị na-edebe ya ala. Iwu nke Kraịst dabeere n’ịhụnanya, nke bụkwanụ ihe kacha mma iwu kwesịrị ịdabere na ya. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ?

Ọ bụrụ na anyị ahụ ndị ọzọ n’anya, anyị na-edebe “iwu nke Kraịst” (A ga-akọwa ya na paragraf nke 9 ruo na nke 14) *

9-10. Olee ihe ndị gosiri na ọ bụ ịhụnanya mere Jizọs ji mee ihe niile o mere, oleekwa otú anyị ga-esi eme ka ya?

9 Nke mbụ, ọ bụ ịhụnanya mere Jizọs ji mee ihe niile o mere. Onye na-enwere ndị mmadụ ọmịiko gosiri na ọ hụrụ ha n’anya. Ọ bụ ụdị ọmịiko a mere Jizọs ji kụziere ìgwè mmadụ ihe, gwọọ ndị ọrịa, nye ndị agụụ ji nri, kpọlitekwa ndị nwụrụ anwụ. (Mat. 14:14; 15:32-38; Mak 6:34; Luk 7:11-15) Ọ bụ eziokwu na ime ihe ndị a were Jizọs oge, meekwa ka ike gwụ ya, o butere ọdịmma ndị ọzọ ụzọ. Ụzọ kachanụ o si gosi na ọ hụrụ anyị n’anya nke ukwuu bụ na ọ nwụrụ maka anyị.—Jọn 15:13.

10 Ihe ndị anyị na-amụta: Anyị nwere ike ime ka Jizọs ma anyị were ya na mkpa ndị ọzọ nwere karịrị nke anyị. Anyị nwekwara ike iṅomi Jizọs ma anyị na-amụ otú anyị ga-esi na-enwekwuru ndị nọ n’ókèala anyị ọmịiko. Ọ bụrụ na ụdị ọmịiko a emee ka anyị na-ekwusara ndị mmadụ ozi ọma ma na-akụziri ha Baịbụl, anyị na-egosi na anyị na-edebe iwu nke Kraịst.

11-12. (a) Gịnị na-egosi na ihe banyere anyị na-emetụ Jehova n’obi nke ukwuu? (b) Olee otú anyị nwere ike isi na-ahụ ndị ọzọ n’anya ka Jehova?

11 Nke abụọ, Jizọs mere ka a mata na Nna ya hụrụ anyị n’anya. Mgbe Jizọs na-eje ozi ya n’ụwa, o mere ka a mata na ihe banyere ndị ohu Jehova na-emetụ Jehova n’obi nke ukwuu. Ihe ụfọdụ Jizọs kụziri bụ: Onye nke ọ bụla n’ime anyị dị oké ọnụ ahịa n’anya Nna anyị nke eluigwe. (Mat. 10:31) Jehova dị njikere ịnabata onye ọ bula si n’ọgbakọ ya kpafuo ma laghachi. (Luk 15:7, 10) Jehova ji Ọkpara ya gbapụta anyị iji gosi na ọ hụrụ anyị n’anya nke ukwuu.—Jọn 3:16.

12 Ihe ndị anyị na-amụta: Olee otú anyị nwere ike isi na-ahụ ndị ọzọ n’anya ka Jehova? (Efe. 5:1, 2) Ọ bụ ma anyị jiri ụmụnna anyị niile kpọrọ ihe, jirikwa obi ụtọ nabata “atụrụ furu efu” nke laghachikwutere Jehova. (Ọma 119:176) Anyị na-egosikwa na anyị hụrụ ụmụnna anyị n’anya ma anyị na-eji oge anyị na ike anyị na-enyere ha aka, karịchaa, mgbe ha nọ ná mkpa. (1 Jọn 3:17) Ọ bụrụ na anyị ana-ahụ ndị ọzọ n’anya, anyị na-edebe iwu nke Kraịst.

13-14. (a) Dị ka e kwuru na Jọn 13:34, 35, gịnị ka Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-eme, gịnịkwa mere o ji bụrụ iwu ọhụrụ? (b) Olee otú anyị si egosi na anyị na-edebe iwu ọhụrụ ahụ?

13 Nke atọ, Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu ka ha hụ ibe ha n’anya otú yanwa si hụ ha n’anya. (Gụọ Jọn 13:34, 35.) Iwu a Jizọs nyere ha bụ iwu ọhụrụ n’ihi na e kwughị banyere ụdị ịhụnanya a n’Iwu ahụ Jehova si n’aka Mozis nye ndị Izrel. Iwu ọhụrụ a kwuru ka anyị na-ahụ ụmụnna anyị n’anya otú ahụ Jizọs si hụ anyị. * Anyị kwesịrị ịhụ ụmụnna anyị n’anya karịadị ka anyị hụrụ onwe anyị. Anyị kwesịkwara ịhụ  ha n’anya nke na anyị ga-adị njikere ịnwụchitere ha ọnwụ, otú ahụ Jizọs meere anyị.

14 Ihe ndị anyị na-amụta: Olee otú anyị si erube isi n’iwu ọhụrụ ahụ? Ọ bụ ịhapụ ihe ụfọdụ na-amasị anyị n’ihi ụmụnna anyị. Ọ bụghị naanị na anyị ga-adị njikere ịnwụ maka ụmụnna anyị, kamakwa, anyị ga-adịkwa njikere ịhapụ ụmụ obere ihe ụfọdụ maka ha. Dị ka ihe atụ, mgbe anyị na-agba mbọ ebuga nwanna mere agadi ọmụmụ ihe, ma ọ bụ hapụ ime ihe ụfọdụ na-amasị anyị iji mee ihe ga-eme onye anyị hụrụ n’anya obi ụtọ, ma ọ bụkwanụ na anyị weere oge ezumike anyị na-enyere ndị ọdachi dakwasịrị aka, anyị na-edebe iwu nke Kraịst. Ọ bụrụ na anyị ana-eme ihe ndị a, anyị na-enye aka eme ka ọgbakọ bụrụ ebe onye ọ bụla ga-anọ obi eruo ya ala.

IWU AHỤ MERE KA A NA-EKPE IKPE ZIRI EZI

15-17. (a) Olee otú ihe Jizọs mere si gosi otú o si ele ikpe ziri ezi anya? (b) Olee otú anyị ga-esi eṅomi Jizọs?

15 Na Baịbụl, “ikpe ziri” pụtara ime ihe Chineke kwuru na ọ bụ ihe ọma, nakwa ime ya n’eleghị mmadụ anya n’ihu. Gịnị mere anyị nwere ike iji kwuo na iwu nke Kraịst mere ka a na-ekpe ikpe ziri ezi?

Jizọs kwanyeere ụmụ nwaanyị ùgwù ma mesoo ha ihe n’ụzọ dị mma, ma ndị nke ndị mmadụ weere ka ndị na-abaghị uru (A ga-akọwa ya na paragraf nke 16) *

16 Nke mbụ, chegodị otú ihe Jizọs mere si gosi otú o si ele ikpe ziri ezi anya. N’oge ya, ndị ndú okpukpe ndị Juu kpọrọ ndị na-abụghị ndị Juu asị, na-eledakwa ndị Juu na-agụghị akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ okpukpe ndị Juu anya. O nweghịkwa ihe ha ji ụmụ nwaanyị kpọrọ. Ma, Jizọs mesoro mmadụ niile ihe otú kwesịrị ekwesị, o leghịkwa mmadụ anya n’ihu. Ọ nabatara ndị na-abụghị ndị Juu nwere okwukwe na ya. (Mat. 8:5-10, 13) O ziri mmadụ niile ozi ọma, ma ndị ọgaranya ma ndị ogbenye. (Mat. 11:5; Luk 19:2, 9) O nweghị mgbe ọ kparịrị ụmụ nwaanyị ma ọ bụ mesie ha ike. Kama nke ahụ, ọ kwanyeere ha ùgwù ma meso ha ihe n’ụzọ dị mma, ma ndị nke ndị mmadụ weere ka ndị na-abaghị uru.—Luk 7:37-39, 44-50.

17 Ihe ndị anyị na-amụta: Anyị nwere ike ime ka Jizọs ma anyị na-emeso ndị mmadụ ihe n’eleghị ha anya n’ihu ma na-ezi mmadụ niile chọrọ ige anyị ntị ozi ọma n’agbanyeghị okpukpe ha na otú ha si baa ọgaranya ma ọ bụ daa ogbenye. Ụmụnna nwoke kwesịrị ịna-akwanyere ụmụ nwaanyị ùgwù, si otú ahụ na-eme ka Kraịst. Ọ bụrụ na anyị ana-eme ihe ndị a, anyị na-edebe iwu nke Kraịst.

18-19. Gịnị ka Jizọs kụziri gbasara ikpe ziri ezi, gịnịkwa ka anyị na-amụta na ya?

18 Nke abụọ, ka anyị tụlee ihe Jizọs kụziri gbasara ikpe ziri ezi. Ọ kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ihe ndị ga-enyere ha aka imeso ndị ọzọ ihe otú dị mma. Dị ka ihe atụ, chegodị gbasara ihe Jizọs kụziri gbasara imere ndị ọzọ ihe anyị chọrọ ka ha meere anyị. (Mat. 7:12) Anyị niile chọrọ ka a na-emeso anyị ihe otú dị mma. N’ihi ya, anyị kwesịkwara ịna-emeso ndị ọzọ ihe otú dị mma. Anyị mee otú ahụ, ha nwekwara ike imeso anyị ihe otú ahụ. Ọ bụrụkwanụ na e mesoro anyị ihe n’ụzọ na-adịghị mma? Jizọs kụzikwaara ndị na-eso ụzọ ya ka ha nwee obi ike na Jehova ‘ga-eme ka ndị ọ họọrọ, bụ́ ndị na-etiku ya ehihie na abalị, nweta ikpe ziri ezi.’ (Luk 18:6, 7) Ihe a Jizọs kwuru na-emesi anyị obi ike na Chineke anyị na-ahụ ahụhụ niile anyị na-ata n’oge ikpeazụ a, nakwa na ọ ga-eme ka anyị nweta ikpe ziri ezi mgbe oge ya ruru.—2 Tesa. 1:6.

19 Ihe ndị anyị na-amụta: Ọ bụrụ na anyị emee ihe Jizọs kwuru, anyị ga-emeso ndị mmadụ ihe n’ụzọ dị mma. E meso anyị ihe n’ụzọ na-adịghị mma n’ụwa Setan a, ịmata na Jehova ga-eme ka anyị nweta ikpe ziri ezi na-akasi anyị obi.

 OLEE OTÚ NDỊ ISI EZINỤLỌ NA NDỊ OKENYE KWESỊRỊ ISI EMESO NDỊ ỌZỌ IHE?

20-21. (a) Olee otú ndị isi ezinụlọ na ndị okenye kwesịrị isi na-emeso ndị ọzọ ihe? (b) Olee otú di nwere ike isi gosi na ya hụrụ nwunye ya n’anya nke ukwuu, oleekwa otú nna kwesịrị isi na-emeso ụmụ ya ihe?

20 Olee otú ndị isi ezinụlọ na ndị okenye kwesịrị isi na-emeso ndị ọzọ ihe n’iwu nke Kraịst? Ebe ọ bụ na iwu ahụ dabeere n’ịhụnanya, ha kwesịrị ịna-akwanyere ndị ọzọ ùgwù ma jiri ịhụnanya na-emeso ha ihe. Ha kwesịkwara icheta na Kraịst chọrọ ka anyị na-egosi na anyị hụrụ ndị mmadụ n’anya n’ihe niile anyị na-eme.

21 N’ezinụlọ. Di kwesịrị ịhụ nwunye ya n’anya “dị nnọọ ka Kraịst hụkwara ọgbakọ ahụ n’anya.” (Efe. 5:25, 28, 29) Di kwesịkwara iṅomi ụdị ịhụnanya Kraịst nwere ma bute ọdịmma nwunye ya ụzọ. O nwere ike isiri ụfọdụ ụmụ nwoke ike igosi ụdị ịhụnanya a, ikekwe n’ihi na ndị ezinụlọ ha anaghị emeso ndị mmadụ ihe otú dị mma ma ọ bụ hụ ha n’anya. O nwekwara ike isiri ha ike ịkwụsị ụdị àgwà ọjọọ a. Ma, ha kwesịrị ịgbanwe ya ka ha nwee ike idebe iwu nke Kraịst. Di jiri obi ya niile hụ nwunye ya n’anya, nwunye ya ga na-asọpụrụ ya. Ọ bụrụkwa na nna ahụ ụmụ ya n’anya, ọ gaghị na-agwa ha okwu ọjọọ ma ọ bụ na-emesi ha ike. (Efe. 4:31) Kama, ọ na-egosi ha na ọ hụrụ ha n’anya, nakwa na ihe ha na-amasị ya. Ọ ga-emekwa ka obi na-eru ha ala. Ọ bụrụ na nna ana-eme ihe ndị a, ụmụ ya ga-ahụ ya n’anya ma tụkwasị ya obi.

22. Dị ka 1 Pita 5:1-3 kwuru, olee onye nwe “atụrụ” ahụ, oleekwa otú e kwesịrị isi na-emeso ha ihe?

22 N’ọgbakọ. Ndị okenye kwesịrị icheta na “atụrụ” Chineke abụghị nke ha. (Jọn 10:16; gụọ 1 Pita 5:1-3.) Okwu bụ́ “ìgwè atụrụ Chineke” na “ihe nketa nke Chineke” na-echetara ndị okenye na ọ bụ Jehova  nwe atụrụ ahụ. Ọ chọrọ ka ha hụ atụrụ ya n’anya ma na-enwere ha ọmịiko. (1 Tesa. 2:7, 8) Ọ bụrụ na ndị okenye ejiri ịhụnanya na-elekọta atụrụ Jehova, ihe ha ga-adị ya mma. Ọ ga-emekwa ka ụmụnna hụ ha n’anya ma na-akwanyere ha ùgwù.

23-24. (a) Gịnị ka ndị okenye na-eme ma nwanna mee mmehie dị oké njọ? (b) Olee ihe ndị okenye na-echeta ma ha na-eleba ụdị okwu ahụ anya?

23 Olee ihe ndị okenye na-eleba anya ma nwanna mee mmehie dị oké njọ? Ọrụ ndị okenye na-arụ dị iche n’ọrụ ndị ikpe na ndị okenye na-arụ n’oge ụmụ Izrel. N’Iwu Mozis, ndị okenye na-eleba anya ma n’ihe ndị gbasara ofufe Chineke ma n’ihe ndị na-agbasachaghị ofufe Chineke. Ma n’iwu nke Kraịst, ndị okenye na-eleba anya naanị n’ihe ọjọọ ndị gbasara ofufe Chineke. Ha makwa na ọ bụ ndị ọchịchị ka Chineke hapụrụ ka ha na-eleba anya n’ihe gbasara ime mpụ na ihe ndị ọzọ. Ọ bụkwa ha ka ọ dịịrị iri onye mere ihe ọjọọ nhá ma ọ bụ ịtụ ya mkpọrọ.—Rom 13:1-4.

24 Gịnị ka ndị okenye na-eme ma nwanna mee mmehie dị oké njọ? Ha na-eji ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru eleba okwu ahụ anya ma kpebie ihe ha ga-eme. Ha na-eburu n’uche na iwu nke Kraịst dabeere n’ịhụnanya. Ịhụnanya ga-eme ka ndị okenye jụọ onwe ha, sị: Gịnị ka anyị ga-eme iji nyere ụmụnna ndị mmehie a kpara aka ọjọọ aka? Ịhụnanya ga-emekwa ka ndị okenye jụọ onwe ha, sị: Nwanna ahụ mere ihe ọjọọ ahụ, ò chegharịala? Ànyị nwere ike inyere ya aka ka ya na Jehova dịrịghachi ná mma?

25. Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

25 Obi na-atọ anyị ụtọ na e nyere anyị iwu nke Kraịst. Ọ bụrụ na anyị niile ana-agba mbọ edebe iwu a, onye ọ bụla nọ n’ọgbakọ ga-amata na a hụrụ ya n’anya ma jiri ya kpọrọ ihe, obi ga na-erukwa ya ala. Ma, anyị ka bi n’ụwa ebe “ndị ajọ mmadụ . . . na-ajọwanye njọ.” (2 Tim. 3:13) Anyị kwesịrị ịmụrụ anya. Olee otú ọgbakọ kwesịrị isi na-ekpe ikpe ziri ezi ka Chineke mgbe ha na-eleba anya n’okwu gbasara imetọ ụmụaka? Isiokwu na-esonụ ga-aza ajụjụ a.

ABỤ 15 Too Ọkpara Jehova

^ par. 5 Isiokwu a na isiokwu abụọ na-eso ya so n’isiokwu ndị na-atụle ihe mere obi ji kwesị isi anyị ike na Jehova bụ Chineke nke hụrụ anyị n’anya ma na-ekpe ikpe ziri ezi. Ọ chọrọ ka ndị ya nweta ikpe ziri ezi. Ọ na-akasikwa ndị a na-emegbu emegbu n’ụwa ọjọọ a obi.

^ par. 1 Gụọ Isiokwu bụ́ “Otú Iwu Mozis Si Gosi na Jehova Nwere Ịhụnanya ma Na-ekpe Ikpe Ziri Ezi.” Ọ gbara n’Ụlọ Nche nke Febụwarị 2019.

^ par. 13 NKỌWAKWU: Ụdị ịhụnanya a na-eme ka anyị na-ebute ọdịmma nke ndị ọzọ ụzọ. Ọ na-emekwa ka anyị hapụ ihe ụfọdụ na-amasị anyị ka anyị nwee ike inyere ndị ọzọ aka ma ọ bụ mee ihe ga-abara ha uru.

^ par. 61 NKỌWA FOTO: Ebe Jizọs na-ele nwaanyị di ya nwụrụ, bụ́ onye otu mkpụrụ nwa nwoke ya nwụrụ. Jizọs nweere nwaanyị a ọmịiko ma kpọlite nwa ya n’ọnwụ.

^ par. 63 NKỌWA FOTO: Ebe Jizọs na-eri nri n’ụlọ onye Farisii aha ya bụ Saịmọn. Otu nwaanyị, nke nwere ike ịbụ onye akwụna, ka ji anya mmiri ya sachaa ụkwụ Jizọs, jiri ntutu isi ya hichaa ya ma tee ya mmanụ. Saịmọn ana-akatọ nwaanyị a, Jizọs ana-agbachitere ya.