Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Họrọ asụsụ Igbo

 ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ 21

Ekwela Ka E Jiri “Amamihe nke Ụwa A” Megharịa Gị Anya

Ekwela Ka E Jiri “Amamihe nke Ụwa A” Megharịa Gị Anya

“Amamihe nke ụwa a bụ ihe nzuzu n’ebe Chineke nọ.” —1 KỌR. 3:19.

ABỤ 98 Akwụkwọ Nsọ Si n’Ike Mmụọ Nsọ Chineke

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Gịnị ka Okwu Chineke na-akụziri anyị?

ANYỊ nwere ihe ga-enyere anyị aka idi nsogbu ọ bụla nwere ike ịbịara anyị n’ihi na Jehova bụ Onye Ozizi Ukwu anyị. (Aịza. 30:20, 21) Okwu ya bụ́ Baịbụl na-agwa anyị ihe niile dị anyị mkpa iji “ruo eru n’ụzọ zuru ezu” nakwa iji bụrụ ndị “a kwadebere n’ụzọ zuru ezu ịrụ ezi ọrụ niile.” (2 Tim. 3:17) Ọ bụrụ na anyị ana-eme ihe Baịbụl na-akụziri anyị, anyị na-ama ihe karịa ndị na-akwado “amamihe nke ụwa a.”—1 Kọr. 3:19; Ọma 119:97-100.

2. Olee ihe anyị ga-atụle n’isiokwu a?

2 Dị ka anyị ga-atụle n’isiokwu a, ọ na-agụkarị anụ ahụ́ anyị agụụ ime ihe ụwa na-akụzi. N’ihi ya, o nwere ike ịna-esiri anyị ike ịghara ịna-eche echiche na ịna-akpa àgwà ka ndị ụwa. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji gwa anyị, sị: “Nọrọnụ na nche: ma eleghị anya, a pụrụ inwe onye ga-eburu unu dị ka anụ oriri ya site na nkà ihe ọmụma na aghụghọ efu, dị ka ọdịnala mmadụ si dị.” (Kọl. 2:8) N’isiokwu a, anyị ga-atụle otú ndị mmadụ si malite ikweta ụgha abụọ na-ewu ewu Ekwensu na-akụzi. Na nke ọ bụla n’ụgha ndị a, anyị ga-ahụ ihe mere amamihe ụwa a ji bụrụ ihe nzuzu, nakwa otú amamihe si n’Okwu Chineke si baa uru karịa ihe ọ bụla ụwa nwere ike ịkụziri anyị.

OTÚ NDỊ MMADỤ SIZI GBANWEE OTÚ HA SI ELE MMEKỌAHỤ ANYA

3-4. Olee ihe gbanwere n’otú ndị mmadụ si ele mmekọahụ anya n’Amerịka n’ihe dị ka malite n’afọ 1900 ruo 1930?

3 N’ihe dị ka afọ 1900 ruo 1930 n’Amerịka, otú ndị mmadụ si ele mmekọahụ anya gbanwere nke ukwuu. Tupu mgbe ahụ, ọtụtụ ndị kweere na ọ bụ naanị nwoke na  nwaanyị bụ́ di na nwunye kwesịrị inwe mmekọahụ, nakwa na e kwesighị ịna-ekwu ihe gbasara mmekọahụ n’ihu ọha. Ma, ụdị ihe ndị ahụ bịara laa ka naị, ndị mmadụ emewezie otú masịrị ha.

4 N’agbata afọ 1920 na 1929, otú ndị mmadụ si akpa àgwà na otú ha si ele mmekọahụ anya gbanwere n’ụzọ dị egwu. Otu onye na-eme nchọpụta kwuru, sị: “Ihe gbasara mmekọahụ bidoro gbawa ma na fim, sinima, akwụkwọ dị iche iche ma n’ihe e ji akpọsa ngwá ahịa.” N’oge ndị ahụ, otú ndị mmadụ si agba egwú na-eme ka ndị mmadụ na-eche banyere mmekọahụ, ejiji ndị mmadụ bịakwara ka njọ. Baịbụl kwukwara na n’oge ikpeazụ a, ndị mmadụ ga-abụ ndị “hụrụ ihe ụtọ n’anya” nke ukwuu.—2 Tim. 3:4.

Ụzọ na-ezighị ezi ndị ụwa si ele mmekọahụ anya anaghị emegharị ndị ohu Jehova anya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 5) *

5. Olee otú ụwa si ele ihe gbasara mmekọahụ anya malite n’afọ 1960?

5 N’agbata afọ 1960 na afọ 1969, nwoke na nwaanyị malitere ibi n’alụghị alụ, ịgba alụkwaghịm na nwoke idina nwoke na nwaanyị idina nwaanyị ghọkwara ihe ọtụtụ ndị nabatara. A malitekwara igosi ihe gbasara mmekọahụ n’ihe dị iche iche e ji atụrụ ndụ n’asọghị ihere. Gịnị ka ihe a niile kpatarala? Otu onye na-ede akwụkwọ kwuru na ọ kpatarala ụmụ mmadụ ọtụtụ nsogbu. Dị ka ihe atụ, ọ kpatarala ọtụtụ ndị obi mgbawa, mee ka ọtụtụ ezinụlọ tisaa, meekwa ka ile ndị gba ọtọ rie ọtụtụ ndị isi. Otu ihe gosiri na amamihe nke ụwa bụ nzuzu bụ otú ọrịa ndị a na-ebute ná mmekọahụ, dị ka ọrịa o biri n’ájá ọcha, si ju ebe niile.—2 Pita 2:19.

6. Gịnị mere a ga-eji ekwu na otú a ndị ụwa si ele mmekọahụ anya bụ ihe Setan chọrọ?

6 Otú a ndị ụwa si ele mmekọahụ anya bụ ihe Ekwensu chọrọ. O doro anya na obi na-atọ ya ụtọ ma ọ hụ ka ndị mmadụ ji mmekọahụ na alụmdi na nwunye na-eme ihe egwuregwu. (Efe. 2:2) Ndị na-enwe mmekọahụ rụrụ arụ na-egosi na ha ejighị ikike Jehova nyere ụmụ mmadụ ịmụta ụmụ kpọrọ ihe. Ndụ ebighị ebi nwekwara ike ịkwa ha.—1 Kọr. 6:9, 10.

IHE BAỊBỤL KWURU BANYERE MMEKỌAHỤ

7-8. Olee ihe mere otú Baịbụl kwuru e kwesịrị isi ele mmekọahụ anya ji ka otú ụwa si ele ya anya mma?

Ndị na-akwado amamihe nke ụwa a na-akatọ mmadụ ịkpa àgwà otú Baịbụl kwuru. Ha na-ekwu na ọ baghị uru ime otú ahụ. Ụdị ndị ahụ nwere ike ịna-ajụ, sị: ‘Gịnị mere Chineke ji kee anyị ka inwe mmekọahụ na-agụ anyị agụụ, ma ya  asị anyị enwela ya?’ Ihe mere ha ji ajụ ajụjụ a bụ n’ihi na ha na-eche na ndị mmadụ kwesịrị ime ihe ọ bụla na-agụ ha agụụ. Ma, Baịbụl kwuru ihe dị iche. O kwuru na ọ bụghị ihe niile na-agụ anyị agụụ ka anyị kwesịrị ime, nakwa na anyị nwere ike ịjụ ime ihe na-adịghị mma na-agụ anyị. (Kọl. 3:5) Ihe ọzọ bụ na Jehova chọrọ ka anyị si n’alụmdi na nwunye, bụ́ onyinye o nyere anyị, na-egbo agụụ mmekọahụ. (1 Kọr. 7:8, 9) Ọ bụ ya mere di na nwunye nwere ike iji na-enwe mmekọahụ n’akwaghị mmakwaara ma ọ bụ chegbuwe onwe ha ka ndị na-akwa iko.

8 Ma Baịbụl na-akụziri anyị otú dị mma anyị ga-esi na-ele mmekọahụ anya. Ọ na-ekwu na mmekọahụ nwere ike ime ka di na nwunye na-enwe obi ụtọ. (Ilu 5:18, 19) Ma, Baịbụl kwuru, sị: “Ka onye ọ bụla n’ime unu mara otú ọ ga-esi jide arịa nke ya n’ịdị nsọ na nsọpụrụ, ọ bụghị iji anyaukwu na-enwe agụụ mmekọahụ, ụdị nke ahụ mba ndị na-amaghị Chineke na-enwe.”—1 Tesa. 4:4, 5.

9. (a) N’afọ 1900 ruo 1930, olee otú e si nyere ndị Jehova aka ịgbaso amamihe si n’Okwu Chineke? (b) Olee ihe bara uru 1 Jọn 2:15, 16 kwuru? (ch) Dị ka e kwuru ná Ndị Rom 1:24-27, olee àgwà rụrụ arụ ndị anyị kwesịrị izere?

9 N’afọ 1900 ruo 1930, ihe ndị ‘mmehie ha na-adịkwaghị ewute’ na-eme emegharịghị ndị Jehova anya. (Efe. 4:19) Ha gbalịrị ime ihe Jehova kwuru. Ụlọ Nche May 15, 1926 kwuru na “nwoke na nwaanyị kwesịrị ịna-eche ihe dị mma ma na-eme ihe dị mma, karịchaa n’ihe gbasara nwoke na nwaanyị.” N’agbanyeghị ihe ndị mmadụ na-eme, ndị na-efe Jehova na-eme ihe Okwu Chineke kwuru, bụ́ nke ka amamihe nke ụwa mma. (Gụọ 1 Jọn 2:15, 16.) Obi dị anyị ụtọ na anyị nwere Okwu Chineke. Obi dịkwa anyị ụtọ na Jehova na-akụziri anyị ihe n’oge kwesịrị ekwesị, iji mee ka ụwa ghara iji ihe ọ na-akụzi gbasara mmekọahụ megharịa anyị anya. *Gụọ Ndị Rom 1:24-27.

OTÚ NDỊ MMADỤ SI GBANWEE OTÚ HA SI ELE ONWE HA ANYA

10-11. Gịnị ka Baịbụl kwuru ga-eme n’oge ikpeazụ?

10 Baịbụl kwuru na n’oge ikpeazụ, ndị mmadụ ga-abụ “ndị hụrụ naanị onwe ha n’anya.” (2 Tim. 3:1, 2) N’ihi ya, ọ naghị eju anyị anya na ụwa chọrọ ka ndị mmadụ na-ewere onwe ha ka ndị kacha mkpa. Otu akwụkwọ kwuru na n’agbata afọ 1970 na afọ 1979, akwụkwọ ndị na-ekwu otú mmadụ ga-esi enwe ihe ịga nke ọma ná ndụ juru ebe niile. Ụfọdụ n’ime ha kwuru na “mmadụ ekwesịghi ịgbanwe ihe ọ bụla gbasara onwe ya ma ọ bụ na-eche na o nwere ihe dị njọ n’otú ọ dị.” Dị ka ihe atụ, otu n’ime akwụkwọ ndị ahụ kwuru, sị: “Hụ onwe gị n’anya n’ihi na ị bụ asampete, ọ dịghị onye ha ka gị.” Akwụkwọ ahụ kwukwara na “mmadụ kwesịrị iji aka ya kpebie otú ọ ga-esi akpa àgwà ma mee ihe ọ bụla o chere dị ya mma o nwere ike ime.”

11 Ị̀ nụtụla ụdị okwu a? Ekwensu gwakwara Iv ka o mee ụdị ihe a. Ọ gwara ya na o nwere ike ịdị “ka Chineke, mara ihe ọma na ihe ọjọọ.” (Jen. 3:5) Taa, ọtụtụ ndị na-eche naanị gbasara onwe ha, nke na n’uche ha, e nweghị onye kwesịrị ịgwa ha ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ, ma Chineke n’onwe ya. Dị ka ihe atụ, otú ndị mmadụ si ele alụmdi na nwunye anya na-egosi na ihe a bụ eziokwu.

Onye Kraịst na-ebute ọdịmma ndị ọzọ ụzọ, karịchaa, nke di ma ọ bụ nwunye ya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 12) *

12. Olee otú ụwa si ele alụmdi na nwunye anya?

12 Baịbụl gwara ndị di na nwunye ka  ha na-akwanyere ibe ha ùgwù ma jiri nkwa ha kwere ibe ha n’ụbọchị ha gbara akwụkwọ kpọrọ ihe. Ọ gwara ha ka ha kpebisie ike na o nweghị ihe ga-eme ka ha tisaa. O kwuru, sị: ‘Nwoke ga-ahapụ nna ya na nne ya wee rapara n’ahụ́ nwunye ya, ha ga-aghọkwa otu anụ ahụ́.’ (Jen. 2:24) Ma, ndị na-eso amamihe ụwa na-ekwu ihe dị iche. Ha na-ekwu na di ma ọ bụ nwunye kwesịrị ilekwasị anya ná mkpa nke ya. Otu akwụkwọ na-ekwu gbasara ịgba alụkwaghịm kwuru, sị: “Mgbe ndị mmadụ na-agba akwụkwọ n’obodo ụfọdụ, ha na-ekwe ibe ha nkwa n’ihu ọha na ‘ọ bụ naanị ọnwụ ga-ekewa ha abụọ.’ Ma taa, ndị mmadụ agbanweela okwu ndị ahụ ha ji ekwe ibe ha nkwa ka ọ bụrụ na onye ọ bụla nweziri ike zawa aha nna ya ma ọ bụrụ na ha ahụkwaghị ibe ha n’anya.” Ihe a emeela ka ọtụtụ ezinụlọ tisaa, kpatakwara ọtụtụ ndị obi mgbawa. O doro anya na otú a ndị mmadụ si ele alụmdi na nwunye anya na-egosi na amamihe nke ụwa bụ ihe nzuzu.

13. Gịnị mere Jehova achọghị iji anya ahụ ndị mkpako?

13 Baịbụl kwuru, sị: “Onye ọ bụla nke dị nganga n’obi bụ ihe arụ n’anya Jehova.” (Ilu 16:5) Gịnị mere Jehova achọghị iji anya ahụ ndị mpako? Ihe kpatara ya bụ na ndị na-akpa àgwà a na-eme ka Setan. Chetụgodị otú Setan dịruru mpako iche na Jizọs, bụ́ onye Jehova ji kee ihe niile, kwesịrị ịkpọrọ ya isiala. (Mat. 4:8, 9; Kọl. 1:15, 16) Ndị onwe ha na-ebu isi ka Setan na-egosi n’eziokwu na amamihe nke ụwa bụ ihe nzuzu n’anya Chineke.

IHE BAỊBỤL KWURU BANYERE OTÚ ANYỊ KWESỊRỊ ISI ELE ONWE ANYỊ ANYA

14. Olee otú Ndị Rom 12:3 si enyere anyị aka ile onwe anyị anya otú kwesịrị ekwesị?

14 Baịbụl na-enyere anyị aka ile onwe anyị anya otú kwesịrị ekwesị. O kwuru na anyị kwesịrị ịhụ onwe anyị n’anya otú dị mma. Jizọs kwuru, sị: “Hụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.” Ihe a o kwuru gosiri na anyị kwesịrị ilebara mkpa anyị anya. (Mat. 19:19) Ma, Baịbụl  ekwughị na anyị kwesịrị iwere onwe anyị ka ndị ka ndị ọzọ mma. Kama, o kwuru ka anyị ‘ghara ime ihe ọ bụla n’ihi esemokwu ma ọ bụ n’ihi ịbụ ndị onwe ha na-ebu isi, kama n’ịdị nwayọọ n’obi na-ewere na ndị ọzọ ka anyị.’—Fil. 2:3; gụọ Ndị Rom 12:3.

15. Gịnị mere i ji chee na ihe Baịbụl kwuru banyere otú anyị kwesịrị isi ele onwe anyị anya bara uru?

15 Taa, ọtụtụ ndị e weere ka ndị ma ihe na-ewere ihe Baịbụl na-akụzi banyere ile onwe anyị anya otú kwesịrị ekwesị ka ihe na-abaghị uru. Ha na-ekwu na ọ bụrụ na mmadụ ewere onwe ya ka onye ka nta, ndị ọzọ ga-eleda ya anya. Ma, gịnị ka mmadụ iche na ya ka ndị ọzọ mma, bụ́ ihe ụwa Setan na-akụzi, kpatarala? Gịnị ka gịnwa chọpụtarala? Ndị na-eche naanị banyere onwe ha, hà na-enwe obi ụtọ? Ndị ezinụlọ ha, hà na-enwe obi ụtọ? Hà na-enwe ezigbo ndị enyi? Ha na Chineke hà dị n’ezigbo mma? N’ihe ndị i ji anya gị hụ, ole ndị ka enwe obi ụtọ, ọ̀ bụ ndị na-eso amamihe nke ụwa ka ọ bụ ndị na-eso amamihe Chineke nke dị na Baịbụl?

16-17. Olee ihe anyị kwesịrị ikele Chineke maka ya, n’ihi gịnịkwa?

16 Mmadụ iso ndụmọdụ ndị ụwa weere ka ndị ma ihe na-enye dị ka ebe onye furu ụzọ na-ajụ onye ọzọ furu ụzọ ajụjụ ụzọ. Jizọs kwuru banyere ndị a sị na ha ma ihe n’oge ya, sị: “Ọ bụrụkwa na onye ìsì eduo onye ìsì, ha abụọ ga-adaba n’olulu.” (Mat. 15:14) N’eziokwu, amamihe nke ụwa a bụ ihe nzuzu n’ebe Chineke nọ.

Obi na-atọ ndị ohu Jehova ụtọ ma ha cheta ihe ndị ha merela n’ozi Jehova (A ga-akọwa ya na paragraf nke 17) *

17 Kemgbe ụwa, ihe Baịbụl kwuru “bara uru iji ya zie ihe, iji ya dọọ mmadụ aka ná ntị, iji ya mee ka ihe guzozie, na iji ya nye ọzụzụ n’ezi omume.” (2 Tim. 3:16) Obi dị anyị ezigbo ụtọ na Jehova ji nzukọ ya na-eme ka ụwa ghara iji amamihe ya na-emegharị anyị anya. (Efe. 4:14) Ihe Jehova na-akụziri anyị na-eme ka anyị na-eme ihe Okwu ya kwuru. Anyị na-ekele Jehova na o nyere anyị amamihe kacha mma na nduzi dị n’Okwu ya bụ́ Baịbụl.

ABỤ 54 “Lekwa Ụzọ”

^ par. 5 Isiokwu a ga-eme ka anyị kwetasikwuo ike na ọ bụ naanị Jehova kwesịrị ịgwa anyị otú anyị ga-esi ebi ndụ. Ọ ga-emekwa ka anyị mata na mmadụ iso amamihe nke ụwa a ga-akpatara ya ezigbo nsogbu, ma iso amamihe si n’Okwu Chineke ga-abara anyị uru.

^ par. 9 Dị ka ihe atụ, gụọ akwụkwọ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 1, isi nke 24-26 na Nke 2, isi 4-5.

^ par. 50 NKỌWA FOTO: Ebe otu di na nwunye na-echeta ụfọdụ ihe merela ná ndụ ha. Ebe di na nwunye ahụ na-ezi ozi ọma n’ihe dị ka afọ 1968.

^ par. 52 NKỌWA FOTO: Ebe nwanna ahụ na-enye nwunye ya onyinye n’otu oge ọ nọ n’ụlọ ọgwụ n’agbata afọ 1981 na 1989, obere nwa ha nwaanyị nọkwa na-ele ihe na-emenụ.

^ par. 54 NKỌWA FOTO: Ka ọ dị ugbu a, di na nwunye a ji obi ụtọ na-echeta otú ha si jiri ndụ ha jeere Jehova ozi. Nwa ha nwaanyị ahụ na ndị ezinụlọ ya sokwa ha na-enwe obi ụtọ.