Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Họrọ asụsụ Igbo

Ịdị Mma, Olee Otú Anyị Nwere Ike Isi Mụta Ya?

Ịdị Mma, Olee Otú Anyị Nwere Ike Isi Mụta Ya?

ANYỊ niile chọrọ ka ndị mmadụ were anyị ka ezigbo mmadụ. Ma, ịbụ ezigbo mmadụ taa anaghị adịcha mfe. Otu ihe kpatara ya bụ na ndị mmadụ bụ “ndị na-adịghị ahụ ezi ihe n’anya.” (2 Tim. 3:3) O nwere ike ịbụ na ha ji aka ha na-ekpebiri onwe ha ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ, ya emee ka ha na-ekwu na “ihe ọma bụ ihe ọjọọ, na ihe ọjọọ bụ ihe ọma.” (Aịza. 5:20) O nwekwara ike isiri anyị ike ịbụ ezigbo mmadụ n’ihi na anyị ezughị okè ma ọ bụ n’ihi otú ihe ndị anyị mere n’oge ndị gara aga si kpaa anyị aka ọjọọ. N’ihi ya, o nwere ike ịdị anyị otú ọ dị otu nwanna nwaanyị ferela Jehova ọtụtụ afọ. O kwuru, sị: “O siiri m ezigbo ike ikweta na m ga-abụli ezigbo mmadụ.”

Obi dị anyị ụtọ ịmata na anyị niile nwere ike ịbụ ezigbo mmadụ. Ịdị mma so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ. Mmụọ nsọ dị ike karịa ihe ọ bụla nwere ike ime ka o siere anyị ike ịbụ ezigbo mmadụ. Ka anyị mụọ gbasara ịdị mma nakwa otú anyị nwere ike isi na-akpa àgwà a.

GỊNỊ BỤ ỊDỊ MMA?

Ịdị mma pụtara mmadụ ịbụ ezigbo mmadụ ma ọ bụ ịna-akpa ezi àgwà. Onye bụ́ ezigbo mmadụ na-achọkarị ụzọ ọ ga-esi na-enyere ndị ọzọ aka ma na-emere ha ihe ọma.

Ọ ga-abụ na ị hụla na ụfọdụ ndị na-emere ndị ezinụlọ ha ma ọ bụ ndị enyi ha ihe ọma, ma nke ahụ emeghị ka ha bụrụ ezigbo mmadụ n’anya Jehova. Ma nke bụ́ eziokwu bụ na o nweghị onye n’ime anyị nwere ike ime ihe ọma mgbe niile n’ihi na Baịbụl kwuru na “e nweghị onye ezi omume n’ụwa nke na-eme naanị ezi ihe, nke na-adịghịkwa emehie.” (Ekli. 7:20) Pọl onyeozi ji obi ya niile kwuo, sị: “Amaara m na ọ dịghị ezi ihe bi n’ime m, ya bụ, n’anụ ahụ́ m.” (Rom 7:18) N’ihi ya, o doro anya na anyị chọọ ịbụ ezigbo mmadụ, anyị ga-amụta ya n’aka Jehova n’ihi na ọ bụ ya ka ịdị mma si n’aka.

“JEHOVA DỊ MMA”

Ọ bụ Jehova na-ekpebi ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ. Baịbụl kwuru gbasara ya, sị: “Ị dị mma, ị na-emekwa ihe ọma. Kụziere m ụkpụrụ gị.” (Ọma 119:68) Ka anyị tụlee ihe abụọ amaokwu a kwuru gosiri na Jehova dị mma.

Jehova dị mma. Jehova dị ezigbo mma nke na o mekataghị mee ihe na-adịghị mma. Àgwà ya ndị ọzọ gosiri na ọ dị mma. Ka anyị tụlee ihe mere mgbe Jehova gwara Mozis, sị: “Mụ onwe m ga-eme ka ịdị mma m dum gabiga n’ihu gị.” Jehova gosiri Mozis ebube ya, ma ịdị mma ya. Mozis nụrụ olu kwuru gbasara Jehova, sị: “Jehova, Jehova, Chineke nke na-eme ebere, na-emekwa amara, onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, onye obiọma ya na eziokwu ya dị ukwuu, onye na-eme ka obiọma ya ruoro ọtụtụ puku ọgbọ, na-agbaghara njehie na mmebi iwu na mmehie, ma ọ gaghị anwa anwa hapụ inye ntaramahụhụ.” (Ọpụ. 33:19; 34:6, 7) Ihe a mere ka o doo anya na Jehova dị mma n’ụzọ niile. N’agbanyeghị na Jizọs dị mma otú mmadụ nwere ike ịdị, o kwuru, sị: “Ọ dịghị onye bụ́ ezi onye, ma e wezụga otu onye, ya bụ, Chineke.”—Luk 18:19.

Ihe ndị Chineke kere na-egosi anyị na Jehova dị mma

Jehova na-eme ihe ọma. Ihe niile Jehova na-eme gosiri na ọ dị mma. Baịbụl kwuru, sị: “Jehova dị mma n’ebe ihe niile o kere eke nọ, ebere ya na-erutekwa ọrụ ya niile.” (Ọma 145:9) N’ihi na Jehova dị mma ma na-emeso mmadụ niile ihe n’ụzọ dị mma,  ọ na-enye ha ndụ, na-enyekwa ha ihe ndị ga-eme ka ha dịrị ndụ. (Ọrụ 14:17) Ihe ọzọ na-egosi na ọ dị mma bụ na ọ na-agbaghara anyị mmehie. Otu ọbụ abụ kwuru, sị: “Gị onwe gị, Jehova, dị mma, dịkwa njikere ịgbaghara mmehie.” (Ọma 86:5) Obi kwesịrị isi anyị ike na “Jehova agaghị ajụ inye ndị na-eje ije n’enweghị ntụpọ ihe ọ bụla bụ́ ihe ọma.”—Ọma 84:11.

‘MỤTA IME IHE ỌMA’

Chineke kere anyị n’onyinyo ya. N’ihi ya, anyị nwere ike ịbụ ezigbo mmadụ ma na-eme ihe ọma. (Jen. 1:27) Ma Okwu Chineke gbara anyị ume ka anyị ‘mụta ime ihe ọma.’ (Aịza. 1:17) Olee otú anyị nwere ike isi mụta ime ihe ọma? Ka anyị tụlee ụzọ atọ anyị nwere ike isi mụta ya.

Nke mbụ, anyị kwesịrị ịrịọ Chineke ka o nye anyị mmụọ nsọ ya. Mmụọ nsọ nwere ike inyere Ndị Kraịst aka ịbụ ezigbo mmadụ n’anya Chineke. (Gal. 5:22) Mmụọ nsọ Chineke nwekwara ike inyere anyị aka ịhụ ezi ihe n’anya na ịkpọ ihe ọjọọ asị. (Rom 12:9) Baịbụl kwuru na Jehova nwere ike ime ka anyị “guzosie ike n’omume ọma niile nakwa n’okwu ọma niile.”—2 Tesa. 2:16, 17.

Nke abụọ, anyị kwesịrị ịna-agụ Okwu Chineke. Ọ bụrụ na anyị ana-agụ Okwu Chineke, Jehova ga-akụziri anyị “ụzọ dum nke ihe dị mma.” (Ilu 2:9; 2 Tim. 3:17) Obi anyị yiri igbe e ji etinye akụ̀ dị oké ọnụ ahịa. Mgbe anyị na-amụ Baịbụl ma na-atụgharị uche na ya, anyị na-etinye ihe ọma n’obi anyị nke e nwere ike iji tụnyere itinye ihe ndị dị oké ọnụ ahịa n’igbe e ji etinye akụ̀ dị oké ọnụ ahịa. Ihe ndị anyị tinyere n’obi anyị nwere ike ịbara anyị uru n’ọdịnihu.—Luk 6:45; Efe. 5:9.

Nke atọ, anyị kwesịrị ịgbalịsi ike “na-eṅomi ihe ọma.” (3 Jọn 11) Anyị nwere ike ịhụ ndị anyị ga-eṅomi na Baịbụl. Ndị kachanụ anyị ga-eṅomi bụ Jehova na Jizọs. Anyị nwekwara ike iṅomi ndị ọzọ a maara ka ndị na-eme ihe ọma. Mmadụ abụọ nwere ike ịgbata anyị n’obi bụ Tabita na Banabas. (Ọrụ 9:36; 11:22-24) I nwere ike ịmụta ihe n’aka ha ma ị mụọ ihe Baịbụl kwuru banyere ha. Mgbe ị na-amụ ya, chọpụta ihe ndị ha mere iji nyere ndị ọzọ aka. Chee banyere ihe ndị i nwere ike ime iji nyere ụfọdụ ndị aka n’ezinụlọ gị ma ọ bụ n’ọgbakọ. Chetakwa uru Tabita na Banabas ritere n’ihi na ha meere ndị mmadụ ihe ọma. Gịnwa nwekwara ike irite uru otú ahụ ha ritere.

Anyị nwekwara ike iche gbasara ụfọdụ ndị n’oge a na-eme ihe dị mma. Dị ka ihe atụ, chee gbasara ndị okenye na-arụsi ọrụ ike, bụ́ ndị “hụrụ ezi ihe n’anya.” Cheekwa gbasara ụmụnna nwaanyị ndị si ma n’okwu ma n’omume ha gosi na ha bụ “ndị na-akụzi ihe dị mma.” (Taị. 1:8; 2:3) Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Roslyn kwuru, sị: “Enyi m na-agbalịsi ike inyere ndị nọ n’ọgbakọ aka na ịgba  ha ume. Ọ na-eche banyere ọnọdụ ha, mgbe ụfọdụ, ọ na-enye ha obere onyinye ma ọ bụ si n’ụzọ ndị ọzọ nyere ha aka. M na-ewere ya ka ezigbo mmadụ.”

Jehova na-agba ndị ya ume ka ha ‘chọọ ezi ihe.’ (Emọs 5:14) Ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ, ọ ga-eme ka anyị jiri ihe Jehova kwuru na o ziri ezi kpọrọ ihe, meekwa ka anyị kpebisikwuo ike ime ihe dị mma.

Anyị na-agbalị ka anyị bụrụ ezigbo mmadụ ma na-eme ihe ọma

Anyị ekwesịghị iche na ọ gwụla mgbe anyị meere ndị mmadụ ihe buru ibu ma ọ bụ nye ha ihe ndị dara oké ọnụ ka anyị meere ha ihe ọma. Dị ka ihe atụ, ka ihe anyị kụrụ nwee ike ito, anyị agaghị agba ya mmiri buru ibu otu ugboro. Kama, anyị ga na-agba ya mmiri ntakịrị ntakịrị ọtụtụ ugboro. Otú ahụkwa ka ọ dị imere ndị mmadụ ihe. Ọ bụrụ na anyị ana-emere ndị mmadụ obere ihe ọtụtụ ugboro, ọ ga-egosi na anyị bụ ezigbo mmadụ.

Baịbụl gbara anyị ume ka anyị bụrụ ndị “a kwadebere” na ndị “dị njikere” imere ndị mmadụ ihe ọma. (2 Tim. 2:21; Taị. 3:1) Ọ bụrụ na anyị ana-eche gbasara ihe ha na ndị mmadụ na-alụ, anyị nwere ike ịhụ ụzọ ndị anyị ga-esi enyere onye agbata obi anyị aka “n’ihe dị mma maka iwuli ya elu.” (Rom 15:2) Anyị nwere ike inye ya ihe anyị nwere. (Ilu 3:27) Dị ka ihe atụ, anyị nwere ike ịkpọ mmadụ ka ọ bịa rie nri na nke anyị ma ọ bụkwanụ ka anyị na ya nọrịa iji gbarịta ibe anyị ume. Ọ bụrụ na mmadụ na-arịa ọrịa, anyị nwere ike gaa leta ya ma ọ bụ kpọọ ya n’ekwentị. Anyị nwekwara ike ịchọpụta ụzọ ndị anyị nwere ike isi gwa ndị ọzọ “okwu dị mma maka iwuli elu dị ka ọ pụrụ ịdị mkpa, ka o wee mee ka ndị na-anụ ya nweta ihe dị mma.”—Efe. 4:29.

Anyị kwesịrị ịchọ ụzọ ndị anyị ga-esi na-emere mmadụ niile ihe ọma otú ahụ Jehova na-eme. N’ihi ya, otú anyị si emeso onye ukwu ka anyị kwesịrị isi emeso onye nta. Otu ụzọ anyị nwere ike isi eme ya bụ ikwusara mmadụ niile ozi ọma Alaeze Chineke. Anyị na-agbalị ime ihe Jizọs nyere anyị n’iwu, ya bụ, ka anyị na-emere ma ndị kpọrọ anyị asị ihe ọma. (Luk 6:27) Ọ dịghị njọ imere ndị mmadụ ihe ọma, n’ihi na “ọ dịghị iwu na-emegide ihe ndị dị otú a.” (Gal. 5:22, 23) Ọ bụrụ na anyị ana-emere ndị mmadụ ihe ọma n’agbanyeghị na a na-emegide anyị ma ọ bụ na anyị nwere nsogbu, o nwere ike ime ka ndị mmadụ bata n’ọgbakọ ma mee ka e too Chineke.—1 Pita 3:16, 17.

URU ANYỊ NA-ERITE MA ANYỊ NA-EME IHE ỌMA

Baịbụl kwuru na “ọ bụ ihe si n’omume ezi mmadụ pụta ga-eju ya afọ.” (Ilu 14:14) Olee uru ụfọdụ anyị na-erite ma anyị meere ndị mmadụ ihe ọma? Ọ bụrụ na anyị emeere ndị mmadụ ihe ọma, hanwa nwekwara ike imeso anyị ihe otú dị mma. (Ilu 14:22) Ọ bụrụgodị na ha emesoghị anyị ihe otú dị mma, anyị kwesịrị ịna-emere ha ihe ọma n’ihi na o nwere ike ime ka ha gbanwee obi ha ma mesowe anyị ihe otú dị mma.—Rom 12:20.

Ọ bụrụ na anyị ana-eme ihe ọma ma na-agbara ihe ọjọọ ọsọ, ọ ga-abara anyị uru. Ọtụtụ ụmụnna ekwuola na ime otú ahụ abaarala ha uru. Ka anyị tụlee gbasara otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Nancy. O kwuru, sị: “Mgbe m na-etolite, m na-eme aghara, na-eme omume rụrụ arụ, na-akparịkwa ndị mmadụ. Ma, mgbe m mụtara ihe Chineke kwuru bụ́ ihe ọma ma na-eme ya eme, m malitere inwekwu obi ụtọ. Ugbu a, ndị mmadụ na-akwanyere m ùgwù.”

Ihe kachanụ mere anyị ji kwesị ịmụta ịna-emere ndị mmadụ ihe ọma bụ na ọ na-eme ka obi na-atọ Jehova ụtọ. Ọ bụrụgodị na ọtụtụ ndị anaghị ahụ ihe anyị na-eme, Jehova na-ahụ. Ọ ma mgbe ọ bụla anyị meere ndị mmadụ ihe ọma ma na-eche echiche dị mma. (Efe. 6:7, 8) Olee otú o si agọzi anyị? Baịbụl kwuru, sị: “Onye bụ́ ezi mmadụ na-enweta ihu ọma Jehova.” (Ilu 12:2) N’ihi ya, ka anyị nọgide na-amụta otú anyị ga-esi na-emere ndị mmadụ ihe ọma. Jehova kwere nkwa na “ebube na nsọpụrụ na udo ga-adịrị onye ọ bụla na-eme ezi ihe.”—Rom 2:10.