Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Họrọ asụsụ Igbo

 ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ 10

Gịnị Na-egbochi Ime M Baptizim?

Gịnị Na-egbochi Ime M Baptizim?

“Ha abụọ banyekwara n’ime mmiri ahụ, ma Filip ma ọnaozi ahụ; o wee mee ya baptizim.”—ỌRỤ 8:38.

ABỤ 52 Ndị Kraịst Nyefere Chineke Onwe Ha

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Olee ihe Adam na Iv tụfuru, oleekwa ihe ọ kpatara?

ÒNYE ka i chere kwesịrị ikpebi ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ? Mgbe Adam na Iv riri mkpụrụ si n’osisi ịma ihe ọma na ihe ọjọọ, ha mere ka otú ha si ele Jehova na iwu ya anya doo anya. Ha gosiri na ha ejighị Jehova na iwu ya kpọrọ ihe. Ha họọrọ iji aka ha ekpebiri onwe ha ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ. (Jen. 3:22) Ma, chegodị banyere ihe ndị ha tụfuru. Ha na Jehova abụghịzi enyi. Ha tụfuru ohere ha nwere ịdị ndụ ebighị ebi, meekwa ka ụmụ ha bụrụ ndị mmehie ma na-anwụ anwụ. (Rom 5:12) Ihe ahụ Adam na Iv mere mere ka ndị mmadụ na-atagbu onwe ha n’ahụhụ.

Mgbe ọnaozi Itiopia ahụ kweere na Jizọs, ọ chọrọ ka e mee ya baptizim ozugbo (A ga-akọwa ya na paragraf nke 2 na nke 3)

2-3. (a) Gịnị ka ọnaozi Itiopia ahụ mere mgbe Filip ziri ya ozi ọma? (b) Olee ngọzi ndị anyị na-enweta ma anyị mee baptizim, oleekwa ajụjụ ndị anyị ga-aza?

2 Jiri ihe Adam na Iv mere tụnyere ihe ọnaozi Itiopia ahụ mere mgbe Filip ziri ya ozi ọma. Ihe Jehova na Jizọs meere ọnaozi ahụ tọrọ ya ụtọ nke na o mere baptizim ozugbo. (Ọrụ 8:34-38) Anyị nyefee Jehova onwe anyị, e mee anyị baptizim otú ahụ e mere ọnaozi ahụ, anyị na-egosi na obi dị anyị ụtọ maka ihe Jehova na Jizọs meere anyị. Anyị na-egosikwa na anyị tụkwasịrị Jehova obi, nakwa na anyị ma na ọ bụ ya kwesịrị ikpebi ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ.

3 Chegodị banyere ngọzi ndị anyị na-enweta ma anyị na-efe Jehova. Otu n’ime ha bụ na Jehova ga-enye anyị ihe niile Adam na Iv tụfuru, ma ohere ịdị ndụ ebighị  ebi. Ebe anyị nwere okwukwe na Jizọs Kraịst, Jehova na-agbaghara anyị mmehie anyị ma mee ka anyị na-enwe akọnuche dị ọcha. (Mat. 20:28; Ọrụ 10:43) Anyị esorola n’ezinụlọ nke ndị ohu Jehova kwesịrị ntụkwasị obi ma nwee olileanya magburu onwe ya n’ọdịnihu. (Jọn 10:14-16; Rom 8:20, 21) N’agbanyeghị ihe ọma ndị a, ụfọdụ ndị matarala Jehova na-egbu oge ime ihe ọnaozi Itiopia ahụ mere. Gịnị nwere ike ịna-egbochi ha ime baptizim? Olee otú ha ga-esi emeri nsogbu ndị ahụ?

NSOGBU NDỊ NA-EGBOCHI ỤFỌDỤ IME BAPTIZIM

Ihe ụfọdụ na-eme ka o siere ụfọdụ ndị ike ime baptizim

Enweghị obi ike (A ga-akọwa ya na paragraf nke 4 na nke 5) *

4-5. Olee nsogbu Avery na Hannah nwere?

4 Enweghị obi ike. Nne na nna otu nwa okorobịa aha ya bụ Avery bụ Ndịàmà Jehova. A ma papa ya ama ka ezigbo nna na okenye ji ọrụ ya kpọrọ ihe. N’agbanyeghị nke ahụ, Avery na-egbu oge ime baptizim. Maka gịnị? O kwuru, sị: “Echere m na agaghị m akpali àgwà ka papa m.” Avery chekwara na ya agaghị arụli ọrụ ndị e nwere ike inye ya n’ọdịnihu. O kwukwara, sị: “Echegburu m onwe m banyere ikpe ekpere n’ihu ọha, ikwu okwu n’ọmụmụ ihe ma ọ bụ iduru ìgwè ozi ubi gaa ozi ọma.”

5 Otu nwa agbọghọ dị afọ iri na asatọ aha ya bụ Hannah anaghị enweli obi ike. Nne na nna ya bụ Ndịàmà Jehova. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ na-eche na ya agaghị emeli ihe Jehova chọrọ ma e mee ya baptizim. N’ihi gịnị? Ọ na-eche na o nweghị ihe ya dị mma ya. Mgbe ụfọdụ, obi na-ajọ ya njọ nke na ọ na-ama ụma emerụ onwe ya ahụ́. Ihe a ọ na-eme onwe ya na-eme ka ihe ka njọ. O kwuru, sị: “O nweghị onye m gwara ihe m mere, ma ndị mụrụ m. Echere m na Jehova agaghị achọ ka m bụrụ ohu ya, n’ihi ihe m na-eme onwe m.”

Ndị enyi ọjọọ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 6) *

6. Gịnị gbochiri Vanessa ime baptizim?

6 Ndị enyi ọjọọ. Otu nwa agbọghọ dị afọ iri abụọ na abụọ aha ya bụ Vanessa kwuru, sị: “Enwere m ezigbo enyi mụ na ya ma kemgbe ihe fọrọ obere ka o ruo afọ iri.” Ma enyi Vanessa anaghị enyere ya aka ime baptizim o bu n’obi ime. Ihe a wutere Vanessa, ya ekwuo, sị: “Ọ na-esiri m ike inweta ndị enyi, m nọ na-echegbu onwe m na ọ bụrụ na m hapụ enyi m nwaanyị a, agaghị m enwe enyi ọzọ.”

Ụjọ imejọ ihe (A ga-akọwa ya na paragraf nke 7) *

7. Olee ihe tụrụ Makayla ụjọ, n’ihi gịnịkwa?

7 Ụjọ imejọ ihe. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Makayla dị afọ ise mgbe a chụrụ nwanne ya nwoke n’ọgbakọ. Ka ọ na-etolite, ọ hụrụ otú obi si gbawaa ndị mụrụ ya n’ihi nwanne ya nwoke a chụrụ n’ọgbakọ. O kwuru, sị: “Ụjọ tụrụ m na  e mee m baptizim, m ga-eme ihe ọjọọ, a chụọ m n’ọgbakọ, ya emee ka obi gbawakwuo ndị mụrụ m.”

Ụjọ mmegide (A ga-akọwa ya na paragraf nke 8) *

8. Olee ihe tụrụ Miles ụjọ?

8 Ụjọ mmegide. Nna nwa okorobịa aha ya bụ Miles na nwunye nna ya bụ Ndịàmà Jehova, ma mama Miles abụghị. Miles kwuru, sị: “Mụ na mama m biri afọ iri na asatọ, m na-atụkwa ụjọ ịgwa ya na m chọrọ ime baptizim. M hụrụ ihe o mere mgbe papa m ghọrọ Onyeàmà Jehova. Ụjọ na-atụ m na ọ ga-emegide m.”

OLEE OTÚ Ị GA-ESI EMERI IHE NDỊ NA-EGBOCHI GỊ IME BAPTIZIM?

9. Olee ihe nwere ike ime ma ị mata na Jehova hụrụ anyị n’anya ma na-enwe ndidi?

9 Adam na Iv efeghị Jehova n’ihi na ha ejighị obi ha niile hụ ya n’anya. N’agbanyeghị nke ahụ, Jehova hapụrụ ha ka ha dịrị ndụ ruo mgbe ha mụtara ụmụ ma jiri aka ha kpebie otú ha ga-esi azụ ha. N’oge na-adịghị anya, nsogbu mkpebi ha mere iji aka ha atụrụ onwe ha ụka kpataara ha mere ka o doo anya na ha zuzuru nzuzu. Nwa mbụ ha gburu nwanne ya na-enweghị ihe o mere ya. Ka oge na-agakwa, ihe e ji mara ọtụtụ ndị bi n’ụwa bụ ime ihe ike na ịchọ ihe ga-abara naanị onwe ha uru. (Jen. 4:8; 6:11-13) Ma, e nwere ihe Chineke ga-eme iji napụta ụmụ Adam na Iv niile chọrọ ife ya. (Jọn 6:38-40, 57, 58) Ka ị na-amụkwu gbasara otú Jehova si enwe ndidi ma hụ anyị n’anya, i nwere ike ịhụkwu ya n’anya. Ị gaghị achọ ime ihe Adam na Iv mere, kama ị ga-enyefe Jehova onwe gị.

Ihe ị ga-eme ka i merie ha

(A ga-akọwa ya na paragraf nke 9 na nke 10) *

10. Olee otú ichebara ihe Abụ Ọma 19:7 kwuru echiche ga-esi enyere gi aka ịna-efe Jehova?

10 Na-amụ gbasara Jehova. Ka ị na-amụkwu gbasara Jehova, obi ga-esikwu gị ike na ị ga-efeli ya. Avery anyị kwuburu okwu ya sịrị: “Ịgụ Abụ Ọma 19:7 na ichebara ya echiche mere ka m nwekwuo obi ike.” (Gụọ ya.) Mgbe Avery hụrụ otú Jehova si meere ya ihe e kwuru n’amaokwu ahụ, ọ bịara hụkwuo Jehova n’anya. Ịhụnanya anyị nwere n’ebe Jehova nọ na-eme ka anyị nwee  obi ike, na-enyekwara anyị aka izere ihe ndị ọ kpọrọ asị ma na-eme ka anyị chọọ ife ya. Hannah anyị kwuburu okwu ya kwuru, sị: “Ịmụ Baịbụl mere ka m ghọta na ọ na-ewute Jehova ma m merụọ onwe m ahụ́.” (1 Pita 5:7) Hannah ghọrọ ‘onye na-eme okwu Chineke.’ (Jems 1:22) Olee uru ọ baara ya? O kwuru, sị: “Mgbe m hụrụ uru ime ihe Jehova kwuru baara m, m bịara hụkwuo ya n’anya. Ugbu a, obi siri m ike na Jehova ga na-eduzi m mgbe ọ bụla m chọrọ ka o nyere m aka.” Hannah kwụsịrị imerụ onwe ya ahụ́. O nyefere Jehova onwe ya, e meekwa ya baptizim.

(A ga-akọwa ya na paragraf nke 11) *

11. Olee ihe Vanessa mere iji mete ezi ndị enyi, oleekwa ihe anyị nwere ike ịmụta na ya?

11 Saa anya ná mmiri họrọ ndị enyi. Vanessa anyị kwuburu okwu ya mechara ghọta na ọ bụ enyi ya na-egbochi ya ife Jehova. N’ihi ya, ya na ya kwụsịrị ịna-akpa. Ma, e nwere ihe ọzọ o mere. Ọ gbara ezigbo mbọ nweta ndị enyi ọhụrụ n’ọgbakọ. O kwuru na ihe Noa na ndị ezinụlọ ya mere nyeere ya aka. O kwuru, sị: “Ndị gbara ha gburugburu ahụghị Jehova n’anya, ma ha na ibe ha dị ná mma.” Mgbe Vanessa mechara baptizim, ọ ghọrọ ọsụ ụzọ. O kwuziri, sị: “Ihe a mere ka m mete ndị nọ n’ọgbakọ anyị nakwa ndị nọ n’ọgbakọ ọzọ enyi.” Gịnwa nwekwara ike imete ezigbo ndị enyi ma ị na-eme ihe ndị i nwere ike ime n’ozi Jehova gwara anyị ka anyị jeere ya.—Mat. 24:14.

(A ga-akọwa ya na paragraf nke 12 ruo nke 15) *

12. Olee ụdị ụjọ Adam na Iv na-enweghị, oleekwa ihe ọ kpataara ha?

12 Atụla ụjọ na-enweghị isi. E nwere ụdị ụjọ dị mma. Dị ka ihe atụ, anyị kwesịrị ịtụ ụjọ ime ihe ga-ewe Jehova iwe. (Ọma 111:10) Ọ bụrụ na Adam na Iv tụrụ ụdị ụjọ a, ha agaraghị enupụrụ Jehova isi. Ma, ha nupụụrụ ya isi. Mgbe ha nupụchaara Jehova isi, anya ha mepere, ya bụ na ọ bịara doo ha anya na ha bụzi ndị mmehie. Naanị ihe ha ga-emeli bụ ibufere ụmụ ha mmehie na ọnwụ. Ebe ọ bụ na anya ha emepeela, ihere mewere ha n’ihi na ha gba ọtọ, ha ewere ihe kpuchie onwe ha.—Jen. 3:7, 21.

13-14. (a) Olee ihe 1 Pita 3:21 kwuru mere na anyị ekwesịghị ịtụ ụjọ ọnwụ? (b) Gịnị mere anyị kwesịrị iji hụ Jehova n’anya?

 13 Ọ bụ eziokwu na anyị kwesịrị ịtụ ụjọ imejọ Jehova, ma anyị ekwesịghị ịtụ ụjọ ọnwụ. Jehova emeela ka anyị nwee ohere ịdị ndụ ebighị ebi. Ọ bụrụ na anyị emehie ma jiri obi anyị niile chegharịa, Jehova ga-agbaghara anyị. Ọ ga-agbaghara anyị n’ihi na anyị nwere okwukwe n’àjà Ọkpara ya chụrụ iji gbapụta anyị. Otu ụzọ kacha mkpa anyị ga-esi gosi na anyị nwere okwukwe bụ inyefe Jehova onwe anyị, e mee anyị baptizim.—Gụọ 1 Pita 3:21.

14 E nwere ọtụtụ ihe mere anyị ji kwesị ịhụ Jehova n’anya. Ọ na-enye anyị ihe ndị na-eme anyị obi ụtọ kwa ụbọchị, na-akụzikwara anyị ihe ndị bụ́ eziokwu gbasara onwe ya na nzube ya. (Jọn 8:31, 32) O nyere anyị ọgbakọ ya ka ọ na-eduzi anyị ma na-enyere anyị aka. Ọ na-enyere anyị aka idi nsogbu ndị anyị nwere ugbu a. O mekwara ka anyị nwee olileanya ịdị ndụ ebighị ebi mgbe ọ ga-eme ka ihe niile dị mma n’ọdịnihu. (Ọma 68:19; Mkpu. 21:3, 4) Ọ bụrụ na anyị echee banyere ihe ndị Jehova merela anyị iji gosi na ọ hụrụ anyị n’anya, anyị ga-ahụkwu ya n’anya. Ọ bụrụkwa na anyị ahụ Jehova n’anya, anyị ga-amụta ịtụ ụjọ kwesịrị ekwesị. Anyị ga-atụ ụjọ imejọ Onye anyị ji obi anyị niile hụ n’anya.

15. Olee otú Makayla si kwụsị ịtụ ụjọ na ya ga-eme ihe ọjọọ ma e mechaa ya baptizim?

15 Makayla anyị kwuburu gbasara ya kwụsịrị ịtụ ụjọ na ya ga-eme ihe ọjọọ ma e mechaa ya baptizim, mgbe ọ ghọtara na Jehova na-agbaghara mmehie. O kwuru, sị: “M ghọtara na anyị niile ezughị okè nakwa na anyị niile na-emejọ ihe. M ghọtakwara na Jehova hụrụ anyị n’anya nakwa na ọ ga-agbaghara anyị n’ihi àjà Jizọs chụrụ.” Otú o si hụ Jehova n’anya mere ka o nyefee Jehova onwe ya ma mee baptizim.

(A ga-akọwa ya na paragraf nke 16) *

16. Olee otú e si nyere Miles aka ịkwụsị ịtụ ụjọ na mama ya agaghị ekwe ya mee baptizim?

16 Miles, onye na-atụbu ụjọ na mama ya ga-emegide ya ma ọ chọọ ime baptizim, mechara gakwuru onye nlekọta sekit ka o nyere ya aka. O kwuru, sị: “Papa onye nlekọta sekit ahụ bụ Onyeàmà Jehova, ma mama ya abụghị. O nyeere m aka iche ihe m nwere ike ịgwa mama m ka ọ ghọta na ọ bụ m ji aka m kpebie ime baptizim, na ọ bụghị papa m na-amanye m.” Obi adịghị mama Miles ụtọ n’ihi mkpebi a o mere. Miles mechara kwapụ n’ụlọ ha. Ma, o kpebisiri ike ime baptizim. O kwuru, sị: “Ịmụta ihe ọma ndị Jehova meere m metụrụ m n’obi. Mgbe m chebaara àjà Jizọs ji ndụ ya chụọ echiche, m chọpụtara na Jehova hụrụ m n’anya nke ukwuu. Ihe a mere ka m nyefee Jehova onwe m, e meekwa m baptizim.”

 NỌGIDE NÁ MKPEBI I MERE

Anyị nwere ike igosi na obi dị anyị ụtọ maka ihe Chineke meere anyị (A ga-akọwa ya na paragraf nke 17)

17. Olee ohere anyị nwere?

17 Mgbe Iv riri mkpụrụ osisi ahụ n’Iden, o gosiri na ọ jụrụ Nna ya. Mgbe Adam sooro ya nupụrụ Jehova isi, o gosiri na obi adịghị ya ụtọ maka ihe ọma niile Jehova meere ya. Anyị niile nwere ohere igosi na anyị adịghị ka Adam na Iv. Obi dị anyị ụtọ maka ihe niile Jehova na-emere anyị. Ọ bụrụ na anyị emee baptizim, anyị na-egosi Jehova na anyị kwetara na ọ bụ ya nwere ikike ikpebiri anyị ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ. Ọ na-egosikwa na anyị hụrụ ya n’anya ma tụkwasị ya obi.

18. Olee ihe ị ga-eme ka i nwee ike ịnọgide na-efe Jehova?

18 Anyị mechaa baptizim, anyị kwesịkwara ịnọgide na-eme ihe Jehova chọrọ, ọ bụghị ihe anyịnwa chọrọ. Ọtụtụ nde ndị na-efe Jehova na-eme otú ahụ taa. I nwekwara ike ime ka ha ma ọ bụrụ na ị nọgide na-amụtakwu ihe Okwu Chineke kwuru, na-agachi ọmụmụ ihe anya, jirikwa ịnụ ọkụ n’obi na-akọrọ ndị ọzọ ihe ị mụtara banyere Nna gị hụrụ gị n’anya. (Hib. 10:24, 25) Mgbe ọ bụla ị chọrọ ime mkpebi, gee ntị n’ihe Jehova si n’Okwu ya na nzukọ ya na-agwa gị. (Aịza. 30:21) I mee otú ahụ, ihe niile ị na-eme ga-aga nke ọma.—Ilu 16:3, 20.

19. Olee ihe i kwesịrị ịnọgide na-echeta, n’ihi gịnịkwa?

19 Ọ bụrụ na ị nọgide na-achọpụta uru ndị ị na-erite n’ihi na ị na-eme ihe Jehova kwuru, ọ ga-eme ka ị hụkwuo ya n’anya ma jirikwuo iwu ya kpọrọ ihe. Mgbe ahụ, mbọ ọ bụla Setan na-agba ime ka ị kwụsị ife Jehova ga-akụ afọ n’ala. Weregodị ya na ị dị ndụ ihe dị ka otu puku afọ na-abịa abịa. Ị ga-echeta na mkpebi i mere ka e mee gị baptizim bụ mkpebi kacha mma i metụrụla ná ndụ gị.

ABỤ 28 Ịbụ Enyi Jehova

^ para. 5 Mkpebi kacha mkpa ị ga-eme ná ndụ gị bụ ma ị̀ ga-eme baptizim ma ọ bụ na ị gaghị eme. Gịnị mere mkpebi a ji dị mkpa? Anyị ga-aza ajụjụ a n’isiokwu a. Ọ ga-enyere ndị na-eche echiche ime baptizim aka imeri nsogbu ndị na-egbochi ha ime baptizim.

^ para. 56 NKỌWA FOTO: Enweghị Obi Ike: Ebe ụjọ na-atụ otu nwa okorobịa ịza ajụjụ n’ọmụmụ ihe.

^ para. 58 NKỌWA FOTO: Ndị Enyi Ọjọọ: Ebe ihere na-eme otu nwa agbọghọ bụ́ Onyeàmà Jehova mgbe ọ hụrụ Ndịàmà Jehova ibe ya.

^ para. 60 NKỌWA FOTO: Ụjọ Imejọ Ihe: Ebe nwa okorobịa a chụrụ n’ọgbakọ na-ahapụ ụlọ, nwanne ya nwaanyị ana-eche na ụdị ihe a nwekwara ike ime ya.

^ para. 62 NKỌWA FOTO: Ụjọ mmegide: Ebe ụjọ na-atụ otu nwata nwoke ikpe ekpere mgbe mama ya na-abụghị Onyeàmà Jehova na-ele ya anya.

^ para. 65 NKỌWA FOTO: Enweghị Obi Ike: Ebe otu nwa okorobịa na-amụkwu ihe.

^ para. 67 NKỌWA FOTO: Ndị Enyi Ọjọọ: Ebe nwa agbọghọ bụ́ Onyeàma Jehova na-egosi na obi dị ụtọ na ya bụ Onyeàmà Jehova.

^ para. 69 NKỌWA FOTO: Ụjọ Imejọ Ihe: Ebe otu nwa agbọghọ mechara jiri ọgbakọ kpọrọ ihe na-abanye ná mmiri ka e mee ya baptizim.

^ para. 71 NKỌWA FOTO: Ụjọ mmegide: Ebe otu nwa okorobịa katara obi na-akọwara mama ya na-abụghị Onyeàmà Jehova ihe o kweere.