Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Họrọ asụsụ Igbo

 ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ 11

Gee Jehova Ntị

Gee Jehova Ntị

““Onye a bụ Ọkpara m . . . geenụ ya ntị.”​—MAT. 17:5.

ABỤ 89 Gee Ntị, Rube Isi, Ka A Gọzie Gị

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1-2. (a) Olee ụzọ ndị Jehova sirila gwa ndị mmadụ okwu? (b) Olee ihe anyị ga-atụle n’isiokwu a?

Ọ NA-ATỌ Jehova ụtọ ịgwa anyị okwu. N’oge ochie, o si n’aka ndị amụma, ndị mmụọ ozi, nakwa Ọkpara ya bụ́ Jizọs Kraịst mee ka anyị mata uche ya. (Emọs 3:7; Gal. 3:19; Mkpu. 1:1) Taa, ọ na-eji Okwu ya bụ́ Baịbụl agwa anyị okwu. O nyere anyị ya ka anyị nwee ike ịmụta ụzọ ya na otú o si eche echiche.

2 Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, Jehova si n’eluigwe kwuo okwu ugboro atọ. Ka anyị tụlee ihe Jehova kwuru, ihe ndị anyị ga-amụta na ya, nakwa uru ọ ga-abara anyị.

“Ị BỤ ỌKPARA M, ONYE M HỤRỤ N’ANYA”

3. Dị ka anyị gụrụ na Mak 1:9-11, gịnị ka Jehova kwuru mgbe e mere Jizọs baptizim, oleekwa ihe atọ dị mkpa okwu ndị ahụ gosiri?

3 Mak 1:9-11 kwuru mgbe mbụ Jehova si n’eluigwe kwuo okwu. (Gụọ ya.) O kwuru, sị: “Ị bụ Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya; ihe gị masịrị m.” Ọ ga-abụrịrị na okwu ahụ Jehova gwara Jizọs iji gosi na ọ hụrụ ya n’anya nakwa na ọ tụkwasịrị ya obi ruru ya n’obi. Ihe a Jehova kwuru gosiri ihe atọ dị mkpa gbasara Jizọs. Nke mbụ, Jizọs bụ Ọkpara ya. Nke abụọ, Jehova hụrụ Ọkpara ya n’anya. Nke atọ, ihe Jizọs masịrị Jehova. Ka anyị tụlekwuo ha n’otu n’otu.

4. Mgbe e mere Jizọs baptizim, olee ọrụ ọhụrụ Jehova mere ka o doo anya na ọ ga-arụ?

4 “Ị bụ Ọkpara m.” Jehova ji okwu ndị a mee ka o doo anya na Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya ga-enwe ọrụ ọhụrụ ọ ga-arụ. Mgbe Jizọs nọ n’eluigwe, ọ bụ ọkpara Chineke bụ́ mmụọ. Ma mgbe e mere ya baptizim, Jehova jizi mmụọ nsọ tee ya mmanụ. N’oge ahụ, Jehova  mere ka a mata na Jizọs, bụ́ Ọkpara Ya e tere mmanụ, nweziri olileanya ịlaghachi eluigwe ịbụ Eze na Nnukwu Onye Nchụàjà Chineke họpụtara. (Luk 1:31-33; Hib. 1:8, 9; 2:17) Ọ bụ ya mere na mgbe e mere Jizọs baptizim, Nna ya kwuru, sị: “Ị bụ Ọkpara m.”—Luk 3:22.

Anyị na-enwe obi ụtọ mgbe a na-agba anyị ume nakwa mgbe a na-aja anyị mma (A ga-akọwa ya na paragraf nke 5) *

5. Olee otú anyị ga-esi na-ahụ ndị ọzọ n’anya ma na-agba ha ume ka Jehova?

5 “Ị bụ . . . onye m hụrụ n’anya.” Otú Jehova si gwa Ọkpara ya na ọ hụrụ ya n’anya na-eme ka anyị mata na anyị kwesịrị ịna-achọ ohere ndị anyị ga-eji na-aja ndị ọzọ mma. (Jọn 5:20) Obi na-atọgbu anyị atọgbu ma onye anyị hụrụ n’anya gosi anyị na ọ hụrụ anyị n’anya ma jaa anyị mma maka ihe ọma anyị mere. Anyị kwesịkwara ịna-ahụ ụmụnna anyị na ndị ezinụlọ anyị n’anya ma na-agbakwa ha ume. Ọ bụrụ na anyị ajaa ndị ọzọ mma, ọ ga-eme ka okwukwe ha sikwuo ike, meekwa ka ha jiri obi ha niile na-efe Chineke. Ndị nne na nna kwesịrị ịna-agba ụmụ ha ume. Ọ bụrụ na ndị nne na nna ejiri obi ha niile na-aja ụmụ ha mma ma gosi na ha hụrụ ha n’anya, ụmụ ha ga na-eme nke ọma.

6. Gịnị mere anyị kwesịrị iji tụkwasị Jizọs obi?

6 “Ihe gị masịrị m.” Ihe a Jehova gwara Jizọs gosiri na obi siri ya ike na Jizọs ga-eme uche Nna ya. Ebe ọ bụ na obi siri Jehova ike na Ọkpara ya ga-eme uche ya, obi kwesịkwara isi anyị ike na Jizọs ga-emezu ihe niile Jehova kwere anyị ná nkwa. (2 Kọr. 1:20) Ọ bụrụ na anyị echebara ihe Jizọs mere echiche, ọ ga-eme ka anyị kpebisikwuo ike ịmụta ihe n’aka ya ma na-eṅomi ya. Obi sikwara Jehova ike na ndị ohu ya ga na-amụta ihe n’aka Ọkpara ya.—1 Pita 2:21.

 “GEENỤ YA NTỊ”

7. Dị ka Matiu 17:1-5 si kwuo, olee mgbe Jehova si n’eluigwe kwuo okwu, oleekwa ihe o kwuru?

7 Gụọ Matiu 17:1-5. Oge nke abụọ Jehova si n’eluigwe kwuo okwu bụ mgbe ‘e nwoghara Jizọs.’ Jizọs gwara Pita, Jems, na Jọn ka ha duga ya n’ugwu dị oké elu. Mgbe ha nọ ebe ahụ, ha hụrụ ọhụụ dị ịtụnanya. Ihu Jizọs nwuru gbaa dị ka ìhè, uwe ya ana-egbukekwa egbuke. Ihe abụọ yiri mmadụ, nke nọchiri anya Mozis na Ịlaịja, malitere ịgwa Jizọs okwu banyere ọnwụ ọ na-aga ịnwụ na otú a ga-esi akpọlite ya n’ọnwụ. Ọ bụ eziokwu na “ụra ji” ndịozi atọ ahụ, ma mgbe ha tetara, ha hụrụ ọhụụ a dị ịtụnanya. (Luk 9:29-32) Ígwé ojii malitere ikpuchi ha, ha anụkwa otu oké olu si n’ígwé ojii ahụ. Ọ bụ olu Chineke. Jehova kwukwara ụdị ihe ahụ o kwuru mgbe a na-eme Jizọs baptizim iji gosi na ọ hụrụ Ọkpara ya n’anya nakwa na ihe ya masịrị ya. O kwuru, sị: “Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya, onye ihe ya masịrị m.” Ma na nke ugbu a, Jehova kwuziri, sị: “Geenụ ya ntị.”

8. Olee uru ọhụụ ahụ baara ndị na-eso ụzọ Jizọs?

8 Ọhụụ ahụ mere ka anyị matatụ gbasara ebube na ike Jizọs ga-enwe n’ọdịnihu dị ka Eze Alaeze Chineke. O doro anya na ọhụụ a gbara Jizọs ume ma mee ka o nwee ike ọ ga-eji die ahụhụ na ọnwụ ahụhụ ọ na-aga ịnwụ. Ọhụụ ahụ mekwara ka okwukwe ndị na-eso ụzọ ya sikwuo ike, meekwa ka ha jikere maka ọrụ ndị siri ike ha ga-arụ nakwa mmegide a ga-emegide ha n’ọdịnihu. Mgbe ihe dị ka afọ iri atọ gachara, Pita onyeozi kwuru gbasara ọhụụ ahụ iji gosi na ya ka na-echeta banyere ya.—2 Pita 1:16-18.

9. Olee ndụmọdụ bara uru Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya?

9 “Geenụ ya ntị.” Jehova mere ka o doo anya na ya chọrọ ka anyị na-ege Ọkpara ya ntị ma na-eme ihe ndị ọ gwara anyị. Olee ihe ndị Jizọs kwuru mgbe ọ nọ n’ụwa? O kwuru ọtụtụ ihe ndị bara uru anyị kwesịrị ige ntị na ha. Dị ka ihe atụ, o medara obi kụziere ndị na-eso ụzọ ya otú e si ezi ozi ọma, chetakwara ha ọtụtụ ugboro ka ha na-eche nche. (Mat. 24:42; 28:19, 20) Ọ gwara ha ka ha jiri ike ha niile rụọ ọrụ ahụ nakwa ka ha ghara ịda mbà. (Luk 13:24) Jizọs mere ka o doo ndị na-eso ụzọ ya anya na ha kwesịrị ịhụ ibe ha n’anya, dịrị n’otu ma na-edebe iwu ya. (Jọn 15:10, 12, 13) Ndụmọdụ Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya baara ha ezigbo uru. Ọ na-abakwara anyị uru taa.

10-11. Olee otú anyị ga-esi egosi na anyị na-ege Jizọs ntị?

10 Jizọs kwuru, sị: “Onye ọ bụla nke dịnyeere eziokwu na-ege ntị n’olu m.” (Jọn 18:37) Anyị na-egosi na anyị na-ege ntị n’olu Jizọs ma anyị ‘na-ediri ibe anyị ihe ma na-agbaghara ibe anyị kpamkpam.’ (Kọl. 3:13; Luk 17:3, 4) Ụzọ ọzọ anyị si egosi na anyị na-ege Jizọs ntị bụ iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma ma ‘n’oge dị mma ma n’oge nsogbu.’—2 Tim. 4:2.

11 Jizọs kwuru, sị: “Atụrụ m na-ege ntị n’olu m.” (Jọn 10:27) Ndị Kraịst na-ege Jizọs ntị ma ha na-ege ntị nke ọma n’ihe Jizọs na-ekwu ma na-eme ya eme. Ha anaghị ekwe ka “nchegbu nke ndụ” megharịa ha anya. (Luk 21:34) Kama, ihe ka ha mkpa ná ndụ bụ ime ihe Jizọs nyere ha n’iwu, ma mgbe o siiri ha ike ime otú ahụ. Ọtụtụ n’ime ụmụnna anyị na-edi ọtụtụ ihe, dị ka mkpagbu, ịda  ogbenye, na ọdachi ndị na-emere onwe ha. N’agbanyeghị ihe ndị a niile, ha ka nọgidere na-efe Jehova, ihe ọ sọkwara ya mee. Jizọs na-agwa ha, sị: “Onye nabatara ihe m nyere n’iwu ma na-edebe ha, ọ bụ onye ahụ hụrụ m n’anya. N’aka nke ọzọ, onye hụrụ m n’anya ka Nna m ga-ahụ n’anya.”—Jọn 14:21.

Ozi ọma anyị na-ezi na-enyere anyị aka ilekwasị anya n’ofufe Jehova (A ga-akọwa ya na paragraf nke 12) *

12. Olee ụzọ ọzọ anyị ga-esi egosi na anyị na-ege Jizọs ntị?

12 Ihe ọzọ anyị ga-eme iji gosi na anyị na-ege Jizọs ntị bụ ịna-erubere ndị na-edu ndú n’ọgbakọ isi. (Hib. 13:7, 17) E nweela ọtụtụ ihe a gbanwerela ná nzukọ Jehova n’oge na-adịbeghị anya. Ụfọdụ n’ime ha bụ ihe ọhụrụ ndị anyị ga-eji na-ezi ozi ọma, otú anyị ga-esi na-ezi ozi ọma, otú anyị sizi enwe ọmụmụ ihe etiti izu, na otú anyị si arụ ma na-arụzigharị Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị. Ihe ndị a niile bụ maka ọdịmma anyị. Ha na-egosi na nzukọ Jehova hụrụ anyị n’anya, obi dịkwa anyị ụtọ maka ha. Obi siri anyị ike na Jehova ga-agọzi mbọ anyị na-agba ime ihe nzukọ ya gwara anyị mee.

13. Olee uru ndị anyị ga-erite ma anyị na-ege Jizọs ntị?

13 Ọ bụrụ na anyị egee ntị n’ihe niile Jizọs kụziri, ọ ga-abara anyị uru. Jizọs kwere ndị na-eso ụzọ ya nkwa na ihe ndị ọ kụziri ga-eme ka ha nweta ume ọhụrụ. Ọ gwara ha sị: “Mkpụrụ obi unu ga-enweta ume. N’ihi na yok m adịghị egbu mgbu, ibu m dịkwa mfe.” (Mat. 11:28-30) Okwu Chineke, ma Oziọma anọ ahụ kwuru gbasara ndụ Jizọs na ozi o jere, na-eme ka anyị nwee ume ọhụrụ, na-eme ka anyị nwee ike ife Chineke, na-emekwa ka anyị mara ihe. (Ọma 19:7; 23:3) Jizọs kwuru, sị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị na-anụ okwu Chineke ma na-edebe ya!”—Luk 11:28.

‘M GA-EMEKWA KA AHA M DỊ EBUBE’

14-15. (a) Olee nke ugboro atọ Jehova si n’eluigwe kwuo okwu dị ka e dere na Jọn 12:27, 28? (b) Olee ihe mere okwu Jehova gwara Jizọs ji gbaa ya ume ma kasie ya obi?

14 Gụọ Jọn 12:27, 28. Jọn dere nke ugboro atọ Jehova si n’eluigwe kwuo okwu. Ụbọchị ole na ole tupu Jizọs anwụọ, ọ gara Jeruselem ka o mee Ememme Ngabiga ikpeazụ ya. O kwuru, sị: “Ọ dị ihe na-echegbu mkpụrụ obi m.” Mgbe ahụ, o kpere ekpere, sị: “Nna, mee ka aha gị dị ebube.” Nna ya si n’eluigwe kwuo, sị: “Emewo m ka ọ dị ebube, m ga-emekwa ka ọ dị ebube ọzọ.”

 15 Jizọs nọ na-echegbu onwe ya maka otú ọ ga-esi kwesị ntụkwasị obi n’ebe Jehova nọ. Ihe a abụghịkwanụ obere ọrụ. Jizọs ma na ya ga-ata nnukwu ahụhụ ma nwụọ. (Mat. 26:38) Ihe kacha Jizọs mkpa bụ ime ka aha Nna ya dị ebube. E boro Jizọs ebubo na ọ na-ekwulu Chineke. Ọ na-echegbukwa onwe ya na ọnwụ ya ga-eme ka a kọchaa aha Chineke. O doro anya na okwu ahụ Jehova gwara Jizọs mere ka obi sie ya ike. N’ihi ya, obi siziri ya ike na Jehova ga-eme ka aha ya dị ebube. Ọ ga-abụ na okwu ahụ Jehova gwara ya kasiri ya obi ma mee ka o nwee ike idi ahụhụ ndị ọ ga-ata. O nwere ike ịbụ na ọ bụ naanị Jizọs ghọtara ihe Nna ya kwuru mgbe ahụ, ma Jehova gbara mbọ hụ na e dere ihe ndị ahụ maka anyị.—Jọn 12:29, 30.

Jehova ga-eme ka aha ya dị ebube ma zọpụta ndị ya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 16) *

16. Olee ihe nwere ike ime ka anyị na-echegbu onwe anyị mgbe ụfọdụ gbasara nkọcha a na-akọcha aha Chineke?

16 Dịkwa ka Jizọs, nkọcha a na-akọcha aha Jehova nwere ike ịna-echu anyị ụra. O nwere ike ịbụ na a na-emegide anyị dị ka e megidere Jizọs. O nwekwara ike ịbụ na akụkọ ụgha ndị na-emegide anyị na-akọsa banyere anyị na-enye anyị nsogbu n’obi. Anyị nwekwara ike ịna-eche otú akụkọ ndị ahụ si mee ka a na-akọcha Jehova na nzukọ ya. N’oge ndị ahụ, ihe ahụ Jehova kwuru na ya ga-eme ka aha ya dị ebube ga-akasi  anyị obi. Anyị ekwesịghị ichegbu onwe anyị gbasara otú ndị mmadụ si akatọ aha Jehova na nzukọ ya. Obi kwesịrị isi anyị ike na “udo nke Chineke nke karịrị echiche niile ga-eche obi [anyị] na ike iche echiche [anyị] nche site n’aka Kraịst Jizọs.” (Fil. 4:6, 7) Jehova ga-emerịrị ka aha ya dị ebube. Jehova ga-eji Alaeze ya mezie ihe niile Setan na ụwa ya merela ndị ohu ya na-ekwesị ntụkwasị obi.—Ọma 94:22, 23; Aịza. 65:17.

RITE URU N’IGE CHINEKE NTỊ

17. Dị ka e kwuru n’Aịzaya 30:21, olee otú Jehova si agwa anyị okwu taa?

17 Jehova ka na-agwa anyị okwu taa. (Gụọ Aịzaya 30:21.) Nke bụ́ eziokwu bụ na Jehova anaghị esi n’eluigwe agwa anyị okwu taa. Ma, o nyere anyị Okwu ya, bụ́ Baịbụl, bụ́ ebe o si na-agwa anyị ihe anyị ga-eme. Jehova na-ejikwa mmụọ nsọ ya eme ka “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi” na-enye ndị ohu ya nri. (Luk 12:42) Ha ebipụtala ọtụtụ akwụkwọ, nwee ọtụtụ ihe n’Ịntanet, mepụtakwa vidio nakwa ọtụtụ ihe ndị a na-egere egere, bụ́ ndị na-eme ka okwukwe anyị sikwuo ike.

18. Olee otú ihe Jehova kwuru si eme ka i nwekwuo okwukwe na obi ike?

18 Ka anyị na-echeta ihe Jehova gwara Ọkpara ya mgbe ọ ka nọ n’ụwa. Ka ihe ndị a Chineke kwuru e dere na Baịbụl mee ka obi sie anyị ike na Jehova ga-edozi nsogbu niile Setan na ụwa ọjọọ ya kpatarala anyị. Ka anyị kpebisie ike ịna-ege Jehova ntị nke ọma. Anyị mee otú ahụ, anyị ga-enwe ike idi nsogbu niile na-abịara anyị ugbu a na ndị nke ga-abịara anyị n’ọdịnihu. Baịbụl gwara anyị, sị: “Ntachi obi dị unu mkpa, ka unu wee nata mmezu nke nkwa ahụ, mgbe unu mesịrị uche Chineke.”—Hib. 10:36.

ABỤ 4 “Jehova Bụ Onye Na-azụ M Dị Ka Atụrụ”

^ para. 5 Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, Jehova si n’eluigwe gwa ya okwu ugboro atọ. N’otu n’ime oge ndị ahụ, Jehova gwara ndị na-eso ụzọ Jizọs ka ha gee Ọkpara ya ntị. Taa, Jehova si n’Okwu ya bụ́ Baịbụl, ma ihe ndị Jizọs kụziri nakwa ná nzukọ ya na-agwa anyị okwu. N’isiokwu a, anyị ga-atụle uru ọ ga-abara anyị ịna-ege Jehova na Jizọs ntị.

^ para. 52 NKỌWA FOTO: Ebe otu okenye hụrụ ohu na-eje ozi ka ọ na-edebe Ụlọ Nzukọ Alaeze ọcha, na-enyekwa ụmụnna akwụkwọ n’ebe a na-ewere akwụkwọ, nakwa ebe okenye ahụ ji obi ya niile na-aja ya mma.

^ para. 54 NKỌWA FOTO: Ebe otu di na nwunye nọ na Siera Lion na-enye otu onye na-akụ azụ̀ akwụkwọ ịkpọ òkù maka ọmụmụ ihe anyị.

^ para. 56 NKỌWA FOTO: Ebe ụmụnna anyị bi n’obodo a machibidoro ọrụ anyị iwu na-amụ ihe n’ụlọ otu nwanna. Ha ejighị ejiji ka ndị na-aga ọmụmụ ihe ka ndị mmadụ ghara ịmata ebe ha na-aga.