Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ 2

Na-eto Jehova n’Ọgbakọ

Na-eto Jehova n’Ọgbakọ

“M ga-anọ n’ime ọgbakọ too gị.”​—ỌMA 22:22.

ABỤ 59 Soro M Too Jaa

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Olee otú obi dị Devid banyere Jehova, oleekwa ihe nke a mere ka o mee?

EZE DEVID kwuru, sị: “Jehova dị ukwuu, kwesịkwa nnọọ ka e too ya.” (Ọma 145:3) Ọ hụrụ Jehova n’anya, ya emee ka o too Chineke “n’ime ọgbakọ.” (Ọma 22:22; 40:5) O doro anya na ị hụrụ Jehova n’anya ma kweta ihe a Devid kwuru. Ọ sịrị: “Ka gị onwe gị, Jehova bụ́ Chineke Izrel bụ́ nna anyị, bụrụ onye a gọziri agọzi malite na mgbe ebighị ebi ruo mgbe ebighị ebi.”​—1 Ihe 29:​10-13.

2. (a) Olee otú anyị ga-esi eto Jehova? (b) Olee nsogbu ụfọdụ ụmụnna anyị nwere, oleekwa ihe anyị ga-atụle?

2 Taa, otu ụzọ anyị si eto Jehova bụ ịza ajụjụ n’ọmụmụ ihe. Ma, ọtụtụ ụmụnna anyị nwere nsogbu ndị ha na ha na-alụ. Ha chọrọ ịna-aza ajụjụ n’ọmụmụ ihe, ma ụjọ anaghị ekwe ha. Olee ihe ha nwere ike ime? Olee ihe ndị ga-enyere anyị niile aka ịna-aza ajụjụ ga na-agba ụmụnna anyị ume? Ma, tupu anyị azaa ajụjụ ndị a, ka anyị buru ụzọ tụlee ihe anọ dị mkpa mere anyị ji aza ajụjụ n’ọmụmụ ihe.

IHE MERE ANYỊ JI AZA AJỤJỤ N’ỌMỤMỤ IHE

3-5. (a) Dị ka Ndị Hibru 13:15 kwuru, olee ihe mere anyị ji aza ajụjụ n’ọmụmụ ihe? (b) Ọ̀ bụ iwu na anyị niile ga-aza otu ụdị ajụjụ? Kọwaa.

3 Jehova kwere ka anyị niile na-eto ya. (Ọma 119:108) Ajụjụ anyị na-aza n’ọmụmụ ihe so ‘n’àjà otuto’ anyị na-achụrụ Jehova, o nweghịkwa onye ga-emere anyị ya. (Gụọ Ndị Hibru 13:15.) Jehova ọ̀ chọrọ ka anyị niile na-achụ otu ụdị àjà ma ọ bụ na-aza otu ụdị ajụjụ? Mbanụ.

4 Jehova ma na ike anyị na ọnọdụ anyị dị iche iche, o jikwa ihe ndị anyị na-emere ya kpọrọ ihe. Chegodị banyere ụdị àjà ndị Izrel chụụrụ ya ọ nabatara. Ụfọdụ ndị Izrel ji atụrụ ma ọ bụ ewu chụọrọ ya àjà. Ma onye Izrel dara ogbenye nwere ike iji “nduru abụọ ma ọ bụ ụmụ kpalakwukwu abụọ” chụọrọ ya àjà. Ọ bụrụ na onye Izrel enweghị ike iweta nnụnụ abụọ, ma ya ejiri “otu ụzọ n’ụzọ iri nke otu ihe ọ̀tụ̀tụ̀ efa ntụ ọka e gwere nke ọma” chụọrọ Jehova àjà, ọ na-anabata ya. (Lev. 5:​7, 11) Ntụ ọka adịghị ọnụ, ma Jehova na-anabata àjà ahụ, ọ bụrụhaala na ọ bụ “ntụ ọka e gwere nke ọma.”

5 Chineke anyị dị obiọma na-emekwa otú ahụ taa. Anyị zaa ajụjụ, ọ naghị atụ anya ka okwu na-aga anyị niile were were n’ọnụ ka Apọlọs ma ọ bụ ka anyị mee ka ndị mmadụ kwenye ka Pọl. (Ọrụ 18:24; 26:28) Ihe ọ chọrọ bụ ka anyị jiri obi anyị niile na-aza ajụjụ otú anyị nwere ike. Cheta nwaanyị ahụ di ya nwụrụ nke nyere obere mkpụrụ ego abụọ. Jehova hụrụ ya n’anya n’ihi na o nyere ihe niile o nwere.​—Luk 21:​1-4.

Ịza ajụjụ na-abara ma anyị ma ndị na-ege anyị ntị uru (A ga-akọwa ya na paragraf nke 6 na nke 7) *

6. (a) Dị ka Ndị Hibru 10:​24, 25 si kwuo, olee otú azịza ụmụnna anyị na-aza si abara anyị uru? (b) Olee otú ị ga-esi egosi na obi dị gị ụtọ maka ya?

6 Anyị na-eji ajụjụ anyị na-aza agbarịta ibe anyị ume. (Gụọ Ndị Hibru 10:​24, 25.) Obi na-atọ anyị ụtọ ma anyị nụ azịza dị iche iche ụmụnna anyị na-aza n’ọmụmụ ihe. Obi na-atọkwa anyị ụtọ ma anyị nụ ka ụmụaka ji obi ha niile na-aza ajụjụ dị nkenke. Ọ na-agba anyị ume ma anyị nụ otú nwanna si jiri obi ụtọ na-ekwu banyere eziokwu ọ mụtara. Obi na-atọ anyị ụtọ ịhụ ụmụnna anyị ndị ‘gbasiri mgba ike’ ịza ajụjụ, n’agbanyeghị ihere ma ọ bụ na ha ka na-amụ asụsụ anyị amụ. (1 Tesa. 2:2) Olee otú anyị ga-esi egosi na obi dị anyị ụtọ maka mbọ ha na-agba? A gbasaa ọmụmụ ihe, anyị nwere ike ikele ha maka azịza na-agba ume ha zara. Otú ọzọ anyị ga-esi egosi na obi dị anyị ụtọ bụ anyịnwa ịna-aza ajụjụ. Nke a ga-egosi na anyị na-agba ụmụnna anyị ume, ọ bụghị naanị hanwa ịgba anyị ume.​—Rom 1:​11, 12.

7. Olee uru ọ na-abara anyị ma anyị zaa ajụjụ?

7 Ịza ajụjụ na-abara anyị uru. (Aịza. 48:17) Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ? Nke mbụ, ọ bụrụ na anyị chọrọ ịza ajụjụ, ọ ga-emekwu ka anyị kwadebe ọmụmụ ihe nke ọma. Ọ bụrụkwa na anyị akwadebe nke ọma, ọ ga-eme ka anyị ghọtakwuo Okwu Chineke. Ịghọtakwu Okwu Chineke ga-eme ka anyị na-eme ihe ndị anyị na-amụta. Nke abụọ, o nwere ike ime ka ọmụmụ ihe na-atọkwu anyị ụtọ, n’ihi na anyị zara ajụjụ. Nke atọ, ọ na-eme ka anyị na-echeta ihe anyị zara n’ihi na anyị gbara mbọ zaa ajụjụ.

8-9. (a) Dị ka e kwuru na Malakaị 3:​16, olee otú i chere obi na-adị Jehova n’ihi ajụjụ anyị na-aza? (b) Olee nsogbu ụfọdụ n’ime anyị nwere ike ịna-enwe?

8 Obi na-atọ Jehova ụtọ ma anyị na-aza ajụjụ maka ihe ndị anyị kweere. Obi siri anyị ike na Jehova na-ege anyị ntị ma anyị zawa ajụjụ, obi ana-atọkwa ya ụtọ maka mbọ anyị na-agba ịza ajụjụ n’ọmụmụ ihe. (Gụọ Malakaị 3:16.) Otú o si egosi na obi na-atọ ya ụtọ bụ ịgọzi anyị ma anyị gbalịa na-eme ihe dị ya mma.​—Mal. 3:10.

9 O doro anya na anyị nwere ezigbo ihe mere anyị ji kwesị ịna-aza ajụjụ n’ọmụmụ ihe. Ma, ụjọ nwere ike ịna-atụ ụfọdụ iweli aka. Ọ bụrụ na ọ dị gị otú ahụ, adala mbà. Ka anyị tụlee ụkpụrụ Baịbụl ụfọdụ, ihe atụ ụfọdụ, na ụfọdụ ihe ndị ga-enyere anyị niile aka ịna-azakwu ajụjụ n’ọmụmụ ihe.

OTÚ ANYỊ GA-ESI KWỤSỊ ỊNA-ATỤ ỤJỌ

10. (a) Olee ihe na-atụ ọtụtụ n’ime anyị ụjọ? (b) Ọ bụrụ na ụjọ na-atụ gị ịza ajụjụ, olee àgwà ọma ọ ga-abụ na i nwere?

10 Obi ọ̀ na-awụba gị n’afọ mgbe ọ bụla i chedịrị echiche iweli aka ịza ajụjụ? Ọ bụrụ otú ahụ, ọ bụghị naanị gị ka ụdị ihe a na-eme. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọtụtụ n’ime anyị na-atụtụ ụjọ ma anyị zawa ajụjụ. Tupu gị akwụsị ịtụ ụjọ, i kwesịrị ibu ụzọ mata ihe kpatara ya. Ị̀ na-atụ ụjọ na ị ga-echefu ihe ị chọrọ ịza ma ọ bụ na ị gaghị azata ya? Ị̀ na-echegbu onwe gị na azịza gị agaghị adị mma ka nke ndị ọzọ? N’eziokwu, ụjọ ahụ ị na-atụ adịghị njọ. Ọ na-egosi na ị dị umeala n’obi, nakwa na i weere ndị ọzọ na ha ka gị. Jehova hụrụ ndị dị umeala n’obi n’anya. (Ọma 138:6; Fil. 2:3) Ma, ọ chọkwara ka ị na-eto ya ma na-agba ụmụnna gị ume n’ọmụmụ ihe. (1 Tesa. 5:11) Ọ hụrụ gị n’anya, ọ ga-emekwa ka ị kata obi na-aza ajụjụ.

11. Gịnị ka Baịbụl kwuru ga-enyere anyị aka?

11 Ka anyị leba anya n’ihe ụfọdụ Baịbụl kwuru. Baịbụl kwuru na anyị niile na-emejọ ihe n’ihe anyị na-ekwu na otú anyị si ekwu ya. (Jems 3:2) Ma Jehova ma ụmụnna anyị maara na anyị ezughị okè. (Ọma 103:​12-14) Ụmụnna anyị hụrụ anyị n’anya. (Mak 10:​29, 30; Jọn 13:35) Ha ghọtara na mgbe ụfọdụ, ihe anyị zara n’ajụjụ abụchaghị ihe anyị bu n’obi ịza.

12-13. Gịnị ka anyị mụtara n’aka Nehemaya na Jona?

12 Chee banyere ndị ụfọdụ a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl, bụ́ ndị ga-enyere gị aka ịkwụsị ịtụ ụjọ. Cheta Nehemaya. O jere ozi n’obí otu eze dị ike. Obi adịghị ya mma n’ihi na ọ nụrụ na mgbidi nakwa ọnụ ụzọ ámá Jeruselem emebisiela. (Nehe. 1:​1-4) Chegodị otú obi si wụba ya n’afọ mgbe eze gwara ya ka o kwuo ihe mere obi adịghị ya mma. Nehemaya kpere ekpere ozugbo ma zaa ajụjụ eze jụrụ ya. Nke a mere ka eze mee ihe iji nyere ndị Chineke aka. (Nehe. 2:​1-8) Cheekwa banyere Jona. Mgbe Jehova gwara ya ka ọ gaa gwa ndị Ninive okwu, ezigbo ụjọ tụrụ ya, nke na ọ gbagara ebe ọzọ. (Jona 1:​1-3) Ma, Jehova nyeere ya aka ya enwee ike gaa zie ha ozi ahụ. Ozi ahụ mere ka a ghara ibibi ndị Ninive. (Jona 3:​5-10) Ihe anyị mụtara n’aka Nehemaya bụ na ọ dị mkpa ikpe ekpere tupu anyị azaa ajụjụ. Ihe anyị mụtakwaranụ n’aka Jona bụ na Jehova ga-enyere anyị aka ijere ya ozi, n’agbanyeghị otú ezigbo ụjọ nwere ike isi jide anyị. A sị ka e kwuwe, ịza ajụjụ n’ọmụmụ ihe, ọ̀ ga-atụ gị ụjọ ka ịgwa ndị Ninive ihe Jehova ga-eme ha?

13 Olee ihe ndị anyị ga-eme ga-enyere anyị aka ịna-aza ajụjụ ndị na-agba ume n’ọmụmụ ihe? Ka anyị tụlee ụfọdụ n’ime ha.

14. Gịnị mere anyị kwesịrị iji na-akwadebe ọmụmụ ihe nke ọma? Olee mgbe anyị nwere ike ịkwadebe ya?

14 Na-akwadebe ọmụmụ ihe niile. Ọ bụrụ na ị kwadebe ọmụmụ ihe nke ọma, obi ga-esikwu gị ike ịna-aza ajụjụ. (Ilu 21:5) Ma, onye ọ bụla n’ime anyị nwere oge ọ na-eji akwadebe ọmụmụ ihe. Nwanna Nwaanyị Eloise na-erubeghị afọ iri itoolu, onye di ya nwụrụ, na-amalite ịkwadebe Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche ná mmalite izu. O kwuru, sị: “Ọmụmụ ihe na-aka atọ m ụtọ ma m kwadebe ya n’oge.” Nwanna nwaanyị ọzọ aha ya bụ Joy na-ewepụta oge n’ụbọchị Satọdee amụ Ụlọ Nche ya, n’agbanyeghị na ọ na-eji oge buru ibu arụ ọrụ o ji akpa afọ ya. O kwuru, sị: “M mụọ ya ụbọchị bọtara ụbọchị a ga-enwe ọmụmụ ihe, ọ na-adịrị m mfe icheta ya.” Nwanna Ike, bụ́ okenye na-anaghị enwecha ohere, bụrụkwa ọsụ ụzọ, kwuru, sị: “Achọpụtara m na ọ na-akachara m mma ịmụ ihe ntakịrị ntakịrị n’izu karịa iji ọtụtụ awa mụọ ihe otu mgbe.”

15. Olee otú ị ga-esi akwadebe nke ọma maka ọmụmụ ihe?

15 Gịnị ka ị ga-eme iji kwadebe ọmụmụ ihe nke ọma? Tupu gị amalite ịmụ ihe, rịọ Jehova ka o nye gị mmụọ nsọ ya. (Luk 11:13; 1 Jọn 5:14) Werezie nkeji ole na ole lebara ihe ahụ ị chọrọ ịmụ anya, dị ka isiokwu ya, isiokwu nta, ihe atụ na igbe izi ihe. Ị malitezie ịmụ paragraf nke ọ bụla, gụọ amaokwu Baịbụl ndị e depụtara na ya otú i nwere ike. Chebara ihe ị na-amụ echiche, nke ka nke, ihe ị chọrọ ịza n’ọmụmụ ihe. Ọ bụrụ na ị kwadebe nke ọma, ọ ga-abakwuru gị uru, meekwa ka ọ dịkwuoro gị mfe ịza ajụjụ.​—2 Kọr. 9:6.

16. Olee ngwá ọrụ ndị e nyere gị? Olee otú ị na-esi eji ha amụ ihe?

16 Ọ bụrụ na o kwe gị omume, jiri ngwá ọrụ a na-etinye na kọmputa ndị dị n’asụsụ ị ma na-akwadebe ọmụmụ ihe. Jehova ejirila nzukọ ya nye anyị ngwá ọrụ a na-etinye na kọmputa iji nyere anyị aka ịkwadebe ọmụmụ ihe. JW Library® na-eme ka anyị danloduo akwụkwọ ndị a na-amụ amụ n’ekwentị anyị. Anyị danloduo ha, anyị nweziri ike ịmụ ha, ma ọ bụ ma e nweghị ihe ọzọ, gụọ ha ma ọ bụ gere ha mgbe ọ bụla ma ọ bụ n’ebe ọ bụla. Ụfọdụ na-eji ngwá ọrụ a na-amụ ihe n’oge ha na-eji ezuru ike n’ụlọ ọrụ, ma ọ bụ n’ụlọ akwụkwọ ma ọ bụkwanụ ma ha mewe njem. Watchtower Library na Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N’ỊNTANET na-eme ka ọ dị ezigbo mfe ime nchọnchọ nke ọma n’ihe anyị chọrọ ịmụ.

Olee mgbe ị na-ewepụta oge akwadebe ọmụmụ ihe? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 14 ruo na nke 16) *

17. (a) Gịnị mere o ji dị mma ịkwadebe ọtụtụ ajụjụ? (b) Gịnị ka ị mụtara na vidio isiokwu ya bụ Bụrụ Enyi Jehova​—Na-akwadebe Ihe Ị Ga-aza n’Ọmụmụ Ihe?

17 O kwe omume, kwadebe ọtụtụ ajụjụ n’ihe ọmụmụ nke ọ bụla. N’ihi gịnị? N’ihi na ọ bụghị mgbe niile i weliri aka ka e nwere ike ịkpọ gị. Ndị ọzọ nwere ike iweli aka ha otu mgbe ahụ, nwanna na-eduzi ihe nwere ike kpọọ otu onye n’ime ha. Ka ọmụmụ ihe nwee ike ịgbasa n’oge, nwanna na-eduzi ihe nwere ike ịkpọ ụmụnna ole na ole ka ha zaa ajụjụ n’ihe ọmụmụ ụfọdụ ahụ a na-amụ. N’ihi ya, ewela iwe ma ọ bụ daa mbà ma ọ bụrụ na ọ kpọghị gị ná mmalite ọmụmụ ihe ahụ. Ọ bụrụ na ị kwadebe ọtụtụ ajụjụ ị ga-aza, ị ga-enwekwu ohere ịza ajụjụ. Otu n’ime ajụjụ ị ga-akwadebe nwere ike bụrụ ịgụ Baịbụl. Ma, ọ bụrụ na o kwe gị omume, kwadebekwa otú ị ga-esi zaa ajụjụ n’agụghị azịza gị agụ. *

18. Gịnị mere i kwesịrị iji mee ka azịza gị dị nkenke?

18 Na-aza ajụjụ dị nkenke. Azịza ndị na-agbakarị mmadụ ume bụ ndị dị nkenke. N’ihi ya, na-eme ka azịza gị dị nkenke. Gbalịa ka ọ bụrụ ihe dị ka tịnkọm tịnkọm iri atọ. (Ilu 10:19; 15:23) Ọ bụrụ na o ruola ọtụtụ afọ ị zawara ajụjụ, ọ dị mkpa ka i mee ka azịza gị dị nkenke ka ndị ọzọ si otú ahụ mụta ịza ajụjụ dị nkenke. Ọ bụrụ na azịza gị na-eto ogologo, ụjọ nwere ike tụwa ndị ọzọ, ha ana-eche na ha agaghị azali ajụjụ ka gị. Azịza dị nkenke na-emekwa ka ọtụtụ ndị nwee ohere ịza ajụjụ n’ọmụmụ ihe. Ọ bụrụ na ị bụ onye mbụ a kpọrọ, mee ka azịza gị dị nkenke, ya abụrụkwa kpọmkwem ihe a chọrọ ka ị zaa. Ekwula ihe niile e dere na paragraf. A zachaa isi ihe e kwuru na paragraf ahụ, i nwere ike zaa ihe ndị ọzọ e kwuru na ya. Gụọ igbe isiokwu ya bụ “ Olee Ihe M Nwere Ike Ịza?

19. Olee otú nwanna na-eduzi ihe nwere ike isi enyere gị aka, oleekwa ihe ị ga-eme?

19 Mee ka nwanna na-eduzi ihe mata na e nwere paragraf nke ị ga-achọ ịza. Ọ bụrụ na ị chọrọ ime ihe a, i kwesịrị ịgwa ya tupu ọmụmụ ihe amalite. Oge ruo ka a zaa ajụjụ paragraf ahụ, welie aka gị ozugbo, welie ya elu nke ọma ka o nwee ike ịhụ gị.

20. Olee otú ọmụmụ ihe si yie nri gị na ndị ezigbo enyi gị na-eri?

20 Were ọmụmụ ihe ka nri gị na ndị ezigbo enyi gị na-eri. Ka e were ya na ụfọdụ ndị enyi gị n’ọgbakọ kpọrọ gị ka ị bịa soro ha rie nri ma gwa gị ka ị kwadebe obere nri. Gịnị ka ị ga-eme? Ụjọ nwere ike ịtụtụ gị, ma ị ga-agbalị weta ihe ga-atọ mmadụ niile ụtọ. Jehova, Onye kpọrọ anyị bịa ọmụmụ ihe, akwadeberela anyị ọtụtụ ihe anyị ga-eri na tebụl ya n’ọmụmụ ihe. (Ọma 23:5; Mat. 24:45) Obi na-atọkwa ya ụtọ ma anyị weta onyinye kacha mma anyị nwere ike inye. N’ihi ya, kwadebe nke ọma ma zaa ajụjụ otú i nwere ike ịza. Mgbe ahụ, ọ gaghị abụ naanị na ị bịara rie nri na tebụl Jehova, kama i nyekwara ụmụnna ihe.

ABỤ 2 Jehova Bụ Aha Gị

^ par. 5 Anyị niile hụrụ Jehova n’anya ma na-eto ya otú ahụ Devid mere. Anyị nwere ohere magburu onwe ya igosi na anyị hụrụ Jehova n’anya ma anyị bịa ọmụmụ ihe iji fee ya. Ma ọ na-esiri ụfọdụ n’ime anyị ike ịza ajụjụ n’ọmụmụ ihe. Ọ bụrụ na ụdị ihe a na-eme gị, isiokwu a ga-enyere gị aka ịghọta ihe mere ụjọ ji na-atụ gị ịza ajụjụ, nyekwara gị aka ịkwụsị ịtụ ụjọ.

^ par. 17 Gaa na jw.org, lee vidio isiokwu ya bụ Bụrụ Enyi Jehova​—Na-akwadebe Ihe Ị Ga-aza n’Ọmụmụ Ihe. Gaakwa n’ebe e dere IHE BAỊBỤL NA-AKỤZI, pịa ebe e dere ỤMỤAKA.

^ par. 63 NKỌWA FOTO: Ebe ụmụnna ji obi ụtọ na-aza ajụjụ n’ọmụmụ ihe Ụlọ Nche.

^ par. 65 NKỌWA FOTO: Ihe a bụ ụfọdụ ụmụnna ndị ahụ e gosiri na foto dị n’elu ebe ha na-aza ajụjụ n’ọmụmụ ihe Ụlọ Nche. N’agbanyeghị na ọnọdụ onye nke ọ bụla n’ime ha dị iche, ha na-ewepụta oge na-amụ ihe a ga-amụ n’ọmụmụ ihe.