Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Họrọ asụsụ Igbo

 ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ 4

Gịnị Ka Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị A Na-ejighị Ọtụtụ Ihe Mee Na-akụziri Anyị Banyere Eze Eluigwe?

Gịnị Ka Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị A Na-ejighị Ọtụtụ Ihe Mee Na-akụziri Anyị Banyere Eze Eluigwe?

“Nke a pụtara ahụ́ m. . . . nke a pụtara ‘ọbara m nke ọgbụgba ndụ ahụ.’”​—MAT. 26:​26-28.

ABỤ 16 Toonụ Jaa n’Ihi Ọkpara Ya O Tere Mmanụ

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1-2. (a) Gịnị mere anyị ga-eji atụ anya na Jizọs ga-akụziri anyị ụzọ dị mfe anyị ga-esi na-echeta ọnwụ ya? (b) Olee àgwà ndị Jizọs nwere anyị ga-atụle?

Ị̀ GA-AKỌWALI ihe ndị a na-eme ná Ncheta Ọnwụ Jizọs ma ọ bụ Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị a na-eme kwa afọ? O doro anya na ọtụtụ n’ime anyị ga-echeta ihe ndị a na-eme na ya. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na e jighị ọtụtụ ihe mee ya. Ma, Ncheta Ọnwụ Jizọs a dị ezigbo mkpa. N’ihi ya, anyị nwere ike ịjụ, sị, ‘Gịnị mere e jighị ọtụtụ ihe mee ya?’

2 N’oge Jizọs jere ozi n’ụwa, a ma ya ama ka onye na-akụzi eziokwu ndị dị mkpa otú ndị mmadụ ga-aghọta ya. (Mat. 7:​28, 29) Ọ bụ ya mere o ji kụziere anyị ụzọ dị mfe ma baa uru anyị ga-esi na-echeta * ọnwụ ya. Ka anyị tụlee banyere Ncheta Ọnwụ Jizọs na ụfọdụ ihe ndị Jizọs kwuru na ihe ndị o mere. Ọ ga-eme ka anyị ghọtakwuo otú o si dịrị umeala n’obi, nwee obi ike na otú o si hụ anyị n’anya. Anyị ga-amụtakwa otú anyị nwere ike isi na-emekwu ka ya.

JIZỌS DỊ UMEALA N’OBI

Achịcha na mmanya e ji eme Ncheta Ọnwụ Jizọs na-echetara anyị na Jizọs nwụrụ maka anyị nakwa na ọ bụ Eze anyị na-achị achị ugbu a n’eluigwe (A ga-akọwa ya na paragraf nke 3 ruo na nke 5)

3. Dị ka e kwuru na Matiu 26:​26-28, olee ihe gosiri na Jizọs ji ihe ole na ole malite Ncheta Ọnwụ ya, oleekwa ihe ihe abụọ ahụ o ji malite ya nọchiri anya ha?

3 Jizọs malitere Ncheta Ọnwụ ya mgbe ya na ndịozi ya iri na otu kwesịrị ntụkwasị obi nọ. O weere ihe fọrọ afọ n’ihe ha ji mee Ememme Ngabiga mee ya. (Gụọ Matiu 26: 26-28.) Ọ bụ naanị achịcha na-ekoghị eko na mmanya ha nwere ebe ahụ ka o ji mee ya. Ọ gwara ndịozi ya na ihe abụọ a nọchiri anya ahụ́ ya na ọbara ya zuru okè ọ ga-eji chụọ àjà maka ha n’oge na-adịghị anya. O nwere ike ịbụ na o jughị ndịozi ya anya na o jighị ọtụtụ ihe mee ya. N’ihi gịnị?

4. Olee otú ihe ahụ Jizọs gwara Mata ná mmalite si nyere anyị aka ịghọta ihe mere Jizọs ji jiri ihe ole na ole mee Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị?

4 Ka anyị tụlee ihe mere ọnwa ole na ole tupu Jizọs emee Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị, ya bụ, n’afọ nke atọ ọ malitere ozi ya, mgbe ọ gara n’ụlọ ezigbo ndị enyi ya aha ha bụ Lazarọs, Mata na Meri. Mgbe ya na ha nọ, ọ malitere izi ha ihe. Mata nọkwa ebe ahụ, ma ọ nọ na-agbakeri ala n’ihi ọtụtụ nri ọ na-esiri onye ọbịa ya pụrụ iche. Mgbe Jizọs hụrụ ihe Mata na-eme, o ji obiọma gbazie ya, si otú ahụ nyere ya aka ịghọta na ọ bụghị mgbe ọ bụla ka isi elu na ala dị mkpa. (Luk 10:​40-42) Ka ọ fọrọ awa ole na ole tupu Jizọs ejiri ndụ ya chụọ àjà, o mere ihe ahụ ọ gwara Mata. O ji ihe ole na ole mee Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị. Olee ihe ihe a na-akụziri anyị banyere Jizọs?

5. Olee ihe Ncheta Ọnwụ Jizọs ọ na-achọghị ka a na-eme ka ọ kpọtụ akpọtụ na-echetara anyị banyere Jizọs? Olee otú nke a si daba n’ihe e kwuru ná Ndị Filipaị 2:​5-8?

5 Jizọs gosiri na ya dị umeala n’obi n’ihe niile o kwuru ma mee. N’ihi ya, o jughị anyị anya na Jizọs gosiri na ya dị umeala n’obi n’abalị ikpeazụ ọ dịrị ndụ n’ụwa. (Mat. 11:29) Ọ ma na ya na-aga ịchụ àjà kachanụ a chụtụrụla kemgbe ụwa nakwa na Jehova ga-akpọlite ya n’ọnwụ ka ọ bụrụ eze n’eluigwe. Ọ bụ eziokwu na ọ ma, ọ chọghị ka a na-eme Ncheta Ọnwụ ya ka ọ kpọtụ akpọtụ ma si otú ahụ mee ka a na-eto ya. Kama, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha jiri ihe ole na ole ndị ahụ na-echeta ọnwụ ya otu ugboro n’afọ. (Jọn 13:15; 1 Kọr. 11:​23-25) Ihe a gosiri na Jizọs adịghị mpako. Anyị nwere obi ụtọ na ịdị umeala n’obi bụ otu n’ime àgwà magburu onwe ya Eze anyị nke eluigwe nwere.​—Gụọ Ndị Filipaị 2:​5-8.

6. Ọ bụrụ na nsogbu abịara anyị, olee otú anyị ga-esi eṅomi Jizọs n’otú o si dịrị umeala n’obi?

6 Olee otú anyị ga-esi dịrị umeala n’obi ka Jizọs? Ọ bụ ịna-eme ihe ndị ga-abara ndị ọzọ uru. (Fil. 2:​3, 4) Cheta ihe mere n’abalị ikpeazụ Jizọs nọrọ n’ụwa. Ọ ma na n’oge na-adịghị anya, na ọ ga-anwụ ọnwụ ahụhụ, n’agbanyeghị  nke ahụ, ihe na-echu ya ụra bụ ndịozi ya kwesịrị ntụkwasị obi, bụ́ ndị ga-eruwere ya uju n’oge na-adịghị anya. N’ihi ya, o ji abalị ikpeazụ ya na-enye ha ndụmọdụ, na-agba ha ume ma na-eme ka obi sie ha ike. (Jọn 14:​25-31) Jizọs mekwuru ihe ga-abara ndị ọzọ uru karịa ihe ga-abara onwe ya uru. Ihe a o mere bụ ihe anyị kwesịrị ịna-eme.

JIZỌS NWERE OBI IKE

7. Olee otú Jizọs si gosi na ya nwere obi ike obere oge ọ malitere Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị?

7 Obere oge Jizọs malitere Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị, o mere ihe gosiri na ya nwere obi ike. Olee otú o si mee ya? O kwetara ime ihe Chineke bu n’obi ka o mee, ọ bụ eziokwu na ọ ma na ime otú ahụ pụtara na ọ ga-anwụ ọnwụ ihere maka na ha boro ya ebubo na o kwuluru Chineke. (Mat. 26:​65, 66; Luk 22:​41, 42) Jizọs nọgidere na-ekwesị ntụkwasị obi iji kwanyere aha Chineke ùgwù, igosi na ọ bụ Chineke kwesịrị ịchị nakwa iji mee ka ụmụ mmadụ chegharịrị echegharị nweta ndụ ebighị ebi. Ihe ọzọ bụ na o mere ka ọ kwadebe ndị na-eso ụzọ ya maka nsogbu ga-abịara ha n’oge na-adịghị anya.

8. (a) Olee ihe Jizọs gwara ndịozi ya kwesịrị ntụkwasị obi? (b) Afọ ole na ole Jizọs nwụchara, olee otú ndị na-eso ụzọ ya si nwee obi ike ka ya?

8 Ụzọ ọzọ Jizọs si gosi na ya nwere obi ike bụ na ọ nọghị na-echegbu onwe ya maka nsogbu ndị ọ ga-abụ na o nwere, o lekwasịkwara anya ná mkpa ndịozi ya kwesịrị ntụkwasị obi. Ncheta Ọnwụ ya ahụ ọ malitere mgbe Judas pụrụ, ga-echetara ndị ga-abụ ndị na-eso ụzọ ya e tere mmanụ uru ọbara ya o ji chụọ àjà bara nakwa iso n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ. (1 Kọr. 10:​16, 17) Ka ha nwee ike ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi ma soro Jizọs nọrọ n’eluigwe, ọ gwara ha ihe ya na Nna ya chọrọ ka ha na-eme. (Jọn 15: 12-15) Ọ gwakwara ndịozi ya ọnwụnwa ndị ga-abịara ha. Ọ gwaziri ha ka ha ‘nwee obi ike’ ma si otú ahụ gbaa ha ume ka ha na-eme ka ya. (Jọn 16:​1-4a, 33) Mgbe ọtụtụ afọ gachara, ndị na-eso ụzọ Jizọs ka nọkwa na-eme ka Jizọs n’imere ndị ọzọ ihe ndị ga-abara ha uru ma na-enwe obi ike. N’agbanyeghị na ha ma na ha ga-ata ahụhụ, ha nyeere ibe ha aka n’ọnwụnwa ndị bịaara ha.​—Hib. 10:​33, 34.

9. Olee otú anyị ga-esi na-enwe obi ike ka Jizọs?

9 Taa, anyị na-enwe obi ike ka Jizọs. Dị ka ihe atụ, ka anyị nwee ike inyere ụmụnna anyị a na-emekpọ ọnụ n’ihi okwukwe ha aka, anyị kwesịrị inwe obi ike. Mgbe ụfọdụ, e nwere ike ịtụ ụmụnna anyị mkpọrọ na-ezighị ezi. Ụdị ihe a mee, anyị ga-eme ihe niile anyị nwere ike ime iji nyere ha aka, ma gbachitere ha. (Fil. 1:14; Hib. 13:19) Ụzọ ọzọ anyị si egosi na anyị nwere obi ike bụ ịnọgide na-ekwusa ozi ọma “n’atụghị egwu.” (Ọrụ 14:3) Anyị kpebisiri ike ịna-ekwusa ozi Alaeze otú ahụ Jizọs mere, n’agbanyeghị na ndị mmadụ nwere ike ịna-emegide anyị. Ma mgbe ụfọdụ, anyị nwere ike ịchọpụta na anyị enweghị obi ike. Olee ihe anyị ga-eme?

10. Izu ole na ole tupu Ncheta Ọnwụ Jizọs, olee ihe anyị kwesịrị ime, n’ihi gịnịkwa?

10 Ihe anyị ga-eme iji nwekwuo obi ike bụ ịna-eche banyere olileanya ahụ anyị nwere n’ihi àjà Jizọs ji ndụ ya chụọ. (Jọn 3:16; Efe. 1:7) Izu ole na ole tupu Ncheta Ọnwụ Jizọs, anyị nwere ohere magburu onwe ya igosi na obi dị anyị ụtọ maka ihe mgbapụta ahụ. N’oge ahụ, ka anyị jisie ike gụọ Ọgụgụ Baịbụl maka Ncheta Ọnwụ Jizọs, na-ekpe ekpere ma na-echebara ihe ndị mere tupu e gbuo Jizọs echiche. Anyị bịazie maka Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị, anyị ga-aghọtakwu uru achịcha na mmanya ahụ e ji echeta ọnwụ Jizọs bara, ghọtakwa ihe ha  nọchiri anya ha. Ọ bụrụ na anyị aghọta ihe Jehova na Jizọs meere anyị, ma ghọta otú o si baara anyị na ndị anyị hụrụ n’anya uru, ọ na-eme ka olileanya anyị nwere maka ọdịnihu sikwuo ike, meekwa ka anyị jiri obi ike na-atachi obi ruo ọgwụgwụ.​—Hib. 12:3.

11-12. Ka ọ dị ugbu a, olee ihe anyị mụtarala?

11 Ka ọ dị ugbu a, anyị amụtala na ihe Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị na-echetara anyị abụghị naanị maka ihe mgbapụta ahụ dị oké ọnụ ahịa, kama, ọ na-echetakwara anyị banyere ịdị umeala n’obi na obi ike Jizọs nwere, bụ́ àgwà ya ndị magburu onwe ha. Anyị nwere obi ụtọ na Jizọs ka nwere àgwà ndị a, ebe ọ bụ Nnukwu Onye Nchụàjà anyị nke eluigwe, onye na-arịọrọ anyị arịrịọ. (Hib. 7:​24, 25) Iji gosi na obi dị anyị ụtọ, anyị ga-eji obi anyị niile na-echeta ọnwụ Jizọs, otú ahụ o kwuru ka anyị na-eme. (Luk 22:​19, 20) Anyị na-eme ya n’ụbọchị dabara n’abalị iri na anọ n’ọnwa Naịsan, bụ́ ụbọchị kacha mkpa n’afọ.

12 Anyị nwere ike isi n’otú ahụ Jizọs si jiri ihe ole na ole mee Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị mụta àgwà ọzọ mere o ji nwụọ maka anyị. A ma Jizọs ama maka àgwà a mgbe ahụ ọ nọ n’ụwa. Gịnị bụ àgwà ahụ?

JIZỌS HỤRỤ ANYỊ N’ANYA

13. Olee otú Jọn 15:9 na 1 Jọn 4:​8-10 si kọwaa ụdị ịhụnanya Jehova na Jizọs nwere n’ebe anyị nọ, oleekwa ndị ọ baara uru?

13 Jizọs gosiri na ya hụrụ anyị n’anya ka Jehova n’ihe niile o mere. (Gụọ Jọn 15:9; 1 Jọn 4:​8-10.) Nke kachanụ bụ na Jizọs ji obi ya niile nwụọ maka anyị. Ma ànyị bụ ndị e tere mmanụ ma ọ bụ “atụrụ ọzọ,” ịhụnanya Jehova na Ọkpara ya nwere n’ebe anyị nọ baara anyị uru n’ihi àjà ahụ Jizọs ji ndụ ya chụọ. (Jọn 10:16; 1 Jọn 2:2) Cheekwa banyere achịcha na mmanya ahụ e ji mee Ncheta Ọnwụ Jizọs. Ha gosiri na Jizọs hụrụ ndị na-eso ụzọ ya n’anya ma na-eche banyere ha. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ?

Jizọs gosiri na ọ hụrụ anyị n’anya. O ji ihe ole na ole malite Ncheta Ọnwụ ya, bụ́ nke a na-eme kemgbe ọtụtụ narị afọ nakwa n’ọnọdụ dị iche iche (A ga-akọwa ya na paragraf nke 14 ruo na nke 16) *

14. Olee otú Jizọs si gosi na ya hụrụ ndị na-eso ụzọ ya n’anya?

14 Jizọs gosiri ndị na-eso ụzọ ya e tere mmanụ na ya hụrụ ha n’anya. Otú o si mee ya bụ na o ji ihe ole na ole malite Ncheta Ọnwụ ya ka ha hụ otú o si mee ya. Ka oge na-aga, ha kwesịrị ịna-eme Ncheta Ọnwụ Jizọs kwa afọ, n’agbanyeghị ọnọdụ ha nọ na ya, ma n’ụlọ mkpọrọ. (Mkpu. 2:10) Hà merenụ ihe Jizọs gwara ha na-eme? À na-ajụkwa ajụ?

15-16. Olee otú ụfọdụ ụmụnna anyị sirila mee Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị ma mgbe ọnọdụ tara ezigbo akpụ?

15 Malite n’oge ndịozi Jizọs ruo taa, ezigbo Ndị Kraịst na-agba mbọ na-echeta ọnwụ Jizọs. Ha na-agbalị eme ya otú Jizọs si mee Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị, mgbe ụfọdụ, ha na-eme ya n’ọnọdụ ndị tara akpụ. Tụlee ihe atụ ndị a. Mgbe Nwanna Harold King nọ naanị ya n’ụlọ mkpọrọ dị na Chaịna, o chepụtara ụzọ ọ ga-esi cheta ọnwụ Jizọs. O ji ihe ndị o nwere kwadebe achịcha na mmanya e ji echeta ọnwụ Jizọs n’enweghị onye ma banyere ya. Ọ sara anya ná mmiri gbakọọ ụbọchị a ga-eme ya. Mgbe oge ahụ ruru, ọ bụrụ abụ, kpee ekpere ma kwuo okwu si na Baịbụl.

16 Tụleekwa ihe atụ ọzọ. A tụrụ ụmụnna nwaanyị ụfọdụ mkpọrọ n’otu ogige ịta ahụhụ n’oge Agha Ụwa nke Abụọ. Ha mere Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị n’agbanyeghị na o nwere ike ime ka ha baa ná nsogbu. Ma n’ihi otú ihe ndị e ji mee ya si dịrị mfe nnweta, ha ji akọ mee ya ka a ghara ịhụ ha. Ha kwuru, sị: “Anyị guzo ọtọ ma gbaa onwe anyị gburugburu.  E nwere otu oche dị n’ihu anyị e ji ákwà ọcha sachie ma dewe achịcha na mmanya n’elu ya. Anyị mụnyere kandụl n’ihi na ịgbanye ọkụ eletrik nwere ike ime ka ndị mmadụ mata ihe anyị na-eme. . . . Anyị nọ ebe ahụ kweghachi Nna anyị nkwa na anyị ga-eji ike anyị niile mee ka e wepụ aha nsọ Ya n’ụta.” Ihe a ha mere gosiri na ha nwere ezigbo okwukwe. Jizọs gosikwara na ya hụrụ anyị n’anya mgbe o mere ka ọ dịrị anyị mfe icheta ọnwụ ya ma mgbe ọnọdụ tara ezigbo akpụ.

17. Olee ajụjụ ndị anyị nwere ike ịjụ onwe anyị?

17 Ka Ncheta Ọnwụ Jizọs na-eru nso, anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị ajụjụ ndị a: ‘Olee otú m nwere ike isi hụ ndị ọzọ n’anya ka Jizọs? M̀ na-echebara mkpa ụmụnna m echiche karịa mkpa nke m? M̀ na-atụ anya ka ụmụnna m mee ihe ha na-agaghị emeli, ka m̀ ma ihe ha na-agaghị emeli?’ Ka anyị na-eme ka Jizọs mgbe niile ma na-egosi na ‘ihe banyere onye ọzọ na-emetụ anyị n’obi.’​—1 Pita 3:8.

BURU IHE NDỊ A Ị MỤTARA N’OBI

18-19. (a) Olee ihe obi kwesịrị isi anyị ike maka ya? (b) Gịnị ka i kpebisiri ike ime?

18 Ncheta Ọnwụ Jizọs a gwara anyị na-eme ga-akwụsị otu ụbọchị. Mgbe Jizọs ‘ga-abịa’ n’oge oké mkpagbu, ọ ga-achịkọta “ndị ọ họọrọ” laa n’eluigwe, mgbe ahụ, agaghịkwa na-eme Ncheta Ọnwụ ya.​—1 Kọr. 11:26; Mat. 24:31.

19 Mgbe a kwụsịrị icheta ọnwụ Jizọs, obi kwesịrị isi anyị ike na ndị na-efe Jehova ga-eji obi ụtọ na-echeta mgbe ha na-echeta ọnwụ Jizọs n’ihi na ọ nọchiri anya ụdị ịdị umeala n’obi, obi ike na ịhụnanya kachanụ mmadụ gositụrụla anyị. N’oge ahụ, o doro anya na ndị sorola cheta ọnwụ Jizọs ga na-ekwu banyere ya ka ọ baara ndị niile ga-adị ndụ mgbe ahụ uru. Ma, ka Ncheta Ọnwụ Jizọs nwee ike ịbara anyị uru ugbu a, anyị ga-ekpebisi ike iṅomi otú Jizọs si dịrị umeala n’obi, nwee obi ike na otú o si hụ ndị mmadụ n’anya. Anyị mee otú ahụ, obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova ga-agọzi anyị.​—2 Pita 1:​10, 11.

ABỤ 13 Ọ Bụ Kraịst Ka Anyị Na-eso

^ par. 5 N’oge na-adịghị anya, anyị ga-aga maka Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị iji cheta ọnwụ Jizọs Kraịst. Ọ na-akụziri anyị ọtụtụ ihe banyere ụdị ịdị umeala n’obi, obi ike na ịhụnanya Jizọs nwere. N’isiokwu a, anyị ga-atụle otú anyị nwere ike isi na-akpa àgwà ndị ahụ magburu onwe ha Jizọs nwere.

^ par. 2 NKỌWAKWU: Ihe ncheta pụtara bụ ime ihe pụrụ iche iji cheta ememme dị mkpa ma ọ bụ mmadụ.

^ par. 56 NKỌWA FOTO: Ebe a na-egosi otú ndị ohu Chineke kwesịrị ntụkwasị obi si cheta ọnwụ Jizọs n’oge ndịozi Jizọs; n’ihe dị ka afọ 1880; n’ogige ịta ahụhụ ndị Nazi nakwa n’oge anyị a n’Ụlọ Nzukọ Alaeze a na-ekpuchighị elu ya, bụ́ nke na-efughị oké ego. Ọ dị n’otu mba na-ekpo ọkụ, nke dị n’Ebe Ndịda Amerịka.