Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Họrọ asụsụ Igbo

 ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ 7

Na-adị Umeala n’Obi ma Na-eme Ihe Dị Jehova Mma

Na-adị Umeala n’Obi ma Na-eme Ihe Dị Jehova Mma

“Chọọnụ Jehova, unu niile ndị dị umeala n’obi bi n’ụwa . . . Chọọnụ ịdị umeala n’obi.”​—ZEF. 2:3.

ABỤ 80 ‘Detụ Jehova Ire, Hụ na Ọ Dị Mma’

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1-2. (a) Olee otú Baịbụl si kọwaa Mozis, oleekwa ihe o mere? (b) Olee ezigbo ihe mere anyị ji kwesị ịdị umeala n’obi?

NA Baịbụl, a kọwara Mozis dị ka onye “dị nnọọ umeala n’obi karịa mmadụ niile nọ n’elu ala.” (Ọnụ Ọgụ. 12:3) Ma, nke a ọ̀ pụtara na ọ bụ onye na-esighị ike, onye ọ na-esiri ike ime mkpebi, nakwa onye na-anaghị akwụrụ n’ụkwụ ya? Ọ bụ otú a ka ụfọdụ ndị si akọwa onye dị umeala n’obi. Ma, nke ahụ abụghị eziokwu. Mozis bụ ohu Chineke dị ike, onye na-emere onwe ya mkpebi, nakwa onye nwere obi ike. Jehova nyeere ya aka ya agakwuru eze Ijipt dị ike, duru ihe dị ka nde ndị Izrel atọ gafere ala ịkpa, nyekwara ha aka imeri ndị iro ha.

2 Anyị enweghị ụdị nsogbu ndị ahụ Mozis meriri. Ma kwa ụbọchị, anyị na ndị na-eme ka ọ na-esiri anyị ike ịdị umeala n’obi na-emekọrịta ihe, nsogbu ndị na-emekwa ka o siere anyị ike ịdị umeala n’obi na-abịakwara anyị. Ma, anyị nwere ezigbo ihe ga-eme ka anyị dịrị umeala n’obi. Jehova kwere anyị nkwa na “ndị dị umeala n’obi ga-enweta ụwa.” (Ọma 37:11) Ị̀ ga-asị na ị dị umeala n’obi? Ndị ọzọ, hà ga-ekwukwa otu ihe ahụ banyere gị? Ka anyị nwee ike ịza ajụjụ ndị a dị mkpa, ka anyị buru ụzọ mata ihe mmadụ ịdị umeala n’obi pụtara.

GỊNỊ BỤ ỊDỊ UMEALA N’OBI?

3-4. (a) Olee ihe anyị nwere ike iji tụnyere ịdị umeala n’obi? (b) Olee àgwà ndị anyị kwesịrị inwe ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ịdị umeala n’obi, n’ihi gịnịkwa?

3 Ịdị umeala n’obi * dị ka ihe osise mara mma. Olee ihe mere anyị ji kwuo otú ahụ? Onye na-ese ihe na-eji ihe ndị  nwere ụcha dị iche iche ese ihe ka ihe ọ na-ese nwee ike ịma mma. Otú ahụkwa ka anyị kwesịrị inwe ezigbo àgwà dị iche iche ka anyị nwee ike ịdị umeala n’obi. Ụfọdụ n’ime àgwà ndị ahụ bụ nrubeisi, obiọma, na obi ike. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ime ihe dị Jehova mma, gịnị mere anyị kwesịrị iji nwee àgwà ndị a?

4 Ọ bụ naanị ndị dị umeala n’obi ga na-eme uche Chineke. Ihe so n’uche Chineke bụ ka anyị na-adị nwayọọ n’obi. (Mat. 5:5; Gal. 5:23) Ọ bụrụ na anyị emee uche Chineke, iwe na-ewe Setan. Ọ bụ ya mere na n’agbanyeghị na anyị dị nwayọọ, ndị bụ́ nke Setan na-akpọ anyị asị. (Jọn 15:​18, 19) N’ihi ya, anyị kwesịrị inwe obi ike ka anyị nwee ike imeri Setan.

5-6. (a) Olee ihe mere Setan achọghị iji anya ahụ ndị dị umeala n’obi? (b) Olee ajụjụ ndị anyị ga-aza?

5 Onye na-adịghị umeala n’obi na-adị mpako, na-ewe oké iwe, ọ naghịkwa erubere Jehova isi. Ọ bụ àgwà ndị a ka e ji mara Setan. Ka a sịkwa ihe mere na ọ chọghị iji anya ahụ ndị dị umeala n’obi. Àgwà ọma ha na-akpa na-eme ka ndị mmadụ mata na ọ bụ onye obi ọjọọ n’ihi na o nweghị àgwà ndị ahụ. Ihe ọzọ bụ na àgwà ndị a na-egosi na ọ bụ onye ụgha. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na n’agbanyeghị ihe ọ bụla ọ na-ekwu ma ọ bụ na-eme, ọ gaghị akwụsịli ndị dị umeala n’obi ife Jehova.​—Job 2:​3-5.

6 Olee mgbe o nwere ike isiri anyị ike ịdị umeala n’obi? Oleekwa ihe mere anyị ji kwesị ịgbalị ka anyị na-adị umeala n’obi? Ka anyị nwee ike ịza ajụjụ ndị ahụ, anyị ga-atụle gbasara Mozis, ụmụ okorobịa atọ ahụ a dọọrọ n’agha laa Babịlọn, nakwa Jizọs.

OLEE MGBE Ọ NA-ESI IKE ỊDỊ UMEALA N’OBI?

7-8. Olee ihe Mozis mere mgbe a na-akwanyereghị ya ùgwù?

7 Mgbe e nyere anyị ikike: O nwere ike isiri ndị e nyere ikike ike ịna-adị umeala n’obi, nke ka nke, mgbe onye nọ n’okpuru ha nupụụrụ ha isi ma ọ bụ kwuo na ha anaghị eme mkpebi dị mma. Ụdị ihe a ò metụla gị? Ọ bụrụkwanụ na ọ bụ onye ezinụlọ gị mere ya? Gịnị ka ị ga-eme? Ka anyị tụlee ihe Mozis mere mgbe ụdị ihe a mere ya.

8 Jehova họpụtara Mozis ka ọ bụrụ onye ndú ụmụ Izrel. O mekwara ka o dee  iwu ndị ga na-achị ha. O doro anya na Jehova kwụ Mozis n’azụ. N’agbanyeghị nke ahụ, ụmụnne ya bụ́ Miriam na Erọn kwuru okwu ọjọọ banyere ya, kwuokwa na o kwesịghị ịlụ nwaanyị ọ lụrụ. Ụfọdụ ndị nọ n’ọkwá Mozis nọ na ya gaara ewe ezigbo iwe ma chọwa otú ha ga-esi emesi ha ike. Ma, Mozis emeghị otú ahụ. O weghị iwe ọsọ ọsọ. Ọ rịọdịrị Jehova ka ọ gwọọ Miriam ekpenta o tiri ya. (Ọnụ Ọgụ. 12:​1-13) Olee ihe mere Mozis ji mee otú ahụ?

Mozis rịọrọ Jehova ka ọ gwọọ Miriam ekpenta ya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 8)

9-10. (a) Olee ihe Jehova nyeere Mozis aka ịghọta? (b) Olee ihe ndị isi ezinụlọ na ndị okenye ga-amụta n’aka Mozis?

9 Mozis kwere ka Jehova zụọ ya. Ihe dị ka afọ iri anọ tupu mgbe ahụ, mgbe Mozis nọ n’obí eze n’Ijipt, ọ dịghị umeala n’obi. Nke bụ́ eziokwu bụ na e nwere mgbe o were iwe ọkụ, gbuo otu nwoke o chere na ihe ọ na-eme adịghị mma. Mozis chere na ihe ndị o mere ga-adị Jehova mma. Jehova ji afọ iri anọ nyere ya aka ịghọta na ọ bụghị naanị obi ike ka o kwesịrị inwe, kama, o kwesịkwara ịdị umeala n’obi ka o nwee ike idu ụmụ Izrel. Ka o nwee ike ịdị umeala n’obi, o kwesịrị iwetu onwe ya ala, na-erube isi ma dịrị obiọma. Ọ mụtara àgwà ndị a ma bụrụ ezigbo onye ndú.​—Ọpụ. 2:​11, 12; Ọrụ 7:​21-30, 36.

10 Taa, ndị isi ezinụlọ na ndị okenye kwesịkwara iṅomi Mozis. Ọ bụrụ na a kwanyereghị unu ùgwù, unu ewela iwe ọsọ ọsọ. Kwetanụ ihe ndị unu mejọrọ ma si otú ahụ gosi na unu dị umeala n’obi. (Ekli. 7:​9, 20) Meenụ ihe Jehova kwuru gbasara idozi nsogbu. Medanụ obi zaghachi. (Ilu 15:1) Ọ bụrụ na ndị isi ezinụlọ na ndị okenye ana-eme ihe ndị a, ha na-eme Jehova obi ụtọ, na-eme ka udo dị, na-emekwa ka ndị ọzọ mụta otú ha ga-esi adị umeala n’obi.

11-13. Olee ihe ndị Hibru atọ ahụ mere anyị kwesịkwara ime?

11 Mgbe a na-akpagbu anyị: Kemgbe ụwa, ndị ọchịchị na-emekpọ ndị Jehova ọnụ. Ha nwere ike ibo anyị ebubo na anyị mere ihe ọjọọ. Ma, ihe mere ha ji eme ya bụ n’ihi na anyị kpebiri “irubere Chineke isi dị ka onye na-achị achị karịa mmadụ.” (Ọrụ 5:29) E nwere ike iji anyị eme ihe ọchị, tụọ anyị mkpọrọ ma ọ bụdị kụọ anyị isi aba okpu. Ma n’ihi na Jehova na-enyere anyị aka, anyị agaghị emegwara ha ihe ha mere anyị, kama, anyị ga-agbachi ha nkịtị n’oge ahụ.

12 Ka anyị tụlee ihe ndị Hibru atọ ahụ a dọọrọ n’agha laa Babịlọn aha ha bụ Hananaya, Mishel, na Azaraya mere anyị kwesịrị ịna-eme. * Eze Babịlọn nyere ha  iwu ka ha kpọọrọ otu ihe oyiyi ukwu e ji ọlaedo mee isiala. Ha medara obi kọwaara eze ahụ ihe mere na ha agaghị akpọrọ ihe oyiyi ahụ isiala. Ha nọgidere na-erubere Chineke isi n’agbanyeghị na eze ahụ yiri ha egwu na ọ ga-atụba ha n’oké ọkụ. Jehova napụtara ha ozugbo, ọ bụ eziokwu na ha echeghị na ọ ga-eme otú ahụ. Ha dị njikere ịnabata ihe ọ bụla Jehova kwere ka o mee. (Dan. 3:​1, 8-28) Ihe a ha mere gosiri na ndị dị umeala n’obi na-enwe obi ike. O nweghị eze, ụdị iyi egwu ọ bụla, nakwa ụdị ntaramahụhụ ọ bụla nwere ike ime ka anyị kwụsị ife Jehova “ofufe a na-ekewaghị ekewa.”​—Ọpụ. 20:​4, 5.

13 Olee otú anyị nwere ike isi ṅomie ndị Hibru atọ ahụ ma ndị mmadụ chọọ ka anyị kwụsị irubere Chineke isi? Anyị ga-adị umeala n’obi ma tụkwasị Jehova obi na ọ ga-enyere anyị aka. (Ọma 118:​6, 7) Anyị ga-akwanyere ndị na-ekwu na anyị mere ihe ọjọọ ùgwù, jirikwa nwayọọ zaghachi ha. (1 Pita 3:15) Anyị agaghị anwa anwa mee ihe ọ bụla ga-emebi adịm ná mma anyị na Nna anyị hụrụ anyị n’anya.

Ọ bụrụ na ndị mmadụ achọghị iji ntị anụ ozi ọma anyị, anyị ga-akwanyere ha ùgwù mgbe anyị na-azaghachi ha (A ga-akọwa ya na paragraf nke 13)

14-15. (a) Olee ihe nwere ike ime anyị ma anyị na-echegbu onwe anyị? (b) Dị ka Aịzaya 53:​7, 10 si kwuo, gịnị mere anyị nwere ike iji kwuo na Jizọs bụ onye kacha dịrị umeala n’obi mgbe e nwere ihe na-echegbu ya?

14 Mgbe e nwere ihe na-echegbu anyị: E nwere ọtụtụ ihe na-eme ka anyị na-echegbu onwe anyị. O nwere ike ịbụ na anyị na-echegbu onwe anyị tupu anyị elee ule n’ụlọ akwụkwọ ma ọ bụkwanụ ma e nwee ọrụ anyị chọrọ ịrụ n’ụlọ ọrụ anyị. Anyị nwekwara ike ichegbu onwe anyị ma a chọọ ịwa anyị ahụ́ ma ọ bụkwanụ chọọ ile anyị ahụ́. Ọ na-esiri anyị ike ịdị umeala n’obi ma anyị na-echegbu onwe anyị. Ihe ndị na-anaghị enye anyị nsogbu nwere ike malite ịgbakasị anyị ahụ́. Anyị nwere ike ịgwa ndị mmadụ okwu ọjọọ ma ọ bụ meso ha ihe n’ụzọ na-adịghị mma. Ọ bụrụ na e nwetụla mgbe i chegburu onwe gị, ihe Jizọs mere ga-enyere gị aka.

15 Mgbe ọ fọrọ ọnwa ole na ole ka Jizọs nwụọ, e nwere ihe ndị nọ na-echegbu ya. Ọ ma na a ga-egbu ya nakwa na ọ ga-ata nnukwu ahụhụ. (Jọn 3:​14, 15; Gal. 3:13) Ọnwa ole na ole tupu ọnwụ ya, o kwuru na e nwere ihe na-ewute ya. (Luk 12:50) Mgbe ọ fọrọ ụbọchị ole na ole ka ọ nwụọ, o kwuru, sị: “Ọ dị ihe na-echegbu mkpụrụ obi m.” Ihe ndị o kwuru mgbe ọ na-agwa Chineke otú obi dị ya n’ekpere gosiri na ọ dị umeala n’obi ma na-erubere Chineke isi. Ọ sịrị: “Nna, zọpụta m n’oge awa a. Otú o sina dị, ọ bụ nke a mere m ji bịaruo n’oge awa a. Nna, mee ka aha gị dị ebube.” (Jọn 12:​27, 28) Mgbe oge ahụ ruru, Jizọs ji obi ike nyefee ndị iro Chineke onwe ya, ha emee ka ọ taa ahụhụ tupu ya anwụọ ma menye ya ihere. N’agbanyeghị ihe ndị ahụ, Jizọs mere uche Chineke. N’ihi ya, obi siri anyị ike ikwu na Jizọs bụ onye kacha dịrị umeala n’obi mgbe e nwere ihe na-echegbu ya.​—Gụọ Aịzaya 53:​7, 10.

Jizọs bụ onye kacha dịrị umeala n’obi (A ga-akọwa ya na paragraf nke 16 ruo na nke 17) *

16-17. (a) Olee ihe ndịozi Jizọs mere nke gaara eme ka o siere ya ike ịdị umeala n’obi? (b) Olee otú anyị ga-esi na-eṅomi Jizọs?

16 N’abalị ikpeazụ Jizọs dịrị ndụ n’ụwa, ndịozi ya mere ihe gaara eme ka o siere ya ike ịdị umeala n’obi. Chegodị otú Jizọs si chegbuo onwe ya n’abalị ahụ. Ọ̀ ga-anọgide na-erubere Chineke isi ruo ọnwụ? Ọ bụrụ na o rubereghị Chineke isi, o nweghị onye gaara enwe olileanya ịdị ndụ ebighị ebi. (Rom 5:​18, 19) Nke kachanụ bụ na ihe o mere ga-eme ka e nye Nna ya otuto ma ọ bụ kọchaa ya. (Job 2:4) Mgbe ya na ndịozi ya na-eri nri ikpeazụ, ndịozi ya nọ na-ese ezigbo okwu banyere “onye ọ bụ n’ime ha nke yiri ka ọ bụ ya  kasị ukwuu.” Jizọs agbaziela ha ọtụtụ ugboro tupu mgbe ahụ banyere ihe a, ma ná mgbede ụbọchị ahụ. O doro anya na Jizọs ewereghị ha iwe. Kama, o medara obi gwa ha okwu. Jizọs ji nwayọọ gwa ha hoo haa ọzọ ụdị àgwà ha kwesịrị inwe. Ọ jaziri ha mma maka otú ha si jiri obi ha niile na-akwado ya.​—Luk 22:​24-28; Jọn 13:​1-5, 12-15.

17 Gịnị ka ị gaara eme ma a sị na ọ bụ gị ka ụdị ihe a mere? Anyị kwesịrị ime ka Jizọs ma dịrị nwayọọ n’obi ma mgbe e nwere ihe na-echegbu anyị. Jiri obi gị niile na-edebe iwu Jehova bụ́ “na-agbaghara ibe unu kpamkpam.” (Kọl. 3:13) Ọ bụrụ na anyị echeta na anyị niile na-eme ma na-ekwu ihe na-ewe ndị ọzọ iwe, anyị ga-eme ihe a Chineke kwuru. (Ilu 12:18; Jems 3:​2, 5) Na-ajakwa ndị ọzọ mma maka àgwà ọma ha.​—Efe. 4:29.

GỊNỊ MERE ANYỊ KWESỊRỊ IJI NA-AGBALỊ ADỊ UMEALA N’OBI?

18. Olee otú Jehova na-esi enyere ndị dị umeala n’obi aka ime ezigbo mkpebi, ma gịnị ka ha ga-eme?

18 Anyị ga na-eme ezigbo mkpebi. Mgbe ọ na-esiri anyị ike ikpebi ihe anyị ga-eme, Jehova ga-enyere anyị aka ime ezigbo mkpebi. Ma ọ ga-emere anyị ya naanị ma anyị dịrị umeala n’obi. Ọ gwara anyị na ọ ga-anụ “arịrịọ ndị dị umeala n’obi na-arịọ.” (Ọma 10:17) Ọ ga-emere anyị ihe karịrị ịnụ arịrịọ anyị. Baịbụl kwuru, sị: “Ọ ga-eme ka ndị dị umeala n’obi na-eje ije ná mkpebi ikpe ya, ọ ga-ezikwa ndị dị umeala n’obi ụzọ ya.” (Ọma 25:9) Jehova na-eji Baịbụl, akwụkwọ anyị, * vidio na ọmụmụ ihe “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” na-ahazi akụziri anyị ihe. (Mat. 24:​45-47) Anyị kwesịrị ịdị umeala n’obi ma kweta na anyị chọrọ enyemaka Jehova. Otú anyị ga-esi eme ya bụ ịmụ Okwu ya na iji obi anyị niile na-eme ihe anyị na-amụta.

19-21. Olee ihe Mozis mejọrọ na Kedesh, oleekwa ihe anyị na-amụta na ya?

19 Anyị agaghị na-emejọkarị ihe. Chegodị ọzọ banyere Mozis. Ruo ọtụtụ afọ, ọ nọgidere na-adị umeala n’obi ma mee ihe dị Jehova mma. Ma mgbe ndị Izrel wagharịrị n’ọzara ihe fọrọ obere ka o ruo afọ iri anọ, Mozis egosizighị na ya dị umeala n’obi. Nwanne ya nwaanyị, onye ọ ga-abụ ya nyere aka chebe ya n’Ijipt, ka nwụrụ anwụ, e liekwa ya na Kedesh. Ndị  Izrel malitekwara ikwu na anaghị elekọta ha nke ọma. Na nke ugbu a, ha ‘sesara Mozis okwu’ n’ihi na ha enweghị mmiri ha ga-aṅụ. N’agbanyeghị ọtụtụ ọrụ ebube Jehova si n’aka Mozis rụọ, nakwa otú Mozis si jiri obi ya niile duo ndị Izrel ọtụtụ afọ, ha ka nọ na-eme mkpesa. Ha mere mkpesa, ọ bụghị naanị maka mmiri, kama banyere Mozis, ka à ga-asị na ọ bụ ya mere na ha enweghị mmiri ha ga-aṅụ.​—Ọnụ Ọgụ. 20:​1-5, 9-11.

20 Mozis were ezigbo iwe ma kwụsị ịdị umeala n’obi. Kama ịgwa nkume ahụ okwu otú ahụ Jehova gwara ya, o ji iwe gwa ụmụ Izrel okwu ma kwuo na ya ga-arụ ọrụ ebube. Ọ kụziri nkume ahụ ihe ugboro abụọ, mmiri buru ibu agbapụta. Iwe na mpako mere ka o mejọọ ihe. (Ọma 106:​32, 33) Mozis abanyeghị n’Ala Nkwa ahụ n’ihi na ọ kwụsịtụrụ ịdị umeala n’obi.​—Ọnụ Ọgụ. 20:12.

21 E nwere ezigbo ihe anyị ga-amụta n’akụkọ a. Nke mbụ, anyị ga na-agbasi mbọ ike ka anyị nọgide dịrị umeala n’obi. Ọ bụrụ na anyị akwụsịtụ ịdị umeala n’obi, anyị nwere ike dịwa mpako, ya emee ka anyị kwuwe ma ọ bụ mewe ihe na-adịghị mma. Nke abụọ, anyị nwee ihe na-echegbu anyị, o nwere ike isiri anyị ike ịdị umeala n’obi. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịgbasị mbọ ike na-adị umeala n’obi ma mgbe e nwere ihe na-echegbu anyị.

22-23. (a) Gịnị mere anyị kwesịrị iji na-adị umeala n’obi? (b) Gịnị ka ihe e kwuru na Zefanaya 2:3 pụtara?

22 A ga-echebe anyị. N’oge na-adịghị anya, Jehova ga-ebibi ndị na-eme ihe ọjọọ n’ụwa. Ọ bụ naanị ndị dị umeala n’obi ka a ga-echebe. Mgbe ahụ, udo ga-adị n’ebe niile n’ụwa. (Ọma 37:​10, 11) Ị̀ ga-eso ná ndị ahụ dị umeala n’obi? I nwere ike iso ma ọ bụrụ na i mee ihe Jehova gwara gị mee na Zefanaya 2:3 (Gụọ ya).

23 Gịnị mere Zefanaya 2:3 ji kwuo, sị: “Ma eleghị anya, a ga-ezobe unu”? Ihe ebe a na-ekwu abụghị na Jehova enweghị ike ichebe ndị chọrọ ime ihe dị ya mma na ndị ọ hụrụ n’anya. Kama, ihe ọ na-ekwu bụ na e nwere ihe anyị kwesịrị ime ka e nwee ike ichebe anyị. E nwere ike ịzọpụta anyị “n’ụbọchị iwe Jehova,” anyị adịrị ndụ ebighị ebi ma ọ bụrụ na anyị agbaa mbọ ugbu a dịrị umeala n’obi ma na-eme ihe dị Jehova mma.

ABỤ 120 Dịrị Umeala n’Obi Ka Jizọs

^ para. 5 O nweghị onye n’ime anyị bu ịdị umeala n’obi pụta ụwa. Anyị ga-agba mbọ ka anyị mụta ya. Anyị nwere ike ịchọpụta na anyị na-adị umeala n’obi ma anyị na ndị na-eme udo na-emekọrịta ihe. Ma, o nwere ike isiri anyị ike ịdị umeala n’obi ma anyị na ndị mpako na-emekọ ihe. N’isiokwu a, anyị ga-atụle ihe ndị anyị ga-agbalịsi ike merie ka anyị nwee ike ịdị umeala n’obi.

^ para. 3 NKỌWAKWU: Ịdị umeala n’obi. Ndị dị umeala n’obi na-eji obiọma emeso ndị ọzọ ihe. Ha anaghịkwa ewe iwe mgbe a kpasuru ha iwe. Ha anaghị adị mpako. Ha na-ewere ya na ndị ọzọ ka ha. Mgbe e kwuru na Jehova dị umeala n’obi, ihe ọ pụtara bụ na ọ na-emere ndị nọ n’okpuru ya ebere ma hụ ha n’anya.

^ para. 12 Ndị Babịlọn gụrụ ndị Hibru atọ ahụ Shedrak, Mishak na Abednego.​—Dan. 1:7.

^ para. 18 Dị ka ihe atụ, gụọ isiokwu bụ́ “Mee Mkpebi Ndị Na-ewetara Chineke Otuto.” Ọ gbara n’Ụlọ Nche Eprel 15, 2011.

^ para. 59 NKỌWA FOTO: Ebe Jizọs medara obi na-agbazi ndịozi ya mgbe ha sechara okwu n’etiti onwe ha banyere onye kachanụ.