ỤLỌ NCHE—NKE A NA-AMỤ AMỤ Febụwarị 2019

Ihe dị n’Ụlọ Nche a bụ isiokwu ndị a ga-amụ malite n’Eprel 8 ruo Mee 5, 2019

Nọgide Na-ekwesị Ntụkwasị Obi

Gịnị bụ ikwesị ntụkwasị obi, oleekwa otú anyị ga-esi nọgide na-ekwesị ntụkwasị obi?

Na-adị Umeala n’Obi ma Na-eme Ihe Dị Jehova Mma

Olee otú Mozis na Jizọs si gosi anyị otú anyị ga-esi na-adị umeala n’obi? Olee uru anyị ga-erite ma anyị dị umeala n’obi taa?

Gịnị Mere Anyị Ji Kwesị Ikele Ndị Meere Anyị Ihe Ọma?

Gịnị ka anyị ga-amụta n’aka Jehova, Jizọs, na onye Sameria bụ́ onye ekpenta banyere ikele ndị meere anyị ihe ọma?

Otú Iwu Mozis Si Gosi na Jehova Nwere Ịhụnanya ma Na-ekpe Ikpe Ziri Ezi

Gịnị ka Iwu Mozis na-egosi banyere otú Chineke si ele ịhụnanya na ikpe ziri ezi n’anya?

AKỤKỌ NDỤ

Ihe Ndị Mụrụ M Kụziiri M Mere Ka Ihe Gaziere M

Gụọ akụkọ ndụ Nwanna Woodworth Mills, bụ́ onye ji obi ya niile jeere Jehova ozi kemgbe ihe dị ka afọ iri asatọ.

Ị̀ Maara?

Olee mgbe a malitere inwe ụlọ nzukọ?