Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Họrọ asụsụ Igbo

 AKỤKỌ NDỤ

Anyị Chọtara “Nkume Pel Dị Nnọọ Oké Ọnụ Ahịa”

Anyị Chọtara “Nkume Pel Dị Nnọọ Oké Ọnụ Ahịa”

NWANNA WINSTON PAYNE na Pamela nwunye ya na-eje ozi n’alaka ụlọ ọrụ anyị dị n’Ọstrelia. Ozi ha na-ejere Jehova na-eme ha obi ụtọ, ma ha enwekwaala nsogbu ụfọdụ. Otu n’ime ha bụ ịgbalị ịmụta otú ndị obodo dị iche iche ha jere ozi si eme ihe. Nke ọzọ abụrụ na ime pụrụ Nwanna Nwaanyị Payne. Ma n’agbanyeghị ihe ndị a, ha nọgidere na-ahụ Jehova na ndị ya n’anya, na-enwekwa obi ụtọ n’ozi ha na-ejere ya. Anyị gbara ha ajụjụ ọnụ, ka ha kọtụrụ anyị ihe ụfọdụ gbasara ndụ ha.

Nwanna Winston, biko gwa anyị otú i si malite ịchọ Chineke.

A mụrụ m n’otu ugbo dịpụrụ adịpụ na Kwinsland, Ọstrelia. Ndị mụrụ m anaghị aga chọọchị. N’ihi na ebe anyị bi dịpụrụ adịpụ, e nwechaghị ndị ọzọ m ma ma e wezụga ndị ezinụlọ anyị. Ma mgbe m dị afọ iri na abụọ, m bidoro ịchọ ịmata Chineke. M kpere ekpere, rịọ ya ka o mee ka m mata eziokwu banyere ya. M mechara hapụ ugbo anyị gaa rụwa ọrụ n’Adelaide dị n’Ebe Ndịda Ọstrelia. Mụ na Pam matara mgbe m di afọ iri abụọ na otu. M gara ezumike na Sidney n’oge ahụ. Ọ gwara m gbasara otu chọọchị. Chọọchị a na-ekwu na ndị Briten si n’ebo ndị a sị furu efu n’Izrel. Ha sịrị na ebo ndị ahụ bụ ebo iri dị n’ebe ugwu Izrel a dọọrọ n’agha n’ihe dị ka n’afọ 740 Tupu Oge Ndị Kraịst. Mgbe m laghachiri Adelaide, m jụrụ otu onye ọrụ ibe m ya na Ndịàmà Jehova malitere ịmụ Baịbụl banyere ya. Mụ na ya kwuru okwu awa ole na ole. Anyị kwuru karịchaa gbasara ihe Ndịàmà Jehova kweere. Mgbe anyị kwuchara, m ghọtara na Chineke azala m ekpere ahụ m kpere mgbe m ka dị obere. Amụtawala m eziokwu banyere Onye Okike m na Alaeze ya. Achọtala m “nkume pel dị nnọọ oké ọnụ ahịa.”​—Mat. 13:​45, 46.

Nwanna Nwaanyị Payne, gịnwa malitekwara ịchọ nkume pel ahụ mgbe ị dị obere. Olee otú i si chọta ya?

A mụrụ m n’obodo Kọf Habọ dị na Niu Saụt Wels. Ndị mụrụ m na ndị mụrụ mama m kweere n’ihe chọọchị ahụ nke na-ekwu na ndị Briten si n’ebo ndị furu efu n’Izrel na-akụzi. A kụziiri mụ na nwanne m nwaanyị tọrọ m na nwanne m nwoke m tọrọ, nakwa ụmụ nwanne mama m na Chineke hụrụ ndị nna nna ha si Briten n’anya karịa  ndị ọzọ. Ekwetaghị m ihe a ha na-akụzi, o meghịkwa ka mụ na Chineke dịrị ná mma. Mgbe m dị afọ iri na anọ, m gara chọọchị dị iche iche dị n’obodo anyị, dị ka, Anglịkan, Baptist, nakwa Seventh-day Adventist. Ma o nweghị nke nyeere m aka ịmata Chineke.

Ezinụlọ anyị mechara kwaga Sidni. Ọ bụ ebe ahụ ka mụ na Winston di m matara mgbe ọ bịara ezumike. Dị ka o kwuru na mbụ, ihe anyị kwurịtara banyere okpukpe mere ka ọ malite iso Ndịàmà Jehova mụwa Baịbụl. Mgbe ọ laghachiri, o bidoro idetara m akwụkwọ ozi. Ihe na-eju na ya bụ ihe dị iche iche Baịbụl kwuru. Ịgwa gị eziokwu, ihe a na-ewekasị m iwe ahụ́ na mbụ. Ma nwayọọ nwayọọ, m chọpụtara na ihe ọ na-ekwu gbasara Chineke bụ eziokwu.

N’afọ 1962, m kwagara Adelaide ka m nwee ike ịnọ Winston nso. Ọ gwara otu di na nwunye bụ́ Ndịàmà Jehova, aha ha bụ Thomas Sloman na Janice, ka mụ na ha biri. Ha bụbu ndị ozi ala ọzọ na Papụa Niu Gini. Adị m afọ iri na asatọ mgbe ahụ. Ha nyeere m ezigbo aka ịmata Jehova nke ọma. M malitekwara ịmụ Okwu Chineke. Obere oge, ya edoo m anya na achọtala m eziokwu. Mgbe mụ na di m lụchara, anyị bidoro ịsụ ụzọ oge niile ozugbo. N’agbanyeghị nsogbu ndị bịaara anyị, ozi anyị na-ejere Chineke emeela ka ọ gọzie anyị nke ukwu, meekwa ka anyị jiri pel ọma a anyị chọtara kpọrọkwuo ihe.

Nwanna Winston, biko gwa anyị banyere afọ ndị mbụ ị malitere ijere Jehova ozi.

A. Map gosiri ebe ndị anyị gara mgbe m bụ onye nlekọta sekit

B. Stamp ndị e ji ezipụ akwụkwọ ozi n’ụfọdụ agwaetiti ndị anyị jere ozi na ha. Ihe a na-akpọbu Kiribati na Tuvalu bụ agwaetiti Gilbat na Elis

C. Ihe a bụ agwaetiti Funafuti dị na Tuvalu. Agwaetiti a mara ezigbo mma. O sokwa n’ọtụtụ agwaetiti ndị anyị gara tupu e ziga ndị ozi ala ọzọ na ya

Obere oge mụ na Pam lụchara, Jehova mepeere anyị ọnụ ụzọ mbụ n’ime ọtụtụ “ọnụ ụzọ buru ibu” maka ijekwuru ya ozi. (1 Kọr. 16:9) Ọ bụ Nwanna Jack Porter gwara anyị banyere ọnụ ụzọ nke mbụ ahụ. Ọ bụ onye nlekọta sekit bịara ileta obere ọgbakọ anyị n’oge ahụ. (Mụ na ya so na kọmitii alaka dị n’Ọstrelia ugbu a.) Nwanna Jack na Roslyn nwunye ya gbara anyị ume ịmalite ịsụ ụzọ oge niile. Mụ na nwunye m sụkwara ụzọ afọ ise. Mgbe m gbara afọ iri abụọ na itoolu, a gwara mụ na nwunye m ka anyị malite ọrụ sekit n’agwaetiti ndị dị n’Ebe Ndịda Pasifik. Ọ bụ alaka ụlọ ọrụ Fiji na-elekọta ebe ndị ahụ. Agwaetiti ndị ahụ bụ Amerịkan Samoa, Samoa, Kiribati, Nawuro, Niyue, Tokelaụ, Tọnga, Tuvalu, na Vanuwatu.

N’oge ahụ, ndị bi n’ụfọdụ agwaetiti ndị dịpụrụ adịpụ na-enyo Ndịàmà Jehova enyo, n’ihi ya, anyị na-akpachara anya ma dị akọ ma anyị gaa izi ha ozi ọma. (Mat. 10:16) Ọgbakọ ndị e nwere ebe ndị ahụ dị obere, ụfọdụ anaghịkwa enwe ike inye anyị ebe anyị ga-ebi. N’ihi ya, anyị na-ajụ ndị obodo ma ànyị nwere ike ịnọ na nke ha. Ha na-ejikarị obi ha niile ekwe ka anyị nọrọ n’ụlọ ha.

Nwanna Winston, anyị chọpụtara na i nwere mmasị ná nsụgharị, olee ihe kpatara ya?

Ebe m na-eduzi ụlọ akwụkwọ ndị okenye na Samoa

Mgbe anyị malitere ije ozi n’agwaetiti ndị dị na Tọnga, ụmụnna ndị nọ n’ebe ahụ nwere naanị traktị na akwụkwọ nta ole na ole e dere n’asụsụ Tọngan. Ha gaa ozi ọma, ha na-eji akwụkwọ Ezi-Okwu Ahu Nke Nedubà ná Ndu Ebigh-Ebi nke Bekee amụrụ ndị mmadụ ihe. N’ihi ya, mgbe anyị gara ụlọ akwụkwọ ndị okenye were izu anọ, ndị okenye atọ na-amachaghị Bekee kwetara ịsụgharị akwụkwọ Ezi-Okwu Ahu n’asụsụ Tọngan. Nwunye m ji taịpraịta dee ihe ha sụgharịrị, anyị eziga ya alaka ụlọ ọrụ dị n’Amerịka ka ha bipụta ya. Ihe niile a were ihe dị ka izu asatọ. Ọ bụ eziokwu na otú ha si sụgharịa akwụkwọ ahụ adịchaghị mma, o nyeere ọtụtụ ndị na-asụ Tọngan aka ịmụta eziokwu. Mụ na nwunye m abụghị ndị nsụgharị, ma ihe a merenụ mere ka anyị nwee mmasị ná nsụgharị.

Nwanna Nwaanyị Payne, otú ihe dị n’agwaetiti ndị ahụ na otú ihe dị n’Ọstrelia hà dị iche?

Ihe a bụ otu n’ime ebe ndị anyị biri mgbe anyị na-arụ ọrụ sekit

Ha dị ezigbo iche. N’ebe ụfọdụ anyị gara n’agwaetiti ndị ahụ, e nwere anwụnta, oké okpomọkụ na òké. Anyị rịakwara ọrịa ọtụtụ ugboro, nweekwa mgbe anyị na-enweghị nri ga-ezuru anyị. Ma ahụ́ na-eru anyị ala  n’abalị ma anyị nọrọ na fale anyị na-ele oké osimiri anya. Fale bụ ihe ndị Samoa na-akpọ ụlọ akịrịka a na-akụchighị ahụ́ ya akụchi. N’abalị ụfọdụ, ọnwa na-aza ala nke na anyị na-ahụ akị bekee ndị dị ebe ahụ, meekwa ka anyị na-ahụ osimiri ahụ nke ọma. Oge ọma ndị ahụ na-enyere anyị aka ikpe ekpere na ịna-eche banyere ihe ọma ndị Jehova na-emere anyị, kama ịna-eche banyere nsogbu anyị.

Anyị bịara hụ ụmụaka ndị ebe ahụ n’anya n’ihi na ha na-eme anyị obi ụtọ, obi na-atọkwa ha ụtọ ma ha hụ anyịnwa bụ́ ndị ọcha. N’otu oge anyị gara Niyue, otu nwatakịrị nwoke metụrụ ajị dị n’aka di m aka, sị ya: “Ajị gị dịcha ka ábụ́bà ọkụkọ, ha mara mma.” Ọ ga-abụrịrị na ọ hụbeghị onye nwere ọtụtụ ajị otú ahụ, ọ maghịkwa otú ọ ga-esi akọwa ya.

O wutere anyị mgbe anyị hụrụ otú ndị mmadụ si daa ogbenye n’ebe ahụ nakwa otú inweta ihe e ji ebi ndụ si esi ike. Obodo ha mara mma ma ha enwechaghị ụlọ ọgwụ na ezigbo mmiri ọṅụṅụ. Ma, o yiri ka ụmụnna anyị anaghị echegbu onwe ha n’ihi ihe ndị a. Ha weere ụwa ha otú ha si hụ ya. Ha na-enwe obi ụtọ na ha na ndị ezinụlọ ha na-anọrị, na ha nwere ebe ha na-anọ efe Jehova, nakwa na ha nwere ike ito Jehova. Otú a ha si ebi ndụ nyeere anyị aka ilekwasị anya n’ihe ndị kacha mkpa ná ndụ nakwa ịghara ịna-achọ ibi ndụ okomoko.

Nwanna Nwaanyị Payne, unu gaa ebe ọhụrụ mgbe ụfọdụ, ị na-eji aka gị gaa kute mmiri, na-esikwa nri unu ga-eri. Olee ihe nyeere gị aka?

Ebe nwunye m na-asa ákwà anyị mgbe anyị nọ na Tọnga

Obi dị m ụtọ na papa m zụrụ m nke ọma. Ọ kụziiri m ọtụtụ ihe, dị ka otú e si eji nkụ esi nri, nakwa otú m ga-esi eme ka obere ihe m nwere zuoro m. N’otu oge anyị gara Kiribati, anyị biri n’obere ụlọ e ji akịrịka kpuchie elu ya, wụọ kọnkịrị n’ala ya, jirikwa osisi achara kụọ ahụ́ ya. Mgbe m chọrọ isi obere nri, m gwuru ala, tinye mkpo akị bekee na ya, jiri ya menye ọkụ. Iji nweta mmiri, m gara soro ụmụ nwaanyị obodo ahụ kwụrụ n’ahịrị n’ebe ha na-esere mmiri. Mgbe o ruru ka m sere mmiri, m gbalịrị ugboro ugboro iji ihe ha ji esere mmiri seta mmiri, ma o kweghị m. Ha niile chịwara m ọchị. Mgbe ha chịchara, otu nwaanyị bịara nyere m aka seta mmiri. Ha na-adị obiọma, na-adịkwa njikere inyere mmadụ aka.

Ozi unu gara n’agwaetiti ndị ahụ tọrọ unu ezigbo ụtọ. Kọtụrụnụ anyị ihe ndị unu na-anaghị echefu echefu banyere ebe ahụ.

Nwanna Winston: O wetụrụ anyị oge tupu anyị aghọta otú ndị ebe ahụ si eme ihe. Dị ka ihe atụ, ụmụnna nyewe anyị nri, ha na-ekupụtachara anyị nri ha siri. Na mbụ, anyị amaghị na anyị kwesịrị irifọrọ ha nri. N’ihi ya, anyị na-ericha ihe ha bupụtara. Ma mgbe anyị ghọtara na anyị kwesịrị ịna-erifọrọ ha nri, anyị mewere ya. Ụmụnna anyị ghọtara na anyị amaghị ụma na-ericha ihe niile na mbụ. Obi na-adịkwa ha ụtọ mgbe ọ bụla anyị bịara ileta ha n’ihe dị ka ọnwa isi ọ bụla. N’oge ahụ, e nweghị Ndịàmà Jehova si ebe ọzọ ụmụnna ndị a hụtụrụla, e wezụga mụ na nwunye m.

Ebe m du ụmụnna na-aga ozi ọma mgbe anyị nọ n’agwaetiti Niyue

Anyị gaa ileta ụmụnna, ọ na-emekwa ka ndị obodo matakwuo ndị Ndịàmà Jehova bụ. Ọtụtụ ndị obodo chere na ọ bụ naanị ụmụnna nọ n’obodo ha bụ Ndịàmà Jehova. Ma mgbe ha hụrụ ka mụ na nwunye m si obodo ọzọ bịa ileta ụmụnna anyị, ha matara na ọ bụghị naanị ụmụnna nọ n’obodo ha bụ Ndịàmà Jehova. Obi tọkwara ha ụtọ.

Nwanna Nwaanyị Payne: Otu n’ime ihe ndị m na-anaghị echefu echefu mere mgbe anyị gara ileta otu ọgbakọ e nwere ụmụnna ole na ole na ya na Kiribati. Nwanna Itinikai Matera, bụ́ naanị okenye ha nwere n’ọgbakọ ahụ, gbalịrị ilekọta anyị nke ọma. Otu ụbọchị, o ji otu nkata otu mkpụrụ àkwá dị na ya bịa na nke anyị. Ọ sịrị: “M wetaara unu àkwá a.” N’oge ahụ, anyị ịta àkwá ọkụkọ bụụrụ anyị nnukwu ihe. Obere ihe a o ji obi ya niile nye anyị metụrụ anyị n’obi.

 Nwanna Nwaanyị Payne, mgbe afọ ụfọdụ gachara, ime pụrụ gị. Gịnị nyeere gị aka idi ya?

M bịara dị ime n’afọ 1973 mgbe mụ na di m na-eje ozi n’Ebe Ndịda Pasifik. Anyị laghachiri Ọstrelia, ime ahụ pụkwara mgbe ọnwa anọ gachara. Ihe a gbawakwara di m obi n’ihi na nwa ahụ m dị ime ya bụkwa nwa ya. Obi gbawara m, ma m ji nwaayọọ nwaayọọ na-enweta onwe m. Ma ọ pụchaghị anyị n’obi ruo mgbe anyị nwetara Ụlọ Nche April 15, 2009. Ajụjụ bụ́: “È nwere olileanya na nwa nwụrụ n’afọ nne ya ga-ebilite n’ọnwụ?” gbara n’Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ. Isiokwu ahụ mere ka obi sie anyị ike na ọ bụ Jehova ga-ekpebi ihe ọ ga-eme, na ọ na-emekwa ihe dị mma mgbe niile. Jehova ga-ewepụ ihe niile mere ka obi gbawaa anyị n’ụwa ọjọọ a, mgbe ọ ga-eme ka Ọkpara ya “bibie ọrụ Ekwensu.” (1 Jọn 3:8) Isiokwu ahụ mere ka anyị jirikwuo “pel” dị oké ọnụ ahịa anyị nwere n’ihi na anyị bụ Ndịàmà Jehova kpọrọkwuo ihe. Olee uru ndụ a anyị dị bara ma ọ bụrụ na anyị enweghị olileanya na Alaeze Chineke ga-abịa?

Mgbe ime ahụ pụchara m, anyị malitere ozi oge niile ọzọ. Anyị jere ozi ọnwa ole na ole n’alaka ụlọ ọrụ anyị dị n’Ọstrelia, mechaa malitekwa ọrụ sekit. N’afọ 1981, mgbe anyị jechara ozi afọ anọ n’ime ime obodo ndị dị na Niu Saụt Wels nakwa na Sidni, a kpọrọ anyị ka anyị bịa jewe ozi n’alaka ụlọ ọrụ dị n’Ọstrelia. Ọ bụkwa ebe ahụ ka anyị nọ na-eje ozi ruo ugbu a.

Nwanna Winston, ihe ndị ị mụtara mgbe ị na-eje ozi n’Ebe Ndịda Pasifik, hà na-enyere gi aka n’ọrụ gị ugbu a i so na Kọmitii Alaka Dị n’Ọstrelia?

À na-ajụkwa ajụ? Ha na-enyere m ezigbo aka. Nke mbụ, a gwara alaka ụlọ ọrụ dị n’Ọstrelia ka ha na-elekọta Amerịkan Samoa na Samoa. Mgbe e mechiri alaka ụlọ ọrụ dị na Niu Ziland, ndị nọ na ya gafetara na nke dị n’Ọstrelia. Ugbu a, alaka ụlọ ọrụ a dị n’Ọstrelia na-elekọtazi Ọstrelia, Amerịkan Samoa na Samoa, Kuk Aịlandz, Niu Ziland, Niyue, Timọ-Lest, Tokelaụ, na Tọnga. Ejeela m ozi n’ọtụtụ n’ime ebe ndị a ka onye na-anọchite anya alaka ụlọ ọrụ. Ihe ndị m mụtara n’aka ụmụnna ndị kwesịrị ntụkwasị obi nọ n’agwaetiti ndị ahụ na-enyere m ezigbo aka ugbu a m nọ n’alaka ụlọ ọrụ na-ejere ha ozi.

Nwanna Winston na Pamela nwunye ya n’alaka ụlọ ọrụ dị n’Ọstrelia

Tupu mụ apịachie okwu m, m ga-achọ ikwu na kemgbe ọtụtụ afọ, mụ na Pam nwunye m esila n’ihe mere ná ndụ anyị ghọta na ọ bụghị naanị ndị toro eto na-achọ Chineke. Ndị na-eto eto chọkwara inweta “nkume pel dị nnọọ oké ọnụ ahịa,” ọ bụrụgodị na ndị ezinụlọ ha enweghị mmasị. (2 Eze 5:​2, 3; 2 Ihe 34:​1-3) N’eziokwu, Jehova bụ Chineke hụrụ anyị n’anya. Ọ chọkwara ka mmadụ niile, ma ụmụaka ma ndị agadi nweta ndụ.

Mgbe mụ na nwunye m malitere ịchọ Chineke ihe karịrị afọ iri ise gara aga, anyị amachaghị na ọ ga-abara anyị uru otú a. O doro anya na eziokwu Alaeze Chineke bụ nkume pel dị oké ọnụ ahịa. Anyị kpebisiri ike iji ya kpọrọ ihe.