Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ònye Bụ Eze nke Alaeze Chineke?

Ònye Bụ Eze nke Alaeze Chineke?

Chineke mere ka ọtụtụ ndị so dee Baịbụl dee ọtụtụ ihe a ga-eji amata onye ga-abụ Eze nke Alaeze Chineke. Onye ọchịchị a ga-abụ

  • Onye Chineke họọrọ. ‘Mụ onwe m emewo ka eze m nọdụ n’ocheeze. M ga-enye gị mba dị iche iche ka ha bụrụ ihe nketa gị. Nyekwa gị nsọtụ niile nke ụwa ka ha bụrụ ihe onwunwe gị.’​—Abụ Ọma 2:​6, 8.

  • Onye ga-anọkwasị n’ocheeze Devid. “A mụworo anyị otu nwa, e nyewokwa anyị otu nwa nwoke . . . Mgbasa ịchịisi ya na udo ya ga-agbasa agaghị enwe ọgwụgwụ, n’elu ocheeze Devid nakwa n’alaeze ya iji mee ka o guzosie ike.”​—Aịzaya 9:​6, 7.

  • Onye a ga-amụ na Betlehem. ‘Betlehem, ọ bụ n’ime gị ka onye ga-aghọ onye ọchịchị ga-esi pụta. Ọ ga-abụ onye ukwu ruo na nsọtụ niile nke ụwa.’​—Maịka 5:​2, 4.

  • Onye ndị mmadụ jụrụ ma gbuo. “E ledara ya anya, ọ dịghịkwa ihe anyị ji ya kpọrọ. . . . A mara ya ube n’ihi mmebi iwu anyị; a nọkwa na-echi ya ọnụ n’ala n’ihi njehie anyị.”​—Aịzaya 53:​3, 5.

  • Onye a kpọlitere n’ọnwụ ya anọrọ n’aka nri Chineke. “Ị gaghị ahapụ mkpụrụ obi m n’ime Shiol. Ị gaghị ekwe ka onye na-eguzosi ike n’ebe ị nọ banye n’olulu. . . . Ịdị mma dị n’aka nri gị ruo mgbe ebighị ebi.”​—Abụ Ọma 16:​10, 11.

Jizọs ruru eru ịbụ ezigbo onye ọchịchị ga-achị ụmụ mmadụ.

Kemgbe ụmụ mmadụ dịwara ndụ n’ụwa a, ọ bụ naanị otu onye ka ihe niile ahụ e kwuru e ji ama ezigbo Onye ọchịchị dabara nnọọ adaba n’ebe ọ nọ. Onye ahụ bụ Jizọs Kraịst. Nke bụ́ eziokwu bụ na otu mmụọ ozi gwara Meri nne Jizọs, sị: “Chineke ga-enyekwa ya ocheeze Devid bụ́ nna ya, . . . alaeze ya agaghịkwa enwe ọgwụgwụ.”​—Luk 1:​31-33.

Jizọs abụtụbeghị onye ọchịchị n’ụwa a. Kama, ebe ọ bụ Eze nke Alaeze Chineke, ọ ga-anọ n’eluigwe na-achị ụmụ mmadụ. Gịnị mere ọ ga-eji bụrụ ezigbo Onye ọchịchị? Ka anyị tụlee ihe ndị o mere mgbe ọ nọ n’ụwa.

  • Ihe gbasara ndị mmadụ metụrụ Jizọs n’obi. Jizọs nyeere ndị mmadụ aka, ma ụmụaka ma ndị agadi, n’agbanyeghị ebe ha si na ọkwá ha nọ na ya. (Matiu 9:36; Mak 10:16) Mgbe otu onye ekpenta rịọrọ ya, sị: “Ọ bụrụ nnọọ na ị chọrọ, ị pụrụ ime ka m dị ọcha,” Jizọs nweere ya ọmịiko ma gwọọ ya.​—Mak 1:​40-42.

  • Jizọs kụziiri anyị otú anyị ga-esi na-eme uche Chineke. O kwuru, sị: “Unu apụghị ịbụ ndị ohu Chineke na nke Akụnụba.” O kwukwara na anyị kwesịrị ịna-emeso ndị ọzọ ihe otú anyị chọrọ ka ha si na-emeso anyị. Ihe ọzọ bụ na Jizọs gosiri na Chineke nwere mmasị, ọ bụghị naanị n’ihe anyị na-eme, kamakwa, n’otú anyị si eche echiche na otú obi na-adị anyị. N’ihi ya, ka anyị nwee ike ịna-eme uche Chineke, anyị ga-agbalịsi ike ka anyị ghara ịna-eche ihe ọjọọ n’obi anyị. (Matiu 5:28; 6:24; 7:12) Jizọs kwukwara na ọ bụrụ na anyị chọrọ ịna-enwe ezigbo obi ụtọ, anyị ga-amụta ihe Chineke chọrọ ka anyị na-eme ma na-eme ya eme.​—Luk 11:28.

  • Jizọs kụziiri anyị ihe ịhụ ndị ọzọ n’anya pụtara. Ihe ndị Jizọs kwuru na ihe ndị o mere kpara ezigbo ike, ha rukwara ndị ọ na-ezi ihe n’obi. Baịbụl kwuru, sị: “Otú o si ezi ihe juru ìgwè mmadụ ahụ anya; n’ihi na ọ na-ezi ha ihe dị ka onye nwere ikike.” (Matiu 7:​28, 29) Ọ kụzikwaara ha, sị: “Na-ahụnụ ndị iro unu n’anya.” O kpedịrị ekpere gbasara ụfọdụ ndị so gbuo ya, sị: “Nna, gbaghara ha, n’ihi na ha amaghị ihe ha na-eme.”​—Matiu 5:44; Luk 23:34.

Jizọs ruru eru ịbụ ezigbo Onye ọchịchị ga-achị ụwa n’ihi na ọ na-enyere ndị mmadụ aka ma na-emere ha ebere. Ma, olee mgbe ọ ga-amalite ịchị?