Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Mgbe Alaeze Chineke Ga-achịwa Ụwa?

Olee Mgbe Alaeze Chineke Ga-achịwa Ụwa?

Ụfọdụ n’ime ndị na-eso ụzọ Jizọs nọ na-achọ ịma mgbe Alaeze Chineke ga-achịwa ụwa. Jizọs gwara ha na ha agaghị amatali kpọmkwem mgbe Alaeze Chineke ga-amalite ịchị ụwa. (Ọrụ Ndịozi 1:​6, 7) Ma, tupu mgbe ahụ, Jizọs agwala ha na ọ bụrụ na ha ahụ ka ihe ụfọdụ na-eme n’ụwa n’otu mgbe, na ha ga-eji ya ‘mara na alaeze Chineke dị nso,’ nakwa na o ruwela mgbe ọ ga-achịwa ụwa.​—Luk 21:31.

OLEE IHE NDỊ JIZỌS KWURU NA HA GA NA-EME?

Jizọs sịrị: “Mba ga-ebuso mba ọzọ agha, alaeze ga-ebusokwa alaeze ọzọ agha; a ga-enwekwa oké ala ọma jijiji, ọrịa na-efe efe na ụkọ nri.” (Luk 21:​10, 11) Ọ bụrụ na ihe ndị a niile ana-eme n’otu mgbe, ha ga-egosi n’eziokwu na “alaeze Chineke dị nso.” Ihe ndị a hà emewela ugbu a n’otu mgbe, hà na-emekwa n’ụwa niile? Lee ihe ndị a chọpụtara.

1. AGHA

N’afọ 1914, agha kpụ ọkụ n’ọnụ malitere. A lụtụbeghị ụdị agha a mbụ. Ndị na-akọ akụkọ ihe mere eme na-ekwukarị na ọ bụ n’afọ 1914 ka ọtụtụ ihe gbanwere n’ụwa n’ihi na ọ bụ n’afọ ahụ ka a lụrụ agha mbụ zuru ụwa ọnụ. Ọ bụ n’agha ahụ ka a malitere iji ọtụtụ ngwá agha ndị jọgburu onwe ha alụ agha, dị ka, ụgbọala na-atụ bọmbụ, ụgbọelu na-atụ bọmbụ, égbè na-awụpụ mgbọ, kemikal ọjọọ a na-agbanye n’ikuku, na ngwá agha ọjọọ ndị ọzọ. E mechakwara lụọ agha ụwa nke abụọ, nke a nọ na ya mepụta ngwá agha ọgwụrụ mba ma jiri ya gbuo ọtụtụ ndị. Kemgbe afọ 1914, ụmụ mmadụ ka na-alụ agha n’ebe dị iche iche. Agha ndị ahụ ataakwala isi ọtụtụ nde mmadụ.

2. ALA ỌMA JIJIJI

Otu akwụkwọ a na-akpọ Britannica Academic kwuru na n’afọ ọ bụla, a na-enwe ihe dị ka otu narị ala ọma jijiji ndị nwere ike imebi ihe buru ibu. Otu nchọpụta e mere n’Amerịka kwukwara na “ihe ndị merela eme (kemgbe ihe dị ka afọ 1900) gosiri na a ga na-enwe ihe dị ka ala ọma jijiji iri na isii n’afọ ọ bụla.” Ọ bụ eziokwu na ụfọdụ ndị nwere ike ikwu na ihe mere o ji dị ka à na-enwezi ọtụtụ ala ọma jijiji bụ n’ihi na e nweela ngwá ọrụ ọgbara ọhụrụ ndị e ji amata gbasara ala ọma jijiji, nke bụ́ eziokwu bụ na n’ụwa niile, oké ala ọma jijiji na-akpatara ọtụtụ ndị ahụhụ, na-atakwa isi ọtụtụ ndị karịa otú ọ dị na mbụ.

 3. ỤKỌ NRI

A na-enwe ụkọ nri n’ụwa niile n’ihi agha, mpụ, nrụrụ aka, ụkọ ego, ahazighị otú a ga na-esi arụ ọrụ ugbo nke ọma, ma ọ bụkwanụ emeghị ezigbo atụmatụ maka ọdachi. Ngalaba Òtù Mba Ụwa nke na-ahụ maka ihe oriri kwuru ihe ha chọpụtara banyere ụkọ nri n’afọ 2018. Ha sịrị: “N’ụwa niile, narị nde mmadụ asatọ na iri abụọ na otu na-anọ agụụ. Otu narị nde na iri abụọ na anọ n’ime ha anaghịdị ahụ tụrụ rachaa.” Erighị ezigbo nri so n’ihe na-akpata ọnwụ ụmụaka karịrị nde atọ kwa afọ. N’afọ 2011, ọ bụ otu erighị ezigbo nri a kpatara ọnwụ ihe dị ka ọkara n’ime ụmụaka niile nwụrụ n’ụwa niile.

4. ỌRỊA NA-EFE EFE

Ngalaba Òtù Mba Ụwa nke Na-ahụ Maka Ahụ́ Ike kwuru, sị: “Malite n’afọ 2000, ọtụtụ ajọ ọrịa na-efe efe bụzi okwu a kpụ n’ọnụ. Ọrịa ndị a rịara n’oge gara aga, dị ka, ọgbụgbọ na ọnyụnyụ na ịba ọcha n’anya alọghachila, ndị nke ọhụrụ apụtakwala, dị ka, ọrịa mmịnwụ, oké ahụ́ ọkụ, ọrịa MERS, Ebola na ọrịa Zika.” Ọ bụ eziokwu na ndị sayensị na ndị dọkịta amatala ọtụtụ ihe banyere ọrịa dị iche iche, ma ha enwebeghị ike ịgwọ ọrịa niile.

5. OZI ỌMA A NA-EKWUSA N’ỤWA NIILE

Jizọs kwuru ihe ọzọ so n’ihe ndị ahụ a ga-eji ama na Alaeze Chineke adịla nso. O kwuru, sị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba niile; mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ ga-abịa.” (Matiu 24:14) Ka a na-enwe nsogbu dị iche iche n’ụwa, ihe karịrị nde mmadụ asatọ si ná mba niile na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke na narị mba abụọ na iri anọ. Ha na-ekwusa ya n’ihe karịrị otu puku asụsụ. Ụdị ihe a emetụbeghị mbụ.

 OLEE OTÚ IHE NDỊ A NA-EMENỤ SI GBASA ANYỊ?

Ihe ndị ahụ niile Jizọs sị na a ga-eji ama na Alaeze Chineke adịla nso na-emecha taa. Olee ihe mere anyị kwesịrị iji chebara ihe ndị a echiche? Ọ bụ maka na Jizọs kwuru, sị: “Mgbe unu hụrụ ka ihe ndị a na-eme, maranụ na alaeze Chineke dị nso.”​—Luk 21:31.

N’oge na-adịghị anya, Alaeze Chineke ga-eme ka uche Chineke mee n’ụwa

Ihe ndị ahụ Jizọs kwuru a ga-eji ama na Alaeze Chineke dị nso na oge Baịbụl kwuru ihe ụfọdụ ga-eji eme, na-enyere anyị aka ịmata na Chineke mere ka Alaeze ya malite ịchị n’eluigwe n’afọ 1914. * N’oge ahụ, o mere ka Ọkpara ya bụ́ Jizọs Kraịst bụrụ Eze. (Abụ Ọma 2:​2, 4, 6-9) N’oge na-adịghị anya, Alaeze Chineke ga-amalite ịchị ụwa, ọ ga-ebibi ọchịchị ndị ọzọ niile ma mee ka ụwa ghọọ paradaịs, ebe ụmụ mmadụ ga-ebi ruo mgbe ebighị ebi.

Jizọs gwara anyị ka anyị na-ekpe ekpere, sị: “Ka alaeze gị bịa. Ka uche gị meekwa n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.” (Matiu 6:10) N’oge na-adịghị anya, ihe a ọ gwara anyị na-ekpe n’ekpere ga-emezu. Ma, gịnị ka Alaeze Chineke na-eme kemgbe ahụ ọ malitere ịchị n’eluigwe n’afọ 1914? Oleekwa ihe ndị anyị na-atụ anya na Alaeze ahụ ga-eme mgbe ọ ga-amalite ịchị ụwa?

^ par. 17 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu banyere afọ 1914, gụọ ihe nke 22 e dere ná ngwụcha akwụkwọ bụ́ Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị? Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara akwụkwọ ahụ.