Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Họrọ asụsụ Igbo

Mụta Ịna-ejide Onwe Gị

Mụta Ịna-ejide Onwe Gị

“Mkpụrụ nke mmụọ nsọ bụ . . . njide onwe onye.”​—⁠GAL. 5:​22, 23.

ABỤ: 83, 52

1, 2. (a) Olee nsogbu ndị mmadụ nwere ike inwe n’ihi na ha anaghị ejide onwe ha? (b) Gịnị mere ịtụle isiokwu a kwuru gbasara mmadụ ijide onwe ya ji baa uru taa?

NJIDE ONWE ONYE bụ àgwà Jehova Chineke ga-enyeliri anyị aka ịmụta. (Gal. 5:​22, 23) Ọ naghị esiri Jehova ike ijide onwe ya. Ma, ọ na-esiri anyị ike ime otú ahụ n’ihi na anyị ezughị okè. Ọtụtụ nsogbu ndị mmadụ na-enwe taa bụ n’ihi na ha anaghị ejide onwe ha. Nke a nwere ike ime ka ha na-eyigharị ihe ndị ha chọrọ ime, ghara ịna-eme nke ọma n’ọrụ ha, nakwa n’ụlọ akwụkwọ. O nwekwara ike ime ka ndị mmadụ na-agwa ibe ha okwu ọjọọ, na-aṅụbiga mmanya ókè, na-alụ ọgụ, na-agba alụkwaghịm, na-eji ụgwọ n’enweghị isi, ma na-aṅụ ọgwụ ọjọọ. Nsogbu ndị ọzọ o nwere ike ịkpata bụ ịga mkpọrọ, obi ọjọọ, ibute ọrịa ọjọọ n’ihi ịkwa iko, ịtụ ime ọkwà, nakwa nsogbu ndị ọzọ.​—⁠Ọma 34:​11-14.

2 O doro anya na ndị na-anaghị ejide onwe ha na-akpatara onwe ha na ndị ọzọ nsogbu. Ọtụtụ ndị anaghịzi ejide onwe ha. Nchọpụta ndị e mere n’agbata afọ 1941 na afọ 1949 gosiri na ndị mmadụ anachaghị ejide onwe ha. Ma, ihe ndị a chọpụtara n’oge na-adịbeghị anya gosiri na ọ kala njọ. O kwesịghị iju ndị na-amụ Baịbụl anya n’ihi na Baịbụl kwuru na otu n’ime ihe ndị gosiri na anyị bi “n’oge ikpeazụ” bụ na ndị mmadụ ‘anaghị ejide onwe ha.’​—⁠2 Tim. 3:​1-3.

3. Gịnị mere Ndị Kraịst ji kwesị ịmụta ịna-ejide onwe ha?

 3 Gịnị mere anyị ji kwesị ịmụta otú anyị ga-esi na-ejide onwe anyị? O nwere ihe abụọ mere anyị ji kwesị ịmụta ya. Nke mbụ bụ na a chọpụtara na ndị na-ejide onwe ha anaghị enwecha nsogbu otú ndị na-anaghị ejide onwe ha na-enwe. Uche ha na-akpakọ ọnụ, ha na ndị ọzọ na-adị ná mma, ha anaghịkwa ewe iwe ọsọsọ, ma ọ bụ daa mbà n’obi. Nke abụọ bụ na ọ bụrụ na anyị chọrọ ka anyị na Chineke dịrị ná mma, anyị kwesịrị imeri ọnwụnwa ndị na-abịara anyị ma ghara ịna-eme ihe ọjọọ ndị na-agụ anyị agụụ. Adam na Iv emeghị otú ahụ. (Jen. 3:⁠6) Chee echiche ọtụtụ nsogbu ndị mmadụ nwerela kemgbe ahụ Adam na Iv nupụchaara Chineke isi n’ihi na ha ejideghị onwe ha.

4. Olee ihe ga-agba onye ọ na-esiri ike ijide onwe ya ume?

4 Jehova ma na anyị ezughị okè, nakwa na ọ na-esiri anyị ike ijide onwe anyị. Ọ chọkwara inyere anyị aka ka anyị ghara ịna-eme ihe ọjọọ na-agụ anyị agụụ. (1 Eze 8:​46-50) Ebe ọ bụ ezigbo Enyi anyị, ọ na-agba ndị ọ na-esiri ike ijide onwe ha mgbe ụfọdụ ume. Ka anyị tụlee ihe Jehova merela iji gosi na ọ na-ejide onwe ya. Anyị ga-amụkwa gbasara ndị jidere onwe ha na ndị na-ejideghị onwe ha a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl. Anyị ga-elebakwa anya n’ihe ndị anyị ga-eme ga-enyere anyị aka ịna-ejidekwu onwe anyị.

JEHOVA NA-EJIDE ONWE YA

5, 6. Olee ihe Jehova mere nke gosiri na ọ na-ejide onwe ya?

5 Jehova na-ejide onwe ya mgbe niile n’ihi na o zuru okè. (Diut. 32:⁠4) Ma, anyị ezughị okè. N’agbanyeghị nke ahụ, anyị kwesịrị ileba anya n’otú Jehova sirila jide onwe ya, ka anyị nwee ike ịna-eme ka ya. Ime otú ahụ ga-enyere anyị aka ime ihe ziri ezi ma mmadụ kpasuo anyị iwe. Olee ihe ụfọdụ ndị gosiri na Jehova na-ejide onwe ya?

6 Chegodị otú Jehova si jide onwe ya mgbe Setan kpachaara anya nupụrụ ya isi. Ọ ga-abụ na ihe a Setan mere were ndị mmụọ ozi iwe, ma mee ka ha kpọọ ya asị. Ọ ga-abụkwa na ọ dị gị otú ahụ ma ị na-ahụ ahụhụ niile Setan kpatarala ndị mmadụ. Ma, Jehova jidere onwe ya, meekwa ihe kwesịrị ekwesị. Kemgbe ahụ, ọ nọkwa na-eme ihe kwesịrị ekwesị nakwa ihe ndị gosiri na ọ naghị ewe iwe ọsọsọ. (Ọpụ. 34:6; Job 2:​2-6) Maka gịnị? Jehova hapụrụ ka oge gaa n’ihi na ọ chọghị ka e bibie onye ọ bụla, kama “ọ chọrọ ka mmadụ niile chegharịa.”​—⁠2 Pita 3:⁠9.

7. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’otú Jehova si jide onwe ya?

7 Otú Jehova si jide onwe ya na-akụziri anyị na tupu anyị ekwuo okwu ma ọ bụ mee ihe, anyị kwesịrị ichebara ya echiche ma ghara ime ihe ọkụ ọkụ. Ọ bụrụ na e nwere ihe dị mkpa ị chọrọ ikpebi ime, buru ụzọ chebara ya echiche. Rịọ Jehova ka o nye gị amamihe ị ga-eji kwuo ma ọ bụ mee ihe kwesịrị ekwesị. (Ọma 141:⁠3) Ọ na-adịrị anyị mfe ime ihe anyị na-ekwesịghị ime ma a kpasuo anyị iwe. Ọtụtụ n’ime anyị akwaala mmakwaara mgbe anyị kwuchara okwu ma ọ bụ mee ihe n’echeghị echiche.​—⁠Ilu 14:29; 15:28; 19:⁠2.

NDỊ OHU JEHOVA NDỊ JIDERE ONWE HA NA NDỊ NA-EJIDEGHỊ ONWE HA

8. (a) Olee ebe a kọrọ akụkọ gbasara ndị jidere onwe ha? (b) Gịnị mere Josef ji gbaa ọsọ mgbe nwunye Pọtịfa chọrọ ka ha kwaa iko? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

8 Ole ndị a kọrọ gbasara ha na Baịbụl gosiri na mmadụ ijide onwe ya bara uru? E nwere ọtụtụ n’ime ha a kọrọ na ha jidere onwe ha mgbe ọnwụnwa bịaara ha. Otu  n’ime ha bụ nwa Jekọb aha ya bụ Josef. O jidere onwe ya mgbe ọ na-ejere Pọtịfa ozi. Pọtịfa bụ onyeisi ndị na-eche Fero nche. Nwunye Pọtịfa malitere ịnwụrụ Josef n’ihi na ‘ọ bịara maa mma n’ahụ́, maakwa mma ile anya.’ Ọ chọkwara ka ya na Josef kwaa iko. Gịnị mere Josef ji gbaara ya ọsọ n’agbanyeghị nsogbu o nyere ya ugboro ugboro ka ha kwaa iko? Ọ ga-abụ na Josef chebaara nsogbu ọ ga-akpatara ya echiche ma o mee otú ahụ. Mgbe nwaanyị ahụ jidere ya n’uwe ka ha kwaa iko, ọ hapụụrụ ya uwe ya ma rie mbọ mbọ. Josef kwuru, sị: “Olee otú m ga-esi mee oké ihe ọjọọ a wee mehie Chineke?”​—⁠Jen. 39:​6, 9; gụọ Ilu 1:⁠10.

9. Olee otú i nwere ike isi jikere maka imeri ọnwụnwa?

9 Olee ihe anyị mụtara n’ihe a Josef mere? Otu n’ime ya bụ na a nwaa anyị ọnwụnwa imebi iwu Chineke, anyị kwesịrị ịgba mbọ merie ya. Tupu ụfọdụ ndị aghọọ Ndịàmà Jehova, ha na-eribiga ihe ókè, na-aṅụbiga mmanya ókè, na-aṅụ sịga, na-aṅụ ọgwụ ike, na-akwa iko, na-emekwa omume ọjọọ ndị ọzọ. Mgbe e mechakwara ha baptizim, ihe ndị a nwekwara ike ịna-agụ ha agụụ ime mgbe ụfọdụ. Mgbe ọ bụla a nwara gị ọnwụnwa ka i mebie iwu Jehova, gbalịa chee otú ọ ga-esi mee ka gị na Jehova gharazie ịdị ná mma ma ọ bụrụ na i jideghị onwe gị. Buru ụzọ chee ihe ndị e nwere ike iji nwaa gị ọnwụnwa ma kpebie otú i nwere ike isi gbaara ha ọsọ. (Ọma 26:​4, 5; Ilu 22:⁠3) Ọ bụrụ na nke ọ bụla n’ime ha abịara gị, rịọ Jehova ka o nye gị amamihe, nakwa ka i jide onwe gị ka i nwee ike imeri ọnwụnwa ahụ.

10, 11. Olee ọnwụnwa na-abịara ọtụtụ ndị na-eto eto n’ụlọ akwụkwọ? (b) Olee ihe nwere ike inyere Ndị Kraịst na-eto eto aka ịgbara ịkwa iko ọsọ?

10 Ụdị ọnwụnwa ahụ bịaara Josef, abịakwarala ọtụtụ Ndị Kraịst na-eto eto. Chegodị gbasara otu nwa agbọghọ aha ya bụ Kim. Ọtụtụ ụmụ klas ya na-akwakarị iko. Ha bịa ụlọ akwụkwọ, ha na-akọ otú ha si kwaa iko ná ngwụcha izu. Ma, Kim enweghị nke ọ ga-akọ. O kwuru na ihe a mere ka ọ na-eche mgbe ụfọdụ na “a jụrụ ya ajụ.” O kwukwara na ụmụ klas ya na-ele ya anya ka onye iberiibe n’ihi na e nweghị onye ya na ya na-akpa. Ma, Kim ma na ya erubeghị ka ya na nwoke kpawa. Ọ makwa na mgbe agụụ ịkwa iko na-aka agụ mmadụ bụ mgbe ọ na-eto eto. (2 Tim. 2:22) Ụmụ akwụkwọ ibe ya na-ajụkarị ya ma ọ̀ ka bụ nwa agbọghọ na-amaghị nwoke. Ọ na-eji oge ahụ ha na-ajụ ya ajụjụ a akọwara ha ihe mere na ya achọghị ịkwa iko. Anyị ji Ndị Kraịst na-eto eto kpebisiri ike na ha agaghị akwa iko eme ọnụ. Jehova jikwa ha eme ọnụ.

11 Baịbụl gwara anyị gbasara ndị na-agbaraghị ịkwa iko ọsọ iji dọọ anyị aka ná ntị. Ọ gwakwara anyị nsogbu ndị ọ ga-akpatara anyị ma anyị ejideghị onwe anyị. Ọ bụrụ na ụdị ihe ahụ mere Kim emee gị, i kwesịrị iche gbasara nwa okorobịa ahụ na-enweghị uche a kọrọ akụkọ ya n’Ilu isi asaa. Cheekwa gbasara ihe Amọn mere na nsogbu ọ kpataara ya. (2 Sam. 13:​1, 2, 10-15, 28-32) Ndị nne na nna nwere ike inyere ụmụ ha aka ka ha mụta ịna-ejide onwe ha, nakwa ka ha mata otú nwoke na nwaanyị kwesịrị isi na-akpa. Otú ha ga-esi eme ya bụ iji amaokwu Baịbụl ndị anyị kwurula okwu ha kwurịta banyere ya mgbe ha na-enwe ofufe ezinụlọ.

12. (a) Olee otú Josef si jide onwe ya ka ụmụnne ya ghara ịmata onye ọ bụ? (b) Olee oge ndị anyị kwesịrị ijide onwe anyị?

12 E nwekwara oge ọzọ Josef mere ihe gosiri na ya na-ejide onwe ya. Mgbe ụmụnne ya bịara Ijipt ka ha zụrụ nri, Josef emeghị ka ha mata onye ọ bụ. Ihe mere  o ji mee ya bụ ka ọ mata ihe dị ha n’obi. Mgbe ọ na-enweghịzi ike ijide onwe ya, ọ hapụrụ ha gaa ebe ọzọ bewe ákwá. (Jen. 43:​30, 31; 45:⁠1) Ọ bụrụ na nwanna gị ma ọ bụ onye ị hụrụ n’anya akpasuo gị iwe, ime ka Josef ga-eme ka ị ghara ime ihe ma ọ bụ kwuo ihe ị ga-emecha kwaa mmakwaara. (Ilu 16:32; 17:27) A chụọ ndị ikwu gị n’ọgbakọ, i kwesịrị ijide onwe gị ka gị na ha ghara ịna-emekọ ihe mgbe ọ na-adịghị mkpa. O nwere ike isiri gị ike ime ya. Ma ọ ga-adịrị gị mfe ime ya ma i cheta na ime otú ahụ na-egosi na ị na-eṅomi Jehova, nakwa na ị na-eme ihe ọ sị gị mee.

13. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’ihe Eze Devid mere?

13 Anyị nwere ike ịmụta ihe n’ihe Eze Devid mere. Mgbe Sọl na Shimiaị kpasuru ya iwe, o weghị iwe ma ọ bụ jiri ike o nwere mesie ha ike. (1 Sam. 26:​9-11; 2 Sam. 16:​5-10) Ma, ọ bụghị mgbe niile ka Devid jidere onwe ya. Otú anyị si mara bụ mmehie ya na Bat-shiba mere na ihe o mere mgbe Nebal onye anyaukwu kpasuru ya iwe. (1 Sam. 25:​10-13; 2 Sam. 11:​2-4) Ma, anyị nwere ike ịmụta ezigbo ihe n’ihe a Devid mere. Nke mbụ bụ na ndị okenye kwesịrị ịna-ejide onwe ha ka ha ghara iji ike ha na-eme ihe na-ekwesịghị ekwesị. Nke abụọ abụrụ na anyị ekwesịghị ịtụkwasị onwe anyị obi, na-eche na e nweghị mgbe ọnwụnwa ga-abịara anyị.​—⁠1 Kọr. 10:⁠12.

IHE NDỊ Ị GA-EME

14. Olee ihe mere otu nwanna? Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị mee ihe nwanna a mere ma ụdị ihe ahụ mee anyị?

14 Gịnị ka ị ga-eme ka ị na-ejidekwu onwe gị? Chegodị gbasara akụkọ a mere eme. Otu ụgbọala kụrụ ụgbọala Nwanna Luigi n’azụ. Ọkwọ ụgbọala a malitere ịkparị Luigi, na-achọ ịlụso ya ọgụ n’agbanyeghị na ọ bụ ya chọrọ ya okwu. Luigi rịọrọ Jehova ka o nyere ya aka ijide onwe ya, gbalịakwa imeda onye nke ọzọ obi. Ma, nwoke ahụ akwụsịghị mba ọ nọ na-aba. Luigi deere nọmba ụgbọala nwoke ahụ ma si ebe ahụ pụọ, nwoke ahụ anọrọkwa na-aba mba. Mgbe otu izu gachara, Luigi gara nletaghachi na nke otu nwaanyị o ziri ozi ọma ma chọpụta na ọkwọ ụgbọala ahụ bụ di nwaanyị ahụ. Ahụ́ nwụrụ nwoke a, ya arịọ Luigi ka ọ gbaghara ya. O kwuru na ọ ga-aga ịhụ ụlọ ọrụ ịnshọransị nke Luigi ka ha bịa mezie ụgbọala Nwanna Luigi ozugbo. Nwoke a so nwunye ya mụọ ihe. Ihe ndị ọ nụrụ tọkwara ya ụtọ. Ihe a mere ka Luigi ghọta na otú ahụ o si jide onwe ya ụbọchị ahụ bara ezigbo uru n’ihi na a sị na o meghị otú ahụ, nsogbu gaara adị.​—⁠Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 6:​3, 4.

Ihe anyị mere mgbe a kpasuru anyị iwe nwere ike ịba uru n’ozi anyị ma ọ bụ kpaa ya aka ọjọọ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 14)

15, 16. Olee otú ịmụ Baịbụl ga-esi nyere gị na ezinụlọ gị aka ịmụta ịna-ejide onwe unu?

15 Ịmụchi Baịbụl anya ga-enyere Ndị Kraịst aka ịna-ejide onwe ha. Cheta na Chineke gwara Jọshụa, sị: “Akwụkwọ iwu a agaghị apụ n’ọnụ gị, ị ga na-agụkwa ihe dị na ya n’olu dị ala ehihie na abalị, ka i wee lezie anya mee ihe niile e dere na ya; n’ihi na mgbe ahụ, ị ga-eme ka ụzọ gị gaa nke ọma, mgbe ahụkwa, ị ga-eji amamihe mee ihe.” (Jọsh. 1:⁠8) Olee otú ịmụ Baịbụl ga-esi nyere gị aka ịmụta ịna-ejide onwe gị?

16 Anyị amụtala ọtụtụ ihe atụ ndị e kwuru na Baịbụl gosiri uru anyị ga-erite ma anyị na-ejide onwe anyị nakwa ahịa ọ ga-aghọ anyị ma anyị ghara ime otú ahụ. O nwere ihe mere Jehova ji mee ka e dee ha na Baịbụl. (Rom 15:⁠4) Ọ ga-abara anyị uru ma anyị na-agụ ha, na-echebara ha echiche ma na-amụ ha. Mgbe ị na-agụ ha, gbalịa ka ị ghọta otú ha si gbasa gị. Rịọ Jehova ka o nyere gị aka ka i mee ihe  ị gụrụ n’Okwu ya. Ị chọpụta na e nwere ebe ị na-anaghị ejidecha onwe gị, kweta na ọ bụ nsogbu i nwere. Kọọrọ ya Jehova n’ekpere, ma gbalịa ka ị mata otú i nwere ike isi na-ejidekwu onwe gị. (Jems 1:⁠5) Mee nchọnchọ n’akwụkwọ anyị ka ị hụ ihe ndị e kwuru ga-enyere gị aka ịna-ejidekwu onwe gị.

17. Olee ụzọ dị iche iche ndị nne na nna nwere ike isi nyere ụmụ ha aka ịmụta ịna-ejide onwe ha?

17 Olee otú i nwere ike isi nyere ụmụ gị aka ịmụta ịna-ejide onwe ha? Ndị nne na nna ma na ụmụ ha ebughị àgwà a pụta ụwa. Ọ bụ ya mere ha ji kwesi ịna-akpa àgwà ọma ka ụmụ ha mụtakwa ịna-akpa àgwà ọma. (Efe. 6:⁠4) Ị chọpụta na ọ na-esiri ụmụ gị ike ịna-ejide onwe ha, jụọ onwe gị ma ị̀ na-ejide onwe gị. Ihe ga-enyere gị aka ịna-ejide onwe gị bụ ịna-agachi ozi ọma na ọmụmụ ihe anya, na-enwechikwa ofufe ezinụlọ anya. Ọ bụrụ na nwa gị asị gị meere ya ihe na-adịghị mkpa, gwa ya hoo haa na ị gaghị eme ihe ahụ. Jehova gwara Adam na Iv ihe ndị ha ga-eme na ihe ndị ha na-agaghị eme. Ihe ndị ahụ ọ gwara ha gaara enyere ha aka ịna-erubere Jehova isi. Otú ahụ ka ọ dịkwa aka ná ntị nne na nna na-adọ ụmụ ha. Ọ bụrụ na ha ana-adọ ụmụ ha aka ná ntị ma na-akpa àgwà ọma, ọ ga-eme ka ụmụ ha mụta ịna-ejide onwe ha. Irubere Chineke isi so n’otu n’ime ihe ndị kacha baa uru ụmụ gị kwesịrị ịmụta.​—⁠Gụọ Ilu 1:​5, 7, 8.

18. Gịnị mere anyị ga-eji kwesị ịsa anya ná mmiri mgbe anyị na-ahọrọ ndị anyị na ha ga na-akpa?

18 O doro anya na ma ànyị bụ nne ma ọ bụ nna, ma ọ bụkwanụ na anyị abụghị, anyị kwesịrị ịsa anya ná mmiri mgbe anyị na-ahọrọ ndị anyị na ha ga na-akpa. Ọ bụrụ na ndị enyi gị bụ ndị hụrụ Jehova n’anya, ha ga-enyere gị aka ikpebi ihe ndị bara uru ị ga na-eme ma gbaara nsogbu ọsọ. (Ilu 13:20) Àgwà ọma ha na-akpa ga-enyere gị aka ịna-ejide onwe gị ka ha. Nke bụ́ eziokwu bụ na àgwà ọma gị ga-agbakwa ha ume. Ọ bụrụ na anyị ana-ejide onwe anyị, anyị na Chineke ga na-adị ná mma, obi ga na-atọ anyị ụtọ, ọ ga-abakwara ndị anyị hụrụ n’anya uru.