ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 41
ABỤ NKE 13 Ọ Bụ Kraịst Ka Anyị Na-eso
Ihe Anyị Ga-amụta n’Ụbọchị Iri Anọ Ikpeazụ Jizọs Nọrọ n’Ụwa
“Ha hụkwara ya ruo ụbọchị iri anọ, ọ nọkwa na-ekwu gbasara Alaeze Chineke.”—ỌRỤ 1:3.
IHE A GA-AMỤ
Anyị ga-amụta otú anyị ga-esi eme ihe Jizọs mere n’ụbọchị iri anọ ikpeazụ ọ nọrọ n’ụwa.
1-2. Gịnị mere mgbe ndị na-eso ụzọ Jizọs abụọ nọ na-aga n’ụzọ Emeọs?
N’ABALỊ iri na isii n’ọnwa Naịsan afọ 33, ndị na-eso ụzọ Jizọs nọ ná mwute, ụjọ ana-atụkwa ha. Mmadụ abụọ n’ime ha si Jeruselem gawa Emeọs bụ́ obodo dị ihe dị ka kilomita iri na otu ma e si Jeruselem gawa ya. Obi dara ụmụ nwoke ndị a mbà n’ihi na e gbuola Jizọs onye ha na-eso ụzọ ya. O yiziri ha ka Mezaya agaghịzi eme ihe ndị Juu na-atụ anya ka o meere ha. Ma, e nwere otu ihe ga-emenụ ga-eju ha anya.
2 Otu onye ha na-amaghị bịakwutere ha soro ha na-aga n’okporo ụzọ. Ha nọ na-akọrọ ya gbasara ihe ndị dị njọ mere Jizọs. Onye ahụ malitere ịgwa ha gbasara ihe ha na-agaghị echefu echefu. Ọ kọwaara ha “malite n’ihe Mosis dere ruo n’Akwụkwọ Ndị Amụma niile” ihe mere o ji dị mkpa ka Mezaya taa ahụhụ ma nwụọ. Mgbe ha atọ rutere Emeọs, onye ahụ ha na-amaghị mere ka ha mata na ọ bụ Jizọs, onye Chineke kpọlitere n’ọnwụ. Obi tọgburu ha atọgbụ ịmata na Mezaya dị ndụ.—Luk 24:13-35.
3-4. Gịnị mere ndị na-eso ụzọ Jizọs? Gịnị ka anyị ga-amụ n’isiokwu a? (Ọrụ Ndịozi 1:3)
3 Jizọs pụtara n’ihu ndị na-eso ụzọ ya ọtụtụ ugboro n’ụbọchị iri anọ ikpeazụ ọ nọrọ n’ụwa. (Gụọ Ọrụ Ndịozi 1:3.) N’oge ahụ, ndị na-eso ụzọ ya na-eru uju, ụjọ ana-atụkwa ha. Ma Jizọs gbara ha ume, ha enwewe obi ụtọ, jirikwa obi ike na-ekwusa ozi ọma gbasara Alaeze Chineke, na-akụzikwa gbasara ya. a
4 Ịmụ gbasara ihe ndị Jizọs mere n’oge ahụ ga-abara anyị uru. N’isiokwu a, anyị ga-ahụ otú Jizọs si jiri oge ahụ (1) gbaa ndị na-eso ụzọ ya ume, (2) mee ka ha ghọtakwuo Akwụkwọ Nsọ nke ọma, na (3) zụọkwa ha ka ha nwee ike ịrụkwu ọrụ. Na nke ọ bụla n’ime ha, anyị ga-achọpụta otú anyị nwere ike isi eme ka Jizọs.
NA-AGBA NDỊ ỌZỌ UME
5. Gịnị mere e ji kwesị ịgba ndị na-eso ụzọ Jizọs ume?
5 E kwesịrị ịgba ndị na-eso ụzọ Jizọs ume. Maka gịnị? Ụfọdụ ahapụla ụlọ ha, ndị ezinụlọ ha, nakwa ihe ha ji akpa afọ ha na-eso Jizọs mgbe niile. (Mat. 19:27) A na-emegbu ụfọdụ ndị n’ihi na ha bụ ndị na-eso ụzọ Jizọs. (Jọn 9:22) Ihe mere ha ji dịrị njikere ịhapụ ihe ndị ahụ bụ n’ihi na ha kwetara na Jizọs bụ Mezaya ahụ e kwere ná nkwa. (Mat. 16:16) Mana, mgbe e gburu Jizọs, o yiziri ka ihe ha na-atụ anya ya Mezaya ga-eme agaghịzi enwe isi. Obi dakwara ha mbà.
6. Gịnị ka Jizọs mere mgbe a kpọlitechara ya n’ọnwụ?
6 O doro anya na Jizọs ghọtara na ihe mere ndị na-eso ụzọ ya ji na-eru uju abụghị na okwukwe ha esighị ike. Kama, ọ bụ n’ihi na e gburu ya. N’ihi ya, n’ụbọchị ahụ a kpọlitere ya n’ọnwụ, ọ malitere ịgba ndị enyi ya ume. Dị ka ihe atụ, ọ pụtara n’ihu Meri Magdalin mgbe ọ nọ n’ili ya na-ebe ákwá. (Jọn 20:11, 16) Ọ pụtara n’ihu ndị na-eso ụzọ ya abụọ anyị kwuru okwu ha ná mmalite isiokwu a, pụtakwa n’ihu Pita onyeozi. (Luk 24:34) Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’ihe a Jizọs mere? Ka anyị legodị ihe mere n’oge ọ pụtara n’ihu Meri Magdalin.
7. Dị ka e kwuru na Jọn 20:11-16, gịnị ka Jizọs hụrụ ka Meri na-eme n’isi ụtụtụ abalị iri na isii n’ọnwa Naịsan? Gịnịkwa ka ihe ahụ mere ka o mee? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)
7 Gụọ Jọn 20:11-16. N’isi ụtụtụ abalị iri na isii n’ọnwa Naịsan, ụfọdụ ụmụ nwaanyị ndị na-eso ụzọ Jizọs gara n’ebe ahụ e liri ya. (Luk 24:1, 10) Ka anyị lee ihe otu onye n’ime ha bụ́ Meri Magdalin mere. Mgbe Meri ruru n’ili ahụ, ọ hụrụ na ozu Jizọs adịghịzi ebe ahụ. Ọ gbaara ọsọ gaa gwa Pita na Jọn, ha esoro ya gbara ọsọ gaa n’ili ahụ. Mgbe Pita na Jọn hụchara na ozu Jizọs adịghịzi ebe ahụ, ha laghachiri n’ụlọ ha. Mana, Meri emeghị otú ahụ. Ọ nọọrọ ebe ahụ na-ebe ákwá. Ma, ọ maghị na Jizọs nọ na-ele ya. Jizọs nọ na-ele otú nwaanyị a bụ́ ezigbo onye na-eso ụzọ ya si na-ebe ákwá, ya emetụ ya n’ahụ́. N’ihi ya, ọ pụtara n’ihu Meri ma mee obere ihe gbara ya ezigbo ume. Ọ gwara ya okwu ma nye ya ọrụ dị ezigbo mkpa. Ọ gwara ya ka ọ gaa gwa ụmụnna ya na a kpọlitela ya n’ọnwụ.—Jọn 20:17, 18.
8. Olee otú anyị nwere ike isi na-eme ka Jizọs?
8 Olee otú anyị ga-esi eme ka Jizọs? Anyị na-eme ka Jizọs ma anyị na-agba ụmụnna anyị ume ka ha nọsie ike na-efe Jehova. Anyị kwesịkwara ịna-ege ha ntị nke ọma ma gbalịa na-aghọta ihe bụ́ nsogbu ha nakwa otú obi dị ha ma gbaa ha ume otú ahụ Jizọs mere. Ka anyị lee ihe mere otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Jocelyn. Nwanne ya nwaanyị nwụrụ n’ihe mberede. Nwanna Nwaanyị Jocelyn sịrị: “Ruo ọtụtụ ọnwa, m nọ na-eru ezigbo uju.” Ma, otu nwanna na nwunye ya kpọrọ ya ka ọ bịa n’ụlọ ha. Ha gere ya ntị nke ọma ka ọ na-ekwu otú obi dị ya. Ha jikwa obiọma meso ya ihe, gwakwa ya na Jehova ji ya kpọrọ ezigbo ihe. Nwanna Nwaanyị Jocelyn sịrị: “Obi gbawara m, mụ adị ka onye mmiri na-eri. Mana, Jehova ji ụmụnna ndị a nyere m aka. Ha nyeere m aka ka ife Jehova gụwakwa m agụụ.” Anyị nwekwara ike ịgba ndị ọzọ ume ma anyị gee ha ntị nke ọma ka ha na-agwa anyị otú ọ dị ha n’obi, anyị agwa ha okwu ga-akasi ha obi ma nyere ha aka ka ha nọgide na-efe Jehova.—Rom 12:15.
NYERE NDỊ MMADỤ AKA ỊGHỌTA OKWU CHINEKE
9. Olee ihe siiri ndị na-eso ụzọ Jizọs ike? Olee otú Jizọs si nyere ha aka?
9 Ndị na-eso ụzọ Jizọs ghọtara na Okwu Chineke bụ eziokwu. Ha mekwara ike ha niile irubere Jehova isi. (Jọn 17:6) Ma, ha aghọtaghị ihe mere e ji gbuo Jizọs ka onye omekome. Jizọs ma na ndị na-eso ụzọ ya nwere okwukwe nakwa na ha hụrụ Jehova n’anya. Ma, ọ ma na ha kwesịkwara ịghọtakwu Akwụkwọ Nsọ nke ọma. (Luk 9:44, 45; Jọn 20:9) N’ihi ya, ọ kụziiri ha otú ha ga-esi aghọta ihe ha gụrụ n’Akwụkwọ Nsọ. Ka anyị lee otú o si mee ya mgbe ọ pụtara n’ihu ndị na-eso ụzọ ya abụọ ahụ mgbe ha na-aga Emeọs.
10. Olee otú Jizọs si mee ka obi sie ndị na-eso ụzọ ya ike na ọ bụ ya bụ Mezaya? (Luk 24:18-27)
10 Gụọ Luk 24:18-27. Ị̀ chọpụtara na Jizọs agwaghị ụmụ nwoke ahụ onye ọ bụ ozugbo? Kama ọ jụrụ ha ajụjụ. Maka gịnị? O nwere ike ịbụ na ọ chọrọ ka ha kwuo otú ọ dị ha n’obi. Ha mekwara otú ahụ. Ha gwara ya na ha nọ na-atụ anya ka Jizọs napụta ndị Izrel n’aka ndị Rom na-achịgbu ha. Mgbe ha kwuchara otú ọ dị ha n’obi, Jizọs ji Akwụkwọ Nsọ nyere ha aka ịghọta ihe merenụ. b N’abalị ahụ, Jizọs mechara gakwuru ndị na-eso ụzọ ya ndị ọzọ, kọwakwaara ha eziokwu ndị a. (Luk 24:33-48) Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’akụkọ a?
11-12. (a) Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’otú Jizọs si kụzie Baịbụl? (Kọwaakwa ihe e sere na foto ndị e ji kọwaa paragraf a.) (b) Olee otú onye mụụrụ Nwanna Nortey Baịbụl si nyere ya aka?
11 Olee otú anyị ga-esi eme ka Jizọs? Nke mbụ, anyị na ndị anyị na-amụrụ Baịbụl mụwa ihe, anyị kwesịrị iji akọ jụọ ha ajụjụ ndị ga-eme ka ha kwuo ihe dị ha n’obi. (Ilu 20:5) Ị ghọta otú ọ dị ha n’obi, gosi ha otú ha ga-esi achọta amaokwu Baịbụl ndị ga-enyere ha aka. Agwakwala ha ihe ha ga-eme. Kama, nyere ha aka ka ha chebara ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru echiche nakwa ka ha ghọta otú ha ga-esi na-eme ya. Ka anyị lee ihe mere otu nwanna bi na Gana aha ya bụ Nortey.
12 Mgbe Nortey dị afọ iri na isii, ọ malitere ịmụ Baịbụl. Ma, n’oge na-adịghị anya, ndị ezinụlọ ya malitere imegide ya. Gịnị nyeere ya aka ka ọ ghara ịkwụsị ịmụ Baịbụl? Onye na-amụrụ ya Baịbụl ji Matiu isi iri kọwaara ya na a ga-akpagbu ezigbo Onye Kraịst ọ bụla. Nwanna Nortey sịrị: “N’ihi ya, mgbe a malitere ịkpagbu m, obi siri m ike na mụ achọtala eziokwu.” Onye na-amụrụ ya ihe nyekwaara ya aka ichebara ihe Matiu 10:16 kwuru echiche ka o nwee ike ịdị akọ ma na-akwanyere ndị ezinụlọ ya ùgwù ma ha kwuwe gbasara okpukpe. Mgbe e mechara Nwanna Nortey baptizim, ọ chọrọ ịghọ ọsụ ụzọ oge niile. Mana papa ya chọrọ ka ọ gaa mahadum. Onye mụụrụ ya Baịbụl agwaghị ya ihe ọ ga-eme. Kama, o ji ajụjụ mata ihe dị ya n’obi, jirikwa ihe Baịbụl kwuru nyere ya aka ikpebi ihe ọ ga-eme. Gịnị mechara mee? Nwanna Nortey kpebiri ịbanye ozi oge niile. Papa ya chụpụrụ ya n’ụlọ ha. Olee otú ihe ndị a niile dị Nwanna Nortey n’obi? Ọ sịrị: “Obi siri m ezigbo ike na mkpebi m mere dị mma.” Ọ bụrụkwa na anyịnwa ewepụta oge nyere ndị ọzọ aka ichebara ihe Baịbụl kwuru echiche, anyị nwere ike inyere ha aka ka ụkwụ sie ha ike n’ọgbakọ.—Efe. 3:16-19.
NA-AZỤ ỤMỤNNA NWOKE KA HA BỤRỤ “ONYINYE”
13. Gịnị ka Jizọs mere ka e nwee ike ịrụrụ ọrụ Nna ya nyere ya na-aga? (Ndị Efesọs 4:8)
13 Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, ọ rụrụ ọrụ Nna ya nyere ya ka ọ rụọ nke ọma. (Jọn 17:4) Mana, Jizọs echeghị na ọ bụ naanị ya ga-arụtali ọrụ Chineke chọrọ ka ọ rụọ. N’ime afọ atọ na ọkara o ji kwusaa ozi ọma n’ụwa, ọ zụrụ ndị ọzọ ka ha na-ekwusakwa ozi ọma. Tupu ya alaghachi n’eluigwe, o nyere ndị na-eso ụzọ ya ọrụ ilekọta atụrụ Chineke nakwa ọrụ ikwusa ozi ọma na ịkụziri ndị mmadụ ihe. O nwere ike ịbụ na ụfọdụ n’ime ha erubeghị afọ iri atọ mgbe ahụ. (Gụọ Ndị Efesọs 4:8.) Ụmụ nwoke ndị a so Jizọs rụsie ọrụ ike. Ha na-erubekwara ya isi. Mana tupu ya alaa eluigwe, ọ zụkwuru ha ka ha nwee ike ịghọ “onyinye.” Olee otú o si zụkwuo ha?
14. Olee otú Jizọs si nyere ndị na-eso ụzọ ya aka imekwu nke ọma n’ozi Chineke n’ime ụbọchị iri anọ ikpeazụ ọ nọrọ n’ụwa? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)
14 Jizọs ji obiọma nye ndị na-eso ụzọ ya ndụmọdụ o kwesịrị inye ha. Dị ka ihe atụ, ọ chọpụtara na ụfọdụ n’ime ha na-enwekarị obi abụọ. N’ihi ya, o nyere ha ndụmọdụ maka ya. (Luk 24:25-27; Jọn 20:27) O mere ka ha ghọta na ha kwesịrị ịna-agbasi mbọ ike n’ilekọta atụrụ Chineke karịa ka ha na-agba n’ịrụ ọrụ ha ji akpa afọ ha. (Jọn 21:15) O chetaara ha ka ha ghara iji ihe ha na-eme n’ofufe Jehova tụnyere ihe ndị ọzọ na-eme. (Jọn 21:20-22) Ọ gbazikwara echiche ụfọdụ na-adịghị mma ha nwere gbasara Alaeze Chineke, nyekwara ha aka ilekwasị anya n’ikwusa ozi ọma. (Ọrụ 1:6-8) Gịnị ka ndị okenye nwere ike ịmụta n’aka Jizọs?
15-16. (a) Olee otú ndị okenye ga-esi eme ka Jizọs? (b) Olee otú ndụmọdụ e nyere Nwanna Patrick si baara ya uru?
15 Olee otú ndị okenye ga-esi eme ka Jizọs? Ha kwesịrị ịna-azụ ụmụnna nwoke ma na-enyere ha aka, ma ndị nke ka dị obere, ka ha ruo eruo ịrụkwu ọrụ n’ọgbakọ. c Ndị okenye anaghị atụ anya na ndị ha na-azụ ga-ezu okè. Ha kwesịrị ịna-enye ụmụnna nwoke ka bụ́ okorobịa ndụmọdụ, jirikwa obiọma na-eme ya ka ha nwee ike ịmụta otú ha ga-esi dịrị umeala n’obi, bụrụ ndị a tụkwasịrị obi, na ndị dị njikere inyere ndị ọzọ aka.—1 Tim. 3:1; 2 Tim. 2:2; 1 Pita 5:5.
16 Ka anyị lee otú ndụmọdụ si baara otu nwanna nwoke aha ya bụ Patrick uru. Mgbe ọ ka na-eto eto, ọ na-ejikarị olu ike agwa ndị mmadụ okwu, na-emesokwa ha otú na-adịghị mma, ma ụmụnna nwaanyị. Otu okenye chọpụtara àgwà a na-adịghị mma nwanna a na-akpa ma jiri obiọma nye ya ndụmọdụ. Nwanna Patrick sịrị: “Obi dị m ụtọ na ọ gbaziri m. Obi na-adakarị m mbà ma m hụ ka a na-enye ụmụnna nwoke ndị ọzọ ọrụ m chọrọ ịrụ. Mana, ndụmọdụ okenye a nyere m nyeere m aka ịchọpụta na ihe kwesịrị ịbụ mkpa m bụ otú m ga-esi na-ejere ụmụnna m ozi kama ilekwasị anya n’ọrụ ndị m chọrọ ka e nye m n’ọgbakọ.” Ihe a mere ka a họpụta Nwanna Patrick ka ọ bụrụ okenye mgbe ọ dị afọ iri abụọ na atọ.—Ilu 27:9.
17. Olee otú Jizọs si gosi na ọ tụkwasịrị ndị na-eso ụzọ ya obi?
17 Ọrụ Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya abụghị naanị ikwusa ozi ọma. O nyekwara ha ọrụ ịkụzi ihe. (Mat. 28:20) d O nwere ike ịbụ na ndị na-eso ụzọ ya chere na ha erughị eru ịrụ ọrụ ahụ. Ma, obi siri Jizọs ike na ha ga-arụli ya. Ọ gwakwara ha otú ahụ. Ọ bụ ya mere o ji gwa ha, sị: “Otú Nna m zitere m ka m na-ezigakwa unu.”—Jọn 20:21.
18. Olee otú ndị okenye ga-esi eme ka Jizọs?
18 Olee otú ndị okenye ga-esi eme ka Jizọs? Ndị okenye ma ihe na-azụ ndị ọzọ ma na-enye ha ọrụ. (Fil. 2:19-22) Dị ka ihe atụ, ndị okenye nwere ike ịgwa ndị na-eto eto ka ha soro na-edowe Ụlọ Nzukọ Alaeze ọcha ma na-arụzi ihe ndị mebiri na ya. Ha nwere ike inye ụmụnna ha ọrụ, kụziere ha otú e si arụ ya, tụkwasịkwa ha obi na ha ga-arụta ya. E nwere otu nwanna ghọrọ okenye ọhụrụ aha ya bụ Matthew. O kwuru na obi dị ya ụtọ n’otú ndị okenye ma nke a na-akọ si zụọ ya ịrụ ọrụ e nyere ya, tụkwasịkwa ya obi na ọ ga-arụta ya. Ọ sịrị: “M mejọọ ihe, ha na-enyere m aka ịchọpụta ihe m nwere ike isi n’ihe ahụ m mejọrọ mụta ma mekwuo nke ọma n’oge ọzọ. e
19. Gịnị ka anyị kwesịrị ikpebisi ike ime?
19 Jizọs ji ụbọchị iri anọ ikpeazụ ọ nọrọ n’ụwa gbaa ndị na-eso ụzọ ya ume, kụziere ha ihe, zụọkwa ha. Ka anyị kpebisie ike isosi nzọụkwụ ya ike. (1 Pita 2:21) Ọ ga-enyere anyị aka ime otú ahụ. A sị ka e kwuwe, o kwere anyị nkwa, sị: “M nọnyekwaara unu ụbọchị niile ruo ọgwụgwụ oge a.”—Mat. 28:20.
ABỤ NKE 15 Too Ọkpara Jehova
a Akwụkwọ Matiu, Mak, Luk, na Jọn, na akwụkwọ Baịbụl ndị ọzọ kwuru ọtụtụ ugboro Jizọs pụtara n’ihu ndị ọzọ, dị ka Meri Magdalin (Jọn 20:11-18); ụmụ nwaanyị ndị ọzọ (Mat. 28:8-10; Luk 24:8-11); ndị na-eso ụzọ Jizọs abụọ (Luk 24:13-15); Pita (Luk 24:34); ndịozi Jizọs, ma e wepụ Tọmọs (Jọn 20:19-24); ndịozi Jizọs, ma Tọmọs (Jọn 20:26); ndị na-eso ụzọ Jizọs asaa (Jọn 21:1, 2); ihe karịrị narị ndị na-eso ụzọ Jizọs ise (500) (Mat. 28:16; 1 Kọr. 15:6); nwanne ya nwoke Jems (1 Kọr. 15:7); ndịozi ya niile (Ọrụ 1:4); nakwa ndịozi ya n’ebe dị nso na Betani. (Luk 24:50-52) E nwekwara ike inwe oge ndị ọzọ ọ pụtara n’ihu ndị na-eso ụzọ ya Baịbụl na-ekwughị.—Jọn 21:25.
b Ị chọọ ịhụ amụma ndị e buru na Baịbụl gbasara Mezaya, gaa na jw.org gụọ isiokwu bụ́ “Amụma Ndị E Buru Gbasara Mesaya Hà Na-egosi n’Eziokwu na Ọ Bụ Jizọs Bụ Mesaya?”
c Mgbe ụfọdụ, e nwere ike ịhọpụta ụmụ nwoke nọ n’agbata afọ iri abụọ na ise na afọ iri abụọ na itoolu ka ha bụrụ ndị nlekọta sekit. Ma, ụmụnna ndị a ga-ebu ụzọ bụrụ ndị okenye ma nke a na-akọ.
d Okwu Grik a sụgharịrị “na-ezi ha” pụtakwara ịkụzi ihe, ịkọwa ihe na ikwu ihe otú ọ ga-edo anya ma gosikwa ihe àmà ga-akwado ihe a na-ekwu. Ịkụziri ndị mmadụ ka ha debe ihe niile Jizọs nyere n’iwu abụghị ihe a ga-eme otu mgbe kwụsị. A ga na-akụziri ha ihe Jizọs kwuru, na-egosi ha otú ha ga-esi na-eme ya nakwa otú ha ga-esi na-eme ka Jizọs.
e Ị chọọ ịhụ ihe ndị ọzọ gbasara otú e si enyere ụmụnna nwoke na-eto eto aka ka ha ruo eruo ịrụkwu ọrụ n’ọgbakọ, gụọ Ụlọ Nche Ọgọst 2018, peeji nke 11 na nke 12, paragraf nke 15 ruo na nke 17, nakwa nke Eprel 15, 2015, peeji nke 3 ruo na nke 13.
f NKỌWA FOTO: Mgbe e nyechaara otu onye a na-amụrụ Baịbụl aka ka o chebara ihe Baịbụl kwuru echiche, o kpebiri na ya ga-atụfu ihe ndị o nwere e ji achọ ụlọ mma ma e mewe Krismas.