Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Ọrụ A Dị Ukwuu”

“Ọrụ A Dị Ukwuu”

MGBE oge ruru ka e nwee otu nnọkọ dị oké mkpa na Jeruselem, Eze Devid kpọkọtara ndị niile bụ́ ndị isi, ndị na-eje ozi n’obí eze, na ndị dike. Obi bụ ha sọ aṅụrị mgbe a mara ọkwa pụrụ iche na Jehova ekwuola na ọ bụ Sọlọmọn nwa Devid ga-arụ ụlọ pụrụ iche a ga na-anọ efe ezi Chineke. N’oge ahụ, Devid emeela agadi. Ma, Chineke nyere ya ụkpụrụ a ga-eji rụọ ụlọ ahụ, ya akọọrọ ya Sọlọmọn. Devid sịrị: “Ọrụ a dị ukwuu; n’ihi na nnukwu ụlọ a abụghị maka mmadụ, kama ọ bụ maka Jehova Chineke.”—1 Ihe 28:1, 2, 6, 11, 12; 29:1.

Ajụjụ Devid jụziri bụ: “Ònye n’ime unu na-ewepụta onwe ya iwetara Jehova onyinye taa?” (1 Ihe 29:5) A sị na ị nọ ebe ahụ, gịnị ka ị gaara eme? Ọ̀ gaara emetụ gị n’obi ịkwado ọrụ ahụ? Ndị Izrel malitere inye onyinye ozugbo. N’eziokwu, ha ‘ṅụrịrị ọṅụ n’ihi onyinye afọ ofufo ha nyere, n’ihi na ha ji obi zuru ezu nye Jehova onyinye afọ ofufo.’—1 Ihe 29:9.

Mgbe ọtụtụ narị afọ gara, Jehova mere ka e nwee ihe karịrị ụlọ nsọ ahụ. Ọ bụ ụlọ nsọ ihe atụ, nke ga-eme ka ụmụ mmadụ nwee ike ịna-efe ya n’ihi àjà ahụ Jizọs chụrụ. (Hib. 9:11, 12) N’oge anyị a, gịnị ka Jehova ji na-enyere ndị mmadụ aka ka ha na ya dị ná mma? Ọ bụ ozi ọma anyị na-ekwusa. (Mat. 28:19, 20) O meela ka a na-amụrụ ọtụtụ nde mmadụ Baịbụl kwa afọ, na-eme ọtụtụ puku mmadụ baptizim, na-ehiwekwa ọtụtụ narị ọgbakọ ndị ọhụrụ.

Ọ bụ ya mere o ji dị mkpa ka a na-ebikwu akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl, na-arụkwu Ụlọ Nzukọ Alaeze ma na-elekọta ha, na-enwetakwu ebe a ga na-anọ eme mgbakọ. Ọ̀ bụ na i kwetaghị na ikwusa ozi ọma bụ nnukwu ọrụ bara ezigbo uru?—Mat. 24:14.

Anyị hụrụ Chineke na ndị agbata obi anyị n’anya, ghọtakwa na e kwesịrị ikwusa ozi ọma a ngwa ngwa. Ọ bụ ya mere anyị ji enye onyinye sí anyị n’obi. Anyị na-esi otú ahụ ‘ewetara Jehova onyinye.’ Obi dị anyị ezigbo ụtọ na anyị ‘ji ihe anyị ndị dị oké ọnụ ahịa asọpụrụ Jehova,’ na-ahụkwa otú e si jiri ihe ndị ahụ niile na-arụ ọrụ kachanụ a rụtụrụla kemgbe ụwa.—Ilu 3:9.