Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Họrọ asụsụ Igbo

Ndị Na-eto Eto Guzogidenụ Ekwensu

Ndị Na-eto Eto Guzogidenụ Ekwensu

“Yirinụ ekike agha zuru ezu nke si n’aka Chineke, ka unu wee nwee ike iguzosi ike megide atụmatụ aghụghọ nke Ekwensu.”—EFE. 6:11.

ABỤ: 79, 140

1, 2. (a) Gịnị mere ndị na-eto eto ji na-emeri n’agha ha na Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya na-alụ? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.) (b) Olee ihe anyị ga-atụle?

PỌL ONYEOZI ji Ndị Kraịst tụnyere ndị agha. Anyị na-alụ agha, nweekwa ndị anyị na ha na-alụ ya. Ndị anyị na ha na-alụ ya abụghị ndị mmadụ, kama ọ bụ Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya. Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya bụ aka ochie n’ịlụ agha. E lee ya anya, o nwere ike iyi ka anyị agaghị emerili n’agha a, karịchaa ma ọ bụrụ na anyị ka na-eto eto. Olee otú ndị na-eto eto ga-esi merie ndị mmụọ ọjọọ ndị a ka mmadụ ike? Nke bụ́ eziokwu bụ na ndị na-eto eto nwere ike imeri ha, ha na-emerikwa. N’ihi gịnị? N’ihi na ha “na-enweta ike n’ime Onyenwe anyị.” Ma ihe ha na-eme abụghị naanị inweta ike n’aka Chineke. Ha ekeela onwe ha ekike maka ịlụ agha. Dị ka ndị agha a zụrụ nke ọma, ha eyirila “ekike agha zuru ezu nke si n’aka Chineke.”—Gụọ Ndị Efesọs 6:10-12.

2 Mgbe Pọl mere ihe atụ a, ọ ga-abụ na ihe o bu n’obi bụ ihe ndị agha Rom na-eyi aga agha. (Ọrụ 28:16) Ka anyị tụlee ihe mere ihe atụ a ji daba adaba. Anyị ga-atụlekwa ihe ụfọdụ  ndị na-eto eto kwuru gbasara nsogbu ndị ha na-enwe n’iyiri ihe agha nke ọ bụla, nakwa uru ha na-erite ma ha yiri ya.

Ekike Agha Gị Ò Zuru Ezu?

“WERENỤ EZIOKWU KEE ÚKWÙ UNU”

3, 4. Olee otú eziokwu ndị dị na Baịbụl si yie ihe onye agha Rom na-eke n’úkwù?

3 Gụọ Ndị Efesọs 6:14. Ihe onye agha Rom na-eke n’úkwù na-enwe ígwè nke na-echebe úkwù ya. A rụrụ ya otú ọ ga-ejide ihe agha nke o yi n’elu. Ụfọdụ ihe a na-eke n’úkwù na-enwe ebe a na-amịnye mma agha na daga. Onye agha kesie ihe ọ na-eke n’úkwù ya ike, obi na-aka ya ịlụ agha.

4 Eziokwu anyị mụtara n’Okwu Chineke na-echebekwa anyị ka a ghara iji nkụzi ụgha duhie anyị. (Jọn 8:31, 32; 1 Jọn 4:1) Ka anyị na-eji eziokwu Chineke na-akụziri anyị kpọrọ ihe, ka ọ na-adịkwuru anyị mfe iyiri “ihe mgbochi obi” anyị, ya bụ, ịna-eme ihe Chineke kwuru. (Ọma 111:7, 8; 1 Jọn 5:3) Ọ bụrụkwa na eziokwu ndị dị na Baịbụl edoo anyị anya, anyị ga-eji ha gosi ndị na-emegide anyị na ihe anyị na-ekwu bụ eziokwu.—1 Pita 3:15.

5. Gịnị mere anyị ga-eji na-ekwu eziokwu?

5 Anyị jiri eziokwu dị na Baịbụl kee onwe anyị, anyị ga na-eme ya eme, na-ekwukwa eziokwu mgbe niile. Gịnị mere anyị ga-eji gbaara ụgha ọsọ? Ọ bụ n’ihi na ụgha bụ otu n’ime ngwá agha Setan kacha eji eduhie ọtụtụ ndị. Ụgha na-emerụ ma onye na-agha ya ma onye na-ekwere na ya ahụ́. (Jọn 8:44) N’ihi ya, anyị na-agbalị izere ịgha ụgha n’agbanyeghị na anyị ezughị okè. (Efe. 4:25) Ma, ọ naghị adị mfe. Otu nwa agbọghọ dị afọ iri na asatọ, aha ya bụ Abigail kwuru, sị: “Mgbe ụfọdụ, o nwere ike iyi ka ikwu eziokwu abaghị uru, nke ka nke, ma ọ bụrụ na ịgha ụgha ga-eme ka ị ghara ịba ná nsogbu.” Gịnị meziri o ji ekwu eziokwu mgbe niile? Ọ sịrị: “M kwuo eziokwu, akọnuche m anaghị enye m nsogbu. Nne na nna m na ndị enyi m ma na m na-ekwu eziokwu.” Nwa agbọghọ ọzọ dị afọ iri abụọ na atọ aha ya bụ Victoria, kwuru, sị: “Ọ bụrụ na i kwuo eziokwu ma kwụsie ike n’ihe ndị i kweere, e nwere ike ịmaja gị. Ma uru ọ na-aba enweghị atụ. Ọ na-eme ka obi sikwuo gị ike, gị abịarukwuo Jehova nso, ndị hụrụ gị n’anya ga na-akwanyekwara gị ùgwù.” N’eziokwu, ọ bara uru iji ‘eziokwu kee úkwù anyị’ mgbe niile.

Ihe a na-eke n’úkwù bụ́ eziokwu (A ga-akọwa ya na paragraf nke 3 ruo na nke 5)

“IHE MGBOCHI OBI BỤ́ EZI OMUME”

6, 7. Gịnị mere e ji jiri ezi omume tụnyere ihe mgbochi obi?

6 N’oge ndịozi Jizọs, a na-eji ibé ígwè arụ ụfọdụ ihe mgbochi obi onye agha Rom na-eyi. A na-arọ ibé ígwè ndị ahụ otú ha ga-ekpuchi obi ya. A rụnyere ihe ndị e ji akpọchi ihe n’ígwè ndị ahụ, werezie akpụkpọ anụ kekọta ha. Ọtụtụ ibé ígwè e ji akpụkpọ anụ kekọta na-ekpuchizi ubu ya. Ụdị ihe agha a anaghị ekwecha ya megharịa ahụ́. Ma, ọ ga na-elebara ya anya ka ọ mara ma ibé ígwè ndị ahụ hà dịkwa otú ha kwesịrị ịdị. Ma, ihe agha a na-egbochi mma agha ma ọ bụ akụ́ ịmaba ya n’obi, ma ọ bụ n’akụkụ ahụ́ ya ọzọ dị mkpa.

7 E nwere ike iji iwu Jehova nke na-echebe obi anyị tụnyere ihe mgbochi obi. (Ilu 4:23) Onye agha agaghị anwa anwa were ihe mgbochi obi ya e ji ígwè bụ́ ọkpọka rụọ gbanwere nke a na-ejighị ezigbo ígwè rụọ. Otú ahụ ka ọ dịkwa anyị. Anyị agaghị anwa anwa hapụ ime ihe Jehova kwuru mewe ihe anyị chere na ọ dị mma. Anyị agaghị echebeli obi anyị n’onwe anyị. (Ilu 3:5, 6) Kama nke ahụ, anyị ga na-agba mbọ iji hụ na “ihe mgbochi obi” Jehova nyere anyị ka na-echebe obi anyị.

8. Gịnị mere ime ihe Jehova kwuru ji aba uru?

 8 Ò nwere mgbe ị na-eche na iwu Jehova kere gị agbụ? Daniel, onye dị afọ iri abụọ na otu kwuru, sị: “Ndị nkụzi m na ụmụ akwụkwọ ibe m ji m eme ihe ọchị n’ihi na m na-eme ihe Baịbụl kwuru. E nwere mgbe o mere ka m ghara ịna-akata obi, mụ adaakwa mbà n’obi.” Olee ihe nyeere ya aka? O kwuru, sị: “M mechara chọpụta na ime ihe Jehova kwuru na-aba uru. Ụfọdụ ndị ‘enyi m’ malitere ịṅụ ọgwụ ike, ndị ọzọ ahapụ ụlọ akwụkwọ. Ọ dị mwute na ndụ ha enweghị isi. N’eziokwu, Jehova na-echebe anyị.” Madison, onye dị afọ iri na ise sịrị: “Ọ na-esiri m ike ime ihe Jehova kwuru ma ghara iso ndị ọgbọ m na-eme ihe ha chere na ọ bụ ikpori ndụ.” Olee ihe o meziri? O kwuru, sị: “M na-echetara onwe m na m na-aza aha Jehova, nakwa na ọnwụnwa ndị na-abịara m bụ ụzọ Setan si alụso m ọgụ. Mgbe ọ bụla m meriri ọnwụnwa, obi na-atọ m ezigbo ụtọ.”

Ihe mgbochi obi bụ́ ezi omume (A ga-akọwa ya na paragraf nke 6 ruo na nke 8)

“AKPỤKPỌ ỤKWỤ BỤ́ NGWÁ ỌRỤ NKE OZI ỌMA NKE UDO”

9-11. (a) Olee ụdị akpụkpọ ụkwụ Ndị Kraịst na-eyi? (b) Olee ihe ga-eme ka ahụ́ ruo anyị ala ikwusa ozi ọma?

9 Gụọ Ndị Efesọs 6:15. Onye agha Rom na-eyighị akpụkpọ ụkwụ ya adịbeghị njikere ịga agha. Ihe e ji mee akpụkpọ ụkwụ ya bụ akpụkpọ anụ atọ a nyakọtara ọnụ. Otú a e si rụọ ya mere ka akpụkpọ ụkwụ ahụ sie ezigbo ike, ya adịkwa ya mma n’ụkwụ.

10 Akpụkpọ ụkwụ ndị agha Rom na-eyi na-enyere ha aka ịlụ agha nke ọma, ma ụdị nke Ndị Kraịst na-eyi na-enyere ha aka ikwusa ozi ọma nke udo. (Aịza. 52:7; Rom 10:15) N’agbanyeghị ya, ọ chọrọ ka anyị kata obi zie ndị mmadụ ozi ọma mgbe ọ dị mkpa. Bo, onye dị afọ iri abụọ kwuru, sị: “Ụjọ na-atụ m izi ụmụ klas m ozi ọma. Ama m na ihere mere m. M cheta ya, amaghị m ihe kpatara ya. Ma ugbu a, obi na-atọ m ụtọ na m na-ezi ndị ọgbọ m ozi ọma.”

11 Ọtụtụ ndị na-eto eto achọpụtala na obi na-eru ha ezigbo ala izi ozi ọma ma ha kwadebe nke ọma. Gịnị ka ị ga-eme iji kwadebe? Otu nwa agbọghọ dị afọ iri na isii aha ya bụ Julia kwuru, sị: “M na-etinye akwụkwọ e ji amụ Baịbụl n’akpa m ji aga akwụkwọ. M na-egekwa ntị ma ụmụ akwụkwọ ibe m na-ekwu uche ha na ihe ha kweere. Ọ na-enyere m aka iche ihe m ga-eji enyere ha aka. M kwadebe akwadebe, ọ na-adịrị m mfe ịgwa ha ihe ga-abara ha uru.” Makenzie, nwa agbọghọ dị afọ iri abụọ na atọ kwuru, sị: “I wetuo obi na-ege ndị ọgbọ gị ntị, ị ga-aghọta ihe bụ́ nsogbu ha. M na-agbalị gụọ isiokwu niile e dere maka ndị na-eto eto. Ọ na-eme ka ọ dịrị m mfe igosi ha ihe dị na Baịbụl ma ọ bụ na jw.org nke ga-enyere ha aka.” Ihe ndị ahụ ha kwuru gosiri na ijikere nke ọma ikwusa ozi ọma dị ka mmadụ iyi akpụkpọ ụkwụ dị ya mma n’ụkwụ.

Akpụkpọ ụkwụ bụ́ ngwá ọrụ nke ozi ọma (A ga-akọwa ya na paragraf nke 9 ruo na nke 11)

“ỌTA UKWU BỤ́ OKWUKWE”

12, 13. Olee ụfọdụ n’ime ‘akụ́ ụta na-ere ọkụ’ nke Setan?

12 Gụọ Ndị Efesọs 6:16. “Ọta ukwu” onye agha Rom na-eji aga agha nwere akụkụ anọ. Ọ na-ekpuchi ya si n’ubu ruo n’ikpere. Ọ na-echebe ya ka ube, akụ́ na mma agha ghara imerụ ya ahụ́.

13 Ụfọdụ n’ime ‘akụ́ ụta na-ere ọkụ’ Setan nwere ike ịgba anyị bụ ụgha ọ na-agha banyere Jehova. Ọ na-ekwu na Jehova anaghị eche gbasara anyị, nakwa na ọ gaghị ahụli anyị n’anya. Otu nwa agbọghọ dị afọ iri na itoolu aha ya bụ Ida nọ na-eche na ya abaghịzi uru. O kwuru, sị: “E nwere mgbe ọ na adị m ka Jehova ọ̀ nọ m n’ebe dị anya, nakwa  na ọ chọghị ịbụ enyi m.” Olee ihe o mere mgbe ọ dị ya otú ahụ? Ọ sịrị: “Ọmụmụ ihe mere ka okwukwe m sie ezigbo ike. Ana m aga ọmụmụ ihe, ma anaghị m aza ajụjụ n’ihi na m chere na o nweghị onye ga-achọ ịnụ ihe m ga-ekwu. Ma ugbu a, m na-akwadebe ọmụmụ ihe, ma na-agbalị ịza ajụjụ ugboro abụọ ma ọ bụ atọ. Ọ naghị adị mfe, ma obi na-atọ m ụtọ ma m mee ya. Ụmụnna na-agbakwa m ezigbo ume. Mgbe ọ bụla m gachara ọmụmụ ihe lọta, obi na-esi m ike na Jehova hụrụ m n’anya.”

14. Olee ihe anyị na-amụta n’ihe mere Ida?

14 E nwere ihe dị mkpa anyị na-amụta n’ihe mere Ida. Ọta a na-enye onye agha anaghị agbanwe agbanwe, otú ọ ha ka ọ na-aha. Ma okwukwe anyị adịghị otú ahụ. O nwere ike ịnyụ ka ọkụ ma ọ bụ sikwuo ike. Ọ bụ anyị ka ọ dị n’aka. (Mat. 14:31; 2 Tesa. 1:3) N’ihi ya, ọ dị mkpa ka anyị mee ka okwukwe anyị sikwuo ike.

Ọta ukwu bụ́ okwukwe (A ga-akọwa ya na paragraf nke 12 ruo na nke 14)

“OKPU AGHA BỤ́ NZỌPỤTA”

15, 16. Olee otú olileanya anyị si yie okpu agha?

15 Gụọ Ndị Efesọs 6:17. A rụrụ okpu agha ndị agha Rom otú ọ ga-eme ka ngwá agha ọ bụla ghara ịtụ onye agha n’isi, n’olu, ma ọ bụkwanụ n’ihu. Ụfọdụ okpu nwere aka, nke na onye agha nwere ike iji ya n’aka.

16 Otú ahụ okpu agha si echebe ụbụrụ onye agha, ka “olileanya nke nzọpụta” si echebe uche anyị. (1 Tesa. 5:8; Ilu 3:21) Olileanya na-eme ka anyị lekwasị anya ná nkwa Chineke kwere anyị ma na-enyere  anyị aka ile nsogbu anyị anya otú kwesịrị ekwesị. (Ọma 27:1, 14; Ọrụ 24:15) Ma, ọ bụrụ na anyị chọrọ ka “okpu agha” anyị na-echebe anyị, anyị ga na-ekpu ya n’isi, anyị agaghị na-eji ya n’aka.

17, 18. (a) Olee otú Setan nwere ike isi mee ka anyị kpupụ okpu agha anyị? (b) Olee otú anyị ga-esi egosi na Setan aghọgbubeghị anyị?

17 Olee otú Setan nwere ike isi mee ka anyị kpupụ okpu agha anyị? Chegodị otú o si nwaa Jizọs. O doro Setan anya na Jizọs ga-emecha chịa ụmụ mmadụ. Ma, Jizọs ga-echere ruo mgbe Jehova ga-eme ya eze. Tupu mgbe ahụ, ọ ga-ata ahụhụ ma nwụọ. N’ihi ya, Setan nyere Jizọs ohere ịbụ eze ozugbo. Setan gwara Jizọs na ọ bụrụ na o fee ya ofufe, ọ ga-eme ka ọ chịwa ụmụ mmadụ ozugbo. (Luk 4:5-7) Setan makwa na Jehova ekwela anyị nkwa imere anyị ihe ọma n’ụwa ọhụrụ ya. Ma, anyị ga-echere, nsogbu nwekwara ike ịbịara anyị tupu oge ahụ. N’ihi ya, Setan na-egosi anyị ihe ndị ọ ga-abụ anyị mee, anyị ekporiwe ndụ ugbu a. Ọ chọrọ ka anyị buru ụzọ na-achụ akụnụba, nweta ihe ọ bụla anyị chọrọ ugbu a. Ọ chọkwara ka anyị ghara ibu ụzọ na-achọ Alaeze Chineke.—Mat. 6:31-33.

18 Ọtụtụ ndị na-eto eto anaghị ekwe ka e jiri ụdị ihe a ghọgbuo ha. Dị ka ihe atụ, Kiana, bụ́ onye dị afọ iri abụọ kwuru, sị: “Ama m na ọ bụ naanị Alaeze Chineke ga-eme ka nsogbu anyị niile kwụsị.” Olee otú olileanya a si nyere ya aka n’otú o si eche echiche, nakwa n’otú o si akpa àgwà ugbu a? O kwukwara, sị: “Olileanya m nwere ibi na Paradaịs na-enyere m aka ka m ghara itinye isi n’ịchụ ihe nke ụwa. Anaghị m eji oge na ike m niile na-arụ ọrụ n’ụwa ochie a, ma ọ bụkwanụ na-achọ ọkwá ukwu. Kama, m na-eji oge na ike m niile ejere Jehova ozi.”

Okpu agha bụ́ nzọpụta (A ga-akọwa ya na paragraf nke 15 ruo na nke 18)

“MMA AGHA NKE MMỤỌ NSỌ” BỤ́ OKWU CHINEKE

19, 20. Olee ihe ị ga-eme ka ị bụrụ aka ochie n’iji Okwu Chineke eme ihe bara uru?

19 Mgbe Pọl dere akwụkwọ ozi a, mma agha ndị agha Rom na-eji alụ agha na-adị ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ amaụkwụ abụọ n’ogologo. Ihe mere ha ji eji ya alụ agha nke ọma bụ n’ihi na ha na-amụ otú e si eji ya alụ agha kwa ụbọchị.

20 Pọl ji Okwu Chineke tụnyere mma agha Jehova nyere anyị. Ma, anyị kwesịrị ịgbalị bụrụ aka ochie n’iji Okwu Chineke agbachitere ihe anyị kweere ma ọ bụ iji ya agbanwe echiche na-adịghị mma anyị nwere. (2 Kọr. 10:4, 5; 2 Tim. 2:15) Olee ihe ị ga-eme ka ị bụrụ aka ochie n’iji Okwu Chineke eme ihe bara uru? Sebastian, onye dị afọ iri abụọ na otu kwuru, sị: “M na-ede otu amaokwu n’isiakwụkwọ ọ bụla m gụrụ na Baịbụl. M na-ede amaokwu Baịbụl ndị kacha amasị m. Ime otú ahụ na-eme ka m na-aghọtakwu otú Jehova si eche echiche.” Daniel, onye anyị kwuburu okwu ya sịrị: “M gụwa Baịbụl, m na-ahọrọ amaokwu ndị m ga-eji nyere ndị mmadụ aka n’ozi ọma. M chọpụtala na ndị mmadụ na-ege ntị nke ọma ma ha hụ na i ji Baịbụl kpọrọ ihe, nakwa na ị na-agbalị inyere ha aka.”

Mma agha nke mmụọ nsọ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 19 ruo na nke 20)

21. Gịnị mere anyị ekwesịghị ịtụ Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya ụjọ?

21 Ihe ndị na-eto eto a kpọrọ aha n’isiokwu a kwuru gosiri na anyị ekwesịghị ịtụ Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya egwu. Ha siri ike, ma Jehova ka ha ike. Ha agaghị adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. N’oge na-adịghị anya, n’oge Ọchịchị Puku Afọ Kraịst, a ga-atụ ha mkpọrọ ka ha ghara ịna-eduhie ndị mmadụ ọzọ. E mechaa, a ga-ebibi ha. (Mkpu. 20:1-3, 7-10) Anyị ma onye iro anyị, otú o si alụso anyị ọgụ, nakwa ihe ndị o bu n’obi ime. Jehova ga-enyere anyị aka iguzogide ya.