Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Họrọ asụsụ Igbo

Ihe Mere Anyị Ji “Na-amị Mkpụrụ Dị Ukwuu”

Ihe Mere Anyị Ji “Na-amị Mkpụrụ Dị Ukwuu”

“A na-enye Nna m otuto na nke a, ka unu na-amị mkpụrụ dị ukwuu, unu ewee bụrụ ndị na-eso ụzọ m.”—JỌN 15:8.

ABỤ: 53, 60

1, 2. (a) Obere oge tupu Jizọs anwụọ, olee ihe ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.) (b) Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị buru ihe mere anyị ji na-ekwusa ozi ọma n’obi? (ch) Olee ihe ndị anyị ga-atụle?

NÁ MGBEDE ikpeazụ tupu Jizọs anwụọ, ya na ndị na-eso ụzọ ya kparịtara ụka ruo ogologo oge. Ọ gwara ha ihe mere ka obi sie ha ike na ọ hụrụ ha n’anya nke ukwuu. O meere ha ihe atụ gbasara osisi vaịn, dị ka anyị tụlere n’isiokwu bu nke a ụzọ. Jizọs ji ihe atụ ahụ gbaa ndị na-eso ụzọ ya ume ka ha “na-amị mkpụrụ dị ukwuu,” ya bụ, ka ha jiri ntachi obi na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke.—Jọn 15:8.

2 Ma, ihe Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya abụghị naanị ihe ha kwesịrị ime, kama ọ gwakwara ha ihe mere ha kwesịrị iji eme ya. Ọ gwara ha ihe mere ha kwesịrị iji na-ekwusa ozi ọma. Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị tụlee ihe ndị ahụ ọ gwara ha? Ọ bụrụ na anyị eburu n’obi ihe mere anyị ji kwesị ịna-ekwusa ozi ọma, ọ ga-eme ka anyị jiri ntachi obi na-agba “àmà nye mba niile.” (Mat. 24:13, 14) N’ihi ya, ka anyị tụlee ihe anọ Baịbụl kwuru mere anyị ji na-ekwusa ozi ọma. Anyị ga-atụlekwa ihe anọ Jehova nyere anyị na-enyere anyị aka iji ntachi obi na-amị mkpụrụ.

 ANYỊ NA-ENYE JEHOVA OTUTO

3. (a) Olee ihe Jọn 15:8 kwuru mere anyị ji na-ekwusa ozi ọma? (b) Olee ihe mkpụrụ vaịn ahụ Jizọs ji mee ihe atụ nọchiri anya ya? Gịnị mere o ji daba adaba?

3 Ihe kacha mkpa mere anyị ji na-ekwusa ozi ọma bụ na ọ na-eme ka a na-eto Jehova, na-emekwa ka e doo aha ya nsọ n’ihu mmadụ niile. (Gụọ Jọn 15:1, 8.) Cheta na Jizọs ji Nna ya bụ́ Jehova tụnyere onye ọrụ ubi kụrụ osisi vaịn, jiri onwe ya tụnyere osisi vaịn, jirikwa ndị na-eso ụzọ ya tụnyere alaka ya. (Jọn 15:5) N’ihi ya, mkpụrụ vaịn ahụ nọchiri anya mkpụrụ ndị na-eso ụzọ ya ga-amị ma ọ bụ ozi ọma ha na-ekwusa. Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “A na-enye Nna m otuto na nke a, ka unu na-amị mkpụrụ dị ukwuu.” Otú ahụ osisi vaịn nke na-amị ezigbo mkpụrụ na-eme ka a na-eto onye kụrụ ya, ka anyị na-emekwa ka a na-eto Jehova mgbe anyị na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke otú anyị nwere ike.—Mat. 25:20-23.

4. (a) Olee ụzọ ndị anyị si eme ka e doo aha Chineke nsọ? (b) Olee otú obi dị gị na i so eme ka e doo aha Chineke nsọ?

4 Olee otú ozi ọma anyị na-ekwusa si eme ka e doo aha Chineke nsọ? Anyị agaghị emeli ka aha Chineke dịrịkwuo nsọ. Aha Chineke dị nsọ kemgbe. Cheta ihe Aịzaya onye amụma kwuru. Ọ sịrị: “Ọ bụ Jehova nke ụsụụ ndị agha ka unu ga-emeso dị ka onye dị nsọ.” (Aịza. 8:13) Anyị na-eme ka e doo aha Chineke nsọ ma anyị were ya na ọ bụ ya kacha aha niile, nakwa ma anyị mee ka ndị ọzọ ghọta na ọ dị nsọ. (Mat. 6:9) Dị ka ihe atụ, mgbe anyị na-agwa ndị mmadụ banyere àgwà ọma Jehova nwere, nakwa ihe ndị o zubere imere ụmụ mmadụ, anyị na-eme ka ndị mmadụ mata na ihe Setan kwuru gbasara Jehova bụ ụgha. (Jen. 3:1-5) Ihe ọzọkwa bụ na ọ bụrụ na anyị ana-agbalị enyere ndị mmadụ aka ịghọta na Jehova ruru eru “ịnata otuto na nsọpụrụ na ike,” anyị na-eme ka e doo aha Chineke nsọ. (Mkpu. 4:11) Rune, onye sụrụla ụzọ ruo afọ iri na isii, kwuru, sị: “Obi na-atọ m ezigbo ụtọ na m so na-agbara Onye kere eluigwe na ala àmà. Ọ na-eme ka m na-achọ ikwusa ozi ọma.”

ANYỊ HỤRỤ JEHOVA NA OKPARA YA N’ANYA

5. (a) Olee ihe Jọn 15:9, 10 kwuru mere anyị ji na-ekwusa ozi ọma? (b) Olee otú Jizọs si mee ka ndị na-eso ụzọ ya ghọta na ha kwesịrị ịna-atachi obi?

5 Gụọ Jọn 15:9, 10. Ihe dị mkpa mere anyị ji ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke bụ na anyị ji obi anyị niile hụ Jehova na Jizọs n’anya. (Mak 12:30; Jọn 14:15) Ihe Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya abụghị naanị ka ha nọrọ n’ịhụnanya ya, kama ka ha ‘nọgide n’ịhụnanya ya.’ N’ihi gịnị? N’ihi na ka ha nwee ike ịna-abụ ezigbo ndị na-eso ụzọ ya si n’afọ ruo n’afọ, ha ga na-atachi obi. Jizọs kwuru “nọgide” ọtụtụ ugboro na Jọn 15:4-10, iji mee ka ndị na-eso ụzọ ya mata na ha kwesịrị ịtachi obi.

6. Olee otú anyị ga-esi egosi na anyị chọrọ ịnọgide n’ịhụnanya Kraịst?

6 Olee otú anyị si egosi na anyị chọrọ ịnọgide n’ịhụnanya Kraịst, anyị na ya adịrịkwa ná mma? Ọ bụ ma anyị na-erubere ya isi. E nwere ike ikwu na ọ na-agwa anyị, sị, ‘Ruberenụ m isi.’ Ihe Jizọs na-agwa anyị mee bụ ihe yanwa mere. Ọ sịrị: “Dị nnọọ ka m debere ihe Nna m nyere n’iwu wee nọgide n’ịhụnanya ya.” (Jọn 15: 10) Ihe a Jizọs mere ka anyị kwesịrị ịna-eme.—Jọn 13:15.

7. Olee ihe jikọrọ nrubeisi na ịhụnanya?

7 Jizọs mere ka o doo anya na e nwere ihe jikọrọ nrubeisi na ịhụnanya. Ọ gwara ndịozi ya, sị: “Onye nabatara ihe m nyere n’iwu ma na-edebe ha, ọ bụ onye ahụ hụrụ m n’anya.” (Jọn 14:21) Mgbe anyị  na-ekwusa ozi ọma Jizọs gwara anyị ka anyị na-ekwusa, anyị na-egosi na anyị hụrụ Chineke n’anya n’ihi na ihe Jizọs gwara anyị na-eme si n’aka Nna ya. (Mat. 17:5; Jọn 8:28) Ọ bụrụ na anyị na-egosi na anyị hụrụ Jehova na Jizọs n’anya, ha ga-eme ka anyị nọrọ n’ịhụnanya ha.

ANYỊ NA-ADỌ NDỊ MMADỤ AKA NÁ NTỊ

8, 9. (a) Olee ihe ọzọ mere anyị ji ekwusa ozi ọma? (b) Olee otú ihe Jehova kwuru n’Ezikiel 3:18, 19 nakwa 18:23 si eme ka anyị nọgide na-ekwusa ozi ọma?

8 E nwere ihe ọzọ mere anyị ji kwesị ịnọgide na-ekwusa ozi ọma. Anyị na-ekwusa ozi ọma iji dọọ ndị mmadụ aka ná ntị. Na Baịbụl, a kpọrọ Noa “onye na-ekwusa” ozi ọma. (Gụọ 2 Pita 2:5.) Ọ ga-abụrịrị na ịdọ ndị mmadụ aka ná ntị banyere mbibi a ga-ebibi ndị ọjọọ so n’ozi ọma o kwusara tupu Iju Mmiri ahụ. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ? Cheta na Jizọs kwuru, sị: “N’ihi na dị ka ha nọ n’ụbọchị ndị ahụ tupu iju mmiri ahụ, na-eri ihe ma na-aṅụ ihe ọṅụṅụ, ndị ikom ana-alụ nwunye, a na-ekekwa ndị inyom di, ruo ụbọchị Noa banyere n’ụgbọ ahụ; ha amaghịkwa ruo mgbe iju mmiri ahụ bịara wee kpochapụ ha niile, otú ahụ ka ọnụnọ Nwa nke mmadụ ga-adị.” (Mat. 24:38, 39) N’agbanyeghị na ndị mmadụ egeghị Noa ntị, ọ nọgidere na-adọ ha aka ná ntị otú Chineke gwara ya mee.

9 Taa, anyị na-ekwusara ndị mmadụ ozi ọma Alaeze Chineke ka ha nwee ike ịmata ihe Chineke ga-emere ụmụ mmadụ n’ọdịnihu. Anyị chọsiri ike ka ndị mmadụ nabata ozi ọma ma “dịrị ndụ,” otú ahụ Jehova chọkwara. (Ezik. 18:23) Mgbe anyị na-ekwusa ozi ọma ụlọ n’ụlọ nakwa n’ebe ndị mmadụ na-anọkarị, anyị na-adọkwa ọtụtụ ndị aka ná ntị na Alaeze Chineke ga-abịa bibie ụwa ọjọọ a.—Ezik. 3:18, 19; Dan. 2:44; Mkpu. 14:6, 7.

ANYỊ HỤRỤ NDỊ MMADỤ N’ANYA

10. (a) Olee ihe Matiu 22:39 kwuru mere anyị ji ekwusa ozi ọma? (b) Kọọ otú Pọl na Saịlas si nyere onye na-elekọta ụlọ mkpọrọ n’obodo Filipaị aka.

10 Ihe ọzọ mere anyị ji kwesị ịnọgide na-ekwusa ozi ọma bụ na anyị hụrụ ndị mmadụ n’anya. (Mat. 22:39) Otú anyị si hụ ha n’anya na-eme ka anyị nọgide na-ekwusa ozi ọma, ebe anyị ma na ndị mmadụ nwere ike ịgbanwe ma ọnọdụ ha gbanwee. Ka anyị tụlee ihe mere Pọl onyeozi na Saịlas n’obodo Filipaị. Ndị na-achọghị iji ntị anụ ozi ọma ha na-ekwusa tụbara ha n’ụlọ mkpọrọ. N’etiti abalị, ala mara jijiji na mberede, ọnụ ụzọ ụlọ mkpọrọ ahụ niile meghere. Onye na-elekọta ụlọ mkpọrọ ahụ tụrụ ụjọ na ndị mkpọrọ ahụ niile agbafuola, ya achọọ igbu onwe ya. Pọl tiri mkpu, sị: “Emerụla onwe gị ahụ́.” Ya ejiri ụjọ jụọ ha, sị: “Gịnị ka m ga-eme ka e wee zọpụta m?” Ha asị ya: “Kwere n’Onyenwe anyị Jizọs, a ga-azọpụtakwa gị.”—Ọrụ 16:25-34.

Anyị na-ekwusa ozi ọma n’ihi na anyị hụrụ Jehova, Jizọs, na ndị mmadụ n’anya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 5 na nke 10)

11, 12. (a) Gịnị ka akụkọ onye ahụ na-elekọta ụlọ mkpọrọ na-akụziri anyị banyere ozi ọma anyị na-ekwusa? (b) Olee ihe mere anyị ji chọọ ịna-ekwusa ozi ọma?

11 Gịnị ka akụkọ onye ahụ na-elekọta ụlọ mkpọrọ na-akụziri anyị banyere ozi ọma anyị na-ekwusa? Cheta na ọ bụ mgbe ala machara jijiji ka onye ahụ na-elekọta  ụlọ mkpọrọ gbanwere obi ya ma kwuo ka e nyere ya aka. Taakwa, ụfọdụ ndị na-anaghị egebu anyị ntị nwere ike ịgbanwe obi ha ma kwuo ka e nyere ha aka ma nsogbu tara akpụ bịara ha. Dị ka ihe atụ, o nwere ike ịbụ na a chụọla ụfọdụ ndị nọ n’ebe anyị na-ekwusa ozi ọma n’ọrụ ha rụrụla ọtụtụ afọ, ya emezie ka ha nọrọ ná mgbagwoju anya. Obi nwere ike ịgbawa ụfọdụ n’ihi na ha na di ha ma ọ bụ nwunye ha etisaala. Obi nwekwara ike na-ajọ ụfọdụ ndị njọ n’ihi ọrịa ọjọọ a chọpụtara na ha na-arịa, ma ọ bụkwanụ na mmadụ nwụnahụrụ ha. Ụdị ihe a mee, onye ahụ obi na-ajọ njọ nwere ike ịjụ ajụjụ gbasara ihe mere anyị ji dịrị ndụ, bụ́kwanụ ajụjụ ọ na-ajụtụbeghị. Ha nwedịrị ike ịna-ajụ onwe ha, sị, ‘Gịnị ka m ga-eme ka a zọpụta m?’ Anyị hụ ụdị ndị a, ha nwere ike ịchọ ige anyị ntị na nke mbụ ya, n’ozi ọma na-eme ka e nwee olileanya anyị na-ekwusa.

12 N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị anọgide na-ekwusa ozi ọma, ndị mmadụ ga-ahụ anyị mgbe ha chọrọ ozi ga-akasi ha obi. (Aịza. 61:1) Charlotte, onye nọrọla n’ozi oge niile kemgbe afọ iri atọ na asatọ, kwuru, sị: “Ndị mmadụ nọ ná mgbagwoju anya taa. E kwesịrị izi ha ozi ọma.” Ejvor, onye sụrụla ụzọ afọ iri atọ na anọ, kwuru, sị: “Ike ụwa na-agwụ ọtụtụ ndị taa karịa mgbe ọ bụla ọzọ. M chọrọ inyere ha aka. Ọ bụ ya mere m ji ekwusa ozi ọma.” O doro anya na otú anyị si hụ ndị mmadụ n’anya bụ ihe magburu onwe ya mere anyị ji na-ezi ha ozi ọma.

IHE JEHOVA NYERE ANYỊ NDỊ NA-ENYERE ANYỊ AKA ỊNA-ATACHI OBI

13, 14. (a) Olee ihe Jọn 15:11 kwuru e nyere anyị? (b) Olee otú anyị nwere ike isi nweta ụdị ọṅụ Jizọs nwere? (ch) Olee uru ọṅụ na-abara anyị n’ozi anyị?

13 N’abalị ikpeazụ tupu Jizọs anwụọ, ọ gwara ndịozi ya ihe ndị a ga-enye ha ga-enyere ha aka iji ntachi obi na-amị mkpụrụ. Gịnị bụ ihe ndị ahụ? Olee uru ha na-abara anyị?

14 Ọṅụ. Ozi ọma Jizọs gwara anyị na-ekwusa ọ̀ bụụrụ anyị ibu arọ? Mbanụ. Mgbe Jizọs mechara ihe atụ banyere osisi vaịn, o kwuru na anyị ga-enweta ọṅụ n’ozi ọma Alaeze anyị na-ekwusa. (Gụọ Jọn 15:11.) O mesiri anyị obi ike na anyị ga-enweta ụdị ọṅụ ọ na-enwe. Olee otú anyị ga-esi enwe ya? Dị ka anyị kwuru ná mmalite, Jizọs ji onwe ya tụnyere osisi vaịn, jirikwa ndị na-eso ụzọ ya tụnyere alaka ya. Ọ bụ n’osisi vaịn ahụ ka alaka ndị ahụ dị. Ọ bụrụhaala na alaka ndị ahụ adịgide n’osisi ahụ, ọ ga na-enye ha mmiri na ihe ga-eme ka ha dịrị ndụ. Otú ahụ ka ọ dịkwa anyịnwa. Ọ bụrụ na anyị na Kraịst adịrị n’otu ma na-eṅomi ya, anyị ga-enwe ụdị ọṅụ ọ na-enwe n’ihi ime uche nna ya. (Jọn 4:34; 17:13; 1 Pita 2:21) Hanne, onye sụrụla ụzọ ihe karịrị afọ iri anọ, kwuru, sị: “Ọṅụ m na-enwe ma m gachaa ozi ọma lọta na-eme ka m nọgide n’ozi Jehova.” N’eziokwu, ezigbo ọṅụ anyị na-enwe na-eme ka anyị nwee ume ịna-ekwusa ozi ọma ma mgbe ọtụtụ ndị na-anaghị ege anyị ntị.—Mat. 5:10-12.

15. (a) Olee ụdị udo e kwuru okwu ya na Jọn 14:27? (b) Olee otú udo si enyere anyị aka n’ozi ọma anyị na-ekwusa?

15 Udo. (Gụọ Jọn 14:27.) Tupu mgbede ahụ Jizọs nwụrụ, ọ gwara ndịozi ya, sị: “M na-enye unu udo m.” Olee otú udo a ga-esi nyere anyị aka ịna-ekwusa ozi ọma? Ọ bụrụ na anyị anọgide na-ekwusa ozi ọma, anyị na-enwe udo n’ihi na anyị ma na anyị na-eme ka obi na-atọ Jehova na Jizọs ụtọ. (Ọma 149:4; Rom 5:3, 4; Kọl. 3:15) Ulf, bụ́ onye sụrụla ụzọ afọ iri anọ na ise kwuru, sị: “Ike na-agwụ m ma m gachaa ozi ọma lọta, ma ọ na-eme ka obi na-atọ m ezigbo ụtọ, na-emekwa  ka ndụ m nwee isi.” Obi na-atọ anyị ụtọ na anyị nwere udo na-adịgide adịgide.

16. (a) Olee ihe Jọn 15:15 kwuru e nyere ndịozi Jizọs? (b) Olee otú ndịozi ya ga-esi nọgide na-abụ enyi Jizọs?

16 Enyi anyị na Jizọs bụ. Mgbe Jizọs kwuchara na ya chọrọ ka ọṅụ ndịozi ya na-enwe “zuo ezu,” ọ gwara ha ihe mere o ji dị mkpa ka ha jiri obi ha niile na-ahụ ibe ha n’anya. (Jọn 15:11-13) O kwukwara, sị: “Ana m akpọ unu ndị enyi m.” O nweghị ihe magburu onwe ya karịa mmadụ na Jizọs ịbụ enyi. Olee ihe ndịozi Jizọs ga-eme ka ha na Jizọs na-abụ enyi? Ha ‘ga-aga n’ihu na-amị mkpụrụ.’ (Gụọ Jọn 15:14-16.) Afọ abụọ tupu mgbe ahụ, Jizọs gwara ndịozi ya, sị: “Mgbe unu na-aga, na-ekwusanụ, sị, ‘Alaeze eluigwe eruwo nso.’” (Mat. 10:7) N’ihi ya, ná mgbede ikpeazụ Jizọs na ndịozi ya nọ, ọ gbara ha ume ka ha nọgide na-ekwusa ozi ọma. (Mat. 24:13; Mak 3:14) O siiri ha ike ime ihe a ọ gwara ha, ma ha ga-emeli ya ka ha na ya na-abụ enyi. Gịnị ga-enyere ha aka? Ihe ọzọ Chineke nyere ha ga-enyere ha aka.

17, 18. (a) Olee ihe Jọn 15:16 kwuru na Jehova nyere anyị? (b) Olee otú ihe ndị ahụ ga-esi enyere ndị na-eso ụzọ Jizọs aka? (ch) Olee ihe Jehova nyere anyị na-enyere anyị aka taa?

17 Ekpere Chineke na-aza anyị. Jizọs kwuru, sị: ‘Nna m ga-enye unu ihe ọ bụla unu rịọrọ ya n’aha m, ihe ọ sọkwara ya bụrụ.’ (Jọn 15:16) Ọ ga-abụ na ihe a Jizọs gwara ndịozi ya gbara ha ezigbo ume. * Ọ bụ eziokwu na ndịozi ahụ aghọtachaghị na obere oge, Jizọs ga-anwụ, ma a gaghị ahapụ ha n’enweghị onye ga-enyere ha aka. Jehova dị njikere ịza ekpere ha ma nyere ha aka n’ozi ọma Alaeze ha na-ekwusa. Jehova mekwara otú ahụ. Obere oge Jizọs nwụchara, ha rịọrọ Jehova ka o mee ka ha nwee obi ike. Jehova zakwara ekpere ha.—Ọrụ 4:29, 31.

Obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova na-aza ekpere anyị na-ekpe ka o nyere anyị aka (A ga-akọwa ya na paragraf nke 18)

18 Otú ahụ ka ọ dịkwa anyị taa. Ọ bụrụ na anyị anọgide na-ekwusa ozi ọma, anyị ga na-abụ ndị enyi Jizọs. Ihe ọzọkwa bụ na obi ga-esi anyị ike na Jehova dị njikere ịza ekpere anyị na-ekpe ka o nyere anyị aka imeri nsogbu ndị anyị na-enwe n’ikwusa ozi ọma Alaeze. (Fil. 4:13) Obi dị anyị ezigbo ụtọ na Jehova na-aza anyị ekpere, nakwa na anyị na Jizọs bụ enyi. Ihe ndị a Jehova nyere anyị na-eme ka anyị nọgide na-amị mkpụrụ.—Jems 1:17.

19. (a) Olee ihe mere anyị ji na-ekwusa ozi ọma? (b) Olee ihe na-enyere anyị aka ịrụcha ọrụ Jehova nyere anyị?

19 Dị ka anyị tụlerela n’isiokwu a, anyị na-ekwusa ozi ọma iji mee ka e too Jehova ma doo aha ya nsọ, iji gosi na anyị hụrụ Jehova na Jizọs n’anya, iji dọọ ndị mmadụ aka ná ntị, nakwa iji gosi na anyị hụrụ ndị mmadụ n’anya. Ihe ọzọ bụ ihe anọ Chineke nyere anyị ga-enyere anyị aka ịrụcha ọrụ ya. Ha bụ ọṅụ, udo, ekpere Chineke na-aza anyị, nakwa enyi anyị na Jizọs bụ. Obi na-atọ Jehova ụtọ mgbe ọ na-ahụ otú anyị si jiri obi anyị niile “na-amị mkpụrụ dị ukwuu.”

^ para. 17 Mgbe Jizọs na ndịozi ya na-ekwurịta okwu, o mesiri ha obi ike ọtụtụ ugboro na Jehova ga-aza ekpere ha.—Jọn 14:13; 15:7, 16; 16:23.