Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NDỤ

O Nwebeghị Mgbe Jehova Hapụrụ M

O Nwebeghị Mgbe Jehova Hapụrụ M

Eso m n’ụmụntakịrị nwaanyị anọ a họpụtara ga-enye Adolf Hitler okooko osisi n’otu oge o kwuchara okwu. Olee ihe mere e ji họrọ m? Papa m na-akwadosi ọchịchị ndị Nazi ike. Ọ bụ ya na-anyara onyeisi ndị Nazi n’obodo anyị ụgbọala. Mama m bu Chọọchị Katọlik n’isi, ọ chọkwara ka m bụrụ onye sista. Papa m ma ọ bụ mama m emelighị ka m bụrụ onye Nazi ma ọ bụkwanụ onye sista. Ka m kọọ ihe kpatara ya.

A ZỤLITERE M na Graz dị n’Ọstria. Mgbe m dị afọ asaa, mama m tinyere m n’ụlọ akwụkwọ praịmarị maka ndị chọrọ ịbụ ndị sista. N’ụlọ akwụkwọ a, m chọpụtara na ndị fada na ndị sista na-akwa iko. Ihe a wụrụ m akpata oyi n’ahụ́. Anọrughị m ebe ahụ otu afọ, mama m akpọpụta m.

Ezinụlọ anyị na papa anyị ebe o yi uwe amị ya

Emechara m banye n’ụlọ akwụkwọ a na-ebi ebi. N’otu abalị, papa m bịara ebe ahụ kpọrọ m pụọ, maka na a nọ na-atụ bọmbụ aghara aghara na Graz. Anyị gbagara n’obodo Skladmin. Obere oge anyị gafechara àkwà mmiri dị ebe ahụ, ha agbarie ya. N’oge ọzọ, ụgbọelu e ji alụ agha gbara égbè n’ụlọ mụ na nne nne m nọ. Mgbe agha biri, anyị bịara ghọta na ma ndị chọọchị ma ndị ọchịchị agaghị enyeliri anyị aka ọ bụla.

AMỤTARA M NA JEHOVA NA-AKWADO NDỊ YA

N’afọ 1950, otu Onyeàmà Jehova malitere ịmụrụ mama m Baịbụl. M na-ege ntị ma ha mụwa ihe, mgbe ụfọdụkwa, m na-eso mama m aga ọmụmụ ihe. Mgbe mama m ghọtawara na Ndịàmà Jehova na-akụzi eziokwu, e mere ya baptizim n’afọ 1952.

N’oge ahụ, ọ na-adị m ka ọgbakọ dị ebe ahụ ọ̀ bụ ebe ndị agadi nwaanyị na-enwe nnọkọ. Ma, ka oge na-aga, anyị gara n’ọgbakọ ọzọ, ebe e nwere ọtụtụ ụmụ okoro na agbọghọ. Ọ dịghị ka ebe ndị agadi nwaanyị na-enwe nnọkọ. Mgbe m laghachiri na Graz, m malitere ịgachi ọmụmụ ihe anya. M bịakwara ghọta na ihe m na-amụ bụ eziokwu. M ghọtakwara na Jehova bụ Chineke nke na-akwado ndị na-ejere ya ozi. Ọ na-akwado anyị ma mgbe ọ dị anyị ka e nweghị onye ga-enyere anyị aka ná nsogbu tara ezigbo akpụ anyị nọ na ya.—Ọma 3:5, 6.

M chọrọ ịna-ezi ndị ọzọ ozi ọma. Ndị mbụ m ziri ozi ọma bụ ụmụnne m. Ụmụnne m ndị nwaanyị anọ tọrọ m bicha n’ebe ha na-akụzi ihe n’ụlọ akwụkwọ. M gara n’ebe ndị ahụ gbaa ha ume ka ha mụwa Baịbụl. Ụmụnne m niile mechara mụwa Baịbụl, ma ghọọ Ndịàmà Jehova.

N’izu nke abụọ mgbe m malitere izi ozi ọma n’ụlọ n’ụlọ, mụ na otu nwaanyị dị ihe dị ka afọ iri atọ na ise bidoro ịmụ Baịbụl. E mechara mee ya baptizim. Ka oge na-aga, e mekwara di ya na ụmụ ya ndị nwoke abụọ baptizim. Ọmụmụ ihe mụ na ha mere ka okwukwe m sie ike. Maka gịnị? Maka na enwetụbeghị onye mụrụ m Baịbụl. Mgbe ọ bụla mụ na ha ga-amụ ihe, m na-ebu ụzọ mụọ ya nke ọma. Ihe ọ pụtara bụ́ na m na-ebu ụzọ akụziri onwe m ihe, ka m nwee ike ịkụziri ya onye m na-amụrụ ihe. Ihe a mere ka m ghọtakwuo eziokwu ahụ nke ọma. Enyefere m Jehova onwe m, e meekwa m baptizim n’ọnwa Eprel afọ 1954.

“A NA-AKPAGBU ANYỊ, MA A DỊGHỊ AHAPỤ ANYỊ”

N’afọ 1955, agara m mgbakọ mba niile na Jamanị, Frans, nakwa n’Ịngland. Mgbe m nọ na Lọndọn, mụ na Nwanna Albert Schroeder matara. Ọ bụ onye nkụzi n’Ụlọ Akwụkwọ Gilied mgbe ahụ, o mechakwara soro n’Òtù Na-achị Isi. Mgbe a na-akpọgharị anyị n’Ebe A Na-edebe Ihe Ochie na Briten, Nwanna Schroeder gosiri anyị ụfọdụ akwụkwọ mpịakọta Baịbụl. E dere aha Chineke ná mkpụrụ akwụkwọ Hibru na ha. Ọ kọwakwara uru akwụkwọ mpịakọta ndị ahụ bara. Ihe ndị ahụ ọ kọwara mere ka m hụkwuo Jehova n’anya, meekwa ka m jiri eziokwu ahụ kpọrọkwuo ihe. O mere ka m kpebisikwuo ike na o nweghị ihe ga-eme ka m kwụsị ịkụziri ndị ọzọ eziokwu ndị dị n’Okwu Chineke.

Mụ na onye mụ na ya sụrụ ụzọ pụrụ iche na Mistelbak, dị n’Ọstria (ọ bụ ya nọ n’aka nri

Amalitere m ịsụ ụzọ oge niile n’abalị mbụ n’ọnwa Jenụwarị afọ 1956. Mgbe ọnwa anọ gachara, a kpọrọ m ka m bụrụ onye ọsụ ụzọ pụrụ iche n’Ọstria. N’oge ahụ, e nweghị Onyeàmà Jehova bi na Mistelbak, bụ́ ebe e zigara m. Ma, e nwere ihe siiri m ike ná mmalite. E nwere nwanna nwaanyị bụ́ ọsụ ụzọ pụrụ iche e zigara mụ na ya ebe a. Mụ na ya dị iche. Dị ka ihe atụ, ọ fọrọ obere ka m ruo afọ iri na itoolu, ma yanwa dị afọ iri abụọ na ise. M sị n’obodo mepere emepe, yanwa si n’ime obodo. Anaghị m eteta ụra ngwa ngwa n’ụtụtụ, ma ọ na-eteta ngwa ngwa. Yanwa na-alaba n’oge, mụnwa anaghị alaba n’oge. Ma, ime ihe ndị anyị na-amụta na Baịbụl mere ka anyị dozie ihe niile, meekwa ka anyị jiri obi ụtọ na-eje ozi anyị.

Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na e nwere nsogbu ndị ọzọ bịaara anyị. A kpagburu anyị ugboro ugboro, ma Jehova ‘ahapụghị anyị.’ (2 Kọr. 4:7-9) E nwere mgbe anyị gara ozi ọma n’otu ime ime obodo, ndị bi ebe ahụ akpọpụtasịara anyị nkịta ha. Tupu anyị amara ihe na-emenụ, ọtụtụ nkịta agbaala anyị gburugburu, jahesịa ezé ma na-agbọrọ anyị. Anyị jidere ibe anyị aka, mụ ekpee ekpere, sị “Jehova biko, ha dọriwe anyị, mee ka anyị nwụọ ozugbo.” Mgbe ọ fọrọ ntakịrị ka ha rute anyị nso, ha kwụsịrị, gbugbuoro anyị ọdụdụ ma laghachi. Anyị matara na ọ bụ Jehova chebere anyị. Mgbe ihe a mechara, anyị ziri ozi ọma n’obodo ahụ niile, obi tọrọ anyị ụtọ na ha gere anyị ntị. O nwere ike ibu na o juru ha anya na nkịta ndị ahụ ataghị anyị ma ọ bụkwanụ otú anyị si kata obi zie ha ozi ọma n’agbanyeghị na ha ji nkịta yie anyị egwu. Ụfọdụ n’ime ha mechadịrị bụrụ Ndịàmà Jehova.

Anyị nwere nsogbu ọzọ menyere anyị ụjọ. O nwere otu abalị nwoke anyị bi n’ụlọ ya gara ṅụrọchaa anya lọta. O bidoro ịba mba na ya ga-egbu anyị, na-ekwu na anyị na-enye ndị bi gburugburu ebe ahụ nsogbu. Nwunye ya gbara mbọ ijide ya, ma o kweghị. Anyị nọ n’ọnụ ụlọ anyị dị n’elu na-anụ ihe niile ọ na-ekwu. Anyị buuru oche ndị dị n’ụlọ anyị ozugbo buchie ọnụ ụzọ ma bido kwanyewa ihe anyị n’igbe. Mgbe anyị mepere ụzọ, nwoke ahụ ji ogologo mma guzochie na steepụ e si abata n’ụlọ anyị. Anyị buuru ihe anyị niile si n’ụzọ dị n’azụ ụlọ ahụ gbapụ n’èzí, sizie n’ubi di nso ebe ahụ rie mbọ mbọ. Anyị alaghachighị n’ụlọ ahụ ọzọ.

Anyị gara na họtel gwa ha nye anyị ụlọ, ha enye anyị ụlọ. Anyị nọrọ ebe ahụ ihe fọrọ obere ka o ruo otu afọ. Ọnụnọ anyị ebe ahụ baara anyị ezigbo uru. Olee otú o si baara anyị uru? Họtel ahụ dị n’etiti obodo ahụ, ndị anyị na-amụrụ Baịbụl chọkwara ịna-abịa ebe ahụ amụ ihe. N’oge na-adịghị anya, anyị malitere inwe ọmụmụ akwụkwọ ọgbakọ, nakwa Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche n’ụlọ anyị, ihe dị ka mmadụ iri na ise na-abịakwa ya.

Anyị nọrọ na Mistelbak ruo ihe karịrị otu afọ. E mechara ziga m n’obodo Feldbak, nke dị n’ebe ndịda anyanwụ obodo Graz. E nwekwara nwanna nwaanyị ọzọ, bụ́ onye ọsụ ụzọ pụrụ iche mụ na ya so na-eje ozi. Ma, e nweghị ọgbakọ ebe ahụ. Anyị bi n’obere ọnụ ụlọ dị n’okpukpu nke abụọ nke ụlọ elu e ji osisi rụọ. Anyị ji akwụkwọ akụkọ fachisịa oghere dị n’agbata osisi ndị ahụ, bụ́ ebe ikuku na-esi efebata. Anyị na-esere mmiri n’olulu mmiri dị ebe ahụ. Ma, mbọ anyị gbara n’obodo ahụ efughị ọhịa. N’ime ọnwa ole na ole anyị malitere ozi ebe ahụ, e hiwere otu ìgwè. N’otu ezinụlọ anyị mụụrụ ihe, mmadụ iri atọ n’ime ha mechara bata n’ọgbakọ.

Ihe ndị a mere ka m na-ekelekwu Jehova n’ihi na ọ naghị ahapụ ndị niile bu ụzọ na-achọ Alaeze ya. Ọ burugodị na nsogbu anyị akarịa ikike mmadụ, Jehova ga-enyere anyị aka.—Ọma 121:1-3.

CHINEKE JI ‘AKA NRI YA NKE EZI OMUME JIDESIE M IKE’

N’afọ 1958, e nwere mgbakọ mba niile n’Ámá Egwuregwu Yanki nakwa na Polo Graụnds, dị na Niu Yọk Siti. M tinyere akwụkwọ ịga. Alaka ụlọ ọrụ dị n’Ọstria jụrụ m ma m̀ ga-achọ iso gaa klas nke iri atọ na abụọ nke Ụlọ Akwụkwọ Gilied. Agaghịnụ m anwa anwa jụ ụdị ihe ọma a. M zaghachiri ha ozugbo na “m ga-achọ ịga.”

Na klas anyị na Gilied, m nọ n’akụkụ Nwanna Martin Poetzinger. Nwanna a diri ọnụ niile e mekpọrọ ya n’ogige ịta ahụhụ ndị Nazi. O mechakwara soro n’Òtù Na-achị Isi. Anyị na-amụ ihe na klas mgbe ụfọdụ, Nwanna Martin na-atakwunyere m, sị, “Erika, gịnị ka ihe a e kwuru pụtara n’asụsụ Jaman?”

Mgbe ọ fọrọ ihe dị ka ọnwa atọ ka anyị gụchaa, Nwanna Nathan Knorr kwuru ebe ndị e zigara anyị. E zigara m na Paragụwaị. Ebe m dị obere mgbe ahụ, m ga-anata papa m ikike tupu e kwe ka m banye n’obodo ahụ. Mgbe o kwetara, m kwagara na Paragụwaị n’ọnwa Mach afọ 1959. E nyere mụ na nwanna nwaanyị ọzọ bú onye ozi ala ọzọ ụlọ n’ebe ndị ozi ala ọzọ na-ebi n’Asụnshọn.

O teghị aka, mụ amata Walter Bright, bụ́ onye ozi ala ọzọ gụrụ akwụkwọ na klas nke iri atọ nke Ụlọ akwụkwọ Gilied. Ka oge na-aga, anyị lụrụ. Mụ na ya sokwa die nsogbu ndị bịaara anyị. Mgbe ọ bụla nsogbu tara akpụ bịaara anyị, anyị na-agụ nkwa Jehova kwere n’Aịzaya 41:10. Ọ sịrị: “Atụla egwu, n’ihi na m nọnyeere gị. Elegharịla anya n’ụjọ, n’ihi na abụ m Chineke gị. M ga-eme ka ị dị ike.” Ihe a Baịbụl kwuru mere ka obi sie anyị ike na ọ bụrụhaala na anyị agbalịsie ike na-eme uche Chineke ma buru ụzọ na-achọ Alaeze ya, Jehova agaghị ahapụ anyị.

Ka oge na-aga, e zigara anyị n’ebe dị nso n’ókè Paragụwaị na Brazil. Mgbe anyị rutere ebe ahụ, onye ụkọchukwu nọ ebe ahụ gwara ndị na-eto eto ka ha were nkume tụkasịa ụlọ na-esichaghị ike anyị bi na ya. Walter mechara mụwara onyeisi ndị uwe ojii obodo ahụ Baịbụl. Ọ gbara mbọ hụ na ndị uwe ojii nọ nso n’ụlọ anyị ruo otu izu, ndị obodo ahụ enyeghịkwa anyị nsogbu ọzọ. Obere oge ihe a mechara, anyị kwagara n’ụlọ ọzọ ka nke mbụ ahụ mma. Ọ dị na Brazil, ma ọ dị nso n’ókè Paragụwaị na Brazil. Ebe ọhụrụ a e zigara anyị baara anyị ezigbo uru maka na anyị nwere ike ịna-enwe ọmụmụ ihe ma na Brazil ma na Paragụwaị. Tupu anyị ahapụ ebe ahụ, e hiwere obere ọgbakọ abụọ na ya.

Mụ na dị m Walter, mgbe anyị na-eje ozi ala ọzọ n’Asụnshọn, dị na Paragụwaị

JEHOVA NỌGIDERE NA-ENYERE M AKA

Ndị Dọkịta m gwara m na agaghị m amụtali nwa, ma n’afọ 1962, o juru anyị anya mgbe a chọpụtara na m dị ime. Anyị kwagaziri na Họliwud dị na Flọrịda. Ọ dị nso n’ebe ndị ezinụlọ di m bi. Mụ na di m asụghị ụzọ ruo ọtụtụ afọ n’ihi na anyị nwere ezinụlọ anyị na-elekọta. Ma, anyị ka jikwa ihe ndị gbasara Alaeze Chineke kpọrọ ihe ná ndụ anyị.—Mat. 6:33.

Mgbe anyị rutere Flọrịda n’ọnwa Nọvemba afọ 1962, ndị obodo a anaghị achọ ka ndị ọcha na ndị ojii na-enwe nnọkọ otu ebe. O juru anyị anya na ụmụnna ndị ọcha na ndị isi ojii na-enwe ọmụmụ ihe iche iche, na-agakwa ozi ọma iche iche n’ihi otú ndị obodo a si eme. Ma, Jehova anaghị akpa ókè agbụrụ, o teghịkwa aka ụmụnna ndị ọcha na ndị ojii amalite ịnọ n’otu ọgbakọ. O doro anya na ọ bụ Jehova mere ka o kwe omume. Ugbu a, e nweziri ọtụtụ ọgbakọ n’ebe ahụ.

Ọ dị mwute na ọrịa kansa ụbụrụ gburu di m n’afọ 2015. Kemgbe afọ iri ise na ise anyị lụrụ, ọ hụrụ m n’anya, hụkwa Jehova n’anya, o nyekwaara ọtụtụ ụmụnna aka. Ana m atụ anya ịhụ ya ọzọ mgbe ahụ́ ga-esi ya ike ma a kpọlite ya n’ọnwụ.—Ọrụ 24:15.

Obi dị m ụtọ na ejeela m ozi oge niile ihe karịrị afọ iri anọ ugbu a. Jehova agọziekwala m mmaji kwuru mmaji. Dị ka ihe atụ, mụ na di m hụchara mgbe e mere mmadụ otu narị na iri atọ na isii anyị mụụrụ Baịbụl baptizim. Ma, nke a apụtaghị na ihe gaara anyị siriri werere mgbe niile. Ma, ọ dịghị mgbe anyị kụdoro nsogbu ndị bịaara anyị aka kwụsị ozi anyị na-ejere ezi Chineke anyị. Kama nke ahụ, anyị bịarukwuru ya nso, tụkwasịkwa ya obi na ọ ga-edozi nsogbu anyị mgbe ọ chọrọ nakwa otú dị ya mma. O mekwara otú ahụ.—2 Tim. 4:16, 17.

Ọnwụ di m na-ewute m nke ukwuu, ma ozi oge niile na-enyere m aka idi ya. Mgbe ọ bụla m na-akụziri ndị ọzọ ihe, na-agwakwa ha banyere olileanya mbilite n’ọnwụ, ọ na-akasị m obi. N’eziokwu, o nwetụbeghị mgbe Jehova hapụrụ m. O mezuru nkwa o kwere m bụ́ na ọ ga-enyere m aka, mee ka m dị ike, jirikwa ‘aka nri ya nke ezi omume’ jidesie m ike.—Aịza. 41:10.