Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ha Ji Obi Ha Wepụta Onwe Ha

Ha Ji Obi Ha Wepụta Onwe Ha

ỌTỤTỤ ụmụnna nwaanyị na-alụghị di so n’ọtụtụ n’ime ndị ji obi ha niile na-ekwusa ozi ọma n’obodo ebe a chọkwuru ndị ga na-ekwusa ozi ọma. Ụfọdụ n’ime ha ejeela ozi ná mba ọzọ ruo ọtụtụ afọ. Gịnị nyeere ha aka ọtụtụ afọ gara aga ịkwaga mba ọzọ? Olee ihe ha mụtarala n’ikwusa ozi ọma ná mba ọzọ? Oleekwa uru ọ baarala ha? Anyị gbara ọtụtụ ụmụnna nwaanyị ndị a jeerela Jehova ozi ọtụtụ afọ ajụjụ ọnụ. Ọ bụrụ na ị bụ nwanna nwaanyị na-alụbeghị di, ya ana-agụkwa gị agụụ isi otú a pụrụ iche na-ekwusa ozi ọma, obi siri anyị ike na ihe ha kwuru ga-abara gị uru. N’eziokwu, akụkọ ha ga-abara ndị niile na-efe Chineke uru.

OTÚ HA SI KWỤSỊ INWE OBI ABỤỌ

Anita

Ọ bụrụ na ị bụ nwanna nwaanyị na-alụbeghị di, ọ̀ na-eme gị obi abụọ ma ị̀ ga-emeli ihe dị n’ikwusa ozi ọma oge niile ná mba ọzọ? Otu nwanna nwaanyị dị afọ iri asaa na ise, aha ya bụ Anita, nọbu na-enwe obi abụọ ma ọ̀ ga-emelikwa ihe dị na ya. O toro n’Ịngland, bụ́ ebe ọ malitere ịsụ ụzọ mgbe ọ dị afọ iri na asatọ. Ọ sịrị: “Ịkụziri ndị ọzọ gbasara Jehova na-atọ m ụtọ. Ma, echetụbeghị m echiche na m ga-ekwusali ozi ọma ná mba ọzọ. Amụtụbeghị m asụsụ ọzọ. Obi m gwakwara m na agaghị m amụtali asụsụ ọzọ. N’ihi ya, obi mafuru m mgbe a kpọrọ m ka m gaa Ụlọ Akwụkwọ Gilied. O juru m anya na a kpọrọ mụnwa ọ na-enweghị onye ma m. Ma, m gwara onwe m sị, ‘Ọ bụrụ na Jehova chere na m ga-emeli ya, m ga-anwa ike m.’ Ihe a mere afọ iri ise gara aga. Kemgbe ahụkwa, m na-eje ozi ala ọzọ na Japan.” O kwukwara sị: “Mgbe ụfọdụ, m na-eji ọnụ ọchị agwa ụmụnna nwaanyị na-eto eto sị, ‘Nyalienụ akpa unu soro m n’ọrụ a kacha enye obi ụtọ.’ Obi dị m ụtọ na ọtụtụ n’ime ha emeela otú ahụ.”

ỊKATA OBI MEE YA

Ọtụtụ ụmụnna nwaanyị ndị jerela ozi ná mba ọzọ nwere mgbe ha nweburu obi abụọ ma hà ga-emelikwa ya. Gịnị nyeere ha aka ịkata obi?

Maureen

Otu nwanna nwaanyị dị afọ iri isii na anọ, aha ya bụ Maureen, kwuru, sị: “Mgbe m na-eto eto, ọ gụsiri m agụụ ike iji ndụ m eme ihe ga-abara mụ na ndị ọzọ uru.” Mgbe ọ dị afọ iri abụọ, ọ kwagara Kwebek dị na Kanada, bụ́ ebe a chọkwuru ndị ọsụ ụzọ. Nwanna Nwaanyị Maureen kwukwara, sị: “E mechara kpọọ m ka m gaa Ụlọ Akwụkwọ Gilied. Ma, obi akaghị m ịhapụ ndị enyi m gawa ebe m na-amaghị. Obi akaghịkwa m ịhapụ naanị mama m ka ọ na-elekọta papa m ahụ́ na-adịghị. M ji anya mmiri rịọ  Jehova arịrịọ ọtụtụ abalị gbasara ya. Mgbe m gwara ndị mụrụ m ihe m nọ na-eche, ha sịrị m gawa. M hụkwara otú ndị ọgbakọ anyị si nyere ndị mụrụ m aka. Otú a Jehova si enyere m aka mere ka obi sie m ike na ọ ga-elekọta m. M jikereziri ịgawa.” Malite n’afọ 1979, Maureen jere ozi ala ọzọ ihe karịrị afọ iri atọ n’ebe Ọdịda Anyanwụ Afrịka. Taa, Maureen na-elekọtazi mama ya na Kanada ma ka na-arụkwa ọrụ ọsụ ụzọ pụrụ iche. Ọ na-echeta afọ niile ahụ o ji jeere Jehova ozi ná mba ọzọ. Ọ sịrị: “O nweghị mgbe Jehova na-enyeghị m ihe ndị dị m mkpa mgbe m chọrọ ha.”

Wendy

Wendy, bụ́ nwanna nwaanyị dị afọ iri isii na ise, malitere ịsụ ụzọ n’Ọstrelia mgbe ọ dị afọ iri na anọ. O kwuru, sị: “M bụ onye ihere, ọ na-esikwara m ike ịgwa ndị m na-amaghị okwu. Ma, ịsụ ụzọ emeela ka m nwee ike ịgwa ụdị mmadụ ọ bụla okwu. M bịaziri nwee obi ike. Ka oge na-aga, m kwụsịziri ime ihere. Ịsụ ụzọ akụzierela m ịtụkwasị Jehova obi, obi bịakwara sikwuo m ike na m ga-ejeli ozi ná mba ọzọ. Ihe ọzọ bụ na otu nwanna nwaanyị na-alụbeghị di, onye jere ozi ihe karịrị afọ iri atọ na Japan, gwara m ka anyị gaa kwusaa ozi ọma na Japan ọnwa atọ. Otú a mụ na ya si jekọọ ozi mere ka ọ gụwa m agụụ ije ozi ná mba ọzọ.” N’afọ 1986, Wendy kwagara Vanuatu, bụ́ agwaetiti dị ihe dị ka otu puku, narị kilomita asaa na iri asaa ma e si n’ebe ọwụwa anyanwụ Ọstrelia gawa ya.

Wendy ka nọ na Vanuatu. Ọ na-ejezi ozi ugbu a n’ọfis ndị nsụgharị. O kwuru, sị: “Ihe kacha eme m obi ụtọ bụ ịhụ otú e si na-ehiwe ọgbakọ na ìgwè dị iche iche n’obodo ndị dị n’ime ime. Agaghị m akọwali otú obi dị m na m so na-arụ ọrụ Jehova n’agwaetiti ndị dị ebe a.”

Kumiko (ọ nọ n’etiti)

Kumiko, onye dị afọ iri isii na ise ugbu a, bụ ọsụ ụzọ oge niile na Japan mgbe onye ya na ya na-asụkọ ụzọ gwara ya ka ha kwaga Nepal. Kumiko sịrị: “Ọ nọgidere na-agwa m ka anyị gaa, mụ ana-asị ya mba. Ihe na-eche m uche bụ otú m ga-esi gaa mụwa asụsụ ọhụrụ, mụwakwa ndụ ndị ebe ahụ. Nsogbu ọzọ bụkwa otú m ga-esi nweta ego m ga-eji akwaga mba ọzọ. Ka mụ na obi m nọ na-alụ, ụgbọala kụrụ mụ na ọgba tum tum m, mụ enwetazie onwe m n’ụlọ ọgwụ. M nọ ebe ahụ na-eche, sị: ‘Ònye ma ihe ọzọ na-aga ime m? M nwere ike ịda ezigbo ọrịa ga-eme ka ije ozi ala ọzọ kwaa m. Ọ̀ bụ na mụ agaghị ejeli ozi ná mba ọzọ, ọ bụrụgodị otu afọ?’ M kpesiri ekpere ike ka Jehova nyere m aka ka m kwaga mba ọzọ.” Mgbe Kumiko si n’ụlọ ọgwụ pụta, ọ gara Nepal. Ya na onye ya na ya na-asụkọ ụzọ mechara gazie biri ebiri n’ebe ahụ.

 Kumiko na-echeta ihe ndị mere n’ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ afọ iri o jere ozi na Nepal. Ọ sịrị: “Jehova mere ka ihe ndị ahụ nọ na-echu m ụra pụọrọ m n’ụzọ otú ahụ o si mee ka Osimiri Uhie pụọrọ ụmụ Izrel n’ụzọ. Obi dị m ụtọ na m mechara jewe ozi n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu. E nwere otu ezinụlọ m na-amụrụ ihe. Ọtụtụ mgbe, m gaa ịmụrụ ha ihe, mmadụ ise ma ọ bụ isii n’ime ndị agbata obi ha na-abịa nọrọ gewe ntị. Ụmụaka na-agwadị m ka m nye ha traktị. Ozi ọma m na-ekwusa n’ebe a ndị mmadụ na-ege ntị nke ọma na-atọ m ụtọ.”

OTÚ HA SI EMERI NSOGBU NDỊ HA NA-ENWE

Nke bụ́ eziokwu bụ na ụmụnna nwaanyị ndị a nwere obi ike anyị gbara ajụjụ ọnụ nwetụchara nsogbu. Olee otú ha si emeri nsogbu ndị ahụ?

Diane

Diane, sí Kanada, sịrị: “Na mbụ, o siiri m ike ịhapụ ezinụlọ m gaa biri ebe dị anya.” Ọ dị afọ iri isii na abụọ ugbu a. O jeekwala ozi ala ọzọ afọ iri abụọ na Kot Devụa. Ọ sịkwara: “M riọrọ Jehova ka o nyere m aka ka m hụ ndị m na-aga izi ozi ọma n’ebe m na-aga n’anya. Otu n’ime ndị nkụzi anyị n’Ụlọ Akwụkwọ Gilied, bụ́ Nwanna Jack Redford, gwara anyị na ná mmalite, ihe ndị anyị ga-ahụ n’ebe anyị gara nwere ike inye anyị nsogbu n’obi, ma ọ bụdị wụọ anyị akpata oyi n’ahụ́. Otu n’ime ihe ndị a nwere ike ịbụ na ihe nwere ike isiri anyị ezigbo ike. Ma, ọ sịrị: ‘Unu echela banyere ihe na-esiri unu ike, na-echenụ banyere otú ihu na-adị ndị unu na-ekwusara ozi ọma. Obi unu dịrị n’otú obi na ihu na-adị ha ma ha nụ ozi ọma.’ Ọ bụkwa ihe m mere. O nweghịkwa ihe na-eme obi ụtọ ka ya. Ihu na-abụ ndị mmadụ sọ ọchị ma m na-ezi ha ozi ọma a na-akasi obi.” Oleekwa ihe ọzọ nyeere Diane aka ya enwee ike ijeli ozi ná mba ọzọ? Ọ sịrị: “M metere ndị m na-amụrụ Baịbụl enyi, obi na-adịkwa m ezigbo ụtọ ma m hụ ka ha na-aghọ ndị ohu Jehova. Ebe a m na-eje ozi dịzi m ka obodo m. Enweela m ọtụtụ ndị nne na nna na ụmụnne ndị nwoke na ndị nwaanyị otú ahụ Jizọs kwere anyị ná nkwa.”—Mak 10:29, 30.

Anne, bụ́ nwanna nwaanyị dị afọ iri anọ na isii, na-eje ozi n’Eshia, ebe a machibidoro ọrụ anyị iwu. O kwuru, sị: “Kemgbe ọtụtụ afọ m jere ozi n’obodo dị iche iche ná mba ọzọ, ndị mụ na ha biri bụ ụmụnna nwaanyị ndị àgwà ha na otú e si zụọ ha dị iche na nke m. Mgbe ụfọdụ, ọ na-eme ka anyị na-ese okwu, na-akpasukwa ibe anyị iwe. Mgbe ọ bụla ụdị ihe a mere, m na-agbalị ka m rukwuo ha nso, ka m mụtakwuo omenala ha nke ọma. M gbakwara mbọ ka m hụkwuo ha n’anya, gharakwa ịna-esi  ọnwụ n’ihe. Obi dị m ụtọ na mbọ ndị ahụ m gbara rụpụtara ezigbo ihe. O meela ka mụ na ha bụrụ ezigbo enyi, nyekwara m aka idi ihe ụfọdụ na-esiri m ike n’ebe a m na-ekwusa ozi ọma.”

Ute

N’afọ 1993, e zigara Ute, onye si Jamanị, ka ọ gaa jewe ozi ala ọzọ na Madagaska. Ọ dị afọ iri ise na atọ ugbu a. O kwuru, sị: “Ná mmalite, o siiri m ike ịmụta asụsụ ndị obodo a, siekwara m ike idi oké okpomọkụ, ọrịa ịba, na nje ndị na-akpata ọrịa dịcha ebe a. Ma, ụmụnna nwaanyị ndị bi ebe a, ụmụ ha, na ndị m na-amụrụ Baịbụl nyeere m aka ịmụta asụsụ ha. Nwanna nwaanyị mụ na ya so na-eje ozi ala ọzọ lekọtara m mgbe ahụ́ na-adịghị. Ma, nke kachanụ bụ na Jehova nyeere m aka. M na-akọrọ ya ihe niile na-echegbu m n’ekpere. M kpechaa ekpere, mụ enwezie ndidi ruo ụbọchị ụfọdụ ma ọ bụ ọnwa ụfọdụ ka Jehova za ekpere m. Jehova gbooro m mkpa m niile.” Ute ejeela ozi na Madagaska afọ iri abụọ na atọ ugbu a.

JEHOVA GỌZIRI HA

E nweela ọtụtụ ụmụnna nwaanyị ndị ọzọ na-alụbeghị di kwukwarala na ije ozi ná mba ọzọ na-enye ha obi ụtọ dị ukwu. Olee uru ndị ọ baarala ha?

Heidi

Heidi, bụ́ onye Jamanị dị́ afọ iri asaa na atọ ugbu a, na-eje ozi ala ọzọ na Kot Devụa kemgbe afọ 1968. Ọ sịrị: “Ihe kacha eme m obi ụtọ bụ ịhụ ka ndị m mụụrụ Baịbụl ‘na-eje ije n’eziokwu.’ Ụfọdụ n’ime ha bụzi ndị ọsụ ụzọ na ndị okenye ọgbakọ. Ọtụtụ n’ime ha na-akpọ m mma ma ọ bụ nne nne. Otu n’ime ndị nke bụ́ okenye na ndị ezinụlọ ya weere m ka onye ezinụlọ ha. Jehova esila otú a nye m nwa nwoke, nye m nwunye nwa, nyekwa m ụmụ ụmụ atọ.”—3 Jọn 4.

Karen (ọ nọ n’etiti)

Karen, bụ́ onye Kanada dị́ afọ iri asaa na abụọ ugbu a, ejeela ozi ihe karịrị afọ iri abụọ n’ebe Ọdịda Anyanwụ Afrịka. Ọ sịrị: “Ije ozi ala ọzọ akụzierela m ịhụ ndị ọzọ n’anya, inwe ndidi na ịna-ewepụta onwe m ije ozi. Ihe ọzọ bụ na iso ndị sí ná mba dị iche iche jee ozi emeela ka m na-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị. Amụtala m na e nwere otú dị iche iche e nwere ike isi na-arụ ihe ụfọdụ. Obi dịkwa m ezigbo ụtọ na m nwere ezigbo ndị enyi n’ebe dị iche iche n’ụwa. N’agbanyeghị na ndụ anyị na ozi anyị agbanweela, anyị ka bụkwa ezigbo enyi.”

Margaret, bụ́ onye Ịngland dị́ afọ iri asaa na itoolu ugbu a, jere ozi ala ọzọ n’obodo Laụs. Ọ sịrị: “Ije ozi ná mba ọzọ emeela ka m jiri anya m hụ otú Jehova si akpọbata ndị si n’agbụrụ dị iche iche n’ọgbakọ ya. O meela ka okwukwe m sie ike, meekwa ka obi sie m ike na ọ bụ Jehova na-ahazi ọgbakọ ya, nakwa na ihe ọ bụla o bu n’obi ga-emezurịrị.”

N’eziokwu, ụmụnna nwaanyị na-alụghị di, bụ́ ndị na-eje ozi ná mba ọzọ, na-akpa ike dị egwu n’ikwusa ozi ọma. Anyị kwesịrị iji obi anyị niile na-aja ha mma. (Ikpe 11:40) Ihe ọzọ bụ na ọnụ ọgụgụ ha na-amụba n’ike n’ike. (Ọma 68:11) Ì nwere ike ịhazi ihe ndị ị na-eme ka i nwee ike ime ka ụmụnna nwaanyị ndị a anyị gbara ajụjụ ọnụ, bụ́ ndị ji obi ha niile na-ekwusa ozi ọma? I mee otú ahụ, ị ‘ga-edetụ Jehova ire ma hụ na ọ dị mma.’—Ọma 34:8.