Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Olee otú e si esi otu ebe ewere ọkụ aga ebe ọzọ n’oge ochie?

IHE e kwuru na Jenesis 22:6 gosiri na, ka Ebreham nwee ike ịchụrụ Chineke àjà n’ebe dịtụ anya, o “buuru nkụ ọ ga-eji chụọ àjà nsure ọkụ ahụ bo ya Aịzik nwa ya ma were ọkụ na mma e ji egbu anụ, ha abụọ wee soro na-aga.”

E nweghị ebe e kwuru n’Akwụkwọ Nsọ gbasara otú ndị oge ochie si emenwu ọkụ. Mgbe otu onye na-ekwu gbasara ihe a dị n’akwụkwọ Jenesis, o kwuru na ọ ga-esi ezigbo ike iburu ọkụ a mụnyere amụnye gaa ụdị ogologo njem ahụ Ebreham na Aịzik gara, ọkụ ahụ aghara ịnyụ. N’ihi ya, o nwere ike ịbụ na ihe e kwuru n’akwụkwọ Jenesis na Ebreham bu bụ ihe ndị e ji emenwu ọkụ.

Ma, ndị ọzọ kwuru na ọ dịghị mfe imenwu ọkụ n’oge ochie. Ọ na-aka adịrị ndị mmadụ mfe ịgụrụ icheku ọkụ na nke onye agbata obi ha were ya menwuo ọkụ, kama ịga chọwa otú ha ga-esi emenwu nke ha. Ọ bụ ihe a mere ọtụtụ ndị ọkachamara ji chee na ọ ga-abụ na ihe Ebreham mere bụ iji ite e ji agbụ ígwè mee aka ya, gụrụ icheku ọkụ gaa ebe ahụ ọ chọrọ ịchụ àjà. (Aịza. 30:14) Mmadụ nwere ike iji ụdị icheku ọkụ a o si ebe ọzọ gụrụ na ụmụ irighiri ihe kpọrọ nkụ a kwọpụtara n’osisi menwuo ọkụ n’ebe ọ bụla ọ chọrọ.