Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Họrọ asụsụ Igbo

Ị̀ Ma Jehova Otú Noa, Daniel, na Job Si Mara Ya?

Ị̀ Ma Jehova Otú Noa, Daniel, na Job Si Mara Ya?

“Ndị na-eme ihe ọjọọ apụghị ịghọta ikpe ziri ezi, ma ndị na-achọ Jehova pụrụ ịghọta ihe niile.”—ILU 28:5.

ABỤ: 126, 150

1-3. (a) Gịnị ga-enyere anyị aka ịnọgide na-eme ihe dị Chineke mma n’oge ikpeazụ a? (b) Olee ihe anyị ga-atụle n’isiokwu a?

NDỊ ỌJỌỌ ga-anọgide ‘na-epulite dị ka ahịhịa ndụ,’ ka ọgwụgwụ ụwa na-eru nso. (Ọma 92:7) N’ihi ya, ọ naghị eju anyị anya na ọtụtụ ndị taa anaghị akpa àgwà otú Chineke chọrọ. Oleezi otú anyị ga-esi ‘bụrụ ụmụ ọhụrụ n’ebe ihe ọjọọ dị; ma bụrụ dimkpa n’ike ịghọta ihe’?—1 Kọr. 14:20.

2 Amaokwu Baịbụl ebe e si nweta isiokwu a zara ajụjụ a. Ebe ahụ kwuru, sị: “Ndị na-achọ Jehova pụrụ ịghọta ihe niile,” ya bụ, ihe niile ga-enyere ha aka ime ihe dị Jehova mma. (Ilu 28:5) Ilu 2:7, 9 na-akụzikwara anyị na Jehova na-enye ndị na-eme ihe ziri ezi amamihe. N’ihi ya, ha nwere ike ‘ịghọta ezi omume na ikpe ziri ezi na ịkwụwa aka ọtọ, bụ́ ụzọ dum nke ihe dị mma.’

3 Noa, Daniel, na Job nwere ụdị amamihe ahụ. (Ezik. 14:14) Otú ahụ ka ọ dịkwa ndị Chineke taa. Gịnwa kwanụ? Ị̀ ‘na-aghọta ihe niile’ ga-enyere gị aka ime ihe dị Jehova mma? Ihe kacha mkpa ga-enyere gị aka bụ ịmata Chineke nke ọma. N’ihi  ya, n’isiokwu a, anyị ga-atụle (1) otú Noa, Daniel, na Job si mata Chineke, (2) uru ịmata Chineke baara ha, nakwa (3) otú anyị nwere ike isi nwee okwukwe ka ha.

NOA SO CHINEKE JEE IJE N’ỤWA ỌJỌỌ

4. Olee otú Noa si mata Jehova? Oleekwa otú nke a si nyere ya aka?

4 Otú Noa si mata Jehova. Malite mgbe Adam na Iv malitere ịmụ ụmụ, e nwere ụzọ atọ ndị mmadụ sirila mata Chineke. Nke mbụ bụ ikiri ihe ndị e kere eke. Nke abụọ bụ site n’aka ndị ọzọ fere Chineke. Nke atọ abụrụ mmadụ iji anya ya hụ otú Chineke sirila gọzie ya n’ihi ime ihe dị ya mma. (Aịza. 48:18) Ka Noa na-ekiri ihe ndị e kere eke, ọ hụrụ ọtụtụ ihe ndị gosiri na Chineke dị, hụkwa ihe ndị mere ka ọ mata ọtụtụ àgwà ya, dị ka “ike ebighị ebi ya na ịbụ Chineke ya.” (Rom 1:20) N’ihi ya, Noa bịara kwere na Chineke dị, okwukwe ya esiekwa ezigbo ike.

5. Olee otú Noa si mata ihe mere Chineke ji kee mmadụ?

5 Baịbụl kwuru na okwukwe “na-esi n’ihe a nụrụ.” (Rom 10:17) Olee otú Noa si nụ gbasara Jehova? Ọ ga-abụ na ndị ikwu ya kọọrọ ya banyere ya. Otu n’ime ha bụ Lemek nna ya, bụ́ nwoke nwere okwukwe na Chineke. A mụrụ Lemek tupu Adam anwụọ. (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.) Ndị ọzọ ọ mụtara gbasara Jehova n’aka ha bụ ndị nna nna ya ochie bụ́ Metusela na Jered. Jered nwụrụ mgbe Noa dị narị afọ atọ na iri isii na isii. * (Luk 3:36, 37) O nwere ike ịbụ na Noa si n’aka ndị a na ndị nwunye ha mata na ọ bụ Chineke kere mmadụ nakwa na ọ chọrọ ka ha mụọ ụmụ ma jupụta ụwa. Ọ ga-abụkwa na ha kọọrọ ya otú Adam na Iv si nupụ isi n’ogige Iden nakwa nsogbu ọ kpataara ụmụ mmadụ, bụ́kwanụ ihe Noa ji anya ya na-ahụ. (Jen. 1:28; 3:16-19, 24) Ihe ha kọọrọ Noa ruru ya n’obi, o mekwara ka o fewe Jehova.—Jen. 6:9.

6, 7. Olee otú olileanya si mee ka okwukwe Noa sikwuo ike?

6 Olileanya na-eme ka okwukwe mmadụ sikwuo ike. Chegodị otú obi dị Noa mgbe ọ matara na aha ya, nke nwere ike ịpụta “Ezumike ma ọ bụ Nkasi obi,” na-egosi na e nwere olileanya na ihe ga-adị mma. (Jen. 5:29) Jehova mere ka Lemek kwuo banyere Noa, sị: “Onye a ga-ewetara anyị nkasi obi . . . ná ndọgbu anyị na-adọgbu onwe anyị n’ọrụ n’ihi ọnụ Jehova bụrụ ala.” Noa nwere olileanya na Chineke ga-eme ka ihe dị mma. Noa nwere okwukwe ná “mkpụrụ” ahụ nke ga-egwepịa agwọ ahụ isi. Ebel na Inọk, bụ́ ndị dịrị ndụ tupu Noa, nwekwara ụdị okwukwe a.—Jen. 3:15.

7 O nwere ike ịbụ na Noa aghọtachaghị ihe niile amụma ahụ dị na Jenesis 3:15 pụtara, ma ọ ghọtara na ọ na-egosi na a ga-emecha napụta ụmụ mmadụ n’ahụhụ. Ihe ọzọ bụ na ihe Inọk kwuru dabara n’ihe dị ná nkwa ahụ Chineke kwere n’ogige Iden. Inọk kwuru na Chineke ga-ebibi ndị ajọ omume. (Jud 14, 15) Ọ ga-abụrịrị na ihe Inọk kwuru nke ga-emezu na nke ikpeazụ ya n’Amagedọn, mere ka okwukwe na olileanya Noa sikwuo ike.

8. Olee otú ịmata Chineke nke ọma si chebe Noa?

8 Otú ịmata Chineke nke ọma si baara Noa uru. Ịmata Chineke nke ọma nyeere ya aka, karịchaa ka ọ ghara ime ihe ọ bụla ga-ewute Jehova. Dị ka ihe atụ, n’ihi na Noa “so ezi Chineke jee ije,” ya na ndị ọjọọ anaghị akpa. Noa ekweghị ka ike ndị mmụọ ọjọọ ahụ nọ n’ụwa n’oge ahụ na-akpa megharịa ya anya otú ha si megharịa ndị na-enweghị okwukwe  na Chineke. O nwedịrị ike ịbụ na ndị ahụ fewere ndị mmụọ ọjọọ ahụ. (Jen. 6:1-4, 9) Ihe ọzọkwa bụ na Noa ma na Chineke gwara ụmụ mmadụ ka ha mụọ ụmụ ma jupụta ụwa. (Jen. 1:27, 28) N’ihi ya, mgbe ndị mmụọ ọjọọ ahụ bịara lụrụ ụmụ nwaanyị ma mụta ụmụ, Noa ma na ihe a ha mere jọgburu onwe ya. Ọ bịara dokwuo ya anya mgbe ndị mmụọ ọjọọ ahụ mụtara ụmụ, ụmụ ha agbaa ajọ dimkpa ma karịa ndị ọzọ niile ike. Ka oge na-aga, Chineke gwara Noa na ya ga-eji mmiri bibie ndị ọjọọ niile. Okwukwe Noa nwere na ihe a ga-eme, mere ka ọ rụọ ụgbọ, a zọpụtakwa ya na ezinụlọ ya.—Hib. 11:7.

9, 10. Olee otú anyị ga-esi eṅomi okwukwe Noa?

9 Otú anyị ga-esi enwe okwukwe ka Noa. Ihe ga-akacha enyere anyị aka bụ ịna-amụchi Okwu Chineke anya, ikwe ka ihe ndị anyị na-amụta ruo anyị n’obi, iji ya na-emezi ndụ anyị, jirikwa ya na-eme mkpebi ndị dị mma. (1 Pita 1:13-15) Okwukwe na amamihe Chineke ga-emezi ka Setan ghara iji aghụghọ ya nwata anyị, meekwa ka anyị ghara ịkpawa àgwà ka ndị ụwa. (2 Kọr. 2:11) Ime ihe ike na omume rụrụ arụ na-atọ ọtụtụ ndị ụtọ, ha na-emekwa ihe na-agụ anụ ahụ́ ha agụụ. (1 Jọn 2:15, 16) Ihe ọjọọ ndị a juru n’ụwa nwedịrị ike ime ka ndị okwukwe ha na-esighị ike leghara ihe ndị na-egosi na ụbọchị Chineke dị nso anya. Cheta na mgbe Jizọs ji oge anyị a tụnyere oge Noa, o kwughị gbasara ime ihe ike na omume rụrụ arụ ndị mmadụ na-eme, kama, o kwuru gbasara ihe ndị nwere ike ịdọpụ mmadụ uche n’ofufe Chineke.—Gụọ Matiu 24:36-39.

10 Jụọ onwe gị, sị: ‘Ihe ndị m na-eme, hà na-egosi na m ma Jehova nke ọma? Okwukwe m ọ̀ na-eme ka m na-akpa àgwà otú Chineke chọrọ ma na-akọrọ ya ndị ọzọ?’ Ihe ndị ị zara ga-enyere gị aka ịmata ma ì ‘so ezi Chineke na-eje ije’ ka Noa.

DANIEL GOSIRI NA CHINEKE NYERE YA AMAMIHE MGBE O BI NA BABỊLỌN

11. (a) Gịnị ka otú Daniel si hụ Chineke n’anya ma jiri Okwu ya kpọrọ ihe mgbe ọ dị obere na-akụziri anyị gbasara ndị mụrụ ya? (b) Olee àgwà ọma Daniel nwere ị ga-achọ iṅomi?

11 Otú Daniel si mata Jehova. Ọ ga-abụrịrị na ndị mụrụ ya kụziiri ya ịhụ Jehova n’anya nakwa iji Okwu ya kpọrọ ihe. Daniel akwụsịghị ịhụ Chineke n’anya na iji Okwu ya kpọrọ ihe ná ndụ ya niile. Mgbe o medịrị agadi, ọ ka na-amụchi Akwụkwọ Nsọ anya. (Dan. 9:1, 2) Daniel ma Jehova nke ọma, marakwa otú o si mesoo ndị Izrel ihe. Ihe gosiri nke a bụ ekpere o ji obi ya niile kpee, nke e dere na Dan. 9:3-19. Gbalịa wepụta oge gụọ ekpere ahụ ma chebara ihe ndị o kwuru na ya echiche. Jụọ onwe gị ihe ọ na-akụziri gị gbasara Daniel.

12-14. (a) Olee otú Daniel si gosi na ya nwere amamihe Chineke? (b) Olee otú Chineke si gọzie Daniel n’ihi na o nwere obi ike ma rubere ya isi?

12 Otú ịmata Chineke nke ọma si baara Daniel uru. Ọ dịghịrị ndị Juu na-efe Chineke mfe ife ya na Babịlọn, bụ́ ebe ndị bi na ya na-ekpere arụsị. Dị ka ihe atụ, Jehova gwara ndị Juu, sị: “Chọọkwanụ udo nke obodo ahụ m mere ka a dọrọ unu n’agha laa na ya.” (Jere. 29:7) Ma, ọ chọkwara ka ha na-efe naanị ya. (Ọpụ. 34:14) Gịnị nyeere Daniel aka ime ihe ndị a Chineke sịrị ha mee? Amamihe Chineke nyere ya mere ka ọ mata na ọ ga-ebu ụzọ rubere Chineke isi tupu ya erubere ndị ọchịchị isi. Mgbe ọtụtụ narị afọ gachara, Jizọs kụzikwara otu ihe ahụ.—Luk 20:25.

13 Chegodị ihe Daniel mere mgbe e mere iwu ka onye ọ bụla ghara ịrịọ chi ọ bụla ma ọ bụ mmadụ ọ bụla ọzọ arịrịọ  n’ime ụbọchị iri atọ ma e wezụga eze. (Gụọ Daniel 6:7-10.) Daniel gaara eji maka iwu a kwuo, sị: ‘Ọ bụ naanị ụbọchị iri atọ.’ Ma, o kweghị ka iwu a eze nyere gbochie ya ife Chineke. O nwere ike zoro ezo na-ekpe ekpere ka a ghara ịhụ ya. Ma, ọ ma na ndị mmadụ amarala na ọ na-ekpe ekpere kwa ụbọchị. N’agbanyeghị na o nwere ike ịta isi ya, ọ nọgidere na-ekpe ekpere ebe a ga-ahụ ya n’ihi na ọ chọghị ime ka ndị mmadụ chewe na ọ kwụsịla ife Jehova.

14 Jehova gọziri Daniel n’ihi na o nwere obi ike ma rubere ya isi. Ọ napụtara ya n’aka ọdụm. Nke a mere ka ndị nọ n’obodo niile ndị Midia na Peshia na-achị nụ banyere Jehova.—Dan. 6:25-27.

15. Olee otú anyị ga-esi enwe okwukwe ka Daniel?

15 Otú anyị ga-esi enwe okwukwe ka Daniel. Ihe ga-eme ka okwukwe anyị sie ike abụghị naanị ịgụ Okwu Chineke, kama, ọ bụ ‘ịghọta ihe ọ pụtara.’ (Mat. 13:23) Anyị chọrọ ịmata otú Jehova si ele ihe anya. N’ihi ya, anyị kwesịrị iwepụta oge na-echebara ihe anyị gụrụ echiche. Ihe ọzọ dị anyị mkpa bụ isi n’ala ala obi anyị na-ekpe ekpere mgbe nsogbu ma ọ bụ ihe isi ike ndị ọzọ bịaara anyị. Ọ bụrụ na anyị ejiri okwukwe rịọ Jehova ka o nye anyị amamihe na ike, ọ ga-enye anyị ha.—Jems 1:5.

JOB MERE UCHE CHINEKE MA MGBE IHE DỊỊRỊ YA MMA MA N’OGE NSOGBU

16, 17. Olee otú Job si mata Chineke nke ọma?

16 Otú Job si mata Jehova. Job abụghị onye Izrel. Ma, ọ bụ onye ikwu Ebreham, Aịzik, na Jekọb bụ́ ndị Jehova mere ka ha mata onye ọ bụ na ihe ọ chọrọ imere ụmụ mmadụ. Job ma banyere ọtụtụ n’ime ihe ndị a, ma anyị amaghị ndị kọọrọ ya ha. (Job 23:12) Job kwuru, sị: “Ọ bụ n’akụkọ ka m nụrụ banyere gị.” (Job 42:5) Jehova n’onwe ya kwudịrị na Job kwuru ihe ndị bụ́ eziokwu banyere ya.—Job 42:7, 8.

Anyị hụ ihe ndị Chineke kere, ọ na-eme ka anyị mata ụdị onye ọ bụ, na-emekwa ka okwukwe anyị sie ike (A ga-akọwa ya na paragraf nke 17)

17 Job sikwa n’ihe ndị Chineke kere mata àgwà Jehova. (Job 12:7-9, 13) Ma Elaịhu ma Jehova ji ihe ndị e kere eke kụziere Job na o nweghị ihe ụmụ mmadụ bụ ma e jiri ha tụnyere Chineke. (Job 37:14; 38:1-4) Ihe Jehova gwara ya ruru ya n’obi, nke na o ji obi umeala gwa Chineke, sị: “Amatawo m na i nwere ike ime ihe niile, ọ dịghịkwa ihe ọ bụla i zubere nke ị na-apụghị ime. . . . Echegharịwo m n’ájá na ntụ.”—Job 42:2, 6.

18, 19. Olee otú Job si gosi na ọ ma Jehova nke ọma?

 18 Otú ịmata Chineke nke ọma si baara Job uru. Ihe Chineke chọrọ ka mmadụ na-eme doro Job anya. Ọ ma Jehova nke ọma, meekwa ihe gosiri na ọ ma ya. Dị ka ihe atụ: Job ma na ya agaghị ekwu na ya hụrụ Chineke n’anya ma ọ bụrụ na ọ naghị emere mmadụ ibe ya ihe ọma. (Job 6:14) O bulighị onwe ya elu karịa ndị ọzọ, kama, ọ na-eme ndị ọzọ ka hà bụ ndị ezinụlọ ya, ma hà bara ọgaranya ma hà dara ogbenye. O kwuru, sị: ‘Ọ́ bụghị Onye ahụ kere m n’afọ kere ha?’ (Job 31:13-22) Mgbe ahụ Job bara ọgaranya, ọ naghị eleda ndị ọzọ anya. Nke a dị iche n’ihe ọtụtụ ndị bara ọgaranya na ndị nọ n’ọkwá ukwu na-eme taa.

19 Job gbaara ụdị ikpere arụsị ọ bụla ọsọ, ma n’ime obi ya. Ọ ma na mmadụ ikpere arụsị na ịchụ akụnụba ọnwụ ọnwụ ga-eme ka onye ahụ jụ “ezi Chineke bi n’elu.” (Gụọ Job 31:24-28.) O weere alụmdi na nwunye ka ihe dị nsọ na-ejikọ nwoke na nwaanyị. Ya na anya ya gbadịrị ndụ na ọ gaghị ele nwa agbọghọ na-amaghị nwoke anya otú na-adịghị mma. (Job 31:1) Cheta na Job mere ihe a mgbe Chineke na-ekwubeghị ka mmadụ ghara ịlụ karịa otu nwaanyị. N’ihi ya, Job gaara alụ ụmụ nwaanyị abụọ ma ọ bụrụ na ọ chọrọ. * O nwere ike ịbụ na ihe mere Job ji lụọ naanị otu nwaanyị bụ na ọ ma na alụmdi na nwunye mbụ Jehova haziri n’Iden bụ n’etiti otu nwoke na otu nwaanyị. (Jen. 2:18, 24) Mgbe ihe dị ka otu puku afọ na narị isii gachara, Jizọs kụziiri ndị mmadụ na nwoke kwesịrị ịlụ naanị otu nwaanyị nakwa na ọ bụ naanị ndị lụrụ di na nwunye kwesịrị ịna-enwe mmekọahụ.—Mat. 5:28; 19:4, 5.

20. Olee otú ịmata Jehova na ihe ndị ọ chọrọ nke ọma ga-esi enyere anyị aka ịhọrọ ezigbo ndị enyi nakwa ntụrụndụ dị mma?

20 Otú anyị ga-esi enwe okwukwe ka Job. Otú anyị ga-esi emekwa ya bụ ịmata Jehova nke ọma, ma kwe ka ihe anyị ma banyere ya na-eduzi ndụ anyị. Dị ka ihe atụ, ọbụ abụ bụ́ Devid kwuru na Jehova “kpọrọ onye ọ bụla nke hụrụ ime ihe ike n’anya asị.” Ọ dọkwara anyị aka ná ntị ka anyị na “ndị ụgha” ghara ịna-akpa. (Gụọ Abụ Ọma 11:5; 26:4.) Jụọ onwe gị, sị: ‘Gịnị ka amaokwu ndị a na-agwa m gbasara otú Chineke si eche echiche? Olee otú ịmata ya ga-esi enyere m aka ikpebi ihe kacha mkpa ná ndụ m, otú m si eji Ịntanet eme ihe, ndị mụ na ha na-akpa, nakwa ụdị ntụrụndụ m ga na-enwe?’ Ihe ị zara nwere ike inyere gị aka ịmata otú ị maruru Jehova. Ka anyị ghara imewe ihe ka ndị ụwa, anyị kwesịrị ịzụ “ikike nghọta” anyị iji mata, ọ bụghị naanị ihe dị iche n’ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi, kama, ihe dị iche n’ịma ihe na amaghị ihe.—Hib. 5:14; Efe. 5:15.

21. Gịnị ga-enyere anyị aka “ịghọta ihe niile” anyị kwesịrị ịghọta iji na-eme ihe dị Nna anyị nke eluigwe mma?

21 Noa, Daniel, na Job ji obi ha niile chọọ Jehova, ọ bụ ya mere o ji mee ka ha chọta ya. O nyeere ha aka “ịghọta ihe niile” ga-enyere ha aka ime ihe dị ya mma. Ọ bụ ya mere ha ji bụrụ ndị ezi omume anyị kwesịrị iṅomi, ha jikwa ndụ ha mee ihe ndị bara uru. (Ọma 1:1-3) N’ihi ya, jụọ onwe gị, sị: ‘M̀ ma Jehova nke ọma otú Noa, Daniel na Job si mara ya?’ Nke bụ́ eziokwu bụ na anyị nwere ike ịmata Jehova ugbu a karịa ha n’ihi na ọ kụzierela anyị ọtụtụ ihe banyere onwe ya. (Ilu 4:18) N’ihi ya, na-amụchi Okwu Chineke anya. Na-echebara ihe ị na-agụ echiche. Na-arịọ Chineke ka o nye gị mmụọ nsọ ya. Mgbe ahụ, ị ga-abịarukwu Nna gị nke eluigwe nso. Ị ga na-akpakwa àgwà ka onye ma ihe n’ụwa a na-amaghị Chineke.—Ilu 2:4-7.

^ para. 5 Nna ochie Noa bụ́ Inọk ‘sokwa ezi Chineke na-eje ije.’ Ma, “Chineke kpọpụrụ ya,” ya bụ, na ọ nwụrụ ihe dị ka afọ iri isii na itoolu tupu a mụọ Noa.—Jen. 5:23, 24.

^ para. 19 Noa mekwara otu ihe ahụ. Ọ lụrụ naanị otu nwaanyị n’agbanyeghị na ndị mmadụ malitere ịlụ karịa otu nwaanyị obere oge Adam na Iv nupụchara isi n’ogige Iden.—Jen. 4:19.