Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Họrọ asụsụ Igbo

Ònye Ka Ị Na-achọ Ka Ọ Mata Gị ma Jiri Gị Kpọrọ Ihe?

Ònye Ka Ị Na-achọ Ka Ọ Mata Gị ma Jiri Gị Kpọrọ Ihe?

“Chineke abụghị onye ajọ omume ichefu ọrụ unu na ịhụnanya unu gosiri maka aha ya.”—HIB. 6:10.

ABỤ: 39, 30

1. Olee ihe anyị niile na-achọkarị?

OLEE otú ọ na-adị gị ma onye ị ma nke ọma ma na-akwanyere ùgwù chefuo aha gị ma ọ bụdị ghara ịmata gị? Ụdị ihe a nwere ike iwute gị nke ukwuu. Maka gịnị? Ọ bụ maka na onye ọ bụla n’ime anyị chọrọ ka a mara ya. Ọ bụghị naanị na anyị chọrọ ka ndị mmadụ mata anyị, anyị chọkwara ka ha mata ụdị mmadụ anyị bụ na ihe ndị anyị merela ná ndụ.—Ọnụ Ọgụ. 11:16; Job 31:6.

2, 3. Olee ihe nwere ike ime ma anyị chọọ ka ndị ọzọ mata anyị? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

2 Ma ọ bụrụ na anyị akpachaghị anya, anyị nwere ike chọọ ka a mata anyị gabiga ókè. Ụwa Setan nwere ike ime ka anyị chọọ ịbụ ndị a ma ama na ndị dị mkpa. Ọ bụrụ na ụdị ihe a emee, ọ ga-eme ka anyị ghara ịmata Nna anyị nke eluigwe, bụ́ Jehova Chineke nke ọma, nakwa ife ya otú ọ chọrọ.—Mkpu. 4:11.

3 Otú ụfọdụ ndị ndú okpukpe n’oge Jizọs si were mmadụ ịchọ ka a mata ya abụghị otú ha kwesịrị isi were ya. Jizọs  dọrọ ndị na-eso ụzọ ya aka ná ntị, sị: “Lezienụ anya maka ndị odeakwụkwọ bụ́ ndị ọ na-amasị iyi uwe mwụda na-ejegharị, ọ na-atọkwa ha ụtọ ka a na-ekele ha n’ọma ahịa, ka ha na-anọkwa n’oche ihu n’ụlọ nzukọ na ebe ndị kasị ùgwù ná nri anyasị.” Ọ gwakwara ha, sị: “A ga-ama ha ikpe ka ukwuu.” (Luk 20:46, 47) Ma, Jizọs jara otu nwaanyị di ya nwụrụ dara ogbenye mma maka obere onyinye o nyere. O nwere ike ịbụ na ndị mmadụ ahụghị onyinye a o nyere. (Luk 21:1-4) Otú Jizọs si were mmadụ ịchọ ka a mata ya dị iche n’otu ndị ọzọ si were ya. Isiokwu a ga-eme ka anyị ghọta otú e kwesịrị isi mara anyị, bụ́kwanụ otú Jehova Chineke chọrọ ka e si mara anyị.

OTÚ KACHA MMA ANYỊ CHỌRỌ KA E SI MARA ANYỊ

4. Olee otú kacha mma anyị chọrọ ka e si mara anyị? Maka gịnịkwa?

4 Ma, olee otú kacha mma anyị chọrọ ka e si mara anyị? Anyị achọghị ka e si n’agụmakwụkwọ, n’achụmnta ego, nakwa n’egwuregwu mara anyị otú ọtụtụ ndị si chọọ ka e si na ha mara ha. Pọl kọwara otú kacha mma e kwesịrị isi mara anyị. Ọ sịrị: “Ugbu a unu maara Chineke, ma ọ bụkwanụ ebe unu bụ ndị Chineke maara, olee otú unu si na-agaghachi n’ihe mbụ ndị na-adịghị ike na ndị na-enweghị isi ma na-achọ ka unu bụrụ ohu ha ọzọ?” (Gal. 4:9) O nweghị ihe karịrị ịbụ onye “Chineke maara,” bụ́ Onye Ọchịchị Kachanụ n’Eluigwe na n’Ụwa. Jehova ma onye anyị bụ, ọ hụrụ anyị n’anya, chọọkwa ka anyị na ya bụrụ enyi. O kere anyị ka anyị na ya bụrụ enyi.—Ekli. 12:13, 14.

5. Olee ihe anyị ga-eme ka Chineke mara anyị?

5 Anyị ma na Mozis bụ enyi Jehova. Mgbe ọ rịọrọ Jehova ka o mee ka ọ mata ụzọ ya nke ọma, Jehova gwara ya, sị: “M ga-emekwa ihe a i kwuru okwu ya, n’ihi na ihe gị masịrị m, amakwaara m gị n’aha.” (Ọpụ. 33:12-17) Jehova ga-agọzikwa anyị mmaji kwuru mmaji ma ọ mara anyị. Ma, olee ihe anyị ga-eme ka Jehova mara anyị? Ọ bụ ịhụ ya n’anya, nakwa inyefe ya onwe anyị.—Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 8:3.

6, 7. Olee ihe nwere ike ime ka anyị na Jehova ghara ịdị ná mma?

6 Ma, anyị ekwesịghị iji adịm ná mma anyị na Nna anyị nke eluigwe gwuo egwu. Anyị kwesịrị ịna-eme ihe Ndị Kraịst nọ na Galeshia Pọl degaara akwụkwọ ozi mere. Anyị ekwesịghị ịna-agbara ihe “ndị na-adịghị ike na ndị na-enweghị isi” dị n’ụwa ohu, ya na ịchọ ka ụwa na-eto anyị. (Gal. 4:9) Ụmụnna ndị ahụ nọ na Galeshia ma Chineke, Chineke amarakwa ha. Ma, Pọl sịrị na ha “na-agaghachi” n’ihe ndị na-enweghị isi. Ihe Pọl na-ekwu bụ na “ugbu a ha maara Chineke, gịnị mere ha ji laghachi n’ihe ndị na-enweghị isi, ma ọ bụ ihe ndị na-abaghị uru ha hapụrụ?”

7 Ụdị ihe a ò nwere ike ime anyị taa? Ee, o nwere ike ime anyị. Mgbe anyị matara Jehova, ọ ga-abụ na anyị achọghịzi ka a mara anyị amara n’ụwa Setan otú ahụ Pọl na-achọghịzi ka a mara ya. (Gụọ Ndị Filipaị 3:7, 8.) Ọ ga-abụkwa na anyị hapụrụ ịgụkwu akwụkwọ, ma ọ bụ jụ ịnọ n’ọkwá ukwu, ma ọ bụkwanụ jụ itinye aka n’achụmnta ego ga-eme ka anyị baa ọgaranya n’ụwa. Ọ ga-abụ na egwú anyị na-agụ ma ọ bụ egwuregwu anyị na-eme gaara eme ka anyị bụrụ ndị a ma ama, ma ọ bụ ndị aka ji akụ, ma anyị hapụrụ ihe ndị ahụ niile. (Hib. 11:24-27) Ọ gaghị adị mma ka anyị kwawa mmakwaara n’ihi mkpebi ndị ahụ dị  mma anyị mere, ma na-eche na ndụ anyị gaara aka mma ma a sị na anyị tinyere isi n’ihe ndị ahụ anyị hapụrụ. Iche otú ahụ nwere ike ime ka anyị laghachi n’ịchụ ihe ụwa, ya bụ, ihe ndị ahụ anyị lere anya ka ihe “ndị na-adịghị ike na ndị na-enweghị isi” n’ụwa a.

MEE KA MKPEBI I MERE KA JEHOVA MARA GỊ SIKWUO IKE

8. Olee ihe ga-eme ka mkpebi anyị mere ka Jehova mata anyị sikwuo ike?

8 Olee otú anyị ga-esi mee ka mkpebi anyị mere ka Jehova mara anyị sikwuo ike, kama ịchọ ka ụwa mara anyị? Ka anyị nwee ike ime otú ahụ, anyị kwesịrị icheta ihe abụọ dị mkpa. Nke mbụ, Jehova ma mgbe niile ndị ji obi ha niile na-efe ya. (Gụọ Ndị Hibru 6:10; 11:6) O ji onye ọ bụla bụ́ ohu ya kpọrọ ihe, ma were ileghara ndị na-efe ya anya ka “ajọ omume.” Jehova ‘na-ama ndị bụ́ ndị ya.’ (2 Tim. 2:19) Ọ “maara ụzọ ndị ezi omume,” marakwa otú ọ ga-esi anapụta ha ná nsogbu.—Ọma 1:6; 2 Pita 2:9.

9. Nye ihe atụ otú Jehova si gosi na ya hụrụ ndị ya n’anya.

9 E nweela oge ụfọdụ Jehova mere ihe n’ụzọ pụrụ iche iji gosi na ya hụrụ ndị ya n’anya. (2 Ihe 20:20, 29) Dị ka ihe atụ, chegodị otú o si napụta ndị ya n’Oké Osimiri Uhie mgbe ndị agha Fero chụ ha na-abịa. (Ọpụ. 14:21-30; Ọma 106:9-11) Ihe a merenụ dị ịtụnanya nke na ndị mmadụ n’oge ahụ ka nọkwa na-ekwu banyere ya mgbe afọ iri anọ gachara. (Jọsh. 2:9-11) Ọ na-agba anyị ezigbo ume ma anyị na-echeta otú Jehova si gosi ike ya, gosikwa na ya hụrụ ndị ya n’anya n’ihi na n’oge na-adịghị anya, Gọg nke Megọg ga-ebuso anyị agha. (Ezik. 38:8-12) N’oge ahụ, obi ga-atọ anyị ezigbo ụtọ na anyị kpebiri ka Chineke mara anyị, kama ụwa ịma anyị.

10. Olee ihe ọzọ anyị kwesịrị iburu n’obi?

10 Anyị kwesịkwara iburu ihe nke abụọ n’obi. Jehova nwere ike ịgọzi anyị otú anyị na-atụghị anya ya. Jehova agaghị agọzi ndị na-eme ihe ọma naanị ka ndị mmadụ hụ ha. Maka gịnị? N’ihi na a kwụọla ha ụgwọ ọrụ mgbe ahụ ndị mmadụ na-eto ha. (Gụọ Matiu 6:1-5.) Ma, Jizọs kwuru na Nna ya “nke na-ahụ ihe na nzuzo,” na-ahụ ndị a na-enyeghị otuto n’ihi ihe ọma ha mere. Ọ na-ahụ ihe ọma ndị ahụ ha na-eme, ma na-agọzi ha otú kwesịrị ekwesị. Ma mgbe ụfọdụ, Jehova na-agọzi anyị otú anyị na-atụghị anya ya. Ka anyị tụlee ihe atụ ụfọdụ.

CHINEKE AGỌZIE OTU NWA AGBỌGHỌ DỊ UMEALA N’OBI OTÚ Ọ NA-ATỤGHỊ ANYA YA

11. Olee otú Jehova si gọzie Meri?

11 Mgbe oge ruru ka a mụọ Ọkpara Chineke n’ụwa, Jehova họọrọ otu nwa agbọghọ na-amaghị nwoke aha ya bụ Meri ka ọ mụọ ya. Meri bi n’obere obodo a na-akpọ Nazaret. Obodo a dị anya ma e si Jeruselem nakwa ụlọ nsọ ya mara mma gawa ya. (Gụọ Luk 1:26-33.) Gịnị mere Jehova ji họrọ Meri? Mmụọ ozi Gebriel gwara ya na ọ bụ onye ‘Chineke meere amara.’ Ihe Meri mechara gwa Elizabet onye ikwu ya gosiri na ya na Jehova bụ ezigbo enyi. (Luk 1:46-55) N’eziokwu, Jehova nọ na-ele Meri ma gọzie ya otú ọ na-atụghị anya ya n’ihi na o ji obi ya niile na-efe ya.

12, 13. Olee otú Jehova si kwanyere Jizọs ùgwù mgbe a mụrụ ya, nakwa mgbe a kpọ ya gaa n’ụlọ nsọ mgbe ụbọchị iri anọ gachara?

12 Mgbe Meri mechara mụọ Jizọs,  Jehova emeghị ka ndị isi a ma ama na Jeruselem nakwa na Betlehem mata ihe merenụ ma si otú ahụ kwanyere ha ùgwù. Ndị mmụọ ozi bịakwutere ndị ọzụzụ atụrụ dị umeala n’obi nọ na-azụ atụrụ ha n’azụ Betlehem ma kọọrọ ha ya. (Luk 2:8-14) Ndị ọzụzụ atụrụ ahụ gaziri hụ Jizọs mgbe ahụ a mụrụ ya ọhụrụ. (Luk 2:15-17) Ọ ga-abụ na o juru Meri na Josef ezigbo anya na a kwanyeere Jizọs ụdị ùgwù a. Chegodị ihe dị iche n’otú Jehova si eme ihe nakwa n’otú Ekwensu si eme ihe. Mgbe Setan zigara ndị na-eji kpakpando akọ ihe ga-eme n’ọdịnihu ka ha gaa hụ Jizọs na ndị mụrụ ya, ahụ́ erughị ndị bi na Jeruselem ala mgbe ha nụrụ na a mụọla Jizọs. (Mat. 2:3) Otú a onye ukwu na onye nta si mata banyere ya mere ka e gbuo ọtụtụ ụmụaka aka ha dị ọcha.—Mat. 2:16.

13 Mgbe ụbọchị iri anọ gachara Meri mụrụ Jizọs, o kwesịrị ịga chụọrọ Jehova àjà n’ụlọ nsọ dị na Jeruselem otú iwu kwuru. Ụlọ nsọ a dị ihe dị ka kilomita itoolu ma e si Betlehem gawa ya. (Luk 2:22-24) Ka Meri, Josef, nakwa Jizọs nọ na-eme njem, ọ ga-abụ na Meri nọ na-eche ma onye nchụàjà ọ̀ ga-ekwu ọrụ ụfọdụ pụrụ iche Jizọs ga-arụ n’ọdịnihu. A kwanyeere Jizọs ùgwù, ma ọ ga-abụ na ọ bụghị otú Meri si tụọ anya ya. Kama, Jehova si n’ọnụ “onye ezi omume na onye na-asọpụrụ Chineke,” a na-akpọ Simiọn, nakwa Ana, onye amụma nwaanyị dị afọ iri asatọ na anọ mee ka a mata na Jizọs ga-abụ Mesaya ahụ e kwere ná nkwa, ma ọ bụ Kraịst.—Luk 2:25-38.

14. Olee otú Jehova si gọzie Meri?

14 Gịnịkwanụ gbasara Meri? Jehova ọ̀ nọgidere na-agọzi ya n’ihi otú o si lekọta Ọkpara ya? O mere otú ahụ. Chineke mere ka e dee ihe ndị o mere na ihe ndị o kwuru na Baịbụl. Ọ ga-abụ na Meri enweghị ike iso Jizọs gaa ebe ndị ọ gara afọ atọ na ọkara ahụ o jere ozi n’ụwa. O nwere ike ịbụ n’ihi na di ya anwụọla, ya ebiri na Nazaret. N’ihi ya, ọ hụghị ọtụtụ ihe Jizọs mere ebe ndị ahụ o jere ozi. Ma, ọ nọ mgbe Jizọs nwụrụ. (Jọn 19:26) Meri na ndị na-eso ụzọ Jizọs mechara nọrọ na Jeruselem tupu ha enweta mmụọ nsọ na Pentikọst. (Ọrụ 1:13, 14) Ọ ga-abụrịrị na e tere ya na ndị ọzọ na-eso ụzọ Jizọs mmanụ. Ọ bụrụ otú ahụ, ọ pụtara na o so ná ndị Chineke họọrọ ka ha na Jizọs biri n’eluigwe ruo mgbe ebighị ebi. Ihe a bụ ụzọ magburu onwe ya Jehova si gọzie ya n’ihi otú o si fee ya.

OTÚ JEHOVA SI KWANYERE ỌKPARA YA ÙGWÙ

15. Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, olee otú Jehova si gosi na ya hụrụ Ọkpara ya n’anya?

15 Jizọs achọghị ka ndị ndú okpukpe ma ọ bụ ndị ọchịchị kwanyere ya ùgwù. Ma, Jehova si n’eluigwe kwuo okwu ugboro atọ iji mee ka Ọkpara ya mata na ọ hụrụ ya n’anya. Ọ ga-abụrịrị na ihe a gbara Jizọs ezigbo ume. Obere oge e mechara ya baptizim n’Osimiri Jọdan, Jehova kwuru, sị: “Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya, onye ihe ya masịrị m.” (Mat. 3:17) O nwere ike ịbụ na ọ bụ naanị Jọn Onye Na-eme Baptizim nụrụ ihe a Jehova kwuru. Ihe dị ka otu afọ tupu Jizọs anwụọ, ndịozi Jizọs atọ nụrụ ka Jehova kwuru gbasara Jizọs, sị: “Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya, onye ihe ya masịrị m; geenụ ya ntị.” (Mat. 17:5) N’ikpeazụ, ụbọchị ole na ole tupu Jizọs  anwụọ, Jehova sikwa n’eluigwe gwa Ọkpara ya okwu.—Jọn 12:28.

Olee ihe ị mụtara n’otú Jehova si kwanyere Ọkpara ya ùgwù? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 15 ruo na nke 17)

16, 17. Olee otú Jehova si kwanyere Jizọs ùgwù otú ọ na-atụghị anya ya?

16 N’agbanyeghị na Jizọs ma na ọ ga-anwụ ọnwụ ihere, e bo ya ebubo na o kwuluru Chineke, o kpere ekpere ka uche Jehova mee, ọ bụghị uche nke ya. (Mat. 26:39, 42) Baịbụl sịrị na “o diri osisi ịta ahụhụ, leghara ihere anya,” n’ihi na ọ chọrọ ka naanị Nna ya kwanyere ya ùgwù, ọ bụghị ụwa. (Hib. 12:2) Olee otú Jehova si kwanyere Jizọs ùgwù?

17 Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, o kpere ekpere ka Nna ya mee ka o nwee ebube o nwere mgbe ya na ya nọ n’eluigwe. (Jọn 17:5) O nweghị ihe gosiri na Jizọs tụrụ anya ihe karịrị nke ahụ. Ọ tụghị anya ka Jehova bugoo ya n’ọkwá n’eluigwe. Ma, olee ihe Jehova mere? Ọ kwanyeere Jizọs ùgwù otú ọ na-atụghị anya ya. Mgbe Jehova kpọlitere Jizọs n’ọnwụ, o mere ka ọ nọrọ “n’ọkwá ka elu,” n’eluigwe. O mekwara ka ọ bụrụ mmụọ na-anaghị anwụ anwụ n’eluigwe, bụ́ ihe onye ọ bụla na-enwetatụbeghị mbụ. * (Fil. 2:9; 1 Tim. 6:16) Ihe a bụ ụzọ magburu onwe ya Jehova si gọzie Jizọs n’ihi otú o si rubere ya isi.

18. Gịnị ga-enyere anyị aka ka anyị ghara ịchọ ịbụ ndị a ma ama n’ụwa a?

18 Gịnị ga-enyere anyị aka ka anyị ghara ịchọ ịbụ ndị a ma ama n’ụwa? Buru n’obi na Jehova ji ndị niile na-efe ya kpọrọ ihe mgbe niile. Ọ na-agọzikwa ha otú ha na-atụghị anya ya. Ònye manụ ihe ọma ndị anyị na-atụghị anya ha Jehova ga-emere anyị n’ọdịnihu? Ma, ka ọ dị ugbu a, mgbe anyị na-edi ihe isi ike na ọnwụnwa ndị na-abịara anyị n’ụwa ọjọọ a, anyị kwesịrị ịna-echeta na ụwa a na ịbụ onye a ma ama na ya na-agabiga agabiga. (1 Jọn 2:17) Nna anyị hụrụ anyị n’anya, bụ́ Jehova ‘abụghị onye ajọ omume ichefu ọrụ anyị na ịhụnanya anyị gosiri maka aha ya.’ (Hib. 6:10) N’eziokwu, ọ ga-agọzi anyị, ma o nwere ike ịbụ otú anyị na-atụdịghị anya ya.

^ para. 17 Ihe a nwere ike ịbụ ngọzi ọ na-atụghị anya ya, ebe ọ bụ na e kwughị gbasara anwụghị anwụ n’Akwụkwọ Nsọ Hibru.