TETA! Nke 6 n'Afọ 2017 | Mmebi Ụwa Ò Ruwela?
Gịnị mere ọnọdụ ụwa ji na-aka njọ kwa ụbọchị?
Baịbụl kwuru, sị: “Ọ dịrịghị mmadụ nke na-eje ije ọbụna iduzi nzọụkwụ ya.”—Jeremaya 10:23.
Teta! a kọwara ihe mere ọtụtụ ndị mmadụ ji kwere na ihe ga-emecha dị mma n’ụwa n’ọdịnihu.
ISIOKWU TETA! A
Mmebi Ụwa Ò Ruwela Ka Ọ̀ Bụ Na O Ruwebeghị?
Ha wegara aka elekere Doomsday clock ihu iji gosi na mmebi ụwa adịla nso taa karịa otú ọ dị kemgbe ihe dị ka afọ iri isii gara aga. Nke ahụ ọ̀ pụtara na o ruwela mgbe ụwa ga-emebi?
ISIOKWU TETA! A
Onye Ọ Bụla Chọrọ Ịmata Azịza Ya
Ozi ụlọ ọrụ mgbasa ozi na-agbasa na-eme ka ọtụtụ ndị na-ekwu na ụwa aghịghasịala nke na ọ gaghị ekwekwa mmekwata. Olee otú ha dịruru ná njọ?
ISIOKWU TETA! A
Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?
Kemgbe ọtụtụ narị afọ gara aga ka Baịbụl buru amụma na a ga-enwe nsogbu ndị tara akpụ n’ụwa.
IHE NDỊ GA-ENYERE EZINỤLỌ AKA
Kụziere Ụmụ Gị Ịdị Umeala n’Obi
Kụziere ha ịdị umeala n’obi otú ga-eme ka ha ghara ileda onwe ha anya.
OBODO NA NDỊ BI NA YA
Mgbe M Gara Niu Ziland
N’agbanyeghị na Niu Ziland nọ ebe dịpụrụ adịpụ n’obodo ndị ọzọ, ihe dị ka nde mmadụ atọ na-abịa na ya maka ilegharị anya kwa afọ. Ọ̀ gịnị na-adọrọ mmasị ha?
IHE GBASARA NDỊ OGE OCHIE
Alhazen
O nwere ike ị maghị onye Alhazen bụ, ma, ihe ndị o mere mgbe ọ nọ ndụ na-abara gị uru.
IHE BAỊBỤL KWURU
Aha Chineke
E nwere ọtụtụ utu aha ndị mmadụ na-akpọ Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile. Ma, Chineke nwere aha nke ya.
Isiokwu Ndị E Bipụtara na Teta! n’Afọ 2017
Ebe e depụtara isiokwu ndị gbara na Teta! Ndị e bipụtara n’afọ 2017.
Ihe Ndị Ọzọ Anyị Nwere
Na-ekwu Eziokwu
Gịnị mere i ji kwesị ịna-ekwu eziokwu mgbe niile?
Olee Otú Ị Ga-esi Amata Ezigbo Okpukpe?
E nwere ihe itoolu Baịbụl kwuru e ji amata ezigbo okpukpe.

