Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

È KERE YA EKE?

Mkpokoro Eju Mmiri na Ihe Ndị Ọzọ Yiri Eju Bi ná Mmiri

Mkpokoro Eju Mmiri na Ihe Ndị Ọzọ Yiri Eju Bi ná Mmiri

MKPOKORO eju mmiri na ihe ndị ọzọ yiri eju na-ebi ná mmiri na-enyere ha aka ibi n’ebe siri ike obibi, dị ka, n’ala ala osimiri. Otú mkpokoro ha si na-ekpuchi ahụ́ ha nke ọma ka ihe ọ bụla ghara ime ya, dọọrọ mmasị ndị njinia, ha achọwa ka ha matakwuo gbasara ya. Ndị njinia ndị a bidoro ime nchọnchọ iji matakwuo gbasara ọdịdị ha. Ha chọrọ ilere anya n’otú ha dị rụọ ụgbọala na ụlọ ndị ga na-echebe ndị nọ ha n’ime nke ọma.

Ihe Ị Ga-echebara Echiche: Ndị njinia ndị a mere nchọnchọ n’ụdị mkpokoro abụọ: (1) ndị nke dị mbadamba na-adị abụo abụọ na (2) ndị nke pịrị ọnụ ka nke eju.

Nchọpụta ndị e mere gosiri na mkpokoro ndị nke dị mbadamba na-eme ka ihe ọ bụla chọrọ ịdụpu ya chipụ gaa n’akụkụ ya na n’ebe jikọtara mkpokoro abụọ ahụ. Ná mkpokoro ndị nke pịrị ọnụ ka nke eju, ihe ọ bụla chọrọ ịdụpu ya na-achipụkwa gaa sụọ n’etiti ya, bụkwanụ ebe kacha sie ike ná mkpokoro ahụ. Ọ pụtara na o nwee ka ihe si kụọ na mkpokoro ndị a, ihe ahụ na-achịpụ gaa sụọ n’ebe kacha sie ike na mkpokoro ahụ. Ihe a na-eme ka ihe ọ bụla ghara imetụta ihe nọ n’ime mkpokoro ahụ.

Mgbe ndị na-eme nchọpụta ji mkpokoro ndị nke ezigbo ya tụnyere ihe yiri mkpokoro ha ji kọmputa mepụta, iji mata nke ga-akacha esi ike, ha chọpụtara na mkpokoro nke ezigbo ya ahụ ji okpukpu abụọ sie ike karịa nke ahụ ha rụpụtara.

Otu akwụkwọ aha ya bụ Scientific American, kwuru, sị: “Ọ bụrụ na e mepụta ụgbọala ga-adị ka mkpokoro eju ndị a n’ọdịnihu, ọ ga-ama ezigbo mma, siekwa ike otú ga-eme ka o chebe ndị nọ ya n’ime.”

Gịnị Ka I Chere? Otú mkpokoro eju mmiri na ihe ndị ọzọ yiri eju na-ebi ná mmiri dị, ọ̀ nọkatara dịrị? Ka è kere ya eke?