Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AJỤJỤ ỌNỤ | FAN YU

Onye Na-emepụta Ihe A Na-etinye na Kọmputa Kwuru Ihe Mere O Ji Kwere na Chineke

Onye Na-emepụta Ihe A Na-etinye na Kọmputa Kwuru Ihe Mere O Ji Kwere na Chineke

FAN YU malitere ịrụ ọrụ dị ka ọkachamara n’ihe gbasara mgbakọ na mwepụ n’ụlọ ọrụ a na-akpọ China Institute of Atomic Energy dị nso na Beijin. O kwebughị na Chineke ma ọ bụ na e kere ihe eke. Ma ugbu a, o kwetala na ọ bụ Chineke kere ihe niile. Anyị gbara ya ajụjụ ọnụ iji mata otú o si mee.

Biko, kọtụrụ anyị ihe ụfọdụ gbasara onwe gị.

A mụrụ m n’afọ 1959 n’otu obodo a na-akpọ Fuzo, dị ná mpaghara Jianshi, dị na Chaịna. Mgbe m dị afọ asatọ, a nọ na-enwe nsogbu ndọrọ ndọrọ ọchịchị na Chaịna. Ndị ọchịchị nyere papa m iwu ka ọ gaa rụọ ụzọ ụgbọ okporo ígwè n’otu ọzara dịpụrụ adịpụ. Papa m bụ njinia n’oge ahụ. N’ime ọtụtụ afọ ọ nọrọ ebe ahụ, ihe ọ na-abịa eleta anyị bụ naanị otu ugboro n’afọ. Mgbe ahụ, ọ bụ mụ na mama m bi. Ọ na-akụzi n’ụlọ akwụkwọ praịmarị, ọ bụkwa n’ụlọ akwụkwọ ahụ ka anyị bi. N’afọ 1970, anyị kwagara Liufan, bụ́ ime obodo dị ná mpaghara Linchuan. Nri dị ụkọ ebe ahụ, ndị bi na ya dakwara ụkpa.

Olee ihe ndị ezinụlọ unu kweere?

Papa m enweghị mmasị n’okpukpe na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Mama m bụ onye Buda. A kụziiri anyị n’ụlọ akwụkwọ na ndụ nọkatara dịrị, na o nweghị onye kere ya. M kwetakwara ihe ahụ a kụziiri anyị.

Gịnị mere i ji nwee mmasị ná mgbakọ na mwepụ?

Ihe mere m ji nwee mmasị ná mgbakọ na mwepụ bụ na ọ na-enyere mmadụ aka ileba anya n’ihe ka ọ mata nke bụ́ eziokwu. Abanyere m mahadum obere oge Mao Tse-tung bụ́ nwoke kpatara nsogbu ndọrọ ndọrọ ọchịchị ahụ nwụchara n’afọ 1976. Ihe bụ́ isi m gụrụ na mahadum bụ mgbakọ na mwepụ. Mgbe m nwetachara akara ugo mmụta, m nwetara ọrụ. Ọrụ m bụ ime mgbakọ na mwepụ maka otú e si arụpụta ígwè ọrụ nuklia.

Mgbe mbụ ị nụrụ gbasara Baịbụl, gịnị ka i chere gbasara ya?

N’afọ 1987, m gara n’otu mahadum dị na Teksas, n’Amerịka iji nweta akara ugo mmụta ọzọ. O doro m anya na ọtụtụ ndị Amerịka kweere na Chineke, na-agụkwa Baịbụl. M nụkwara na Baịbụl kwuru ọtụtụ ihe ga-abara anyị uru. N’ihi ya, m kpebiri na m ga-agụ ya.

M chọpụtara na ihe Baịbụl kwuru na-aba uru. Ma, e nwere ebe ụfọdụ siiri m ike nghọta, n’ihi ya, m kwụsịrị ịgụ ya.

Gịnị mere i ji maliteghachi ịgụ Baịbụl?

N’afọ 1990, otu nwaanyị Onyeàmà Jehova bịara n’ụlọ m gosi m ihe Baịbụl kwuru banyere otú ọdịnihu ụmụ mmadụ ga-esi ka mma. Nwaanyị ahụ kpọtaziiri m di na nwunye ga na-akụziri m Baịbụl. Nwunye m bụ́ Liping bụbu onye nkụzi fiziks n’otu ụlọ akwụkwọ sekọndrị dị na Chaịna. O kwebughị na Chineke dị, ma, o mechara bido mụwa Baịbụl. Anyị abụọ mụtara ihe Baịbụl kwuru gbasara otú ndụ si malite. Ma, ikweta na o nwere onye kere ihe niile siiri m ike, n’ihi ya, m kpebiri iji aka m mee nchọnchọ iji chọpụta nke bụ́ eziokwu.

Olee otú i si mee ya?

Ebe m bụ aka ochie n’ime mgbakọ na mwepụ, amaara m otú e nwere ike isi jiri mgbakọ na mwepụ gbakọọ ihe ma mata ma ọ̀ ga-eme. Amakwa m na ihe dị ndụ emekataghị dịrị ma ọ bụrụ na e nweghị protin. N’ihi ya, m malitere ịgbakọ otú protin ga-esi nọkata jiri aka ya dịrị. Protin so n’otu n’ime irighiri ihe ndị dị ịtụnanya ụmụ mmadụ ma. Ihe ndị dị ndụ nwekwara ọtụtụ protin dị iche iche n’ime ha. Protin ndị a na-emekọrịtakwa ihe n’ụzọ a kapịrị ọnụ. Emechara m chọpụta otu ihe gbasara protin nke ndị ọzọ chọpụtakwara, ya bụ, na protin agaghị anọkata mepụta onwe ya. O nwetụbeghị akwụkwọ evolushọn m gụrụ kọwara ihe doro anya ga-eme ka m kweta na protin ndị a ga-emepụtali onwe ha, ma ya fọdụzie ihe ndị ha dị n’ime ha ịnọkata mepụta onwe ha. N’uche nke m, ihe ndị m chọpụtara gosiri na e nwere Onye Okike.

Gịnị mere iji kweta na Baịbụl si n’aka Chineke?

Ka ọmụmụ ihe mụ na Ndịàmà Jehova nọ na-aga n’ihu, m mụtara na e nwere ọtụtụ amụma ndị dị na Baịbụl mezuru otú ahụ e si buo ha. M chọpụtakwara na ime ihe Baịbụl kwuru na-abara m uru. M sịrị onwe m: ‘Olee otú o si bụrụ na ndị dere Baịbụl dere ihe na-abara anyị uru taa, n’agbanyeghị na ha dịrị ndụ ọtụtụ puku afọ gara aga?’ Ka oge na-aga, ọ bịara doo m anya na Baịbụl bụ Okwu Chineke n’eziokwu.

Olee ihe mere ị ka ji nọgide na-ekwere na e nwere Onye Okike?

Mgbe ọ bụla m chebaara ihe dị iche iche dị n’ụwa echiche, ọ na-eme ka m kweta na e nwere Onye Okike. Ugbu a, ọrụ m bụzi ịrụpụta ihe ndị a na-etinye n’ime kọmputa, m chọpụtara na o nweghị otú a ga-esi jiri ihe kọmputa na-eme tụnyere ihe ụbụrụ mmadụ nwere ike ime. Dị ka ihe atụ, otú ụbụrụ anyị si aghọta okwu dị ezigbo ịtụnanya. Ọtụtụ n’ime anyị nwere ike ịghọta ihe mmadụ kwuru, ọ bụrụgodị na onye ahụ ekwuruchaghị ya n’isi, ma ọ bụ na ụzụ na-eme n’ebe ahụ, na ọ chịrị ọchị mgbe ọ na-ekwu ya, kwaa ụkwara, sụọ nsụ, ma ọ bụkwanụ na o ji olu ndị obodo ha kwuo ya. I nwere ike iche na ihe a enweghị ihe ọ bụ. Ma, ndị na-arụpụta ihe a na-etinye na kọmputa ma na ọ bụ ihe. O doro anya na o nweghị otú a ga-esi jiri ụbụrụ mmadụ tụnyere ọkpọka ngwá ọrụ kọmputa na-aghọta ihe mmadụ na-ekwu.

Ụbụrụ anyị nwere ike isi n’okwu mmadụ mata otú obi dị onye ahụ, obodo o si, na otú o si ekwu okwu. Ma, kọmputa kachanụ n’ụwa agaghị emeli ihe ndị a. Ndị na-arụpụta ihe ndị a na-etinye n’ime kọmputa na-achọ otú ha ga-esi rụọ kọmputa ga na-amata olu mmadụ nke ọma ka ụbụrụ anyị. O doro m anya na ihe a ha na-eme bụ isi n’ọrụ aka Chineke na-amụrụ ihe.

Ma, ikweta na o nwere onye kere ihe niile siiri m ike. N’ihi ya, m kpebiri imekwu nchọnchọ iji chọpụta nke bụ́ eziokwu