N’ỤWA A NSOGBU JURU

4 | Na-enwe Olileanya

4 | Na-enwe Olileanya

IHE MERE O JI DỊ MKPA

Nsogbu ndị juru n’ụwa na-eme ka ndị mmadụ na-echegbu onwe ha. Nchegbu a nwere ike ịkpatara ha ọrịa, meekwa ka obi koro ha n’elu. Ọtụtụ ndị nsogbu ndị a kparala aka ọjọọ enweghị olileanya. Gịnịzi ka ihe ndị a kpataara ha?

  • Ụfọdụ n’ime ha anaghịdị achọ iche gbasara ọdịnihu.

  • Ndị ọzọ na-aṅụ oké mmanya ma ọ bụ ọgwụ ike iji chefuo ụwa ha.

  • E nwere mmadụ ole na ole chere na ọnwụ kaara ha mma karịa ndụ. Ha na-ajụ, sị, “Oleezi ihe m nọ ndụ eme?”

Ihe I Kwesịrị Ịma

  • Nsogbu ụfọdụ i nwere ga-adị naanị obere oge, ihe nwekwara ike ịka mma mgbe ị na-atụghị anya ya.

  • Ọ bụrụgodị na nsogbu gị akwụsịghị, e nwere ihe ndị i nwere ike ịna-eme ga-enyere gị aka idi nsogbu gị.

  • Baịbụl kwuru na ihe ga-aka mma n’ọdịnihu, na nsogbu niile ndị mmadụ nwere ga-ebi.

Ihe Ndị I Nwere Ike Ime Ugbu A

Baịbụl sịrị: “Unu echegbula onwe unu mgbe ọ bụla maka echi, n’ihi na a ga-enwe ihe unu ga-eche banyere ya echi. Ihe ọjọọ nke ụbọchị nke ọ bụla ezuorola ya.”​—Matiu 6:34.

Echegbula onwe gị maka echi. Ekwela ka ihe ndị ga-eme echi chuwe gị ụra nke na ị gaghịzi emeli ihe ndị i kwesịrị ime taa.

Naanị ihe ichegbu onwe gị maka ihe ọjọọ ndị nwere ike ime ga-eme bụ ikowekwu gị obi n’elu, meekwa ka obi gharazie isi gị ike na ihe ga-aka mma n’ọdịnihu.

Baịbụl Kwuru na Ihe Ga-adị Mma n’Ọdịnihu

Otu ọbụ abụ nke dịrị ndụ n’oge ochie sịrị: “Okwu gị bụ ọkụ m ji ahụ ebe m na-azọnye ụkwụ, bụrụkwa ìhè nke na-enwu n’ụzọ m.” (Abụ Ọma 119:105) Ka anyị hụ otú Baịbụl, bụ́ Okwu Chineke, si bụrụ ọkụ na ìhè.

N’abalị, ọ bụ ọkụ na-eme ka anyị hụ ebe anyị ga-azọnye ụkwụ. Baịbụl na-emekwara anyị ihe yiri ya. Ọ na-enye anyị ezigbo ndụmọdụ ga-enyere anyị aka mgbe ọ na-esiri anyị ike ikpebi ihe anyị ga-eme.

Ìhè na-eme ka anyị hụ ihe ndị dị anya dị anyị n’ihu. Otú ahụ ka Baịbụl na-emekwa ka anyị mata ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu.